Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 4/15 p. 16-21
  • Kwadebe Maka Mgbapụta Banye n’Ime Ụwa Ọhụrụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kwadebe Maka Mgbapụta Banye n’Ime Ụwa Ọhụrụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Otú Anyị Si Emeghachi Omume n’Ụzọ Ndụ nke Ụwa
  • Ònye Ma Ọ Bụ Gịnị Na-ebute Ụzọ ná Ndụ?
  • Nkwadebe Ndị E Ji Ịhụnanya Mee maka Nnapụta Ka Ukwuu
  • Ihe Mere O Ji Dị Oké Mkpa Ime Ihe Pụtara ìhè Ugbu a
  • Enyemaka Chineke nke Na-eduje Ná Nnapụta
  • Cheta Nwunye Lọt
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Nwunye Lọt Lere Anya n’Azụ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Nwee Obi Ike Ka Mgbapụta Na-eru Nso
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ebee Ka I Kwesịrị Ịnọ Mgbe A Ga-ebibi Ụwa?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 4/15 p. 16-21

Kwadebe Maka Mgbapụta Banye n’Ime Ụwa Ọhụrụ

“Chetanụ Nwunye Lọt.”—LUK 17.32.

1. Oké ihe omume dị aṅaa nke nnapụta Chineke ka a ga-eme ka ọ pụta ìhè n’ihe ọmụmụ anyị nke taa, oleekwa ụzọ ọ pụrụ isi baara anyị uru?

MGBE ọ kọsịrị ihe banyere ọrụ nnapụta ahụ dị ebube Jehova rụụrụ Noa na ezinụlọ ya, Pita onyeozi kpọtụrụ uche n’ihe atụ ọzọ dị n’akụkọ ihe mere eme. Ọ dọọrọ uche gaa ná nchebe e chebere Lọt onye ezi omume mgbe e mere ka Sọdọm na Gọmọra ghọọ ntụ, dị ka anyị na-agụ na 2 Pịta 2:6-8. E chebere ihe ndekọ ahụ maka abamuru anyị. (Ndị Rom 15:4) Anyị iburu n’uche ihe mere n’ihe banyere nnapụta ahụ pụrụ inye aka n’ịkwadebe anyị maka nchebe banye n’ime ụwa ọhụrụ nke Chineke.

Otú Anyị Si Emeghachi Omume n’Ụzọ Ndụ nke Ụwa

2. Àgwà dị aṅaa a na-akpa na Sọdọm na Gọmọra dujere na Chineke ibibi ha?

2 Gịnị mere e ji bibie obodo ndị ahụ na ndị bi n’ime ha? Pita onyeozi zoro aka ná ntinye ha tinyere aka ‘n’ibi obi n’agụụ ịkwa iko.’ (2 Pita 2:7) Dị ka e gosiri site n’ụzọ a na-esi eji okwu Grik ahụ e si na ya sụgharịta okwu ahụ na-eme ihe, ndị Sọdọm na Gọmọra tinyere aka n’omume ọjọọ n’ụzọ gosipụtara ajọ enweghị nsọpụrụ, ọbụna nnupụisi pụtara ìhè, nye iwu na ike ọchịchị. Jud amaokwu 7 kwuru na ha ‘kwara iko gabiga ókè wee pụọ soo anụ ahụ iji ya mee ihe megidere usoro okike.’ Oké ịdị njọ nke omume ha pụtara ìhè mgbe ndị ikom Sọdọm, “ma okorobịa ma agadi, ndị ala ahụ nile” gbara ụlọ Lọt gburugburu ma gwa ya ka ọ kpọpụta ndị ọbịa bịara na nke ya ka ndị ikom Sọdọm wee jiri ha mejuo agụụ rụrụ arụ ha na-enwe. Ha wee kwuluo Lọt n’ihi na o guzogidere ajọ ihe nke ha chọrọ ime.—Jenesis 13:13; 19:4, 5, 9.

3. (a) Olee ụzọ Lọt na ezinụlọ ya si bịa biri n’ebe rụrụ arụ dị ka Sọdọm? (b) Gịnị bụ mmeghachi omume Lọt n’ebe àgwà rụrụ arụ nke ndị Sọdọm dị?

3 Na mbụ, Lọt kwatara n’ógbè dị nso na Sọdọm n’ihi na o nwere olileanya nke inwe ihe ịga nke ọma n’ụzọ ihe onwunwe. Mgbe oge na-aga, o jere biri n’ime obodo ahụ kpọmkwem. (Jenesis 13:8-12; 14:12; 19:1) Ma o kwenyereghị àgwà rụrụ arụ nke ndị obodo ahụ, ha eleghịkwa ya anya dị ka otu n’ime ha, nke ihe àmà gosiri na ọ bụ n’ihi na Lọt na ezinụlọ ya adịghị ekere òkè n’ụzọ ndụ ha. Dị ka 2 Pita 2:7, 8 na-asị: “Lọt, . . . mgbe ibi obi n’agụụ ịkwa iko nke ndị ahụ ndị na-emebị iwu na-ewute ya nke ukwuu (n’ihi na onye ezi omume ahụ, ebe ọ na-ebi n’etiti ha, o weere ọrụ ha nke na-emebi iwu mekpaa mkpụrụ obi ezi omume ya ahụ kwa ụbọchị, n’ile ihe na ịnụ ihe).” Ọnọdụ ndị ahụ ghọrọ oké ọnwụnwa nye Lọt n’ihi na, dị ka onye ezi omume, ọ kpọrọ omume dị otú ahụ asị.

4. (a) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ọnọdụ ndị e nwere taa si yie ndị dị na Sọdọm oge ochie? (b) Ọ bụrụ na anyị yiri Lọt onye ezi omume, olee ụzọ anyị na-esi emeghachi omume n’ọnọdụ ndị rụrụ arụ nke oge a?

4 N’oge anyị a kwa, ụkpụrụ omume ụmụ mmadụ aghọwo nke e wedara n’ala nke ukwuu. N’ọtụtụ mba, ọtụtụ ndị na-etinye aka n’inwe mmekọahụ tupu a lụọ di na nwunye ma ọ bụ iso ndị na-abụghị dị ma ọ bụ nwunye ha na-enwe mmekọahụ. Ọbụna ndị ka na-eto eto ndị nọ n’ụlọ akwụkwọ na-etinyekwa aka n’ụzọ ndụ dị otú a n’ụzọ dị omimi, ha na-akwakwa ndị na-adịghị esonyere ha emo. Ndị ikom na-edina ndị ikom na ndị inyom na-edina ndị inyom apụtawo ìhè n’ime ka a mara ha, ha na-agagharịkwa n’okporo ụzọ dị iche iche n’obodo ukwu dị iche iche ịchọ ka a kwụsị ịle ha anya ọjọọ. Ndị ụkọchukwu esonyewokwa n’ụdị omume nke a rụrụ arụ. Ọ bụghị ọtụtụ chọọchị na-ekwupụta hoo haa na ha na-ahọpụta ndị a ma ama dị ka ndị nwoke na nwanyị na-edinarịta ndị nwoke na nwanyị ibe ha na ndị na-akwa iko dị ka ndị ụkọchukwu. Ma, n’ihe na-eme eme n’ezie, dị ka akụkọ dị iche iche na-egosị mgbe mgbe, ọ bụghị nnọọ ihe siri ike ịchọta ndị nwoke na-edina ndị nwoke ibe ha na ndị nwanyị na-edina ndị nwanyị ibe ha, ndị na-akwa iko, na ndị na-akwa iko bụ́ ndị lụworo di na nwunye, n’etiti ndị ụkọchukwu. N’ezie, ụfọdụ ndị ndú okpukpe abụrụwo ndị a kpọfere n’obodo ndị ọzọ ma ọ bụ ọbụna manye ha ịgba arụkwaghịm n’ihi akụkọ ọjọọ metụtara ha na mmekọahụ. Ndị hụrụ ezi omume n’anya adịghị ekwenyere omume mmebi iwu dị otú a; ha ‘na-akpọ ajọ ihe asị.’ (Ndị Rom 12:9) Ọ na-ewute ha karịsịa mgbe àgwà ndị mmadụ ndị na-azọrọ na ha na-ejere Chineke ozi na-ewetara aha ya nkọcha, wee na-eme ka ndị na-aghọtachaghị ihe na-aganụ gbakụta ihe nile banyere okpukpe azụ ná mwute.—Ndị Rom 2:24.

5. Ajụjụ dị aṅaa ka mbibi Jehova bibiri Sọdọm na Gọmọra na-azara anyị?

5 Site n’afọ ruo n’afọ, ọnọdụ na-ajọwanye njọ. Ọ̀ ga-emesịa ruo ná njedebe? Ee, ọ ga-eru! Ihe Jehova mere Sọdọm na Gọmọra oge ochie na-egosi n’ụzọ pụtara ìhè na, n’oge ọ kara aka, ọ ga-emezu ihe o kpere n’ikpe. Ọ ga-ebibi ndị ajọ omume kpam kpam, ma ọ ga-anapụta ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi.

Ònye Ma Ọ Bụ Gịnị Na-ebute Ụzọ ná Ndụ?

6. (a) Ihe mmụta dị aṅaa nke bịara n’ezi oge dị n’ihe ndekọ banyere ụmụ okorobịa ndị ahụ chọrọ ịlụ ụmụ Lọt? (b) Olee ụzọ àgwà ndị ahụ na-akwadebe ịlụ ha si tinye ụmụ Lọt n’ule?

6 Ọ bụ nanị ndị ahụ na-egosịpụta ezi nsọpụrụ Chineke ka a ga-azọpụta. N’ihe banyere nke a, tụlee ihe ndị mmụọ ozi Jehova gwara Lọt tupu e bibie Sọdọm na Gọmọra. “Ọ̀ dị onye i nwere n’ebe a ọzọ? Di nwa gị, na ụmụ gị ndị ikom, na ụmụ gị ndị inyom, na onye ọ bụla i nwere n’obodo a; mee ka ha si n’ebe a pụọ: n’ihi na ndị na-ebibi ebe a ka anyị bụ.” Lọt wee jee gwa ụmụ okorobịa ahụ na-achọ ịlụ ụmụ ya ndị inyom okwu. Ọ gbara ha ume ọtụtụ ugbo, sị: “Bilienụ, si n’ebe a pụọ; n’ihi na Jehova na-ebibi obodo a!” Mmekọrịta ha na ezinụlọ Lọt nwere nyere ha ohere pụrụ iche nke ịbụ ndị a napụtara, ma ha aghaghị ime ihe n’onwe ha. Ha aghaghị inye ihe àmà pụtara ìhè nke irubere Jehova isi. Kama nke ahụ, n’anya ha, Lọt “dị ka onye na-akwa emo.” (Jenesis 19:12-14) Ị pụrụ nnọọ iche otú ọ ga-adịworị ụmụ ndị inyom nke Lọt mgbe ha nụrụ ihe meworonụ. O tinyere ikwesị ntụkwasị obi ha nye Chineke n’ule.

7, 8. (a) Mgbe mmụọ ozi ndị ahụ gbara Lọt ume ka ọ kpọrọ ezinụlọ ya wee gbapụ, ò si aṅaa meghachi omume, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka nke a ji bụrụ ihe ezi uche na-adịghị na ya? (b) Iji wee bụrụ ndị a napụtara, gịnị dị mkpa nye Lọt na ezinụlọ ya?

7 N’isi ụtụtụ echi ya, ndị mmụọ ozi malitere ịgwa Lọt ka o mee ngwa ngwa. Ha sịrị: “Bịlie, chịrị nwunye gị, na ụmụ gị ndị inyom abụọ ndị a hụrụ n’ebe a; ka e wee ghara ikpochapụ gị n’ahụhụ ajọ omume obodo a.” Ma, ‘ọ nọgịdere na-egbu oge.’ (Jenesis 19:15, 16) Ọ̀ bụ n’ihi gịnị? Gịnị ka ọ na-echere? Ọ̀ bụ ihe onwunwe ndị o nwere na Sọdọm ebe ahụ—bụ́ nke dọrọwororị ya bịa n’ógbè ahụ? Ọ bụrụ na o jigide ihe ndị a aka, a ga-ebibikọta ya na Sọdọm.

8 Site n’obi ebere, ndị mmụọ ozi ahụ jidere ndị nọ n’ezinụlọ ya n’aka wee dọkpụrụ ha ngwa ngwa pụọ n’obodo ahụ. Mgbe e ruru n’azụ obodo ahụ, mmụọ ozi Jehova nyere iwu, sị: “Wepụga onwe gị n’ihi ndụ gị; elegidela anya n’azụ gị, eguzokwala na Gburugburu ala a nile; wepụga onwe gị jee n’ugwu ahụ, ka e wee ghara ikpochapụ gị.” Lọt ka nọkwa na-agba ala gburugburu. N’ikpeazụ, mgbe e mesịrị kwere na ọ pụrụ ije n’otu ebe na-adịghị anya nke ukwuu, ya na ezinụlọ ya gbapụrụ. (Jenesis 19:17-22) A pụghịkwa ichere ọzọ, nrubeisi dị oké mkpa.

9, 10. (a) N’ihi gịnị ka ịnọnyere di ya ji bụrụ ihe na-ezughị ezu iji mee ka nchebe nke nwunye Lọt bụrụ ihe e ji n’aka? (b) Mgbe nwunye Lọt nwụrụ, ule ọzọ dị aṅaa chere lọt na ụmụ ya ndị inyom ihu?

9 Otú ọ dị, nnapụta ahụ ezubeghị okè mgbe ha hapụsịrị Sọdọm. Jenesis 19:23-25 na-agwa anyị, sị: “Anyanwụ awawo n’elu ụwa mgbe Lọt batara n’ime Zoa. Jehova wee mee ka brimstone na ọkụ si n’eluigwe zokwasị Sọdọm na Gọmọra dị ka mmiri site n’ebe Jehova nọ; o wee kwatuo obodo ndị a, na Gburugburu ala ahụ nile, na ndị nile bi n’obodo ahụ nile, na ihe opupu nke ala.” Ma olee ebe nwunye Lọt nọ?

10 O sooro di ya gbapụ. Otú ọ dị, ò ji obi ya nile kwere n’ihe di ya na-eme? Ọ dịghị ihe ọ bụla gosiri na ọ dị ụzọ ọ bụla o si kwadoo omume na-adịghị ọcha nke ndị Sọdọm. Ma ịhụnanya o nwere n’ebe Chineke nọ ò sịrị ike karịa nkekọ o nwere n’ebe ụlọ na ihe onwunwe o nwere n’ebe ahụ dị? (Tụlee Luk 17:31, 32.) Mgbe ọ nọ n’okpuru nrụgide, ihe dị ya n’obi pụtara ìhè. Ihe àmà gosiri na ha anọworị nso Zoa, ma eleghị anya n’ebe dị nso ịbanye n’obodo ahụ, mgbe o ji nnupụisi tụgharịa wee lee anya n’azụ. Dịkwa ka ihe ndekọ Bible na-akọ, o “wee ghọọ ogidi nnu.” (Jenesis 19:26) Ugbu a, ule ikwesị ntụkwasị obi ọzọ chere Lọt na ụmụ ya ndị inyom ihu. Ihe nkekọ dị n’etiti Lọt na nwunye ya nke nwụworonụ ma ọ bụ mmetụta nke ụmụ agbọghọ ahụ n’ebe nne ha nwụworo anwụ nọ ò siri ike karịa ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova nọ, bụ́ onye wetaworo oké ọdachi nke a? Hà ga-anọgide na-erubere Chineke isi ọ bụ ezie na otu onye ha nwere mmekọrịta chiri anya n’ebe ọ nọ egosiwo onwe ya ịbụ onye na-ekwesịghị ntụkwasị obi nye ya? Site ná ntụkwasị obi zuru ezu n’ebe Jehova nọ, ha eleghị anya n’azụ.

11. Gịnị ka anyị mụtaworo n’ebe a banyere nnapụta nke Jehova na-enye?

11 Ee, Jehova maara ụzọ e si anapụta ndị na-asọpụrụ Chineke site n’ọnwunwa. Ọ maara ụzọ e si anapụta òtù ezinụlọ dum ndị dị n’otu n’ofufe dị ọcha; ọ makwaara ụzọ e si anapụta ndị mmadụ n’otu n’otu. Mgbe ha hụrụ ya n’anya n’ezie, ọ na-egosi ezi mmasị n’imeso ha ihe. “Ya onwe ya maara otú a kpụworo anyị; ọ na-echeta na ájá ka anyị bụ.” (Abụ Ọma 103: 13, 14) Ma nnapụta ya bụ nanị nye ndị ahụ na-asọpụrụ Chineke, ndị nsọpụrụ ha bụ nke ziri ezi, ndị nrubeịsi ha bụ ngosịpụta nke ikwesị ntụkwasị obi.

Nkwadebe Ndị E Ji Ịhụnanya Mee maka Nnapụta Ka Ukwuu

12. Nkwadebe ịhụnanya dịgasị aṅaa ka Jehova gaje ime tupu o weta nnapụta ahụ nke anyị ji oké ịnụ ọkụ n’obi na-echere?

12 Site n’ihe ndị o mere n’ụbọchi Noa na n’ụbọchị Lọt, Jehova ewepụghi ndị mmebi iwu nile ruo mgbe ebighị ebi. Dị ka akwụkwọ nsọ na-asị, ọ bụ nanị na o setịpụrụ ụkpụrụ nke ihe ndị gaje ime n’ọdịnihu. Tupu ihe ndị ahụ emee, Jehova bu n’uche ihe ndị ka ukwuu, bụ́ ndị o zubere ime iji wetara mmadụ ndị hụrụ ya n’anya abamuru. Ọ gaje izite Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, bụ́ Jisọs Kraịst, n’elu ala. N’ebe a, Jisọs ga-ewepụ ịta ụta nile n’aha Chineke site n’ịgosịpụta ụdị nsọpụrụ ahụ nke Adam, dị ka mmadụ zuru okè, kwesịrị inyeworị Chineke, nke ọ pụkwararịị inye Chineke; ma Jisọs ga-eme nke a n’ọnọdụ ndị siri ike nke ukwuu karị. Jisọs gaje ịtọgbọ ndụ mmadụ ya zuru okè dị ka àjà ka ụmụ Adam ndị nwere okwukwe nwee ike inwetaghachi ihe ahụ Adam tụfuru. Mgbe ahụ, Chineke gaje ịhọpụta “ìgwè atụrụ nta” nke ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi iso Kraịst kere òkè n’Alaeze eluigwe ya, a ga-achịkọpụtakwa “oké ìgwè mmadụ” site ná mba nile imejupụta ntọala nke òtù ụmụ mmadụ ọhụrụ. (Luk 12:32; Mkpughe 7:9) Mgbe e mezusịrị nke ahụ, Chineke gaje ịrụ ọrụ nnapụta ahụ dị ebube nke ihe ndị metụtara Iju Mmiri ahụ na mbibi nke Sọdọm na Gọmọra sere onyinyo ya.

Ihe Mere O Ji Dị Oké Mkpa Ime Ihe Pụtara ìhè Ugbu a

13, 14. Gịnị ka anyị pụrụ ịmụta site n’eziokwu ahụ nke bụ na Pita jiri mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’oge Lọt na n’oge Noa mere ihe atụ?

13 Ndị na-amụ Okwu Chineke maara na ọtụtụ mgbe Jehova emewo ihe iji napụta ndị ohu ya. Otú ọ dị, n’ihe ka ọtụtụ n’ime ndị a, Bible adịghị asị, ‘dị ka ọ dịrị n’oge ahụ, otú a ka ọ ga-adị n’oge ọnụnọ Nwa nke mmadụ.’ N’ihi gịnị ka Pita onyeozi, site ná nduzi nke mmụọ nsọ, ji wepụta ihe atụ abụọ ndị a iche? Gịnị bụ ihe dị iche banyere ihe ndị mere n’ụbọchị Lọt na n’ụbọchị Noa?

14 A na-ahụta otu ihe àmà pụtara ìhè na Jud amaokwu 7, ebe anyị na-agụ na “Sọdọm na Gọmọra, na obodo dị ha gburugburu, . . . e debewo ha n’ihu ọha mmadụ dị ka ihe ngosi, na-ahụ ahụhụ mmehie nke ọmụma ikpe ziri ezi, nke bụ ọkụ ebighị ebi.” Ee, mbibi nke ndị ahụ na-eme oké ajọ omume n’obodo ndị ahụ bụ ruo mgbe ebighị ebị, dị ka mbibi nke a ga-enwe n’ọgwụgwụ ajọ usoro ihe dị ugbu a ga-abụkwa. (Matiu 25:46) A na-ezokwa aka n’Iju Mmiri nke oge Noa n’ebe ndị a na-atụle ikpe ọmụma ebighị ebi. (2 Pita 2:4, 5, 9-12; 3:5-7) Ya mere, site na mbibi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’oge Noa na n’oge Lọt, Jehova gosiri na ya ga-anapụta ndị ohu ya site n’ibibi ndị ahụ na-eme ajọ omume ruo mgbe ebighị ebi.—2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-10.

15. (a) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa nke dị ngwa ka a na-enye ndị ahụ na-etinye aka n’ajọ omume? (b) N’ihi gịnị ka a na-aghaghị imezu ikpe ziri ezi n’isi ndị nọgidere n’omume ọjọọ?

15 Ọ dịghị atọ Jehọva ụtọ ibibi ndị na-emebi iwu, ọ dịghị atọkwa ndị ohu ya ụtọ. Site n’ọnụ Ndịàmà ya, Jehova na-agba ndị mmadụ ume, sị: “Chigharịanụ, sinụ n’ụzọ ọjọọ nile unu chigharịa; ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka unu ga-anwụ?” (Ezekiel 33:11) Otú o sina dị, mgbe ndị mmadụ na-egosighị ọchịchọ ọ bụla ige ntị n’òkù nke a o ji ịhụnanya na-akpọ, ma nọgide n’ụzọ ndụ nke ịchọ ọdịmma onwe ha, nsọpụrụ Jehova nwere nye aha nsọ nke onwe ya na ịhụnanya o nwere n’ebe ndị ohu ya kwesịrị ntụkwasị obi nọ, bụ́ ndị na-ata ahụhụ mmekpọ ọnụ n’aka ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, na-akpali ya ka o mee ihe n’ikpe ziri ezi.

16. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji nwee obi ike na nnapụta ahụ e buru n’amụma dị ezi nso? (b) Ọ̀ bụ site na gịnị, ọ̀ bụkwa banye na gịnị, ka nnapụta ahụ ga-abụ?

16 Oge Chineke ga-eweta nnapụta adịwo nso ugbu a! Ụdị omume na ihe omume ndị Jisọs buru amụma ha dị ka ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya na nke ọgwụgwụ nke usoro ihe dị ugbu a na-apụta nnọọ ìhè. Akụkụ dị iche iche nke ihe ịrịba ama ahụ malitere ịpụta n’ihe karịrị 75 afọ gara aga, Jisọs kwukwara na “ọgbọ a” agaghị agabịga ma ọlị tupu e mezuo ihe Chineke kpere n’ikpe n’isi ụwa nke a nke na-adịghị asọpụrụ Chineke. Mgbe Jehova kpebiri na a kpọsawo ozi Alaeze ahụ ruo n’ókè zuru ezu n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile, mgbe ahụ, ọgwụgwụ nke ụwa ajọ omume nke a ga-abịa, nnapụta nye ndị na-asọpụrụ Chineke ga-esokwa nke a bịa. (Matiu 24:3-34; Luk 21:28-33) Ọ̀ bụ nnapụta site na gịnị? Ọ bụ site n’ọnwụnwa nile ndị ha cheworo ihu n’aka ndị ajọ omume, sitekwa n’ọnọdụ ndị wetawooro ha mkpagbu kwa ụbọchị dị ka ndị hụrụ ezi omume n’anya. Ọ ga-abụkwa nnapụta banye n’ime ụwa ọhụrụ ebe ọrịa na ọnwụ ga-abụ ihe gabigaworonụ.

Enyemaka Chineke nke Na-eduje Ná Nnapụta

17. (a) Ajụjụ dị aṅaa nke na-akpata ntụgharị uche ka anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị? (b) Olee ụzọ anyị pụrụ isi nye ihe àmà na, dị ka Noa, ‘egwu Chineke’ bụ ihe na-akpali anyị?

17 Ajụjụ nke ọ dị mkpa ka anyị tụlee n’otu n’otu bụ, ‘Àdị m njikere maka ihe ahụ Chineke gaje ime?’ Ọ bụrụ na anyị na-atụkwasị onwe anyị obi ma ọ bụ na-atụkwasị obi n’ihe anyị chere na ọ bụ ezi omume, anyị adịbeghị njikere. Ma, ọ bụrụ na, dị ka Noa, a na-akpali anyị site ‘n’egwu Chineke,’ mgbe ahụ anyị ji okwukwe na-azaghachi ná ntụziaka nke Jehova na-enye anyị, nke a ga-edujekwa ná nnapụta anyị.—Ndị Hibru 11:7.

18. N’ihi gịnị ka ịmụta ezi nsọpụrụ nye usoro ọchịchị Chineke ji bụrụ akụkụ dị mkpa ná nkwadebe anyị na-eme ịbụ ndị a napụtara banye n’ime ụwa ọhụrụ ahụ?

18 N’iji okwu mara mma na-akọwa ndị ahụ na-enweta nchebe ahụ nke Jehova na-enye ọbụna ugbu a, Abụ Ọma 91:1, 2 na-asị: “Onye na-ebi n’ebe nzuzo nke Onye kachasị ihe nile elu, ọ bụ n’okpuru ndò nke Onye pụrụ ime ihe nile ka ọ na-anọ ọnọdụ abalị. M ga-asị Jehova, Ị bụ ebe mgbaba m na ebe m e wusiri ike; ị bụ Chineke m, onye m na-atụkwkasị obi.” N’ebe a ka e nwere ìgwè mmadụ ndị Chineke na-echebe dị ka ụmụ nnụnụ nọ n’okpuru nkù siri ike nke nne ha. Ntụkwasị obi zuru ezu ha nwere bụ n’ebe Jehova nọ. Ha na-anakwere na ọ bụ ya bụ Onye kachasị ihe nile elu, Onye pụrụ ime ihe nile. N’ihi nke a, ha na-asọpụrụ usoro ọchịchị Chineke, na-edokwa onwe ha n’okpuru ya, ma ọ bụ ndị mụrụ ụmụ na-egosipụta ya ma ọ bụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche.” (Matiu 24:45-47) Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu n’ihe banyere anyị nile n’otu n’otu? Dị ka Noa, ànyị na-amụta ime ‘ihe nile Jehova nyere anyị n’iwu,’ na-emekwa ihe nile n’ụzọ nke ya? (Jenesis 6:22) Ya bụrụ otú ahụ, anyị na-eme ihe kwekọrọ ná nkwadebe Jehova na-emere anyị ugbu a maka nnapụta banye n’ime ụwa ọhụrụ nke ezi omume ya.

19. (a) Gịnị bụ obi ihe atụ anyị, gịnịkwa mere o ji dị mkpa ka anyị lebara ya anya? (Ilu 4:23) (b) Olee ụzọ anyị pụrụ isi rite uru site n’ihe nlereanya nke Lọt n’ihe banyere mmeghachi omume anyị n’ebe ihe ndọrọ nke ụwa dị?

19 Nkwadebe ahụ gụnyekwara ilebara obi ihe atụ anyị anya. “Onye na-anwa obi bụ Jehova.” (Ilu 17:3) Ọ na-enyere anyị aka ịghọta na ọ bụghị ihe o yiri ka ànyị bụ n’elu ahụ bụ ihe dị mkpa, kama nke ahụ, ọ bụ mmadụ ime anyị, bụ́ obi anyị. Ọ bụ ezie na anyị adịghị etinye aka n’ime ihe ike ma ọ bụ omume rụrụ arụ dị ka ụwa nke anyị bi n’ime ya na-eme, ọ dịkwa mkpa ka anyị nọrọ na nche megide ikwere ka ihe omume ndị dị otú a dọrọ mmasị anyị ma ọ bụ bụrụ ihe ndị na-enye anyị ọṅụ. Dị ka Lọt, nanị ịdị adị nke omume mmebi iwu ndị dị otú ahụ kwesịrị ịbụrụ anyị ihe mwute. Ndị kpọrọ ihe ọjọọ asị agaghi na-achọ ụzọ ha ga-esi kere òkè na ya; ma, mmadụ ndị na-akpọghi ya asị pụrụ izere ikere òkè na ya kpọmkwem, ma jiri uche ha na-enwe agụụ ikere òkè na ya. “Unu ndị na-ahụ Jehova n’anya, kpọọnụ ihe ọjọọ asị.”—Abụ Ọma 97:10.

20. (a) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Bible si na-adọ anyị aka ná ntị megide ụzọ ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya? (b) Ànyị pụrụ isi aṅaa mara ma ozizi ahụ dị mkpa nke Bible n’ihe banyere ịhụ ihe onwunwe n’anya ọ̀ gbamiwo mkpọrọgwụ n’ime obi anyị?

20 Jehova ji ịhụnanya na-ezi anyi ihe ka anyi gbakụta azụ, ọ bụghị nani omume rụrụ arụ, kamakwa ụzọ ndụ nke ịhụ ihe onwunwe n’anya. Okwu ya na-adụ ọdụ ka anyị nwee ‘afọ ojuju ebe anyị nwere ihe oriri na ihe igbokwasị n’ahụ.’ (1 Timoti 6:8) Noa na ụmụ ya ndị ikom hapụrụ ụlọ ha mgbe ha banyere n’ime ụgbọ ahụ. Lọt na ezinụlọ ya hapụkwara ụlọ ha na ihe onwunwe ha nile iji wee zọpụta ndụ ha. Èbee ka anyị tụkwasịworo mmetụta anyị? “Chetanụ nwunye Lọt.” (Luk 17:32) Jisọs gbara ume, sị: “Ma burunụ ụzọ chọọ alaeze ya, na ezi omume ya.” (Matiu 6:33) Ànyị na-eme nke ahụ? Ọ bụrụ na ụkpụrụ ezi omume nile nke Jehova na-eduzi anyị, ọ bụrụkwa na ịkpọsa ozi ọma nke Alaeze ya bụ nchegbu mbụ anyị nwere ná ndụ, mgbe ahụ, anyị na-anakwere n’ezie nkwadebe ọ na-akwadebe ndị a ga-anapụta banye n’ime ụwa ọhụrụ ya.

21. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ ịtụ anya n’ụzọ ziri ezi na nkwa Jehova nke nnapụta bụ nke a ga-emezu n’isi nso?

21 Jisọs gwara ndị na-asọpụrụ Chineke, bụ́ ndị ga-ahụ mmezu nke ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya n’ike Alaeze, sị: “Leenụ anya n’elu, weliekwanụ isi unu; n’ihi na mgbapụta unu na-eru nso.” (Luk 21:28) Ị hụwo ka ihe ịrịba ama ahụ na-apụta ìhè n’akụkụ ya nile? Ya bụrụ otú ahụ, nwee ntụkwasị obi na mmezu nke nkwa nnapụta Jehova kwere dị ezi nso ugbu a! Kwere n’ezie na ‘Jehova matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke.’—2 Pita 2:9.

Gịnị Ka Ị Mụtaworo?

◻ Dị ka Lọt, olee ụzọ anyị kwesịrị isi meghachi omume n’ihe banyere ụzọ ndụ nke ụwa?

◻ Ule dịgasị aṅaa ka Lọt na ezinụlọ ya chere ihu ọbụna mgbe ha nọ na-agbapụ na Sọdọm?

◻ Olee ụzọ ihe atụ ndị ahụ Pita jiri mee ihe si na-emesi ike okè mkpa ọ dị iwere ọnọdụ siri ike n’akụkụ nke Jehova ugbu a?

◻ N’ịkwadebe ndị ya maka nnapụta, ihe dịgasị aṅaa dị mkpa ka Jehova na-ezi ha?

[Foto dị na peeji nke 18]

Chineke na-echebe ndị ya dị ka ụmụ nnụnụ nọ n’okpuru nkù siri ike nke nne ha

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya