Nkwupụta Mmehie—Ụzọ nke Mmadụ Ka Ọ̀ Bụ Ụzọ nke Chineke?
N’ETITI ndị Katọlik, e nwewo oké mgbanwe n’ihe banyere nkwupụta mmehie n’ime ọtụtụ narị afọ ndị gaworo aga. N’afọ ndị mbụ nke Chọọchị Katọlik, ime nkwupụta na inye ahụhụ dịịrị nanị mmehie ndị dị oké njọ. N’ihe banyere nke a, akwụkwọ bụ Religion in the Medieval West na-asị: “Ruokwa akụkụ ikpeazụ nke narị afọ nke isii, usoro inye ọpịpịa bụ nke siri ike nke ukwuu: a pụrụ inye sakramenti nanị otu ugbo ná ndụ, a na-eme nkwupụta mmehie n’ihu ọha, ọpịpịa a na-enye na-adịkwa ogologo, siekwa ike.”
Ruo ókè ha aṅaa ka ọpịpịa ahụ na-esi ike? Na 1052, e nyere otu onye mere nkwupụta mmehie ya ahụhụ nke iji ụkwụ gaa ije site n’obodo Bruges nke dị na Belgium ruo Jerusalem n’eyighị akpụkpọ ụkwụ! Akwụkwọ bụ Christianity in the West 1400-1700 na-asị, “A ka na-ahụ ndị Katọlik n’afọ 1700 n’olulu mmiri na iyi dị iche iche dị nsọ, ka ha na-egbunye ikpere n’ime mmiri ahụ jụrụ oyi nke ukwuu, nke na-eru ha n’akpịrị ịnọ kpee ekpere nchegharị ha.” Ebe ọ bụ na n’oge ahụ, a naghị agbaghara mmehie ruokwa mgbe e mezuru ọpịpịa ahụ e nyere, ọtụtụ ndị na-edebe nkwupụta mmehie ha ruo mgbe ha na-achọ ịnwụ.
Olee mgbe ihe omume nke oge a nke nkwupụta mmehie malitere? Akwụkwọ ahụ bụ Religion in the Medieval West na-asị: “Ndị mọnk bụ ndị Celt wepụtara ụdị ọhụrụ nke inye ọpịpịa na France n’akụkụ ikpeazụ nke narị afọ nke isii. . . . Nke a bụ nkwupụta mmehie nke ịgbanye izu ná ntị otu onye, nke onye ahụ na-egosi nchegharị na-ekwupụta mmehie ya na nzuzo gwa otu onye ụkọchukwu, ọ bụkwa otu ụdị nke ihe ahụ ndị mọnk na-eme nke bụ inye ndụmọdụ ime mmụọ.” Dị ka omenala oge ochie nke ndị mọnk si dị, ndị mọnk na-ekwupụta mmehie ha gwarịta ibe ha iji nweta enyemaka ime mmụọ, ijikwa merie adịghị ike ha dị iche iche. Otú ọ dị, ná nkwupụta mmehie nke ịgbanye izu ná ntị ndị a na-eme n’oge dị ugbu a, chọọchị kwuru na onye ụkọchukwu nwere ihe dị ukwuu karị nke bụ “ike ma ọ bụ ikike ịgbaghara mmehie.”—New Catholic Encyclopedia.
Jisọs ò nyere ụfọdụ n’ime ndị na-eso ụzọ ya ike dị otú ahụ n’ezie? Gịnị ka o kwuru, bụ́ nke dujeworo ụfọdụ ndị ná nkwubi okwu nke a?
‘Mkpịsị Ugodi nke Alaeze ahụ’
N’otu mgbe, Jisọs Kraịst gwara Pita onyeozi, sị: “M ga-enye gị mkpịsị ugodi nke alaeze eluigwe: ihe ọ bụla ị ga-eke agbụ n’elu ụwa, a ga-ele ya anya dị ka ihe e kere agbụ n’eluigwe; ihe ọ bụla ị ga-atọpụ n’elu ụwa, a ga-ele ya anya dị ka ihe a tọpụworo n’eluigwe.” (Matiu 16:19, The Jerusalem Bible) Gịnị ka okwu Jisọs pụtara, bụ́ ‘mkpịsị ugodi nke alaeze ahụ’? Anyị pụru ịghọta nke a nke ọma karị ma ọ bụrụ na anyị elee anya n’otu oge ọzọ mgbe Jisọs jiri okwu ahụ bụ “mkpịsị ugodi” mee ihe.
N’otu mgbe, Jisọs gwara ndị ndú okpukpe ndị Juu, bụ́ ndị maara Iwu Mosis nke ọma, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu ndị ọkà iwu, n’ihi na unu ewepụwo mkpịsị ugodi nke ihe ọmụma! Unu onwe unu abanyeghị, unu egbochiwokwa ndị ọzọ ịbanye, bụ́ ndị chọrọ ịbanye.” (Luk 11:52, JB) ‘Igbochi ndị ọzọ ịbanye’ n’ebee? Jisọs na-agwa anyị na Matiu 23:13, sị: “Ahụhụ ga-adịrị unu, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii, unu ndị ihu abụọ! Unu ndị na-emechi ụzọ alaeze eluigwe n’ihu ụmụ mmadụ, unu onwe unu adịghị abanye, unu adịghị ekwekwa ka ndị ọzọ banye, bụ́ ndị chọrọ ịbanye.” (JB) Dị ka a pụrụ ikwu ya, ndị ndú okpukpe ndị Juu mechibidoro ọtụtụ ndị ụzọ site n’ịnapụ ha ohere nke iso Jisọs Kraịst nọrọ n’eluigwe. “Mkpịsị ugodi” nke ndị ndú okpukpe ndị ahụ ‘wepụworo’ enweghị ụzọ ọ bụla o si metụta ịgbaghara mmehie. Ọ bụ mkpịsị ugodi nke ihe ọmụma Chineke nyeworo.
N’otu aka ahụ, ‘mkpịsị ugodi nke alaeze ahụ’ ndị e nyere Pita adịghị anọchi anya inwe ike ịgwa eluigwe ihe banyere onye e kwesịrị ịgbaghara mmehie ya ma ọ bụ onye e kwesịrị ime ka nke ya dịgide. Kama nke ahụ, ọ nọchiri anya ohere ọma dị ukwuu Pita nwere imeghe ụzọ nke eluigwe site n’ikesa ihe ọmụma Chineke nyeworo site n’ije ozi ya. O mere nke a na mbụ n’ebe ndị Juu na ndị na-eso ụzọ ndị Juu nọ, mgbe ahụ, nye ndị Sameria, e mesịakwa nye ndị Jentaịl.—Ọrụ 2:1-41; 8:14-17; 10:1-48.
“Ihe Ọ Bụla Unu Kere Agbụ n’Elu Ụwa”
Mgbe e mesịrị, a gwaghachiri ndị na-eso ụzọ ndị ọzọ okwu ahụ Jisọs gwara Pita. Jisọs sịrị, “N’ezie asị m unu, ihe ọ bụla unu kere agbụ n’elu ụwa a ga-ele ya anya dị ka ihe e keworo agbụ n’eluigwe; ihe ọ bụla unu tọhapụrụ n’ụwa a ga-ele ya anya dị ka ihe a tọhapụworo n’eluigwe.” (Matiu 18:18, JB) Ikike dị aṅaa ka Kraịst nyere ndị na-eso ụzọ ya n’ebe a? Okwu ndị gbara ya gburugburu na-egosi na ọ na-ekwu okwu banyere idozi nsogbu ndị dị n’etiti ndị kwere ekwe na idebe ọgbakọ ọcha site n’iwepụsị ndị mmebi iwu na-enweghị nchegharị.—Matiu 18:15-17.
N’okwu ndị metụtara ajọ mmebi nke iwu Chineke, ndị ikom nwere ibu ọrụ n’ọgbakọ ga-eleba anya n’okwu ahụ wee kpebie ma onye ahụ mere ihe ọjọọ ọ̀ bụ onye e kwesịrị ‘ike agbụ’ (ile ya anya dị ka onye ikpe mara) ma ọ bụ ‘ịtọhapụ’ (ịhapụ ya dị ka onye ikpe na-amaghị). Nke a ọ̀ pụtara na eluigwe ga-agbaso mkpebi nke ụmụ mmadụ? Ee e. Dị ka onye ọkà mmụta Bible bụ Robert Young na-egosi, mkpebi ọ bụla nke ndị ahụ na-eso ụzọ mere ga-agbaso mkpebi nke e mere n’eluigwe, ọ gaghị ebute ya ụzọ. O kwuru na n’ụzọ nkịtị, amaokwu 18 kwesịrị ịgụ, sị: Ihe unu kere agbụ n’elu ala “kwesịrị ịbụ nke (e buwororịị ụzọ) kee agbụ” n’eluigwe.
N’ezie, ọ bụ ihe ezi uche na-adịghị ya iche na mmadụ ọ bụla na-ezughị okè ga-eme mkpebi nke ndị nọ n’ogige nke eluigwe na-aghaghị ịgbaso. Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya karị ikwu na ndị nnọchianya Kraịst a họpụtara ahọpụta ga-agbaso nduzi ya nile ka ha wee debe ọgbakọ ya ọcha. Ha ga-eme nke a site n’ime mkpebi ndị dabeere n’ụkpụrụ ndị a tọwororịị n’eluigwe. Jisọs n’onwe ya ga-eduzi ha n’ime nke a.—Matiu 18:20.
Ọ̀ dị mmadụ ọ bụla nke pụrụ “ịnọchi anya Kraịst dị ka ọkà ikpe nke dị ka nna” ruo n’ókè nke ikpebi ọdịnihu ebighị ebi nke onye na-efe ofufe ibe ya? (New Catholic Encyclopedia) Ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ndị ụkọchukwu na-agbaghara mmehie mgbe nile ha nụrụ nkwupụta mmehie, ọ bụ ezie na “o yiri ka e nwere nkwenye a na-adịghị ekwupụta ekwupụta [n’etiti ndị ọkà mmụta okpukpe Katọlik] na ọ na-esi ike ịhụ onye nwere mwute n’ezie maka mmehie ya.” (The New Encyclopædia Britannica) N’ezie, olee mgbe ikpeazụ ị nụrụ na onye ụkochukwu jụrụ ịgbaghara mmehie ma ọ bụ ịtọhapụ onye mere ihe ọjọọ? Ma eleghị anya, nke a bụ n’ihi na onye ụkọchukwu nke ahụ n’onwe ya echeghị na ya nwere ikike ikpebi ma onye ahụ mere mmehie ò nwere nchegharị ma ọ bụ na o nweghị. Ma ọ bụrụ na nke a bụ ọnọdụ dịnụ, n’ihi gịnị ka o ji na-ekwu na ya nwere ikike ịgbaghara mmehie?
Cheedị nnọọ echiche banyere ụlọikpe ebe ọkà ikpe nke nwere obi ọmịiko na-atọhapụ nnọọ ndị nile mere mpụ, ọbụna ndị nọgidere na-emebi iwu, n’ihi na ha na-emezu ihe omume mmeghachi efu nke ịnakwere mpụ ndị ha mere ma na-ekwu na o wutere ha. Ọ bụ ezie na nke a pụrụ imezuru ndị mmebi iwu ihe ha chọrọ, echiche na-ezighị ezi dị otú ahụ banyere ime ebere ga-eweda ùgwù a na-akwanyere ikpe ziri ezi n’ala nke ukwuu. Ọ̀ pụrụ ịbu na nkwupụta mmehie dị ka e si eme ya na Chọọchị Katọlik na-eme ka obi siwanye ndị mmadụ ike n’ezie ime mmehie?—Eklisiastis 8:11.
Ramona, n’ịdabere n’ahụmahụ ya nke ikwupụta mmehie dị ka onye Katọlik eri mgbe ọ dị afọ asaa, sịrị, “Nkwupụta mmehie adịghị arụpụta mkpali ọ bụla nke ịnwa izere mmehie ahụ n’ọdịnihu.” O kwukwara, sị: “Nkwupụta mmehie na-ewulite echiche ahụ nke bụ na Chineke na-agbaghara ihe nile, na n’agbanyeghịkwa ihe anụ ahụ gị na-ezughị okè dujere gị ime, na ọ ga-agbaghara gị. Ọ dịghị ewulite ọchịchọ miri emi nke ime ihe ziri ezi.”a
Ma gịnị banyere okwu Jisọs nke e dekọrọ na Jọn 20:22, 23? N’ebe ahụ, ọ gwara ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Naranụ Mmụọ Nsọ. N’ihi na ndị nile unu gbaghaara mmehie ha, a gbagharawo ha; ndị nile unu mere ka mmehie ha dịgide, e mewo ka ha dịgide.” (JB) Ọ̀ bụ na n’ebe a, Jisọs enyeghị ndị na-eso ụzọ ya ikike kpọmkwem ịgbaghara mmehie?
Ọ bụrụ na e lee ya anya nanị ya, amaokwu Bible nke a pụrụ iyi ka ọ̀ na-ekwu otú ahụ. Otú ọ dị, ọ bụrụ na a tụlekọọ okwu ndị a na ihe ndekọ ahụ dị na Matiu 18:15-18 na ihe nile ọzọ Bible na-akụzi banyere nkwupụta na mgbaghara mmehie, gịnị ka anyị na-aghaghị ikwubi? Na n’akwụkwọ Jọn 20:22, 23, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ikike ịchụpụ ndị na-eme ajọ mmehie n’enweghị nchegharị site n’ọgbakọ. N’otu mgbe ahụ, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya ikike iji ebere gbaghara ndị mmehie nwere nchegharị. O doro anya na ihe Jisọs na-ekwu abụghị na ndị na-eso ụzọ ya kwesịrị ikwupụtara onye ụkọchukwu mmehie nile ọ bụla ha mere.
E si otú a nye ndị nwere ibu ọrụ n’ọgbakọ ikike ikpebi otú ha ga-esi lebara ndị mere ajọ mmehie anya. A ga-eme mkpebi dị otú ahụ n’okpuru nduzi nke mmụọ nsọ Chineke nakwa n’ụzọ kwekọrọ ná nduzi nile Chineke nyere site n’aka Jisọs Kraịst na Akwụkwọ Nsọ. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 5:1-5; 1 Ndị Kọrint 5:1-5, 11-13.) Ọ ga-esi otú ahụ bụrụ na ndị ikom ahụ nwere ibu ọrụ nlekọta na-eme ihe kwekọrọ ná nduzi sitere n’eluigwe, ọ bụghị ịmanye eluigwe ịgbaso mkpebi nke ha.
“Na-ekwupụtanụ Mmehie Unu Gwarịta Ibe Unu”
Ya mere, olee mgbe o kwesịrị ekwesị ka ndị Kraịst kwupụta mmehie gwarịta ibe ha? N’ihe banyere mmehie dị oké njọ (ọ bụghị obere ndahie ọ bụla) mmadụ kwesịrị ikwupụta mmehie ya gwa ndị nlekọta nwere ibu ọrụ n’ọgbakọ. Ọbụna ma a sị na mmehie adịghị oké njọ ma ọ bụrụ na akọ na uche onye ahụ mere mmehie na-enye ya nsogbu gabiga ókè, e nwere abamuru dị ukwuu n’ime nkwupụta na ịchọ enyemaka ime mmụọ.
N’ihe banyere nke a, onye ahụ so dee Bible, bụ́ Jemes na-asị: “Ọ bụrụ na onye ọ bụla n’ime unu na-arịa ọrịa [ime mmụọ], o kwesịrị izipụ ozi ka a kpọọ ndị okenye nke chọọchị, ha aghaghịkwa ite ya mmanụ n’aha Onyenwe anyị, kpeekwa ekpere n’isi ya. Ekpere nke okwukwe ga-azọpụtakwa onye ahụ ahụ na-adịghị ike, Onyenwe anyị ga-emekwa ka o bilighachi; ọ bụrụkwa na o mewo mmehie ọ bụla, a ga-agbaghara ya. Ya mere na-ekwupụtanụ mmehie unu gwarịta ibe unu, na-ekpekwanụ ekpere n’ihi ibe unu.”—Jemes 5:14-16, JB.
N’okwu ndị a, ọ dịghị ihe na-egosi ime nkwupụta nke ịgbanye izu ná ntị mmadụ n’ụzọ a haziri ahazi, nke bụkwa ihe omume mmeghachi efu. Kama nke ahụ, mgbe ibu mmehie nyikwasịrị onye Kraịst nke ukwuu nke na ọ na-eche na ya apụghịkwa ikpe ekpere, o kwesịrị ịkpọ ndị okenye ma ọ bụ ndị nlekọta a họpụtara ahọpụta n’ọgbakọ, ha ga-esokwa ya kpee ekpere. Iji nyere ya aka inwetaghachi ike ime mmụọ ya, ha ga-ejikwa mmanụ nke Okwu Chineke mee ihe.—Abụ Ọma 141:5; tụlee Luk 5:31, 32; Mkpughe 3:18.
E kwesịrị ịrịba ama ndụmọdụ nke Jọn Onye Na-eme Baptism nke bụ ‘ịmịpụta mkpụrụ nke kwesịrị nchegharị.’ (Matiu 3:8; tụlee Ọrụ Ndị Ozi 26:20.) Onye nwere nchegharị n’ezie na-agbakụta ụzọ mmehie ya azụ. Dị ka Eze Devid nke Israel oge ochie, onye mmehie nke nwere nchegharị, onye na-ekwupụta njehie ya gwa Chineke ga-anata mgbaghara. Devid dere, sị: “Ana m emerị ka ị mara mmehie m, ekpuchighịkwa m ajọ omume m: m sịrị, M ga-ekwupụtara Jehova njehie m nile; gị onwe gị bupụkwara ajọ omume nke mmehie m.”—Abụ Ọma 32:5.
Imezu ọpịpịa e nyere enye apụghị ime ka mmadụ nweta mgbaghara dị otú ahụ. Ọ bụ nanị Chineke pụrụ inye ya. Ọ na-eburu ihe ikpe ziri ezi zuru okè chọrọ n’uche, ma mgbaghara ya bụ ngosipụta nke ịhụnanya o nwere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ. Ịhụnanya ya bụkwa ngosipụta nke obi ebere na-erughịrị mmadụ, nke gbanyere mkpọrọgwụ n’àjà mgbapụta nke Jisọs Kraịst, nke a na-enyekwa nanị ndị mmehie nwere nchegharị, bụ́ ndị siworo n’ihe ọjọọ wezụga onwe ha n’anya Chineke. (Abụ Ọma 51:7; Aịsaịa 1:18; Jọn 3:16; Ndị Rom 3:23-26) Ọ bụ nanị ndị ahụ Jehova Chineke gbagharawooro ga-enweta ndụ ebighị ebi. Iji nweta mgbaghara dị otú ahụ, anyị aghaghị ime nkwupụta mmehie n’ụzọ nke Chineke, ọ bụghị n’ụzọ nke mmadụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji gosi ọdịiche n’ebe nke ahụ dị, lee Mak 3:29; Ndị Hibru 6:4-6; 10:26. N’akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a, ndị so dee Bible na-ekwu hoo haa na ọ bụghị mmehie nile ka Chinek na-agbaghara.
[Foto dị na peeji nke 7]
Devid kwupụtaara Jehova mmehie ya, bụ́ onye gbaghaara ya