Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w95 11/1 p. 16-21
  • Oge Ịmụrụ Anya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Oge Ịmụrụ Anya
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Na-echenụ Nche”!
  • “Ọgbọ” ahụ nke Na-agabiga
  • “Ụbọchị na Oge Hour Ahụ”
  • “Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ” nke Ezi Omume
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ndị A Zọpụtara n’Aka “Ajọ Ọgbọ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
  • Ọnụnọ Kraịst—Gịnị Ka Ọ Pụtara Nye Gị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1995
w95 11/1 p. 16-21

Oge Ịmụrụ Anya

“A ghaghịkwa ibu ụzọ kwusaa ozi ọma nke m n’ihu mba nile. . . . Ma onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.”—MAK 13:10, 13.

1. N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji tachie obi ma nwee obi ike?

ANYỊ aghaghị ịtachi obi—n’ime ọgbọ nke na-enweghị okwukwe, nke gbagọkwara agbagọ! Ọgbọ nke ụmụ mmadụ aghọọla nke rụrụ arụ kemgbe 1914, dị nnọọ ka ọ dị n’ụbọchị Jisọs. Taakwa, ịrụ arụ ahụ zuru ụwa nile. Na “mgbe ikpeazụ” ndị a, “oge dị oké egwu” nke Pọl onyeozi kọwara na-eti ihe a kpọrọ mmadụ ihe otiti. ‘Ndị ajọ mmadụ na ndị aghụghọ nọgidere na-ajọkarị njọ.’ N’ụzọ doro anya, “ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ,” Setan bụ́ Ekwensu, onye na-eme mgbalị ikpeazụ ya ugbu a imebi ụwa. Ma nweenụ obi ike! Ọ dị “oké mkpagbu” nke na-abịanụ nke ga-ewetara ndị nile hụrụ ezi omume n’anya ahụ efe na-adịgide adịgide.—2 Timoti 3:1-5, 13; 1 Jọn 5:19; Mkpughe 7:14.

2. Olee otú e si mezuo amụma na 1914?

2 N’ụzọ na-enye obi ụtọ, Jehova edokwasịwo Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ugbu a n’ocheeze n’eluigwe, ná njikere maka iwepụsị ndị iro mmegbu nile nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Mkpughe 11:15) Dị ka ọ dị n’ọbịbịa mbụ nke Mesaịa ahụ, otú a kwa, e mezuwo n’ime ọgbọ a otu amụma dị ịrịba ama nke Daniel dekọrọ. Na Daniel 4:16, 17, 32, a gwara anyị banyere nkwụsịtụ nke ọbụbụeze ziri ezi nke ụwa ruo “oge asaa.” Ná mmezu ha ka ukwuu, oge asaa a bụ ngụkọta nke afọ asaa nke Bible nke nwere 360 ‘ụbọchị’ n’afọ nke ọ bụla, ma ọ bụ 2,520 afọ ná ngụkọta.a Ha malitere na 607 T.O.A., mgbe Babilọn malitere ịzọda alaeze Israel n’okpuru ụkwụ ya, ruo na 1914 O.A., bụ́ afọ e chiri Jisọs eze n’eluigwe dị ka Eze ruru eru nke ihe a kpọrọ mmadụ. Mgbe ahụ ka “oge nke mba ọzọ” gwụsịrị. (Luk 21:24) Ma mba nile ajụwo ido onwe ha n’okpuru Alaeze Mesaịa ahụ na-abịanụ.—Abụ Ọma 2:1-6, 10-12; 110:1, 2.

3, 4. (a) Ntụnyere dị aṅaa ka a pụrụ iji ihe ndị mere na narị afọ mbụ tụnyere ndị nke oge anyị? (b) Ajụjụ ndị dị aṅaa dị mkpa ka a pụrụ ịjụ?

3 Ka izu nke 70 nke afọ ahụ (29-36 O.A.) na-eru nso, nakwa ka afọ 1914 na-abịaru nso, ndị na-atụ egwu Chineke nọ na-atụ anya ọbịbịa Mesaịa. Ọ bịakwara! Otú ọ dị, n’ọnọdụ nke ọ bụla, ụzọ o si bịa dị iche n’ihe a na-atụ anya ya. N’ọnọdụ nke ọ bụlakwa, mgbe ihe pụrụ ịbụ ntakịrị oge gasịrị, otu ajọ “ọgbọ” na-enweta mbibi n’ikpeazụ site n’iwu Chineke.—Matiu 24:34.

4 N’isiokwu anyị bu ụzọ, anyị rịbara ama otú ajọ ọgbọ nke ndị Juu ahụ sịrị ka a kwafuo ọbara Jisọs si bịa ná njedebe ya. Gịnịzi banyere ọgbọ rụrụ arụ nke ihe a kpọrọ mmadụ nke na-emegide ma ọ bụ na-eleghara ya anya ọbụna ugbu a? Olee mgbe a ga-emezu ihe e kpere n’ikpe n’ahụ ọgbọ a na-enweghị okwukwe?

“Na-echenụ Nche”!

5. (a) N’ihi ezi ihe dị aṅaa ka ọ na-ejighị dịrị anyị mkpa ịmata oge nke “ụbọchị na oge hour” nke Jehova? (b) Dị ka Mak si kwuo, ezi ndụmọdụ dị aṅaa ka Jisọs ji mechie amụma ya?

5 Mgbe o busịrị amụma ihe ndị ga-eduje n’oge “mkpagbu ukwu,” Jisọs kwukwasịrị: “Banyere ụbọchị na oge hour ahụ, ọbụna ndị mmụọ ozi nke eluigwe amataghị, Ọkpara ahụ amataghịkwa, kama ọ bụ nanị Nna m matara.” (Matiu 24:3-36; Mak 13:3-32) Ọ dịghị anyị mkpa ịmata kpọmkwem mgbe ihe dị iche iche ga-eme. Kama nke ahụ, ebe anyị ga-elekwasị anya ga-abụrịrị n’ịnọ na nche, ịzụlite okwukwe siri ike, na iji ọrụ n’aka n’ozi Jehova—ọ bụghị n’ịgbakọ oge. Jisọs mechiri oké amụma ya site n’ikwu, sị: “Lezienụ anya, mụrụnụ anya . . . n’ihi na unu amataghị mgbe oge ahụ bụ. . . . Na-echenụ nche . . . Okwu M na-agwa unu ka M na-agwa mmadụ nile, Na-echenụ nche.” (Mak 13:33-37) Ihe ize ndụ dị n’ọchịchịrị nke ụwa nke taa. Anyị aghaghị ịmụrụ anya!—Ndị Rom 13:11-13.

6. (a) Na gịnị ka okwukwe anyị kwesịrị ịgbado ụkwụ? (b) Olee otú anyị ‘pụrụ isi gụọ ụbọchị anyị’? (ch) Gịnị ka Jisọs bu n’uche n’ụzọ bụ isi n’okwu bụ́ “ọgbọ”?

6 Ọ bụghị nanị na anyị aghaghị ịṅa ntị n’amụma ndị sitere n’ike mmụọ nsọ banyere ụbọchị ikpeazụ ndị a nke ajọ usoro ihe kama anyị aghaghị ime ka okwukwe anyị gbadosie ụkwụ ike n’ụzọ bụ isi n’àjà dị oké ọnụ ahịa nke Kraịst Jisọs na nkwa Chineke ndị magburu onwe ha dabeere na ha. (Ndị Hibru 6:17-19; 9:14; 1 Pita 1:18, 19; 2 Pita 1:16-19) N’ịbụ ndị ọ dị ọkụ n’obi ịhụ ọgwụgwụ nke ajọ usoro ihe nke a, mgbe ụfọdụ ndị Jehova akọwo nkọ banyere mgbe “mkpagbu ukwu” ahụ ga-etiwapụ, ọbụna na-ejikọta nke a ná mgbakọ ihe bụ afọ ndụ nke otu ọgbọ kemgbe 1914. Otú ọ dị, anyị ‘na-eme ka obi amamihe bịa,’ ọ bụghị site n’ịkọ nkọ banyere afọ ole ma ọ bụ ụbọchị ole mejupụtara otu ọgbọ, kama site n’iche echiche banyere otú anyị si ‘agụ ụbọchị anyị’ n’iwetara Jehova otuto ọṅụ. (Abụ Ọma 90:12) Kama ịbụ ụkpụru maka ịgụ oge, okwu ahụ bụ́ “ọgbọ” dị ka Jisọs si jiri ya mee ihe na-ezo aka n’ụzọ bụ isi n’ebe ndị bikọrọ ndụ n’otu oge n’akụkọ ihe mere eme nọ, na-enwe ihe ndị e ji amata ha.b

7. Gịnị ka prọfesọ akụkọ ihe mere eme dere banyere “ọgbọ 1914,” oleekwa otú nke a si kwekọọ n’amụma Jisọs?

7 N’ikwekọ n’ihe ahụ e dere n’elu, prọfesọ nke akụkọ ihe mere eme bụ́ Robert Wohl dere n’akwụkwọ ya bụ́ The Generation of 1914, sị: “A naghị akọwa ọgbọ nke akụkọ ihe mere eme site n’ebe ngụkọ oge ya . . . Ọ bụghị oge a gụkọrọ ná nkebi ná nkebi.” Ma ọ rụtụrụ aka na Agha Ụwa Mbụ mere ka e nwee “echiche dị ukwuu nke nkewapụ pụọ n’oge ndị gara aga,” o kwukwasịkwara: “Ndị dị ndụ gabiga agha ahụ adịghị mgbe ha pụrụ iwepụ ya n’uche ha na otu ụwa agwụwo, ọzọ malitekwara n’August 1914.” Lee ka nke ahụ si bụrụ eziokwu! Ọ na-elekwasị anya n’ebe okwu ahụ hiwere isi. “Ọgbọ a” nke ihe a kpọrọ mmadụ kemgbe 1914 ahụwo mgbanwe ndị jọgburu onwe ha. Ọ hụwo ka e ji ọbara nke ọtụtụ nde dee ụwa dị ka mmiri. Ibu agha, mgbukpọ, iyi egwu, mpụ, na mmebi iwu etiwapụwo n’ụwa nile. Ụnwụ nri, ọrịa, na omume rụrụ arụ gbara ụwa anyị gburugburu. Jisọs buru amụma, sị: “Unu onwe unu kwa, mgbe ọ bụla unu [ndị na-eso ụzọ ya] ga-ahụ ihe ndị a ka ha na-apụta, maranụ n’alaeze Chineke dị nso. N’ezie asị m unu, Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe nile ga-eme.”—Luk 21:31, 32.

8. Olee otú ndị amụma Jehova si mesie mkpa ọ dị ịmụrụ anya ike?

8 Ee, mmeri zuru ezu nke Alaeze Mesaịa ahụ dị nso! Mgbe ahụ, ọ̀ dị ihe ọ bụla a ga-erite n’ịchọgharị oge ma ọ bụ site n’ịkọ nkọ banyere oge ndụ nkịtị nke otu “ọgbọ”? Ọ dịghị ma ọlị! Habakuk 2:3 na-ekwu n’ụzọ doro anya, sị: “Ọhụụ ahụ na-adịru mgbe a kara aka, ọ na-ekusikwara ọgwụgwụ ya ume ike, ọ gaghị ekwukwa okwu ụgha: ọ bụrụ na ọ laa azụ, chere ya; n’ihi na ọ ghaghị ịbịa, ọ gaghị anọ ọdụ.” Ụbọchị ime mpịazi nke Jehova ji ọsọ na-abịaru nso.—Jeremaịa 25:31-33; Malakaị 4:1.

9. Ihe ndị dị aṅaa mere kemgbe 1914 na-egosi na oge ahụ dị mkpirikpi?

9 Mgbe ọchịchị Alaeze Kraịst malitere na 1914, a chụdara Setan n’ụwa. Nke a apụtawo ‘ahụhụ nye ụwa . . . n’ihi na Ekwensu arịdakwuruwo unu, na-enwe oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge.’ (Mkpughe 12:12) Oge ahụ dị mkpirikpi, n’ezie, ma e jiri ya tụnyere ọtụtụ puku afọ nke ịchịisi Setan. Alaeze ahụ dị nso, otú a ka ọ dịkwa ụbọchị na oge hour Jehova maka imezu ihe e kpere n’ikpe n’ahụ ajọ ọgbọ a!—Ilu 3:25; 10:24, 25.

“Ọgbọ” ahụ nke Na-agabiga

10. Olee otú “ọgbọ a” si yie nke ụbọchị Noa?

10 Ka anyị nyochaa okwu Jisọs dị na Matiu 24:34, 35 n’ụzọ chiri anya karị: “N’ezie asị m unu, Ọgbọ a agaghị agabiga ma ọlị, ruo mgbe ihe ndị a nile ga-eme. Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu nile nke m agaghị agabiga ma ọlị.” (Ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Okwu Jisọs ndị sochiri gosiri na “ọ dịghị onye ọ bụla matara ụbọchị na oge hour ahụ.” Nke dị mkpa nke ukwuu karị, ọ na-egosi na anyị aghaghị izere ọnyà ndị gbara anyị gburugburu n’ọgbọ a. N’ihi ya Jisọs na-ekwukwasị: “Ọ bụkwa dị ka ụbọchị Noa dịrị, otú a ka ọbịbịa Nwa nke mmadụ ga-adị. N’ihi na dị ka ha nọ na mgbe ahụ nke bu oké iju mmiri ahụ ụzọ na-eri ihe na-aṅụkwa ihe ọṅụṅụ, na-alụ nwunye, na-enyekwa n’ọlụlụ di ruo ụbọchị Noa batara n’ụgbọ ya, ha amaghịkwa ruo mgbe oké iju mmiri ahụ bịara, kpopu ha nile; otú a ka ọbịbịa Nwa nke mmadụ ga-adị.” (Matiu 24:36-39) N’ebe a Jisọs ji ọgbọ dị n’oge ya tụnyere ụbọchị Noa.—Jenesis 6:5, 9.

11. Ntụnyere ndị dị aṅaa ka Jisọs mere, dị ka Matiu na Luk si kọọ?

11 Nke a abụghị nke mbụ ndị ozi ahụ nụrụ ka Jisọs ji ‘ọgbọ dị iche iche’ tụnyere ibe ha, n’ihi na ruo ụbọchị ole na ole tupu mgbe ahụ o kwuwo banyere onwe ya, sị: “Nwa nke mmadụ . . . [aghaghị] ibu ụzọ hụ ọtụtụ ahụhụ, a ghaghịkwa ịjụ Ya site n’ọgbọ a. Ma dị ka e mere n’ụbọchị Noa, otú a ka ọ ga-adịkwa n’ụbọchị Nwa nke mmadụ.” (Luk 17:24-26, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Otú a, Matiu isi 24 na Luk isi 17 na-eme otu ntụnyere ahụ. N’ụbọchị Noa “anụ ahụ nile, bụ́ mmadụ, [nke] bibiri ụzọ ya n’elu ụwa” bụ́ ndị e bibikwara n’Iju Mmiri ahụ bụ “ọgbọ a.” N’ụbọchị Jisọs ndị Juu ahụ dapụrụ n’ezi ofufe bụ́ ndị na-ajụ Jisọs bụ “ọgbọ a.”—Jenesis 6:11, 12; 7:1.

12, 13. (a) Gịnị taa bụ “ọgbọ a” nke na-aghaghị ịgabiga? (b) Olee otú ndị Jehova si anagide ‘ọgbọ a gbagọrọ agbagọ nke na-enwekwa anya uhie’ ugbu a?

12 Ya mere, ná mmezu ikpeazụ nke amụma Jisọs taa, o doro anya na “ọgbọ a” na-ezo aka ná ndị nọ n’elu ụwa ndị na-ahụ ihe ịrịba ama nke ọnụnọ Kraịst ma ghara imezi ụzọ ha. N’ụzọ dị iche, anyị dị ka ndị na-eso ụzọ Jisọs na-ajụ ịbụ ndị ụdị ndụ nke “ọgbọ a” kpụziri. Ọ bụ ezie na anyị nọ n’ime ụwa, anyị agaghị abụ akụkụ ya ma ọlị, “n’ihi na oge ahụ dị nso.” (Mkpughe 1:3; Jọn 17:16) Pọl onyeozi na-adụ anyị ọdụ, sị: “Meenụ ihe nile n’ejighị ntamu na ịrụ ụka ọ bụla; ka unu wee ghọọ ndị na-adịghị ịta ụta ndị na-aghọghịkwa aghụghọ, ụmụ Chineke ndị a na-apụghị ịta ụta n’etiti ọgbọ gbagọrọ agbagọ nke na-enwekwa anya uhie, ndị a na-ahụ unu n’etiti ha dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa.”—Ndị Filipaị 2:14, 15; Ndị Kọlọsi 3:5-10; 1 Jọn 2:15-17.

13 Anyị inwu “dị ka ndị na-enye ìhè” gụnyere ọ bụghị nanị igosipụta àgwà dị ọcha nke ndị Kraịst kama, karịsịa, ịrụzu ọrụ Jisọs buru amụma ya: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Ọ dịghị mmadụ ọ bụla pụrụ ikwu mgbe ọgwụgwụ ahụ ga-abụ, ma anyị maara na ọgwụgwụ nke “ọgbọ a” nke ndị ajọ mmadụ ga-abịa ozugbo a gbaworo àmà ahụ otú Chineke chọrọ “ruo ebe ụwa sọtụrụ.”—Ọrụ 1:8.

“Ụbọchị na Oge Hour Ahụ”

14. Ndụmọdụ dị aṅaa ka ma Jisọs ma Pọl nyere banyere “oge ahụ nile na ụbọchị ahụ nile,” oleekwa otú anyị kwesịrị isi meghachi omume?

14 Mgbe a gbara àmà ahụ zuru ụwa ọnụ ruo n’ókè Jehova zubere, ọ ga-abụ “ụbọchị na oge hour” ya ibibi usoro ụwa nke a. Ọ dịghị anyị mkpa ịmata oge ahụ tupu mgbe ahụ. Otú a, n’ịgbaso ihe nlereanya Jisọs, Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “Ọ dịghị unu mkpa, ụmụnna anyị, ka e degara unu akwụkwọ banyere oge ahụ nile na ụbọchị ahụ nile. N’ihi na unu onwe unu matara nke ọma na dị ka onye ohi na-abịa n’abalị, otú a ka ụbọchị nke Onyenwe anyị na-abịa. Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha, dị ka ime na-eme nwanyị nke dị ime; ha agaghị agbanarịkwa ya ma ọlị.” Rịba ama ebe Pọl lekwasịrị anya: ‘Ọ bụ mgbe ha na-asị.’ Ee, mgbe e kwuru okwu “udo na ntụkwasị obi,” mgbe a na-atụtụghị anya ya, a ga-emezu ikpe Chineke na mberede. Lee ka okwu ndụmọdụ Pọl si kwesị ekwesị: “Ya mere otú a, ka anyị ghara ịrahụ ụra, dị ka ndị fọdụrụ, kama ka anyị na-eche nche nweekwa anya udo”!—1 Ndị Tesalọnaịka 5:1-3, 6; leekwa amaokwu nke 7-11; Ọrụ 1:7.

15, 16. (a) N’ihi gịnị ka anyị na-ekwesịghị iji chee na Amagedọn dị anya karịa otú anyị pụrụ icheworịị? (b) Olee otú a na-aghaghị isi bulie ịchịisi Jehova elu n’ọdịnihu dị nso?

15 Nghọta anyị ka zie ezi banyere “ọgbọ a” ọ̀ pụtara na Amagedọn dị anya karịa otú anyị chere na mbụ? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ bụ ezie na ọ dịtụghị mgbe anyị maara “ụbọchị na oge hour ahụ,” Jehova Chineke mgbe nile anọwo na-ama ya, Ọ dịghịkwa agbanwe agbanwe. (Malakaị 3:6) N’ụzọ doro anya, ụwa na-emikpukwu n’ime mbibi na-enweghị ngwọta. Mkpa ọ dị ịmụrụ anya dị ngwa karịa otú ọ dịworo mgbe ọ bụla. Jehova ekpugheworo anyị “ihe na-aghaghị ịpụta n’isi nso,” anyị kwesịkwara iji echiche ịdị ngwa zuru ezu meghachi omume.—Mkpughe 1:1; 11:18; 16:14, 16.

16 Ka oge ahụ na-eru nso, mụrụ anya, n’ihi na Jehova na-akwado iwetara usoro ihe nile nke Setan ọdachi! (Jeremaịa 25:29-31) Jehova na-asị: “M ga-emekwa Onwe m ka M dị ukwuu, M ga-edokwa Onwe m nsọ, mee ka a mara Mụ onwe m n’anya ọtụtụ mba; ha ewee mara na Mụ onwe m bụ Jehova.” (Ezikiel 38:23) “Ụbọchị Jehova” ahụ nke ga-ekpebi ihe nile na-abịaru nso!—Joel 1:15; 2:1, 2; Emọs 5:18-20; Zefanaịa 2:2, 3.

“Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ” nke Ezi Omume

17, 18. (a) Dị ka Jisọs na Pita si kwuo, olee otú “ọgbọ a” ga-esi gabiga? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji nọgide na-eche nche banyere àgwà na omume nke nsọpụrụ Chineke?

17 Banyere ‘ihe ndị a nile na-aghaghị ịpụta n’isi nso’ Jisọs sịrị: “Eluigwe na ụwa ga-agabiga, ma okwu nile nke m agaghị agabiga ma ọlị.” (Matiu 24:34, 35) Ma eleghị anya Jisọs bu “eluigwe na ụwa”—ndị na-achị achị na ndị a na-achị achị—nke “ọgbọ a” n’uche. Pita onyeozi ji okwu yiri ndị ahụ mee ihe n’izo aka n’ebe “eluigwe nke dị ugbu a, ha na ụwa” dị, bụ́ ndị a “kpadoworo nye ọkụ . . . ebe a na-edebe ha nye ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” Ọ kọwaziri otú ‘ụbọchị Onyenwe anyị ga-esi bịa dị ka onye ohi; nke ọ bụ n’ime ya ka eluigwe [nke ọchịchị] ga-agabiga’ ya na òtù ụmụ mmadụ rụrụ arụ, ma ọ bụ “ụwa,” na ọrụ ọjọọ ya nile. Onyeozi ahụ gbaziri anyị ume ‘ibi obi nsọ na ịrụ ọrụ nsọpụrụ Chineke, [ka anyị nọ] na-echere ma na-eburu ọnụnọ nke ụbọchị Jehova n’uche, nke eluigwe ga-ere ọkụ wee laa n’iyi n’ihi ya, ihe nile dị n’eluigwe ga-agbakwa ọkụ wee gbazee.’ Gịnị ga-esochi? Pita dọọrọ uche anyị gaa ‘n’eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ nke ezi omume bi n’ime ha.’—2 Pita 3:7, 10-13.c

18 “Eluigwe ọhụrụ” ahụ, bụ́ ọchịchị Alaeze site n’aka Kraịst Jisọs na ndị eze ha na ya ga-eso chịa, ga-awụkwasị ngọzi n’ahụ òtù “ụwa ọhụrụ” ezi omume nke ihe a kpọrọ mmadụ. Ị̀ bụ otu n’ime ndị ga-eso n’òtù ahụ? Ọ bụrụ otú ahụ, i nwere ihe mere ị ga-eji tee egwú ọṅụ n’ọdịnihu magburu onwe ya nọ na-echere gị!—Aịsaịa 65:17-19; Mkpughe 21:1-5.

19. Oké ihe ùgwù dị aṅaa ka anyị pụrụ inwe ụtọ ya ugbu a?

19 Ee, a na-achịkọba “ọgbọ” ezi omume nke ihe a kpọrọ mmadụ ọbụna ugbu a. Taa, “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” e tere mmanụ na-enye izi ihe sitere n’aka Chineke n’ikwekọ n’ihe ndị e dere n’Abụ Ọma 78:1, 4, sị: “Ndị m, ṅaanụ ntị n’iwu m: tọọnụ ntị n’ala ịnụ okwu nile nke ọnụ m . . . , na-akọrọ ọgbọ nke ga-adị n’ihu akụkọ otuto nile nke Jehova, na ike Ya na oké ọrụ Ya nile nke Ọ rụworo.” (Matiu 24:45-47) N’April 14 nke afọ a, n’ihe gafere 75,500 ọgbakọ na n’ime ihe dị ka 230 ala, ihe karịrị 12,000,000 mmadụ gburugburu ụwa jere Ememe Ncheta ọnwụ Kraịst. Ì so n’ime ha? Tụkwasị okwukwe gị na Kraịst Jisọs ma ‘kpọkuo aha Onyenwe anyị maka nzọpụta.’—Ndị Rom 10:10-13.

20. Ebe ọ bụ na “e mewo ka oge a dị mkpụmkpụ,” olee otú anyị na-aghaghị isi mụrụ anya, na-enwekwa olileanya dị aṅaa?

20 “E mewo ka oge a dị mkpụmkpụ,” ka Pọl onyeozi kwuru. Ya mere, ọ bụ oge ịmụrụ anya na iji ọrụ n’aka mgbe nile n’ọrụ Jehova, ka anyị na-atachi obi n’ọnwụnwa na ịkpọasị ndị ajọ ọgbọ nke ihe a kpọrọ mmadụ na-eweta. (1 Ndị Kọrint 7:29; Matiu 10:22; 24:13, 14) Ka anyị nọgide na-eche nche, na-ahụ ihe nile e buru n’amụma n’ime Bible ndị gaje ịbịakwasị “ọgbọ a.” (Luk 21:31-33) Site n’ịgbanarị ihe ndị a nile na iji nnwapụta Chineke guzoro n’ihu Nwa nke mmadụ, anyị pụrụ n’ikpeazụ inwe ihe nrite nke ndụ ebighị ebi.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka ihe ọmụma sara mbara banyere “oge asaa” ahụ, lee peji nke 127-139, 186-189 nke akwụkwọ bụ́ “Ka Alaeze Gị Bịa,” nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

b Lee Mpịakọta 1, peji nke 918, nke akwụkwọ bụ́ Insight on the Scriptures, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

c Leekwa peji nke 152-156 na 180-181 nke akwụkwọ bụ́ Our Incoming World Government—God’s Kingdom, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

Ajụjụ ná Ntụleghachi:

◻ Ebe anyị hụworo mmezu nke Daniel 4:32, olee otú anyị kwesịrị isi “nọrọ na nche” ugbu a?

◻ Olee otú Oziọma Matiu na Luk si mee ka a mata “ọgbọ a”?

◻ Ka anyị nọ na-echere “ụbọchị na oge hour” ahụ, gịnị ka anyị na-ahụ, olekwa otú anyị kwesịrị isi meghachi omume?

◻ Gịnị ka olileanya nke “eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” ahụ nke ezi omume kwesịrị ịkwali anyị ime?

[Foto ndị dị na peeji nke 17]

Ihe a kpọrọ mmadụ na-ata ahụhụ ga-enweta ahụ efe mgbe ajọ ọgbọ a na-eme ihe ike gabigara

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

Alexandra Boulat/Sipa Press

[Ebe E Sigasị Nweta Foto]

N’aka ekpe na na ndịda: Luc Delahaye/Sipa Press

[Foto dị na peeji nke 18]

“Eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ” dị ebube dị nnọọ n’ihu maka agbụrụ nile nke ihe a kpọrọ mmadụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya