Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ì Nwere Okwukwe Yiri nke Elaịja?
    Ụlọ Nche—1992 | Eprel 1
    • See onyinyo nwoke nke a, yiri uwe akpụkpọ anụ ya nke onye ime obodo. Ọ bụ onye obodo ugwu ugwu ahụ bụ́ Gilead, yie ka a zụlitere n’etiti ndị dị umeala n’obi na-azụ atụrụ. Ọ na-eguzo n’ihu eze ukwu bụ́ Ehab, ma eleghị anya kpọmkwem n’obí ukwu ya, ya na ụlọ ọdụ ya a ma ama, ụba ihe ịchọ mma ya ndị pụrụ nnọọ iche na arụsị ndị buru ibu. N’ebe ahụ, n’obodo Sameria ahụ e wusiri ike nke na-ekwo ekwo, ebe e chezọworo nnọọ ofufe Jehova, ọ na-agwa Ehab na chi ya nke a, Beal a, enweghị ike, bụ́ ihe na-adịghị adị. N’afọ a na n’afọ ndị na-abịa, ka Elaịja na-ekwupụta, a gaghị enwe mmiri ozuzo ma ọ bụ igirigi!

      Olee ebe o si nweta okwukwe dị otú ahụ? Ọ̀ bụ na ụjọ atụghị ya iguzo n’ebe ahụ n’ihu eze isi ike nke a, nke si n’ezi ofufe dapụ. Ma eleghị anya. Mgbe ihe karịrị otu puku afọ gasịrị, onye nne ji ya na Jisọs bụ́ Jemes na-emesi anyị obi ike na Elaịja bụ “mmadụ yiri anyị n’ahụ ya.” (Jemes 5:17) Ma rịba okwu Elaịja ama: “Jehova, bụ́ Chineke nke Israel, na-adị ndụ, onye m guzoworo n’ihu ya.” Elaịja bu n’uche na dị ka onye na-ejere Jehova ozi, ọ na-eguzo n’ihu ocheeze dị elu karịa nke Ehab—ocheeze nke Eze Onyenwe eluigwe na ala! Ọ bụ onye nnọchianya, onye ozi nke ocheeze ahụ. Site n’ọnọdụ nke a, gịnị dị n’ebe Ehab, ntakịrị mmadụ bụ eze nke na-enwekwaghị ngọzi Jehova, nọ nke ọ ga-atụ egwu ya?

      Ọ bụghị ihe ndabara na Jehova bụ onye dị adị nye Elaịja. O doro anya na onye amụma ahụ amụwo ihe ndekọ nke otú Chineke si mesoo ndị Ya. Jehova adọwo ndị Juu aka ná ntị na ya ga-eji ụkọ mmiri ozuzo na ụnwụ nri taa ha ahụhụ ma ọ bụrụ na ha echigharịghị pụọ n’ife chi ụgha dị iche iche ofufe. (Deuterọnọmi 11:16, 17) Site n’obi ike na Jehova ga-emezu okwu ya mgbe nile, Elaịja ‘kpere ekpere ka mmiri ghara izo.’—Jemes 5:17.

  • Ì Nwere Okwukwe Yiri nke Elaịja?
    Ụlọ Nche—1992 | Eprel 1
    • a Ma Jisọs ma Jemes kwuru na mmiri e zoghị n’ala ahụ ruo “afọ atọ na ọnwa isii.” Ma, a sịrị na Elaịja guzoro n’ihu Ehab iweta ụkọ mmiri ozuzo ahụ “n’afọ nke atọ”—ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụ ịgụ site n’ụbọchị a mara ọkwa ụkọ mmiri ozuzo ahụ. Ya mere, ọ ghaghị ịbụwo mgbe otu oge ọkọchị nke mmiri na-ezoghị na ya nke dị ogologo gasịrị mgbe o guzoro nke mbụ ya n’ihu Ehab.—Luk 4:25; Jemes 5:17; 1 Ndị Eze 18:1.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya