Iji Ire Anyị Egosi na Anyị Nwere Amamihe Si n’Elu
‘A SỊ na m maara agaraghị m ekwu ihe ahụ m kwuru!’ Ọ̀ dịtụla mgbe ị gwara onwe gị ụdị ihe a? Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ na-esiri anyị niile ike ịkwa ire anyị nga. Baịbụl kwuru na ụmụ mmadụ nwere ike ịzụ̀ ụdị anụ ọhịa niile, “ma ire, ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ịzụ̀ ya.” (Jems 3:7, 8) Ànyị ga-ejizi maka ihe a Baịbụl kwuru kwụsị ịkwa ire anyị nga? Mbanụ! Ka anyị leba anya n’ụfọdụ ndụmọdụ Baịbụl ndị nwere ike inyere anyị aka ịgbalịsi ike ịkwa ire anyị nga, nke bụ́ ihe dị nta dị n’ahụ́ anyị ma ọ na-akpa ike.
● “N’ọtụtụ okwu, mmehie anaghị ahapụ ịdị, ma onye na-achịkwa egbugbere ọnụ ya ji ezi uche eme ihe.” (Ilu 10:19) Ọ bụrụ na anyị na-ekwu oké okwu, ọ ga-adịrị anyị mfe ikwu ihe anyị na-ekwesịghị ikwu ma ọ bụ ihe ga-ewute ndị ọzọ. N’eziokwu, ire a na-akwaghị nga nwere ike ịdị ka ọkụ, gbasaa asịrị ma ọ bụ okwu ọjọọ banyere onye ọzọ n’egbughị oge. (Jems 3:5, 6) Ma ọ bụrụ na anyị “na-achịkwa egbugbere ọnụ” anyị, ma ọ bụ na-echebara ihe anyị chọrọ ikwu echiche tupu anyị ekwuo ya, anyị ga-achọpụta otú ihe anyị ga-ekwu nwere ike ịdị ndị ọzọ. Anyị na-eme otú a, ndị mmadụ ga-ama na anyị na-akpachara anya tupu anyị ekwuo okwu, ọ ga-eme ka ha na-akwanyere anyị ùgwù, obi ga na-esikwa ha ike ịkọrọ anyị ihe.
● ‘Bụrụ onye na-anụ ihe ngwa ngwa, onye na-adịghị ekwu okwu ngwa ngwa, onye na-adịghị ewe iwe ngwa ngwa.’ (Jems 1:19) Ọ bụrụ na anyị na-ege ntị nke ọma mgbe ndị ọzọ na-ekwu okwu, obi na-adị ha ụtọ n’ihi na nke ahụ na-egosi ha na anyị nwere mmasị n’ebe ha nọ nakwa na anyị na-akwanyere ha ùgwù. Ma ọ́ bụrụkwanụ na mmadụ akparịa anyị ma ọ bụ kwuo ihe ga-akpasu anyị iwe? Ọ bụ mgbe ahụ ka anyị ga-agbalịsi ike hụ na anyị ‘eweghị iwe ngwa ngwa’ ma ghara imegwara ihe ahụ e mere anyị. Ònye makwanụ ma o nweela ihe kpasuru onye ahụ iwe, nakwa ma ọ̀ ga-emecha rịọ mgbaghara maka mkparị ahụ ọ kparịrị anyị? Ọ̀ na-esiri gị ike ịghara ‘iwe iwe ngwa ngwa’? Ya bụrụ otú ahụ, rịọ Chineke ka o nyere gị aka inwe ike ijide onwe gị. Ọ ga-aza gị arịrịọ ahụ iji obi gị dum rịọ.—Luk 11:13.
● “Ire dị nro pụkwara ịgbaji ọkpụkpụ.” (Ilu 25:15) Ọ bụ eziokwu na ọtụtụ ndị weere na onye dị nwayọọ esighị ike, ma nke bụ́ eziokwu bụ na onye dị nwayọọ siri ike. Dị ka ihe atụ, mgbe mmadụ kpọrọ anyị asị ma ọ bụ jiri obi ọjọọ na-emegide anyị, iji olu ọma zaghachi ya nwere ike ime ka ọ gbanwee. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọ dịghị mfe iji nwayọọ azaghachi, karịchaa mgbe a kpasuru anyị ezigbo iwe. N’ihi ya, chebara uru dị n’ige ntị na ndụmọdụ Baịbụl echiche, cheekwa nsogbu ndị i nwere ike inwe ma ọ bụrụ na i meghị otú ahụ.
Ndụmọdụ ndị dị na Baịbụl bụ n’ezie “amamihe nke si n’elu.” (Jems 3:17) Mgbe ọ bụla anyị mere ihe ndị ahụ Baịbụl kwuru n’otú anyị si ekwu okwu, ihe anyị na-ekwu ga-egosi na anyị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù, ọ ga-emekwa ka ndị ọzọ na-abịa anyị nso ma na-ewulikwa ha elu. Okwu anyị ga-adịkwa ka “mkpụrụ osisi apụl ọlaedo nke dị n’ime ihe e ji ọlaọcha tụọ,” nke bụ́ okwu e kwuru n’oge kwesịrị ya.—Ilu 25:11.