Isi 22
Chineke nke “Onyeisi Udo” ahụ Abụrụ “Ihe Nile n’Ime Ihe Nile”
1. Na gịnị ka Jisọs Kraịst setịpụrụ ihe nlereanya maka ihe ndị ọzọ nile e kere eke n’ime eluigwe na n’elu ala?
NA NWA oge ka mbilite n’ọnwụ ya gasịrị, “Onyeisi Udo” ahụ gwara otu n’ime ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ana m arịgo lakwuru Nna m na Nna unu, na Chineke m na Chineke unu.” (Jọn 20:17) Site n’okwu ndị ahụ o kwetara na Nna eluigwe ya bụkwa Chineke ya, Onye ọ bụ nanị ya ka o fere ofufe. N’ofufe dị otú ahụ o setipụụrụ ihe nile ọzọ e kere eke n’ime eluigwe na ala nile ihe ilereanya.
2, 3. (a) Olee otú 1 Ndị Kọrint 15:24-26, 28 si kọwaa omume pụrụ iche nke Jisọs nke ido onwe ya n’okpuru Nna ya? (b) Ihe dị ukwuu dị aṅaa ga-esi n’ime ya pụta?
2 Lee ihe nlereanya dị ebube “Onyeisi Udo” ahụ ga-abụrụ agbụrụ mmadụ e mere ka ha zuo okè mgbe ọ ga-eji iguzosi ike n’ihe doo onwe ya n’ụzọ pụrụ iche n’okpuru Onye ahụ bụ ezi Ọkaaka nke eluigwe na ala nile! A ga-ekpughe nke a n’ụzọ na-enweghị atụ n’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ ya n’elu agbụrụ mmadụ, mgbe ọ ga-eweghachiworị udo, ịnọ ná ntụkwasị obi na nkwekọ n’ụwa nile. N’amụma nke na-adịghị agha ụgha, e mesiri anyị obi ike banyere nke a:
3 “E mesịa ọgwụgwụ ihe nile ga-abịa, mgbe ọ bụla ọ ga-arara alaeze ya nye n’aka Chineke, Onye bụkwa Nna; mgbe ọ bụla ọ ga-emeworị ka ọbụbụ isi nile na ịchịisi nile na ike nile ghara ịdị irè. N’ihi na ọ ghaghị ịbụ eze, ruo mgbe ọ ga-edebeworị ndị iro ya nile n’okpuru ụkwụ ya. Dị ka onye iro ikpeazụ, a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè. Ma mgbe ọ bụla a ga-edoworị ihe nile n’okpuru ya, mgbe ahụ ka a ga-edo Ọkpara ahụ onwe ya n’okpuru Onye ahụ nke doro ihe nile n’okpuru Ya, ka Chineke wee bụrụ ihe nile n’ime ihe nile.” (1 Ndị Kọrint 15:24-26, 28) Ma ọ bụ dị ka The Amplified Bible si sụgharịa akụkụ ikpeazụ nke amaokwu 28: “Ka Chineke wee bụrụ ihe nile n’ime ihe nile—ya bụ, bụrụ mmadụ nile ihe nile, onye kasị elu, ike mkpali dị n’ime ma na-achịkwa ndụ.”
4. (a) Olee otú ndị bi n’ụwa ga-esi meghachi omume n’ihe nlereanya nke Nna nke kuchiri ha? (b) Akụkụ ọhụrụ dị aṅaa nke ịnọ n’okpuru ga-adị mgbe ahụ?
4 Mgbe “Onyeisi Udo” ahụ nyefere Chineke ya Alaeze ahụ n’ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ ahụ, a ga-eme ka ndị bi n’ụwa mara ihe omume nke a nke Nna kuchiri ha. N’inwe ya dị ka Onye Nlereanya na Eze ha, n’otu aka ahụ ha ga-edo onwe ha n’ọnọdụ dị ọhụrụ n’okpuru Chineke Onye Kachasị Ihe Nile Elu. Ugbu a ná nke mbụ ya ha ga-eji ịhụnanya doo onwe ha n’okpuru Jehova kpọmkwem, ee, fee ya ofufe n’obi ọcha na eziokwu nile, n’enwekwaghị ọdịmkpa nke ozi onye nchụàjà nke Jisọs, ọbụna mgbe a na-ekpe ekpere.
5. Gịnị ga-abụ omume nke 144,000 ndị eze ahụ ha na Jisọs Kraịst ga-achị?
5 N’ụzọ dị otú a Chineke Onye Kachasị Ihe Nile Elu na-aghọkwa ọzọ Eze nke eluigwe na ala nile n’enweghị onye nnọchianya ya nke bụ eze n’eluigwe ma ọ bụ n’ala. Ọ bụkwa eziokwu na 144,000 òtù ndị eze, bụ́ ndị Jisọs Kraịst gbatara n’ụwa ga-egbukwa ikpere n’ala n’ihu Onye Ọchịchị ahụ Dị Ebube, ha ga-esitekwa n’echiche ọzọ nke a nakwere ya dị ka Ọkaaka nke Eluigwe na Ala.
Ule Ikpeazụ Maka Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ
6. (a) Gịnị ga-eme ụmụ mmadụ na-adịghị erube isi n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri nke Jisọs? (b) Gịnị ga-abụ ọnọdụ nke ndị Jisọs ga-enyefe Nna ya nke eluigwe?
6 N’ịnabata Jehova dị ka Onye Ikpe Kasị Elu, ọ bụ ọchịchọ Jisọs Kraịst ka nnwapụta nile dị mkpa nke Chineke dịkwasị n’ọrụ Jisọs rụzuru n’oge Ọchịchị Narị Afọ Iri ya. N’oge ọchịchị ahụ, mmadụ ndị ahụ jụrụ ime ihe ezi omume chọrọ n’aka ha, ndị nupụkwaara Eze ahụ isi ga-abụworị ndị e bibiri. Otú a, ndị Jisọs Kraịst nyefere Jehova Chineke n’aka, bụ́ Onye Ikpe ikpeazụ, ga-abụ ndị ahụ na-erube isi ruteworo izu okè mmadụ.
7. (a) Gịnị ka a ga-etinye n’ule nnyocha mgbe Jisọs nyeghachisịrị Alaeze ahụ? (b) Olee otú a ga-esi tinye agbụrụ mmadụ e mere ka ha zuo okè n’ule ahụ?
7 Na mgbe ahụ ka oge ruru itinye ndịgide nke nraranye mmadụ n’ebe Ọkaaka Eluigwe na Ala, bụ́ Jehova Chineke, n’ule nọ. Dị ka ọ dị n’ọnọdụ Job, ajụjụ bụ: Hà na-ahụ Chineke n’anya ma na-efe ya nanị n’ihi ihe ọma nile o mewooro ha, ka hà na-ahụ ya n’anya n’ihi ihe ọ bụ n’onwe ya kpọmkwem—Ọkaaka O Ruuru nke eluigwe na ala? (Job 1:8-11) Ma olee otú a ga-esi tinye ikwesị ntụkwasị obi si n’obi agbụrụ mmadụ ahụ zuru okè n’ule? Bible na-aza, sị: A ga-atọhapụ Setan bụ Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya ruo “nwa oge” site n’abyss ahụ bụ́ ebe a tụworo ha mkpọrọ ruo otu puku afọ. (Mkpughe 20:3) Site n’ikwe ka Ekwensu tinye agbụrụ mmadụ nke e weghachiri eweghachi n’ule, a pụrụ ịnwapụta iguzosi ike n’ezi ihe nke ndị so n’agbụrụ mmadụ e mere ka ha zuo okè nye Chineke n’otu n’otu n’ụzọ zuru okè.—Tụlee Job 1:12.
8. (a) Mgbe a tọhapụsịrị ya n’abyss ahụ, gịnị ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya ga-agbalị ime? (b) Ụzọ omume dị aṅaa ka ndị hapụrụ onwe ha ka Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya duhie ha ga na-agbaso?
8 N’ime 7,000 afọ gara aga, Setan bụ Ekwensu nwere ike nke iduba Adam na Iv ahụ zuru okè ná mmehie site na ha ịgbaso ụzọ ime ihe nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. Akwụkwọ Nsọ ekwughị ụdị ọnwụnwa ndị Jehova ga-ekwe ka Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya jiri mee ihe mgbe a tọhapụsịrị ha site n’ime abyss ahụ. Ma ihe ịrụ ụka adịghị ya na a ga-enwe ihe na-akpali ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na ọchịchọ nke ịnọ n’adabereghị na Chineke. Onye nnupụisi ahụ n’onwe ya nke na-enupụ isi megide ọkaaka nke Jehova, bụ́ Ekwensu, ka ga-ezubesi ike ime ka e nweekwa ndị nnupụisi n’etiti agbụrụ mmadụ. Ọ́ dị kpọmkwem ihe ga-abụ ókè ihe ịga nke ọma ìgwè ndị mmụọ ọjọọ ahụ a tọhapụrụ ga-enwe, bụ nke a na-ekwughị, ma a ga-enwe ọnụ ọgụgụ zuru ezu nke mmadụ ndị na-enupụ isi ka e wee nwee ìgwè mmadụ buru ibu. Mmehie n’akụkụ mmadụ ọ bụla e kere eke, nke zuworo okè ugbu a, ga-abụ mgbe ahụ nke e chere echiche wee mee, n’ihi ya kwa ọ ga-abụ nke a ma ụma mee, nke a kpachara anya mee. Ọ ga-abụ ihe àmà nke ịhapụ ofufe nke nanị ezi Chineke ahụ na-adị ndụ na ịdịnyere akụkụ nke Setan bụ Ekwensu. (Mkpughe 20:7, 8) Otú a, n’ọnọdụ nke ndị nnupụisi ndị a, Jehova abụghị “ihe nile n’ime ihe nile.”
9. (a) Gịnị ga-eme ndị na-adịghị eguzosi ike n’ezi ihe nye Jehova Chineke? (b) Olee otú a ga-esi mee ka ógbè nke a na-adịghị ahụ anya ghara inwe ndị nnupụisi? (ch) Ọnọdụ dị aṅaa nke dị ebube ga-adị mgbe ahụ n’eluigwe na ala nile?
9 Otú ọ dị, ndị ahụ na-eguzosi ike n’ihe ga-ajụ ịnabata ịrụ ụka na nrụgide nke ndị e duhieworo, ndị na-achọ ọdịmma nke mba ha. N’alaghị azụ ọ bụla, ndị ahụ na-eguzosi ike n’ihe na-ahọrọ ikwe ka Jehova bụrụ “ihe nile n’ime ihe nile” n’ọnọdụ nke ha. Maka ikpe ziri ezi n’onwe ya, a ghaghị ime ka ọkaaka nke Jehova sie ezi ike. Dị ka ihe si na ya pụta, a ga-ebipụ ndị ahụ nile Setan kpaliri inupụ isi n’elu ala pụọ n’ịdị adị ruo ebighị ebi. Lee ka o si maa mma iwepụ ha! Ógbè a na-adịghị ahụ anya nke ihe e kere eke aghaghịkwa ịbụ nke e wepụsịrị ndị nnupụisi nile na ya. Ya mere, iji mee ka ịdị ọcha eluigwe na ala ahụ zuo òkè, a ga-ekpochapụ Setan bụ Ekwensu na ìgwè ndị mmụọ ọjọọ ya, bipụ ha n’ịdị adị. Otú a, a ga-eme ka eluigwe na ala dịrị ọcha pụọ ná ntụpọ ọ bụla nke mmehie. (Mkpughe 20:9, 10) Ịdị nsọ nke Jehova ga-ejupụta ebe nile. (Tụlee Zekaraịa 14:20.) A ga-edo aha nsọ nke Chi Kachasị Ihe Nile Elu nsọ n’eluigwe na n’ụwa. Ndị nile bi n’eluigwe na n’ụwa ga-eji ọṅụ mee uche ya kasị elu.
10. N’ụzọ ndị dị aṅaa ka elu ala ga-enwe ọdịiche ruo mgbe nile ebighị ebi nke ọ na-adịghị ụwa mbara igwe ọ bụla ọzọ ga-enwe ya?
10 Ruo ebighị ebi nile elu ala anyị ga-enwe ọdịiche nke ọ na-adịghị ụwa mbara igwe ọ bụla ọzọ nke dị n’ime mbara igwe dum nke na-enweghị nsọtụ ga-enwe, ọ bụ ezie na ọ pụrụ ịbụ na elu ala agaghị abụ nanị ụwa mbara igwe nke a ga-ebi na ya mgbe ọ bụla. N’ụzọ pụrụ iche, ọ ga-abụ ebe Jehova wepụrụ ọkaaka eluigwe na ala ya n’ụta n’ụzọ a na-adịghị arụ ụka, na-eguzobe ụkpụrụ ikpe nke eluigwe na ala na nke na-adịru ebighị ebi. Ọ ga-abụ ụwa mbara igwe nke ọ bụ na nanị ya ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha buworo “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” Ọ ga-abụ nanị ụwa mbara igwe nke Chineke zigara Ọkpara ya ọ kasị hụ n’anya ịghọ mmadụ ma nwụọ iji napụta ndị bi na ala mbara igwe ahụ pụọ ná mmehie na ọnwụ. Ọ ga-abụ nanị ụwa mbara igwe nke ọ bụ na ya ka Jehova ga-ewereworị 144,000 bi na ya ịbụ “ndị nketa nke Chineke, na ndị ha na Kraịst na-ekekọ.”—Ndị Rom 8:17.
Ndị Seraph, Ndị Cherub, Ndị Mmụọ Ozi
11, 12. (a) Ụdị mmụọ ndị dị aṅaa e kere eke ka Aịsaịa hụrụ n’ọhụụ? (b) Mmasị dị aṅaa ka ndị a nwere n’ebe anyị bụ ụmụ mmadụ nọ?
11 Chineke, Isi Iyi dị ebube nke ihe nile e kere eke, ma ndị nọ n’eluigwe ma ndị nọ n’elu ala, ga-abụ “ihe nile” nye 144,000 ndị ha na Kraịst na-ekekọ nyekwa ndị ọzọ nọ n’eluigwe. N’isi 6 nke akwụkwọ Aịsaịa, e mere ka anyị hụpete ihe na-eme n’ụlọ ikpe eluigwe. N’ebe ahụ anyị na-agụ, sị: “M wee hụ Onyenwe anyị ka ọ na-anọkwasị n’ocheeze dị elu nke e buliwokwara elu, ọnụ ọnụ ala nile nke uwe mwụda ya jupụtakwara ụlọ ukwu Chineke. Ndị seraph na-eguzo n’elu ya: nkù isii ka seraph ọ bụla n’ime ha nwere; abụọ ka o ji ekpuchi ihu ya, abụọ ka o ji ekpuchi ụkwụ ya abụọ, abụọ ka o ji efe efe. Otu wee kpọọ ibe ya òkù, sị, Nsọ, nsọ, nsọ, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha dị: ùjú ụwa nile bụ ebube ya.”—Aịsaịa 6:1-3.
12 Lee ka Aịsaịa si nwee ihu ọma ịhụ Onye ahụ kasị dịrị nsọ n’eluigwe na ala nile ka ọ na-anọkwasị n’elu ocheeze ya nke eluigwe, ebe ndị seraph dị ebube na-ejere ya ozi! Lee ọhụụ dị ebube nke ahụ bụ, na-ekpughe ọnọdụ dị elu nke ihu ọma ndị seraph a nọ na ya, n’ihi na ọ bụ Onye Kasị Dịrị Nsọ, onye ịdị nsọ ya ka ha na-ekwupụta ka ha na-agba àmà nye ịdị nsọ ya site n’imesi ya ike okpukpu atọ! Ndị seraph nwere mmasị inyere ndị na-efe Jehova aka ịdị nsọ dị ka Chineke dị nsọ.—Aịsaịa 6:5-7.
13. (a) Ụdị mmụọ ndị ọzọ dị aṅaa e kere eke ka Bible na-ekpughere anyị? (b) Olee otú e si kọwaa Jehova n’ihe banyere njikọ dị n’etiti ya na ha?
13 Dị nnọọ ka e nwere ụdị dị iche iche nke ndụ ihe e kere eke n’ebe a n’elu ala, nke bụ ihe àmà nke ike Jehova Chineke, otú a ka e nwekwara ihe ndị e kere eke nke ụdị ọzọ n’ógbè nke ndị bụ mmụọ. Bible na-ekpughe na ndị a bụ ndị cherub dị ebube, ndị ọ̀tụ̀tụ̀ ọsọ ha mgbe ha na-efe na-aghaghị ịdị ukwuu. (Abụ Ọma 18:10; tụlee Ndị Hibru 9:4, 5.) Jenesis 3:24 na-egosi na mgbe Adam na Iv mehiesịrị megide Chineke ahụ dị nsọ nke eluigwe site n’iri mkpụrụ osisi ahụ a machibidoro n’iwu, Onye Okike ahụ debere ndị cherub n’ebe ọwụwa anyanwụ nke ụzọ e si abanyeghachi na Paradaịs obi ụtọ ahụ, tinyere “ire ọkụ nke mma agha nke na-echigharị onwe ya.” A na-ekwu banyere Jehova dị ka onye “na-ebi n’etiti cherubim.” (Abụ Ọma 99:1; Aịsaịa 37:16) Otú a e gosiri ya dị ka onye ocheeze ya dị n’elu ndị cherub.
14. (a) Olee ụdị mmụọ ndị ọzọ e kere eke nke a na-agaghị elefuru anya? (b) Olee otú ha hà n’ọnụ ọgụgụ?
14 Ndị a na-agaghị eleghara anya n’etiti ìgwè ndị mmụọ e kere eke bụ ndị mmụọ ozi. Ọtụtụ nde n’ime ha dị. (Daniel 7:9, 10) N’etiti ha e nwere ndị mmụọ ozi e nyere ọrụ ijere ndị na-efe Jehova n’elu ala ozi. Jisọs dọrọ aka ná ntị na ọ dịghị onye kwesịrị ime ka onye ọ bụla n’ime ndị na-efe Jehova ofufe sụọ ngọngọ n’ihi na “ndị mmụọ ozi ha n’eluigwe na-elegide ihu Nna m nke bi n’eluigwe.” (Matiu 18:10; Ndị Hibru 1:14) N’ọgwụgwụ nke 40 ụbọchị nke ibu ọnụ Jisọs n’ọhịa na mgbe o nwesịworo mmeri n’iguzogide ọnwụnwa atọ dị ike nke Ekwensu chere ya n’ihu, lee ihe ùgwù ọ bụụrụ ndị mmụọ ozi ije ozi maka mkpa anụ ahụ nke Jisọs ahụ tasịrị ahụ na nke agụụ na-agụ!—Matiu 4:11.
15, 16. (a) Kọwaa ịdị n’otu nke yiri nke ezinụlọ nke ga-adị n’eluigwe na n’elu ala. (b) Ụgwọ ọrụ dị aṅaa nke sitere n’aka Jehova ka a ga-enye ụmụ mmadụ ndị ahụ e mere ka ha zuo okè, bụ́ ndị nwere ihe ịga nke ọma n’ịgafe ule ahụ? (ch) Olee otú Jehova ga-esi lee nnweta nke ọ ga-enweta mmezu nke nzube mbụ ya anya?
15 N’elu ebe ahụ n’ime eluigwe, ndị mmụọ ahụ dị ebube bi n’ebe ahụ ga-abụrịta ụmụnna, ebe a ga-eme n’elu ala ebe a ka ezinụlọ mmadụ zuru okè bụrịta ụmụnna ndị ikom na ụmụnna ndị inyom. Ha ga-adị n’onyinyo na oyiyi Chineke ruo n’ókè ahụ dị ukwuu nke Adam na Iv nọ ‘n’onyinyo na oyiyi’ nke Onye Okike ha, mgbe a ka kesịrị ha ọhụrụ site n’aka okike nke Jehova Chineke. (Jenesis 1:26, 27) Mgbe ụmụ mmadụ ahụ zuru òkè gafesịrị ule ikpeazụ ahụ, a ga-enye ha ikike ịdị ndụ ebighị ebi, a ga-ejikwa ịhụnanya kuchie ha dị ka “ụmụ Chineke,” na-aṅụrị ọṅụ ná nnwere onwe dị ebube, ma bụrụ akụkụ ezinụlọ dị n’otu nke Jehova n’ime eluigwe na ala.—Ndị Rom 8:21.
16 Lee aha obi ụtọ na ite egwú ọṅụ nke onwe ya dum nke Jehova Chineke ga-eji lekwasị mmezu nke nzube mbụ ya—ọrụ dị ike na-enweghị atụ nke inwe ihe nile dị ka mkpebi mbụ ya si dị—ihe nile e kere eke ịdị n’otu n’ịhụnanya a na-adịghị egbubi egbubi nke ya na ha!
17. N’ịtụle ihe a nile, ònye ga-enwe ike ịhapụ ime ihe dị aṅaa, n’ikwekọ n’okwu ndị ahụ nke onye ọbụ abụ ahụ?
17 N’ịtụle ihe a nile, ònye ga-enwe ike ịhapụ ịgọzi Chineke nke a nke Na-enwe Nzube? N’abụghị ibuli okwu ya n’ụzọ na-ekwesịghị ekwesị nye ndị e kere eke ka mmadụ ike, onye ọbụ abụ ahụ na-ekwu, sị: “Gọzienụ Jehova, ndị mmụọ ozi ya, unu ndị dike dị ike, ndị na-eme okwu ya, n’ige ntị olu nke okwu ya. Gọzienụ Jehova, usuu ndị agha ya nile; unu ndị na-ejere ya ozi, ndị na-eme ihe na-atọ ya ụtọ.”—Abụ Ọma 103:20, 21.
18. Olee otú onye ọbụ abụ ahụ si mechie akwụkwọ Abụ Ọma?
18 Onye ọbụ abụ ahụ nwere ọṅụ nke e ji ike mmụọ nsọ kpalie ji okwu agbamume ndị a mechie akwụkwọ Abụ Ọma: “Toonụ Jaa. Toonụ Chineke n’ebe nsọ ya: Toonụ ya ná mbara igwe nke ike ya. Toonụ ya n’ihi ịdị ike ya nile: Toonụ ya dị ka ịba ụba nke ịdị ukwuu ya si dị. Werenụ ọfụfụ opi ike too ya: chịrịnụ une na ụbọ akwara too ya. Werenụ egwú otiti na ite egwú too ya: Chịrịnụ ụbọ e ji akwara kwee na ọ̀já too ya: Chịrịnụ ájà nke a na-anụ nke ọma too ya: Chịrịnụ ájà nke na-adasi ụda ike too ya. Ka ihe ọ bụla nke na-eku ume too Jaa. Toonu Jaa.”—Abụ Ọma 150:1-6.
19. (a) N’ihe nkekọ dị aṅaa ka a ga-eme ka eluigwe na ala dịrị n’otu? (b) N’ụzọ bụ isi, gịnị ka ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi ga-ekwu?
19 A ga-eji ihe nkekọ nke izu okè mee ka eluigwe na ala dum dịrị n’otu ruo ebighị ebi, ihe nkekọ nke otu ofufe nke Nna nke eluigwe ahụ n’ihi na ụmụ ya hụrụ ya n’anya ma na-akwanyere ya ùgwù dị ukwuu karịa ihe nile. Ee, mgbe ahụ ọ ga-abụ na ihe nile e kere eke nke nwere ọgụgụ isi ga-ekwu, n’ụzọ bụ isi, dị ka ndị seraph ahụ kwuru, sị: “Nsọ, nsọ, nsọ, ka Jehova nke usuu nile nke ndị agha dị: ùjú ụwa nile bụ ebube ya.” Mgbe ahụ, n’ezie, Chineke nke “Onyeisi Udo” ahụ ga-abụworị “ihe nile n’ime ihe nile”—ruo mgbe nile ebighị ebi.
[Foto ndị dị na peeji nke 188, 189]
Eluigwe na ala dum ga-adị n’otu n’ofufe dị n’udo nke Ọkaaka nke Eluigwe na Ala