Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Anyị Pụrụ Ịnagide Ọnwụnwa Ọ Bụla!
    Ụlọ Nche—2005 | Jun 15
    • “Obiọma Na-erughịrị Mmadụ nke Chineke Bụ́ nke A Na-egosipụta n’Ụzọ Dị Iche Iche”

      Pita onyeozi na-ekwu na e mewo ka Ndị Kraịst “ruo újú site n’ọnwụnwa dị iche iche.” (1 Pita 1:6) O mesịrị kwuo n’akwụkwọ ozi o dere site n’ike mmụọ nsọ na “obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke” bụ “nke a na-egosipụta n’ụzọ dị iche iche.” (1 Pita 4:10) Okwu ndị ahụ bụ́ “n’ụzọ dị iche iche” nwere otu ụdị nke okwu Grik mbụ ahụ. N’ikwu banyere okwu a, otu ọkà mmụta Bible na-ekwu, sị: “Nke a bụ okwu na-egosipụta nnọọ mmetụta. . . . Ikwu banyere ebere [ma ọ bụ, obiọma na-erughịrị mmadụ] nke Chineke dị ka poikilos pụtara na o nweghị ọnọdụ ọ bụla ụmụ mmadụ na-eche ihu nke ebere Chineke na-apụghị imeri.” Ọ gara n’ihu na-ekwu, sị: “O nweghị ọnọdụ, nsogbu, ihe mberede ma ọ bụ mkpa chọrọ ime ihe ngwa ngwa nke a pụrụ inwe bụ́ nke ebere Chineke na-apụghị imeri, na nke ebere Chineke na-apụghị ịnagide n’ụzọ gara nke ọma ma merie. O nweghị ihe na-eme ná ndụ nke ebere Chineke na-apụghị inyere mmadụ aka ịnagide. Okwu a nke na-akọwa ihe n’ụzọ doro anya bụ́ poikilos na-echetara anyị ebere Chineke nke pụrụ inye aka n’ọnọdụ ọ bụla, bụ́ nke ruru eru n’ezie inyere anyị aka ịnagide ihe nile.”

      Obiọma Na-erughịrị Mmadụ nke Chineke Na-enyere Anyị Aka Ịnagide Ọnwụnwa

      Dị ka Pita si kwuo, otu ụzọ Chineke si egosipụta obiọma ya na-erughịrị mmadụ bụ site n’ụdị mmadụ dịgasị iche mejupụtara ọgbakọ Ndị Kraịst. (1 Pita 4:11) Ohu Chineke nke ọ bụla nwere onyinye ime mmụọ, ma ọ bụ ikike, ndị pụrụ ịbụ isi iyi nke agbamume nye ndị na-eche ọnwụnwa ihu. (Ndị Rom 12:6-8) Dị ka ihe atụ, ụfọdụ n’ime ndị nọ n’ọgbakọ bụ ndị nkụzi pụtara ìhè nke Bible. Okwu ha ndị nwere ihe mmụta na-akpali ma na-akwali ndị ọzọ ịtachi obi. (Nehemaịa 8:1-4, 8, 12) Ndị ọzọ na-eme nleta ọzụzụ atụrụ n’ụzọ chiri anya n’ụlọ ndị nkasi obi dị mkpa. A na-eji nleta ndị dị otú ahụ agba ndị ahụ ume, ‘na-akasi ha obi.’ (Ndị Kọlọsi 2:2) Mgbe ndị nlekọta mere ụdị nleta ndị ahụ na-ewusi okwukwe ike, ha na-enye ndị ha letara onyinye ime mmụọ. (Jọn 21:16) A makwaara ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ n’ihi ihu ọchị ha, ọmịiko ha na n’ihi iji ịdị nro na-emeso ndị kwere ekwe ibe ha, bụ́ ndị ọnwụnwa kpatawooro mwute, ihe. (Ọrụ 4:36; Ndị Rom 12:10; Ndị Kọlọsi 3:10) Ọmịiko na enyemaka nke sitere n’aka ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị ndị ahụ na-ahụ n’anya bụ ngosipụta dị ịrịba ama nke obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke.—Ilu 12:25; 17:17.

  • Anyị Pụrụ Ịnagide Ọnwụnwa Ọ Bụla!
    Ụlọ Nche—2005 | Jun 15
    • Ee, n’agbanyeghị ụdị ọnwụnwa anyị na-eche ihu, obiọma na-erughịrị mmadụ nke Chineke ga-enyere anyị aka imeri ya. (Jems 1:17) Enyemaka bịara n’oge ya na nkwado kwesịrị ekwesi nke Jehova nyere ndị ohu ya—n’agbanyeghị òkè ọnwụnwa ha ma ọ bụ ihe ịma aka ha haruru—bụ otu ihe àmà nke “amamihe dịgasị iche iche nke Chineke.” (Ndị Efesọs 3:10) Ọ̀ bụ na i kwetaghị?

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya