Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 5/1 p. 14-19
  • Ònye Ga-agbanarị “Mgbe Ahụhụ”?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Ga-agbanarị “Mgbe Ahụhụ”?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụzọ “Ihe A Na-achọsi Ike” Si Abata
  • ‘Chọọnụ, Chọọnụ, Chọọnụ’
  • Maịkael Abanye n’Ọrụ!
  • Chọọ Jehova Tupu Ụbọchị Iwe ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Mee Nkwupụta Ihu Ọha Maka Nzọpụta
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Ụbọchị Ikpe Jehova Dị Nso!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 5/1 p. 14-19

Ònye Ga-agbanarị “Mgbe Ahụhụ”?

“Onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova, a ga-eme ka o wepụga onwe ya.”—JOEL 2:32.

1. Dị ka Daniel na Malakaị si kwuo, gịnị ka e ji amata ndị ahụ na-eme ihe iji nweta nzọpụta na “mgbe ahụhụ”?

N’ILEPỤ anya bịa n’oge anyị, Daniel onye amụma dere, sị: “Mgbe ahụhụ ga-adịkwa, nke mgbe dị otú ahụ na-adịghị site na mgbe mba ọ bụla malitere ịdị ruo mgbe ahụ: ma na mgbe ahụ ka a ga-eme ka ndị gị wepụga onwe ha, bụ́ onye ọ bụla a ga-ahụ na e deworo aha ya n’akwụkwọ.” (Daniel 12:1) N’ezie nke ahụ bụ okwu ndị na-akasi obi! Jehova ga-echeta ndị ya ọ nwapụtaworo, dị nnọọ ka Malakaị 3:16 kwupụtakwara: “Mgbe ahụ ndị na-atụ egwu Jehova na-ekwurịta okwu, otu onye na ibe ya: Jehova wee ṅaa ntị, nụ, e wee deere ndị na-atụ egwu Jehova, ndị na-echekwa echiche aha ya, akwụkwọ ncheta n’ihu ya.”

2. Gịnị na-esi n’iche echiche banyere aha Jehova pụta?

2 Iche echiche banyere aha Jehova na-eduga n’inwe ezi ihe ọmụma banyere ya, Kraịst ya, na nzube nile dị ukwuu nke Alaeze ya. Otú a, ndị ya na-amụta inye ya nsọpụrụ dị omimi, ịbanye ná mmekọrịta miri emi a raara nye ya, na ‘iji obi ha dum na nghọta ha dum na ume ha dum’ hụ ya n’anya. (Mak 12:33; Mkpughe 4:11) Jehova ejiwo amara mee ndokwa, site n’àjà nke Jisọs Kraịst, maka ndị dị umeala n’obi n’elu ala inweta ndụ ebighị ebi. Ya mere, ndị a pụrụ iji obi ike kwughachi okwu ndị ahụ usuu ndị agha eluigwe kwuru nke nyere Chineke otuto n’oge a mụrụ Jisọs, na-asị: “Otuto dịrị Chineke n’ebe kachasị ihe nile elu, udo dịkwa n’elu ụwa n’etiti mmadụ ndị ihe ha dị ya ezi mma.”—Luk 2:14.

3. Tupu e nwee ike inwe udo n’elu ụwa nke a, ihe omume dị aṅaa nke Jehova ga-ebu ụzọ were ọnọdụ?

3 Udo ahụ dị nso karịa ka ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ na-eche. Ma mmezu nke ihe Jehova kpere n’ikpe megide ụwa nke a rụrụ arụ aghaghị ibu ụzọ bịa. Onye amụma ya bụ Zefanaịa kwuru, sị: “Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa nke ukwuu.” Ụdị ụbọchị dị aṅaa ka nke ahụ bụ? Amụma ahụ gara n’ihu ikwu, sị: “Gee ntị olu ụbọchị Jehova; dike na-eti mkpu dị ilu n’ebe ahụ. Ụbọchị nrubiga ókè nke iwe ka ụbọchị ahụ bụ, ụbọchị ahụhụ na mkpagbu, ụbọchị nke ime mkpọmkpọ ebe na ịtọgbọrọ n’efu, ụbọchị ọchịchịrị na oké mgbachi, ụbọchị igwe ojii na oké ọchịchịrị, ụbọchị opi ike na iti mkpu agha, imegide obodo nile e wusiri ike, na imegide ụlọ nkụkụ nile dị elu. M ga-emekwa ka mkpa kpaa mmadụ, ha ewee jegharịa dị ka ndị ìsì, n’ihi na ọ bụ Jehova ka ha mehieworo megide.”—Zefanaịa 1:14-17; leekwa Habakuk 2:3; 3:1-6, 16-19.

4. Olee ndị na-aza òkù ahụ nke ịmara na ijere Chineke ozi?

4 Ọ bụ ihe obi ụtọ ịmara na ọtụtụ nde taa na-aza òkù ahụ nke ịmara na ijere Chineke ozi. Banyere ndị Kraịst e tere mmanụ, bụ́ ndị e webatara n’ime ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, e buru amụma, sị: “Ha nile ga-amara mụ onwe m, site n’onye dịkarịsịrị nta n’ime ha wee ruo onye dịkarịsịrị ukwuu n’ime ha, ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.” (Jeremaịa 31:34) Ndị a ebutewo ụzọ n’ọrụ ịgba àmà nke oge a. Ugbu a, ka ọtụtụ n’ime ihe fọdụrụ ná ndị e tere mmanụ na-ejezukwa ozi elu ala ha, “oké ìgwè mmadụ” nke “atụrụ ọzọ” abịawo ‘ife Chineke ofufe ehihie na abalị’ ná ndokwa ya yiri ụlọ nsọ. (Mkpughe 7:9, 15; Jọn 10:16) Ị̀ bụ onye na-enwe ihe ùgwù nke a na-enweghị atụ?

Ụzọ “Ihe A Na-achọsi Ike” Si Abata

5, 6. Tupu e mee ka mba nile mee mkpatụ ruo ná mbibi ha, ọrụ dị aṅaa na-azọpụta ndụ na-ewere ọnọdụ?

5 Ugbu a ka anyị tụgharịa gaa na Hagaị 2:7, ebe Jehova buru amụma banyere ụlọ ime mmụọ ya nke ofufe. Ọ sịrị: “M ga-emekwa ka mba nile mee mkpatụ, ihe a na-achọsi ike nke mba nile ga-abịakwa, m ga-emejukwa ụlọ a n’ebube.” Amụma ndị dị na Bible na-egosi na ‘ime ka mba nile mee mkpatụ’ na-ezo aka ná mmezu nke Jehova ga-emezu ihe o kpere n’ikpe n’ahụ mba nile. (Nehum 1:5, 6; Mkpughe 6:12-17) Ya mere, ihe ahụ Jehova ga-eme nke e buru amụma ya na Hagaị 2:7 ga-emezu n’ọ̀tụ̀tụ̀ kasị site na mba nile ịbụ ndị e tikpọrọ pụọ n’ịdị adị—ndị e kpochapụrụ kpam kpam. Ma gịnị banyere “ihe a na-achọsi ike nke mba nile”? Hà ga-echere ruo mgbe mkpatụ ikpeazụ ahụ na-eweta mbibi mere ka ha bata? Ọ dịghị otú ahụ ma ọlị.

6 Joel 2:32 na-asị na “onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Jehova, a ga-eme ka o wepụga onwe ya: n’ihi na n’Ugwu Zaịọn na n’ime Jerusalem ka ụfọdụ ndị gbapụrụ agbapụ ga-adị, dị ka Jehova sịworo, na n’etiti ndị fọdụrụ afọdụ ka ndị Jehova na-akpọ ga-adị.” Jehova na-adọpụta ha, ha ewee na-akpọkụ aha ya site n’inwe okwukwe n’àjà Jisọs tupu ntiwapụ ahụ ga-abịa n’ikpeazụ nke oké mkpagbu. (Tụlee Jọn 6:44; Ọrụ Ndị Ozi 2:38, 39.) Ọ bụ ihe obi ụtọ na oké ìgwè mmadụ ahụ dị oké ọnụ ahịa, ndị ọnụ ọgụgụ ha karịrị nde anọ ugbu a, ‘na-abata’ n’ụlọ ofufe nke Jehova na-enwe olileanya na ọ ‘ga-eme ka mba nile mee mkpatụ’ n’Amagedọn.—Mkpughe 7:9, 10, 14.

7. Gịnị ka ‘ịkpọku aha Jehova’ gụnyere?

7 Olee ụzọ ndị a lanarịrịnụ si akpọku aha Jehova? Jemes 4:8 na-enye anyị ihe ngosi, na-asị: “Bịaruonụ Chineke nso, ọ ga-abịarukwa unu nso. Meenụ ka aka unu dị ọcha, unu ndị mmehie; meekwanụ ka obi unu dị ọcha, unu ndị nwere uche abụọ.” Dị ka ọ dị n’ihe banyere ihe fọdụrụ e tere mmanụ bụ́ ndị butere ụzọ, ndị ahụ nwere olileanya iso n’oké ìgwè mmadụ nke ndị lanarịrị Amagedọn aghaghị ime mkpebi. Ọ bụrụ na i nwere olileanya ịlanarị, ị ghaghị ịṅụ mmiri sitere n’Okwu Jehova dị ọcha n’ụzọ miri emi ma tinye ụkpụrụ ezi omume ya n’ọrụ ná ndụ gị. Ị ghaghị ime mkpebi ịrara ndụ gị nye Jehova, na-egosipụta nke a site na baptism ime mmiri. Ịkpọku Jehova n’okwukwe gụnyekwara ịgbara ya àmà. Otú a, ná Ndị Rom isi 10, amaokwu 9 na 10, Pọl dere, sị: “Ọ bụrụ na ị ga-ewere ọnụ gị kwupụta Jisọs na ọ bụ Onyenwe anyị, ọ bụrụkwa na ị ga-ewere obi gị kwere na Chineke mere ka o si ná ndị nwụrụ anwụ bilie, a ga-azọpụta gị: n’ihi na a na-eji obi kwere ruo ezi omume; a na-ejikwa ọnụ kwupụta ruo nzọpụta.” Mgbe ahụ, n’amaokwu 13, onyeozi ahụ hotara amụma Joel, na-emesi ya ike na “onye ọ bụla nke ga-akpọku aha Onyenwe anyị [“Jehova,” NW], a ga-azọpụta ya.”

‘Chọọnụ, Chọọnụ, Chọọnụ’

8. (a) Dị ka onye amụma bụ Zefanaịa si kwuo, gịnị ka Jehova chọrọ anyị n’aka maka nzọpụta? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka okwu ahụ bụ “eleghị anya” nke dị na Zefanaịa 2:3 na-adọ anyị?

8 N’ịtụgharị gaa n’akwụkwọ Bible bụ Zefanaịa, isi 2, amaokwu 2 na 3, anyị na-agụ banyere ihe Chineke chọrọ anyị n’aka maka nzọpụta: “Mgbe ọnụma nke iwe Jehova akabịakwasịghị unu, mgbe ụbọchị iwe Jehova akabịakwasịghị unu. Chọọnụ Jehova, unu nile ndị dị umeala n’obi bi n’ụwa, ndị rụworo ihe o kpere n’ikpe; chọọnụ ezi omume, chọọnụ umeala n’obi: eleghị anya a ga-ezobe unu n’ụbọchị iwe Jehova.” Rịba ama okwu ahụ bụ “eleghị anya.” Ọ bụghị okwu metụtara a zọpụtahaala gị, a zọpụtachaala gị. Anyị ịbụ ndị e zobere n’ụbọchị ahụ dabeere n’anyị ịnọgide na-eme ihe atọ ndị ahụ. Anyị aghaghị ịchọ Jehova, ịchọ ezi omume, na ịchọ umeala n’obi.

9. Olee ụzọ e si akwụghachi ndị ahụ na-achọ umeala n’obi ụgwọ?

9 N’ezie, ụgwọ ọrụ a na-akwụ maka ịchọ umeala n’obi mara mma nke ukwuu! N’Abụ Ọma 37, amaokwu 9 ruo 11, anyị na-agụ, sị: “Ndị na-ele anya Jehova, ndị ahụ ga-enweta ala. Ma ọ fọdụrụ nwa mgbe, onye na-emebi iwu agaghị adịkwa . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ala; ịba ụba nke udo ga-atọkwa ha ụtọ.” Gịnịkwa banyere ịchọ ezi omume? Amaokwu 29 na-asị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” Banyere ịchọ Jehova, amaokwu 39 na 40 na-agwa anyị, sị: “Nzọpụta ndị ezi omume na-esi n’aka Jehova bịa: ọ bụ ebe ha siri ike na mgbe mkpa. Jehova naenyekwara ha aka, na-eme ka ha gbapụ: ọ na-eme ka ha si n’aka ndị na-emebi iwu gbapụ, ọ na-azọpụtakwa ha, n’ihi na ha agbabawo n’ime ya.”

10. Olee ndị a rịbaworo ama maka ọjụjụ ha jụrụ ịchọ Jehova na ịchọ umeala n’obi?

10 Òtù dị iche iche nke Krisendọm adawo n’ịchọ Jehova. Ọbụna ndị ụkọchukwu na-ajụ aha ya dị oké ọnụ ahịa, na-eji nganga na-ewepụ ya ná nsụgharị Bible ha dị iche iche. Ha na-ahọrọ ife Onyenwenụ ma ọ bụ Chineke nke na-enweghị aha na inye Atọ n’Ime Otu ndị ọgọ mmụọ nsọpụrụ dị omimi. Ọzọkwa, Krisendọm adịghị achọ ezi omume. Ọtụtụ ndị òtù ya na-anakwere ma ọ bụ na-akwado ibi ụdị ndụ onye mere otú ọ masịrị ya. Kama ịchọ umeala n’obi dị ka Jisọs mere, ha na-eme ngosipụta, dị ka ihe atụ na telivishọn, nke ndụ okomoko, bụrụkwa nke rụrụ arụ ọtụtụ mgbe. Ndị ụkọchukwu na-ama abụba site n’irigbu ìgwè atụrụ ha. N’okwu ndị dị na Jemes 5:5, ha ‘ebiwo n’oké oriri na ọṅụṅụ n’elu ụwa, dịakwa ndụ ọjọọ dị ka ọ na-atọ ahụ ha ụtọ.’ Ka ụbọchị Jehova na-abịaru nso, ha ga-achọpụta n’ezie na okwu ahụ e dere n’ike mmụọ nsọ metụtara ha: “Akụ̀ adịghị aba uru n’ụbọchị nke nrubiga ókè nke iwe.”—Ilu 11:4.

11. Ònye bụ onye ahụ na-emebi iwu, olee ụzọ o siworo bụrụ onye ikpe ọmụma ọbara dị ukwuu mara?

11 Na narị afọ mbụ O.A., dị ka Pọl onyeozi kọrọ n’akwụkwọ ozi ya nke abụọ ọ degaara ndị Tesalonaịka, ndị Kraịst ụfọdụ ghọrọ ndị nwere mkpali, na-eche na ụbọchị Jehova abịakwasịwo ha. Ma Pọl dọrọ aka ná ntị na oké ndapụ n’ezi ofufe aghaghị ibu ụzọ bịa, a ghaghị ikpughekwa “onye ahụ na-emebi iwu.” (2 Ndị Tesalonaịka 2:1-3) Ugbu a, na narị afọ nke 20 anyị a, anyị pụrụ ịghọta na ndapụ n’ezi ofufe ahụ eruwo n’ókè buru ibu nakwa ụzọ ndị ụkọchukwu nke Krisendọm si bụrụ ndị na-emebi iwu n’anya Chineke. N’ime ụbọchị ikpeazụ ndị a kemgbe 1914, ndị ụkọchukwu abụrụwo ndị oké ikpe ọmụma ọbara mara site n’ịkwado ‘ịkpụgharị mma ogè ka ha ghọọ mma agha.’ (Joel 3:10) Ha anọgidewo na-akụzi ozizi ụgha dị iche iche, ndị dị ka mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke mmadụ bu pụta ụwa, pọgatrị, ịta ahụhụ n’ọkụ ala mmụọ, ime ụmụ ọhụrụ baptism, Atọ n’Ime Otu, na ihe ndị yiri ha. Gịnị ga-abụ ọnọdụ ha mgbe Jehova ga-emezu ihe o kpere n’ikpe? Ilu 19:5 na-asị: “Onye na-ekupụ okwu ụgha dị ka ume agaghị ewepụga onwe ya.”

12. (a) Gịnị bụ “eluigwe” na “ụwa” nke mmadụ nke a ga-ekpochapụ n’oge na-adịghị anya? (b) Gịnị ka anyị na-amụta site ná mbibi a gaje ibibi ajọ ụwa nke a?

12 Na 2 Pita 3:10, anyị na-agụ, sị: “Ụbọchị Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] ga-abịa dị ka onye ohi; nke ọ bụ n’ime ya ka eluigwe ga-eji oké ùzù gabiga, ihe nile dị n’eluigwe ga-agbakwa ọkụ wee laa n’iyi, ụwa na ọrụ nile a rụrụ n’ime ya ga-erechapụkwa.” A ga-ekpochapụ ọchịchị rụrụ arụ nke kpuchiworo ihe a kpọrọ mmadụ dị ka eluigwe, ya na ihe nile mejupụtara òtù ụmụ mmadụ rụrụ arụ n’oge a, pụọ n’ụwa nke Chineke. Ndị na-emepụta na ndị na-ere ngwá agha ndị na-eweta mbibi, ndị wayo, ndị okpukpe ihu abụọ na ndị ụkọchukwu ha, ndị na-akwalite omume rụrụ arụ, ime ihe ike na imempụ—ndị a nile ga-apụ n’anya. A ga-ekpochapụ ha site n’oké iwe Jehova. Ma n’amaokwu 11 na 12, Pita nyekwara ndị Kraịst okwu ndụmọdụ nke a: “Ebe a na-eme ka ihe ndị a nile laa n’iyi otú a, ọ̀ bụ aha mmadụ gịnị ka unu na-aghaghị ịbụ n’ibi obi nsọ nile na nsọpụrụ Chineke nile, na-ele anya ọbịbịa [“ọnụnọ,” NW] nke ụbọchị ahụ nke Chineke [“Jehova,” NW].”

Maịkael Abanye n’Ọrụ!

13, 14. Ònye bụ Onye ukwu ahụ na-ewepụ ọchịchị Jehova n’ụta, oleekwa ụzọ o siworo na-arụsi ọrụ ike kemgbe 1914?

13 Olee otú mmadụ ọ bụla ga-esi gbanarị “mgbe ahụhụ” nke Jehova? Onye Chineke Họpụtaworo maka iweta mgbapụ bụ onye isi ndị mmụọ ozi bụ́ Maịkael, onye aha ya pụtara “Ònye Dị Ka Chineke?” Mgbe ahụ, n’ụzọ kwesịrị ekwesị, ọ bụ Onye na-ewepụ ọchịchị Jehova n’ụta, na-ebuli Jehova elu dị ka nanị ezi Chineke ahụ na Eze Onyenwe eluigwe na ala nke ziri ezi.

14 Lee aha ihe omume kwesịrị ịrịba ama nke Mkpughe isi 12, amaokwu 7 ruo 17, na-akọwa banyere ‘ụbọchị Onyenwe anyị’ kemgbe 1914! (Mkpughe 1:10) Maịkael, bụ́ onye isi ndị mmụọ ozi, si n’eluigwe chụda Setan ahụ jụrụ okwukwe bịa n’elu ụwa. Mgbe e mesịrị, dị ka a kọwara ná Mkpughe isi 19, amaokwu 11 ruo 16, onye a kpọrọ “Onye kwesịrị ntụkwasị obi na Onye eziokwu” “na-azọkwa ebe nzọcha mkpụrụ vine nke mmanya nke ọnụma nke iwe Chineke Onye Pụrụ Ime Nile.” A kpọrọ onye agha eluigwe nke a dị ike “Eze kachasị ndị eze nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile.” N’ikpeazụ, Mkpughe isi 20, amaokwu 1 na 2, na-agwa anyị banyere mmụọ ozi nke tụbara Setan n’ime abyss ma mee ka ọ nọrọ n’ebe ahụ ruo otu puku afọ. N’ụzọ doro anya, akụkụ akwụkwọ nsọ ndị a nile na-ezo aka n’ebe otu Onye na-ewepụ ọkaaka Jehova n’ụta nọ, bụ́ Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, bụ́ onye Jehova mere ka ọ nọkwasị n’ocheeze eluigwe ya dị ebube na 1914.

15. N’ụzọ dị aṅaa pụrụ iche ka Maịkael “ga-eguzo ọtọ” n’oge na-adịghị anya?

15 Maịkael anọwo “na-eguzo,” dị ka e kwuru na Daniel 12:1, n’ihi ndị Jehova kemgbe e chiri ya Eze na 1914. Ma n’oge na-adịghị anya Maịkael “ga-eguzo ọtọ” n’echiche pụrụ iche—dị ka Onye Jehova Họpụtaworo iwepụ mmebi iwu nile pụọ n’elu ụwa na dị ka Onye Mgbapụta nke òtù ndị Chineke nile zuru ụwa ọnụ. E gosipụtara ịdị ukwuu nke “mgbe ahụhụ” ahụ site n’okwu Jisọs kwuru na Matiu 24:21, 22: “Mgbe ahụ ka mkpagbu ukwu ga-adị, nke ihe dị ka ya akadịghị site ná mmalite ụwa ruo mgbe a, ee e, ọ gaghị adịkwa ma ọlị. Ọ bụrụkwa na e meghị ụbọchị ahụ ka ha dị mkpirikpi, a gaghị azọpụta mmadụ ọ bụla: ma n’ihi ndị a họpụtara a ga-eme ka ụbọchị ahụ dị mkpirikpi.”

16. Anụ ahụ dị aṅaa ka a ga-azọpụta n’oge oké mkpagbu ahụ?

16 Lee aha obi ụtọ anyị pụrụ inwe na a ga-azọpụta anụ ahụ ụfọdụ n’oge ahụ! Ee e, ọ bụghị dị ka ndị Juu ahụ na-enupụ isi e jidere na Jerusalem n’afọ 70 O.A., ndị e buuru ụfọdụ n’ime ha gaa Rom dị ka ndị ohu. Kama nke ahụ, ndị gbanarịrị “mgbe ọgwụgwụ” ahụ ga-adị ka ọgbakọ ndị Kraịst ahụ gbapụwororị na Jerusalem mgbe a malitere ịgba ya gburugburu nke ikpeazụ. Ha ga-abụ ndị nke Chineke, ọtụtụ nde oké ìgwè mmadụ ahụ, ha na ndị e tere mmanụ ọ bụla ka pụrụ ịnọ n’elu ụwa. (Daniel 12:4) Oké ìgwè mmadụ ahụ “na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta.” N’ihi gịnị? N’ihi na ‘ha asawo uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ime ọbara Nwa Atụrụ ahụ.’ Ha nwere okwukwe n’ike mgbapụta nke ọbara Jisọs a wụsịrị, ha na-egosipụtakwa okwukwe ahụ site n’ịnọgidesi ike n’ijere Chineke ozi. Ọbụna ugbu a, Jehova, bụ́ “Onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze,” na-agbasakwa ụlọ ikwuu nchebe ya n’isi ha, ebe Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Kraịst Jisọs, na-azụ ma na-eduru ha gaa n’isi iyi nke mmiri nke ndụ.—Mkpughe 7:14, 15.

17. Olee ihe a gbara oké ìgwè mmadụ ahụ ume ime kpọmkwem ka ha wee bụrụ ndị e zobere n’ụbọchị ahụhụ na-abịa abịa?

17 N’ịchọ Jehova, ezi omume, na umeala n’obi, ọ dịghị mgbe ọtụtụ nde oké ìgwè mmadụ ahụ ga-ekwe ka ịhụnanya mbụ ha nwere maka eziokwu ahụ jụọ oyi! Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime ndị a yiri atụrụ, gịnị ka ị na-aghaghị ime? Dị ka e kwupụtara ná Ndị Kọlọsi isi 3, amaokwu 5 ruo 14, ị ghaghị ‘iyipụchasị mmadụ ochie ahụ, ya na omume ya nile’ kpam kpam. Site n’ịchọ enyemaka Chineke, gbalịa ‘iyikwasị mmadụ ọhụrụ ahụ, nke dabeere n’ezi ihe ọmụma.’ N’ịchọ umeala n’obi, wulite ma nọgide na-anụ ọkụ n’obi n’ito Jehova na n’ime ka ndị ọzọ mara oké nzube ya nile. Otú a, a pụrụ izobe gị na “mgbe ahụhụ,” n’ụbọchị “ọnụma nke iwe Jehova.”

18, 19. N’ụzọ dị aṅaa ka ntachi obi siworo dị mkpa maka nzọpụta?

18 Ụbọchị ahụ dị nso! Ọ na-abịaru anyị nso ngwa ngwa. Nchịkọta nke ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ n’otu n’otu anọwo na-aga n’ihu ugbu a ruo ihe dị ka 57 afọ. Ụfọdụ n’ime ndị a anwụwo ma na-echere mbilite n’ọnwụ ha. Ma a na-emesi anyị obi ike site n’amụma dị ná Mkpughe na dị ka otu òtù, oké ìgwè mmadụ ahụ ga-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta dị ka ndị a ga-eji malite òtù “ụwa ọhụrụ.” (Mkpughe 21:1) Ị̀ ga-anọ n’ebe ahụ? Nke ahụ ga-ekwe omume, n’ihi na Jisọs kwuru na Matiu 24:13, sị: “Onye weere ntachi obi nọgide ruo ọgwụgwụ ihe nile, onye ahụ ka a ga-azọpụta.”

19 Ihe isi ike dị iche iche nke ndị Jehova na-enwe ahụmahụ ya n’usoro ihe ochie nke a ga-anọgide na-amụba. Mgbe oké mkpagbu ahụ na-eweta ihe mgbu ga-etiwapụkwa, ị pụrụ inweta ihe isi ike dị iche iche. Ma nọrọ Jehova na ọgbakọ ya nso. Mụrụ anya! “Cherenụ m, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta), cherenụ ụbọchị mgbe m ga-ebili ọtọ ịkwata ihe: n’ihi na ikpe m bụ ime ka mba nile zukọta, ka m wee chịkọta alaeze nile, ịwụsa ha oké iwe m, bụ́ ọnụma nile nke iwe m: n’ihi na a ga-eji ọkụ nke ekworo m ripịa ụwa nke a nile.”—Zefanaịa 3:8.

20. Ka oge ikpeazụ nke “mgbe ahụhụ” na-abịaru nso karị, gịnị ka anyị na-aghaghị ime?

20 Maka nchebe na agbamume anyị, Jehova ejiwo obi ebere nye ndị ya ‘asụsụ dị ọcha,’ nke gụnyere ozi ahụ mara mma banyere Alaeze ya na-abịa abịa, “ka ha nile wee kpọkuo aha Jehova, ife ya n’otu ubu.” (Zefanaịa 3:9) Ka oge ikpeazụ nke “mgbe ahụhụ” na-abịaru nso karị, ka anyị jiri ịnụ ọkụ n’obi na-eje ozi, na-enyere ndị ọzọ dị umeala n’obi aka ‘ịkpọku aha Jehova’ maka nzọpụta ha.

Ị̀ Na-echeta?

◻ Ihe omume dị aṅaa nke Jehova ga-ebute ụzọ tupu e nweta udo n’elu ụwa?

◻ Dị ka Joel si kwuo, gịnị ka mmadụ na-aghaghị ime iji bụrụ onye a zọpụtara?

◻ Dị ka Zefanaịa si kwuo, olee ụzọ ndị dị umeala n’obi pụrụ isi nweta nchebe pụọ n’ọnụma nke iwe Jehova?

◻ Ònye bụ “onye ahụ na-emebi iwu,” oleekwa ụzọ o siworo bụrụ onye ikpe ọmụma ọbara mara?

◻ Olee ụzọ ntachi obi si bụrụ ihe dị mkpa n’okwu banyere nzọpụta?

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya