Isi nke 2
Akwụkwọ nke Na-ekpughe Ihe Ọmụma Chineke
1, 2. N’ihi gịnị ka anyị ji nwee mkpa maka nduzi Onye Okike anyị?
Ọ BỤ nnọọ ihe ezi uche dị na ya na Onye Okike anyị na-ahụ n’anya ga-enye ihe a kpọrọ mmadụ akwụkwọ ntụziaka na nduzi. Ọ̀ bụkwa na i kwetaghị na ụmụ mmadụ nwere mkpa nduzi?
2 Ihe karịrị 2,500 afọ gara aga, otu onye amụma na ọkọ akụkọ ihe mere eme dere, sị: “Ọ bụghị onye ọ bụla nke na-eje ije nwe ime ka nzọụkwụ ya guzosie ike.” (Jeremaịa 10:23) Taa, ịbụ eziokwu nke okwu ahụ na-apụta ìhè karịa mgbe ọ bụla. N’ihi ya, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ William H. McNeill na-arịba ama: “Ahụmahụ mmadụ na mbara ala nke a afọwo nke nta ka ọ bụrụ ndịgide nke usoro ọgba aghara na ntisasị na-enweghị nkwụsịtụ nke nhazi ọha mmadụ e guzobere eguzobe.”
3, 4. (a) Olee otú anyị kwesịrị isi lee ọmụmụ Bible anya? (b) Olee otú anyị ga-esi gaa n’ihu ná nnyocha nke Bible?
3 Bible na-emezu mkpa anyị nile maka nduzi nke amamihe dị na ya. N’eziokwu, ọ na-eju ọtụtụ ndị anya mgbe ha nyochara Bible nke mbụ ya. Ọ bụ akwụkwọ buru ibu, akụkụ ya ụfọdụ adịghịkwa mfe nghọta. Ma ọ bụrụ na e nyere gị akwụkwọ usoro iwu nke na-egosipụta ihe ọ dị mkpa ka i mee iji nweta ihe nketa bara uru, ọ̀ bụ na ị gaghị ewepụta oge iji jiri nlezianya mụọ ya? Ọ bụrụ na akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ ahụ esiere gị ike nghọta, ma eleghị anya ị ga-enweta enyemaka nke onye nwere ahụmahụ n’okwu ndị dị otú ahụ. Gịnị ma i lee Bible anya n’otu echiche ahụ? (Ọrụ 17:11) O metụtara ihe dị ukwuu karịa ihe nketa nke ihe onwunwe. Dị ka anyị mụtara n’isiakwụkwọ bu ụzọ, ihe ọmụma Chineke pụrụ iduba ná ndụ ebighị ebi.
4 Ka anyị nyochaa akwụkwọ ahụ nke na-ekpughe ihe ọmụma Chineke. Anyị ga-ebu ụzọ nye nchịkọta dị mkpirikpi nke Bible. E mesịa anyị ga-atụle ihe ndị mere ọtụtụ ndị maara nke a na-akọ ji kwere na ọ bụ Okwu Chineke sitere n’ike mmụọ nsọ.
IHE DỊ N’IME BIBLE
5. (a) Gịnị dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru? (b) Gịnị dị n’Akwụkwọ Nsọ Grik?
5 Bible nwere 66 akwụkwọ n’ime nkebi abụọ, ndị a na-akpọkarị Agba Ochie na Agba Ọhụrụ. E dere 39 akwụkwọ nke Bible n’asụsụ Hibru karịsịa, 27 kwa n’asụsụ Grik. Akwụkwọ Nsọ Hibru, nke ihe mejupụtara ya bụ Jenesis ruo Malakaị, na-ekwu banyere okike tinyere 3,500 afọ nke mbụ nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. N’inyocha akụkụ nke a nke Bible, anyị na-amụ banyere otú Chineke si mesoo ndị Israel—site n’ọmụmụ ha dị ka mba na narị afọ nke 16 T.O.A. gaa n’ihu banye n’ime narị afọ nke 5 T.O.A.a Akwụkwọ Nsọ Grik, nke nwere akwụkwọ Matiu ruo Mkpughe, na-elekwasị anya n’ozizi na ọrụ Jisọs Kraịst na ndị na-eso ụzọ ya n’ime narị afọ mbụ O.A.
6. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji mụọ Bible dum?
6 Ụfọdụ na-azọrọ na “Agba Ochie” bụ maka ndị Juu na “Agba Ọhụrụ” bụ maka ndị Kraịst. Ma dị ka 2 Timoti 3:16 na-ekwu, “ihe ọ bụla e deworo n’akwụkwọ nsọ bụ ihe si n’obi Chineke pụta, ọ bakwara uru.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) N’ihi ya, ezigbo ọmụmụ ihe nke Akwụkwọ Nsọ aghaghị ịgụnye Bible dum. N’ezie, akụkụ abụọ ndị ahụ nke Bible na-emejupụta ibe ha, na-agwakọta nke ọma iwepụta otu isiokwu chịkọtara ihe nile.
7. Gịnị bụ isiokwu nke Bible?
7 Ma eleghị anya i jewo nzukọ okpukpe ruo ọtụtụ afọ ma nụ ka a gụpụtara akụkụ ụfọdụ nke Bible n’olu dara ụda. Ma ọ bụ ị pụrụ ịgụwo ihe ndị e wepụtara na ya n’onwe gị. Ị̀ maara na Bible nwere otu echiche site na Jenesis ruo Mkpughe? Ee, otu isiokwu nwere nkwekọ gbasazuru Bible dum. Gịnị bụ isiokwu ahụ? Ọ bụ iwepụ oruru o ruuru Chineke ịchị ihe a kpọrọ mmadụ n’ụta na mmezu nke nzube ịhụnanya ya site n’Alaeze ya. E mesịa, anyị ga-ahụ kpọmkwem otú Chineke ga-esi mezuo nzube nke a.
8. Gịnị ka Bible na-ekpughe banyere ụdị onye Chineke bụ?
8 Tụkwasị n’igosipụta nzube Chineke, Bible na-ekpughe ụdị onye ọ bụ. Dị ka ihe atụ, site na Bible anyị na-amụta na ihe na-emetụ Chineke n’ahụ nakwa na nhọrọ ndị anyị na-eme na-agbasa ya. (Abụ Ọma 78:40, 41; Ilu 27:11; Ezikiel 33:11) Abụ Ọma 103:8-14 na-ekwu na Chineke nwere “obi ebere, na-emekwa amara, Ọ dịghị ewe iwe ọsọ ọsọ, Ọ na-abakwa ụba n’ebere.” Ọ na-emeso anyị n’ụzọ ọmịiko, ‘na-echeta na anyị bụ ájá nkịtị’ ma na-alaghachi na ya mgbe anyị nwụrụ. (Jenesis 2:7; 3:19) Lee àgwà ndị magburu onwe ha ọ na-egosipụta! Nke a ọ́ bụghị ụdị Chineke ị chọrọ ife ofufe?
9. Olee otú Bible si enye echiche doro anya banyere ụkpụrụ nile nke Chineke, oleekwa ụzọ anyị pụrụ isi rite uru n’ihe ọmụma dị otú ahụ?
