Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w99 12/15 p. 26-29
  • Gilead Eziga Ndị Ozi Ala Ọzọ ‘n’Ebe Ụwa Sọtụrụ’

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gilead Eziga Ndị Ozi Ala Ọzọ ‘n’Ebe Ụwa Sọtụrụ’
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Jiri Ikwesị Ntụkwasị Obi Na-ejere Jehova na Ndị Agbata Obi Ozi
  • Ndị Nkụzi Enye Ihe Ncheta Ndị Na-akpali Akpali
  • Ndị Ozi Ala Ọzọ Nwere Ahụmahụ Enye Ihe Mmesi Obi Ike
  • Izere Ihe Otiti nke Na-egbu Ọnọdụ Ime Mmụọ
  • Ndị Mmụta nke Okwu Chineke Na-agụsị Akwụkwọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Mmụọ Afọ Ofufo Akpọta Ndị Mmadụ na Gilead
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Ndị A Kwaliri Ije Ozi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • Ụbọchị Ngụsị Akwụkwọ—Ụbọchị Magburu Onwe Ya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
w99 12/15 p. 26-29

Gilead Eziga Ndị Ozi Ala Ọzọ ‘n’Ebe Ụwa Sọtụrụ’

RUO ihe karịrị iri afọ ise ugbu a, Watchtower Bible School of Gilead anọwo na-ezipụ ndị ozi ala ọzọ. Na September 11, 1999, klas nke 107 nke Gilead gụsịrị akwụkwọ. O nwere ụmụ akwụkwọ 48 si ná mba 11, e zigakwara ndị a ije ozi n’ala 24 dị iche iche. Ha ga-esonyere ọtụtụ puku ndị ozi ala ọzọ ndị ọzọ, bụ́ ndị kewooro òkè pụtara ìhè n’imezu okwu ndị ikpeazụ Jisọs kwuru tupu ọ rịgoro n’eluigwe. O buru n’amụma na ndị na-eso ụzọ ya ‘ga-abụ ndị àmà ya ruo ebe ụwa sọtụrụ.’—Ọrụ 1:8.

Usoro ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ, nke e mere n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower dị na Patterson, New York, bụ oké ememe nke e mere na gburugburu ebe mara mma. Ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ nwere nnọọ obi ụtọ inwe ndị ikwu, ezi ndị enyi, na ndị ọbịa ha n’etiti ndị bịaranụ. A gụnye ndị gere ma kirie ihe omume ahụ site na tepụ na vidio ndị e jikọtara ha na ihe owuwu Brooklyn na Wallkill, ọnụ ọgụgụ ndị bịaranụ dị 4,992.

Jiri Ikwesị Ntụkwasị Obi Na-ejere Jehova na Ndị Agbata Obi Ozi

“Ònye nọ n’akụkụ Jehova?” Nke ahụ bụ isiokwu nke okwu mmeghe bụ́ nke Carey Barber, onye so n’Òtù Na-achị Isi nakwa onyeisi oche nke ihe omume ngụsị akwụkwọ ahụ kwuru. Ọ kọwara na nke a bụ isiokwu chere ndị Israel ihu n’oge Mosis. E chetaara ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ nakwa ndị bịaranụ na ọtụtụ ndị Israel nwụrụ n’ọzara n’ihi na ha anọgidesighị ike n’akụkụ Jehova. Mgbe ha dabasịrị n’ikpere arụsị, ha “wee nọdụ ala iri ihe na ịṅụ ihe, ha wee bilie igwu egwú.” (Ọpụpụ 32:1-29) Jisọs dọrọ ndị Kraịst aka ná ntị banyere otu ihe ize ndụ ahụ, sị: “Na-ezenụ onwe unu, ka a ghara iwere imebiga ajọ ihe ókè, na ịṅụbiga mmanya ókè, na nchegbu nke ndụ a, bogbuo obi unu ma eleghị anya, ụbọchị ahụ ewee bịakwasị unu na mberede.”—Luk 21:34-36.

Ọkà okwu sochirinụ, bụ́ Gene Smalley, nke Ngalaba Ide Ihe, jụrụ ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ, sị: “Ùnu Ga-adị Ka Ọgwụ Paregoric?” Ọ kọwara na a nakweere okwu Grik bụ́ pa·re·go·riʹa n’asụsụ Bekee dị ka aha otu ọgwụ nke na-ebelata ahụ erughị ala. Otú ọ dị, Pọl onyeozi ji okwu Grik a e ji akọwa ihe mee ihe ná Ndị Kọlọsi 4:11 iji kọwaa ndị ha na ya na-arụkọ ọrụ. Na New World Translation, a sụgharịrị okwu a ịbụ “ndị enyemaka na-eme ka [a] dị ike.”

N’ebe e kenyere ha ọrụ, ndị ozi ala ọzọ ahụ na-agụsị akwụkwọ pụrụ ịbụ ọgwụ paregoric nke oge a n’ụzọ dị irè site n’iji obi umeala ghọọ ndị enyemaka na-eme ka a dị ike n’ebe ụmụnna ndị nwoke na ndị nwanyị nọ, nakwa site n’igosipụta mmụọ nke nkwenye na nke ịhụnanya ná mkpakọrịta ha na ndị ozi ala ọzọ ibe ha.

Daniel Sydlik, bụ́ onye so n’Òtù Na-achị Isi, bụ onye ọzọ kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Ụkpụrụ Ọma A Ga-agbaso.” Ọ kọwara na ụkpụrụ ahụ dị elu nke Jisọs setịpụrụ na Matiu 7:12 nke bụ́, “ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu,” na-agụnye imere ndị ọzọ ezi ihe, ọ bụghị nanị izere imejọ ha.

Iji mee nke a n’ụzọ na-aga nke ọma, a chọrọ ụzọ ihe atọ: anya na-ahụ ụzọ, obi ọmịiko, na aka na-enye aka. Ná nchịkọta, o kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị enwee ọchịchọ inye aka, anyị kwesịrị inye aka ozugbo. Anyị aghaghị itinyekwu mgbalị imere ndị ọzọ ihe anyị ga-achọ ka ha meere anyị.” Nke a ga-adị otú ahụ karịsịa n’ebe ndị ozi ala ọzọ nọ bụ́ ndị na-aga ala ọzọ inyere ndị mmadụ aka ịgbaso ezi Iso Ụzọ Kraịst.

Ndị Nkụzi Enye Ihe Ncheta Ndị Na-akpali Akpali

Onye nkụzi Gilead bụ́ Karl Adams nyere ndị ozi ala ọzọ ahụ na-agụsị akwụkwọ agbamume bụ́ “Nọgidenụ Na-eto Eto.” N’akụkụ ndị dị aṅaa? Nke mbụ, n’amamihe nakwa n’ikike iji ya eme ihe nke ọma. Na Gilead, ụmụ akwụkwọ ahụ amụtawo otú e si eme nnyocha iji mara ebe ihe ndekọ Bible nọ mee na ọnọdụ dugara na ya. A gbawo ha ume ịtụle otú ihe ndekọ nke ọ bụla kwesịrị isi metụta ndụ ha. A gbara ha ume ịnọgide na-eme nke a.

“Nke abụọ, nọgidenụ na-eto eto n’ịhụnanya. Ịhụnanya bụ ihe na-eto eto ma ọ bụrụ na a zụọ ya azụọ. Ọ bụrụ na e leghara ya anya, ọ pụrụ ịnwụ,” ka Nwanna Adams kwuru. (Ndị Filipaị 1:9) Ugbu a, dị ka ndị ozi ala ọzọ, ọ ga-adị ha mkpa ito eto n’ịhụnanya n’ọnọdụ dị iche iche. Nke atọ kwa: “Na-abanụ ụba n’amara na ọmụma nke Onyenwe anyị, bụ́ Onye nzọpụta anyị, Jisọs Kraịst.” (2 Pita 3:18) “Nke a bụ obiọma dị egwu nke Jehova gosiworo anyị site n’aka Ọkpara ya,” ka ọkà okwu ahụ kwuru. “Ka anyị na-eto n’ekele maka ebere ahụ na-erughịrị mmadụ, anyị ga na-enwekwu obi ụtọ n’ime uche Chineke nakwa n’ịrụ ọrụ o nyeworo anyị ịrụ.”

Onye nkụzi ọzọ nke Gilead, bụ́ Mark Noumair, kwuru okwu n’isiokwu bụ́ “Jirinụ Ịhụnanya Nakwere Ya, Unu Pụkwara Idi Ya.” Ọ dụrụ ọdụ, sị: “Mụtanụ iji ịhụnanya anakwere ọnọdụ ndị na-ama aka ná ndụ nke ozi ala ọzọ, unu ga-enwekwa ike idi ha. Ọ bụ nanị ndị Jehova hụrụ n’anya ka ọ na-adọ aka ná ntị. Ọ bụrụgodị na i chere na ndụmọdụ ụfọdụ bụ ndị ezi uche na-adịghị na ha, ndị e bu mmadụ n’obi nye, ma ọ bụ ndị e nyere n’ụzọ na-adịghị mma, ịhụnanya n’ebe Jehova nọ na mmekọrịta gị na ya ga-enyere gị aka ịnakwere ha.”

Nwanna Noumair kọwara na ozi ala ọzọ gụnyere ọtụtụ ọrụ. “Ma ọrụ nke unu na-ejighị ịhụnanya arụ ga-eme ka unu ghara inwe afọ ojuju. Ọ bụrụ na ịhụnanya adịghị, ọrụ ndị unu na-arụ n’ụlọ—dị ka isi nri, ịga ahịa, ịsacha mkpụrụ osisi, isi mmiri ọkụ—pụrụ ịghọ nnọọ ihe na-adịghị enye obi ụtọ. Unu aghaghị ịkwụsị ma jụọ onwe unu, sị, ‘N’ihi gịnị ka m ji arụ ihe ndị a?’ Ọ bụrụ na unu agwa onwe unu, sị, ‘Mgbalị m na-atụnye ụtụ n’ahụ ike na obi ụtọ nke ndị ozi ala ọzọ ibe m,’ mgbe ahụ ọ gaghị esiri unu ike nnakwere.” Ná nchịkọta, ọ gbara ume, sị: “Ma ọ̀ bụ n’ihe banyere ịnara ịdọ aka ná ntị, ịrụzu ihe ndị a chọrọ unu n’aka dị ka ndị ozi ala ọzọ, ma ọ bụ idozi nghọtahie, iji ịhụnanya nakwere ya ga-eme ka unu nwee ike ịtachi obi n’ọrụ e nyere unu. ‘Ịhụnanya adịghị ada mgbe ọ bụla.’ ”—1 Ndị Kọrint 13:8.

Onye nkụzi Gilead bụ́ Wallace Liverance duziri mmeghachi nke ihe ngosi banyere ọtụtụ ahụmahụ ndị dị ụtọ ụmụ akwụkwọ ahụ nwere mgbe ha so ọgbakọ ndị dị n’ógbè ahụ na-arụ ọrụ. Tinyere ije site n’ụlọ ruo n’ụlọ, ha ji ọzụzụ ozi ala ọzọ ha mee ihe n’ịchọta ndị mmadụ n’ebe gwongworo na-akwụsị, n’ebe ndị a na-asụ ákwà, n’ọdụ ụgbọ okporo ígwè, nakwa n’ebe ndị ọzọ.

Ndị Ozi Ala Ọzọ Nwere Ahụmahụ Enye Ihe Mmesi Obi Ike

Mgbe ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ gara ná mba ọzọ, ọ̀ dị ha mkpa ichegbu onwe ha? Hà pụrụ ịnagide ihe ịma aka nke ọrụ ala ọzọ? Gịnị ka alaka ụlọ ọrụ di iche iche na-eme iji nyere ndị a bịara ọhụrụ aka inwe ihe ịga nke ọma? Iji zaa ajụjụ ndị a na ndị ọzọ, Steven Lett, nke Ngalaba Ije Ozi, na David Splane, nke Ngalaba Ide Ihe, gbara ụmụnna bụ́ ndị na-aga ụlọ akwụkwọ maka ndị kọmitii alaka n’oge ahụ n’Ebe Agụmakwụkwọ Watchtower ahụ, ajụjụ ọnụ. Ụmụnna ndị a gbara ajụjụ ọnụ na-eje ozi na kọmitii alaka dị na Spain, Hong Kong, Liberia, Benin, Madagascar, Brazil, na Japan.

Ndị ohu Jehova a nwere ahụmahụ, bụ́ ndị ọtụtụ n’ime ha jeworo ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ ruo ọtụtụ iri afọ, mesighachiri ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ nakwa ndị mụrụ ha na ndị ikwu ha bụ́ ndị bịaranụ, obi ike. N’ịdabere n’ahụmahụ onwe ha na nke ndị ozi ala ọzọ ibe ha, ha gosiri na a pụrụ idozi nsogbu na nchegbu dị iche iche n’ụzọ gara nke ọma. Nsogbu ha na-eche ihu pụrụ ịdị ukwuu, “ma a pụrụ idozi ha, Society na-enyekwara anyị aka,” ka Raimo Kuokkanen, bụ́ onye ozi ala ọzọ nọ na Madagascar kwuru. “Ọ bụghị anyị họọrọ ọrụ ahụ, e nyere anyị ya enye,” ka Östen Gustavsson, bụ́ onye na-eje ozi ugbu a na Brazil, kwuru. “Ya mere anyị kpebiri ime ihe nile anyị pụrụ ime iji nọgide na-arụ ya.” James Linton, bụ́ onye na-eje ozi na Japan, sịrị na ihe nyeere ya aka bụ “ọnụnọ ụmụnna ndị nọworị na-eje ozi n’ọrụ ozi ala ọzọ nọ n’ebe ahụ.” Ozi ala ọzọ bụ ụzọ na-enye obi ụtọ na afọ ojuju isi jeere Jehova ozi na isi lekọta atụrụ ya.

Izere Ihe Otiti nke Na-egbu Ọnọdụ Ime Mmụọ

Theodore Jaracz, onye so n’Òtù Na-achị Isi, bụ́ onye gụsịrị akwụkwọ na klas nke asaa nke Gilead na 1946, kwuru okwu mmechi, n’isiokwu bụ́ “Ihe Ịma Aka nke Ime Ka Ọnọdụ Ime Mmụọ Dịgide.” N’ibu ụzọ kpọtụ uche n’arụ ndị dị egwu na-eme n’akụkụ dị iche iche nke ụwa, ọ kọwara na n’ezie, ọdachi ndị ka njọ na-abịakwasị ihe a kpọrọ mmadụ.

N’izo aka n’Abụ Ọma nke 91, Nwanna Jaracz mere ka a mata “ajọ ọrịa na-efe efe” na “mbipụ” ahụ bụ́ ndị meworo ka ọtụtụ nde mmadụ nọ anyị gburugburu daa ọrịa, gbuokwa ha, n’ụzọ ime mmụọ. Ekwensu na ajọ usoro ihe ya ejiriwo mkpọsa ndị yiri ajọ ọrịa na-efe efe, bụ́ ndị dabeere n’ọgụgụ isi na ịhụ ihe onwunwe n’anya mee ihe, iji belata ma gbuo ọnọdụ ime mmụọ, ma Jehova na-emesi anyị obi ike na ihe otiti a agaghị abịadebe “onye na-ebi n’ebe nzuzo nke Onye kachasị ihe nile elu.”—Abụ Ọma 91:1-7.

“Ihe ịma aka ahụ,” ka Nwanna Jaracz kwuru, “bụ ịnọgide na-adị ike n’okwukwe, ịnọgide n’ebe dị nchebe. Anyị apụghị ịdị ka ndị ọchị bụ́ ndị ‘na-enweghị ọnọdụ ime mmụọ.’ Nke a bụzi nsogbu e nwere n’oge a. Ọ bụ nke na-eche anyị nile ihu n’ime nzukọ a. Ọ pụkwara iche unu ihu n’ozi ala ọzọ unu.” (Jud 18, 19) Ma a gwara ndị ozi ala ọzọ ahụ na-agụsị akwụkwọ na ha pụrụ ịnọgide na-enwe ọnọdụ ime mmụọ n’ụzọ na-aga nke ọma n’ọrụ ha. Dị ka ihe atụ, a gbara ha ume ịtụle otú ụmụnna anyị si atachi obi na Russia, n’Esia, nakwa n’ala dị iche iche nke Africa—n’agbanyeghị mmachibido iwu, mmegide kpụ ọkụ n’ọnụ, ịkwa emo, mkpọsa nke ndị na-ekweghị na Chineke, na ebubo ụgha dị iche iche. N’ọtụtụ ọnọdụ kwa, nsogbu anụ ahụ na-esonye, bụ́ nke agha agbụrụ na ụkọ nke ihe ndị dị mkpa ná ndụ na-akpata.

Mgbe ọnọdụ ime mmụọ nọ n’ọnọdụ ọjọọ, “ọ dị mkpa ịchọpụta ihe kpatara nsogbu ahụ ma rụzie ọrụ na ya, na-eji ndụmọdụ nke Okwu Chineke eme ihe.” E nyere ihe atụ ndị sitere na Bible. A gbara Joshua ume ịtụgharị uche n’akwụkwọ Iwu nke ya ehihie na abalị. (Joshua 1:8) Mgbe a chọtara akwụkwọ Iwu ahụ n’oge Josaịa, Jehova gọziri ojiji e ji ikwesị ntụkwasị obi tinye ntụziaka ndị dị na ya n’ọrụ. (2 Ndị Eze 23:2, 3) Timoti matara ihe dị nsọ nile e deworo n’akwụkwọ nsọ site n’oge ọ dị na nwa ọhụrụ. (2 Timoti 3:14, 15) Ndị Beria abụghị nanị ndị na-ege ntị nke ọma; e lere ha anya dị ka ndị ‘dị mma n’obi’ n’ihi na ha nyochara Akwụkwọ Nsọ kwa ụbọchị. (Ọrụ 17:10, 11) Jisọs Kraịst bụkwa ihe nlereanya kasịnụ nke onye maara Okwu Chineke ma jiri ya mee ihe.—Matiu 4:1-11.

Ná mmechi, Nwanna Jaracz ji ikpo ọkụ dụọ ndị ozi ala ọzọ ọhụrụ ahụ ọdụ, sị: “Ugbu a unu ejikerewo ịrụ ọrụ ozi ala ọzọ unu. Unu na-agakwa ná mba ọzọ, n’ụzọ nkịtị, na-aga n’ọtụtụ akụkụ dị iche iche nke ụwa. Ọ bụrụ na anyị ezute ihe ịma aka nke ime ka ọnọdụ ime mmụọ anyị dịgide, mgbe ahụ anyị agajeghị ikwe ka ihe ọ bụla dọpụ uche anyị ime ihe anyị kpebisiworo ike ime. Unu gaje iji ịnụ ọkụ n’obi na-eme nkwusa, kwalie ndị ọzọ iṅomi okwukwe unu, anyị ga na-esokwa unu ekpe ekpere ka Jehova mee ka ndị unu ga-ezi ihe dị ndụ dị ka o meworo ka anyị dị. Ọtụtụ ga-esikwa otú ahụ gbanahụ ọdachi ime mmụọ na-akpọtụ ugbu a n’ụwa nile. Ha ga-esonyere anyị n’ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu ime uche Jehova. Ka Jehova gọziekwa unu ka unu na-eme nke ahụ.”

Mgbe onyeisi oche gụsịrị ozi ekele ndị sitere ná mba dị iche iche na gburugburu ụwa, oge ruru maka inye ụmụ akwụkwọ ahụ na-agụsị akwụkwọ diplọma ha. Ọgụgụ nke akwụkwọ ozi na-emetụ n’obi nke ụmụ akwụkwọ ahụ dere sochiziri. Lee ekele ha nwere n’ebe Jehova na nzukọ ya nọ maka ọzụzụ ahụ pụrụ iche ha nwetaworo nakwa maka ọrụ dị iche iche e kenyere ha dị ka ndị ozi ala ọzọ bụ́ ndị na-aga “ebe ụwa sọtụrụ”!—Ọrụ 1:8.

[Igbe dị na peeji nke 29]

Ihe Banyere Klas Ahụ

Ọnụ ọgụgụ mba ha si bịa: 11

Ọnụ ọgụgụ mba ndị e zigara ha: 24

Ọnụ ọgụgụ ụmụ akwụkwọ: 48

Ọnụ ọgụgụ di na nwunye: 24

Nkezi afọ ndụ: 34

Nkezi afọ ha nọworo n’eziokwu: 17

Nkezi afọ ha nọworo n’ozi oge nile: 12

[Foto dị na peeji nke 26]

Klas nke 107 Na-agụsị Akwụkwọ nke Watchtower Bible School of Gilead

Ná ndepụta dị n’okpuru, e nyere ahịrị ndị ahụ nọmba site n’ihu gaa n’azụ, e depụtakwara aha ha site n’aka ekpe gaa n’aka nri n’ahịrị nke ọ bụla.

1. Peralta, C.; Hollenbeck, B.; Shaw, R.; Hassan, N.; Martin, D.; Hutchinson, A. 2. Edwards, L.; Vezer, T.; Ceruti, Q.; Entzminger, G.; D’Aloise, L.; Baglieri, L. 3. Knight, P.; Krause, A.; Kasuske, D.; Rose, M.; Friedl, K.; Nieto, R. 4. Rose, E.; Backus, T.; Talley, S.; Humbert, D.; Bernhardt, A.; Peralta, M. 5. D’Aloise, A.; Humbert, D.; Dunn, H.; Gatling, G.; Shaw, J.; Ceruti, M. 6. Baglieri, S.; Krause, J.; Hollenbeck, T.; Martin, M.; Bernhardt, J.; Hutchinson, M. 7. Backus, A.; Dunn, O.; Gatling, T.; Vezer, R.; Knight, P.; Hassan, O. 8. Nieto, C.; Talley, M.; Friedl, D.; Kasuske, A.; Edwards, J.; Entzminger, M.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya