Nyere Ụmụ Gị Aka Ime nke Ọma
MGBE a bịara n’ịzụ ụmụaka, ọtụtụ ndị nne na nna na-achọgharị azịza ebe nile, bụ́ ndị ha nwere n’ezie n’ebe obibi ha. Ọtụtụ ezinụlọ nwere Bible, ma ọ dị n’elu shelf akwụkwọ na-ekpokọ uzuzu kama iji ya mee ihe n’ịzụ ụmụaka.
N’eziokwu, ọtụtụ ndị taa na-enwe obi abụọ banyere iji Bible eme ihe nduzi ná ndụ ezinụlọ. Ha na-ajụ ya dị ka ihe oge ya gafeworo, nke meworo ochie, ma ọ bụ nke sibigara ike ókè. Ma nnyocha e ji obi eziokwu mee ga-ekpughe na Bible bụ akwụkwọ bara uru maka ezinụlọ. Ka anyị lee ụzọ o si baa uru.
Gburugburu Ebe Obibi Kwesịrị Ekwesị
Bible na-agwa nna ka o were ụmụ ya dị ka “ome osisi olive gburugburu table [ya].” (Abụ Ọma 128:3, 4) Obere osisi ndị na-esighị ike agaghị etolite ghọọ osisi ndị na-amị mkpụrụ ma ọ bụrụ na e jighị ezi nlezianya zụọ ha, ma e nyeghị ha nri kwesịrị ekwesị, ájá, na mmiri. N’otu aka ahụ, ịzụlite ụmụaka n’ụzọ gara nke ọma chọrọ ọrụ na nlekọta. Gburugburu ebe obibi dị mma dị ụmụaka mkpa iji toruo ntozu okè.
Ihe mbụ a chọrọ maka gburugburu ebe obibi dị otú ahụ bụ ịhụnanya—n’etiti di na nwunye na n’etiti ndị nne na nna na ụmụaka. (Ndị Efesọs 5:33; Taịtọs 2:4) Ọtụtụ ndị òtù ezinụlọ na-ahụ ibe ha n’anya ma ha adịghị ahụ mkpa ọ dị ikwupụta ịhụnanya dị otú ahụ. Otú ọ dị, tụlee: Ị̀ pụrụ ikwu n’ụzọ ziri ezi na gị na otu enyi gị enwewo nkwurịta okwu ma ọ bụrụ na i degaara ya akwụkwọ ozi ị na-etinyedịghị adres, stamp, ma ọ bụ zipụ? N’otu aka ahụ, Bible na-egosi na ezi ịhụnanya karịrị nnọọ mmetụta na-ekpo obi ọkụ; ọ na-apụta ìhè n’okwu ọnụ na omume. (Tụlee Jọn 14:15 na 1 Jọn 5:3.) Chineke setịpụrụ ihe nlereanya, na-ekwupụta ịhụnanya ya maka Ọkpara ya: “Onye a bụ Ọkpara m M hụrụ n’anya, Onye ihe Ya dị m ezi mma.”—Matiu 3:17.
Ịja Mma
Olee otú ndị nne na nna pụrụ isi gosi ụmụ ha ụdị ịhụnanya ahụ? Dị ka ụzọ isi malite, chọọ akụkụ ndị dị mma. Ọ dị mfe ịhụ mmejọ n’ebe ụmụaka nọ. Etozughị okè, enweghị ahụmahụ, na ịchọ ọdịmma onwe ha nanị ga-apụta ìhè n’ọtụtụ ụzọ, kwa ụbọchị. (Ilu 22:15) Ma ha ga-eme ọtụtụ ihe ọma kwa ụbọchị. Olee nke ị ga-elekwasị anya na ya? Chineke adịghị elekwasị anya ná mmejọ anyị kama ọ na-echeta ihe ọma anyị na-eme. (Abụ Ọma 130:3; Ndị Hibru 6:10) Anyị kwesịrị imeso ụmụ anyị n’otu ụzọ ahụ.
Otu nwa okorobịa kwuru, sị: “Ná ndụ m nile n’ụlọ, apụghị m ichetatụ ụdị ịja mma ọ bụla—ma ọ bụ maka ihe ndị a rụzuru n’ụlọ ma ọ bụ n’ụlọ akwụkwọ.” Ndị nne na nna, unu elegharala mkpa a dị oké mkpa n’ụmụ unu anya! E kwesịrị ịdị na-aja ụmụaka nile mma n’ụzọ chiri anya maka ihe ọma ndị ha na-eme. Nke ahụ ga-ebelata ihe ize ndụ nke ha itolite bụrụ ndị ‘obi furu,’ na-ekwenyesi ike na ọ dịghị ihe ha mere ga-adị mma ruo n’ókè zuru ezu.—Ndị Kọlọsi 3:21.
Nkwurịta Okwu
Ụzọ ọzọ dị mma isi gosi ụmụ gị ịhụnanya bụ ịgbaso ndụmọdụ nke Jemes 1:19: “Bụrụ onye na-anụ ihe ọsọ ọsọ, onye na-adịghị ngwa ikwu okwu, na-adịghịkwa ngwa iwe iwe.” Ị̀ na-adọpụta ihe dị n’obi ụmụ gị ma na-ege ntị n’ezie n’ihe ha nwere ikwu? Ọ bụrụ na ụmụ gị amara na ị ga-agwa ha okwuchukwu ọbụna tupu ha ekwusịa okwu ma ọ bụ na ị ga-ewe iwe mgbe ị matara ihe dị ha n’obi n’ezie, mgbe ahụ ha pụrụ izochi mmetụta ha. Ma ọ bụrụ na ha amara na ị ga-ege ntị n’ezie, o yikarịrị nnọọ ka ha ga-agwa gị ihe dị ha n’obi.—Tụlee Ilu 20:5.
Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na ha ekwupụta ihe ndị ị maara na ọ dị njọ? Ọ̀ bụ oge ịzaghachi n’iwe, kwuo okwuchukwu, ma ọ bụ ịdọ aka ná ntị ụfọdụ? N’ezie, ụfọdụ okwu iwe ụmụaka pụrụ ime ka o sie ike ịbụ “onye na-adịghị ngwa ikwu okwu, na-adịghịkwa ngwa iwe iwe.” Ma tụlee ọzọ ihe nlereanya Chineke n’ebe ụmụ ya nọ. Ọ̀ na-eme ka e nwee ọnọdụ nke ịtụ egwu ọjọọ, nke na ụmụ ya na-atụ ụjọ ịkọrọ ya ihe dị ha n’obi n’ezie? Ee e! Abụ Ọma 62:8 na-ekwu, sị: “Tụkwasịnụ [Chineke] obi na mgbe nile, unu ndị Ya; wụsịanụ obi unu n’ihu Ya dị ka mmiri: Chineke bụụrụ anyị ebe mgbaba.”
Ya mere mgbe Abraham nwere nchegbu banyere mkpebi Chineke ibibi obodo Sọdọm na Gọmọra, ọ laghị azụ ịgwa Nna ya nke eluigwe, sị: “Ya bụrụ Gị ihe arụ ime dị ka ihe a si dị . . . Onye ikpe ụwa nile, ọ́ gaghị eme ihe e kpere n’ikpe?” Jehova abaraghị Abraham mba; O gere ya ntị ma mee ka egwu ya dajụọ. (Jenesis 18:20-33) Chineke na-enwe ndidi ma dị nro n’ụzọ dị ịrịba ama, ọbụna mgbe ụmụ ya kwupụtara mmetụta ndị na-ezighị ezi na ndị ezi uche na-adịghị na ha ma ọlị.—Jona 3:10–4:11.
N’otu aka ahụ ọ dị ndị nne na nna mkpa ime ka e nwee ọnọdụ ebe ụmụaka ga-enwe mmetụta nke ịnọ ná nchebe ikwupụta ihe ndị dị ha n’ime ime obi, n’agbanyeghị otú ndị a pụrụ isi na-akpata oké nchegbu. Ya mere ọ bụrụ na nwa gị ekwuo okwu iwe jupụtara ná mmetụta, gee ntị. Kama ịba mba, gosi na ị ghọtara echiche nwa ahụ ma chọpụta ihe ndị kpatara ya. Dị ka ihe atụ, ị pụrụ ikwu, sị: ‘O yiri ka iwe ọ na-ewe gị banyere ihe dị otú a. Ị̀ chọrọ ịkọrọ m ihe merenụ?’
Ịchịkwa Iwe
N’ezie, ọ dịghị nne ma ọ bụ nna na-enwe ndidi ka Jehova. Ụmụaka pụkwara n’ezie itinye ndidi nke ndị nne na nna ha n’ule ruo ná njedebe. Ọ bụrụ na ị na-eweso ụmụ gị iwe site n’oge ruo n’oge, echegbula onwe gị na nke a na-eme ka ị bụrụ ajọ nne ma ọ bụ nna. Mgbe ụfọdụ, ị pụrụ nnọọ izi ezi n’iwe iwe. Chineke n’onwe ya na-eweso ụmụ ya iwe n’ụzọ ziri ezi, ọbụna ụfọdụ ndị ọ hụrụ n’anya nke ukwuu. (Ọpụpụ 4:14; Deuterọnọmi 34:10) Otú ọ dị, Okwu ya na-akụziri anyị ịchịkwa iwe anyị.—Ndị Efesọs 4:26.
N’ụzọ dị aṅaa? Mgbe ụfọdụ ọ na-enye aka ịkwụsịtụ ruo nwa oge ka iwe gị wee nwee ohere ịdajụlata. (Ilu 17:14) Chetakwa, Onye a bụ nwatakịrị! Atụla anya àgwà onye meworo okenye ma ọ bụ echiche onye tozuru okè. (1 Ndị Kọrint 13:11) Ịghọta ihe mere nwa gị ji eme omume n’ụzọ ụfọdụ pụrụ ime ka iwe gị belata. (Ilu 19:11) Echefula mgbe ọ bụla oké ọdịiche dị n’agbata ime ihe ọjọọ na ịdị njọ. Itikwasị nwatakịrị mkpu n’ihi na ọ dị njọ pụrụ ime ka nwa ahụ na-eche, sị, ‘Oleedị uru ọ bara ịgbalịwa ịbụ onye ọma?’ Ma iji ịhụnanya na-agbazi nwatakịrị olu ga-enyere nwatakịrị ahụ aka ime nke ọma karị n’oge ọzọ.
Ịnọgide Na-enwe Ịdị n’Usoro na Nkwanye Ùgwù
Ịkụziri ụmụaka inwe echiche nke ịdị n’usoro na nkwanye ùgwù bụ otu n’ime ihe ịma aka kasịnụ ndị nne na nna na-eche ihu. N’ụwa ime ihe masịrị onye nke taa, ọtụtụ ndị na-eche ma ò zidịrị ezi igbochi ụmụaka ha ma ọlị. Bible na-aza, sị: “Mkpanaka na ịba mba na-enye amamihe: ma nwata nke a na-ahapụ n’onwe ya na-eme ka ihere mee nne ya.” (Ilu 29:15) Ụfọdụ na-ezere okwu bụ́ “mkpanaka,” na-eche na ọ pụtara ụdị ụfọdụ nke mmetọ ụmụaka. Ma ọ bụghị. Okwu Hibru maka “mkpanaka” zoro aka n’ebe mkpara dị, dị ka nke onye ọzụzụ atụrụ na-eji edu—ọ bụghị ịkụgbu—atụrụ ya.a Ya mere mkpanaka na-anọchite anya ịdọ aka ná ntị.
N’ime Bible, inye ịdọ aka ná ntị pụtara n’ụzọ bụ isi izi ihe. Ọ bụ ya mere akwụkwọ Ilu ji kwuo ihe dị ka ugboro anọ, sị, ‘nụrụ ịdọ aka ná ntị.’ (Ilu 1:8; 4:1; 8:33; 19:27) Ọ dị ụmụaka mkpa ịmụta na ime ihe ziri ezi na-enyeghachi ụgwọ ọrụ nakwa na ime ihe ọjọọ na-eweta ihe ọjọọ. Ntaramahụhụ pụrụ inye aka mee ka ihe mmụta ndị na-adịghị mma bamie, dị nnọọ ka ụgwọ ọrụ—dị ka ịja mma—pụrụ isi mesie ndị dị mma ike. (Tụlee Deuterọnọmi 11:26-28.) Ndị nne na nna ga-eme nke ọma iṅomi ihe nlereanya Chineke mgbe a bịara n’inye ntaramahụhụ, n’ihi na ọ gwara ndị ya na ya ga-enye ha ahụhụ “ruo n’ókè kwesịrị ekwesị.” (Jeremaịa 46:28, NW) Ihe dị ụmụaka ụfọdụ mkpa agwụla okwu ole na ole siri ike iji gbazie ha. Ihe ndị ọzọ siri ike karị dị ndị ọzọ mkpa. Ma inye ahụhụ “ruo n’ókè kwesịrị ekwesị” enweghị mgbe ọ ga-agụnye ihe ọ bụla pụrụ imerụ nwatakịrị ahụ n’ezie n’ụzọ mmetụta uche ma ọ bụ n’anụ ahụ.
Ịdọ aka ná ntị guzoziri eguzozi kwesịrị ịgụnye izi ụmụaka banyere ókè na ebe ndị a ga-ejedebe. A kọwara ọtụtụ n’ime ndị a n’ụzọ doro anya n’Okwu Chineke. Bible na-akụzi nkwanye ùgwù maka ókèala dị gburugburu ala mmadụ. (Deuterọnọmi 19:14) Ọ na-esetịpụ ịkpa ókè anụ ahụ, na-eme ka ọ bụrụ ihe ọjọọ ịhụ ime ihe ike n’anya ma ọ bụ ilezi anya merụọ onye ọzọ ahụ. (Abụ Ọma 11:5; Matiu 7:12) Ọ na-etinye ịkpa ókè n’ihe banyere mmekọahụ, na-akagbu idina onye ikwu. (Levitikọs 18:6-18) Ọ matara ọbụna ịkpa ókè onwe onye na nke mmetụta uche, na-amachibido anyị ịkpọ mmadụ aha ọjọọ ma ọ bụ ụdị ịkpọ iyi ndị ọzọ. (Matiu 5:22) Ịkụziri ụmụaka ebe ndị a ga-ejedebe na ịkpa ókè ndị a—ma n’okwu ọnụ ma n’ihe nlereanya—dị mkpa n’ime ka e nwee ọnọdụ ezinụlọ dị mma.
Isi ihe ọzọ dị n’ịnọgide na-enwe ịdị n’usoro na nkwanye ùgwù n’ime ezinụlọ bụ ịghọta ọrụ ndị e nwere n’ezinụlọ. N’ọtụtụ ezinụlọ taa, ọrụ ndị dị otú ahụ edoghị anya ma ọ bụ bụrụ nke a ghọtahiere. N’ụfọdụ, nne ma ọ bụ nna na-akọsara nwatakịrị nsogbu nzuzo ụfọdụ bụ ibu arọ, nsogbu ndị a na-akwadebeghị nwatakịrị ahụ ime ihe banyere ha. Ná ndị ọzọ, a na-ahapụ ụmụaka ịbụ obere ndị ọchịchị aka ike, na-emere ezinụlọ dum mkpebi. Nke ahụ dị njọ ma na-emerụ ahụ. Ndị nne na nna nwere ibu ọrụ nke igbo mkpa ụmụaka ha ndị dị ntakịrị—ma ha bụ nke anụ ahụ, nke mmetụta uche, ma ọ bụ nke ime mmụọ—ọ bụghị ịsụgharị ya isi. (2 Ndị Kọrint 12:14; 1 Timoti 5:8) Tụlee ihe atụ Jekọb, bụ́ onye gbanwere otú ezinụlọ ya dum na ndị so ha si aga ka ọ ghara isibigara ndị ntakịrị ike ókè. Ọ ghọtara otú ike ha hà ma mee ihe n’ụzọ kwekọrọ na nke ahụ.—Jenesis 33:13, 14.
Ilekọta Mkpa Ime Mmụọ
Ọ dịghị ihe dị mkpa n’ọnọdụ ezinụlọ dị mma karịa ọnọdụ ime mmụọ. (Matiu 5:3) Ụmụaka nwere ikike dị ukwuu maka ọnọdụ ime mmụọ. Ha na-enwe ọtụtụ ajụjụ: Gịnị mere anyị ji dịrị ndụ? Ònye mere ụwa na anụmanụ ya, osisi, oké osimiri? Gịnị mere ndị mmadụ ji anwụ? Gịnị na-eme mgbe ọ gasịrị? Gịnị mere ihe ọjọọ ji adakwasị ndị ọma? O yiri ndepụta na-enweghị ọgwụgwụ. Ọtụtụ mgbe, ọ bụ ndị nne na nna na-enwe mmasị karị ịghara iche echiche banyere ihe ndị dị otú ahụ.b
Bible na-agba ndị nne na nna ume itinye oge n’inye ụmụ ha ọzụzụ ime mmụọ. Ọ na-ekwu banyere ọzụzụ dị otú ahụ n’okwu ndị na-ekpo ọkụ dị ka mkparịta ụka na-aga n’ihu n’agbata ndị nne na nna na ụmụaka. Ndị nne na nna pụrụ ịkụziri ụmụ ha banyere Chineke na Okwu ya mgbe ha na-ejekọ ije, na-anọdụkọ n’ụlọ, n’oge ịlakpu ụra—mgbe ọ bụla o kwere mee.—Deuterọnọmi 6:6, 7; Ndị Efesọs 6:4.
Bible adịghị nanị atụ aro usoro ihe omume ime mmụọ dị otú ahụ. Ọ na-enyekwa ihe ndị ga-adị gị mkpa. E kwuwerị, olee otú ị ga-esi zaa ajụjụ ụmụaka ndị e hotara n’elu? Bible nwere azịza ha. Ha doro anya, ha na-adọrọ adọrọ, ha na-enyekwa olileanya dị ukwuu n’ụwa a na-enweghị olileanya. Nke kakwarị mma, inweta amamihe Bible pụrụ inye ụmụ gị nkwado sikarịsịrị ike, nduzi a kasị jide n’aka n’oge dị mgbagwoju anya nke taa. Nye ha nke ahụ, ha ga-emekwa nke ọma n’ezie—ugbu a na ruo n’ọdịnihu.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Teta!, December 8, 1992, peji nke 26-27.
b E mere akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ maka ọmụmụ ihe ezinụlọ, o nwekwara ihe nduzi dị ukwuu bara uru sitere na Bible banyere alụmdi na nwunye na ịzụ ụmụaka. Ọ bụ Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara ya.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]
Chọọ ụzọ isi na-enye nwa gị ịja mma a kapịrị ọnụ n’ụzọ chiri anya
[Igbe dị na peeji nke 9]
Ụzọ Isi Nyere Ụmụaka Aka Ime nke Ọma
• Mee ka e nwee ọnọdụ dị nchebe ebe ha ga-enwe mmetụta nke ịbụ ndị a hụrụ n’anya na ndị a chọrọ
• Na-aja ha mma n’ụzọ chiri anya. Kpọọ okwu aha
• Bụrụ onye na-ege ntị nke ọma
• Kwụsịtụ mgbe iwe bilitere
• Setịpụ ịkpa ókè na ebe a ga-ejedebe ndị doro anya, ndị na-adịghị agbanwe agbanwe
• Mee ka ịdọ aka ná ntị kwekọọ ná mkpa nke nwatakịrị ọ bụla
• Atụla anya ihe karịrị ihe ezi uche dị na ya site n’aka nwa gị
• Gboo mkpa ime mmụọ site n’ọmụmụ ihe chiri anya nke Okwu Chineke
[Igbe dị na peeji nke 11]
Ihe A Na-amaghị n’Oge Ya
ỤKPỤRỤ Bible nyeere ndị Israel oge ochie aka inwe ọdịdị ndụ ezinụlọ karịrị nnọọ nke mba ndị gbara ha gburugburu. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Alfred Edersheim na-ekwu, sị: “A gafee ókèala Israel, ọ ga-abụ nnọọ ihe siri ike ikwu okwu banyere ndụ ezinụlọ n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ma ọ bụ ọbụna banyere ezinụlọ, dị ka anyị si aghọta okwu ndị a.” Dị ka ihe atụ, n’etiti ndị Rom oge ochie, iwu nyere nna ikike a na-akparaghị ókè n’ime ezinụlọ. Ọ pụrụ irenye ụmụ ya n’ịbụ ohu, mee ka ha rụọ ọrụ dị ka ndị ọrụ e goro ego, ma ọ bụ ọbụna gbuo ha—n’enweghị ihe e mere ya.
Ụfọdụ ndị Rom chere na ndị Juu na-eme ihe na-eju anya n’imeso ụmụ ha n’ụzọ dị nro. N’ezie, onye Rom na-akọ akụkọ ihe mere eme na narị afọ mbụ bụ́ Tacitus dere otu akụkụ ihe odide jupụtara n’ịkpọasị megide ndị Juu, na-ekwu na omenala ha bụ “n’otu oge nke rụrụ arụ na nke na-asọ oyi.” Otú ọ dị, o kwetara, sị: “Ọ bụ mpụ n’etiti ha igbu nwa ọhụrụ ọ bụla a ka mụrụ amụ.”
Bible nyere ụkpụrụ dị nnọọ elu. Ọ kụziiri ndị Juu na ụmụaka dị oké ọnụ ahịa—nke a ga-ewere n’ezie dị ka ihe nketa si n’aka Chineke n’onwe ya bịa—nakwa nke a ga-emeso otú ahụ. (Abụ Ọma 127:3) Dị ka ihe àmà gosiri, ọtụtụ ndị biri ndụ kwekọrọ na ndụmọdụ ahụ. Ọbụna asụsụ ha nyere ihe ọmụma dị ukwuu banyere nke a. Edersheim na-ekwu na e wezụga okwu ndị e nwere maka ọkpara na ada, Hibru oge ochie nwere okwu itoolu maka ụmụaka, nke ọ bụla bụ maka oge dị iche ná ndụ. Dị ka ihe atụ, e nwere okwu maka nwa ka na-aṅụ ara na ọzọ maka nke a kwụsịworo ara. Maka ụmụaka ndị metụrụ okenye karị, e nwere okwu na-egosi na ndị a na-esiwanye ike. Maka ndị ntorobịa mere okenye karị, e nwere okwu nke pụtara n’ụzọ nkịtị ‘inwere onwe onye.’ Edersheim na-ekwu, sị: “N’ụzọ e ji n’aka, ndị ji nlezianya otú a leruo anya ná ndụ nwatakịrị iji nye aha na-enye echiche nke oge ọ bụla na-esochi n’ịdị adị ya, aghaghị ịbụworị ndị ha na ụmụ ha nwere njikọ ịhụnanya.”