Jehova Nwe Nzọpụta
“Chineke bụụrụ anyị Chineke na-azọpụta azọpụta.”—ABỤ ỌMA 68:20.
1, 2. (a) N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji kwuo na Jehova bụ Isi Iyi nke nzọpụta? (b) Ị̀ ga-esi aṅaa kọwaa Ilu 21:31?
JEHOVA bụ Onye Nzọpụta nke ụmụ mmadụ hụrụ ya n’anya. (Aịsaịa 43:11) Eze Israel a ma ama bụ́ Devid maara nke a site n’ahụmahụ nke onwe ya, o jikwa obi ya dum bụọ, sị: “Jehova nwe nzọpụta.” (Abụ Ọma 3:8) Jona onye amụma jiri otu okwu ahụ kpee ekpere sitere n’ala ala obi mgbe ọ nọ n’afọ azụ̀ ukwu ahụ.—Jona 2:9.
2 Nwa Devid bụ́ Solomọn makwaara na Jehova bụ Isi Iyi nke nzọpụta, n’ihi na ọ sịrị: “Ịnyịnya bụ ihe a na-edoziri ụbọchị agha: ma Jehova nwe nzọpụta.” (Ilu 21:31) N’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nke oge ochie, oké ehi dọkpụrụ ọ́gụ̀, ịnyịnya buru ibu, ndị mmadụ gbara ịnyịnya mule, e jikwa ịnyịnya buo agha. Otú ọ dị, tupu ụmụ Israel abanye n’Ala Nkwa ahụ, Chineke nyere iwu na eze ha ga-enwe n’ọdịnihu ‘agaghị eme ka ịnyịnya baara ya ụba.’ (Deuterọnọmi 17:16) Ịnyịnya agha agaghị adị mkpa n’ihi na Jehova ga-azọpụta ndị ya.
3. Ajụjụ ndị dị aṅaa kwesịrị ka anyị tụlee ha?
3 Eze Onyenwe anyị Jehova bụ “Chineke na-azọpụta azọpụta.” (Abụ Ọma 68:20) Lee echiche na-agba ume ọ bụ! Ma olee ‘nzọpụta’ ndị Jehova meworo? Oleekwa ndị ọ zọpụtaworo?
Jehova Na-azọpụta Ndị Ziri Ezi
4. Olee otú anyị si mara na Jehova na-azọpụta ndị na-asọpụrụ ya?
4 Ndị nile na-achụso ụzọ ziri ezi dị ka ndị ohu Chineke raara onwe ha nye pụrụ inweta nkasi obi site n’okwu Pita onyeozi bụ́: “Onyenwe anyị matara ịdọpụta ha n’ọnwụnwa, bụ́ ndị na-asọpụrụ Chineke, na idebe ndị ajọ omume n’ahụhụ mmehie ruo ụbọchị ikpe.” N’ime ka isiokwu a doo anya, Pita kwuru na Chineke ‘emereghị ụwa ochie ebere, kama ọ bụ Noa, onye mere ha asatọ, bụ́ onye na-ekwusa ezi omume, ka O chebere, mgbe O mere ka iju mmiri bịakwasị ụwa nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.’—2 Pita 2:5, 9.
5. N’ọnọdụ ndị dị aṅaa ka Noa jere ozi dị ka “onye na-ekwusa ezi omume”?
5 Were ya na ị nọ n’etiti ọnọdụ ndị dị n’ụbọchị Noa. Ndị mmụọ ọjọọ nwoghara onwe ha nọ n’ụwa. Ụmụ ndị mmụọ ozi a nupụrụ isi ji obi ọjọọ na-emeso ụmụ mmadụ ihe, “ụwa jupụtakwara n’ihe ike.” (Jenesis 6:1-12) Otú ọ dị, a pụghị ịmaja Noa gaa n’ịhapụ ozi Jehova. Kama nke ahụ, ọ bụ “onye na-ekwusa ezi omume.” Ya na ezinụlọ ya wuru ụgbọ, n’adịghịkwa mgbe ha rụrụ ụka na a ga-ekpochapụ ajọ omume n’oge ndụ ha. Okwukwe Noa na-ama ụwa ahụ ikpe. (Ndị Hibru 11:7) Ọnọdụ ndị dị taa yiri ndị dị n’ụbọchị Noa, na-aka ụbọchị ndị a akara dị ka mgbe ikpeazụ nke ajọ usoro ihe a. (Matiu 24:37-39; 2 Timoti 3:1-5) Mgbe ahụ, dị ka Noa, ị̀ ga-ekwesị ntụkwasị obi dị ka onye na-ekwusa ezi omume nke so ndị Chineke na-eje ozi ka ị na-echere nzọpụta Jehova?
6. Olee otú 2 Pita 2:7, 8 si egosi na Jehova na-azọpụta ndị ziri ezi?
6 Pita na-enye ihe àmà ọzọ nke na-egosi na Jehova na-azọpụta ndị ziri ezi. Onyeozi ahụ na-asị: “[Chineke] wee dọpụta Lọt, bụ́ onye ezi omume, mgbe ibi obi n’agụụ ịkwa iko nke ndị ahụ ndị na-emebi iwu na-ewute ya nke ukwuu (n’ihi na onye ezi omume ahụ, ebe ọ na-ebi n’etiti ha, o weere ọrụ ha nke na-emebi iwu mekpaa mkpụrụ obi ezi omume ya ahụ kwa ụbọchị, n’ile ihe na ịnụ ihe).” (2 Pita 2:7, 8; Jenesis 19:1-29) Mmekọahụ rụrụ arụ aghọwo ụzọ ndụ nye ọtụtụ nde mmadụ na mgbe ikpeazụ ndị a. Dị ka Lọt, ị̀ bụ onye ‘ibi obi n’agụụ ikwa iko nke ọtụtụ ndị taa na-ewute’? Ọ bụrụ na ị bụ, ọ bụrụkwa na ị na-eme ezi omume, ị pụrụ iso ná ndị Jehova ga-azọpụta mgbe a ga-eweta ajọ usoro ihe a n’ọgwụgwụ ya.
Jehova Na-azọpụta Ndị Ya n’Aka Ndị Mmegbu
7. Olee otú mmeso Jehova mesoro ụmụ Israel n’Ijipt si egosi na ọ na-azọpụta ndị ya pụọ ná mmegbu?
7 Ruo ogologo oge nile usoro ihe ochie a dịruru, ndị ohu Jehova ga na-enweta mkpagbu na mmegbu ndị iro. Ma ha pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-agbapụta ha, n’ihi na ọ zọpụtawo ndị ya e megburu n’oge ndị gara aga. Ka e were ya na ị bụ onye Israel ndị Ijipt na-emegbu n’ụbọchị Mosis. (Ọpụpụ 1:1-14; 6:8) Chineke etie Ijipt ihe otiti kwuru ihe otiti. (Ọpụpụ 8:5–10:29) Mgbe ihe otiti nke iri ahụ na-eweta ọnwụ na-egbu ụmụ e buru ụzọ mụọ n’Ijipt, Fero ekwere ka Israel pụọ ma mesịa kpọkọta ndị agha ya ma chụwa ha n’azụ. Otú ọ dị, n’oge na-adịghị anya, e bibie ya na ndị ikom ya n’Osimiri Uhie. (Ọpụpụ 14:23-28) Gị esoro Mosis na Israel nile bụọ abụ a: “Jehova bụ onye agha: Jehova bụ aha Ya. Ụgbọala Fero nile na usuu ndị agha ya ka Ọ tụfuworo n’oké osimiri: ndị isi agha ya a họpụtara ahọpụta, ha emikpuwo emikpu n’Oké Osimiri Uhie. Ogbu mmiri na-ekpuchi ha: ha arịdawo ná mmiri dị omimi dị ka nkume.” (Ọpụpụ 15:3-5) Ọdachi yiri nke ahụ na-echere ndị nile na-emegbu ndị Chineke na mgbe ikpeazụ ndị a.
8, 9. Site n’akwụkwọ Ndị Ikpe, nye otu ihe atụ nke na-egosi na Jehova na-azọpụta ndị ya n’aka ndị mmegbu.
8 Ruo ọtụtụ afọ mgbe ụmụ Israel batasịrị n’Ala Nkwa ahụ, ndị ikpe kpere ikpe n’etiti ha. Mgbe ụfọdụ ndị ala ọzọ mekpara ha ahụ, ma Chineke jiri ndị ikpe kwesịrị ntụkwasị obi mee ihe iji gbapụta ha. Ọ bụ ezie na anyị pụrụ ‘ịsụ ude n’otu aka ahụ n’ihu ndị na-emegbu anyị na ndị na-akpagbu anyị,’ Jehova ga-azọpụtakwa anyị dị ka ndị ohu ya na-eguzosi ike n’ihe. (Ndị Ikpe 2:16-18; 3:9, 15) N’ezie, akwụkwọ Bible bụ́ Ndị Ikpe na-emesi anyị obi ike banyere nke a nakwa banyere nzọpụta ka ukwuu Chineke ga-eweta site n’aka Onyeikpe ọ họpụtara, bụ́ Jisọs Kraịst.
9 Ka anyị laghachị n’ụbọchị Onyeikpe Berak. N’ihi ofufe ụgha na enweghị ihu ọma Chineke, Eze Kenean bụ́ Jebin achịwo ụmụ Israel ọchịchị aka ike ruo afọ 20. Sisera bụ ọchịagha nke usuu ndị agha Kenean ahụ buru ibu. Ma, ‘a hụghị ọta, ma ọ bụ ube, n’etiti [iri puku anọ] n’Israel,’ ọ bụ ezie na mba ahụ pụrụ iru ihe dị ka nde mmadụ anọ n’ọnụ ọgụgụ. (Ndị Ikpe 5:6-8) Ụmụ Israel ji nchegharị bekuo Jehova ákwá. Dị ka Chineke duziri site n’aka onye amụma nwanyị bụ́ Debora, Berak chịkọtara ndị ikom 10,000 n’Ugwu Teboa, Jehova emeekwa ka ndị iro ahụ bịaruo ndagwurugwu ahụ dị n’ala ala Teboa dị elu. Usuu ndị agha na ụgbọ ịnyịnya 900 nke Sisera esi ná mkpọda ahụ nakwa n’ala mmiri Kaịshọn ahụ tara ata bigbọrọ na-abịa. Ma oké mmiri ozuzo mere ka oké idei mmiri rikpuo Kaịshọn. Ka Berak na ndị ikom ya zọọrọ njem na-agbadata Ugwu Teboa ka oké mmiri ozuzo ahụ na-ezo, ha ahụ mbibi ahụ nke oké iwe Jehova wetara. Ndị ikom Berak egbuchapụ ndị Kenean ahụ ji ụjọ na-agbalaga, ọ dịghịkwa onye lanarịrịnụ. Lee ihe ịdọ aka ná ntị ọ bụụrụ ndị na-emegbu anyị bụ́ ndị na-anwa ịlụso Chineke ọgụ!—Ndị Ikpe 4:3-16; 5:19-22.
10. N’ihi gịnị ka anyị pụrụ iji jide n’aka na Chineke ga-azọpụta ndị ohu ya nke oge a n’aka ndị na-emegbu ha?
10 Jehova ga-azọpụta ndị ohu ya nke oge a n’aka ndị nile na-emegbu ha, dị nnọọ ka ọ zọpụtara Israel na-atụ egwu Chineke n’oge ndị dị ize ndụ. (Aịsaịa 43:3; Jeremaịa 14:8) Chineke gbapụtara Devid “n’ọbụ aka ndị iro ya nile.” (2 Samuel 22:1-3) Ya mere, ọ bụrụgodị na e megbuo ma ọ bụ kpagbuo anyị dị ka ndị Jehova, ka anyị nwee obi ike, n’ihi na Eze Mesaịa ya ga-atọhapụ anyị ná mmegbu. Ee, “mkpụrụ obi ndị ogbenye ka ọ ga-azọpụta. Ọ ga-esi n’aka nzọgbu na n’aka ime ihe ike gbapụta mkpụrụ obi ha.” (Abụ Ọma 72:13, 14) Mgbapụta ahụ dị nso n’ezie.
Chineke Na-azọpụta Ndị Na-atụkwasị Ya Obi
11. Ihe nlereanya dị aṅaa nke ịdabere n’ebe Jehova nọ ka Devid na-eto eto setịpụrụ?
11 Iji hụ nzọpụta Jehova, anyị aghaghị iji obi ike na-atụkwasị ya obi. Devid gosipụtara iji obi ike dabere n’ebe Chineke nọ mgbe ọ gara izute dike ahụ bụ́ Gọlaịat. Chetụdị banyere onye Filistia ahụ gbara dimkpa iguzo n’ihu Devid na-eto eto, bụ́ onye na-ekwu, sị: “Gị onwe gị na-ewere mma agha, werekwa ube, werekwa mkpụmkpụ ube, bịakwute m: ma mụ onwe m na-ewere aha Jehova nke usuu nile nke ndị agha bịakwute gị, bụ́ Chineke nke usoro agha nile nke Israel, Onye ị taworo ụta. Ụbọchị taa ka Jehova ga-emechibido gị nye n’aka m; m ga-etigbukwa gị, wezụga isi gị n’ahụ gị; m ga-ewerekwa ozu ndị ọmụma ụlọikwuu ndị Filistia nye anụ ufe nke eluigwe, nyekwa anụ ọhịa nke ụwa taa; ka ụwa nile wee mara na Chineke dịịrị Israel: ya na ka mkpọkọta nke a nile wee mara na ọ bụghị mma agha na ube ka Jehova ji azọpụta: n’ihi na Jehova nwe agha nke a.” N’oge na-adịghị anya, Gọlaịat nwụrụ, e meriekwa ndị Filistia oké mmeri. N’ụzọ doro anya, Jehova zọpụtara ndị ya.—1 Samuel 17:45-54.
12. N’ihi gịnị ka ọ pụrụ iji bụrụ ihe enyemaka icheta dike Devid bụ́ Eleeza?
12 Mgbe anyị na-eche ndị mkpagbu ihu, ọ pụrụ ịdị anyị mkpa ‘ijisi ike’ ma tụkwasị Chineke obi n’ụzọ zuru ezu karị. (Aịsaịa 46:8-13; Ilu 3:5, 6) Rịba ihe a mere n’ebe a na-akpọ Pas-damim, ama. Ndị Israel agbaworo ndị agha Filistia ọsọ. Ma ụjọ ejichighị Eleeza, bụ́ otu n’ime ndị dike Devid atọ a ma ama. O guzoro n’ubi barley ma were mma agha na-etigbu ndị Filistia nanị ya. N’ụzọ dị otú a, ‘Jehova zọpụtara Israel nzọpụta ukwu.’ (1 Ihe E Mere 11:12-14; 2 Samuel 23:9, 10) Ọ dịghị onye na-atụ anyị anya n’aka imeri ndị agha nanị anyị. Ma, mgbe ụfọdụ anyị pụrụ ịnọ nanị anyị, bụrụkwa ndị ndị iro rụgidere. Ànyị ga-eji ekpere dabere na Jehova, bụ́ Chineke nke nzọpụta? Ànyị ga-achọ enyemaka ya iji zere ịrara ndị kwere ekwe ibe anyị nye n’aka ndị mkpagbu?
Jehova Na-azọpụta Ndị Na-eguzosi Ike n’Ezi Ihe
13. N’ihi gịnị ka o ji sie ike ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Chineke n’alaeze ebo iri nke Israel?
13 Iji nweta nzọpụta Jehova, anyị aghaghị ịnọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye ya n’agbanyeghị ihe ndị ọ ga-efu. Ndị Chineke nke oge ochie nwetara ule dị iche iche. Cheedị ihe ị pụrụ icheworị ihu ma a sị na i biwo n’alaeze ebo iri nke Israel. Ọchịchị aka ike Rehoboam emewo ka ebo iri kwụsị ịkwado ya ma guzobe alaeze ebe ugwu nke Israel. (2 Ihe E Mere 10:16, 17; 11:13, 14) N’ime ọtụtụ ndị eze ya, Jihu kachasị mma, ma ọbụnadị ya onwe ya ‘ejegharịghị n’iwu Jehova n’obi ya nile.’ (2 Ndị Eze 10:30, 31) Otú o sina dị, alaeze ebo iri ahụ nwere ndị na-eguzosi ike n’ezi ihe. (1 Ndị Eze 19:18) Ha nwere okwukwe n’ebe Chineke nọ, ọ nọnyekwaara ha. N’agbanyeghị ule nke okwukwe gị, ị̀ na-anọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova?
14. Nzọpụta dị aṅaa ka Jehova zọpụtara n’ụbọchị Eze Hezekaịa, gịnịkwa dugara ná mmeri Babilọn meriri Juda?
14 Ejighị Iwu Chineke kpọrọ ihe nke gbasazuru ebe nile dugara alaeze Israel n’ọdachi. Mgbe ndị Asiria meriri ya na 740 T.O.A., obi abụọ adịghị ya na mmadụ ndị si n’ebo iri ya gbagara n’alaeze ebo abụọ nke Juda, bụ́ ebe ha pụrụ ịnọ fee Jehova ofufe n’ụlọ nsọ ya. Anọ n’ime ndị eze 19 nke Juda bụ́ ndị sitere n’eriri Devid—Esa, Jehoshafat, Hezekaịa, na Josaịa—pụtara ìhè ná nrara ha raara onwe ha nye Chineke. N’ụbọchị nke Hezekaịa na-eguzosi ike n’ezi ihe, ndị Asiria ji usuu ndị agha dị ike bịa imegide Juda. N’ịza arịrịọ Hezekaịa, Chineke jiri nanị otu mmụọ ozi gbuo ndị Asiria 185,000 n’otu abalị, si otú a na-azọpụta ndị na-efe Ya ofufe! (Aịsaịa 37:36-38) Mgbe e mesịrị, ọdịda ndị ahụ dara n’idebe Iwu ahụ na ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị nke ndị amụma Chineke dugara ná mmeri Babilọn meriri Juda na mbibi e bibiri isi obodo ya, bụ́ Jerusalem, na ụlọ nsọ ya na 607 T.O.A.
15. N’ihi gịnị ka ntachi obi ji dị ndị Juu nọ na Babilọn mkpa, oleekwa otú Jehova si mesịa weta mgbapụta?
15 Ọ dị ndị Juu nọ n’ala ọzọ mkpa inwe ntachi obi iji nọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe n’ebe Chineke nọ ka ha nọ ná ndọrọ n’agha na Babilọn ruo ihe dị ka afọ 70 nke ịnọ ná mwute. (Abụ Ọma 137:1-6) Otu onye na-eguzosi ike n’ezi ihe nke kwesịrị ịrịba ama bụ Daniel onye amụma. (Daniel 1:1-7; 9:1-3) Cheedị banyere ọṅụ ọ ga-enweworị mgbe iwu nke Eze Peasia bụ́ Saịrọs malitere ịdị irè na 537 T.O.A., na-enye ndị Juu ohere ịlaghachi Juda iji wughachi ụlọ nsọ ahụ! (Ezra 1:1-4) Daniel na ndị ọzọ atachiwo obi ruo ọtụtụ afọ, ma ha mesịrị hụ nkwatu Babilọn na mgbapụta nke ndị Jehova. Nke a kwesịrị inyere anyị aka igosipụta ntachi obi ka anyị na-echere mbibi nke “Babilọn ukwu ahụ,” bụ́ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha.—Mkpughe 18:1-5.
Jehova Na-azọpụta Ndị Ya Mgbe Nile
16. Nzọpụta dị aṅaa ka Chineke wetara n’ụbọchị Eze Nwanyị Esta?
16 Jehova na-azọpụta ndị ya mgbe nile ha na-ekwesị ntụkwasị obi nye aha ya. (1 Samuel 12:22; Aịsaịa 43:10-12) Chee echiche laa azụ n’ụbọchị Eze Nwanyị bụ́ Esta—narị afọ nke ise T.O.A. Eze Ahasuerọs (Xerxes Mbụ) ahọpụtawo Heman dị ka praịm minista. N’ịbụ onye ọjụjụ Mọdekaị bụ́ onye Juu jụrụ ịkpọ isiala nye ya kpasuru iwe, Heman emee atụmatụ igbu ya na ndị Juu nile nọ n’Alaeze Ukwu Peasia. Ọ kọwara ha dị ka ndị na-ada iwu, kwekwa nkwa inye ego ngo, e kwekwara ka o were mgbaaka akara nke eze kaa akwụkwọ na-enye iwu ikpochapụ ha akara. Esta ejiri obi ike kpugheere eze na ya bụ onye Juu, kpugheekwa atụmatụ igbu ọchụ Heman. N’oge na-adịghị anya a kwụbara Heman kpọmkwem n’elu osisi ahụ o doziri maka igbu Mọdekaị. E mere Mọdekaị praịm minista, na-enyekwa ya ikike ikwe ka ndị Juu lụọrọ onwe ha ọgụ. Ha meriri ndị iro ha oké mmeri. (Esta 3:1–9:19) Ihe omume a kwesịrị iwusi okwukwe anyị ike na Jehova ga-azọpụta ndị ohu ya na-erubere ya isi taa.
17. Olee otú nrubeisi si kere ókè ná mgbapụta nke ndị Juu narị afọ mbụ bụ́ ndị Kraịst bi na Judia?
17 Ihe ọzọ mere Chineke ji azọpụta ndị ya bụ na ha na-erubere ya na Ọkpara ya isi. Were ya na ị bụ otu n’ime ndị Juu na-eso ụzọ Jisọs na narị afọ mbụ. Ọ na-agwa ha, sị: “Mgbe ọ bụla unu ga-ahụ Jerusalem ka a chị usuu ndị agha nọgide ya gburugburu, mgbe ahụ maranụ na ịtọgbọrọ n’efu ya dị nso. Mgbe ahụ ndị nọ na Judia, ka ha gbalaga n’ugwu.” (Luk 21:20-22) Ọtụtụ afọ agafee, ị na-echekwa mgbe okwu ndị a ga-emezu. Mgbe ahụ nnupụisi ndị Juu ebido na 66 O.A. Cestius Gallus eduru ndị agha Rom gbaa Jerusalem gburugburu ma garuo ná mgbidi ụlọ nsọ ahụ. Na mberede, ndị Rom ahụ alaghachi n’enweghị ezigbo ihe kpatara ya. Gịnị ka ndị Juu bụ́ ndị Kraịst ga-eme? Na Ecclesiastical History (Akwụkwọ nke Atọ, isi nke Ise, 3) nke ya, Eusebius na-ekwu na ha si na Jerusalem na Judia gbapụ. A laghị ha n’iyi n’ihi na ha rubere isi n’ịdọ aka ná ntị amụma Jisọs. Ị̀ na-adị njikere ime ihe ná nduzi dabeere n’Akwụkwọ Nsọ nke a na-enye site n’aka “onye ahụ na-achị ezinụlọ, onye kwesịrị ka a tụkwasị ya obi” bụ́ onye e mere onyeisi ihe nile Jisọs “nwere”?—Luk 12:42-44.
Nzọpụta Gaa ná Ndụ Ebighị Ebi
18, 19. (a) Nzọpụta dị aṅaa ka ọnwụ Jisọs mere ka o kwe omume, ọ bụkwa maka ole ndị? (b) Gịnị ka Pọl onyeozi kpebisiri ike ime?
18 Ịṅa ntị n’ịdọ aka ná ntị Jisọs zọpụtara ndụ ndị Juu bụ́ ndị Kraịst nọ na Judia. Ma ọnwụ Jisọs na-eme ka nzọpụta gaa ná ndụ ebighị ebi kwe omume nye “mmadụ nile.” (1 Timoti 4:10) Mkpa ihe a kpọrọ mmadụ maka mgbapụta malitere mgbe Adam mehiere, si otú ahụ na-atụfu ndụ nke onwe ya, na-erekwa agbụrụ mmadụ gaa n’ịbụ ohu nke mmehie na ọnwụ. (Ndị Rom 5:12-19) Àjà ụmụ anụmanụ ahụ a chụrụ n’okpuru Iwu Mosis bụ nanị ihe mkpuchi dị nta maka mmehie. (Ndị Hibru 10:1-4) Ebe ọ bụ na Jisọs enweghị nna bụ́ mmadụ, o dokwara anya na mmụọ nsọ Chineke ‘kpuchiri’ Meri site na mgbe ọ tụụrụ ime ruo ọmụmụ Jisọs, a mụrụ ya n’enweghị ihe nketa ọ bụla nke mmehie ma ọ bụ ezughị okè. (Luk 1:35; Jọn 1:29; 1 Pita 1:18, 19) Mgbe Jisọs nwụrụ dị ka onye zuru okè nke na-eguzosi ike n’ezi ihe, o nyere ndụ ya zuru okè iji gbapụta ma napụta ihe a kpọrọ mmadụ. (Ndị Hibru 2:14, 15) Kraịst si otú a ‘nye Onwe ya ka Ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ihi mmadụ nile.’ (1 Timoti 2:5, 6) Ọ bụghị mmadụ nile ga-eji ndokwa a maka nzọpụta mee ihe, ma Chineke na-akwado iji abamuru ya mee ihe maka ndị ji okwukwe na-anabata ya.
19 Site n’iche abamuru nke àjà mgbapụta ya n’ihu Chineke n’eluigwe, Kraịst gbapụtara ụmụ Adam. (Ndị Hibru 9:24) Jisọs si otú a na-enweta Nwanyị Ọhụrụ, nke ụmụazụ ya e tere mmanụ dị 144,000 bụ́ ndị a kpọliri gaa ná ndụ eluigwe, mejupụtara. (Ndị Efesọs 5:25-27; Mkpughe 14:3, 4; 21:9) Ọ na-aghọkwa “Nna Nke bụ Nna mgbe nile ebighị ebi” nye ndị na-anabata àjà ya ma na-enweta ndụ ebighị ebi n’elu ala. (Aịsaịa 9:6, 7; 1 Jọn 2:1, 2) Lee ndokwa ịhụnanya ọ bụ! Ekele Pọl nwere maka ya pụtara ìhè n’akwụkwọ ozi nke abụọ sitere n’ike mmụọ nsọ o degaara ndị Kraịst nọ na Kọrint, dị ka isiokwu na-esonụ ga-egosi. N’ezie, Pọl kpebisiri ike ịghara ikwe ka ihe ọ bụla gbochie ya inyere ndị mmadụ aka irite uru ná ndokwa dị ebube nke Jehova maka nzọpụta gaa ná ndụ ebighị ebi.
Ị̀ Ga-esi Aṅaa Zaa?
◻ Olee ihe nnwapụta Akwụkwọ Nsọ e nwere na Chineke na-azọpụta ndị ziri ezi?
◻ Olee otú anyị si mara na Jehova na-azọpụta ndị na-atụkwasị ya obi ma na-anọgide na-eguzosi ike n’ezi ihe?
◻ Ndokwa dị aṅaa ka Chineke meworo maka nzọpụta gaa ná ndụ ebighị ebi?
[Foto ndị dị na peeji nke 12]
Devid tụkwasịrị Jehova, bụ́ “Chineke na-azọpụta azọpụta” obi. Ị̀ tụkwasịrị ya?
[Foto dị na peeji nke 15]
Jehova na-azọpụta ndị ya mgbe nile, dị ka o gosipụtara ya n’ụbọchị Eze Nwanyị Esta