“Uche Zuru Okè” Ka Ọgwụgwụ Na-eru Nso
“Ọgwụgwụ ihe nile dị nso: ya mere nweenụ uche zuru okè.”—1 PITA 4:7.
1. Gịnị ka inwe “uche zuru okè” gụnyere?
OKWU ndị dị n’elu nke Pita onyeozi kwesịrị imetụta ụzọ ndị Kraịst si ebi ndụ ha n’ụzọ dị ukwuu. Otú ọ dị, Pita agwaghị ndị na-agụ akwụkwọ ya ka ha si n’ibu ọrụ nkịtị na nchegbu nke ndụ wezụga onwe ha; ọ kwadoghịkwa ịtụ oké ụjọ banyere mbibi nke na-abịanụ. Kama nke ahụ, ọ gbara ume, sị: “Nweenụ uche zuru okè.” Inwe “uche zuru okè” gụnyere inwe ezi echiche, ịghọta ihe, ịma ihe, echiche dị mma n’okwu na omume anyị. Ọ pụtara ikwe ka Okwu Chineke na-achịkwa echiche na omume anyị. (Ndị Rom 12:2) Ebe anyị bi “n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ nke na-enwekwa anya uhie,” uche zuru okè dị mkpa iji zere nsogbu na ihe isi ike.—Ndị Filipaị 2:15.
2. Olee otú ntachi obi Jehova si abara ndị Kraịst uru taa?
2 “Uche zuru okè” na-enyekwara anyị aka inwe echiche dị mma, nke ziri ezi banyere onwe anyị. (Taịtọs 2:12; Ndị Rom 12:3) Nke a dị mkpa n’ihi okwu ndị e dekọrọ na 2 Pita 3:9: “Onyenwe anyị anọghị ọdụ n’ime nkwa Ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama Ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” Rịba ama na Jehova na-atachi ogologo ntachi obi, ọ bụghị nanị nye ndị na-ekweghị ekwe, kamakwa nye “unu”—ndị òtù ọgbakọ ndị Kraịst. N’ihi gịnị? N’ihi na “O zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi.” Ikekwe ọ ka dị ụfọdụ mkpa ime mgbanwe na ndozigharị dị iche iche iji ruo eru maka onyinye nke ndụ ebighị ebi. Ya mere ka anyị lee anya n’akụkụ ebe ndị ọ pụrụ ịdị mkpa ka e mee mgbanwe.
“Uche Zuru Okè” ná Mmekọrịta Onwe Onye Anyị
3. Ajụjụ ndị dịgasị aṅaa ka ndị mụrụ ụmụ pụrụ ịjụ onwe ha banyere ụmụ ha?
3 Ebe obibi kwesịrị ịbụ ebe udo jupụtara. Ma nye ụfọdụ ọ na-abụ ‘ụlọ jupụtara n’ọgụ.’ (Ilu 17:1) Gịnị banyere ezinụlọ gị? Ebe obibi gị ọ̀ bụ ebe “iwe na iti mkpu na nkwulu” na-adịghị? (Ndị Efesọs 4:31) Gịnị banyere ụmụ gị? Hà na-enwe mmetụta nke ịbụ ndị a hụrụ n’anya ma nwee mmasị na ha? (Tụlee Luk 3:22.) Ị̀ na-ewepụta oge na-akụziri ha ihe ma na-azụ ha? Ị̀ ‘na-azụpụta nzụpụta n’ezi omume’ kama ịbụ n’iwe na ọnụma? (2 Timoti 3:16) Ebe ụmụ bụ “ihe nketa nke na-esi n’aka Jehova bịa,” o nwere oké mmasị n’otú e si emeso ha omume.—Abụ Ọma 127:3.
4. (a) Gịnị pụrụ ịdapụta ma ọ bụrụ na di emesoo nwunye ya ihe n’aka ike? (b) Olee otú ndị bụ nwunye pụrụ isi kwalite udo n’ebe Chineke nọ na obi ụtọ n’ezinụlọ ahụ nile?
4 Gịnị banyere di ma ọ bụ nwunye anyị? “Ndị bụ di jikwa ụgwọ ịhụ nwunye nke aka ha n’anya dị ka ha hụrụ ahụ nke onwe ha n’anya. Onye na-ahụ nwunye nke aka ya n’anya na-ahụ onwe ya n’anya: n’ihi na ọ dịghị onye ọ bụla kpọrọ ahụ onwe ya asị mgbe ọ bụla; kama ọ na-azụ ya na-elezikwa ya anya nke ọma, dị ka Kraịst na-emekwa nzukọ Ya.” (Ndị Efesọs 5:28, 29) Ọ bụghị nanị na nwoke nke na-akpa àgwà ọjọọ, dị aka ike, ma ọ bụ na-enweghị ezi uche na-etinye ịdị jụụ nke ụlọ ya n’ihe ize ndụ kama ọ na-emebi mmekọrịta ya na Chineke. (1 Pita 3:7) Gịnị banyere ndị bụ nwunye? N’otu aka ahụ ha kwesịrị ‘ido onwe ha n’okpuru di nke aka ha, dị ka n’okpuru Onyenwe anyị.’ (Ndị Efesọs 5:22) Iche echiche n’ụzọ nke na-atọ Chineke ụtọ pụrụ inyere nwunye aka ileghara emezighị emezi ndị nke di ya anya ma doo onwe ya n’okpuru ya n’ewesoghị ya iwe. Mgbe ụfọdụ, nwunye pụrụ iche na ya ga-ekwurịrị uche ya. Ilu 31:26 na-ekwu banyere ezi nwunye, sị: “Ọnụ ya ka ọ sagheworo n’amamihe; iwu nke ebere dịkwasịkwa n’ire ya.” Site n’imeso di ya ihe n’obiọma, n’ụzọ nkwanye ùgwù, ọ na-anọgide na-enwe udo n’ebe Chineke nọ, ọ na-akwalitekwa obi ụtọ nke ezinụlọ ya nile.—Ilu 14:1.
5. N’ihi gịnị ka ndị ntorobịa kwesịrị iji gbasoo ndụmọdụ Bible banyere imeso ndị mụrụ ha ihe?
5 Ndị na-eto eto, olee otú unu si emeso ndị mụrụ unu omume? Ùnu na-eji okwu ịkwa emo, nke nlelị bụ́ nke ụwa na-agbakarị nkịtị eme ihe? Ka ùnu na-erube isi n’iwu Bible bụ́: “Ụmụ, na-aṅanụ ntị okwu ndị mụrụ unu n’ime Onyenwe anyị: n’ihi na nke a bụ ihe ziri ezi. Sọpụrụ nna gị na nne gị (nke bụ ihe mbụ e nyere n’iwu nke nkwa dịịrị ya), ka ihe wee na-agara gị nke ọma, ka i wee dịkwa ogologo ndụ n’elu ụwa”?—Ndị Efesọs 6:1-3.
6. Olee otú anyị pụrụ isi chọọ udo n’ebe ndị ofufe ibe anyị nọ?
6 Anyị na-egosikwa “uche zuru okè” mgbe anyị ‘na-achọ udo, gbasookwa ya’ n’ebe ndị ofufe ibe anyị nọ. (1 Pita 3:11) Esemokwu na nghọtahie na-ebilite site n’oge ruo n’oge. (Jemes 3:2) Ọ bụrụ na e kwee ka obi ilu tolite, a pụrụ itinye udo nke ọgbakọ nile n’ihe ize ndụ. (Ndị Galetia 5:15) Ya mere dozie esemokwu ngwa ngwa; chọọ ihe ngwọta dị n’udo.—Matiu 5:23-25; Ndị Efesọs 4:26; Ndị Kọlọsi 3:13, 14.
“Uche Zuru Okè” na Ibu Ọrụ Ezinụlọ
7. (a) Olee otú Pọl si gbaa ume inwe “uche zuru okè” n’ihe ụwa? (b) Àgwà dị aṅaa ka ndị di na ndị nwunye bụ́ ndị Kraịst kwesịrị inwe n’ebe ibu ọrụ ụlọ dị?
7 Pọl onyeozi dụrụ ndị Kraịst ọdụ ka ha “dị ndụ uche zuru okè.” (Taịtọs 2:12) Ọ bụ ihe na-akpali mmasị na, n’okwu ndị gbara ya gburugburu, Pọl dụrụ ndị inyom ọdụ “ịbụ ndị na-ahụ di ha n’anya, ndị na-ahụ ụmụ ha n’anya, ndị uche ha zuru okè, ndị dị ọcha, ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ.” (Taịtọs 2:4, 5) Pọl dere nke ahụ n’afọ 61-64 O.A., afọ ole na ole tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe ndị Juu. Ma, ihe ụwa, ndị dị ka ọrụ a na-arụ n’ụlọ, ka dị mkpa. Ya mere ma ndị bụ di ma ndị bụ nwunye kwesịrị ijigide echiche ziri ezi banyere ibu ọrụ ezinụlọ ha ka e wee “ghara ikwulu okwu Chineke.” Otu onye isi ezinụlọ rịọrọ otu onye bịara ileta ya mgbaghara maka ọdịdị na-eme ihere nke ụlọ ya. Ọ kọwara na ọ dakasịrị adakasị “n’ihi na ya na-asụ ụzọ.” Ọ bụ ihe kwesịrị ịja mma mgbe anyị na-achụ àjà maka Alaeze ahụ, ma a ghaghị ilezi anya ịghara itinye ọdịmma nke ezinụlọ anyị n’ihe ize ndụ.
8. Olee otú ndị isi ezinụlọ pụrụ isi lekọta mkpa nke ezinụlọ ha n’ụzọ guzoziri eguzozi?
8 Bible na-agba ndị bụ nna ume idebe ezinụlọ ha n’ọkwá nke mbụ, na-asị na onye na-enyeghị ezinụlọ ya ihe na-akpa ya ‘agọnarịwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.’ (1 Timoti 5:8) Ọnọdụ ibi ndụ dịgasị iche n’ụwa nile, ọ dịkwa mma ideberu atụmanya ihe onwunwe n’ókè. “Enyela m ọnọdụ ogbenye ma ọ bụ akụ̀,” ka onye dere Ilu 30:8 kpere n’ekpere. Otú ọ dị, ndị nne na nna ekwesịghị ileghara mkpa anụ ahụ nke ụmụ ha anya. Dị ka ihe atụ, ọ̀ ga-abụ ihe amamihe mmadụ ịmara ụma hapụ ezinụlọ ya n’enweghị ihe ndị dị mkpa ná ndụ iji chụsoo ihe ùgwù ọchịchị Chineke? Nke a ọ́ pụghị ịkpasu ụmụ onye ahụ iwe? N’aka nke ọzọ, Ilu 24:27 na-asị: “Dozie ije ozi gị n’èzí, jikerekwara ya onwe gị n’ọhịa; e mesịa wuokwa ụlọ gị.” Ee, ọ bụ ezie na nchegbu maka ihe onwunwe nwere ọnọdụ ya, ‘mmadụ iwu ụlọ ya’—n’ụzọ ime mmụọ na n’ụzọ mmetụta uche—dị oké mkpa.
9. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe amamihe ka ndị isi ezinụlọ chebara ikwe omume nke na ha nwere ike nwụọ ma ọ bụ daa ọrịa echiche?
9 Ì mewo ndokwa iji lekọta ezinụlọ gị a dịghị ama ama ị nwụchuo ọnwụ? Ilu 13:22 na-asị: “Ezi mmadụ na-eme ka ụmụ ụmụ ya keta ihe ya.” Tinyere ihe nketa nke ihe ọmụma banyere Jehova na iso ya nwee mmekọrịta, ndị mụrụ ụmụ ga-enwe mmasị inye ụmụ ha ihe anụ ahụ na-akpa ha. N’ọtụtụ ala ndị isi ezinụlọ ji ihe akpọrọ ihe ga-agbalị ichekwa ego, ike ékpé iwu kwadoro, na inshọransị. E kwuwerị, a gụpụghị ndị Chineke na “mgbe na ihe ndapụta.” (Eklisiastis 9:11) Ego bụ “ndò,” ijikwa nlezianya mee atụmatụ pụrụ igbochi ihe isi ike mgbe mgbe. (Eklisiastis 7:12) N’ala ebe ndị gọọmenti na-adịghị akwụ ụgwọ nlekọta ahụ ike, ụfọdụ pụrụ ịhọrọ idopụ ego maka mkpa ahụ ike ma ọ bụ mee ndokwa maka ụdị ụfọdụ nke inshọransị ahụ ike.a
10. Olee otú ndị Kraịst bụ́ nne na nna pụrụ isi ‘kpadoo ihe’ maka ụmụ ha?
10 Akwụkwọ Nsọ na-ekwukwa, sị: “Ọ bụghị ọrụ ụmụ ịkpadoro ndị mụrụ ha ihe, kama ọ bụ ọrụ ndị mụrụ ụmụ ịkpadoro ụmụ ha.” (2 Ndị Kọrint 12:14) N’ụwa ọ bụ ihe a na-ahụkarị bụ́ ndị mụrụ ụmụ ịkpado ego maka agụmakwụkwọ na alụmdi na nwunye nke ụmụ ha n’ọdịnihu iji wee malitere ha ndụ n’ụzọ dị mma. Ì chewo echiche ịkpado ihe maka ọdịnihu ime mmụọ nke nwa gị? Dị ka ihe atụ, ka e were ya na nwa toworo eto na-achụso ozi oge nile. Ọ bụ ezie na ndị ozi oge nile agaghị achọ ma ọ bụ atụ anya nkwado ndị nọ n’èzí, ndị nne na nna na-ahụ n’anya pụrụ ịhọrọ isoro ya ‘na-enwekọ ihe n’akụkụ ihe na-akpa ya’ iji nyere ya aka ịnọgide n’ozi oge nile.—Ndị Rom 12:13; 1 Samuel 2:18, 19; Ndị Filipaị 4:14-18.
11. Ile ego anya n’ụzọ kwesịrị ekwesị ọ̀ na-egosi enweghị okwukwe? Kọwaa.
11 Ile ego anya n’ụzọ ziri ezi adịghị egosi enweghị okwukwe na ajọ usoro ihe Setan eruwo nso ọgwụgwụ ya. Ọ bụ nanị okwu banyere igosi “amamihe” na echiche ziri ezi. (Ilu 2:7; 3:21) Jisọs kwuru n’otu mgbe na “ụmụ nke oge a nwere uche . . . karịa ụmụ nke ìhè” n’otú ha si eji ego eme ihe. (Luk 16:8) Mgbe ahụ, ka a sịkwa ihe mere na ụfọdụ ahụwo mkpa ọ dị ime mgbanwe n’ụzọ ha si eji ihe onwunwe ha eme ihe, ka ha wee nwee ike ilekọta mkpa nke ezinụlọ ha nke ọma karị.
“Uche Zuru Okè” n’Otú Anyị Si Ele Agụmakwụkwọ Anya
12. Olee otú Jisọs si kụziere ndị na-eso ụzọ ya ime mgbanwe gaa n’ọnọdụ ọhụrụ?
12 “Ụwa nke a ka e si ahụ ya anya na-agabiga agabiga,” oké mgbanwe akụ̀ na ụba na ọganihu nkà na ụzụ na-ewerekwa ọnọdụ ngwa ngwa. (1 Ndị Kọrint 7:31) Otú ọ dị, Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ịbụ ndị pụrụ ime mgbanwe. Ọ gwara ha mgbe o zipụrụ ha ná mkpọsa nkwusa ha mbụ, sị: “Unu anatala ọlaedo, ma ọ bụ ọlaọcha ma ọ bụ ọla itinye n’ihe okike unu; unu anatala akpa iwere gaa ije unu, ma ọ bụ uwe ime abụọ, ma ọ bụ akpụkpọ ụkwụ, ma ọ bụ mkpanaka: n’ihi na onye ọrụ kwesịrị ihe e ji azụ ya.” (Matiu 10:9, 10) Otú ọ dị, n’oge ọzọ mgbe e mesịrị, Jisọs sịrị: “Onye nwere akpa ego, ya were ya, onye nwere akpa ije, ya werekwa ya.” (Luk 22:36) Gịnị gbanweworo? Ọnọdụ. Ọnọdụ okpukpe abụrụwo nke ibu iro karị, ugbu a kwa ha aghaghị ịkwadebere onwe ha ihe.
13. Gịnị bụ nzube bụ isi nke agụmakwụkwọ, oleekwa otú ndị nne na nna purụ isi kwadoo ụmụ ha n’akụkụ nke a?
13 N’otu aka ahụ taa, ọ pụrụ ịdị ndị nne na nna mkpa iburu n’uche ihe ndị bụ eziokwu banyere ọnọdụ akụ̀ na ụba nke taa. Dị ka ihe atụ, ị̀ na-ahụ na ụmụ gị na-enweta agụmakwụkwọ zuru ezu? Nzube bụ isi nke agụmakwụkwọ kwesịrị ịbụ ịkwadebe onye ntorobịa ịbụ onye ozi dị irè nke Jehova. Agụmakwụkwọ kasịkwa mkpa bụ agụmakwụkwọ ime mmụọ. (Aịsaịa 54:13) Ndị nne na nna na-echegbukwa onwe ha banyere ikike ụmụ ha nwere ịkwado onwe ha n’ụzọ ego. Ya mere nye ụmụ gị nduzi, nyere ha aka ịhọrọ ihe ọmụmụ ụlọ akwụkwọ kwesịrị ekwesị, sorokwa ha tụlee ma ọ bụ ihe amamihe inwetakwu agụmakwụkwọ ka ọ bụ na ọ bụghị. Ụdị mkpebi ndị ahụ bụ ibu ọrụ ezinụlọ, ndị ọzọ ekwesịghịkwa ịkatọ ụzọ a gbasoro. (Ilu 22:6) Gịnị banyere ndị họrọwooro ịkụziri ụmụ ha ihe n’ụlọ?b Ọ bụ ezie na ọtụtụ arụwo ọrụ e kwesịrị ịja mma, ụfọdụ ahụwo ọrụ ahụ dị ka ihe siri ike karịa ka ha chere, ụmụ ha atawokwa ahụhụ. Ya mere ọ bụrụ na ị na-atụle ịnọ n’ụlọ na-agụ akwụkwọ, hụ na ị gbakọrọ ihe ọ ga-ewe, jiri ezi uche na-enyocha ma i nwere ma nkà ma ọzụzụ onwe onye a chọrọ iji mezuo ya.—Luk 14:28.
‘Achọla Ihe Ukwu’
14, 15. (a) Olee otú Beruk si ghara inwekwa nguzozi ime mmụọ ya? (b) N’ihi gịnị ka o ji bụụrụ ya ihe nzuzu ‘ịchọ ihe ukwu’?
14 Ebe ọgwụgwụ nke usoro ihe a na-abịabeghị, ụfọdụ pụrụ inwe mmasị ịchọ ihe ụwa nwere inye—aka ọrụ dị ùgwù, ọrụ na-enye ego, na akụ̀ na ụba. Tụlee banyere odeakwụkwọ Jeremaịa, bụ́ Beruk. Ọ kwara arịrị, sị: “Biko, ahụhụ na-adịrị m! n’ihi na Jehova atụkwasịwo ihe mwute n’elu ihe mgbu m; adọgbuwo m onwe m n’ọrụ n’ize ume m, ma achọtaghị m izu ike.” (Jeremaịa 45:3) Ike gwụrụ Beruk. Ije ozi dị ka odeakwụkwọ Jeremaịa bụ ọrụ siri ike, nke na-arụgide arụgide. (Jeremaịa 36:14-26) A hụghịkwa ọgwụgwụ nke nrụgide ahụ. Ọ ga-abụ afọ 18 tupu e bibie Jerusalem.
15 Jehova gwara Beruk, sị: “Lee, ihe nke M wuworo ka Mụ onwe m na-akwada, ọzọ, ihe nke M kụworo n’ubi ka Mụ onwe m na-efopụ; ọbụna ala nke a nile, nke m ka ọ bụ. Ma gị onwe gị, ị̀ na-achọrọ onwe gị ihe ukwu? achọla ha.” Beruk enwekwaghị ezi nguzozi ya. Ọ malitewo ‘ịchọrọ onwe ya ihe ukwu,’ ikekwe akụ̀ na ụba, ọkwá dị elu, ma ọ bụ ezi ọnọdụ ihe onwunwe. Ebe Jehova “na-efopụ; ọbụna ala nke a nile,” uru gịnị ka ọ bara ịchọ ihe ndị dị otú ahụ? Ya mere Jehova chetaara Beruk ihe a na-akpali echiche: “N’ihi na, lee, M gaje ime ka ihe ọjọọ bịakwasị anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ . . . , ma M ga-enye gị ndụ gị ka ọ bụrụ ihe nkwata n’ebe nile ị ga-eje.” Ihe onwunwe a na-ahụ anya agaghị alanarị mbibi Jerusalem! Jehova kwere nkwa nanị nzọpụta nke ‘ndụ ya dị ka ihe nkwata.’—Jeremaịa 45:4, 5.
16. Gịnị ka ndị Jehova taa pụrụ ịmụta site n’ahụmahụ Beruk?
16 Beruk ṅara ntị ná mgbazi olu Jehova, dịkwa ka Jehova kwere ná nkwa, Beruk gbapụrụ ná ndụ. (Jeremaịa 43:6, 7) Lee ihe mmụta dị ike ọ bụụrụ ndị Jehova taa! Ugbu a abụghị oge ‘ịchọrọ onwe anyị ihe ukwu.’ N’ihi gịnị? N’ihi na “ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya.”—1 Jọn 2:17.
Iji Oge Fọdụrụ Eme Ihe n’Ụzọ Kasị Mma
17, 18. (a) Olee otú Jona si meghachi omume mgbe ndị Nineve chegharịrị? (b) Ihe mmụta dị aṅaa ka Jehova kụziiri Jona?
17 Oleezi otú anyị pụrụ isi jiri oge fọdụrụ mee ihe n’ụzọ kasị mma? Mụta ihe site n’ahụmahụ nke Jona onye amụma. O wee “jeruo Nineve . . . , o wee kpọsaa, sị, Ọ fọdụrụ [ụbọchị iri anọ], e wee kwatuo Nineve.” Dị ka ihe ijuanya nye Jona, ndị Nineve ṅara ntị n’ozi ya ma chegharịa! Jehova hapụrụ ibibi obodo ahụ. Gịnị bụ mmeghachi omume Jona? “Jehova, biko, wepụ ndụ m n’ahụ m; n’ihi na ọ ka m mma ịnwụ ọnwụ karịa ịdị ndụ.”—Jona 3:3, 4; 4:3.
18 Mgbe ahụ Jehova kụziiri Jona otu ihe mmụta dị mkpa. O “wee gụpụta otu ogiri ụgba, mee ka o tolite n’elu Jona, ka o wee bụrụ ndò n’elu isi ya . . Jona wee ṅụrịa ọṅụ nke ukwuu n’ihi ogiri ụgba ahụ.” Otú ọ dị, aṅụrị Jona adịteghị aka n’ihi na osisi ahụ kpọnwụrụ ngwa ngwa. Jona wee “wee iwe dị ọkụ” n’ihi ntakasị ahụ ya. Jehova mere ka isi ihe O bu n’uche pụta ìhè, na-asị: “Gị onwe gị meere ogiri ụgba nke a ebere . . . Mụ onwe m kwa, Ḿ gaghị emere Nineve ebere, bụ́ obodo ukwu ahụ; nke ihe karịrị [mmadụ puku narị na iri abụọ] nọ n’ime ya, bụ́ ndị na-amaghị nke bụ aka nri ha na aka ekpe ha; na ọtụtụ anụmanụ?”—Jona 4:6, 7, 9-11.
19. Echiche dị aṅaa nke nanị onwe onye ka anyị kwesịrị izere?
19 Lee ka echiche Jona siri bụrụ nanị maka onwe ya! Ọ pụrụ imere osisi ebere, ma o nwetụghị otu mkpụrụ ọmịiko n’ahụ ndị Nineve—ndị, n’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, “na-amaghị nke bụ aka nri ha na aka ekpe ha.” N’otu aka ahụ anyị pụrụ ịchọ ka e bibie ajọ ụwa a, anyị zikwara ezi! (2 Ndị Tesalọnaịka 1:8) Otú ọ dị, ka anyị na-echere, anyị nwere ibu ọrụ inyere ndị obi ha ziri ezi aka bụ́ ndị, n’ikwu ya n’ụzọ ime mmụọ, “na-amaghị nke bụ aka nri ha na aka ekpe ha.” (Matiu 9:36: Ndị Rom 10:13-15) Ị̀ ga-eji mkpirikpi oge fọdụrụnụ nyere ọtụtụ ndị o kwere omume aka inweta ihe ọmụma ahụ dị oké ọnụ ahịa nke Jehova? Olee ọrụ nke ya na ọṅụ inyere mmadụ aka inweta ndụ ga-aha?
Nọgide Na-eji “Uche Zuru Okè” Na-ebi Obi
20, 21. (a) Gịnị bụgasị ụzọ ndị anyị pụrụ isi gosi “uche zuru okè” n’ụbọchị ndị na-abịanụ? (b) Ngọzi ndị dị aṅaa ga-abịa site n’iji “uche zuru okè” na-ebi obi?
20 Ka usoro ihe Setan na-aga n’ihu na-emikpu ná mbibi, ihe ịma aka ndị ọhụrụ ga-echerịrị anyị ihu. Timoti nke Abụọ 3:13 na-ebu amụma, sị: “Ajọ mmadụ nile na ndị aghụghọ ga na-aga n’ihu n’ịjọkarị njọ.” Ma “ka ike ghara ịgwụ unu, unu wee daa mbà ná mkpụrụ obi unu.” (Ndị Hibru 12:3) Dabere na Jehova maka ike. (Ndị Filipaị 4:13) Mụta ịdị nro, ime mgbanwe gaa n’ọnọdụ ndị a na-ajọwanye njọ, kama ịtụkwasị uche n’oge gara aga. (Eklisiastis 7:10) Jiri ezi amamihe mee ihe, na-agbasozu nduzi nke “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” na-enye.—Matiu 24:45-47.
21 Anyị amaghị otú oge fọdụrụ hà. Ma, anyị pụrụ iji obi ike kwuo na “ọgwụgwụ ihe nile dị nso.” Tupu ọgwụgwụ ahụ abịa, ka anyị jiri “uche zuru okè” na-ebi obi ná mmekọrịta anyị na ibe anyị, n’ụzọ anyị si elekọta ezinụlọ anyị, nakwa n’ibu ọrụ nke ọrụ ego anyị. Site n’ime nke ahụ, anyị nile pụrụ inwe obi ike na a ga-ahụ anyị n’ikpeazụ “n’udo, ndị na-enweghị ntụpọ, ndị a na-apụghịkwa ịta ụta n’ihu Ya”!—2 Pita 3:14.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka ihe atụ, na United States, ọtụtụ na-enwe inshọransị ahụ ike, ọ bụ ezie na o yikarịrị ka ha na-adị oké ọnụ. Ụfọdụ ezinụlọ bụ́ Ndịàmà achọpụtawo na ụfọdụ ndị dọkịta na-adịkwu njikere ịtụle nhọrọ ejighị ọbara eme ihe mgbe ezinụlọ nwere inshọransị ahụ ike. Ọtụtụ ndị dibịa ga-anakwere ego ole atụmatụ inshọransị a kpaara ókè ma ọ bụ inshọransị ahụ ike gọọmenti sịrị ka a na-akwụ.
b Ma mmadụ ọ̀ nọ n’ụlọ na-agụ akwụkwọ bụ mkpebi onwe onye. Lee isiokwu bụ́ “Ịnọ n’Ụlọ Na-agụ Akwụkwọ—Ọ̀ Dịịrị Gị?,” nke pụtara ná mbipụta Teta! nke August 8, 1993.
Isi Ihe Maka Ntụleghachi
◻ Olee otú anyị pụrụ isi gosi “uche zuru okè” ná mmekọrịta onwe onye anyị?
◻ Olee otú anyị pụrụ isi gosi nguzozi n’ilekọta ibu ọrụ ezinụlọ anyị?
◻ N’ihi gịnị ka ndị nne na nna na-aghaghị iji nwee mmasị n’agụmakwụkwọ ụwa nke ụmụ ha?
◻ Ihe ndị dị aṅaa ka anyị na-amụta site n’aka Beruk na Jona?
[Foto dị na peeji nke 18]
Mgbe di na nwunye mesoro onwe ha ihe n’ụzọ na-adịghị mma, ha na-emebi mmekọrịta ha na Jehova
[Foto dị na peeji nke 20]
Ndị nne na nna kwesịrị inwe mmasị n’agụmakwụkwọ ụmụ ha