Sọpụrụ Ụdị Mmadụ Nile
“Sọpụrụnụ mmadụ nile. . . . Na-atụnụ egwu Chineke. Na-asọpụrụnụ eze unu.”—1 PITA 2:17.
1. (a) Òle ndị, e wezụga Chineke na Kraịst ka a na-enye nsọpụrụ kwesịrị ekwesị? (b) N’akụkụ dịgasị aṅaa ka e kwesịrị igosi ụmụ mmadụ nsọpụrụ n’ụzọ kwekọrọ na 1 Pita 2:17?
ANYỊ ahụwo na anyị nwere ibu ọrụ nke inye Jehova Chineke na Jisọs Kraịst nsọpụrụ. Nke ahụ bụ ihe ziri ezi, ihe amamihe dị na ya, na ihe na-egosi ịhụnanya. Ma Okwu Chineke gosikwara na anyị kwesịrị ịsọpụrụ ụmụ mmadụ ibe anyị. A gwara anyị, sị, “Sọpụrụnụ mmadụ nile.” (1 Pita 2:17) Ebe ọ bụ na amaokwu nke a ji iwu ahụ bụ, “na-asọpụrụnụ eze unu” mechie, nghọta dị na ya bụ na e kwesịrị inye ndị nile ruru eru inweta ya nsọpụrụ n’ihi ọnọdụ ha. Ya mere, olee ndị ka anyị kwesịrị ịsọpụrụ? Ọnụ ọgụgụ ndị kwesịrị inweta nsọpụrụ pụrụ ịgụnye ọtụtụ ndị karịa ka ụfọdụ nwere ike iche. Anyị pụrụ ikwu na e nwere akụkụ anọ ebe anyị kwesịrị igosi ndị ọzọ nsọpụrụ.
Sọpụrụ Ndị Ọchịchị
2. Olee ụzọ anyị si mara na “eze” ahụ nke e hotara na 1 Pita 2:17 na-ezo aka n’ebe mmadụ bụla bụ eze ma ọ bụ onye ọchịchị nọ?
2 Nke mbụ n’ime akụkụ ndị a metụtara ọchịchị ụmụ mmadụ. Ọ dị mkpa ka anyị sọpụrụ ndị ọchịchị. Mgbe Pita nyere ndụmọdụ, sị: “Na-asọpụrụnụ eze unu,” n’ihi gịnị ka anyị ji na-ekwu na ihe Pita bu n’uche bụ ndị ọchịchị? Ọ bụ n’ihi na ọ na-ekwu okwu banyere ọnọdụ nke na-abụghị n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. Ọ ka kwusịrị, sị: “Doonụ onwe unu n’okpuru ịbụisi ọ bụla mmadụ debere . . . ma ọ bụ eze, dị ka onye nọ n’ike n’elu unu; ma ọ bụ ndị isi, dị ka ndị a na-ezite site n’aka ya.” Rịbakwa ama na Pita mere ka Chineke guzopụ iche n’ebe “eze” nọ, na-asị: “Na-atụnụ egwu Chineke. Na-asọpụrụnụ eze unu.” (1 Pita 2:13, 14) Ya mere “eze” nke Pita na-agba ume ka anyị sọpụrụ na-ezo aka ná ndị eze bụ mmadụ ma ọ bụ n’ebe ndị ọchịchị nọ.
3. Òle ndị bụ “ndị na-achị isi” ahụ, gịnịkwa bụ ihe ruuru ha?
3 Pọl onyeozi nyekwara iwu yiri nke ahụ, sị: ‘Doonụ onwe unu n’okpuru ndị na-achị isi.’ “Ndị na-achị isi” ndị a abụghị Jehova Chineke ma ọ bụ Jisọs Kraịst, kama ha bụ ndị ọchịchị, ndị isi ọchịchị dị iche iche. N’iburu ihe ndị a n’uche, Pọl gara n’ihu ikwu, sị: “Na-akwụghachinụ mmadụ nile ihe nile unu ji ha n’ụgwọ: . . . sọpụrụnụ onye unu ji ụgwọ nsọpụrụ.” Ee, ndị dị otú ahụ, ndị Chineke kweworo ka ha nwee ike ọchịchị kwesịrị inweta nsọpụrụ.—Ndị Rom 13:1, 7.
4. (a) Olee ụzọ a pụrụ isi gosi ndị ọchịchị nsọpụrụ? (b) Ihe nlereanya dị aṅaa ka Pọl onyeozi setịpụrụ n’igosi ndị na-achị achị nsọpụrụ?
4 Olee ụzọ anyị na-esi egosi ndị ọchịchị nsọpụrụ? Otu ụzọ bụ site n’iji nkwanye ùgwù dị omimi na-emeso ha ihe. (Tụlee 1 Pita 3:15.) N’ihi ọnọdụ ha, ha kwesịkwara inweta nkwanye ùgwù dị otú ahụ ọbụna ma a sị na ha bụ ndị ajọ mmadụ. Onye Rom bụ ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Tacitus kọwara Onye isi bụ Filiks dị ka nwoke nke “chere na ya pụrụ ime ajọ ihe ọ bụla n’enweghị ahụhụ ọ bụla ga-abịara ya.” Ma Pọl ji ụzọ nkwanye ùgwù meghee okwu o ji azara ọnụ ya n’ihu Filiks. N’ụzọ yiri nke ahụ, Pọl ji nkwanye ùgwù gwa Eze Herọd Agripa nke Abụọ, sị, “Agụrụ m onwe m n’onye ngọzi [“obi ụtọ,” NW] dịịrị, na agaje m ịgọpụ onwe m n’ihu gị,” ọ bụ ezie na Pọl maara na Agripa na-ebi n’ọnọdụ na-ezighị ezi nke ya na onye ikwu ya. N’otu aka ahụ, Pọl gosiri Onye isi bụ Festọs nsọpụrụ, na-eji utu aha ahụ bụ “Onye Dị Oké Ebube” na-agwa ya okwu, ọ bụ ezie na Festọs bụ onye na-ekpere arụsị.—Ọrụ 24:10; 26:2, 3, 24, 25.
5. N’ụzọ ọzọ dị aṅaa ka a na-esi egosi ndị ọchịchị nsọpụrụ, oleekwa ụzọ Ndịàmà Jehova na-esi esetịpụ ezi ihe nlereanya n’ime nke a?
5 Ụzọ ọzọ anyị na-esi egosi ndị ọrụ ọchịchị nsọpụrụ bụ nke Pọl onyeozi gosiri mgbe o dere ihe banyere ịkwụghachi ndị ọchịchị ihe e ji ha n’ụgwọ. O kwuru ka ‘a tụọ ụtụ nye onye e ji ụgwọ ụtụ; tụọ ụtụ ahịa nye onye e ji ụgwọ ụtụ ahịa.’ (Ndị Rom 13:7) Ndịàmà Jehova na-akwụghachi ụgwọ dị otú ahụ n’agbanyeghị mba ha bi n’ime ya n’ụwa. N’Itali, akwụkwọ akụkọ bụ La Stampa kwuru, sị: “Ha bụ ụmụ amaala kasị na-eguzosi ike n’ihe nke onye ọ bụla pụrụ ịchọ inwe: ha adịghị ezere ịtụ ụtụ isi ma ọ bụ chọọ ụzọ ha ga-esi zere iwu ndị siiri ha ike maka abamuru nke onwe ha.” Akwụkwọ akụkọ The Post nke Palm Beach, Florida, U.S.A., kwukwara banyere Ndịàmà Jehova, sị: “Ha na-atụ ụtụ isi ha. Ha bụ ụfọdụ n’ime ụmụ amaala kasị na-eme ihe n’eziokwu n’ime Mba nke a.”
Sọpụrụ Ndị Were Mmadụ n’Ọrụ
6. Ndị ọzọ dị aṅaa ka ndị ozi bụ Pọl na Pita kwuru na e kwesịrị inye nsọpụrụ?
6 Akụkụ nke abụọ ebe e kwesịrị inye nsọpụrụ bụ n’ebe dị iche iche anyị na-arụ ọrụ. Ndị ozi ahụ bụ Pọl na Pita mesichara ike mkpa ọ dị ndị Kraịst ịsọpụrụ ndị na-elekọta ha ná mmekọrịta nke ụlọ ọrụ. Pọl dere, sị: “Ka ha hà, bụ́ ndị ohu nke nọ n’okpuru yoke, ha gụọ ndị nwe ha ná ndị kwesịrị nsọpụrụ nile, ka e wee ghara ikwulu aha Chineke na ozizi anyị. Ma ndị nwere ndị kwere ekwe dị ka ndị nwe ha, ka ha ghara ilelị ha anya, n’ihi na ha bụ ụmụnna ha; kama ka ha bụrụ ohu ha karị.” Pita kwukwara, sị: “Ndị na-eje ozi, na-edonụ onwe unu n’okpuru ndị nwe unu n’egwu nile; ọ bụghị nanị n’okpuru ndị bụ ezi mmadụ ndị nwekwara obi ọma, kama ọ bụkwa n’okpuru ndị gbagọrọ agbagọ [“ndị ọ na-esi ike ime ihe ga-atọ ha ụtọ,” NW].—1 Timoti 6:1, 2; 1 Pita 2:18; Ndị Efesọs 6:5; Ndị Kọlọsi 3:22, 23.
7. (a) Olee ụzọ e si etinye ya n’ọrụ n’ụzọ ziri ezi taa, bụ́ ndụmọdụ Bible ahụ nke bụ ka “ndị bụ ohu” na-egosi “ndị nwe” ha nsọpụrụ? (b) Gịnị ka ndị Kraịst e were n’ọrụ, bụ́ ndị nwere ndị Kraịst dị ka ndị were ha n’ọrụ kwesịrị ilezi anya ime?
7 N’eziokwu, ịgba ohu agbasazughị n’ebe nile n’oge a. Ma ụkpụrụ nke duziri ndị Kraịst ná mmekọrịta dị n’etiti ohu na onye nwe ya metụtakwara mmekọrịta dị n’etiti onye e were n’ọrụ na onye were ya n’ọrụ. Otú a, ndị Kraịst bụ ndị e were n’ọrụ nwere ibu ọrụ nke igosi nsọpụrụ nye ọbụna ndị nwe ọrụ, bụ́ ndị ọ na-esi ike ime ihe ga-atọ ha ụtọ. Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na onye ahụ nwe ọrụ abụrụkwa onye kwere ikwe ibe ya? Kama ịtụ anya inweta mmeso pụrụ iche ma ọ bụ ịchọ ka e meere ya ihe karịrị ka a na-emere ndị ọzọ n’ihi mmekọrịta ahụ, onye ahụ e were n’ọrụ kwesịrị ijere onye Kraịst were ya n’ọrụ ozi ọbụna n’ụzọ dị mma karị, na-aghara irigbu ya n’ụzọ ọ bụla.
Nsọpụrụ n’Ime Ezinụlọ
8, 9. (a) Olee ndị e nyere ụmụntakịrị iwu inye nsọpụrụ? (b) N’ihi gịnị ka ụmụntakịrị kwesịrị iji gosi nsọpụrụ nke a, oleekwa ụzọ ha pụrụ isi gosi ya?
8 Akụkụ nke atọ ebe e kwesịrị igosi nsọpụrụ bụ n’ime ezinụlọ. Dị ka ihe atụ, ụmụ nwere ibu ọrụ nke ịsọpụrụ ndị mụrụ ha. Ọ bụghị nanị na nke a bụ ihe Iwu ahụ e nyere Mosis chọrọ ha n’aka, kama ọ bụkwa ibu ọrụ nye ndị Kraịst. Pọl onyeozi dere, sị: “Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ime Onyenwe anyị: n’ihi na nke a bụ ihe ziri ezi. Sọpụrụ nna gị na nne gị.”—Ndị Efesọs 6:1, 2; Ọpụpụ 20:12.
9 N’ihi gịnị ka ụmụntakịrị kwesịrị iji sọpụrụ ndị mụrụ ha? Ha kwesịrị ịsọpụrụ ha n’ihi ikike Chineke nyeworo ndị mụrụ ha, nakwa n’ihi ihe ndị mụrụ ha meworo, na-akpata ọmụmụ ha, na-elekọta ha, na-azụkwa ha site na mgbe ha dị na nwata gaa n’ihu. Olee ụzọ ụmụntakịrị kwesịrị isi sọpụrụ ndị mụrụ ha? Ha kwesịrị ime nke a karịsịa site n’irubere ha isi, dookwa onwe ha n’okpuru ha. (Ilu 23:22, 25, 26; Ndị Kọlọsi 3:20) Inye nsọpụrụ dị otú ahụ pụrụ ịchọ ka ụmụntakịrị ndị toworo eto nyekwuo nkwado, ma nke ihe onwunwe ma nke ime mmụọ, nye ndị mụrụ ha ma ọ bụ ndị mụrụ ndị mụrụ ha, bụ́ ndị meworo agadi. E kwesịrị iji amamihe mee nhazi n’etiti nke a na ibu ọrụ ndị ọzọ, dị ka mmadụ ilekọta ụmụ nke aka ya na ikere òkè zuru ezu ná mkpakọrịta ndị Kraịst na ije ozi ubi.—Ndị Efesọs 5:15-17; 1 Timoti 5:8; 1 Jọn 3:17.
10. Òle ndị ka ndị bụ nwunye nwere ibu ọrụ nke igosi nsọpụrụ, oleekwa ụzọ ndị ha pụrụ isi mee nke a?
10 Ma ọ bụghị nanị ụmụntakịrị bụ ndị nọ n’ime ezinụlọ ndị nwere ibu ọrụ nke igosi ndị ọzọ nsọpụrụ. Ndị bụ nwunye ga-enye di ha nsọpụrụ. Pọl onyeozi kwukwara na ‘onye bụ nwunye kwesịrị ịdị na-atụ egwu di ya.’ (Ndị Efesọs 5:33; 1 Pita 3:1, 2) O doro anya na ‘ịtụ egwu’ ndị bụ di gụnyere inye ha nsọpụrụ. Sera sọpụụrụ di ya bụ Abraham mgbe ọ kpọrọ ya “onyenwe ya.” (1 Pita 3:6) Ya mere ndị bụ nwunye, ṅomienụ Sera. Na-enyenụ ndị bụ di unu nsọpụrụ site n’ịnakwere mkpebi ha na ịrụ ọrụ iji mee ka ha gaa nke ọma. Site n’ime ihe nile unu pụrụ ime iji nyere ndị bụ di unu aka ibu ibu dịkwasịrị ha, kama ịtụkwasị ihe n’ibu ndị a, unu na-egosi ha nsọpụrụ.
11. N’ihe banyere igosi nsọpụrụ, ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị bụ di nwere, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
11 Gịnị banyere ndị bụ di? E nyere ha ndụmọdụ n’Okwu Chineke, sị: “Ndị bụ di, otú ahụ, soonụ nwunye unu bikọọ n’ụzọ ihe ọmụma, na-ekenye ihe bụ nwanyị nsọpụrụ, dị ka onye na-adịghị ike karị, dị ka unu na ha bụkwa ndị na-eketakọ amara nke bụ ndụ; ka e wee ghara igbochi ekpere unu.” (1 Pita 3:7) Nke ahụ kwesịrị nnọọ ime ka onye ọ bụla bụ di chee echiche. O yiri ka à ga-asị na e dekwasịrị n’ahụ onye bụ nwunye akara bụ “Ihe dị oké ọnụ. Ihe na-esighị ike karị. Jiri nlezianya jide ya! Nye ya nsọpụrụ!” Ya mere ka ndị bụ di cheta na ọ gwụlakwa ma ha nyere ndị bụ nwunye ha nsọpụrụ site n’ilebara ha anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ha ga-emebi mmekọrịta ha na Jehova Chineke, n’ihi na a ga-egbochi ekpere ha. N’eziokwu, ọ na-abara mmadụ nile uru ka ndị nọ n’ezinụlọ na-egosirịta ibe ha nsọpụrụ.
N’ime Ọgbakọ
12. (a) Olee ndị nwere ibu ọrụ nke igosi nsọpụrụ n’ime ọgbakọ? (b) Olee ụzọ Jisọs si gosi na o kwesịrị ekwesị ịnata nsọpụrụ?
12 E nwekwara ibu ọrụ nke onye ọ bụla nwere igosi nsọpụrụ n’ime ọgbakọ ndị Kraịst. E nyere anyị ndụmọdụ, sị: “Na-ebutenụ ụzọ n’igosirịta ibe unu nsọpụrụ.” (Ndị Rom 12:10, NW) Jisọs mere ka ọ pụta ìhè n’otu n’ime ihe atụ ya na ọ bụ ihe kwesịrị ekwesị ịnara nsọpụrụ. O kwuru na mgbe a kpọrọ anyị òkù ịbịa n’oriri, anyị kwesịrị iwere ọnọdụ dị ala karịsịa, n’ihi na mgbe ahụ, onye kpọrọ anyị òkù ga-agwa anyị ka anyị jee were ọnọdụ dị elu karị, anyị ga-enwetakwa nsọpụrụ n’ihu ndị ọbịa ibe anyị nile. (Luk 14:10) Ugbu a, ebe ọ na-amasị anyị nile ịbụ ndị e nyere nsọpụrụ, ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe mmetụta wee na-enyerịta ibe anyị nsọpụrụ? Olee ụzọ anyị pụrụ isi mee nke a?
13. Gịnị bụ ụzọ ụfọdụ anyị pụrụ isi gosi ndị ọzọ nọ n’ime ọgbakọ nsọpụrụ?
13 Okwu ekele e kwuru maka ọrụ a rụrụ nke ọma pụtara inye nsọpụrụ. Ya mere anyị pụrụ inyerịta ibe anyị nsọpụrụ site n’ikwu okwu ịja mma, ma eleghị anya n’ihi okwu mmadụ kwuru ma ọ bụ ajụjụ ọ zara n’ime ọgbakọ. Tụkwasị na nke ahụ, anyị pụrụ inyerịta ibe anyị nsọpụrụ site n’iji obi dị umeala kee onwe anyị ekike n’ebe ụmụnna nwoke na ndị nwanyị ndị Kraịst nọ, site n’iji nkwanye ùgwù dị omimi na-emeso ha ihe. (1 Pita 5:5) Anyị si otú a na-egosipụta na anyị ji ha kpọrọ ihe dị ka ndị ohu Jehova Chineke ibe anyị ndị kwesịrị nsọpụrụ.
14. (a) Olee ụzọ ụmụnna nwoke ndị nọ n’ọgbako pụrụ isi gosi ụmụnna nwanyị nsọpụrụ ruuru ha? (b) Gịnị na-egosi na inye onyinye bụ otu ụzọ e si egosi nsọpụrụ?
14 Pọl onyeozi nyere nwa okoro ahụ bụ Timoti ndụmọdụ ka o mesoo ụmụnna nwanyị ndị Kraịst meworo agadi ihe dị ka ndị bụ nne, ndị bụkwa ụmụ agbọghọ dị ka ụmụnne ndị nwanyị, “n’ịdị ọcha nile.” Ee, mgbe ụmụnna nwoke leziri anya ka ha ghara imeso ụmụnna ha nwanyị bụ ndị Kraịst ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, dị ka site n’igwusị ha egwu n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị, ha na-egosi ha nsọpụrụ. Pọl gara n’ihu ide, sị: “Na-asọpụrụ ndị inyom di ha nwụrụ, bụ́ ndị nọ n’ezie n’ọnọdụ ndị inyom di ha nwụrụ.” Otu ụzọ a ga-esi enye nwanyị di ya nwụrụ nsọpụrụ bụ site n’inye ya nkwado nke ihe onwunwe. Ma iji bụrụ onye ruru eru maka nke a, ọ ghaghị ịbụ “onye a na-agbara ya ezi àmà n’ọrụ ọma.” (1 Timoti 5:2-10) N’ihe banyere onyinye nke ihe onwunwe, Luk dere banyere ndị bi n’agwaetiti nke Malta, sị: “Ha wee werekwa ọtụtụ nsọpụrụ [“onyinye,” NW] sọpụrụ anyị; mgbe anyị nupụrụ ụgbọ, ha wee tinye n’ụgbọ ihe nile dị anyị mkpa.” (Ọrụ 28:10) Otú a, a pụrụ igosi onye ọzọ nsọpụrụ site n’inye ya onyinye ihe onwunwe.
15. (a) N’ebe òle ndị nọ ka anyị nwere ibu ọrụ pụrụ iche igosi nsọpụrụ? (b) Gịnị bụ otu ụzọ anyị pụrụ isi gosi ndị na-edu ndú nsọpụrụ?
15 N’ịga n’ihu n’akwụkwọ ozi o degaara Timoti, Pọl dere, sị: “Ka a gụọ ndị okenye ná ndị kwesịrị nsọpụrụ okpukpu abụọ, bụ́ ndị na-achị isi nke ọma, ma nke kachasịnụ ndị na-adọgbu onwe ha n’ọrụ n’ime okwu Chineke na ozizi.” (1 Timoti 5:17) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ isi sọpụrụ ndị okenye ma ọ bụ ndị nlekọta? Pọl kwuru, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi m, dị ka mụ onwe m bụkwa onye na-eṅomi Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 11:1) Mgbe anyị gere okwu Pọl ntị ịghọ ndị na-eṅomi ya, anyị na-enye ya nsọpụrụ. Nke a metụtakwara ndị ahụ na-edu ndú n’etiti anyị taa. Ruo n’ókè anyị na-eṅomi ha, site n’ịgbaso ihe nlereanya ha, anyị ga na-enye ha nsọpụrụ.
16. N’ụzọ ndị ọzọ dịgasị aṅaa ka a pụrụ isi gosi ndị na-edu ndú nsọpụrụ?
16 Ụzọ ọzọ anyị na-esi egosi ndị nlekọta nsọpụrụ bụ site n’ịnara agbamume ahụ bụ: “Na-ekwenyenụ ndị isi unu [“ndị na-edu ndú n’etiti unu,” NW], na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha: n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu.” (Ndị Hibru 13:17) N’otu ụzọ ahụ ụmụntakịrị na-asọpụrụ ndị mụrụ ha site n’irubere ha isi, otú ahụ ka anyị na-asọpụrụ ndị na-edu ndú n’etiti anyị site n’irubere ha isi, na-edokwa onwe anyị n’okpuru ha. Dịkwa ka ndị obi ọma ahụ bi na Malta gosiri Pọl na ndị ya na ha so nsọpụrụ site n’inye ha onyinye ihe onwunwe, e gosiwokwa ọtụtụ ndị nnọchianya Society na-ejeghari ejeghari nsọpụrụ n’ụzọ dị otú a ọtụtụ mgbe. Ma, ọ dịghị mgbe ha kwesịrị iji ọnụ ha kwuo ka e nye ha onyinye ndị dị otú a ma ọ bụ gosi na ọ ga-amasị ha ịnata ya ma ọ bụkwanụ na ọ dị ha mkpa.
17. Ibu ọrụ dị aṅaa ka ndị nwere ihe ùgwù nke nlekọta nwere n’ihe banyere igosi nsọpụrụ?
17 N’aka nke ọzọ, ndị nile nọ n’ọnọdụ nlekọta n’ime nzukọ ọchịchị Chineke—ma ọ bụ n’ime ọgbakọ, n’ime sekit ma ọ bụ distrikti dị ka onye nlekọta na-ejeghari ejegharị, n’otu n’ime alaka ụlọ ọrụ dị iche iche nke Watch Tower Society, ma ọ bụ n’ime ezinụlọ—nwere ibu ọrụ nke igosi ndị ha na-elekọta nsọpụrụ. Nke a chọrọ ’aka ha inwe ọmịiko na mmetụta n’ebe ndị ọzọ nọ. Ọ dị mkpa ka ha bụrụ ndị a pụrụ ịbịakwute mgbe nile, na-abụ ndị dị nwayọọ na ndị wedara onwe ha ala n’obi na n’uche, dị ka Jisọs Kraịst kwuru na ya onwe ya bụ.—Matiu 11:29, 30.
Rụọ Ọrụ Iji Wee Nwee Ike Ịsọpụrụ Ndị Ọzọ
18. (a) Gịnị pụrụ igbochi anyị igosi ndị ahụ kwesịrị ekwesị nsọpụrụ? (b) N’ihi gịnị ka a na-enweghị ihe a pụrụ iji kwadoo inwe echiche na-ezighị ezi nke na-achọpụtakarị mmejọ?
18 Ọ dị anyị nile mkpa ịrụsi ọrụ ike iji wee na-asọpụrụ ibe anyị, n’ihi na e nwere ihe dị ike nke na-egbochi anyị ime otú ahụ. Ihe mgbochi, ma ọ bụ ihe ahụ nọchiri ụzọ, bụ obi anyị nke na-ezughị ókè. Bible na-asị, “Nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata.” (Jenesis 8:21) Otu n’ime àgwà mmadụ nke pụrụ igbochi anyị igosi ndị ọzọ nsọpụrụ kwesịịrị ha bụ inwe echiche na-ezighị ezi, nke na-achọpụtakarị mmejọ. Anyị nile bụ mmadụ ndị na-adịghị ike, ndị na-ezughị okè, na-enwe mkpa nke ebere na obi ọma na-erughịrị mmadụ nke Jehova. (Ndị Rom 3:23, 24) N’ịghọta nke a, ka anyị lezie anya ka anyị ghara ilekwasịkarị anya n’adịghị ike nile nke ụmụnna anyị ma ọ bụ na-enyo ihe bụ nzube ụmụnna anyị enyo.
19. Gịnị ga-enyere anyị aka iguzogide àgwà na-ezighị ezi?
19 Ihe ngwọta dịịrị àgwà na-ezighị ezi dị otú ahụ bụ ịhụnanya na njide onwe onye. Ọ dị mkpa ka anyị nwee àgwà ọmịiko, nke iguzosi ike n’ihe, na nke ziri ezi n’ihe banyere ụmụnna anyị, na-arịba ama àgwà ọma ndị ha nwere. Ọ bụrụ na ọ dị ihe anyị na-aghọtaghị, ka anyị dị njikere mgbe nile ikwere ihe ụmụnna anyị kwuru n’enyoghị ha enyo ruo mgbe anyị ghọtara ma o ziri ezi ma ọ bụ na o zighị ezi, ma gbasoo ndụmọdụ Pita, bụ́: “Nke bụ isi ihe nile meenụ ka ịhụnanya ahụ unu na-ahụrịta onwe unu dị ike; n’ihi na ịhụnanya na-ekpuchi ọtụtụ mmehie.” (1 Pita 4:8) Anyị aghaghị inwe ụdị ịhụnanya ahụ ma ọ bụrụ na anyị ga-enye ụmụnna anyị nsọpụrụ nke ha kwesịrị inweta.
20, 21. (a) Gịnị bụ àgwà ọzọ nke pụrụ igbochi anyị igosirịta ibe anyị nsọpụrụ? (b) Gịnị ga-enyere anyị aka iguzogide àgwà nke a?
20 Àgwà ọzọ nke pụkwara igbochi anyị igosi ndị ọzọ nsọpụrụ ruuru ha bụ àgwà ahụ nke ịbụ ndị ihe na-emetụtakarị n’ahụ, ma ọ bụ ịdị na-ahụchatacha ihe nile n’ụzọ na-ezighị ezi. Àgwà nke ịhụchatacha ihe nile nwere ọnọdụ kwesịịrị ya. Ndị omenka aghaghị ịdị na-ahụchatacha ihe n’ihe banyere ụda ma ọ bụ àgwà ihe dị iche iche dị ka otu akụkụ nke ọrụ ha. Ma ịhụchatacha ihe nile, ma ọ bụ ịbụ onye ihe na-emetụtakarị n’ahụ, ná mmekọrịta anyị na ndị ọzọ bụ otu ụdị nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, bụ́ nke pụrụ ịnapụ anyị udo anyị, na-egbochikwa anyị igosi ndị ọzọ nsọpụrụ.
21 Okwu ndị ahụ dị n’Eklisiastis 7:9 na-enye anyị ezi okwu ndụmọdụ n’ihe banyere nke a, sị: “Ekwela ka a kpasuo gị iwe ọsọ ọsọ n’ime mmụọ gị: n’ihi na mkpasu iwe nwere ọnọdụ ya n’obi ndị nzuzu.” Ya mere, ọ na-egosi enweghị amamihe na ezi echiche, nakwa enweghị ịhụnanya, ịbụ onye na-ahụchatacha ihe nile n’ụzọ na-ezighị ezi ma ọ bụ onye a na-akpasu iwe ngwa ngwa. Anyị aghaghị ịnọ na nche ka ọchịchọ anyị nile na-ezighị ezi, ndị dị ka iche echiche na-ezighị ezi, ịbụ ndị na-emekarị nkatọ, ma ọ bụ ịgbalị ịhụchatacha ihe nile n’ụzọ na-ezighị ezi, gbochie anyị inye ndị nile nsọpụrụ ruuru ha.
22. Olee ụzọ a pụrụ isi chịkọta ibu ọrụ anyị nwere igosi nsọpụrụ?
22 N’eziokwu, anyị nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji gosi ndị ọzọ nsọpụrụ. Dịkwa ka anyị hụworo e nwere ọtụtụ ụzọ anyị pụrụ isi gosi nsọpụrụ dị otú ahụ. Anyị aghaghị ịnọ na nche mgbe nile ka àgwà ịchọ ọdịmma onwe onye nanị ma ọ bụ nke na-ezighị ezi ghara igbochi anyị igosi nsọpụrụ. Karịsịa, ọ dị mkpa ka anyị lezie anya igosi ndị nọ n’ime ezinụlọ anyị nsọpụrụ, ndị di na nwunye nyerịta ibe ha, ndị bụ ụmụ nyekwa ndị mụrụ ha. N’ime ọgbakọ, anyị nwekwara ibu ọrụ nke igosi ndị anyị na ha na-efekọ ofufe nsọpụrụ, karịsịakwa, nye ndị ahụ na-arụsi ọrụ ike n’etiti anyị n’ọnọdụ dị iche iche nke nlekọta. N’akụkụ ndị a nile, ọ bụ ihe ga-abara anyị uru igosi nsọpụrụ kwesịrị ekwesị nye ndị ahụ e hotara n’elu, ebe ọ bụ na dị ka Jisọs kwuru: “Ọ dị ngọzi [“obi ụtọ,” NW] inye ihe karị ịnara ihe.”—Ọrụ 20:35.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ N’ihi gịnị, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa ka anyị kwesịrị isi nye ndị ọchịchị nsọpụrụ?
◻ Ndụmọdụ Bible dị aṅaa ka a pụrụ itinye n’ọrụ ná mmekọrịta nke onye e were n’ọrụ na onye were ya n’ọrụ?
◻ Olee ụzọ e kwesịrị isi gosi nsọpụrụ n’ime ezinụlọ?
◻ Nsọpụrụ dị aṅaa nke pụrụ iche ka a pụrụ igosi n’ime ọgbakọ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
◻ Olee ụzọ a pụrụ isi merie adịghị ike dị iche iche nke mmadụ n’ihe banyere enyeghị ndị ọzọ nsọpụrụ?