9 Bible na-enye anyị nghọta pụtara ìhè nke ụkpụrụ dị iche iche nke Chineke. Mgbe ụfọdụ a na-enye ndị a dị ka iwu. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe karị, a na-egosipụta ha n’ụkpụrụ dị iche iche a na-akụzi site n’ihe atụ ndị a na-ahụ anya. Chineke mere ka e detuo ihe omume ụfọdụ ndị mere n’akụkọ ihe mere eme nke Israel oge ochie maka abamuru anyị. Ihe ndekọ ndị a bụ eziokwu na-egosi ihe na-eme mgbe ndị mmadụ rụrụ ọrụ n’ụzọ kwekọrọ ná nzube Chineke, tinyekwara ihe mwute na-esi na ya apụta mgbe ha mere ihe n’ụzọ nke aka ha. (1 Ndị Eze 5:4; 11:4-6; 2 Ihe Emere 15:8-15) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ịgụ ihe ndekọ ndị dị otú ahụ mere eme ga-emetụ anyị n’obi. Ọ bụrụ na anyị anwaa iji anya nke uche hụ ihe omume ndị ahụ e deturu, anyị pụrụ ịhụ otú anyị si yie ndị ahụ o metụtara. N’ime otú ahụ, anyị pụrụ irite uru site n’ihe atụ ndị dị mma, nweekwa ike izere ọnyà ndị matara ndị mere ihe ọjọọ. Otú ọ dị, ajụjụ nke a dị mkpa chọrọ azịza: Olee otú anyị pụrụ isi jide n’aka na ihe anyị na-agụta na Bible si n’ike mmụọ nsọ Chineke n’ezie?
Ị̀ PỤRỤ ỊTỤKWASỊ BIBLE OBI?
10. (a) N’ihi gịnị ka o ji adị ụfọdụ ka Bible ọ̀ bụ ihe oge ya gafeworo? (b) Gịnị ka 2 Timoti 3:16, 17 na-agwa anyị banyere Bible?
10 Ikekwe ị rịbawo ama na ọtụtụ akwụkwọ na-enye okwu ndụmọdụ na-aghọ ihe oge ya gafeworo n’ime nanị afọ ole na ole. Gịnị banyere Bible? O mewo ochie nke ukwuu, ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ agabigawokwa kemgbe e deturu mkpụrụ okwu ya ndị ikpeazụ. N’ihi ya ụfọdụ na-eche na o kwesịghịrị oge ọgbara ọhụrụ anyị. Ma ọ bụrụ na Bible sitere n’obi Chineke, okwu ndụmọdụ ya kwesịrị mgbe nile ịbụ ihe kasị ọhụrụ n’agbanyeghị oké afọ ndụ ya. Akwụkwọ Nsọ ka kwesịkwara ‘ịba uru iji zie ihe, na iji tụọ mmadụ mmehie ha n’anya, na iji mee ka uche mmadụ guzozie, na iji zụpụta nzụpụta nke dị n’ezi omume: ka onye nke Chineke wee zuo okè, onye e meworo ka o zuo okè ịrụ ezi ọrụ nile ọ bụla.’—2 Timoti 3:16, 17.
11-13. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Bible dị irè maka oge anyị?
11 Nnyocha chiri anya na-egosi na ụkpụrụ nile nke Bible bara uru taa dị nnọọ ka ọ bara mgbe mbụ e deturu ha. Dị ka ihe atụ, mgbe a bịara n’ihe banyere ọdịdị mmadụ, Bible na-egosipụta nghọta dị nnọọ mma nke dịịrị ọgbọ ọ bụla nke ihe a kpọrọ mmadụ. N’ụzọ dị mfe anyị pụrụ ịhụ nke a n’Ozizi Elu Ugwu nke Jisọs, nke a na-achọta n’akwụkwọ Matiu, isi 5 ruo 7. Ozizi nke a metụrụ onye bụbu onye ndú ndị India bụ́ Mohandas K. Gandhi n’obi nke ukwuu nke na ọ gwara onye na-arụrụ ndị Britain ọrụ, dị ka ihe a kọrọ si dị, sị: “Mgbe mba nke gị na nke m ga-ekwenyekọ n’ozizi nile nke Kraịst ziri n’ime Ozizi Elu Ugwu nke a, anyị ga-edoziwo ihe isi ike nile, ọ bụghị nanị nke mba anyị dị iche iche, kama ọ bụ nke elu ụwa dum.”
12 Ka a sịkwa ihe mere nkụzi Jisọs ji eru ndị mmadụ n’ahụ! N’Ozizi Elu Ugwu ya, o gosiri anyị ụzọ na-eduga n’ezi obi ụtọ. Ọ kọwara ụzọ isi dozie esemokwu. Jisọs nyere ntụziaka banyere otú e si ekpe ekpere. O gosipụtara àgwà amamihe kasị dị na ya a ga-enwe n’ebe mkpa ihe onwunwe dị ma nye Ụkpụrụ Ọma ahụ maka iso ndị ọzọ nwee mmekọrịta kwesịrị ekwesị. Ụzọ isi mata ndị aghụghọ okpukpe na ụzọ isi nwee ọdịnihu dị ntụkwasị obi sokwa n’isi ihe ndị ọ tụlere n’ozizi a.
13 N’Ozizi Elu Ugwu ahụ na n’ime peji ya nile ndị ọzọ, Bible na-agwa anyị n’ụzọ doro anya ihe anyị ga-eme na ihe anyị ga-ezere iji meziwanye ọnọdụ anyị ná ndụ. Ndụmọdụ ya dị irè nke ukwuu nke na a kpaliri otu onye nkụzi ikwu, sị: “Ọ bụ ezie na m bụ onye ndụmọdụ ụlọ akwụkwọ dị elu nke nwere akara mmụta bachelor na master, agụwokwa m ọnụ ọgụgụ akwụkwọ dị ukwuu banyere ahụ ike nke uche na akparamàgwà, achọpụtara m na ndụmọdụ Bible n’ihe ndị dị ka inwe alụmdi na nwunye na-aga nke ọma, igbochi nnupụisi ụmụaka na ụzọ isi nweta ma nọgide na-enwe ndị enyi dị elu nke ukwuu karịa ihe ọ bụla m gụworo ma ọ bụ mụọ na mahadum.” Tụkwasị n’ịdị irè na ikwesị oge a, a pụrụ ịdabere na Bible.
O ZIRI EZI, KWESỊKWA NDABERE
14. Gịnị na-egosi na Bible ziri ezi ná nkà mmụta sayensị?
14 Ọ bụ ezie na Bible abụghị akwụkwọ sayensị, o ziri ezi ná nkà mmụta sayensị. Dị ka ihe atụ, n’oge mgbe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ụmụ mmadụ kwenyere na ụwa dị larịị, Aịsaịa onye amụma zoro aka n’ebe ọ dị dị ka ihe dị “gburugburu” (Hibru, chugh, nke na-enye n’ebe a echiche nke “okirikiri”). (Aịsaịa 40:22) Ọha mmadụ anakwereghị echiche nke ụwa dị okirikiri ruo ọtụtụ puku afọ mgbe ụbọchị Aịsaịa gasịrị. Ọzọkwa, Job 26:7—nke e dere ihe karịrị 3,000 afọ gara aga—na-ekwu na Chineke “na-ekokwasị ụwa n’ihe na-abụghị ihe.” Otu onye mmụta Bible kwuru, sị: “Otú Job si mara eziokwu ahụ, nke nkà mmụta ọdịdị mbara igwe nwapụtaworo, nke na ụwa na-ekokwasị n’enweghị ihe na-akwado ya na mbara igwe tọgbọ chakoo, bụ ajụjụ nke na-adịghịrị ndị na-agọnarị isite n’ike mmụọ nsọ nke Akwụkwọ Nsọ mfe inweta azịza ya.”
15. Olee otú e si na-eme ka obi ike e nwere na Bible sie ike site n’ụzọ e si kọọ akụkọ ya nile?
15 Ụzọ e si akọ akụkọ bụ́ nke a na-achọta na Bible na-emekwu ka obi ike anyị sie ike n’akwụkwọ a nke meworo ochie. N’adịghị ka akụkọ ọdịbendị na-emeghị eme, e jikọrọ ihe ndị merenụ bụ́ ndị a kọrọ n’ime Bible ha na ndị mmadụ na akara ụbọchị dị iche iche kpọmkwem. (1 Ndị Eze 14:25; Aịsaịa 36:1; Luk 3:1, 2) Ebe ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme n’oge ochie n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’oge nile na-ekwubiga okwu ókè banyere mmeri nke ndị ọchịchị ha ma na-ezochi mmeri ndị e meriri ha na ihe ndị ha mehiere, ndị dere Bible kwuru ihe hoo haa na n’eziokwu—ọbụna banyere ajọ mmehie ndị nke ha onwe ha.—Ọnụ Ọgụgụ 20:7-13; 2 Samuel 12:7-14: 24:10.
AKWỤKWỌ NKE AMỤMA
16. Gịnị bụ ihe àmà kasị ike nke na Bible sitere n’obi Chineke?
16 Amụma e mezuru emezu na-enye ihe àmà na-enweghị mgbagha nke na Bible sitere n’obi Chineke. Bible nwere ọtụtụ amụma ndị e mezuworo n’akụkụ nile. O doro anya na ụmụ mmadụ nkịtị apụghị ịkpata nke a. Mgbe ahụ, olee ihe kpatara amụma ndị a? Bible n’onwe ya na-asị na “ọ dịghị amụma ọ bụla nke e ji ọchịchọ mmadụ buo mgbe ọ bụla: kama mmadụ sitere na Chineke kwuo okwu, mgbe Mmụọ Nsọ [ma ọ bụ ike ọrụ Chineke] na-eme ka ha kwuo.” (2 Pita 1:21) Tụlee ihe atụ ụfọdụ.
17. Olee amụma ndị kwuru maka ọdịda Babilọn, è sikwa aṅaa mezuo ndị a?
17 Ọdịda nke Babilọn. Ma Aịsaịa ma Jeremaịa buchara amụma ọdịda Babilọn n’aka ndị Midia na ndị Peasia. N’ụzọ dị ịrịba ama, e dekọrọ amụma Aịsaịa banyere ihe omume a mgbe Babilọn nọ n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke ike ya, ihe dị ka 200 afọ tupu e merie Babilọn! Akụkụ ndị na-esonụ nke amụma ahụ bụ ugbu a ihe ndị dị n’ihe ndekọ akụkọ ihe mere eme: ime ka Osimiri Yufretis takọọ site n’ịwara mmiri ya ụzọ banye n’ọdọ mmiri mmadụ gwuru (Aịsaịa 44:27; Jeremaịa 50:38); ụkọ nke nchebe site n’elezighị anya n’ọnụ ụzọ ámá nile nke osimiri Babilọn (Aịsaịa 45:1); na mmeri nke onye ọchịchị a kpọrọ Saịrọs meriri.—Aịsaịa 44:28.
18. Olee otú e si mezuo amụma Bible ná mbilite na ọdịda nke ‘eze Gris’?
18 Mbilite na ọdịda nke ‘eze Gris.’ N’otu ọhụụ, Daniel hụrụ otu mkpi ka ọ sọturu otu ebulu, na-agbaji mpi ya abụọ. E mesịa, a gbajiri nnukwute mpi mkpi ahụ, mpi anọ bilitekwara n’ọnọdụ ya. (Daniel 8:1-8) A kọwaara Daniel sị: “Ebulu ahụ nke ị hụrụ, nke nwere mpi abụọ, ha bụ eze nke Midia na Peasia. Mkpi ahụ nke nwere ajị hie nne bụ eze Jevan [Gris]: ma mpi ukwu ahụ nke dị n’etiti anya ya abụọ, nke ahụ bụ eze mbụ. Ma mpi ahụ, nke gbajiri agbaji, nke mpi anọ guzoro n’ọnọdụ ya, alaeze anọ ga-esi ná mba ahụ guzo, ma ọ bụghị n’ike ya.” (Daniel 8:20-22) N’ikwekọ n’amụma a, ihe dị ka narị afọ abụọ n’ihu, ‘eze Gris,’ bụ́ Aleksanda Onye Ukwu, kwaturu Alaeze Ukwu Medo-Peasia nke bụ mpi abụọ ahụ. Aleksanda nwụrụ na 323 T.O.A., anọ n’ime ndị ọchịagha ya mesịkwara nọchie ya. Otú ọ dị, ọ dịghị nke n’ime alaeze ndị a sochirinụ nke nwere ike hà ka nke alaeze ukwu Aleksanda.
19. Olee amụma ndị e mezuru na Jisọs Kraịst?
19 Ndụ Jisọs Kraịst. Akwụkwọ Nsọ Hibru nwere ọtụtụ amụma ndị e mezuru n’ọmụmụ, ozi, ọnwụ, na mbilite n’ọnwụ Jisọs. Dị ka ihe atụ, ihe karịrị 700 afọ tupu o mee, Maịka kwuru na a ga-amụ Mesaịa ahụ, ma ọ bụ Kraịst, na Betlehem. (Maịka 5:2; Luk 2:4-7) Onye ya na Maịka buru amụma n’otu oge bụ́ Aịsaịa kwuru na a ga-eti Mesaịa ahụ ihe ma bụọ ya ọnụ mmiri. (Aịsaịa 50:6; Matiu 26:67) Narị afọ ise tupu o mee, Zekaraịa buru amụma na a ga-arara Mesaịa ahụ nye n’ọnụ ego 30 ọlaọcha. (Zekaraịa 11:12; Matiu 26:15) Ihe karịrị otu puku afọ tupu oge ya, Devid kwuru ọnọdụ ndị a ga-ejikọ ha na ọnwụ Jisọs bụ́ Mesaịa ahụ. (Abụ Ọma 22:7, 8, 18; Matiu 27:35, 39-43) Ihe dịkwa ka narị afọ ise tupu o mee, amụma Daniel kpughere mgbe Mesaịa ahụ ga-apụta nakwa ogologo oge ozi ya ga-ewe na oge ọnwụ ya. (Daniel 9:24-27) Nke a bụ nanị ihe atụ ụfọdụ nke amụma ndị mezuru na Jisọs Kraịst. Ị ga-ahụ na ọ bụ ihe na-enyeghachi ụgwọ ọrụ ịgụkwu banyere ya ma e mesịa.
20. Ihe ndekọ zuru okè nke Bible nke amụma e mezuru emezu kwesịrị inye anyị obi ike dị aṅaa?
20 Ọtụtụ amụma ndị ọzọ nke Bible bụ́ ndị metụtara ogologo oge emezuworị. ‘Ma,’ ka ị pụrụ ịjụ, ‘olee otú nke a si emetụta ndụ m?’ Ọ dị mma, ọ bụrụ na ọ dị onye gwaworo gị eziokwu ruo ọtụtụ afọ, ị̀ ga-anọkata na mberede malite inyo ya enyo mgbe o kwuru ihe ọhụrụ? Ee e! Chineke ekwuwo eziokwu n’ime Bible dum. Nke a ó kwesịghị iwulite ntụkwasị obi gị n’ihe ndị Bible na-ekwe nkwa ha, dị ka amụma ya ndị metụtara paradaịs elu ụwa nke na-abịanụ? N’ezie, anyị pụrụ inwe otu obi ike ahụ Pọl nwere, bụ́ otu n’ime ndị na-eso ụzọ Jisọs na narị afọ mbụ, onye dere na ‘Chineke apụghị ikwu okwu ụgha.’ (Taịtọs 1:2) Ọzọkwa, mgbe anyị gụrụ Akwụkwọ Nsọ ma tinye ndụmọdụ ya n’ọrụ, anyị na-egosipụta amamihe nke ụmụ mmadụ na-apụghị inweta n’ike aka ha, n’ihi na Bible bụ akwụkwọ nke na-ekpughe ihe ọmụma Chineke nke na-eduba ná ndụ ebighị ebi.
‘KA AGỤỤ NA-AGỤ GỊ’ MAKA IHE ỌMỤMA CHINEKE
21. Gịnị ka i kwesịrị ime ma ọ bụrụ na ihe ụfọdụ ị mụtara na Bible eyie ihe na-ebu isi?
21 Ka ị na-amụ Bible, o yikarịrị ka ị ga-amụta ihe ndị dị iche n’ihe a kụzibuuru gị n’oge gara aga. Ọbụna na ị pụrụ ịhụ na ụfọdụ n’ime omenala okpukpe ndị i nweburu mmasị dị ukwuu na ha adịghị amasị Chineke. Ị ga-amụta na Chineke nwere ụkpụrụ dị iche iche nke ezi ihe na ihe ọjọọ bụ́ ndị ka ndị jupụtara n’ụwa a na-anakwere ihe nile elu. Nke a pụrụ iyi ihe na-ebu isi na mbụ. Ma nwee ndidi! Jiri nlezianya nyochaa Akwụkwọ Nsọ iji chọta ihe ọmụma Chineke. Nwee obi ghere oghe banyere ohere e nwere na ndụmọdụ Bible pụrụ ịchọ ime mgbanwe n’echiche na omume gị.
22. N’ihi gịnị ka i ji na-amụ Bible, ị̀ pụkwara isi aṅaa nyere ndị ọzọ aka ịghọta nke a?
22 Ndị enyi na ndị ikwu bu ezi ihe n’obi pụrụ imegide ọmụmụ Bible gị, ma Jisọs sịrị: “Onye ọ bụla ga-ekwupụta m n’ihu mmadụ, ya ka Mụ onwe m ga-ekwupụtakwa n’ihu Nna m Nke bi n’eluigwe. Ma onye ọ bụla nke ga-agọnarị m n’ihu mmadụ, ya ka Mụ onwe m ga-agọnarịkwa n’ihu Nna m Nke bi n’eluigwe.” (Matiu 10:32, 33) Ụfọdụ pụrụ ịtụ egwu na ị ga-etinye aka n’òtù nzuzo ma ọ bụ ghọọ onye na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè. Otú ọ dị, n’ikwu eziokwu, nanị ihe ị na-eme bụ ịgbalị inweta ezi ihe ọmụma nke Chineke na nke eziokwu ya. (1 Timoti 2:3, 4) Iji nyere ndị ọzọ aka ịghọta nke a, nwee ezi uche, ọ bụghị ịdị na-arụ ụka, mgbe ị naagwa ha okwu banyere ihe ị na-amụta. (Ndị Filipaị 4:5) Cheta na ‘a na-erite ọtụtụ n’uru n’ebe a na-ekwughị okwu’ mgbe ha na-ahụ ihe àmà na ihe ọmụma Bible na-abara ndị mmadụ uru n’ezie.—1 Pita 3:1, 2.
23. Olee otú ị pụrụ isi nwee “agụụ” maka ihe ọmụma Chineke?
23 Bible na-agba anyị ume, sị: “Dị ka ụmụ a mụrụ ọhụrụ, ka agụụ mmiri ara nke okwu Chineke, nke aghụghọ na-adịghị ya, na-agụsi unu ike.” (1 Pita 2:2) Nwa a mụrụ ọhụrụ na-adabere ná nri sitere n’ahụ nne ya, ọ na-esikwa ọnwụ ka e gboo mkpa ahụ. N’otu aka ahụ, anyị dabeere n’ihe ọmụma sitere n’aka Chineke. ‘Ka agụụ na-agụ gị’ maka Okwu ya site n’ịga n’ihu n’ọmụmụ ihe gị. N’ezie, mee ya ihe mgbaru ọsọ gị ịgụ Bible kwa ụbọchị. (Abụ Ọma 1:1-3) Nke a ga-ewetara gị ngọzi bara ụba, n’ihi na Abụ Ọma 19:11 na-ekwu banyere iwu Chineke, sị: “N’idebe ha ka ọ̀kpụ̀kpụ̀ ọrụ hiri nne na-apụta.”
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a T.O.A. pụtara “tupu Oge Anyị,” bụ́ nke ziri ezi karịa B.C. (“before Christ” [tupu Kraịst]). O.A. na-egosi “Oge Anyị,” nke a na-akpọkarị A.D., maka anno Domini, nke pụtara “n’ime afọ nke Onyenwe anyị.”
NWALEE IHE ỌMỤMA GỊ
N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Bible na-adịghị ka akwụkwọ ọ bụla ọzọ?
N’ihi gịnị ka ị pụrụ iji tụkwasị Bible obi?
Gịnị na-anwapụtara gị na Bible bụ Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ nsọ?
Igbe dị na peeji nke 14]
JIRI BIBLE GỊ NA-EME IHE NKE ỌMA
Ọ dịghị mkpa na ịmara Bible nke ọma ga-esi ike. Jiri ndepụta nke ihe ndị dị n’ime ya mụọ usoro na ebe a na-achọta akwụkwọ Bible dị iche iche.
Akwụkwọ nile nke Bible nwere isiakwụkwọ na amaokwu maka izo aka n’ụzọ dị mfe. A gbakwụnyere nkewa nke isiakwụkwọ n’ime narị afọ nke 13, o yikwara ka onye France na-ebi akwụkwọ na narị afọ nke 16 ò kewara Akwụkwọ Nsọ Grik gaa n’amaokwu ya ndị e nwere taa. Bible mbụ zuru ezu nke nwere nọmba ma nke isiakwụkwọ ma nke amaokwu bụ otu mbipụta nke French, nke e bipụtara na 1553.
Mgbe e zoro aka n’akwụkwọ nsọ n’akwụkwọ a, nọmba nke mbụ na-egosi isiakwụkwọ, nke na-esokwa na-egosi amaokwu. Dị ka ihe atụ, izo aka bụ́ “Ilu 2:5” pụtara akwụkwọ Ilu, isi nke 2, amaokwu nke 5. Site n’ịdị na-asapeta akụkụ akwụkwọ nsọ ndị e zoro aka na ha, ị ga-enwe ntụsara ahụ ngwa ngwa n’ịchọta amaokwu Bible dị iche iche.
Ụzọ kasị mma isi mara Bible nke ọma bụ ịgụ ya kwa ụbọchị. Na mbụ, nke a pụrụ iyi ihe ịma aka. Ma ọ bụrụ na ị gụọ isiakwụkwọ atọ ruo ise kwa ụbọchị, na-adabere n’otú ha hà n’ogologo, ị ga-agụzu Bible dum n’ime otu afọ. Gịnị ma ị malite taa?
Igbe dị na peeji nke 19]
BIBLE—AKWỤKWỌ PỤRỤ ICHE
• Bible bụ “ihe si n’obi Chineke pụta.” (2 Timoti 3:16) Ọ bụ ezie na ụmụ mmadụ deturu okwu ya nile, Chineke duziri echiche ha, nke mere na Bible bụ n’ezie “okwu Chineke.”—1 Ndị Tesalọnaịka 2:13.
• E dere Bible n’ogologo oge were narị afọ 16, site n’aka ihe dị ka 40 mmadụ keere òkè bụ́ ndị sitere n’ọnọdụ ndụ dịgasị iche iche. Ka o sina dị, ihe a rụzuru kwekọrọ ekwekọ site ná mmalite ruo ná ngwụsị.
• Bible alanarịwo ọtụtụ esemokwu karịa akwụkwọ ọ bụla ọzọ. Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, a kpọrọ ndị mmadụ ọkụ n’elu osisi nanị n’ihi inwe otu Akwụkwọ Nsọ.
• Bible bụ akwụkwọ a kasị na-erepụ n’ụwa. A sụgharịwo ya, n’ozuzu ya ma ọ bụ n’akụkụ ya ụfọdụ, gaa n’ihe karịrị 2,000 asụsụ. E biwo ọtụtụ ijeri n’ime ya, o sikwara ike inwe otu ebe n’ụwa ebe a na-apụghị ịchọta otu.
• Akụkụ kasị ochie nke Bible bụ laa azụ na narị afọ nke 16 T.O.A. Nke a bụ tupu mpụta nke Rig-Veda ndị Hindu (n’ihe dị ka na 1300 T.O.A.), ma ọ bụ “Akwụkwọ Iwu nke Nkata Atọ Ahụ” nke ndị Buddha (narị afọ nke ise T.O.A.), ma ọ bụ Koran ndị Alakụba (narị afọ nke asaa O.A.), nakwa Nihongi ndị Shinto (720 O.A.).
[Foto dị na peeji nke 20]