Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • tp isi 15 p. 163-174
  • Gịnị Mere A Ga-eji Nwee Nchegbu Banyere Ndị Ọzọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Mere A Ga-eji Nwee Nchegbu Banyere Ndị Ọzọ?
  • Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nsọpụrụ nye Ndị Ọzọ na Ihe Onwunwe Ha
  • Imeri Ịkpọasị Agbụrụ, Mba, na nke Ọha Mmadụ
  • Nchegbu Ịhụnanya maka Ọdịmma Ebighị Ebi nke Ndị Ọzọ
  • Ilebara Ihe Na-eme Ezinụlọ nke Gị Anya
  • Hụ Chineke nke Hụrụ Gị n’Anya n’Anya
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • “Karịsịa Ihe Nile, Nweenụ Ịhụnanya Siri Ike”
    Nọrọ na Nche!
  • ‘Nọgidenụ Na-eje Ije n’Ịhụnanya’
    Bịaruo Jehova Nso
  • Bụrụ Onye Ịhụnanya Na-ewuli Elu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
tp isi 15 p. 163-174

Isi 15

Gịnị Mere A Ga-eji Nwee Nchegbu Banyere Ndị Ọzọ?

1. (a) Gịnị kpataworo ọtụtụ ndị mmadụ ji na-achọ ihe nke onwe ha ma ghara inwe nchegbu maka ndị ọzọ? (b) Gịnị ka ọ rụpụtaworo?

NCHEGBU banyere ndị ọzọ nke na-abụghị n’ihi ọdịmma onwe onye dị ụkọ taa. Ọ bụ ezie na anyị nile nwere ókè ụfọdụ nke ịhụnanya site n’ọmụmụ, mgbe ndị ọzọ na-achọ ọdịmma nke onwe ha n’ụzọ na-ezighị ezi ma ọ bụ mgbe mgbalị mmadụ na-eme igosi ịhụnanya bụ nke a ghọtahiere, onye ahụ nwere ike ikpebi na ọ ka mma ilekwasị onwe onye nanị anya. Ndị ọzọ, mgbe ha hụrụ ka ọtụtụ ndị na-erigbu mmadụ ibe ha na-enwe ọganihu n’ụzọ ihe onwunwe nwere ike iche na nke a bụ ụzọ nke inwe ihe ịga nke ọma. Ihe si na ya pụta bụ na ọtụtụ mmadụ enwewo mmụọ nke enweghị ntụkwasị obi, nweekwa nanị ezi ndị enyi ole na ole, ma ọ bụrụ na ọ dị nke ha nwere. Gịnị butere ọnọdụ enweghị obi ụtọ nke a nke ihe ndị na-eme?

2. (a) Bible si aṅaa gosipụta mkpọrọgwụ nke nsogbu a? (b) Gịnị ka ọ pụtara bụ ịmara Chineke?

2 Ịhụnanya dị ụkọ, ụdị ịhụnanya nke na-egosipụta onwe ya n’ezi mmetụta maka ọdịmma na-adịgide adịgide nke ndị ọzọ. Ma gịnị mere o ji dị ụkọ? N’ịkpọtụ uche kpọmkwem n’ihe kpatara nsogbu ahụ, Bible na-asị: “Onye na-adịghị ahụ n’anya amaghị Chineke; n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Otú ọ dị, ọtụtụ ndị na-achọ ihe nke onwe ha na-ekwu na ha kwere na Chineke ọbụnakwa na-eje chọọchị. Ma ihe bụ eziokwu bụ na ha amaghị Chineke n’ezie. Ịmara Chineke pụtara ịmazu ọdịdị ya nke ọma, ịmata ịchịisi ya, na mgbe ahụ ime omume kwekọrọ n’ihe anyị maara banyere ya. (Jeremaịa 22:16; Taịtọs 1:16) Ya mere, iji chọta ezi ọṅụ ná ndụ nke na-abịa nanị mgbe mmadụ gosiri ịhụnanya ma nwetakwa ya, anyị aghaghị ịma Chineke nke ọma, tinyekwa ihe anyị na-amụta n’omume.

3. Chineke èsiwo aṅaa gosipụta oké ịhụnanya ya maka ụmụ mmadụ?

3 “N’ime nke a ka e mere ka ịhụnanya Chineke pụta ìhè n’ime anyị, na Chineke ewerewo Ọkpara ọ mụrụ nanị ya zite n’ụwa, ka anyị wee dị ndụ site n’aka ya,” ka Jọn onyeozi dere. “N’ime nke a ka ịhụnanya dị, ọ bụghị na anyị onwe anyị [buru ụzọ hụ] Chineke n’anya kama ọ bụ ya onwe ya hụrụ anyị n’anya, wee zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi banyere mmehie anyị. Ndị m hụrụ n’anya, ọ bụrụ na Chineke hụrụ anyị n’anya otú a, anyị onwe anyị jikwa ụgwọ ịhụrịta onwe anyị n’anya.” (1 Jọn 4:9-11) Chineke ekweghị ka omume enweghị ịhụnanya nke ụmụ mmadụ dọghachi ịhụnanya nke ya onwe ya azụ. Dị ka e dere ná Ndị Rom 5:8: “Ma Chineke na-eme ka ịhụnanya nke aka ya n’ebe anyị nọ pụta ìhè, n’ihi na, mgbe anyị nọ na-abụ ndị mmehie, Kraịst nwụrụ n’ihi anyị.”

4. Mmetụta dị aṅaa ka nke ahụ mere ka i nwee n’ebe Chineke nọ?

4 Mmadụ ole ka ị hụrụ n’anya hie nne nke na ị ga-atọgbọ ndụ gị n’ihi ha—bụ́ mmadụ ndị ọ na-adịghị ihe ọ bụla ha meere gị? Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, ònye bụ onye ahụ nke ị ga-achọ ka nwa gị nwụọ n’ihi ya? Nke ahụ bụ ụdị ịhụnanya nke Chineke gosiri anyị. (Jọn 3:16) Mmetụta dị aṅaa ka ịmara nke a na-eme ka i nwee n’ebe Chineke nọ? Ọ bụrụ n’ezie na anyị nwere ekele n’ezie n’ihi ihe o meworo, anyị ga-ahụ na ọ bụghị ibu arọ irube isi n’iwu ya nile.—1 Jọn 5:3.

5. (a) Gịnị bụ “iwu ọhụrụ” ahụ nke Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya? (b) Ò si aṅaa metụta nsọpụrụ anyị nye Chineke dị ka onye na-achị achị? (ch) Ya mere, gịnị ka nrubeisi nye “iwu ọhụrụ” nke a na-achọ n’aka anyị?

5 N’abalị ahụ tupu ọnwụ ya, Jisọs nyere ndị na-eso ụzọ ya otu n’ime iwu ndị ahụ. Ọ ga-aka ha akara dị ka ndị dị iche n’ụwa. Ọ sịrị: “Iwu ọhụrụ ka m na-enye unu, ka unu hụrịta ibe unu n’anya.” Iwu Jisọs dị “ọhụrụ” n’ihi na ọ na-asị ka ha hụ ndị ọzọ n’anya, ọ bụghị nanị dị ka ha hụrụ onwe ha, kama “dị ka m hụrụ unu n’anya”—ịdị njikere ịtọgbọ ndụ ha otú onye n’ihi ibe ya. (Jọn 13:34, 35; 1 Jọn 3:16) Ụdị ịhụnanya nke a na-egosi nsọpụrụ anyị nye Chineke site n’ịnwapụta na ihe Ekwensu kwuru bụ ụgha, nke bụ na ọ dịghị mmadụ ọ bụla ga-erubere Chineke isi ma ndụ ya dịrị n’ihe ize ndụ. (Job 2:1-10) O doro nnọọ anya na nrubeisi nye “iwu ọhụrụ” nke a na-achọ nchegbu miri emi maka otu onye n’ebe ibe ya nọ.—Jemes 1:27; 2:15, 16; 1 Ndị Tesalọnaịka 2:8.

6. N’ebe ònye nọ ka a ga-egosikwa ịhụnanya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

6 Ma Kraịst nwụrụ n’ihi ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ, ọ bụghị nanị maka ndị na-eso ụzọ ya. Ọ bụ ya mere Akwụkwọ nsọ ji na-agba ume, sị: “Otú anyị nwere oge, ka anyị na-arụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ, ma ka anyị na-arụ ezi ihe karịsịa n’ebe ndị ezinụlọ nke okwukwe anyị nọ.” (Ndị Galetia 6:10) Ohere nke ‘ịrụ ezi ihe n’ebe mmadụ nile nọ’ na-ebilite kwa ụbọchị. Anyị na-eṅomi Chineke mgbe ịhụnanya anyị bụ nke na-adịghị mkpagide kama nke sitere n’obi ghere oghe na afọ ọma, “n’ihi na ọ na-eme ka anyanwụ ya na-awakwasị ajọ mmadụ na ezi mmadụ, ọ na-emekwa ka mmiri zokwasị ndị ezi omume na ndị ajọ omume.”—Matiu 5:43-48.

Nsọpụrụ nye Ndị Ọzọ na Ihe Onwunwe Ha

7. Gịnị pụrụ imetụta otú anyị si emeso mmadụ na ihe onwunwe nke ndị ọzọ?

7 Anyị na-ebi n’ime ụwa nke na-adịghị ahụ n’anya. Ị pụrụ ịchọpụta ma eleghị anya na ị dịghị emeso ndị ọzọ n’ụzọ dị mma dị ka ị gaara enwe ike ime. Ma ọ bụrụ na mmadụ ga-ejere Chineke ozi, e nwere mkpa maka itinye ezi mgbalị ‘ime ka uche ya bụrụ ihe ọhụrụ.’ (Ndị Rom 12:1, 2) Ọ dị ya mkpa ịgbanwe omume ya n’ebe ụdị mmadụ na ihe onwunwe nke ndị ọzọ dị.

8. (a) Olee ihe na-egosi mgbasa nke enweghị nsọpụrụ n’ebe ihe onwunwe nke ndị ọzọ dị? (b) Ndụmọdụ dị aṅaa n’ime Bible ga-abụ ma a gbasoo ya, ihe ga-adọghachi mmadụ azụ n’ime ụdị ihe ndị ahụ?

8 N’ebe ụfọdụ e nwere nleda anya jọrọ oké njọ n’ebe ihe onwunwe nke ndị ọzọ dị. Nanị maka ihe ọchị, ndị na-eto eto na-emebisi ihe onwunwe nke ma ndị mmadụ ma nke gọọmenti. Ma ọ bụ ha a na-akpachara anya na-emebi ihe ndị ọzọ gbalịsiworo ike inweta. Ụfọdụ nwere ike igosipụta enweghị mmasị n’ụdị arụrụala dị otú ahụ, ma na-etinye ihe na ya site n’ịtụfusi mpekere ihe dị iche iche n’ebe izu ike, n’okporo ámá, ma ọ bụ n’ụlọ ezumezu. Omume ndị a hà kwekọrọ ná ndụmọdụ Jisọs, nke bụ: “Ya mere ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke unu na-achọ ka mmadụ na-eme unu, na-emekwanụ mmadụ otú a, unu onwe unu”? (Matiu 7:12) Ụdị omume enweghị ịhụnanya nke a na-egosi na mmadụ anọghị ná nkwekọ zuru ezu ná nzube Chineke maka ụwa ịghọ paradaịs.

9. (a) Izu ohi si aṅaa emetụta ndụ mmadụ nile? (b) N’ihi gịnị ka izu ohi ji bụrụ ihe ọjọọ n’anya Chineke?

9 N’ọtụtụ ebe, nchegbu maka ndụ na ihe onwunwe na-eme ka ịkpọchi ụzọ, iji ihe ígwè egechi windo na ijiri nkịta na-eche nche bụrụ ihe a na-emekarị. Ụlọ ahịa dị iche iche na-ebuli ọnụ ahịa elu iji nweta ego nke ihe ndị e zuuru. Ma izu ohi agaghị enwe ọnọdụ ọ bụla n’Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke. N’ihi ya, onye ọ bụla na-ele anya ịnọ n’ebe ahụ aghaghị ịmụta ugbu a ibi ndụ n’ụzọ na-akwado ịnọ ná ntụkwasị obi nke ndị mmadụ ibe ha. Bible na-egosi na “onyinye Chineke” bụ ka mmadụ “na-ahụkwa ezi ihe ná ndọgbu nile ọ na-adọgbu onwe ya n’ọrụ.” Ya mere, ọ dị njọ ịnwa ịnapụ ya ihe ọ rụpụtara. (Eklisiastis 3:13; 5:18) Ọtụtụ mmadụ ndị na-adịghị eme ihe n’eziokwu na mbụ agbanweela. Ọ bụghị nanị na ha ewepụwo aka n’izu ohi, kama ha amụtawokwa ọṅụ nke inye ndị ọzọ ihe. (Ọrụ 20:35) Site n’inwe ọchịchọ nke ime ihe dị Chineke mma, ha eburuwo n’obi ihe dị ná Ndị Efesọs 4:28: “Ka onye na-ezu ohi ghara izukwa ohi ọzọ: kama ka ọ dọgbuo onwe ya n’ọrụ, na-eji aka ya abụọ rụọ ezi ihe, ka o wee nwee ihe ya na onye nọ ná mkpa ga-eketa.”

10. (a) Olee otú, site n’ụzọ anyị si ekwusara ndị ọzọ okwu, ka anyị pụrụ isi gosi nchegbu maka ha? (b) Gịnị ga-enyere mmadụ aka ịmụta igosi ịhụnanya n’ụzọ dị otú a?

10 Mgbe mgbe, karịsịa mgbe ihe na-agahie, ihe ndị ọzọ chọrọ abụghị ihe a na-ahụ anya, kama ha na-achọ obi ọma. Otú ọ dị, gịnị na-eme n’ọnọdụ ebe erughị eru mmadụ pụtara ìhè? A pụrụ inwe ntiwapụ nke iwe, okwu mkparị ma ọ bụ ime nkatọ. Ọbụna ụfọdụ ndị matara na ụzọ nke a dị njọ adịghị achịkwa ire ha. Olee otú mmadụ ga-esi merie omume dị otú a? N’ụzọ bụ isi, ihe kọrọ ụkọ bụ ịhụnanya, nke ahụ na-egosikwa na e nwere mkpa nke ịmara Chineke. Mgbe mmadụ ghọtara ịdị ukwuu nke ebere Chineke n’ebe ọ nọ, ọ ga-achọta ya ịbụ ihe dị mfe karị ịgbaghara ndị ọzọ. Ọ pụrụ ọbụna ịmalite ịhụta ụzọ isi nyere onye ahụ mejọrọ ya aka, na-enye ezi enyemaka n’echiche nke imeziwanye ihe.—Matiu 18:21-35; Ndị Efesọs 4:31–5:2.

11. N’ihi gịnị ka anyị na-agaghị ekwu okwu mkparị, ọbụna mgbe ndị ọzọ mesoro anyị ihe n’obi ọjọọ?

11 Ọ bụ eziokwu na ndị ọzọ nwere ike ha agaghị etinye ezi ndụmọdụ nke a sitere n’Okwu Chineke n’ọrụ n’ụzọ ha si emeso anyị omume. N’agbanyeghị ezi ihe anyị bu n’obi, anyị nwere ike mgbe ụfọdụ ịchọta onwe anyị dị ka ndị ha na-akparị. Gịnị ka anyị ga-eme mgbe ahụ? Bible na-adụ ọdụ, sị: “Ekwela ihe ọjọọ merie gị, kama were ezi ihe merie ihe ọjọọ.” (Ndị Rom 12:17-21; 1 Pita 2:21-23) Anyị ịnọgide na-egosi ha obi ọma nwere ike mgbe oge na-aga, mee ka omume ha dị nro ma wepụta àgwà ha ndị ka mma. Ihe ọ sọrọ mmeghachi omume ha bụrụ, mgbe anyị nọgidere na-egosipụta obi ọma, anyị na-egosi na anyị na-akwado ụzọ ịchịisi Chineke, bụ́ nke e guzobere n’ịhụnanya.

Imeri Ịkpọasị Agbụrụ, Mba, na nke Ọha Mmadụ

12, 13. Bible si aṅaa enyere mmadụ aka iwepụ echiche ọ bụla nke ịkpa ókè agbụrụ, mba, ma ọ bụ nke ọha mmadụ?

12 Agbụrụ, ụcha akpụkpọ ahụ, ịhụ mba n’anya, ma ọ bụ ọnọdụ mmadụ ná ndụ adịghị enwe mmetụta n’ebe onye nwere ezi ịhụnanya nọ. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ nakweere eziokwu Bible ahụ nke bụ na ‘Chineke sitere n’otu onye kee agbụrụ nile nke mmadụ.’ (Ọrụ 17:26) N’ihi ya e jikọtara mmadụ nile n’otu. Ọ dịghị agbụrụ dị elu karịa ọzọ dị ka ihe ebumpụta ụwa.

13 Ọ dịghị onye nwere ihe ọ ga-eji nyaa isi n’ihi usoro ọmụmụ ya, agbụrụ, ụcha akpụkpọ ahụ, mba, ma ọ bụ ọnọdụ ya ná ndụ. “Mmadụ nile emehiewo, ha adịghị erukwa otuto Chineke.” (Ndị Rom 3:23) N’ihi ya onye ọ bụla dabeere n’àjà mgbapụta nke Kraịst. Bible gosikwara na ndị a ga-echebe gabiga “mkpagbu ukwu” ahụ ga-esite ná “mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile.”—Mkpughe 7:9, 14-17.

14. Gịnị mere na ahụmahụ ọjọọ mmadụ nwere abụghị ezi ihe mere a ga-eji nwee ịkpọasị megide ndị nile nke otu agbụrụ ma ọ bụ mba?

14 Iji nwaa ime ka ịkpọasị ya zie ezi, mmadụ nwere ike ichetaghachi ahụmahụ dị njọ nke o nwere metụta onye si n’otu agbụrụ ma ọ bụ mba ọzọ. Ma ọ̀ bụ mmadụ nile nke agbụrụ ma ọ bụ mba ahụ tinyere aka n’ihe ọjọọ ahụ e mere? Ọ̀ bụ na ndị mmadụ nke agbụrụ ma ọ bụ mba nke gị onwe gị adịghị eme otú ihe ahụ kpọmkwem? Ọ bụrụ na anyị na-ele anya ibi n’Usoro Ihe Ọhụrụ Chineke nke udo, ọ dị anyị mkpa ịsachapụ n’obi anyị nganga ọ bụla nke na-ewepụ anyị n’ebe ndị ọzọ nọ.

15. Ọ bụrụ na ihe mmadụ kwuru banyere agbụrụ ma ọ bụ mba ọzọ emee ka onye kwere ekwe ibe ya sụọ ngọngọ, nke ọ̀ ga-esi aṅaa metụta nguzo nke ya onwe ya n’ihu Chineke na Kraịst?

15 Mgbe oge na-aga, ihe dị n’obi anyị na-apụta site n’ọnụ anyị. Dị ka Kraịst Jisọs kwuru, sị: “N’ihi na ọnụ ya na-ekwu okwu site n’ihe nke obi nwebigara ókè.” (Luk 6:45) Gịnị ma ọ bụrụ na okwu na-egosipụta ịkpọasị agbụrụ emee ka onye nke na-enwe mmasị ná nzukọ Jehova sụọ ngọngọ? Okwu ahụ dị ike nke ukwuu nke na Jisọs dọrọ aka ná ntị, sị: “Ọzọ, onye ọ bụla nke ga-eme ka otu n’ime ndị nta ndị a ndị kwerenụ ka ọ ma n’ọnyà, ọ ga-aka ya mma ma e were nkume igwe nri nke ịnyịnya ibu na-adọkpụgharị kwụba ya n’olu, tụba ya n’oké osimiri.”—Mak 9:42.

16. Jisọs si aṅaa kọwapụta ụdị akpaghị ókè nke anyị kwesịrị igosi ndị ọzọ?

16 Ndị Kraịst ji ụgwọ igosi mmasị ịhụnanya n’ebe ndị ọzọ nọ n’agbanyeghị agbụrụ ha, mba ha sitere, ma ọ bụ ọnọdụ ha ná ndụ. (Jemes 2:1-9) Dị ka Jisọs gbara ume, sị: “Mgbe ọ bụla i siri nri ukwu, kpọọ ndị ogbenye, ndị ọrụsị, ndị ngwụrọ, ndị ìsì: onye ngọzi ka ị ga-abụ; n’ihi na ha enweghị ihe inyeghachi gị.” (Luk 14:13, 14) Site n’inwe mmasị dị otú a nke ilebara ndị ọzọ anya, anyị na-egosipụta àgwà nile nke ịhụnanya nke Nna anyị nke eluigwe.

Nchegbu Ịhụnanya maka Ọdịmma Ebighị Ebi nke Ndị Ọzọ

17. (a) Gịnị bụ ihe dịkarịsịrị oké ọnụ ahịa nke anyị na ndị ọzọ pụrụ ikerịta? (b) N’ihi gịnị ka anyị kwesịrị iji bụrụ ndị a kwaliri ime otú ahụ?

17 Nchegbu anyị banyere ndị ọzọ agaghị akwụsị nanị ná mkpa ha nke ihe ndị a na-ahụ anya. Ịhụnanya anyị agaghị ezukwa ezu nanị n’ihi na anyị nwere afọ ọma n’ebe ụdị mmadụ nile nọ. Ka ndụ wee nwee ezi nzube, ọ dị mkpa ndị mmadụ ịmara Jehova na nzube ya nile. N’ekpere nye Nna ya, Jisọs sịrị: “Nke a bụ ndụ ebighị ebi ahụ, ka ha mara gị, nke nanị gị bụ ezi Chineke, marakwa onye i zitere, bụ́ Jisọs Kraịst.” (Jọn 17:3) Ọ bụrụ na ị gụwo akwụkwọ a site ná mmalite, ị matawo ụzọ a pụrụ isi nweta ihe mgbata n’ọsọ ahụ. Ị hụwo n’onwe gị ihe Akwụkwọ nsọ kwuru banyere “mkpagbu ukwu” ahụ na ihe àmà nile pụtara ìhè nke na-egosi ịdị nso ya. Ị maara na Alaeze Chineke bụ nanị olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ. Ma ịhụnanya maka Jehova na mmadụ ibe gị ọ̀ na-akwali gị isoro ndị ọzọ kerịta amamihe a dị mkpa?

18. (a) Na Matiu 24:14, ọrụ dị aṅaa ka Jisọs buru n’amụma maka oge anyị? (b) Ànyị kwesịrị isi aṅaa lee ikere òkè na ya anya?

18 Mgbe ọ na-ekwu okwu banyere “ọgwụgwụ oge a,” Jisọs sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:3, 14) Lee ihe ùgwù ọ bụ ịnọchite anya Onye Ọchịchị Kasị Elu nke eluigwe na ụwa, bụ́ Jehova n’onwe ya, mgbe mmadụ na-ekere òkè ‘n’ịgba àmà’ nke a! Ohere nke itinye aka n’ọrụ a pụrụ iche ka dịkwa, ma ọ gaghị adịte anya.

19. Gịnị mere na anyị ekwesịghị ikwe ka mmetụta enweghị ike ọ bụla n’onwe anyị dọghachi anyị azụ n’ikere òkè n’ọrụ a?

19 Mgbe a na-atụle olileanya nke ikere òkè ‘n’ịgba àmà nye mba nile,’ ọ dị mma ịmata na ọ bụghị n’ike mmadụ, kama ọ bụ Chineke na-eme ka ozi ahụ mịpụta mkpụrụ. (Ọrụ 16:14; 1 Ndị Kọrint 3:6) Ọ bụrụ na obi dị njikere kpaliri gị, Jehova pụrụ ijiri gị mee ihe imezu uche ya. Dị ka Pọl onyeozi sịrị: “Ntụkwasị obi dị otú a ka anyị nwekwara site n’aka Kraịst n’ebe Chineke nọ: ọ bụghị na anyị ruru n’onwe anyị, ịgụ ihe ọ bụla dị ka ò sitere n’onwe anyị; kama iru eru anyị sitere na Chineke.”—2 Ndị Kọrint 3:4-6.

20. (a) Mmadụ nile hà ga-azaghachi n’ụzọ dị mma nye ozi ọma ahụ? (b) Ihe dị mma dị aṅaa ka a na-arụzu site n’izisara mmadụ ndị na-enweghị mmasị ma ọ bụ ọbụna ndị mmegide ozi ọma?

20 N’ezie, anyị ekwesịghị ịtụ anya na onye ọ bụla ga-azaghachi n’ụzọ dị mma. Ọtụtụ agaghị enwe mmasị. Ụfọdụ ga-emegide ya. Ma ha pụrụ ịgbanwe. Sọl nke Tasọs, onye bụ na mbụ onye na-akpagbu ndị Kraịst ghọrọ onyeozi na-anụ ọkụ n’obi nke Jisọs. (1 Timoti 1:12, 13) Ma ndị ọzọ hà maara ya ma ọ bụ na ha amaghị, ozi Alaeze ahụ dị ha mkpa. Ya mere anyị kwesịrị inwe nchegbu banyere ha, na-enwe ọchịchọ ijikwu onwe anyị mee ihe maka ọdịmma ebighị ebi ha. (1 Ndị Tesalọnaịka 2:7, 8) Ọbụna ma a sị na ha achọghị ozi Alaeze ahụ, a ka na-emezukwa ihe dị mma. A na-agba àmà ahụ, a na-ebuli aha Jehova elu, ‘nkewapụta’ nke ndị mmadụ na-ewere ọnọdụ, anyị na-egosikwa ikwesị ntụkwasị obi nke onwe anyị nye Jehova.—Matiu 25:31-33.

Ilebara Ihe Na-eme Ezinụlọ nke Gị Anya

21. Ibu ọrụ dị aṅaa ka onyeisi ezinụlọ nwere n’ebe ọdịmma ime mmụọ nke ezinụlọ ya dị?

21 Mgbalị gị inyere ndị ọzọ aka irite uru site ná ndokwa ịhụnanya Jehova kwesịkwara ka e chee ya ihu n’ebe ezinụlọ nke aka gị nọ. Dị ka ihe atụ, onyeisi ezinụlọ nwe ịhụ maka ito eto ime mmụọ nke ezinụlọ ya. Ndokwa ya a haziri nke ọma maka ịtụlekọta Okwu Chineke mgbe mgbe na-emetụta nke a kpọmkwem. Mgbe ekpere nke nna na-ekpe n’isi ezinụlọ ya na-egosi nsọpụrụ miri emi na ekele, nke a pụkwara ịkpụzi omume nke ezinụlọ ahụ nile.

22. N’ihi gịnị ka o ji dị mkpa ka nna dọọ ụmụ ya aka ná ntị, ọ̀ bụkwa gịnị kwesịrị ịkpali ya?

22 Ibu ọrụ ya gụnyekwara inye ahụhụ. Mgbe nsogbu bilitere ọ pụrụ iyi ihe ka mfe ileghara ha anya. Ma ọ bụrụ na nna na-enye ahụhụ nanị mgbe o were iwe, ma ọ bụ ọ bụrụ na a na-edozi nsogbu nanị mgbe ọ dị oké njọ, ọ dị ihe na-efu. Ilu 13:24 na-asị: ‘Nna nke nwere ịhụnanya n’ebe nwa ya nọ na-adọ ya aka ná ntị.’ Otú a nna nke na-ahụ n’anya na-enye ahụhụ mgbe mgbe. Ọ na-eji ndidi kọwaara ụmụ ya ihe, na-atụlekwa ezughị okè nke echiche, omume, nakwa ikike anụ ahụ nke onye ọ bụla n’ime ha nwere. (Ndị Efesọs 6:4; Ndị Kọlọsi 3:21) Ọ bụrụ na ị bụ nna, ì nwere ụdị ịhụnanya ahụ n’ebe ụmụ gị nọ? Ị̀ dị njikere iburu ibu ọrụ a, na-eleghị anya nanị n’ihe dị ugbu a kamakwa n’ọdịmma ọdịnihu nke ezinụlọ gị?—Ilu 23:13, 14; 29:17.

23. Nne ọ̀ pụrụ isi aṅaa na-etinye ihe n’ọdịmma ime mmụọ nke ezinụlọ ya?

23 Nwunye kwa, pụrụ ịtụnye ihe dị ukwuu n’ezinụlọ. Enyemaka ya nke ọ na-enye di ya na iji amamihe na-eji oge eme ihe n’ịgbazi ndụ nke ụmụ ha n’ụzọ nke Chineke na-apụtakarị ìhè n’omume na akparamagwa nke ụmụ. (Ilu 29:15) Ọbụna n’ebe a na-enweghị nna n’ụlọ, ozizi e leziri anya nye nke sitere na Bible tinyere ezi ihe nlereanya na-arụpụta ihe ndị dị mma.

24. (a) Ọ bụrụ na mmegide echee gị ihu site n’aka onye ị lụrụ, ihe iseokwu dị aṅaa ka onye ahụ kwere ekwe kwesịrị iburu n’uche? (b) N’ọnọdụ ndị dị otú a, olee otú a pụrụ isi gosi ịhụnanya n’ebe onye ahụ nke na-ekweghị ekwe nọ?

24 Ma gịnị ma ọ bụrụ na nna nke ezinụlọ anakwereghị Okwu Chineke, ma ọ bụ ọbụna na-akpagbu nwunye ya? Gịnị ka nwanyị ahụ ga-eme? Ọ bụrụ na ọ hụrụ Jehova n’anya, ọ gaghị agbakụta Ya azụ. Ọ bụ Setan bụ onye mara aka na ụmụ mmadụ ga-agbakụta Chineke azụ ma ọ bụrụ na ha anọrọ n’ihe isi ike. Nwanyị ahụ achọghị n’ezie imezu nzube Setan. (Job 2:1-5; Ilu 27:11) Otu mgbe ahụ, Bible na-agba ya ume ịchọ ọdịmma ebighị ebi nke di ya. Ịhapụ ihe ọ maara dị ka eziokwu ga-apụta ntụfu nke ndụ ebighị ebi maka ha abụọ. Ma ọ bụrụ na ọ nọgidesie ike n’okwukwe ya, ọ pụrụ inyere ya aka inweta nzọpụta. (1 Ndị Kọrint 7:10-16; 1 Pita 3:1, 2) Ọzọkwa, site n’ịnọgide na-emezu nkwa alụmdi na nwunye ya, ọbụna n’ihe isi ike, ọ na-egosi nsọpụrụ dị omimi maka Onye ahụ malitere alụmdi na nwunye, bụ́ Jehova Chineke.

25. Mkpebi nke onye ahụ ò si aṅaa emetụta ọdịnihu nke ụmụ?

25 Ihe ọzọ dị ike mere onye kwere ekwe nke mụrụ ụmụ ga-eji rube isi nye Chineke mgbe ọ na-eche mmegide ihu bụ ụmụ ya. Chineke na-ekwe nkwa na ụmụntakịrị nke ndị ohu ya na-asọpụrụ ya ga-abụ ndị a ga-echebe gabiga “mkpagbu ukwu” ahụ nke na-abịanụ. Ọbụna a sị na ọ bụ nanị otu n’ime ndị mụrụ ụmụ ahụ bụ ohu Jehova, Ọ na-agụ ụmụaka dị otú ahụ dị ka ndị dị “nsọ.” (1 Ndị Kọrint 7:14) Ma ọ bụrụ na onye ahụ “ajụ” ime uche Chineke, gịnị ga-eme? Onye dị otú ahụ ga-atụfu ọnọdụ dị mma n’ihu Chineke ọ bụghị nanị maka onwe ya, kamakwa maka ụmụntakịrị ya. (Ndị Hibru 12:25) Lee ihe mfu dị ilu nke ahụ ga-abụ!

26. Iji mee ihe n’ụzọ ga-ewetara anyị na ndị ọzọ ezi uru, gịnị dị anyị mkpa ime?

26 Mgbe ahụ n’agbanyeghị akụkụ ndụ nke anyị lere anya, o doro anya na ọ dị anyị mkpa inwe nchegbu, ọ bụghị maka nanị onwe anyị kamakwa maka ndị ọzọ. Anyị ga-enweta ịhụnanya ma ọ bụrụ na anyị etinye ịhụ ndị ọzọ n’anya n’omume. (Luk 6:38) Ma iji gosipụta ezi ịhụnanya ma ghara ikwe ka echiche nke mmadụ na-ezughị okè rafuo anyị, ọ dị anyị mkpa ịmara Jehova ma soro ya nwee ezi mmekọrịta. Otú ọ dị, anyị ime otú ahụ metụtara nhọrọ nke anyị na-aghaghị ime n’onwe anyị.

[Foto dị na peeji nke 171]

Ụdị ịhụnanya ndị ohu Jehova na-aghaghị inwe chọrọ ka ha na-egosi ezi nchegbu banyere ndị ọzọ n’agbanyeghị agbụrụ, mba, ma ọ bụ ọnọdụ ha ná ndụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya