Ido Onwe Anyị n’Okpuru Ndị Na-achị Isi n’Ụzọ A Kpaara Ókè
“N’ihi ya ọ dị mkpa ido onwe unu n’okpuru ya.”—NDỊ ROM 13:5.
1. Ahụmahụ ọjọọ dịgasị aṅaa ka Ndịàmà Jehova nwetara n’aka ndị ọchịchị Nazi, nke a ọ̀ bụkwa n’ihi ‘ime ihe ọjọọ’?
NA JANUARY 7, 1940, e ji ígwè guillotine a na-eji ebepụ mmadụ isi wee gbuo Franz Reiter na ụmụ okoro ise ndị ọzọ bụ ndị Austria. Ha bụ Bibelforscher, ya bụ Ndịàmà Jehova, ha nwụkwara n’ihi na akọ na uche ha apụghị ikwe ka ha bulie ngwá agha iji kwadoo Ọchịchị nke Hitler. Reiter bụ otu n’ime ọtụtụ puku Ndịàmà ndị nwụrụ n’ihi okwukwe ha n’oge agha ụwa nke abụọ ahụ. Ọtụtụ ndị ọzọ nọrọ ọtụtụ afọ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche. Ndị a nile hà tara ahụhụ site ná “mma agha” nke ndị ọchịchị Nazi ahụ n’ihi na ha “na-eme ihe ọjọọ”? (Ndị Rom 13:4) Ọ dịghị ma ọlị! Okwu Pọl gara n’ihu ikwu na-egosi na ndị Kraịst ndị a rubere isi n’ihe Chineke nyere n’iwu ná Ndị Rom isi 13, ọ bụ ezie na ha tara ahụhụ n’aka ndị ọchịchị.
2. Gịnị bụ ihe dị mkpa nke mere mmadụ ga-eji doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi?
2 Ná Ndị Rom 13:5, onyeozi ahụ dere, sị: “N’ihi ya ọ dị mkpa ido onwe unu n’okpuru ya, ọ bụghị nanị n’ihi iwe ahụ, kama ọ bụkwa n’ihi akọ na uche.” Tupu mgbe ahụ, Pọl kwuru na obubu ndị ọchịchị na-ebu “mma agha” bụ ezi ihe kpatara mmadụ ga-eji doo onwe ya n’okpuru ya. Ma ugbu a, o nyere ihe siri ike karị a ga-eji mee ya: akọ na uche. Anyị na-agbalịsi ike ijere Chineke ozi site “n’akọ na uche dị ọcha.” (2 Timoti 1:3) Bible na-agwa anyị ka anyị doo onwe anyị n’okpuru ndị na-achị isi, anyị na-erubekwa isi n’ihi na anyị chọrọ ime ihe ziri ezi n’anya Chineke. (Ndị Hibru 5:14) N’eziokwu, akọ na uche anyị e ji Bible zụọ na-akwali anyị irubere ọchịchị isi ọbụna mgbe ọ na-adịghị mmadụ nọ nso ile ihe anyị na-eme.—Tụlee Eklisiastis 10:20.
“Ọ Bụ n’Ihi Nke a Ka Unu Na-atụkwa Ụtụ”
3, 4. Aha ọma dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova nwere, n’ihi gịnịkwa ka ndị Kraist kwesịrị iji na-atụ ụtụ isi?
3 Na Nigeria n’afọ ole na ole gara aga, e nwere ọgba aghara dị iche iche n’ihe banyere ịtụ ụtụ isi. Ọtụtụ mmadụ nwụrụ, ndị ọchịchị kpọbatakwara ndị agha n’okwu ahụ. Ndị soja banyere n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze ebe nzukọ na-aga n’ihu wee kwuo na ha chọrọ ịma ihe bụ nzube nke nnọkọ ahụ. Mgbe ha chọpụtara na ọ bụ nnọkọ ọmụmụ Bible nke Ndịàmà Jehova, onye ọfisa na-elekọta ndị agha ahụ gwara ndị soja ahụ ka ha pụọ, na-asị: “Ndịàmà Jehova abụghị ndị na-akpata ọgba aghara n’ihi ụtụ isi.”
4 A maara Ndịàmà ahụ bụ ndị Nigeria nke ọma n’ihi ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’okwu Pọl, bụ: “N’ihi na ọ bụ n’ihi nke a ka unu na-atụkwa ụtụ; n’ihi na ha bụ ndị na-efe Chineke ofufe, na-anọgidesi ike n’ọrụ ha ime otu ihe a.” (Ndị Rom 13:6) Mgbe Jisọs nyere ụkpụrụ nduzi ahụ bụ, ‘Kwụghachi Siza ihe nke Siza,’ ọ na-ekwu okwu banyere ịtụ ụtụ isi. (Matiu 22:21) Ọ bụ ndị ọchịchị na-arụ ụzọ, na-enye nchebe ndị uwe ojii, na-ewu ebe ndebe akwụkwọ ọha dị iche iche, na-ahazikwa usoro ịga njem, na-ewu ụlọ akwụkwọ, ụlọ nzipụ ozi, na-emekwa ọtụtụ ihe ndị ọzọ. Ọtụtụ mgbe, anyị na-eji ihe ndị a eme ihe. Ọ bụ nnọọ ihe ziri ezi na anyị kwesịrị ịkwụ ụgwọ maka ha site n’ụtụ isi anyị.
“Na-akwụghachinụ Mmadụ Nile Ihe Nile Unu Ji Ha n’Ụgwọ”
5. Gịnị ka okwu ahụ pụtara nke bụ “na-akwụghachinụ mmadu nile ihe nile unu ji ha n’ụgwọ”?
5 Pọl gara n’ihu, sị: “Na-akwụghachinụ mmadụ nile ihe nile unu ji ha n’ụgwọ: tụọnụ ụtụ nye onye unu ji ụgwọ ụtụ; tụọnụ ụtụ ahịa nye onye unu ji ụgwọ ụtụ ahịa; tụọnụ egwu onye unu ji ụgwọ egwu; sọpụrụnụ onye unu ji ụgwọ nsọpụrụ.” (Ndị Rom 13:7) Okwu ahụ bụ “mmadụ nile” jikọtara onye ọchịchị nkịtị ọ bụla nke bụ onye na-ejere Chineke ozi n’ebe ọha mmadụ nọ. E nweghị ndị ọ bụla a gụpụrụ. Ọbụna ma a sị na anyị na-ebi n’okpuru usoro ọchịchị nke na-amasịghị anyị n’onwe anyị, anyị na-atụ ụtụ isi. Ọ bụrụ na a dịghị ana okpukpe dị iche iche ụtụ isi n’ebe anyị bi, ọgbakọ dị iche iche pụrụ iji ohere nke a mere ihe. Dịkwa ka ụmụ amaala ndị ọzọ, ndị Kraịst pụrụ iji ndokwa ọ bụla iwu kwadoro mee ihe, bụ́ ndị e mere iji belata ụtụ isi ha na-akwụ. Ma ọ dịghị onye Kraịst ọ bụla kwesịrị izere ịtụ ụtụ isi n’ụzọ megidere iwu.—Tụlee Matiu 5:41; 17:24-27.
6, 7. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji na-atụ ụtụ isi ọbụna ma a sị na e ji ego ahụ na-akwado ihe ndị anyị na-ekwenyereghị ma ọ bụ ọbụna ma ọ bụrụ na ndị ọchịchị ahụ na-akpagbu anyị?
6 Ma, a sịkwanụ na ụtụ isi ahụ eyie nke ikpe ziri ezi na-adịghị na ya? Ma ọ bụ, gịnị ma ọ bụrụ na e ji akụkụ ụfọdụ nke ego ụtụ isi ahụ na-akwado ihe anyị na-ekwenyeghị na ya, dị ka isikwopụrụ ndị mmadụ afọ ime n’anaghị ego, iwu ebe ndọkọba ọbara, ma ọ bụ ịkwado usoro ihe omume ndị megidere echiche nnọpụiche anyị? Anyị ka na-atụkwa ụtụ isi anyị nile. Ọ ghaghị ịbụ ndị ọchịchị ga-ekpebi otú ha ga-esi jiri ego ụtụ isi mee ihe. E nyeghị anyị ọrụ ikpe ọchịchị ikpe. Ọ bụ Chineke bụ “Onyeikpe nke ụwa,” mgbe oge ya rukwara, ọ ga-esoro ọchịchị dị iche iche mee mpịazi n’ihe banyere otú ha siworo jiri ike ọchịchị ha mee ihe. (Abụ Ọma 94:2; Jeremaịa 25:31) Ruo mgbe nke ahụ mere, anyị ga na-atụ ụtụ isi anyị.
7 Gịnịkwanụ ma ọ bụrụ na ọchịchị ahụ na-akpagbu anyị? Anyị ka ga na-atụ ụtụ isi anyị n’ihi ozi ọchịchị na-ejere anyị kwa ụbọchị. N’ihe banyere Ndịàmà ndị na-anata mkpagbu n’otu mba dị n’Africa, akwụkwọ akụkọ San Francisco bụ Examiner sịrị: “Ị pụrụ ile ha anya dị ka ụmụ amaala ndị bụ ezi ihe nlereanya. Ha nọgidere na-atụ ụtụ isi ha, na-elekọta ndị ọrịa, na-ebuso amaghị akwụkwọ agha.” Ee, Ndịàmà ahụ a na-akpagbu tụrụ ụtụ isi ha.
“Egwu” na “Nsọpụrụ”
8. Gịnị bu “egwu” nke anyị na-enye ọchịchị?
8 “Egwu” ahụ e kwuru okwu ya ná Ndị Rom 13:7 abụghị ụjọ na-enweghị isi, kama ọ bụ ùgwù a na-akwanyere ike ọchịchị nkịtị, ụjọ a na-atụ imebi iwu ya. Nkwanye ùgwù nke a bụ nke a na-enye n’ihi ọnọdụ o metụtara, ọ naghị abụkebe n’ihi mmadụ nke nọ n’ọnọdụ ahụ. Mgbe Bible na-ekwu okwu n’ụzọ amụma banyere onye ọchịchị alaeze Rom bụ Taịbiriọs, ọ kpọrọ ya “onye e ledara anya.” (Daniel 11:21) Ma ọ bụ onye ọchịchị alaeze ahụ, n’ihi nke ahụkwa, onye Kraịst ga-ejiworị ya ụgwọ egwu na nsọpụrụ.
9. Olee ụzọ ụfọdụ anyị na-esi enye ndị ọchịchị bụ mmadụ nsọpụrụ?
9 N’ihe banyere inye nsọpụrụ, anyị na-agbaso iwu ahụ Jisọs nyere ịghara inye utu aha ndị dabeere n’ọkwá okpukpe. (Matiu 23:8-10) Ma mgbe a bịara n’ihe banyere ndị ọchịchị nkịtị, anyị na-enwe obi ụtọ n’ịkpọ ha utu aha ọ bụla a chọrọ iji nye ha nsọpụrụ. Pọl jiri utu aha ahụ bụ “onye dị oké ebube” mee ihe mgbe ọ na-agwa ndị ọchịchị Rom okwu. (Ọrụ 26:25) Daniel kpọrọ Nebukadneza “onyenwe m.” (Daniel 4:19) Taa, ndị Kraịst pụrụ iji okwu ndị dị ka “Onyenwe Mmadụ” ma ọ bụ “Onye Dị Ebube” mee ihe. Ha pụrụ ibili ọtọ mgbe onye ọkà ikpe batara n’ụlọikpe ma ọ bụ jiri nkwanye ùgwù hulata isi n’ihu onye na-achị achị ma ọ bụrụ na ọ bụ omenala dị n’ebe ahụ.
Ido Onwe Onye n’Okpuru n’Ụzọ A Kpaara Ókè
10. Olee ụzọ Jisos si gosi na e nwere ịkpa ókè dịịrị ihe ndị ọchịchị bụ mmadụ pụrụ ịchọ n’aka onye Kraịst?
10 Ebe ọ bụ na Ndịàmà Jehova na-edo onwe ha n’okpuru ndị ọchịchị bụ mmadụ, n’ihi gịnị ka Franz Reiter na ọtụtụ ndị ọzọ ji taa ahụhụ dị ka ha si taa? Ọ bụ n’ihi na ido onwe anyị n’okpuru bụ n’ụzọ a kpaara ókè, ndị ọchịchị adịghị amatakwa mgbe nile na e nwere ókè ndị Bible kpara n’ihe ndị ha pụrụ ịchọ n’aka mmadụ. Ọ bụrụ na ọchịchị achọọ ka mmadụ nye ya ihe megidere akọ na uche onye Kraịst a zụrụ azụ, ọ bụ ịgabiga ókè ahụ Chineke kpaara ya. Jisọs gosiri nke a mgbe ọ sịrị: “Nyeghachinụ Siza ihe nke Siza, nyeghachikwanụ Chineke ihe nke Chineke.” (Matiu 22:21) Mgbe Siza chọrọ ka e nye ya ihe bụ nke Chineke, anyị aghaghị ịmata na ọ bụ Chineke ka e kwesịrị ibu ụzọ kenye òkè.
11. Ụkpụrụ dị aṅaa nke na-egosi na e nwere ịkpa ókè ndị dịịrị ihe ndị ọchịchị bụ mmadụ pụrụ ịchọ n’aka mmadụ ka a na-anakwere ebe nile?
11 Ọnọdụ nke a ọ̀ bụ ịgba mgba okpuru ma ọ bụ nke aghụghọ? Ọ dịghị ma ọlị. N’ezie, ọ bụ mgbasapụ nke ụkpụrụ ahụ ihe ka ọtụtụ ná mba ndị mepeworo anya nakweere. N’ime narị afọ nke iri na ise, a kpọpụrụ otu onye aha ya bụ Peter von Hagenbach n’ụlọikpe n’ihi ịmalite ọchịchị na-eyi mmadụ egwu n’ókèala Europe ebe ọ na-achị. A nakwereghị ihe ngọpụ ya nke bụ na ihe ya na-eme bụ nanị ịgbaso iwu nke nna ya ukwu, bụ́ onye Duke nke Burgundy, nyere ya. E mewo nzọrọ ahụ ọtụtụ ugbo eri mgbe ahụ, nke bụ na mmadụ nke na-eme omume arụrụala dị iche iche agaghị aza ajụjụ ọ bụla ma ọ bụrụ na ọ na-agbaso iwu onye nọ n’ọkwá ka elu nyere ya—ndị meworo nzọrọ ahụ n’ụzọ kasị ukwuu bụ ndị Nazi mere mpụ n’oge agha, mgbe ha nọ n’ihu Ụlọikpe Mba Nile ahụ dị na Nuremberg. Nzọrọ dị otú ahụ na-abụkarị nke a na-anakwereghị. Ụlọikpe Mba Nile ahụ kwuru ná mkpebi ikpe ya, sị: “Ndị mmadụ n’otu n’otu nwere ọrụ dịịrị ha ná mba nile, bụ́ nke dị elu karịa ibu ọrụ nke irubere mba nke aka ha isi, bụ́ nke otu mba nyere ha.”
12. Olee ihe atụ Akwụkwọ nsọ dị iche iche e nwere nke ndị ohu Chineke ndị jụrụ irube isi n’ihe ndị ezi uche na-adịghị na ha ndị ọchịchị gwara ha ka ha mee?
12 Ndị ohu Chineke anọwo mgbe nile na-amata na e nwere ịkpa ókè n’ụgwọ ha ji, dị ka akọ na uche ha si dị, ido onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi. N’ihe dị ka oge ahụ a mụrụ Mosis n’Ijipt, Fero nyere ndị inyom Hibru abụọ na-ele ime iwu ka ha gbuo ụmụ nwoke ndị Hibru nile a mụrụ ọhụrụ. Otú ọ dị, ndị inyom ahụ na-ele ime chebere ụmụntakịrị ahụ ndụ. Hà mere ihe ọjọọ n’inupụrụ Fero isi? Ee e, ha gbasoro akọ na uche Chineke nyere ha, Chineke gọzikwara ha n’ihi ya. (Ọpụpụ 1:15-20) Mgbe Israel nọ ná ndọta n’agha na Babilọn, Nebukadneza kwuru ka ndị ozi ya, gụnyere ndị Hibru ahụ bụ Shedrak, Mishak, na Abednego, kpọọ isiala n’ihu ihe oyiyi nke o debeworo na ndagwurugwu Dura. Ndị Hibru atọ ahụ jụrụ ajụ. Hà mere ihe na-ezighị ezi? Ee e, ebe ọ bụ na ịgbaso ihe ahụ eze nyere n’iwu ga-apụtaworị inupụrụ iwu Chineke isi.—Ọpụpụ 20:4, 5; Daniel 3:1-18.
‘Rubere Chineke Isi Dị Ka Onye Ọchịchị’
13. Ihe nlereanya dị aṅaa ka ndị Kraịst oge mbụ setịpụrụ n’ihe banyere nrubeisi a kpaara ókè nye ndị na-achị isi?
13 N’otu aka ahụ, mgbe ndị ọchịchị ndị Juu nyere Pita na Jọn iwu ka ha kwụsị ikwusa ozi ọma banyere Jisọs, ha zaghachiri, sị: “Kpeenụ ma ọ̀ bụ ihe ziri ezi n’anya Chineke ịnụ olu unu karị olu Chineke.” (Ọrụ 4:19; 5:29) Ha apụghị ikpuchi ọnụ ha. Magazin ahụ bụ The Christian Century na-adọrọ uche gaa ná mkpebi ọzọ akọ na uche ndị Kraịst oge mbụ ahụ mere ka ha mee mgbe ọ na-asị: “Ndị Kraịst oge mbụ ejeghị ozi n’òtù ndị agha. Roland Bainton na-ekwu na ‘site n’ọgwụgwụ oge Agba Ọhụrụ ruo afọ iri ahụ bụ A.D. 170-180, e nweghị ihe àmà ọ bụla gosiri na ndị Kraịst nọ n’usuu ndị agha’ (Christian Attitudes Toward War and Peace [Abingdon, 1960], peji 67-8) . . . . Swift na-asị na Justin Martyr ‘lere ya anya dị ka ihe kwekọrọ n’ihe a tụrụ anya ya na ndị Kraịst ga-ezere ime ihe ike.’”
14, 15. Gịnị bụ ụkpụrụ Bible ụfọdụ ndị duziri nrubeisi a kpaara ókè nke ndị Kraịst oge mbu nye ndị na-achị isi bụ mmadụ?
14 N’ihi gịnị ka ndị Kraịst oge mbụ ahụ na-ejighị jee ozi dị ka ndị agha? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nke ọ bụla n’ime ha ji nlezianya mụọ Okwu na iwu Chineke nile, wee meekwa mkpebi nke onwe ya n’ịdabere n’akọ na uche ya nke e ji Bible zụọ. Ha nọpụrụ iche, ‘n’abụghị akụkụ nke ụwa,’ nnọpụiche ha gbochikwara ha ịhọrọ akụkụ dị iche iche ha ga-adụnyere úkwù n’esemokwu nile nke ụwa nke a. (Jọn 17:16, NW; Jọn 18:36) N’ịga n’ihu, ha bụ ndị nke Chineke. (2 Timoti 2:19) Ịtọgbọrọ Ọchịchị ndụ ha ga-apụtaworị inye Siza ihe bụ nke Chineke. Karịsịa, ha so n’òtù ụmụnna zuru ụwa ọnụ nke e kekọtara n’ịhụnanya. (Jọn 13:34, 35; Ndị Kọlọsi 3:14; 1 Pita 4:8; 5:9) Ezi akọ na uche ha apụghị ikwe ka ha bulie ngwá agha nke ha pụrụ iji gbuo nwanna ha nwoke ma ọ bụ nwanyị bụ onye Kraịst.
15 Tụkwasị na nke a, ndị Kraịst apụghị isonye n’ihe omume okpukpe ọha mmadụ na-eme, dị ka ife onye ọchịchị ofufe. N’ihi nke a, e lere ha anya dị ka “ndị pụrụ iche na ndị bụ ihe ize ndụ, ndị fọdụrụ n’ọha mmadụ na-enyokwa ha nnọọ enyo.” (Still the Bible Speaks, nke W, A. Smart dere) Ọ bụ ezie na Pọl dere na ndị Kraịst kwesịrị ‘inyeghachi onye ha ji ụgwọ egwu egwu dị otú ahụ,’ ha echefughị egwu, ma ọ bụ nsọpụrụ, ka ukwuu ha nwere maka Jehova. (Ndị Rom 13:7; Abụ Ọma 86:11) Jisọs n’onwe ya sịrị: “Unu atụla egwu ndị ahụ na-egbu anụ ahụ ma ha apụghị igbu mkpụrụ obi; ma kama nke ahụ na-atụnụ egwu onye ahụ nke pụrụ ibibi ma mkpụrụ obi ma anụ ahụ na Gehena.”—Matiu 10:28, NW.
16. (a) N’akụkụ dịgasị aṅaa ka ọ dị mkpa ka ndị Kraịst jiri nlezianya tụlee odudo ha na-edo onwe ha n’okpuru ndị na-achị isi? (b) Gịnị ka igbe ahụ dị na peji 27 na-eme ihe atụ ya?
16 Dị ka ndị Kraịst, anyị na-eche ihe ịma aka ndị yiri nke ahụ ihu taa. Anyị apụghị ikere òkè n’ụdị ikpere arụsị ọ bụla nke oge a—ma ọ bụ imegharị ahụ n’ụzọ na-egosi ofufe nye ihe oyiyi ma ọ bụ ihe nnọchianya ọ bụla ma ọ bụ ikwu na nzọpụta sitere n’aka onye ọ bụla ma ọ bụ n’òtù ọ bụla. (1 Ndị Kọrint 10:14; 1 Jọn 5:21) Dịkwa ka ndị Kraịst oge mbụ, anyị apụghị imebi nnọpụiche ndị Kraịst anyị.—Tụlee 2 Ndị Kọrint 10:4.
‘Ịdị Nwayọọ na Nsọpụrụ Dị Omimi’
17. Okwu ndụmọdụ dị aṅaa ka Pita gwara ndị ahụ na-ata ahụhụ n’ihi akọ na uche ha?
17 Pita onyeozi dere banyere ọnọdụ anyị nke dabeere n’akọ na uche, sị: “Nke a bụ ihe ekele, ma ọ bụrụ na onye ọ bụla na-atachi obi n’ihe mwute dị iche iche n’ihi akọ na uche n’ebe Chineke nọ, na-ahụ ahụhụ nke na-ezighị ezi.” (1 Pita 2:19) Ee, ọ bụ ihe ziri ezi n’ebe Chineke nọ mgbe onye Kraịst guzosiri ike n’agbanyeghị mkpagbu, e nwekwara abamuru ahụ nke bụ na a na-ewusi okwukwe onye Kraịst ahụ ike, nụchaakwa ya. (Jemes 1:2-4; 1 Pita 1:6, 7; 5:8-10) Pita dekwara, sị: “Ọ bụrụkwa na unu ahụọ ahụhụ n’ihi ezi omume, ngọzi [obi ụtọ, NW] na-adịrị unu: ma unu atụla egwu ahụ ha na-akpata, obi alọkwala unu mmiri; kama doonụ Kraịst anyị nsọ n’ime obi unu dị ka Onyenwe unu: bụrụkwanụ ndị e doziworo mgbe dum ịgọpụrụ onye ọ bụla nke na-ajụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ nke dị n’ime unu, ma ka unu were nwayọọ na egwu gọpụ.” (1 Pita 3:14, 15) Nke a bụ n’ezie okwu ndụmọdụ na-enye aka!
18, 19. N’ụzọ dị aṅaa ka àgwà nke nsọpụrụ dị omimi na inwe ezi uche pụrụ isi nye aka ma ọ bụrụ na ọchịchị akpaara nnwere onwe anyị ókè n’ihe banyere ife ofufe?
18 Mgbe mkpagbu bilitere n’ihi na ndị ọchịchị aghọtaghị ọnọdụ ndị Kraịst ma ọ bụ n’ihi na ndị ndú okpukpe Krisendọm agwawo ndị ọchịchị ihe na-ezighị ezi banyere Ndịàmà Jehova, ime ka ndị ọchịchị mara nke bụ eziokwu pụrụ ịrụpụta ibelata nrụgide ahụ. N’iji nwayọọ na nsọpụrụ dị omimi mee ihe, onye Kraịst adịghị alụ ọgụ anụ ahụ megide ndị na-akpagbu ya. Otú ọ dị, ọ na-eji ụzọ nile iwu kwadoro mee ihe iji kwadoo okwukwe ya. Mgbe ahụ, ọ na-ahapụ okwu nile n’aka Jehova.—Ndị Filipaị 1:7; Ndị Kọlọsi 4:5, 6.
19 Nsọpụrụ dị omimi na-edujekwa onye Kraịst ime ihe nile ọ pụrụ ime, n’emebighị akọ na uche ya, n’irubere ndị ọchịchị isi. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na a machibido nzukọ ọgbakọ dị iche iche iwu, ndị Kraịst na-achọta ụzọ ndị ọzọ na-apụtachaghị ìhè iji nọgide na-anata nri site na table Jehova. Onye Ọchịchị ahụ Kasị Elu, bụ́ Jehova Chineke, na-agwa anyị site n’ọnụ Pọl, sị: “Ka anyị na-atụgharịtakwa uche n’ahụ ibe anyị ịkpasu ịhụnanya na ọrụ ọma dị iche iche; ka anyị gharakwa ịhapụ nzukọ nke onwe anyị, dị ka ụfọdụ na-eme.” (Ndị Hibru 10:24, 25) Ma a pụrụ iji ezi uche mee ihe n’inwe nzukọ ndị dị otú ahụ. Ọbụna ma a sị na ọ bụ nanị mmadụ ole na ole nọ n’ebe ahụ, anyị pụrụ inwe obi ike na Chineke na-agọzi ndokwa ndị dị otú ahụ.—Tụlee Matiu 18:20.
20. Ọ bụru na a machibido nkwusa ozi ọma ihu ọha iwu, olee ụzọ ndị Kraịst pụrụ isi mee ihe banyere ọnọdụ ahụ?
20 N’otu aka ahụkwa, ndị ọchịchị ụfọdụ amachibidowo iwu ikwusa ozi ọma n’ihu ọha. Ndị Kraịst ndị na-ebi n’okpuru ha na-echeta na site n’ọnụ Jisọs n’onwe ya, Onye Ọchịchị ahụ Kasị Elu sịrị: “A ghaghịkwa ibu ụzọ kwusaa ozi ọma nke m n’ihu mba nile.” (Mak 13:10) Ya mere, ha na-erubere Onye Ọchịchị ahụ Kasị Elu isi n’agbanyeghị ihe ọ ga-akpatara ha. N’ebe o kwere mee, ndị ozi ahụ kwusara ozi ọma n’ihu ọha, sitekwa n’ụlọ ruo n’ụlọ, ma e nwere ụzọ ndị ọzọ a na-esi erute ndị mmadụ, dị ka n’ịgba àmà mberede. (Jọn 4:7-15; Ọrụ 5:42; 20:20) Ọtụtụ mgbe, ndị ọchịchị agaghị egbochi ọrụ nkwusa ahụ ma ọ bụrụ na e jiri nanị Bible mee ihe—nke na-eme ka mkpa ọ dị pụta ìhè ka Ndịàmà nile bụrụ ndị a zụrụ nke ọma ịtụgharị uche site n’Akwụkwọ nsọ. (Tụlee Ọrụ Ndị Ozi 17:2, 17.) Site n’ịbụ ndị nwere anya ike, ma na-akwanyekwa ùgwù, ọtụtụ mgbe, ndị Kraịst pụrụ ịchọta ụzọ ha ga-esi rubere Jehova isi n’ewetaraghị onwe ha iwe nke ndị na-achị isi.—Taịtọs 3:1, 2.
21. Ọ bụrụ na Siza alaghị azụ ná mkpagbu ya, ụzọ dị aṅaa ka ndị Kraịst na-aghaghị ịhọrọ?
21 Ma, mgbe ụfọdụ, ndị ọchịchị adịghị ala azụ n’ịkpagbu ndị Kraịst. Mgbe ahụ, anyị pụrụ iji ezi akọ na uche nọgide nanị n’ime ihe ziri ezi. Nwa okoro ahụ bụ Franz Reiter chere ime nhọrọ ihu: mebie okwukwe ya ma ọ bụ nwụọ. Ebe ọ bụ na ọ pụghị ịkwụsị ife Chineke, o ji obi ike jee ka e gbuo ya. N’anyasị ahụ tupu ọ nwụọ, Franz deere nne ya akwụkwọ ozi, sị: “A gaje igbu m n’ụtụtụ echi. Ana m enweta ike site n’aka Chineke, dị ka ọ dịworo mgbe nile n’ihe banyere ezi ndị Kraịst nile malite n’ogologo oge gara aga . . . Ọ bụrụ na i guzosie ike ruo ọnwụ, anyị ga-ezute ọzọ ná mbilite n’ọnwụ.”
22. Olileanya di aṅaa ka anyị nwere, oleekwa ụzọ anyị kwesịrị isi na-aga n’ihu n’oge dị ugbu a?
22 Otu ụbọchị, ihe nile a kpọrọ mmadụ ga-anọ n’okpuru nanị otu iwu, ya bụ nke Jehova. Ka ọ na-eru mgbe ahụ, anyị aghaghị iji ezi akọ na uche na-ekwenyere ndokwa Chineke mere ma nọgide n’ido onwe anyị n’okpuru n’ụzọ a kpaara ókè nye ndị na-achị isi, na-erubekwara Eze Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, isi n’ihe nile n’otu mgbe ahụ.—Ndị Filipaị 4:5-7.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Gịnị bụ ihe dị mkpa nke mere mmadụ ga-eji doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi?
◻ N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji laa azụ n’ịtụ ụtụ isi ndị Siza kwuru ka a tụọ?
◻ Ụdị nsọpụrụ dị aṅaa ka anyị kwesịrị ịnye ọchịchị?
◻ N’ihi gịnị ka odudo anyị na-edo onwe anyị n’okpuru Siza ji bụrụ nanị nke a kpaara ókè?
◻ Ọ bụrụ na a na-akpagbu anyị n’ihi na Siza chọrọ ka anyị nye ya ihe bụ nke Chineke, olee ụzọ anyị kwesịrị isi meghachi omume?
[Igbe dị na peeji nke 27]
Nkwanye ùgwù, ọ bụghị ofufe
N’otu ụtụtụ mgbe klasị na-aga n’ihu, Terra, bụ́ otu nwa agbọghọ nta onye Canada, bụ́ Onyeàmà Jehova, hụtara na onye nkụzi ya kpọọrọ otu nwata akwụkwọ ibe ya pụọ na klasị ruo nwa mgbe nta. Mgbe nwa oge nta gasịrị, onye nkụzi ahụ ji nwayọọ gwa Terra ka o soro ya jee n’ọfis onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ.
Mgbe ha rutere n’ebe ahụ, Terra hụtara ọkọlọtọ Canada ka a gbasara ya n’elu table onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ. Onye nkụzi ahụ gwara Terra ka ọ gbụọ ọnụ mmiri n’ọkọlọtọ ahụ! Ọ tụrụ aro na ebe ọ bụ na Terra adịghị abụ abụ e ji eto mba ma ọ bụ na-ekele ọkọlọtọ ahụ, ọ dịghị ihe ga-egbochi ya ime ihe dị otú ahụ. Terra jụrụ, na-akọwa na ọ bụ ezie na Ndịàmà Jehova adịghị efe ọkọlọtọ ofufe, ha na-akwanyere ya ùgwù.
Mgbe ha lọghachiri na klasị, onye nkụzi ahụ mara ọkwa na ọ dị otu nnwale ya mere. Ọ kpọrọwo ụmụ akwụkwọ abụọ n’otu n’otu jee n’ọfis onye isi ụlọ akwụkwọ wee gwa ha ka ha gbụọ ọnụ mmiri n’ọkọlọtọ. Onye nke mbụ na-ekere òkè n’ihe omume dị iche iche e ji eto mba, ma ọ gbụrụ ọnụ mmiri n’ọkọlọtọ ahụ mgbe a gwara ya ka o mee otú ahụ. N’ụzọ na-eyighị nke ahụ, Terra adịghị abụ abụ e ji eto mba ma ọ bụ na-ekele ọkọlọtọ ahụ; ma n’agbanyeghị nke ahụ, ọ jụrụ ileda ọkọlọtọ ahụ anya n’ụzọ dị otú ahụ. Onye nkụzi ahụ mere ka ọ pụta ìhè na ọ bụ Terra bụ onye gosiri nkwanye ùgwù n’ụzọ kwesịrị ekwesị.—1990 Yearbook of Jehovah’s Witnesses.
[Ebe E Si Nweta Foto Ndị Dị na peeji nke 23]
French Embassy Press & Information Division
USSR Mission to the UN