-
Kapadoshia—Ebe Ndị Mmadụ Biri n’Ebe Obibi Ndị Ifufe na Mmiri WapụtaraỤlọ Nche—2004 | Julaị 15
-
-
PITA onyeozi kwuru okwu banyere Kapadoshia. “Ndị na-ebi nwa oge a chụsasịrị gaa na . . . Kapadoshia,” so ná ndị o degaara akwụkwọ ozi mbụ ya. (1 Pita 1:1) Ala dị aṅaa ka Kapadoshia bụ? N’ihi gịnị ka ndị biri na ya ji bie n’ebe obibi ndị a wapụtara na nkume? Olee otú Iso Ụzọ Kraịst si rute ebe ahụ?
-
-
Kapadoshia—Ebe Ndị Mmadụ Biri n’Ebe Obibi Ndị Ifufe na Mmiri WapụtaraỤlọ Nche—2004 | Julaị 15
-
-
Ka ọ na-erule narị afọ nke abụọ T.O.A., e nweela ógbè ndị Juu na Kapadoshia. Ndị Juu sikwa n’ógbè a nọ na Jeruselem n’afọ 33 O.A. Ha bịara ebe ahụ iji mee Ememe Pentikọst. N’ihi ya, Pita onyeozi meere ndị Juu si Kapadoshia bịa nkwusa mgbe mwụpụ nke mmụọ nsọ gasịrị. (Ọrụ 2:1-9) Ihe ama na-egosi na ụfọdụ nabatara ozi ya ma were okpukpe ọhụrụ ha laa. Ya mere, Ndị Kraịst bụ́ ndị Kapadoshia so ná ndị Pita degaara akwụkwọ ozi mbụ ya.
-