‘Na-ejegharịnụ n’Ime Kraịst’
“Ya mere dị ka unu naara Kraịst anyị, bụ́ Jisọs Onyenwe anyị, na-ejegharịnụ n’ime Ya.”—NDỊ KỌLỌSI 2:6.
1, 2. (a) Olee otú Bible si na-akọwa ndụ Ịnọk nke ije ozi ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova? (b) Olee otú Jehova siworo nyere anyị aka isoro ya na-ejegharị, dị ka Ndị Kọlọsi 2:6, 7 na-egosi?
Ì KIRITỤWO ka obere nwata nwoke so nna ya na-eje ije? Obere nwa ahụ na-agbaso ụkwụ ọ bụla nna ya zọrọ, ihu ya ana-egbukepụ n’obi ụtọ; nna ya ana-enyere ya aka, ihu nke ya ana-egbukepụ n’ịhụnanya na nnwapụta. N’ụzọ dabara adaba, Jehova na-eji nnọọ ụdị ọnọdụ ahụ akọwa ndụ nke ijere ya ozi n’ikwesị ntụkwasị obi. Dị ka ihe atụ, Okwu Chineke na-asị na nwoke ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ịnọk ‘na [ezi] Chineke yikọrọ na-ejegharị.’—Jenesis 5:24; 6:9.
2 Dị nnọọ ka nna nwere nchebara echiche ga-enyere obere nwa ya nwoke aka isoro ya na-eje ije, Jehova enyewo anyị ihe inyeaka kasị mma a pụrụ inweta. O zitere Ọkpara ọ mụrụ nanị ya n’ụwa. N’ije ọ bụla ọ zọrọ n’ogologo ndụ ya n’elu ụwa ebe a, Jisọs Kraịst ṅomiri Nna ya nke eluigwe n’ụzọ zuru okè. (Jọn 14:9, 10; Ndị Hibru 1:3) Ya mere iji soro Chineke na-ejegharị, ọ dị anyị mkpa isoro Jisọs na-ejegharị. Pọl onyeozi dere, sị: “Ya mere dị ka unu naara Kraịst anyị, bụ́ Jisọs Onyenwe anyị, na-ejegharịnụ n’ime Ya, bụrụkwa ndị gbagideworo mkpọrọgwụ n’ime Ya, ndị a na-ewulikwa elu dị ka ụlọ n’ime Ya, ndị a na-ewerekwa okwukwe unu mee ka unu guzosie ike, dị ka e ziri unu, na-ekelebiga ókè.”—Ndị Kọlọsi 2:6, 7.
3. Dị ka Ndị Kọlọsi 2:6, 7 si kwuo, n’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na ijegharị n’ime Kraist karịrị nanị ịbụ onye e mere baptism?
3 N’ihi na ha chọrọ ịdị na-ejegharị n’ime Kraịst, na-agbalịsi ike ịgbaso nzọụkwụ ya zuru okè, a na-eme ndị a na-amụrụ Bible nwere obi eziokwu baptism. (Luk 3:21; Ndị Hibru 10:7-9) N’ụwa nile, na 1997 nanị, ihe karịrị 375,000 weere nzọụkwụ a dị mkpa—nkezi nke ihe karịrị 1,000 kwa ụbọchị. Mmụba a na-akpali akpali! Otú ọ dị, okwu Pọl ndị e dekọrọ ná Ndị Kọlọsi 2:6, 7 na-egosi na ijegharị n’ime Kraịst na-agụnye ihe karịrị nanị ịbụ onye e mere baptism. Ngwaa Grik a sụgharịrị “na-ejegharịnụ” na-akọwa ihe omume nke na-aghaghị ịdịgide, na-aga n’ihu. Ọzọkwa, Pọl na-agbakwụnye na iso Kraịst na-ejegharị na-agụnye ihe anọ: ịgbagide mkpọrọgwụ n’ime Kraịst, ịbụ onye e wuliri elu dị ka ụlọ n’ime ya, iguzosi ike n’okwukwe, na-ekelebigakwa ekele ókè. Ka anyị tụlee nkebi okwu nke ọ bụla ma hụ otú o si enyere anyị aka ịnọgide na-ejegharị n’ime Kraịst.
Ị̀ ‘Gbagidewo Mkpọrọgwụ n’Ime Kraịst’?
4. Gịnị ka ‘ịgbagide mkpọrọgwụ n’ime Kraịst’ pụtara?
4 Nke mbụ, ka Pọl na-ede, ọ dị anyị mkpa ịbụ ndị ‘gbagidere mkpọrọgwụ n’ime Kraịst.’ (Tụlee Matiu 13:20, 21.) Olee otú mmadụ pụrụ isi rụọ ọrụ iji bụrụ onye gbagidere mkpọrọgwụ n’ime Kraịst? A dịghị ahụ mkpọrọgwụ ihe ọkụkụ anya, ma ha dị ihe ọkụkụ ahụ mkpa—ha na-eme ka o guzosie ike, na-enyekwa ya nri. N’otu aka ahụ, ihe nlereanya na ozizi Kraịst na-emetụta anyị nke mbụ ya n’ụzọ anya na-adịghị ahụ, na-abami n’uche na n’obi anyị. N’ebe ahụ ha na-emezi anyị ahụ ma na-ewusi anyị ike. Mgbe anyị kwere ka ha chịkwaa echiche anyị, omume anyị, na mkpebi anyị, a na-akwali anyị ịrara ndụ anyị nye Jehova.—1 Pita 2:21.
5. Olee otú anyị pụrụ isi mee ‘ka agụụ na-agụsi anyị ike’ maka nri ime mmụọ?
5 Jisọs hụrụ ihe ọmụma sitere n’aka Chineke n’anya. Ọbụna na o ji ya tụnyere nri. (Matiu 4:4) Leenụ, n’Ozizi Elu Ugwu ya, o hotara ebe 21 site n’akwụkwọ asatọ dị iche iche nke Akwụkwọ Nsọ Hibru. Iji gbasoo ihe nlereanya ya, anyị aghaghị ime dị ka Pita onyeozi na-agba ume—‘ka agụụ na-agụsi anyị ike’ maka nri ime mmụọ “dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ.” (1 Pita 2:2) Mgbe agụụ nri na-agụsi nwa a mụrụ ọhụrụ ike, ọ na-eme ka o doo anya na ihe na-agụsi ya ike. Ọ bụrụ na ọ dịghị adị anyị otú ahụ ugbu a banyere nri ime mmụọ, okwu Pita na-agba anyị ume ‘ime ka agụụ’ ya na-agụsi anyị ike. N’ụzọ dị aṅaa? Ụkpụrụ ahụ dị n’Abụ Ọma 34:8 pụrụ inye aka: “Detụnụ ire, hụ na Jehova dị mma.” Ọ bụrụ na anyị ‘na-edetụ’ Okwu Jehova, bụ́ Bible ire mgbe nile, ikekwe na-agụ otu akụkụ ya kwa ụbọchị, anyị ga-ahụ na ọ na-emezi ahụ n’ụzọ ime mmụọ ma dị mma. Ka oge na-aga, agụụ ya ga-agụsiwa anyị ike.
6. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ịtụgharị uche n’ihe anyị na-agụ?
6 Otú ọ dị, ọ dị mkpa ịgbari nri nke ọma ozugbo anyị riri ya. N’ihi ya ọ dị anyị mkpa ịtụgharị uche n’ihe anyị na-agụ. (Abụ Ọma 77:11, 12) Dị ka ihe atụ, ka anyị na-agụ akwụkwọ bụ́ Nwoke Kasị Ukwuu nke Dịworo Ndụ, isiakwụkwọ nke ọ bụla na-abawanye uru ma ọ bụrụ na anyị akwụsị ma jụọ onwe anyị, sị: ‘Akụkụ dị aṅaa nke àgwà Kraịst ka m hụrụ n’akụkọ a, oleekwa otú m pụrụ isi ṅomie ya ná ndụ m?’ Ịtụgharị uche otú ahụ ga-eme ka anyị nwee ike itinye ihe anyị na-amụta n’ọrụ. Mgbe ahụ, mgbe mkpebi chere anyị ihu, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị ihe Jisọs gaara emeworị. Ọ bụrụ na anyị emee mkpebi anyị n’ụzọ kwekọrọ na ya, anyị na-enye ihe àmà nke ịbụ ndị gbagideworo mkpọrọgwụ n’ime Kraịst n’ezie.
7. Gịnị kwesịrị ịbụ echiche anyị banyere nri ime mmụọ siri ike?
7 Pọl na-agbakwa anyị ume iri “nri siri ike,” bụ́ eziokwu ka mie emie nke Okwu Chineke. (Ndị Hibru 5:14) Ịgụcha Bible pụrụ ịbụ ihe mgbaru ọsọ mbụ anyị n’akụkụ a. E nwekwara isiokwu dịịrị ọmụmụ ndị a kapịkwuru ọnụ, ndị dị ka àjà mgbapụta nke Kraịst, ọgbụgba ndụ dị iche iche Jehova sooro ndị ya gbaa, ma ọ bụ ụfọdụ ozi amụma ndị dị na Bible. E nwere ụba nke ihe ndị ga-enyere anyị aka ịmịkọrọ na ịgbari nri ime mmụọ siri ike dị otú ahụ. Gịnị bụ ihe mgbaru ọsọ nke inweta ihe ọmụma dị otú ahụ? Ọ bụghị inye anyị ihe mere anyị ga-eji na-etu ọnụ, kama ọ bụ iji wusie ịhụnanya anyị maka Jehova ike na ịdọtakwu anyị nso n’ebe ọ nọ. (1 Ndị Kọrint 8:1; Jemes 4:8) Ọ bụrụ na anyị ejiri agụụ nara ihe ọmụma a, mee ka o metụta anyị onwe anyị, jirikwa ya nyere ndị ọzọ aka, anyị ga na-eṅomi Kraịst n’ezie. Nke a ga-enyere anyị aka ịgbagide mkpọrọgwụ nke ọma n’ime ya.
À ‘Na-ewuli Gị Elu Dị Ka Ụlọ n’Ime Kraịst’?
8. Gịnị ka ịbụ onye ‘e wuliri elu dị ka ụlọ n’ime Kraịst’ pụtara?
8 Maka akụkụ nke ọzọ nke ijegharị n’ime Kraịst, Pọl si n’otu ihe a na-ahụ anya gafee n’ọzọ ngwa ngwa—site na nke ihe ọkụkụ gaa na nke ụlọ. Mgbe anyị na-eche banyere ụlọ a ka na-ewu ewu, anyị adịghị eche banyere nanị ntọala ya kamakwa oké ụlọ ahụ nke na-ebilitenụ a pụrụ ịhụ anya, site n’ịrụsi nnọọ ọrụ ike. N’otu aka ahụ, anyị aghaghị ịrụsi ọrụ ike nke ukwuu iji wulite àgwà na omume ndị yiri nke Kraịst. A na-ahụ nrụsi ọrụ ike dị otú ahụ, ọbụna dị ka Pọl degaara Timoti, sị: “Ka ịga n’ihu gị wee pụta ìhè n’ebe mmadụ nile nọ.” (1 Timoti 4:15; Matiu 5:16) Olee ụfọdụ ọrụ ndị Kraịst ndị na-ewuli anyị elu?
9. (a) Iji ṅomie Kraịst n’ozi anyị, gịnị bụ ụfọdụ ihe mgbaru ọsọ dị irè anyị pụrụ isetịpụ? (b) Olee otú anyị si mara na Jehova chọrọ ka anyị nụ ụtọ ozi anyị?
9 Jisọs nyere anyị ọrụ ikwusa na ịkụzi ozi ọma ahụ. (Matiu 24:14; 28:19, 20) O setịpụrụ ihe nlereanya zuru okè, jiri nkwuwa okwu na-agba àmà n’ụzọ dị irè. N’ezie, ọ dịghị mgbe anyị ga-emeru nke ọma dị ka o mere. Otú ọ dị, Pita onyeozi setịpụụrụ anyị ihe mgbaru ọsọ a: “Doonụ Kraịst anyị nsọ n’ime obi unu dị ka Onyenwe unu: bụrụkwanụ ndị e doziworo mgbe dum ịgọpụrụ onye ọ bụla nke na-ajụ unu ajụjụ banyere olileanya ahụ nke dị n’ime unu, ma ka unu were nwayọọ na egwu gọpụ.” (1 Pita 3:15) Ọ bụrụ na ọ dịghị adị gị ka ‘e doziworo gị mgbe dum ime ngọpụ,’ adala mbà. Setịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ezi uche dị na ha ndị ga-enyere gị aka iji ntakịrị ntakịrị ruo ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ. Ibu ụzọ mee nkwadebe pụrụ ime ka i nwee ike ịgbanwe okwu gị ma ọ bụ iwebata otu akụkụ akwụkwọ nsọ ma ọ bụ abụọ. Ị pụrụ isetịpụ ihe mgbaru ọsọ nke itinyekwu akwụkwọ ndị e ji amụ Bible, imekwu nletaghachi, ma ọ bụ ịmalite ọmụmụ Bible. Ebe a ga-elekwasị anya ekwesịghị ịbụ kpọmkwem n’ole ha dị—dị ka n’ọnụ ọgụgụ hour, akwụkwọ ndị e tinyere, ma ọ bụ ọmụmụ ihe—kama n’ọdịdị ha. Isetịpụ ihe mgbaru ọsọ ndị ezi uche dị na ha na ịgbalịsi ike iru ha pụrụ inyere anyị aka ịnụ ụtọ inyefe onwe anyị n’ozi ahụ. Nke ahụ bụ ihe Jehova na-achọ—ka anyị ‘were ọṅụ’ na-ejere ya ozi.—Abụ Ọma 100:2; tụlee 2 Ndị Kọrint 9:7.
10. Gịnị bụ ụfọdụ ọrụ ndị Kraịst ọzọ ndị ọ dị mkpa ka anyị na-arụ, oleekwa otú ndị a na-esi enyere anyị aka?
10 E nwekwara ọrụ ndị anyị na-arụ n’ọgbakọ ndị na-ewuli anyị elu n’ime Kraịst. Nke kasị mkpa bụ nke igosirịta ibe anyị ịhụnanya, n’ihi na nke a bụ ihe e ji amata ezi ndị Kraịst. (Jọn 13:34, 35) Mgbe anyị ka na-amụ ihe, ọtụtụ n’ime anyị na-arapara n’ahụ onye nkụzi anyị, dị ka o kwesịrị ịdị. Otú ọ dị, ànyị pụrụ ugbu a ịgbaso ndụmọdụ Pọl ‘ịdị obodobo n’obi’ site n’ịmata ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ? (2 Ndị Kọrint 6:13) Ịhụnanya na ekele anyị dịkwa ndị okenye mkpa. Site n’ịkwado ha, ịchọ na ịnakwere ndụmọdụ ha dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, anyị ga-eme ka ọrụ ha siri ike dịkwuo mfe. (Ndị Hibru 13:17) N’otu oge ahụ, nke a ga-atụnye ụtụ n’anyị ịbụ ndị e wuliri elu n’ime Kraịst.
11. Echiche dị aṅaa ezi uche dị na ya ka anyị kwesịrị inwe banyere baptism?
11 Baptism bụ oge na-akpali akpali! Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ịtụ anya na ndụ ọ bụla a na-ebi mgbe nke ahụ gasịrị ga na-akpali akpali otú ahụ. Akụkụ ka ukwuu nke anyị ịbụ ndị e wuliri elu n’ime Kraịst na-agụnye ‘ịgazi dị ka ihe ahụ si dị.’ (Ndị Filipaị 3:16) Nke ahụ apụtaghị ụzọ ndụ na-agwụ ike, nke na-agbụ agbụ. Nanị ihe ọ pụtara bụ ịga n’ihu n’ụzọ kwụ ọtọ—n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, iwulite àgwà ime mmụọ ndị dị mma na ịgbaso ha kwa ụbọchị, kwa afọ. Cheta, “onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.”—Matiu 24:13.
À ‘Na-eme Ka I Guzosie Ike n’Okwukwe’?
12. Gịnị ka ‘iguzosi ike n’okwukwe’ pụtara?
12 Ná nkebi okwu nke atọ ya nke na-akọwa njegharị anyị n’ime Kraịst, Pọl na-agba anyị ume ịbụ ndị ‘e mere ka ha guzosie ike n’okwukwe.’ Otu nsụgharị na-asị, “ndị e ji n’aka n’ihe banyere okwukwe ahụ,” n’ihi na okwu Grik Pọl jiri mee ihe pụrụ ịpụta “ijide ihe n’aka, imesi nkwa ike, na ime ka ihe kwekọọ n’iwu n’ụzọ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe.” Ka anyị na-eto n’ihe ọmụma, a na-enyekwu anyị ihe mere anyị ga-eji ahụ na okwukwe anyị na Jehova Chineke gbagidesiri mkpọrọgwụ ike ma kwụsie ike n’ezie n’ụzọ kwekọrọ n’iwu. Ihe ọ ga-arụpụta bụ anyị iguzosi ike karị. Ọ na-esiwanyere ụwa Setan ike ibufu anyị. Nke a na-echetara anyị ndụmọdụ Pọl ‘ka a na-eburu anyị ruo n’itozu okè.’ (Ndị Hibru 6:1) Ntozu okè na iguzosi ike na-agakọ.
13, 14. (a) Ndị Kraịst narị afọ mbụ nọ na Kọlọsi chere ihe iyi egwu dị aṅaa nye nguzosi ike ha ihu? (b) Olee ihe pụrụ ichegbuworị Pọl onyeozi?
13 E yiri nguzosi ike nke ndị Kraịst narị afọ nke mbụ nọ na Kọlọsi egwu. Pọl dọrọ aka ná ntị, sị: “Lezienụ anya ka onye ọ bụla ghara iwere ịhụ amamihe n’anya na aghụghọ efu nke ya bụrụ onye na-ezu unu n’ohi, ịhụ amamihe n’anya nke dị ka ihe ozizi mmadụ nyere idebe, dị ka ozizi mbụ nke ụwa, ma ọ dịghị ka Kraịst si dị.” (Ndị Kọlọsi 2:8) Pọl achọghị ka ndị Kọlọsi, bụ́ ndị ghọworo ndị “alaeze nke Ọkpara nke ịhụnanya [Chineke],” na-achị bụrụ ndị e bufuru, ndị e duuru pụọ n’ọnọdụ ime mmụọ ha a gọziri agọzi. (Ndị Kọlọsi 1:13) Ịbụ ndị e ji ụzọ dị aṅaa dufuo? Pọl rụtụrụ aka ‘n’ịhụ amamihe n’anya,’ bụ́ nanị oge okwu a pụtara na Bible. Ọ̀ nọ na-ekwu banyere ndị ọkà ihe ọmụma Grik, dị ka Plato na Socrates? Ọ bụ ezie na ndị a na-eyi ezi ndị Kraịst egwu, n’ụbọchị ndị ahụ, a na-eji okwu ahụ bụ́ “ịhụ amamihe n’anya” eme ihe n’ụzọ sara mbara. Ọ na-ezokarị aka n’ọtụtụ ìgwè na echiche ndị ụfọdụ nwere—ọbụna ndị nke okpukpe. Dị ka ihe atụ, ndị Juu narị afọ mbụ dị ka Josephus na Philo kpọrọ okpukpe nke ha ịhụ amamihe n’anya—e leghị anya iji mekwuo ka ọ na-adọrọ mmasị.
14 Ụfọdụ echiche ịhụ amamihe n’anya nke pụrụ ichegbuworị Pọl bụ nke okpukpe. Mgbe e mesịrị n’otu isiakwụkwọ ahụ nke akwụkwọ ozi o degaara ndị Kọlọsi, ọ gwara ndị na-akụzi, “Ejidela, edetụla ire, emetụkwala aka” okwu, bụ́ ndị si otú ahụ na-ezo aka n’akụkụ dị iche iche nke Iwu Mosis bụ́ nke ọnwụ Kraịst mere ka ọ ghara ịdịzi irè. (Ndị Rom 10:4) Tinyere ịhụ amamihe n’anya nke ndị na-ekpere arụsị, mmetụta ndị na-eyi ọnọdụ ime mmụọ nke ọgbakọ ahụ egwu nọ n’ọrụ. (Ndị Kọlọsi 2:20-22) Pọl dọrọ aka ná ntị megide ịhụ amamihe n’anya nke bụ akụkụ nke “ozizi mbụ nke ụwa.” Ọ bụ mmadụ malitere ozizi ụgha dị otú ahụ.
15. Olee otú anyị pụrụ isi zere ịbụ ndị echiche Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị nke na-akpọ anyị ihu dọpụrụ uche?
15 Ịkwalite echiche mmadụ ndị na-adaberesighị ike n’Okwu Chineke pụrụ iyi nguzosi ike onye Kraịst egwu. Anyị taa aghaghị ịkpachara anya maka ụdị iyi egwu ndị ahụ. Jọn onyeozi gbara ume, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, unu ekwela okwu mmụọ nile, kama nwapụtanụ ndị mmụọ ahụ, ma ha bụ ndị siri na Chineke pụta.” (1 Jọn 4:1) Ya mere ọ bụrụ na nwa akwụkwọ ibe gị anwaa ime ka i kweta na ibi ndụ n’ụzọ kwekọrọ n’ụkpụrụ Bible bụ ihe mgbe ochie, ma ọ bụ ọ bụrụ na onye agbata obi gị achọọ ịkwali gị ka ị nakwere àgwà nke ịhụ ihe onwunwe n’anya, ma ọ bụ ọ bụrụ na onye ọrụ ibe gị ejiri aghụghọ rụgide gị imebi akọ na uche gị e ji Bible zụọ, ma ọ bụ ọbụna ọ bụrụ na onye kwere ekwe ibe gị ekwuo okwu nkatọ, nke na-adịghị mma banyere ndị ọzọ nọ n’ọgbakọ dabere n’echiche nke onwe ya, anakwerela nnọọ ihe ha na-ekwu. Wepụ ihe na-ekwekọghị n’Okwu Chineke. Ka anyị na-eme otú ahụ, anyị ga-ejigide nguzosi ike anyị ka anyị na-ejegharị n’ime Kraịst.
‘Na-ekelebiga Ókè n’Okwukwe’
16. Gịnị bụ akụkụ nke anọ nke ijegharị n’ime Kraịst, ajụjụ dịkwa aṅaa ka anyị pụrụ ịjụ?
16 Akụkụ nke anọ nke ijegharị n’ime Kraịst nke Pọl kpọtụrụ aha bụ ka anyị ‘na-ekelebiga ókè n’okwukwe.’ (Ndị Kọlọsi 2:7) Okwu ahụ bụ́ ‘na-ekelebiga ókè’ na-echetara anyị osimiri nke na-ejubiga ókè n’akụkụ ya. Nke a na-atụ aro na nye anyị dị ka ndị Kraịst, ekele anyị ga-abụ ihe na-aga n’ihu ma ọ bụ àgwà anyị. Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ịjụ, sị, ‘M̀ na-enwe ekele?’
17. (a) N’ihi gịnị ka a pụrụ iji kwuo na anyị nile nwere ihe dị ukwuu anyị ga-enye ekele banyere ha, ọbụna n’oge ihe isi ike? (b) Gịnị bụgasị ụfọdụ onyinye sitere n’aka Jehova bụ́ ndị ị na-enwe ekele banyere ha karịsịa?
17 N’ezie, anyị nile nwere ihe mere anyị ga-eji na-ekelebiga Jehova ókè kwa ụbọchị. Ọbụna n’oge ndị kasị njọ, a pụrụ inwe ụfọdụ ihe ndị dị nta pụrụ iweta ahụ efe. Enyi egosi ọmịiko. Onye a hụrụ n’anya ebitụ aka n’ụzọ na-emesighachi obi ike. Ezigbo ụra abalị abụrụ ihe na-eweghachi ume ọhụrụ. Nrị dị ụtọ akụjụọ ihe mgbu nke agụụ. Ube nnụnụ, ọchị nwatakịrị, igwe na-acha anụnụ anụnụ nke gbachapụrụ agbachapụ, ikuku na-enye ume ọhụrụ—ihe ndị a nile na ndị ọzọ pụrụ ịkpọ anyị ihu n’otu ụbọchị. Ọ dị nnọọ mfe iwere onyinye ndị dị otú ahụ n’ihe dị nta. Ọ̀ bụ na ha nile ekwesịghị ka a sị i meela maka ha? Ha nile sitere n’aka Jehova, Isi Iyi nke “ezi onyinye ọ bụla na ihe ọ bụla zuru okè nke e nyere enye.” (Jemes 1:17) O nyewokwa anyị onyinye ndị kagbunyụrụ ndị a anya—dị ka ihe atụ, ndụ n’onwe ya. (Abụ Ọma 36:9) Ọzọkwa, o nyewokwa anyị ohere ịdị ndụ ebighị ebi. Iji nye onyinye a, Jehova chụrụ àjà kasịnụ site n’izite Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ “ihe na-atọ Ya ụtọ.”—Ilu 8:30; Jọn 3:16.
18. Olee otú anyị pụrụ isi gosi Jehova ekele anyị?
18 Mgbe ahụ, lee ka okwu ọbụ abụ ahụ si bụrụ eziokwu: “Ọ bụ ezi ihe ikele Jehova ekele.” (Abụ Ọma 92:1) N’otu aka ahụ, Pọl chetaara ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka, sị: “Na-ekelenụ ekele n’ihe nile ọ bụla.” (1 Ndị Tesalọnaịka 5:18; Ndị Efesọs 5:20; Ndị Kọlọsi 3:15) Onye ọ bụla n’ime anyị pụrụ ikpebi ịdị na-enwe ekele karị. Ọ dịghị mkpa ka ihe ga-emejupụta ekpere anyị bụrụ nanị ịrịọ Chineke arịrịọ banyere ihe ndị na-akpa anyị. Ndị a dịkwa mma. Ma chetụdị banyere otu enyi nke na-agwa gị okwu nanị mgbe ọ chọrọ ihe n’aka gị! Ya mere gịnị ma i kpegara Jehova ekpere nanị iji kelee ma too ya? Lee ka ekpere dị otú ahụ na-aghaghị isi tọọ ya ụtọ mgbe ọ na-eleda anya n’ụwa a na-enweghị ekele! Abamuru nke abụọ bụ na ekpere ndị dị otú ahụ pụrụ inyere anyị aka ilekwasị anya n’akụkụ ndị dị mma nke ndụ, na-echetara anyị otú anyị si bụrụ ndị a gọziri agọzi n’ezie.
19. Olee otú okwu Pọl ji mee ihe ná Ndị Kọlọsi 2:6, 7 si na-egosi na anyị nile pụrụ ịnọgide na-emeziwanye ihe n’isoro Kraịst na-ejegharị?
19 Ọ́ dịghị ịrịba ama otú a pụrụ isi nweta nduzi amamihe dị ukwuu n’otu akụkụ nke Okwu Chineke? Ndụmọdụ Pọl nke ịnọgide na-eso Kraịst na-ejegharị bụ ihe onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị iburu n’obi. Ya mere ka anyị kpebisie ike ‘ịgbagide mkpọrọgwụ n’ime Kraịst,’ ịbụ “ndị a na-ewulikwa elu dị ka ụlọ n’ime Ya,” ‘na-eguzosi ike n’okwukwe,’ ma ‘na-ekelebiga ókè.’ Ndụmọdụ dị otú ahụ dị oké mkpa karịsịa nye ndị e mere baptism ọhụrụ. Ma o metụtara anyị nile. Chee echiche otú mkpọrọgwụ na-esi erubawanye n’ime ala nakwa otú ụlọ a na-ewu ewu na-esi arịkwu elu. Ya mere njegharị anyị na-eso Kraịst na-ejegharị adịghị akwụsị akwụsị ma ọlị. E nwere ohere juru eju maka uto. Jehova ga-enyere anyị aka, gọziekwa anyị, n’ihi na ọ chọrọ ka anyị nọgide na-eso ya na Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya na-ejegharị n’akwụsịghị akwụsị.
Olee Otú Ị Ga-esi Zaa?
◻ Gịnị ka ijegharị n’ime Kraịst gụnyere?
◻ Gịnị ka ‘ịgbagide mkpọrọgwụ n’ime Kraịst’ pụtara?
◻ Olee otú a pụrụ isi ‘wulie anyị elu dị ka ụlọ n’ime Kraịst’?
◻ N’ihi gịnị ka ‘iguzosi ike n’okwukwe’ ji dị oké mkpa?
◻ Olee ihe ndị mere anyị ga-eji ‘na-ekelebiga ókè’?
[Foto dị na peeji nke 10]
E nwere ike a gaghị ahụ mkpọrọgwụ osisi anya, ma ha na-enye ya nri, na-emekwa ka o guzosie ike