Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w93 10/15 p. 12-16
  • Ịchọta Ụzọ E Si Enweta Ịhụnanya Ụmụnna

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịchọta Ụzọ E Si Enweta Ịhụnanya Ụmụnna
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Atụ Dị Iche Iche nke Ịhụnanya Ụmụnna Pụrụ Iche
  • Ihe Nlereanya nke Pọl Onyeozi
  • Nghọta—Ụzọ Isi Nweta Ịhụnanya Ụmụnna
  • Igosipụta Ịhụnanya Ụmụnna
  • “Na-enwenụ Mmetụta Dị Nro Maka Ibe Unu”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Kpebisienụ Ike na ‘Ịhụnanya Ụmụnna Unu Ga-adịgide’
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Otú Di na Nwunye Ga-esi Egosi na Ha Hụrụ Ibe Ha n’Anya
    Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka
  • Na-enwere Ụmụnna Gị Ọmịiko
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2021
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
w93 10/15 p. 12-16

Ịchọta Ụzọ E Si Enweta Ịhụnanya Ụmụnna

“Nyezuokwanụ . . . ịhụnanya ụmụnna n’ime nsọpụrụ Chineke unu.”—2 PITA 1:5-7.

1. Gịnị bụ otu isi ihe mere nzukọ ndị Jehova ji abụ oge ndị na-enye obi ụtọ nke ukwuu?

N’OTU oge, otu dọkịta nke na-abụghị otu n’ime Ndịàmà Jehova bịara ememe ngụsị akwụkwọ nke ada ya ji apụta na Watch Tower Bible School of Gilead, bụ́ ebe ọ nataworo ọzụzụ ije ozi ala ọzọ. Obi dị ya ụtọ nke ukwuu ịhụ ìgwè mmadụ nwere obi ụtọ nke na o kwupụtara na ọ ghaghị ịbụ na ndị a adịghị arịakarị ọrịa. Gịnị mere ìgwè mmadụ a ji nwee obi ụtọ nke ukwuu? N’otu aka ahụ, gịnị na-eme ka nzukọ nile nke ndị Jehova, n’ọgbakọ, ná mgbakọ sekit, nakwa ná mgbakọ distrikti, bụrụ oge obi ụtọ? Ọ́ bụghị ịhụnanya ụmụnna nke ha na-egosipụta n’ebe ibe ha nọ? N’enweghị obi abụọ, ịhụnanya ụmụnna bụ otu ihe mere e jiworo kwuo na ọ dịghị òtù okpukpe ọ bụla ọzọ nke na-enweta oké ọṅụ, obi ụtọ, na afọ ojuju site n’okpukpe dị ka Ndịàmà Jehova na-eme.

2, 3. Okwu Grik abụọ dị aṅaa na-akọ banyere mmetụta anyị kwesịrị inwe n’ebe ibe anyị nọ, oleekwa ihe ndị e ji mara ha nke mere ka ha dị iche?

2 Anyị kwesịrị ịtụ anya ịchọta ịhụnanya ụmụnna dị otú ahụ n’ihi ihe Pita onyeozi kwuru na 1 Pita 1:22: “Ebe unu meworo mkpụrụ obi unu ka ha dị ọcha n’ịṅa ntị nke unu ṅara eziokwu, iwere ịhụnanya nke ihu abụọ na-adịghị ya hụ ụmụnna unu n’anya, sitenụ n’obi unu hụrịta onwe unu n’anya sie ike.” Otu n’ime isi ihe dị n’okwu Grik ahụ a sụgharịrị ebe a ịbụ ‘ịhụnanya ụmụnna’ bụ phi·liʹa (ịhụnanya). Ihe ọ pụtara yitebere ihe a·gaʹpe pụtara, bụ́ okwu nke a na-asụgharịkarị ịbụ “ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ọ bụ ezie na a na-ejirịtakarị ịhụnanya ụmụnna na ịhụnanya eme ihe, ha nwere ihe ndị e ji mara ha kpọmkwem. Anyị ekwesịghị iche na nke ọ bụla n’ime ha bụ ibe ya, dị ka ọtụtụ ndị nsụgharị Bible na-eme. (N’isiokwu nke a na nke na-esonụ, anyị ga-atụle nke ọ bụla n’ime okwu ndị a.)

3 Banyere ọdịiche dị n’etiti okwu Grik abụọ ndị a, otu onye ọkà mmụta rịbara ama na phi·liʹa bụ “kpọmkwem okwu ikpo ọkụ na ịdị nso na ịhụnanya.” N’aka nke ọzọ, a·gaʹpe na-esitekarị n’uche. Otú a ọ bụ ezie na a gwara anyị ka anyị hụ ndị iro anyị n’anya (a·gaʹpe), anyị adịghị enwe ịhụnanya dị omimi n’ebe ha nọ. N’ihi gịnị? N’ihi na “mkparịta nile ọjọọ na-emebi omume ọma.” (1 Ndị Kọrint 15:33) Ihe ọzọ na-egosi na e nwere ọdịiche bụ okwu nke Pita onyeozi: “Nyezuokwanụ . . . ịhụnanya n’ime ịhụnanya ụmụnna unu.”—2 Pita 1:5-7; tụlee Jọn 21:15-17.a

Ihe Atụ Dị Iche Iche nke Ịhụnanya Ụmụnna Pụrụ Iche

4. N’ihi gịnị ka Jisọs na Jọn ji nwee mmetụta ịhụnanya pụrụ iche maka ibe ha?

4 Okwu Chineke na-enye ọtụtụ ihe atụ mara mma nke ịhụnanya ụmụnna pụrụ iche. Mmetụta ịhụnanya nke a pụrụ iche abụghị ihe si ná mkpali pụta kama ọ dabeere ná nghọta nke àgwà ndị pụrụ iche. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe atụ a kasị mara bụ nke mmetụta ịhụnanya ahụ Jisọs Kraịst nwere maka Jọn onyeozi. N’enweghị ihe ịrụ ụka, Jisọs nwere ịhụnanya ụmụnna maka ndị ozi ya nile kwesịrị ntụkwasị obi, nke ahụ bụkwa n’ihi ezi ihe. (Luk 22:28) Otu ụzọ o si gosi nke a bụ site n’ịsacha ụkwụ ha, si otú a na-enye ha ihe mmụta n’ịdị umeala. (Jọn 13:3-16) Ma Jisọs nwere mmetụta ịhụnanya pụrụ iche maka Jọn, bụ́ nke Jọn hotara ọtụtụ mgbe. (Jọn 13:23; 19:26; 20:2) Ọbụna dị ka Jisọs nwere ezi ihe mere ọ ga-eji gosipụta mmetụta ịhụnanya maka ndị na-eso ụzọ ya na ndị ozi ya, o yikarịrị ka Jọn ò mere ka Jisọs nwee ihe mere o ji nwee mmetụta ịhụnanya pụrụ iche n’ebe ọ nọ n’ihi nghọta miri emi o nwere banyere Jisọs. Anyị pụrụ ịhụ nke a site n’ihe odide Jọn, ma Oziọma ya ma akwụkwọ ozi ndị o dere n’ike mmụọ nsọ. Lee ka o si hota ịhụnanya ọtụtụ mgbe n’ihe odide ndị ahụ! A na-ahụta nghọta ka ukwuu Jọn nwere banyere àgwà ime mmụọ ndị Jisọs nwere n’ihe o dere na Jọn isi nke 1 na 13 ruo 17, tinyekwara izo aka ndị o zoro ọtụtụ mgbe n’ịdị adị Jisọs tupu ọ ghọọ mmadụ.—Jọn 1:1-3; 3:13; 6:38, 42, 58; 17:5; 18:37.

5. Gịnị ka a pụrụ ikwu banyere mmetụta ịhụnanya pụrụ iche nke Pọl na Timoti nwere maka ibe ha?

5 N’otu ụzọ ahụ, anyị agaghị achọ ịjụ mmetụta ịhụnanya ụmụnna pụrụ iche nke Pọl onyeozi na onye Kraịst ibe ya bụ Timoti nwere n’ebe ibe ha nọ, bụ́ nke, n’ezie, dabeere n’ịghọta àgwà ndị onye ọ bụla n’ime ha nwere. Ihe odide Pọl nwere okwu ndị mara mma banyere Timoti, dị ka: “Enweghị m onye ọ bụla nke mkpụrụ obi ya yiri nke ya, bụ́ onye ga-echegbu onwe ya banyere ọnọdụ unu n’ezie. . . . Unu maara ọnwụnwa ya, na, dị ka nwa na-eso nna ya, otú a ka o sooro m bụrụ ohu n’izisa ozi ọma.” (Ndị Filipaị 2:20-22) E nwere ọtụtụ izo aka onwe onye n’akwụkwọ ozi ya banyere Timoti nke na-ekpughe mmetụta ịhụnanya na-ekpo ọkụ nke Pọl nwere maka Timoti. Dị ka ihe atụ, rịba ama ihe dị na 1 Timoti 6:20: “Biko Timoti, na-eche ihe ahụ e nyere gị n’aka idebe.” (Leekwa 1 Timoti 4:12-16; 5:23; 2 Timoti 1:5; 3:14, 15.) Karịsịa ntụle nke akwụkwọ ozi Pọl degaara Timoti nakwa akwụkwọ ozi nke o degaara Taịtọs na-eme ka ọ pụta ìhè na Pọl nwere mmetụta ịhụnanya pụrụ iche maka nwa okorobịa nke a. Timoti aghaghị inweworị otu ụdị mmetụta ahụ banyere ọbụbụenyi ha, dị ka a pụrụ ịrịba ama site n’okwu Pọl ndị dị na 2 Timoti 1:3, 4: “Ncheta m banyere gị n’arịrịọ m nile dị n’ewepụghị aka, . . . agụụ ịhụ gị na-agụsi m ike abalị na ehihie, ebe m na-echeta anya mmiri gị nile, ka m wee jupụta n’ọṅụ.”

6, 7. Mmetụta dị aṅaa ka Devid na Jonatan nwere maka ibe ha, n’ihi gịnịkwa?

6 Akwụkwọ Nsọ Hibru na-enyekwa ihe atụ ndị mara mma, dị ka nke Devid na Jonatan. Anyị na-agụ na mgbe Devid gbusịrị Golaịat, “e kekọtara mkpụrụ obi Jonatan na mkpụrụ obi Devid, Jonatan wee hụ ya n’anya dị ka mkpụrụ obi ya.” (1 Samuel 18:1) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na inwe nghọta banyere ihe nlereanya ịnụ ọkụ n’obi Devid maka aha Jehova na atụghị ụjọ ya n’ịpụta ije zute dike ahụ bụ́ Golaịat mere Jonatan ji nwee mmetụta ịhụnanya pụrụ iche maka Devid.

7 Jonatan nwere mmetụta ịhụnanya dị otú ahụ maka Devid nke na o tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ ichedo Devid site n’aka Eze Sọl. Ọ dịghị oge ọ bụla Jonatan were iwe maka nhọpụta Jehova họpụtara Devid ịbụ eze ọzọ ga-achị Israel. (1 Samuel 23:17) Devid nwekwara ịhụnanya miri emi maka Jonatan, bụ́ nke pụtara ìhè site n’ihe o kwuru mgbe ọ na-eru újú maka ọnwụ nke Jonatan: “Anọ m ná mkpa n’ihi gị, nwanne m Jonatan: ị dị ụtọ nke ukwuu n’ebe m nọ: ịhụnanya gị nke ị hụrụ m dị ebube, karị ịhụnanya ndị inyom.” N’ezie, nghọta miri emi kara mmekọrịta ha akara.—2 Samuel 1:26.

8. Olee ndị inyom abụọ gosipụtara mmetụta ịhụnanya pụrụ iche maka ibe ha, n’ihi gịnịkwa?

8 Anyị nwekwara ihe atụ mara mma n’Akwụkwọ Nsọ Hibru banyere mmetụta ịhụnanya pụrụ iche n’akụkụ nke ndị inyom abụọ, Naomi na nwunye nwa ya nke di ya nwụrụ anwụ bụ́ Rut. Cheta okwu Rut gwara Naomi: “Arịọla m ịhapụ gị, isi n’iso gị laghachi: n’ihi na ebe ị na-eje ka m ga-eje; ọ bụkwa ebe ị na-anọ ọnọdụ abalị ka m ga-anọ ọnọdụ abalị: ndị gị ga-abụ ndị m, Chineke gị ga-abụkwa Chineke m.” (Rut 1:16) Ọ̀ bụ na anyị aghaghị ikwubi na Naomi, site n’omume ya nakwa ya ikwu okwu banyere Jehova, nyere aka ịkpali nzaghachi nghọta nke a n’akụkụ Rut?—Tụlee Luk 6:40.

Ihe Nlereanya nke Pọl Onyeozi

9. Gịnị na-egosi na Pọl bụ ihe nlereanya n’ihe banyere ịhụnanya ụmụnna?

9 Dị ka anyị hụworo, Pọl onyeozi nwere ịhụnanya ụmụnna pụrụ iche maka Timoti. Ma o setịpụkwara ihe nlereanya magburu onwe ya nke igosipụta ịhụnanya ụmụnna na-ekpo ọkụ maka ụmụnna ya nile. Ọ gwara ndị okenye sitere n’Efesọs na “ogologo afọ atọ [ọ hapụghị] iwere anya mmiri na-adụ mmadụ nile n’otu n’otu ọdụ abalị na ehihie.” Nke ahụ ọ̀ bụ ịhụnanya ụmụnna na-ekpo ọkụ? Ihe ịrụ ụka adịghị ya! Ha nwekwara otu ụdị mmetụta ahụ banyere Pọl. Mgbe ha nụrụ na ha agaghị ahụkwa ya ọzọ, “ha nile wee kwaa ákwá nke ukwuu, dakwasị Pọl n’olu, sutukwa ya ọnụ.” (Ọrụ 20:31, 37) Nke a ọ̀ bụ ịhụnanya ụmụnna nke dabeere ná nghọta? Ee! A na-ahụkwa ịhụnanya ụmụnna ya site n’okwu o kwuru ná 2 Ndị Kọrint 6:11-13: “Ndị Kọrint, ọnụ anyị ghere oghe ịgwawa unu okwu, e mewo ka obi anyị dị obodobo. A dịghị eme ka unu nọọ n’ọnọdụ dị oké mkpà n’ime anyị, ma a na-eme ka unu nọọ n’ọnọdụ dị oké mkpà n’obi nke unu. Ma dị ka ụgwọ ọrụ n’otu ụzọ ahụ (ana m ekwu dị ka a na-agwa ụmụ m), ka e meekwa ka unu onwe unu dị obodobo n’obi unu.”

10. Enweghị ịhụnanya ụmụnna dị aṅaa dujere Pọl n’ịkọ banyere ọnwụnwa ya ndị dị ná 2 Ndị Kọrint isi nke 11?

10 N’ụzọ doro anya, ọtụtụ n’ime ndị Kọrint enweghị nghọta nke ịhụnanya ụmụnna maka Pọl onyeozi. Otú a, ụfọdụ n’ime ha mere mkpesa, sị: “Akwụkwọ ozi ya dị arọ dịkwa ike; ma ọnụnọ nke ahụ ya n’etiti anyị adịghị ike, okwu ya bụkwa ihe a kpọrọ ihe efu.” (2 Ndị Kọrint 10:10) Nke ahụ mere Pọl ji zoo aka n’ebe “ndị kachasị elu n’etiti ndị ozi” ha nọ, e wee kpalie ya ịkọ banyere ule ndị ọ tachiworo obi na ha, dị ka e dekọrọ ná 2 Ndị Kọrint 11:5, 22-33.

11. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere banyere mmetụta ịhụnanya Pọl nwere maka ndị Kraịst nọ na Tesalọnaịka?

11 Mmetụta ịhụnanya na-ekpo ọkụ nke Pọl nwere maka ndị o jeere ozi pụtara ìhè karịsịa site n’okwu o kwuru ná 1 Ndị Tesalọnaịka 2:8: “Ebe unu dị anyị n’obi nke ukwuu, ọ dị anyị ezi mma ime ka unu keta, ọ bụghị nanị ozi ọma nke Chineke, kama ọ bụkwa mkpụrụ obi nke aka anyị, n’ihi na e mere ka unu bụrụ ndị anyị hụrụ n’anya.” N’ezie, o nwere mmetụta ịhụnanya dị otú ahụ maka ụmụnna ọhụrụ ndị a nke na mgbe ọ na-apụkwaghị ịnọ n’anụghị banyere ha—ọ gụsiri ya agụụ ike ịmara banyere ụzọ ha si na-atachi obi ná mkpagbu—o zigara Timoti, bụ́ onye wetara akụkọ dị mma nke nyere Pọl ume ọhụrụ nke ukwuu. (1 Ndị Tesalọnaịka 3:1, 2, 6, 7) Akwụkwọ Insight on the Scriptures na-akọwa ya nke ọma, sị: “Ihe nkekọ chiri anya nke ịhụnanya ụmụnna dịrị n’etiti Pọl na ndị ahụ o jeere ozi.”

Nghọta—Ụzọ Isi Nweta Ịhụnanya Ụmụnna

12. Olee ihe ndị mere anyị ga-eji na-egosipụta mmetụta ịhụnanya na-ekpo ọkụ maka ụmụnna anyị?

12 Ihe ịrụ ụka adịghị ya, ụzọ isi nweta ịhụnanya ụmụnna bụ inwe nghọta. Ọ̀ bụ na ndị ohu Jehova nile raara onwe ha nye enweghị àgwà ndị na-amasị anyị, nke na-akpali mmetụta ịhụnanya anyị, na-eme ka ihe ha dị anyị ezi mma? Anyị nile na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume ya dị ka ihe mbụ. Anyị nile na-alụsi ọgụ ike megide ndị iro atọ anyị nwere: Setan na ndị mmụọ ọjọọ, ajọ ụwa nke nọ n’okpuru nchịkwa Setan, na àgwà ebumpụta ụwa nke anụ ahụ na-emehie emehie nwere ịchọ ọdịmma onwe ya nanị. Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ịnakwere ọnọdụ ahụ bụ na ụmụnna anyị na-eme ike ha nile n’ihi otú ọnọdụ si kwụrụ? Onye ọ bụla nọ n’elu ụwa nọ n’akụkụ Jehova ma ọ bụ n’akụkụ Setan. Ụmụnna anyị ndị nwoke na ndị nwanyị nọ n’akụkụ Jehova, ee, n’akụkụ nke anyị nọ, ya mere ha kwesịrị inweta ịhụnanya ụmụnna anyị.

13. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmetụta ịhụnanya na-ekpo ọkụ maka ndị okenye?

13 Gịnị banyere inwe ekele maka ndị okenye anyị? Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị inwe ezi mmasị n’obi anyị banyere ha n’ihi ụzọ ha na-esi adọgbu onwe ha n’ọrụ maka ọdịmma nke ọgbakọ? Dịkwa ka anyị nile, ha aghaghị ịkpata ihe ha na ezinụlọ ha ji adị ndụ. Ha nwekwara otu ibu ọrụ ahụ dị ka anyị nile nwere inwe ọmụmụ ihe onwe onye, ịbịa nzukọ nile nke ọgbakọ, na ikere òkè n’ozi ubi. Tụkwasị na nke ahụ, ha nwere ibu ọrụ ịkwadebe ihe omume dị iche iche maka nzukọ nile, inye okwu ihu ọha, na ilekọta nsogbu ndị na-ebilite n’ọgbakọ, bụ́ ndị na-ewe ọtụtụ hour nke ịnụrụ okwu ikpe mgbe ụfọdụ. N’ezie, anyị chọrọ ịdị ‘na-asọpụrụ ndị dị otú a.’—Ndị Filipaị 2:29.

Igosipụta Ịhụnanya Ụmụnna

14. Akụkụ akwụkwọ nsọ dị aṅaa na-enye anyị iwu igosi ịhụnanya ụmụnna?

14 Iji mee ihe na-atọ Jehova ụtọ, anyị aghaghị igosipụta mmetụta na-ekpo ọkụ nke ịhụnanya ụmụnna maka ndị kwere ekwe ibe anyị, ọbụna dị ka Jisọs Kraịst na Pọl mere. Anyị na-agụ, sị: “N’akụkụ [ịhụnanya ụmụnna unu], ka ihe mmadụ ibe unu na-atọrịta unu ụtọ nke ukwuu.” (Ndị Rom 12:10, Kingdom Interlinear) “Ọ dịghị unu mkpa ka mmadụ degara unu akwụkwọ banyere [ịhụnanya ụmụnna]: n’ihi na unu onwe unu bụ ndị Chineke ziworo ịhụrịta ibe unu n’anya.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:9, Int) “Ka [ịhụnanya ụmụnna unu] na-adịgide.” (Ndị Hibru 13:1, Int) N’ezie Nna anyị nke bi n’eluigwe na-enwe obi ụtọ mgbe anyị na-egosi ịhụnanya ụmụnna maka ụmụ elu ala ya!

15. Olee ụzọ ụfọdụ a pụrụ isi gosipụta ịhụnanya ụmụnna?

15 N’oge ndị ozi, ndị Kraịst nwere àgwà nke ikele ibe ha site ‘n’isutu ọnụ dị nsọ’ ma ọ bụ “isutu ọnụ nke ịhụnanya.” (Ndị Rom 16:16; 1 Pita 5:14) N’ezie nke a bụ ngosipụta nke ịhụnanya ụmụnna! Taa, n’ihe ka ọtụtụ n’akụkụ nke ụwa, ngosipụta kwesịrị ekwesị karị ga-abụ ezi ihu ọchị nke onye bụ enyi na ikwe n’aka. Ná mba ndị Latin, dị ka Mexico, e nwere ekele dị n’ụdị nke ibi ọma, n’ezie nke a bụ ngosipụta mmetụta ịhụnanya. Mmetụta ịhụnanya nke a na-ekpo ọkụ n’akụkụ ụmụnna ndị a pụrụ inye aka iso na-akpata oké mmụba na-ewere ọnọdụ ná mba ha.

16. Ohere ndị dị aṅaa ka anyị nwere igosipụta ịhụnanya ụmụnna n’Ụlọ Nzukọ Alaeze anyị?

16 Mgbe anyị batara n’Ụlọ Nzukọ Alaeze, ànyị na-ewepụta onwe anyị ịga gosipụta ịhụnanya ụmụnna? Ọ ga-eme ka anyị nwee okwu ndị na-agba ume ikwu, karịsịa nye ndị o yiri ka hà dara mbà n’obi. A gwara anyị ka anyị ‘na-agụgụ ndị dara mbà n’obi.’ (1 Ndị Tesalọnaịka 5:14) Nke ahụ n’ezie bụ otu ụzọ nke anyị pụrụ isi gosipụta ikpo ọkụ nke ịhụnanya ụmụnna. Ụzọ ọzọ mara mma bụ igosipụta ekele maka okwu ihu ọha mara mma, ihe omume e mere nke ọma, ezi mgbalị nke onye mere ihe omume tinyere n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, na n’ihe ndị ọzọ.

17. Olee ụzọ otu onye okenye si nweta mmetụta ịhụnanya nke ndị nọ n’ọgbakọ?

17 Olee banyere ịkpọ ndị dị iche iche òkù ịbịa n’ụlọ anyị maka ihe oriri ma ọ bụ ma eleghị anya ihe ọtịta mgbe a gbasara nzukọ ma ọ bụrụ na chi ejibeghị nke ukwuu? Ọ̀ bụ na anyị ekwesịghị ikwere ka ndụmọdụ Jisọs nke dị na Luk 14:12-14 duzie anyị? N’otu oge a họpụtara onye bụbu onye ozi ala ọzọ dị ka onye isi oche ndị nlekọta n’otu ọgbakọ ebe ndị ọzọ nile nọ na ya sitere n’agbụrụ dị iche. Ọ chọpụtara àgwà nke enweghị ịhụnanya ụmụnna, ya mere o chepụtara ụzọ isi dozie ọnọdụ ahụ. N’ụzọ dị aṅaa? Kwa ụbọchị Sunday ọ bụla, ọ na-akpọ otu ezinụlọ òkù ihe oriri. Tupu otu afọ agwụsịa, mmadụ nile na-egosipụta ịhụnanya ụmụnna na-ekpo ọkụ n’ebe ọ nọ.

18. Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosi ịhụnanya ụmụnna maka ụmụnna ndị nwoke na nwanyị na-arịa ọrịa?

18 Mgbe otu nwanna nwoke ma ọ bụ nwanyị na-arịa ọrịa, n’ụlọ ya ma ọ bụ n’ụlọ ọgwụ, ịhụnanya ụmụnna ga-akpali anyị ime ka onye ahụ mara na anyị na-eche banyere ya. Ma ọ bụ olee banyere ndị bi n’ebe a na-elekọta ndị ọrịa na ndị agadi? Gịnị ma i jee leta ha n’onwe gị, kpọọ na fon, ma ọ bụ ziga kaadị nke na-egosipụta mmetụta na-ekpo ọkụ?

19, 20. Olee ụzọ anyị pụrụ isi gosi na ịhụnanya ụmụnna anyị adịwo obodobo?

19 Mgbe a na-enye ngosipụta dị otú ahụ nke ịhụnanya ụmụnna, anyị pụrụ ịjụ onwe anyị, sị, ‘Ịhụnanya ụmụnna m ọ̀ na-akpa ókè? Isi ihe ndị dị ka ụcha akpụkpọ ahụ, agụmakwụkwọ, ma ọ bụ akụ̀ ihe onwunwe hà na-emetụta ngosipụta m nke ịhụnanya ụmụnna? Ọ̀ dị mkpa ka m dịwanye obodobo n’ịhụnanya ụmụnna m, dị ka Pọl onyeozi gbara ndị Kraịst nọ na Kọrint ume ime?’ Ịhụnanya ụmụnna ga-akpali anyị ile ụmụnna anyị anya n’ụzọ ziri ezi, na-enwe mmasị n’ebe ha nọ maka ebe ndị ha na-eme nke ọma. Ịhụnanya ụmụnna ga-enyekwara anyị aka ịṅụrị ọṅụ n’ọganihu nke ụmụnna anyị kama inwere ha anya ụfụ.

20 Ịhụnanya ụmụnna kwesịkwara ime ka anyị mụrụ anya inyere ụmụnna anyị aka n’ozi ha. O kwesịrị ịbụ dị ka otu n’ime abụ anyị (Nke 51) si kwuo ya:

“Na-enyere ndị dum na-ada mbà aka,

Ka ha onwe ha wee nwee nkwuwa okwu.

Echezọla ndị ụmụntakịrị,

Na-enyere ha aka ịdị ike imeri egwu.”

21. Nzaghachi dị aṅaa ka anyị pụrụ ịtụ anya ya mgbe anyị gosipụtara ịhụnanya ụmụnna?

21 Ya mere ka anyị ghara ichezọ na n’igosipụta ịhụnanya ụmụnna, ụkpụrụ nke Jisọs kwupụtara n’Ozizi Elu Ugwu ya na-emetụta nke ahụ: “Na-enyenụ, a ga-enyekwa unu; ọ̀tụ̀tụ̀ ọma, nke a bịadaworo ala, yọkọta, nke na-ejubigakwa ókè, ka ha ga-enye n’obi unu. N’ihi na ihe unu ji tụọ ihe ka a ga-eji tụọkwara unu ọzọ.” (Luk 6:38) Anyị na-erite uru n’onwe anyị mgbe anyị na-egosi ịhụnanya ụmụnna, na-ekwu okwu ọma banyere ndị bụ ndị ohu Jehova dị ka anyị onwe anyị bụ. Ndị na-enwe mmasị n’igosipụta ịhụnanya ụmụnna na-enwe obi ụtọ n’ezie!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Lee isiokwu nke na-esonụ: “Ịhụnanya (Agape)—Ihe Ọ Na-abụghị na Ihe Ọ Bụ.”

Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?

◻ Okwu Grik dị aṅaa na-akọ banyere mmetụta anyị, oleekwa ụzọ ha si dịrịta iche?

◻ Olee ụzọ e si enweta ịhụnanya ụmụnna?

◻ Ihe atụ Akwụkwọ Nsọ dị aṅaa ka anyị nwere banyere ịhụnanya ụmụnna pụrụ iche?

◻ N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nwee mmetụta ịhụnanya na-ekpo ọkụ maka ụmụnna anyị na maka ndị okenye?

[Foto dị na peeji nke 15]

Pita onyeozi gbara ụmụnna ya ume ka ha nyezuo ịhụnanya ụmụnna n’ime okwukwe ha nakwa n’àgwà ndị ọzọ nke ndị Kraịst

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya