Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ị Ga-abụli Enyi Jehova
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • 5. Ihe Jehova chọrọ ka ndị enyi ya na-eme

      E nwere ihe ụfọdụ anyị na-achọ ka ndị enyi anyị na-eme.

      • Olee ihe ụfọdụ ị na-achọ ka ndị enyi gị na-emere gị?

      Gụọnụ 1 Jọn 5:3. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Gịnị ka Jehova chọrọ ka ndị enyi ya na-eme?

      Anyị chọọ ịna-erubere Jehova isi, anyị kwesịrị ịhapụ ihe na-adịghị mma anyị na-eme. Gụọnụ Aịzaya 48:17, 18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Gịnị mere Jehova ji gwa ndị enyi ya ka ha hapụ ihe na-adịghị mma ha na-eme?

      Ebe otu nwoke na-arụ ụlọ na-enye onye ọrụ ibe ya okpu ha na-ekpu arụ ọrụ ka ha ghara imerụ ahụ́.

      Ezigbo enyi anyị na-agwa anyị ihe ndị anyị kwesịrị ime ka anyị ghara imerụ ahụ́ nakwa ihe ndị ga-abara anyị uru. Jehova na-emekwara ndị enyi ya ụdị ihe ahụ

  • Ị Ga-abụli Enyi Jehova
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
  • Ime Baptizim Ga-abara Gị Ezigbo Uru
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • Tupu i mee baptizim, ị ga-ebu ụzọ mụọ gbasara Jehova, nweekwa okwukwe siri ike n’ebe ọ nọ. (Gụọ Ndị Hibru 11:6.) Ị ga na-ahụkwu Jehova n’anya ka ị na-amụtakwu gbasara ya nakwa ka okwukwe gị n’ebe ọ nọ na-esikwu ike. O doro anya na ị ga-achọ ịna-ekwusa ozi ọma gbasara ya, na-ebikwa ndụ otú dị ya mma. (2 Timoti 4:2; 1 Jọn 5:3) Ọ bụrụ na mmadụ amalite ‘ịna-eme ihe otú ndị na-efe Jehova kwesịrị ịna-eme iji na-eme ya obi ụtọ,’ o nwere ike ikpebi na ya ga-enyefe Chineke onwe ya nakwa na ya ga-eme baptizim.​—Ndị Kọlọsi 1:​9, 10.a

  • Ime Baptizim Ga-abara Gị Ezigbo Uru
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • a Ọ bụrụ na mmadụ emebuola baptizim mgbe ọ na-aga chọọchị, ọ ga-eme baptizim ọzọ. Maka gịnị? Ọ bụ maka na chọọchị ahụ anaghị akụzi eziokwu dị na Baịbụl.​—Gụọ Ọrụ Ndịozi 19:​1-5 nakwa Isi 13 n’akwụkwọ a.

  • Gosi na Obi Dị Gị Ụtọ Maka Ihe Jehova na Jizọs Meere Gị
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • Weregodị ya na o nwere onye napụtara gị mgbe mmiri na-achọ iri gị. Ị̀ ga-echefu ihe a onye ahụ meere gị? Ka ị̀ ga-achọ ụzọ ndị ị ga-esi gosi ya na obi dị gị ụtọ maka ihe o meere gị?

      Ọ bụ Jehova mere ka anyị nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi. Gụọnụ 1 Jọn 4:​8-​10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Gịnị mere àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ ji bụrụ onyinye pụrụ iche?

      • Olee otú obi dị gị maka ihe a Jehova na Jizọs meere gị?

      Olee otú anyị ga-esi gosi na obi dị anyị ụtọ maka ihe a Jehova na Jizọs meere anyị? Gụọnụ 2 Ndị Kọrịnt 5:​15 na 1 Jọn 4:​11; 5:3. Unu gụchaa amaokwu nke ọ bụla, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee ihe amaokwu a kwuru anyị ga-eme iji gosi na obi dị anyị ụtọ?

  • Olee Otú Anyị Ga-esi Gosi Jehova na Anyị Hụrụ Ya n’Anya?
    Na-enwe Obi Ụtọ Ruo Mgbe Ebighị Ebi—Ihe Ga-enyere Gị Aka Ịmụ Baịbụl
    • Isi nke 34. Ebe otu nwoke na-ele anya n’eluigwe ma na-atụgharị uche.

      ISI NKE 34

      Olee Otú Anyị Ga-esi Gosi Jehova na Anyị Hụrụ Ya n’Anya?

      Ọ̀ na-adị gị ka gị na Chineke dịzi ná mma kemgbe ị malitere ịmụ Baịbụl? Ị̀ ga-achọ ịna-agba mbọ ka gị na ya dịkwuo ná mma? Ọ bụrụ otú ahụ, cheta na ọ bụrụ na anyị ana-ahụkwu Jehova n’anya, yanwa ga-ahụkwu anyị n’anya, na-elekọtakwa anyị. Olee otú ị ga-esi gosi ya na ị hụrụ ya n’anya?

      1. Olee otú anyị ga-esi gosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya?

      Otú anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya bụ ịna-erubere ya isi. (Gụọ 1 Jọn 5:3.) Ọ naghị amanye anyị ka anyị na-erubere ya isi. Kama, ọ na-ahapụ onye ọ bụla n’ime anyị ikpebi ma ọ̀ ga na-erubere ya isi ka ọ̀ bụ na ọ gaghị. Maka gịnị? Ọ bụ maka na Jehova chọrọ ka anyị ‘jiri obi anyị na-erubere ya isi.’ (Ndị Rom 6:17) Ihe ọ pụtara bụ na ọ chọrọ ka ị na-erubere ya isi maka na ị hụrụ ya n’anya, ọ bụghị maka na ọ bụ ihe i kwesịrị ime. E dere nkebi nke 3 na nke 4 n’akwụkwọ a ka ha nyere gị aka ịna-eme ihe dị Jehova mma ma hapụ ihe na-adịghị ya mma, si otú ahụ gosi na ị hụrụ ya n’anya.

      2. Gịnị mere igosi Jehova na anyị hụrụ ya n’anya nwere ike iji siere anyị ike?

      Baịbụl sịrị na “ọtụtụ nsogbu na-abịara onye ezi omume.” (Abụ Ọma 34:19) E nweghị onye n’ime anyị zuru okè. Ihe nwere ike siere anyị ike, e nwere ike ịna-emegbu anyị, nsogbu ndị ọzọ nwekwara ike ịbịara anyị. Nsogbu bịara anyị, o nwere ike isiri anyị ike ime ihe Jehova kwuru n’ihi na ime ihe na-adịghị ya mma nwere ike ịdịrị anyị mfe. Ma, ọ bụrụ na i jiri obi gị niile mee ihe Jehova gwara gị, ị na-egosi na ị hụrụ ya n’anya karịa ihe ọ bụla ọzọ. Ị na-egosikwa na i jisiri ya aka ike. Yanwa ga-ejisikwa gị aka ike. O mekataghị hapụ gị.​—Gụọ Abụ Ọma 4:3.

      MỤTAKWUO IHE

      Chọpụta ihe mere obi ji atọ Jehova ụtọ ma i rubere ya isi nakwa ihe nwere ike inyere gị aka ịna-erubere ya isi.

      3. Ebubo nke gbasara gị

      Ihe e kwuru n’akwụkwọ Job na-egosi na Setan boro Job ebubo, ma ebubo ahụ gbasakwara ndị niile chọrọ ife Jehova. Gụọnụ Job 1:1, 6–2:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Gịnị ka Setan kwuru na ọ bụ ya mere Job ji na-erubere Jehova isi?​—Leruonụ anya na Job 1:9-11.

      • Olee ebubo Setan boro mmadụ niile, ma gịnwa?​—Leruonụ anya na Job 2:4.

      Gụọnụ Job 27:5b. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ a:

      • Olee otú Job si gosi na ọ hụrụ Jehova n’anya n’eziokwu?

      Ebe Setan na-arụ Jehova ụka. Ọ na-ekwu na ihe Job etuto toro ahụ́ niile na otu nwanna nwaanyị n’oge a bu n’uche na-efe Jehova adịghị mma.

      Job rubeere Jehova isi, si otú ahụ gosi na ọ hụrụ ya n’anya

      Otú anyị si egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya bụ ịna-erubere ya isi

      4. Mee Jehova obi ụtọ

      Gụọnụ Ilu 27:11. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Olee otú obi ga-adị Jehova ma ị mara ihe ma na-erubere ya isi? Maka gịnị?

      5. Ị ga-erubeliri Jehova isi

      Otú anyị si hụ Jehova n’anya na-eme ka anyị na-agwa ndị ọzọ gbasara ya. N’ihi otú a anyị si hụ ya n’anya, anyị na-agwa ndị ọzọ gbasara ya ma mgbe ọ na-adịrịghị anyị mfe. Kpọnyenụ VIDIO a. Unu lechaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      VIDIO: Jisie Okwukwe Gị Ike n’Agbanyeghị Mmegide (5:09)

      • È nwere oge ụfọdụ ụjọ na-atụ gị ịgwa ndị ọzọ gbasara Jehova?

      • Na vidio a anyị lere, gịnị nyeere Grayson aka ịkwụsị ịtụ ụjọ?

      Ọ bụrụ na ọ bụ ihe ndị na-amasị Jehova na-amasị anyị, ọ bụrụkwa na anyị akpọọ ihe ndị ọ kpọrọ asị asị, irubere ya isi ga-adịrị anyị mfe. Gụọnụ Abụ Ọma 97:10. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị ị mụtarala na ha na-amasị Jehova? Olee ụfọdụ n’ime ihe ndị ọ kpọrọ asị?

      • Olee ihe ga-enye aka mee ka ihe dị mma na-amasị gị, meekwa ka ị kpọọ ihe ọjọọ asị?

      6. Irubere Jehova isi na-abara anyị uru

      Irubere Jehova isi na-abara anyị uru mgbe niile. Gụọnụ Aịzaya 48:17, 18. Unu gụchaa ya, unu eleba anya n’ajụjụ ndị a:

      • Ì chere na obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ma ihe ga-akacha abara anyị uru mgbe niile? Gịnị mere i ji chee otú ahụ?

      • Olee uru ịmụ Baịbụl na ịmụ gbasara ezi Chineke, bụ́ Jehova, baarala gị?

      ỤFỌDỤ NA-ASỊ na otú ha si akpa àgwà agbasaghị Chineke.

      • Olee amaokwu Baịbụl ị ga-eji gosi mmadụ na otú anyị si akpa àgwà gbasara Jehova?

      NCHỊKỌTA

      Ị ga-egosi na ị hụrụ Jehova n’anya ma ọ bụrụ na ị na-erubere ya isi, jidesiekwa ya aka ike ọ bụrụgodị na ime otú ahụ na-esiri gị ike.

      Ajụjụ ndị e ji echeta ihe a mụrụ

      • Gịnị ka ị mụtara n’akụkọ a kọrọ gbasara Job?

      • Olee otú ị ga-esi gosi Jehova na ị hụrụ ya n’anya?

      • Gịnị ga-enyere gị aka ka ị ghara ịkwụsị irubere Jehova isi?

      Ihe ị ga-agba mbọ mee

      IHE Ị GA-ELEBAKWU ANYA

      Chọpụta ihe ga-enyere gị aka ịna-erubere Jehova isi nakwa ihe ga-enyere gị aka ịna-eme ihe ọgbakọ ya kwuru.

      “Onye Na-eguzosi Ike n’Ihe Ka Ị Ga-eji Iguzosi Ike n’Ihe Meso Ihe” (16:49)

      Chọpụtakwuo gbasara ebubo Setan boro ụmụ mmadụ.

      “Job Nọgidere Na-eme Ihe Ziri Ezi” (Baịbụl​—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu? nkebi nke 6)

      Chọpụta otú mmadụ nwere ike isi gosi na ọ hụrụ Jehova n’anya a sịgodị na ọ bụ onye na-eto eto.

      Mee Jehova Obi Ụtọ (8:16)

      Olee ihe ga-enyere ndị na-eto eto aka ịna-erubere Chineke isi ọ bụrụgodị na ndị ọgbọ ha na-enye ha nsogbu ka ha na-enupụrụ ya isi?

      Ekwela Ka Ndị Ọgbọ Gị Rafuo Gị (3:59)

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya