Jiri Nnwere Onwe Ndị Kraịst Gị Mee Ihe n’Ụzọ Amamihe
‘Dị ka ndị nweere onwe ha, ma unu nwere inwe onwe unu . . . dị ka ndị ohu Chineke.’—1 PITA 2:16.
1. Nnwere onwe dị aṅaa ka Adam tụfuru, ná nnwere onwe dịkwa aṅaa ka Jehova ga-eweghachi ihe a kpọrọ mmadụ?
MGBE nne na nna anyị mbụ mehiere n’ogige Iden, ha tụfuuru ụmụ ha ihe nketa dị ebube—nnwere onwe pụọ ná mmehie na mmerụ. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, a mụrụ anyị nile dị ka ndị ohu nye mmerụ na ọnwụ. Otú ọ dị, ọ bụ ihe obi ụtọ na Jehova zubere iweghachi ụmụ mmadụ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi ná nnwere onwe dị ebube. Taa, ndị obi ha ziri ezi ji ọchịchọ siri ike na-echere “mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke,” ebe nke ahụ ga-eme ka ha “pụọkwa n’ịbụ ohu mmebi baa n’ọnọdụ inwe onwe ya nke ebube nke ụmụ Chineke.”—Ndị Rom 8:19-21.
‘Ndị E Tere Mmanụ Ime Nkwusa’
2, 3. (a) Olee ndị bụ “ụmụ ndị ikom Chineke”? (b) Ọnọdụ dị aṅaa dị ebube ka ha na-enweta, na-eweta ibu ọrụ dị aṅaa?
2 Olee ndị bụ ‘ụmụ Chineke’ ndị a? Ha bụ ụmụnna Jisọs e ji mmụọ nsọ tee mmanụ, ndị ga-eso ya chịa achị n’Alaeze eluigwe. Ndị mbụ so ná ndị a pụtara na narị afọ mbụ O.A. Ha nakweere eziokwu ahụ na-atọpụ mmadụ n’ohu nke Jisọs kụziri, malitekwa na Pentikọst 33 O.A., ha keere òkè n’ihe ùgwù ahụ nke Pita kwuru okwu ya mgbe o degaara ha akwụkwọ, sị: “Unu onwe unu bụ ọgbọ ndị a họpụtaworo, òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze, mba dị nsọ, ndị nke Chineke nwetara.”—1 Pita 2:9a; Jọn 8:32.
3 Ịbụ ndị pụrụ iche nke Chineke—lee ngọzi magburu onwe ya nke ahụ bụ! Ihe fọdụrụ n’ụmụ Chineke ndị a e tere mmanụ nke oge a nwekwara ọnọdụ ahụ a gọziri agọzi n’ihu Chineke. Ma inwe ihe ùgwù dị otú ahụ e buliri elu na-eweta ibu ọrụ. Pita kpọtụrụ uche n’otu n’ime ndị a mgbe ọ gara n’ihu ikwu, sị: “Ka unu wee kwusa ịdị mma nile nke onye ahụ onye kpọpụtara unu n’ọchịchịrị ahụ baa n’ìhè ya dị ebube.”—1 Pita 2:9b.
4. Olee ụzọ ndị Kraịst e tere mmanụ siworo rụzuo ibu ọrụ nke na-abịa site ná nnwere onwe ndị Kraịst ha?
4 Ndị Kraịst e tere mmanụ hà arụzuwo ọrụ nke a nke ịkpọsa ịdị mma nile nke Chineke n’ebe nile? Ee. N’ikwu okwu n’ụzọ amụma banyere ndị e tere mmanụ kemgbe 1919, Aịsaịa kwuru, sị: “Mmụọ nke Onyenwe anyị, bụ́ Jehova, dị n’ahụ m; n’ihi na Jehova etewo m mmanụ izi ndị e wedara n’ala ozi ọma; o zitewo m ikechi ọnyá ndị obi ha tiwara etiwa, ịkpọsa ọhịha gwa ndị a dọtara n’agha, na ịkpọsa mmeghepụ ụlọ mkpọrọ gwa ndị e kere agbụ; ịkpọsa afọ mgbe ihe mmadụ na-atọ Jehova ụtọ, na ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ Chineke anyị nwere.” (Aịsaịa 61:1, 2) Taa, ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ, n’ịgbaso ihe nlereanya nke Jisọs, bụ́ onye akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ metụtara n’ụzọ bụ isi, ji ịnụ ọkụ n’obi na-akpọsara ndị ọzọ ozi ọma nke nnwere onwe.—Matiu 4:23-25; Luk 4:14-21.
5, 6. (a) Gịnị siworo ná nkwusa nke ndị Kraịst e tere mmanụ ji ịnụ ọkụ n’obi mee pụta? (b) Ihe ùgwù na ibu ọrụ dịgasị aṅaa ka ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ nwere?
5 Dị ka ihe si ná nkwusa ha ji ịnụ ọkụ n’obi na-eme pụta, oké ìgwè mmadụ nke atụrụ ọzọ apụtawo n’elu ụwa n’ụbọchị ikpeazụ ndị a. Ha esiwo ná mba nile pụta isonyere ndị e tere mmanụ n’ijere Jehova ozi, eziokwu ahụ emewokwa ka ndị a nwere onwe ha. (Zekaraịa 8:23; Jọn 10:16) Dị ka Abraham a na-akpọ ha ndị ezi omume ná ndabere nke okwukwe, ha abanyewokwa ná mmekọrịta chiri anya nke ha na Jehova Chineke. Dịkwa ka Rehab, ịkpọ ha ndị ezi omume na-eme ka ha soro ná ndị nlanarị—n’ọnọdụ nke ha, nlanarị nke Amagedọn. (Jemes 2:23-25; Mkpughe 16:14, 16) Ma ihe ùgwù ndị dị otú ahụ e buliri elu na-eweta ibu ọrụ nke ịgwa ndị ọzọ banyere ebube nke Chineke. Nke ahụ mere Jọn ji hụ ha ka ha na-enye Jehova otuto n’ihu ọha, “were oké olu tie mkpu, sị, Nzọpụta dịrị Chineke anyị, onye na-anọkwasị n’ocheeze ahụ, dịkwara Nwa Atụrụ ahụ.”—Mkpughe 7:9, 10, 14.
6 N’afọ gara aga, oké ìgwè mmadụ, ndị ọnụ ọgụgụ ha karịrị nde anọ ugbu a, ha na ọnụ ọgụgụ dị nta nke ihe ahụ fọdụrụ ná ndị Kraịst e tere mmanụ, tinyere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ijeri hour n’ịkpọsa ịdị mma nile nke Jehova. Nke a bụ iji nnwere onwe ha mee ihe n’ụzọ kasị mma ruo ókè o kwere mee.
“Na-asọpụrụnụ Eze Unu”
7, 8. Ibu ọrụ dị aṅaa n’ebe ịchịisi ụwa dị ka nnwere onwe ndị Kraịst na-eweta, n’akụkụ nke a kwa, àgwà ọjọọ dị aṅaa ka anyị na-aghaghị izere?
7 Nnwere onwe ndị Kraịst anyị na-eweta ibu ọrụ ndị ọzọ. Pita rụtụrụ ụfọdụ aka mgbe o dere, sị: “Sọpụrụnụ mmadụ nile. Hụnụ òtù ndị bụ ụmụnna n’anya. Na-atụnụ egwu Chineke. Na-asọpụrụnụ eze unu.” (1 Pita 2:17) Gịnị ka okwu ahụ pụtara nke bụ “na-asọpụrụnụ eze unu”?
8 “Eze unu” nọchiri anya ndị ọchịchị ụwa. Taa, mmụọ nke enweghị nsọpụrụ maka ịchịisi ebilitewo n’ụwa, nke a pụkwara imetụta ndị Kraịst n’ụzọ dị mfe. Ọ pụrụ iju onye Kraịst anya ihe mere ọ ga-eji sọpụrụ ‘eze ha,’ ebe ọ bụ na “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) N’iburu okwu ndị a n’uche, ọ pụrụ iche na ya nweere onwe ya inupụ isi n’iwu ndị na-agbakasị ya ahụ ma jụ ịtụ ụtụ isi ma ọ bụrụ na a gaghị ejide ya. Ma nke a ga-emegide iwu Jisọs kwupụtara nke ‘inyeghachi Siza ihe nke Siza.’ N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ ga-abụ ‘iji nnwere onwe ya mee ihe dị ka ihe mkpuchi maka ihe ọjọọ.’—Matiu 22:21; 1 Pita 2:16.
9. N’ihi ezi ihe abụọ dị aṅaa mere a ga-eji rubere ịchịisi ụwa isi?
9 Ndị Kraịst nwere ibu ọrụ nke ịsọpụrụ ịchịisi na ido onwe ha n’okpuru ya—ọbụna ma à sị na nke a bụ n’ụzọ a kpaara ókè. (Ọrụ 5:29) N’ihi gịnị? Na 1 Pita 2:14, 15, Pita rụtụrụ aka n’ihe atọ mere a ga-eji mee nke ahụ mgbe ọ sịrị na ndị ọchịchị bụ ndị “a na-ezite site n’aka [Chineke] ka ha bọọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-eme ihe ọjọọ, ka ha tookwa ndị na-eme ezi ihe.” Egwu nke ịta ahụhụ bụ ihe zuru ezu iji rubere ndị na-achị isi isi. Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe mmechuihu ma ọ bụrụ na otu n’ime Ndịàmà Jehova abụrụ onye e riri nhá ma ọ bụ tụọ mkpọrọ n’ihi imebi ihe, izu ohi, ma ọ bụ imempụ ọ bụla ọzọ! Cheedị echiche otú ụfọdụ ga-esi nwee obi ụtọ ịkpọsa ihe dị otú ahụ! N’aka nke ọzọ, mgbe anyị na-ewulite aha ọma maka irube isi n’obodo, anyị na-anata otuto site n’aka ndị ọchịchị obi ha ziri ezi. A pụrụ inyekwu anyị nnwere onwe ịnọgide na-arụ ọrụ anyị nke ikwusa ozi ọma. Ọzọkwa, site ‘n’ime ezi ihe, anyị na-eme ka amaghị ihe nke ndị na-enweghị uche kpuchie ọnụ.’ (1 Pita 2:15b) Nke a bụ ihe nke abụọ mere e ji erubere ndị na-achị isi isi.—Ndị Rom 13:3.
10. N’ihi ihe kasị sie ike dị aṅaa ka a ga-eji rubere ịchịisi ụwa isi?
10 Ma e nwere ihe dị ike karị kpatara ya. Ịchịisi ndị ahụ dị n’ihi na Chineke kwere ka ha dịrị. Dị ka Pita kwuru, ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ ndị “a na-ezite n’aka” Jehova, ọ bụkwa “ọchịchọ nke Chineke” ka ndị Kraịst doo onwe ha n’okpuru ha. (1 Pita 2:15a) N’otu aka ahụ, Pọl onyeozi kwuru, sị: “Ndị na-achị isi bụkwa ndị Chineke doworo.” N’ihi ya, akọ na uche anyị e ji Bible zụọ na-akpali anyị irubere ndị na-achị isi isi. Ọ bụrụ na anyị ajụ ido onwe anyị n’okpuru ha, anyị “na-eguzogide iwu Chineke.” (Ndị Rom 13:1, 2, 5) Ònye n’etiti anyị ga-achọ ịma ụma guzogide ndokwa Chineke mere? Lee ka nke ahụ ga-esi bụrụ ejighị nnwere onwe ndị Kraịst mee ihe n’ụzọ ziri ezi!
‘Nwee Ịhụnanya Maka Ụmụnna’
11, 12. (a) Ibu ọrụ dị aṅaa n’ebe ndị kwere ekwe ibe anyị nọ na-abịa site ná nnwere onwe ndị Kraịst anyị? (b) Olee ndị kwesịrị inweta nchebara echiche ịhụnanya anyị, n’ihi gịnịkwa?
11 Pita kwukwara na onye Kraịst kwesịrị ‘inwe ịhụnanya maka òtù ụmụnna.’ (1 Pita 2:17) Nke a bụkwa ibu ọrụ ọzọ na-abịa n’ihi nnwere onwe ndị Kraịst. Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị nwere ọgbakọ anyị nọ na ya. N’ezie, anyị nile nọ n’òtù, ma ọ bụ ọgbakọ, zuru ụwa ọnụ nke ụmụnna. Igosipụta ịhụnanya maka ndị a bụ iji nnwere onwe anyị na-eme ihe n’ụzọ amamihe.—Jọn 15:12, 13.
12 Pọl onyeozi kpọtụrụ uche otu ìgwè nke ndị Kraịst kwesịrị inweta ịhụnanya anyị karịsịa. Ọ sịrị: “Na-ekwenyenụ ndị isi [“ndị na-edu ndú n’etiti,” NW] unu, na-edokwanụ onwe unu n’okpuru ha: n’ihi na ndị ahụ na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu, dị ka ndị ga-aza ajụjụ banyere unu; ka ha wee were ọṅụ mee nke a, ghara ịsụ ude: n’ihi na nke a ga-abụ ihe na-abaghịrị unu uru.” (Ndị Hibru 13:17) Ndị ahụ na-edu ndú n’ọgbakọ bụ ndị okenye. N’eziokwu, ndị ikom ndị a ezughị okè. Otú o sina dị, a na-ahọpụta ha site ná nduzi nke Òtù Na-achị Isi. Ha na-edu ndú site n’ihe nlereanya nakwa site ná nchebara echiche, a na-ekenyekwa ha ọrụ ilekọta mkpụrụ obi anyị. Lee aha oké ọrụ nke ahụ bụ! (Ndị Hibru 13:7) Ọ bụ ihe obi ụtọ na ihe ka ọtụtụ n’ọgbakọ nwere mmụọ dị mma, nke inye nkwado, ọ bụkwa ihe ọṅụ nye ndị okenye isoro ha rụkọọ ọrụ. Ọ na-esi ike karị mgbe ndị mmadụ n’otu n’otu na-achọghị inye nkwado. Onye okenye ahụ na-arụkwa ọrụ ya, ma dị ka Pọl si kwuo, ọ na-eji “ịsụ ude” na-arụ ya. N’ezie, anyị achọghị ime ka ndị okenye na-asụ ude! Anyị chọrọ ka ha nweta ọṅụ n’ọrụ ha ka ha wee wulie anyị elu.
13. N’ụzọ ụfọdụ dịgasị aṅaa ka anyị pụrụ inye ndị okenye nkwado?
13 N’ụzọ ụfọdụ dị aṅaa ka anyị pụrụ inye ndị okenye nkwado? Otu ụzọ bụ n’inye aka n’idozi na n’ihicha Ụlọ Nzukọ Alaeze. Ụzọ ọzọ bụ site n’inye nkwado n’ọrụ nke ileta ndị ọrịa na inyere ndị ọrụsị aka. Tụkwasị na nke ahụ, anyị pụrụ ịgbalịsi ike ịnọgide na-adị ike n’ime mmụọ, ka anyị wee ghara ịghọ ibu ọrụ. Otu ebe dị mkpa inye nkwado bụ n’ijigide ịdị ọcha omume na ime mmụọ nke ọgbakọ, ma site n’omume anyị ma site n’ikwupụta mmehie dị oké njọ nke anyị chọpụtara.
14. Olee ụzọ anyị kwesịrị isi nye nkwado n’ịdọ aka ná ntị nke ndị okenye nyere?
14 Mgbe ụfọdụ, iji wee debe ọgbakọ ọcha, ndị okenye aghaghị ịchụpụ onye na-eme mmehie nke na-enweghị nchegharị n’ọgbakọ. (1 Ndị Kọrint 5:1-5) Nke a na-echebe ọgbakọ. Ọ pụkwara inyere onye mmehie ahụ aka. Ọtụtụ mgbe, ịdọ aka ná ntị dị otú ahụ enyewo aka ime ka onye mere mmehie ghọta ihe o mere. Otú ọ dị, gịnị ma ọ bụrụ na onye ahụ a chụpụrụ n’ọgbakọ bụ ezi enyi anyị ma ọ bụ onye ikwu anyị? Ka e were ya na onye ahụ bụ nne ma ọ bụ nna anyị ma ọ bụ nwa anyị nwoke ma ọ bụ nwa anyị nwanyị. Otú o sina dị, ànyị na-akwanyere mkpebi nke ndị okenye mere ùgwù? N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ ihe siri ike. Ma lee ejighị nnwere onwe mee ihe ziri ezi nke ahụ ga-abụ ịrụ mkpebi nke ndị okenye ụka na ịnọgide na-esonyere onye ahụ gosipụtara mmetụta rụrụ arụ n’ọgbakọ na-akpakọrịta! (2 Jọn 10, 11) E kwesịrị ịja ndị Jehova n’ozuzu ha mma n’ihi ụzọ ha si enye nkwado n’okwu ndị dị otú ahụ. Dị ka ihe si na nke ahụ pụta, ọgbakọ Jehova nọgidere bụrụ nke a na-emerụghị emerụ n’ime ụwa nke na-adịghị ọcha.—Jemes 1:27.
15. Ọ bụrụ na mmadụ emee mmehie dị oké njọ, gịnị ka o kwesịrị ime ozugbo?
15 Gịnị ma ọ bụrụ na anyị emee mmehie dị oké njọ? Eze Devid kọwara ndị ahụ nwetara ihu ọma Jehova mgbe ọ sịrị: “Ònye ga-arịgo n’ugwu Jehova? Ònye ga-eguzosikwa ike n’ebe nsọ ya? Onye nwere ọbụ aka abụọ na-emeghị ihe ọjọọ, na obi dị ọcha; onye na-ebulighị mkpụrụ obi ya nye ihe efu, ọ ṅụghịkwa iyi aghụghọ.” (Abụ Ọma 24:3, 4) Ma ọ bụrụ na ọ dị ihe mere ka anyị gharakwa ‘inwe aka na-emeghị ihe ọjọọ na obi dị ọcha,’ anyị aghaghị ime ihe ngwa ngwa. Ndụ ebighị ebi anyị nọ n’ihe ize ndụ.
16, 17. N’ihi gịnị ka onye ikpe oké mmehie mara na-ekwesịghị ịgbalị ikpebi okwu ahụ n’aka ya?
16 A nwawo ụfọdụ izochi mmehie dị oké njọ, ma eleghị na-eche, sị: ‘Ekwupụtawo m mmehie m gwa Jehova ma chegharịa. Ya mere n’ihi gịnị ka m ga-eji mee ka ndị okenye mara?’ Onye ahụ mere ihe ọjọọ pụrụ ime ihere ma ọ bụ tụọ ụjọ ihe ndị okenye pụrụ ime. Otú ọ dị, o kwesịrị icheta na ọ bụ ezie na nanị Jehova na-ehichapụ anyị mmehie anyị, O mewo ka ndị okenye nwee ibu ọrụ bụ isi nke idebe ọgbakọ ọcha. (Abụ Ọma 51:2) Ihe ha ji nọrọ n’ebe ahụ bụ maka ịgwọ ọrịa, maka “ime ka ndị nsọ zuo okè.” (Ndị Efesọs 4:12) Ịhapụ ijekwuru ha mgbe anyị nọ ná mkpa enyemaka ime mmụọ dị ka ịhapụ ijekwuru onye dọkịta mgbe anyị na-arịa ọrịa.
17 Ụfọdụ ndị gbalịrị idozi okwu ahụ nanị ha na-achọpụta na mgbe ọtụtụ ọnwa ma ọ bụ afọ gasịrị, akọ na uche ha ka nọkwa na-enye ha nsogbu nke ukwuu. Ọbụna dị ka nke ka njọ, ndị na-ezochi mmehie dị oké njọ na-adaba ná mmehie nke ugbo abụọ na ọbụna nke ugbo atọ. Mgbe okwu ahụ ga-emesịa pụta ìhè n’ebe ndị okenye nọ, ọ bụ okwu metụtara ime ihe ọjọọ ọtụtụ mgbe. Lee ka o si ka mma ịgbaso ndụmọdụ Jemes! O dere, sị: “Ọ̀ dị onye ọ bụla n’etiti unu nke ahụ ya na-adịghị ike? Ya kpọọ ndị okenye nke nzukọ Kraịst ka ha bịakwute ya; ka ha kpeekwa ekpere n’isi ya, na-ete ya mmanụ olive n’aha Onyenwe anyị [“Jehova,” NW].” (Jemes 5:14) Jekwuru ndị okenye mgbe oge ka dị maka inweta ngwọta. Ọ bụrụ na anyị echere ruo mgbe dị anya, anyị pụrụ ịghọ ndị obi ha siri ike n’ụzọ nke mmehie.—Eklisiastis 3:3; Aịsaịa 32:1, 2.
Ọdịdị na Ntụrụndụ
18, 19. N’ihi gịnị ka otu onye ụkọchukwu ji kwuo okwu dị mma banyere Ndịàmà Jehova?
18 N’afọ ise gara aga, n’otu magazin ndị chọọchị, otu onye ụkọchukwu ndị Katọlik n’Itali kwuru ihe dị mma banyere Ndịàmà Jehova.a Ọ sịrị: “Mụ onwe m nwere mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ; eji m obi m kwere nke ahụ. . . . Ndị nke m maara nwere omume na-enweghị ntụpọ, na-ekwu okwu n’ụzọ dị nro . . . na-akpali[kwa] akpali nke ukwuu. Olee mgbe anyị ga-aghọta na ọ dị mkpa iche eziokwu n’ihu mmadụ n’ụzọ a na-anakwere? Na ndị na-akpọsa eziokwu ahụ ekwesịghị ịbụ ndị na-enwe obi abụọ, ndị na-esi ajọ ìsì, ndị dị nkịkara, ndị ruru unyi?”
19 Dị ka okwu ndị a si dị, onye ụkọchukwu ahụ nwere mmasị n’ihe ndị dị ka ụzọ Ndịàmà si eji ejiji na otú ha na-adị n’anya. O doro anya na ndị o zuteworo aṅawo ntị ná ndụmọdụ nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nyeworo ruo ọtụtụ afọ. (Matiu 24:45) Bible sịrị na uwe ndị inyom kwesịrị ịbụ nke ‘kwesịrị ekwesị na nke a na-asọpụrụ.’ (1 Timoti 2:9) N’oge nke a e nwere ndakpọ nke omume, ndụmọdụ ahụ dịkwa mkpa nye ndị ikom. Ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya na ndị na-anọchite anya Alaeze Chineke kwesịrị igosi ndị nọ n’èzí onwe ha n’ụzọ dị mma n’anya?
20. N’ihi gịnị ka onye Kraịst kwesịrị iji na-elezi anya banyere uwe ya n’oge nile?
20 Ụfọdụ pụrụ ikweta na ná nzukọ nile nakwa n’ozi ubi, ha kwesịrị ilezi anya banyere otú ha si eyi uwe, ma ha pụrụ iche na ụkpụrụ Bible dị iche iche adịghị mkpa n’oge ndị ọzọ. Otú ọ dị, ọ̀ dị mgbe ọ bụla anyị kwesịrị ịkwụsị ịbụ ndị na-anọchite anya Alaeze Chineke? N’eziokwu, ọnọdụ na-adịgasị iche iche. Ọ bụrụ na anyị na-enye aka n’owuwu nke Ụlọ Nzukọ Alaeze, anyị ga-eyi uwe n’ụzọ dị iche site na mgbe anyị na-aga nzukọ n’otu Ụlọ Nzukọ Alaeze ahụ. Mgbe anyị na-ezuru ike, o yiri ka anyị ga-eyi uwe n’ụzọ ga-enye anyị ohere ịtụsara ahụ. Ma mgbe ọ bụla ndị ọzọ na-ele anyị, uwe anyị kwesịrị ịbụ nke dị mma na nke kwesịrị ekwesị.
21, 22. Olee ụzọ e siworo chebe anyị megide ntụrụndụ dị njọ, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka anyị kwesịrị isi na-ele ndụmọdụ metụtara okwu ndị dị otú ahụ anya?
21 Akụkụ ọzọ e lekwasịworo anya nke ukwuu bụ ntụrụndụ. Ụmụ mmadụ—karịsịa ndị na-eto eto—nwere mkpa nke ntụrụndụ. Ọ bụghị mmehie ma ọ bụ igbu oge ịhazi ntụrụndụ maka ezinụlọ. Ọbụna Jisọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya òkù ka ha “zuru ike nke nta.” (Mak 6:31) Ma lezie anya ka ntụrụndụ ghara imeghe ụzọ nye mmerụ nke ime mmụọ. Anyị na-ebi n’ụwa ebe ntụrụndụ na-egosipụta mmekọahụ rụrụ arụ, oké ime ihe ike, ihe ụjọ, na mgbaasị. (2 Timoti 3:3; Mkpughe 22:15) Ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche mụ anya banyere ihe ize ndụ ndị dị otú ahụ, ha nọgidere na-adọkwa anyị aka ná ntị megide ha. Ị̀ na-eche na ihe ncheta ndị dị otú ahụ bụ ihe mgbochi nye nnwere onwe gị? Ka ì nwere ekele na nzukọ Jehova na-echegbu onwe ya n’ụzọ zuru ezu banyere gị iji mee ka ị mara banyere ihe ize ndụ ndị dị otú ahụ?—Abụ Ọma 19:7; 119:95.
22 Ya adịla mgbe ị ga-echefu na ọ bụ ezie na nnwere onwe sitere n’aka Jehova, anyị ga-aza ajụjụ maka ụzọ anyị si jiri ya mee ihe. Ọ bụrụ na anyị elefuru ezi ndụmọdụ anya wee mee mkpebi ndị na-ezighị ezi, anyị apụghị ịta onye ọ bụla ọzọ ụta. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Onye ọ bụla n’etiti anyị ga-aza ajụjụ banyere onwe ya nye Chineke.”—Ndị Rom 14:12; Ndị Hibru 4:13.
Nwee Olileanya Maka Nnwere Onwe nke Ụmụ Chineke
23. (a) Ngọzi ndị dị aṅaa n’ihe banyere nnwere onwe ka anyị na-enweta ugbu a? (b) Ngọzi ndị dị aṅaa ka anyị na-echesi ike?
23 Anyị bụ n’ezie ndị a gọziri agọzi. Anyị nweere onwe anyị pụọ n’okpukpe ụgha na ịtụ egwu na-enweghị isi. N’ihi àjà mgbapụta ahụ, anyị pụrụ ịbịakwute Jehova site n’akọ na uche dị ọcha, na-enwere onwe anyị n’ụzọ ime mmụọ pụọ n’ịbụ ohu mmehie na ọnwụ. N’oge na-adịghịkwa anya, a ga-enwe “mkpughe nke ụmụ ndị ikom Chineke.” N’Amagedọn, a ga-ekpughe ụmụnna Jisọs n’ebube eluigwe ha nye ụmụ mmadụ dị ka ndị mbibi nke ndị iro Jehova. (Ndị Rom 8:19; 2 Ndị Tesalonaịka 1:6-8; Mkpughe 2:26, 27) Mgbe nke ahụ gasịrị, a ga-ekpughe ụmụ Chineke ndị a dị ka ebe ọtụtụ ngọzi si abịara ihe a kpọrọ mmadụ site n’ocheeze Chineke. (Mkpughe 22:1-5) N’ikpeazụ, mkpughe nke a a ga-ekpughe ụmụ Chineke ga-eme ka a gọzie ihe a kpọrọ mmadụ na-ekwesị ntụkwasị obi site ná nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke. Oge ahụ ọ̀ na-agụsi gị agụụ ike? Ya bụrụ otú ahụ, jiri nnwere onwe ndị Kraịst gị mee ihe n’ụzọ amamihe. Buru ohu Chineke ugbu a, ị ga-enwetakwa nnwere onwe ahụ dị ebube ruo mgbe nile ebighị ebi!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Onye ụkọchukwu ahụ mesịrị kwuo na ịja mma ya ahụ abụghị eziokwu, nke doro anya na ọ bụ n’okpuru nrụgide.
Igbe Ntụleghachi
◻ Olee ụzọ ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ siworo nye Jehova otuto?
◻ N’ihi gịnị ka ndị Kraịst kwesịrị iji sọpụrụ ịchịisi ụwa?
◻ N’ụzọ ndị dị aṅaa ka onye Kraịst pụrụ isi nye ndị okenye nkwado?
◻ N’ihe banyere uwe, n’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji eguzopụ iche dị ka ndị dị iche pụọ n’ebe ọtụtụ ndị n’ụwa nọ?
◻ Gịnị ka anyị kwesịrị izere n’ihe banyere ntụrụndụ?
[Foto dị na peeji nke 17]
Ndị okenye kwesịrị inweta ịhụnanya na nkwado anyị karịsịa
[Foto ndị dị na peeji nke 18]
Uwe onye Kraịst kwesịrị ịbụ nke dị mma, nke kwesịrị ekwesị, nke kwesịrị ihe a na-eme