Ọdịdị nke Okwukwe Gị—A Na-anwale Ya Ugbu A
“Gụọnụ ya n’ọṅụ nile, ụmụnna m, mgbe ọ bụla unu dabara n’ọnwụnwa dị iche iche; ebe unu maara na nnwapụta nke okwukwe unu na-arụpụta ntachi obi.”—JEMES 1:2, 3.
1. N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ga-eji tụọ anya ule nke okwukwe ha?
EZI ndị Kraịst adịghị enwe ọchịchọ ịta ahụhụ, ha adịghị enwetakwa ihe ụtọ site n’ihe mgbu ma ọ bụ mweda n’ala. Ma, ha na-eburu n’uche okwu ndị ahụ onye otu nne ji ya na Jisọs bụ́ Jemes dere. Kraịst mere ka o doo ndị na-eso ụzọ ya anya na ha pụrụ ịtụ anya mkpagbu na ihe isi ike ndị ọzọ n’ihi ịrapagidesi ike ha n’ụkpụrụ Chineke. (Matiu 10:34; 24:9-13; Jọn 16:33) Otú o sina dị, ọṅụ pụrụ isi n’ule ndị dị otú ahụ pụta. N’ụzọ dị aṅaa?
2. (a) Olee otú ule nke okwukwe anyị pụrụ isi rụpụta ọṅụ? (b) Olee otú ntachi obi pụrụ isi rụzuo ọrụ ya n’ebe anyị nọ?
2 Isi ihe mere anyị na-eji enwe ọṅụ mgbe anyị nọ n’ọnwụnwa ma ọ bụ n’ule nke okwukwe bụ na ndị a pụrụ ịmịpụta ezi mkpụrụ. Dị ka Jemes na-ekwu, inwe obi ike n’agbanyeghị ule ma ọ bụ ihe isi ike “na-arụpụta ntachi obi.” Anyị pụrụ irite uru site n’ịzụlite àgwà ndị Kraịst ahụ bara uru. Jemes dere, sị: “Ka ntachi obi rụzuo ọrụ ya, ka unu wee tozuo okè dịzuokwa mma, bụrụ ndị ọ dịghị ihe ọ bụla fọdụrụ nke unu na-enweghị.” (Jemes 1:4) Ntachi obi nwere ihe ọ ga-eme, “ọrụ.” Ọrụ ya bụ ime ka anyị tozuo okè n’akụkụ nile, na-enyere anyị aka itozu okè dị ka ndị Kraịst. N’ihi ya, site n’ikwe ka ọnwụnwa ruo n’ọgwụgwụ ya n’emeghị mgbalị ọ bụla iji ụzọ ndị Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị weta ha ná njedebe dị ngwa, a na-anwale ma na-anụcha okwukwe anyị. Ọ bụrụ na anyị enwebughị ndidi, ọmịiko, obiọma, ma ọ bụ ịhụnanya n’ịnagide ọnọdụ dị iche iche ma ọ bụ ụmụ mmadụ ibe anyị, ntachi obi pụrụ ime ka anyị zukwuo okè. Ee, usoro ya bụ: Ule na-arụpụta ntachi obi; ntachi obi na-amụba àgwà ndị Kraịst; ihe ndị a na-enye ọṅụ.—1 Pita 4:14; 2 Pita 1:5-8.
3. N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị ịdala azụ n’ihi egwu ọnwụnwa ma ọ bụ ule nke okwukwe?
3 Pita onyeozi mekwara ka ihe mere na anyị ekwesịghị ịtụ egwu ma ọ bụ dalaa azụ site n’ule nke okwukwe anyị pụta ìhè. O dere, sị: “Nke obi na-atọ unu ụtọ nke ukwuu n’ime ya, ọ bụ ezie na e mere ka o wute unu n’ọnwụnwa dị iche iche nwa oge ugbu a, ma a sị na ọ dị mkpa, ka nnwapụta nke okwukwe unu, ebe ọ dịkarịrị ọlaedo oké ọnụ ahịa nke ukwuu, bụ́ ọlaedo nke na-ala n’iyi, ọ bụ ezie na a na-eji ọkụ nwapụta ya, ka e wee hụ nnwapụta ahụ na ọ na-eweta otuto na ebube na nsọpụrụ n’ime mkpughe nke Jisọs Kraịst.” (1 Pita 1:6, 7) Okwu ndị a na-agba ume ugbu a karịsịa n’ihi na “mkpagbu ukwu” ahụ—oge otuto, ebube, nsọpụrụ, na nlanarị—dị nnọọ nso karịa otú ụfọdụ pụrụ iche, dịkwa nnọọ nso karịa ka ọ dị mgbe anyị ghọrọ ndị kwere ekwe.—Matiu 24:21; Ndị Rom 13:11, 12.
4. Olee ihe otu nwanna nwoke chere banyere ule ndị ya na ndị Kraịst ndị ọzọ e tere mmanụ nwetaworo?
4 N’isiokwu bu ụzọ, anyị tụlere ule ndị ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ chere ihu site na 1914 gaa n’ihu. Ihe ndị a hà bụ ihe ndabere maka ọṅụ? A. H. Macmillan nyere echiche a n’ileghachi anya azụ, sị: “Ahụwo m ọtụtụ ọnwụnwa ndị siri ike ka ha bịakwasịrị nzukọ a na ule ndị e lere okwukwe nke ndị nọ na ya. Site n’enyemaka mmụọ Chineke ọ lanarịrị ma nọgide na-eto eto. Ahụwo m amamihe dị n’iji ndidi chere Jehova ka o mee ka nghọta anyị nke ihe sitere n’Akwụkwọ Nsọ doo anya kama iwe iwe n’ihi echiche ọhụrụ. . . . N’agbanyeghị mgbanwe ndị anyị na-aghaghị ime site n’oge ruo n’oge n’echiche anyị, nke ahụ agaghị agbanwe ndokwa amara nke ihe mgbapụta ahụ na nkwa Chineke nke ndụ agwụghị agwụ. Ya mere ọ dịghị ihe mere anyị ga-eji kwe ka okwukwe anyị daa mbà n’ihi atụmanya ndị a na-emezughị ma ọ bụ mgbanwe n’echiche.”—Ụlọ Nche, August 15, 1966 (Bekee), peji nke 504.
5. (a) Abamuru ndị dị aṅaa si n’ihe ahụ fọdụrụ ịbụ ndị e lere ule pụta? (b) N’ihi gịnị ka okwu banyere ime nnwale kwesịrị iji masị anyị ugbu a?
5 A tọhapụrụ ndị Kraịst e tere mmanụ bụ́ ndị lanarịrị oge ule nke 1914-1919 pụọ ná mmetụta na-erikpu erikpu nke ụwa na pụọ n’ihe omume nile nke okpukpe Babilọn. Ihe ahụ fọdụrụnụ gara n’ihu dị ka ìgwè a sachaworo ma nụchaa, jiri afọ ofufo na-achụ àjà otuto nye Chineke ma na-enwe mmesi obi ike na ọ na-anakwere ha dị ka otu ndị. (Aịsaịa 52:11; 2 Ndị Kọrint 6:14-18) Ikpe esiwo n’ụlọ Chineke malite, ma a gaghị emezu ya n’otu oge a kara aka. Ile ule na myọcha nke ndị Chineke na-aga n’ihu. A na-ele okwukwe ndị nwere olileanya ịlanarị “mkpagbu ukwu” ahụ na-abịanụ dị ka akụkụ nke “oké ìgwè mmadụ ahụ” ule. (Mkpughe 7:9, 14) A na-eme nke a n’ụzọ ndị yiri ihe ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ chere ihu nakwa n’ụzọ ndị ọzọ.
Olee Otú A Pụrụ Isi Nwalee Gị?
6. Gịnị bụ otu ụdị nke ule kpụ ọkụ n’ọnụ nke ọtụtụ ndị nwetaworo?
6 Ọtụtụ ndị Kraịst echewo banyere ihe ịma aka nke iguzogide ule n’ụdị nke mwakpo ndị e mere ihu na ihu. Ha na-echeta akụkọ a: “[Ndị ndú ndị Juu kpọrọ] ndị ozi bịakwute ha, ha pịa ha ihe, nye ha iwu ka ha ghara ikwu okwu n’aha Jisọs, ha wee hapụ ha ka ha laa. Ya mere ha siri n’ihu nnọkọ ikpe ahụ laa, na-aṅụrị na a gụrụ ha ná ndị kwesịrị ka e mee ha ihe ihere n’ihi Aha ahụ.” (Ọrụ 5:40, 41) Akụkọ nke oge a kwa nke ndị Chineke, karịsịa n’oge agha ụwa, na-eme ka o doo anya na ndị mkpagbu tiri ọtụtụ Ndịàmà Jehova ihe n’ezie ma mee ha ihe ka nnọọ nke ahụ njọ.
7. Ruo n’ókè hà aṅaa ka ụfọdụ ndị Kraịst nke oge a ruworo n’igosipụta okwukwe?
7 N’ihe banyere ndị Kraịst ịbụ ndị a na-akpagbu, ụwa adịghị akpa ókè n’etiti ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ na oké ìgwè mmadụ nke “atụrụ ọzọ.” (Jọn 10:16) Eri ọtụtụ afọ, a nwalewo ndị nọ n’ìgwè abụọ a nke ọjọọ ya site n’ịtụ mkpọrọ na ọbụna ogbugbu n’ihi ịhụnanya ha maka Chineke na okwukwe ha n’ebe ọ nọ. Mmụọ Chineke adịwo ìgwè abụọ a mkpa n’agbanyeghị olileanya ha. (Tụlee Ụlọ Nche, June 15, 1996, peji nke 31.) N’ime afọ ndị 1930 na 1940 na Nazi Germany, ọtụtụ n’ime ndị ohu Jehova, gụnyere ụmụaka, gosipụtara okwukwe pụrụ iche, a nwalekwara ọtụtụ ruo n’isi. Na nso nso a karị, ndị Jehova echewo ule nke mkpagbu ihu n’ala ndị dị ka Burundi, Eritrea, Etiopia, Malawi, Mozambique, Rwanda, Singapore, na Zaire. Ule ndị dị ka ndị a gakwara n’ihu.
8. Olee otú okwu nke otu nwanna nwoke bụ́ onye Africa si gosi na nnwale nke okwukwe anyị gụnyere ihe karịrị ịtachiri mkpagbu dị ka ịkụ ihe obi?
8 Otú ọ dị, dị ka e buworo ụzọ kwuo, a na-anwalekwa okwukwe anyị n’ụzọ ndị ka dị aghụghọ. Ụfọdụ n’ime ọnwụnwa ndị ahụ adịghị abịa nnọọ ihu n’ihu, ha adịghịkwa adị mfe ịmata. Tụlee otú ị pụrụ isi meghachi omume nye ụfọdụ n’ihe ndị a na-esonụ. Otu nwanna nwoke n’Angola onye nwere ụmụ iri nọ n’ọgbakọ e kewapụrụ ruo oge ụfọdụ n’iso ụmụnna ruru eru nwee mkpakọrịta. O mesịrị kwe ndị ọzọ omume ileta ọgbakọ ahụ. A jụrụ ya ụzọ o si nwee ike na-enye ezinụlọ ya nri. O siiri ya ike ịza, ihe ọ pụrụ ikwu agwụlakwa na ọnọdụ ahụ siri ike. Ò nwere ike inye ụmụ ya nri ma ọ dịkarịa ala otu ugbo n’ụbọchị? Ọ zara, sị: “Mmm, o siri ike. Anyị amụtawo ikowe akpa anyị ebe aka anyị ga-eru.” Mgbe ahụ n’olu jupụtara ná nkweta, ọ sịrị: “Ma ọ́ bụghị nke a bụ ihe anyị na-atụ anya ya na mgbe ikpeazụ a?” Okwukwe dị otú ahụ dị ịrịba ama n’ụwa, ma ọ bụghị ihe ọhụrụ n’etiti ndị Kraịst na-eguzosi ike n’ihe, bụ́ ndị nwere obi ike zuru ezu na a ga-emezu nkwa Alaeze ahụ dum.
9. Olee otú e si anwale anyị n’ihe metụtara 1 Ndị Kọrint 11:3?
9 A na-elekwa oké ìgwè mmadụ ahụ ule n’ihe banyere ụkpụrụ ọchịchị Chineke. A na-eduzi ọgbakọ ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ dị ka ụkpụrụ Chineke na ụkpụrụ ọchịchị Chineke si dị. Nke a pụtara ibu ụzọ nakwere Jisọs dị ka Onye Ndú, onye a họpụtara ịbụ Isi nke ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 11:3) A na-egosipụta ịdị njikere ido onwe onye n’okpuru ya na Nna ya site n’okwukwe anyị ná nhọpụta ọchịchị Chineke na mkpebi ndị metụtara anyị iji ịdị n’otu na-eme uche Jehova. Ọzọkwa, n’ọgbakọ nke ọ bụla, e nwere ndị ikom a họpụtara idu ndú. Ha bụ ndị na-ezughị okè bụ́ ndị anyị pụrụ ịhụ mmejọ ha ngwa ngwa; ma a na-agba anyị ume ịkwanyere ndị nlekọta dị otú ahụ ùgwù na ido onwe anyị n’okpuru ha. (Ndị Hibru 13:7, 17) Ị̀ na-ahụ nke ahụ dị ka ihe ịma aka mgbe ụfọdụ? Nke a ọ̀ bụ ule nye gị n’ezie? Ọ bụrụ otú ahụ, ị̀ na-erite uru site n’ule nke a nke okwukwe gị?
10. Ule dị aṅaa ka anyị na-eche ihu n’ihe banyere ozi ubi?
10 A na-anwalekwa anyị n’ihe banyere ihe ùgwù na ihe a chọrọ bụ́ ikere òkè mgbe nile n’ozi ubi. Ka anyị wee nwee ike ịgafe ule a, anyị aghaghị ịmata na ikere òkè zuru ezu n’ozi ubi gụnyere ihe karịrị ime nkwusa dịkarịsịrị nta, ma ọ bụ nke mmezu iwu. Cheta okwu ịja mma Jisọs banyere nwanyị ahụ bụ́ ogbenye di ya nwụrụ bụ́ onye nyere ihe nile o jiri biri. (Mak 12:41-44) Anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, ‘Àna m enye onwe m n’ụzọ yiri nke ahụ n’ihe banyere ozi ubi m?’ Anyị nile gaje ịbụ Ndịàmà nke Jehova ụbọchị nile, na-adị njikere n’ohere ọ bụla ime ka ìhè anyị nwuo.—Matiu 5:16.
11. Olee otú mgbanwe ná nghọta ma ọ bụ ndụmọdụ n’ihe banyere àgwà pụrụ isi bụrụ ule?
11 Ule ọzọ anyị pụrụ iche ihu metụtara ọ̀tụ̀tụ̀ nke obi ekele anyị maka ìhè a na-eme ka ọ na-achakwasịkwu eziokwu Bible na maka ndụmọdụ nke òtù ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi na-enye. (Matiu 24:45) Mgbe ụfọdụ nke a na-achọ ka anyị mee mgbanwe n’àgwà anyị, dị ka mgbe o doro anya na ndị na-eji ụtaba eme ihe aghaghị ịkwụsị ma ọ bụrụ na ha chọrọ ịnọgide n’ọgbakọ.a (2 Ndị Kọrint 7:1) Ma ọ bụ ule ahụ pụrụ ịbụ n’anyị ịnakwere mkpa ọ dị imezi ọchịchọ anyị n’egwú ma ọ bụ n’ụdị ntụrụndụ ndị ọzọ.b Ànyị ga-agbagha amamihe dị na ndụmọdụ e nyere? Ka ànyị ga-ekwe ka mmụọ Chineke kpụzie echiche anyị ma nyere anyị aka iyikwasị mmadụ ọhụrụ nke ndị Kraịst?—Ndị Efesọs 4:20-24; 5:3-5.
12. Gịnị ka a chọrọ iji wusie okwukwe ike mgbe e mesịrị mmadụ baptism?
12 Ruo ọtụtụ narị afọ, ọnụ ọgụgụ nke oké ìgwè mmadụ ahụ anọwo na-amụba, mgbe baptism ha gasịkwara, ha anọgidewo na-ewusi mmekọrịta ha na Jehova ike. Nke a gụnyere ihe karịrị ije mgbakọ ndị Kraịst, ije nzukọ ụfọdụ n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ma ọ bụ ikere òkè n’ozi ubi n’oge ụfọdụ. Iji kọwaa: Mmadụ nwere ike ghara ịnọ n’ime Babilọn Ukwu ahụ n’anụ ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, ma ọ̀ hapụwo ya n’ezie? Ọ̀ ka na-arapara n’ihe ndị ahụ na-egosipụta mmụọ Babilọn Ukwu ahụ—mmụọ nke na-eleda ụkpụrụ ezi omume Chineke anya? Ọ̀ na-ewere omume ọma na ikwesị ntụkwasị obi n’alụmdi na nwunye n’ihe nta? Ọ̀ na-eji ọdịmma onwe onye na nke ihe onwunwe akpọrọ oké ihe karịa ọdịmma ime mmụọ? Ee, ọ̀ nọgidewo n’enweghị ntụpọ site n’ụwa?—Jemes 1:27.
Rite Uru Site n’Okwukwe A Nwalere
13, 14. Gịnị ka ụfọdụ meworo mgbe ha malitesịrị n’ụzọ nke ezi ofufe ahụ?
13 Ọ bụrụ na anyị esiwo na Babilọn Ukwu ahụ gbapụ n’ezie, sikwa n’ụwa pụta, ka anyị ghara ile anya n’ihe ndị dị n’azụ. N’ikwekọ n’ụkpụrụ dị na Luk 9:62, onye ọ bụla n’ime anyị ileghachi anya azụ pụrụ ịpụta abụkwaghị onye Alaeze Chineke ga-achị. Jisọs sịrị: “Ọ dịghị onye ọ bụla nke na-ele anya n’azụ, mgbe o tinyesịrị aka ya n’ọgụ anụ ụlọ na-adọkpụgharị, kwesịrị alaeze Chineke.”
14 Ma, ụfọdụ ndị ghọrọ ndị Kraịst n’oge gara aga ekwewo ka e mee ka ha yie usoro ihe a. Ha eguzogidebeghị mmụọ nke ụwa. (2 Pita 2:20-22) Ihe ụwa ndị na-adọpụ uche erikpuwo mmasị na oge ha, si otú a na-egbochi ọganihu ha. Kama ịtụkwasịsi uche na obi ha ike n’Alaeze Chineke na ezi omume ya, na-ebute ihe ndị dị otú ahụ ụzọ ná ndụ, ha echigharịwo gaa n’ịchụso ihe mgbaru ọsọ nke ihe onwunwe. Ọ gwụla ma a kwaliri ha ịmata esighị ike n’okwukwe ha na ọnọdụ ịdị ṅara ṅara ha na ịgbanwe ụzọ ha site n’ịchọ ndụmọdụ Chineke, ha nọ n’ihe ize ndụ nke ịtụfu mmekọrịta ha dị oké ọnụ ahịa nke ha na Jehova na nzukọ ya.—Mkpughe 3:15-19.
15. Gịnị ka ọ na-ewe iji nọgide na-abụ onye Chineke na-anara?
15 Anyị ịbụ ndị a nwapụtara ma nọrọ n’ọnọdụ ịlanarị mkpagbu ukwu ahụ ji ọsọ na-abịa dabeere n’anyị ịnọgide na-adị ọcha, ‘ịsa uwe anyị n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.’ (Mkpughe 7:9-14; 1 Ndị Kọrint 6:11) Ọ bụrụ na anyị anọgideghị na-enwe nguzo dị ọcha, nke ezi omume n’ihu Chineke, a gaghị anabata ije ozi anyị dị nsọ. N’ezie, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ịghọta na ọdịdị nke okwukwe a nwalere anwale ga-enyere anyị aka ịtachi obi na izere inweta iwe Chineke.
16. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka ụgha pụrụ isi bụrụ ule nke okwukwe anyị?
16 Mgbe ụfọdụ, usoro mgbasa ozi na ndị ọchịchị na-enye ndị Chineke aha ọjọọ, na-akọjọ nkwenkwe ndị Kraịst na ụzọ ndụ anyị. Nke a ekwesịghị iju anyị anya, n’ihi na Jisọs na-egosi n’ụzọ doro anya na ‘ụwa ga-akpọ anyị asị n’ihi na anyị esiteghị na ya.’ (Jọn 17:14) Ànyị ga-ekwe ka ndị Setan mere ka ha kpuo ìsì menye anyị ụjọ ma kụda anyị obi, meekwa ka ihere ozi ọma ahụ na-eme anyị? Ànyị ga-ekwe ka ụgha dị iche iche banyere eziokwu ahụ metụta anyị ịgachi nzukọ anya na ọrụ nkwusa anyị? Ka ànyị ga-eguzosi ike ma nwee obi ike, kpebisiekwa ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ ịnọgide na-akpọsa eziokwu ahụ banyere Jehova na Alaeze ya?
17. Mmesi obi ike dị aṅaa pụrụ ịkwali anyị ịnọgide na-egosi okwukwe?
17 Dị ka amụma Bible e mezuru si dị, anyị na-ebimi ugbu a n’oge ọgwụgwụ. Atụmanya anyị ndị dabeere na Bible maka ụwa ọhụrụ nke ezi omume aghaghị ime eme n’ụzọ na-enye obi ụtọ. Ruo mgbe ụbọchị ahụ ga-abịa, ka anyị nile gosipụta okwukwe na-apụghị ịda ada n’Okwu Chineke ma gosipụta okwukwe anyị site n’adaghị mbà n’ikwusa ozi ọma Alaeze ahụ gburugburu ụwa. Cheedị banyere ọtụtụ puku ndị ọhụrụ na-eso ụzọ a na-eme baptism kwa izu. Nke ahụ ọ́ bụghị ihe zuru ezu mere anyị ga-eji nwee ekele na ndidi Jehova n’ihe metụtara imezu ihe o kpere n’ikpe pụrụ iduga ná nzọpụta nke ọtụtụ ndị ọzọ? Ọ̀ bụ na anyị enweghị ọṅụ na Chineke ekwerewo ka ọrụ nkwusa Alaeze ahụ na-azọpụta ndụ gaa n’ihu? Ọ̀ bụkwa na anyị enweghị obi ụtọ na ọtụtụ nde mmadụ anakwerewo eziokwu ahụ ma na-egosipụta okwukwe ha?
18. Gịnị bụ mkpebisi ike gị n’ebe ijere Jehova ozi dị?
18 Anyị apụghị ikwu ogologo oge nnwale a na-anwale okwukwe anyị n’oge a ga-adịru. Ma otu ihe doro anya: Jehova esetịpụwo otu ụbọchị nke ime mpịazi maka eluigwe na ụwa ajọ omume dị ugbu a. Ka ọ dị ugbu a, ka anyị kpebisie ike iṅomi ọmarịcha ọdịdị nke okwukwe a nwalere anwale nke Onye Mmezu nke okwukwe anyị, bụ́ Jisọs, gosipụtara. Ka anyị gbasookwa ihe nlereanya nke ihe ahụ fọdụrụnụ e tere mmanụ na-akawanye nká na nke ndị ọzọ ji obi ike na-eje ozi n’etiti anyị.
19. Gịnị ka ị pụrụ ijide n’aka na ọ ga-emerị ụwa a?
19 Anyị kwesịrị ikpebisi ike isonyere mmụọ ozi ahụ na-efe n’etiti eluigwe kpọsaa ozi ọma ebighị ebi ahụ n’esepụghị aka nye mba nile ọ bụla, ebo nile ọ bụla, asụsụ nile ọ bụla, na ndị nile ọ bụla. Ka ha nụrụ nkwupụta okwu nke mmụọ ozi ahụ: “Tụọnụ egwu Chineke, nyekwa Ya otuto; n’ihi na oge hour nke ikpe Ya abịawo.” (Mkpughe 14:6, 7) Mgbe e mezuru ihe ahụ Chineke kpere n’ikpe, gịnị ka ọ ga-arụpụta n’ihe banyere ọdịdị nke okwukwe anyị a nwalere anwale? Ọ̀ bụ na ọ gaghị abụ mmeri dị ebube—mgbapụta site n’usoro ihe dị ugbu a banye n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke? Site n’ịtachi obi n’ule nke okwukwe anyị, anyị nwere ike ịsị, dị ka Jọn onyeozi sịrị: “Nke a bụkwa mmeri nke meriworo ụwa, bụ́ okwukwe anyị.”—1 Jọn 5:4.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Lee Ụlọ Nche nke July 1, 1974, peji nke 208-214, na Ụlọ Nche nke July 1, 1973 (Bekee), peji nke 409-411.
b Lee Ụlọ Nche nke January 15, 1984, peji nke 27-31.
Ị̀ Na-echeta?
◻ Olee otú o si bụrụ na ule nke okwukwe anyị pụrụ ịbụ ihe na-enye ọṅụ?
◻ Gịnị bụ ụfọdụ ule nke okwukwe anyị ndị a na-apụghị ịmata n’ụzọ dị mfe?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi rite uru site n’imeri ule nke okwukwe anyị n’ụzọ na-aga nke ọma?
[Foto dị na peeji nke 17]
A. H. Macmillan (n’ihu aka ekpe) ihe dị ka n’oge ahụ a tụrụ ya na ndị ọrụ Watch Tower Society mkpọrọ n’ụzọ na-ezighị ezi
O so bịa mgbakọ Detroit, Michigan, 1928
N’afọ ndị ikpeazụ ya, Nwanna Macmillan ka na-egosipụta okwukwe
[Foto dị na peeji nke 18]
Dị ka ezinụlọ a, ọtụtụ ndị Kraịst n’Africa egosipụtawo ọdịdị nke okwukwe a nwalere anwale