ISI NKE 22
“Na-efe Naanị Chineke”
IHE ISIOKWU A NA-EKWU: Icheta isi ihe akwụkwọ Ezikiel na-ekwu, otú ha si emezu n’oge a, na otú ha ga-esi emezu n’ọdịnihu
1, 2. (a) Olee ihe onye ọ bụla n’ime anyị ga-ahọrọrịrị? (b) Olee ihe otu mmụọ ozi na-erubere Chineke isi mere mgbe a chọrọ ife ya ofufe?
ONYE ọ bụla n’ime anyị ga-azarịrị ajụjụ a dị ezigbo mkpa: Ònye ka m ga-efe? Ọtụtụ ndị nwere ike ịsị na okwu gbasara ofufe na-agbagwoju ha anya nakwa na ọ na-esiri ha ike ịma okpukpe nke ha ga-ahọrọ. Ma n’eziokwu, e nweghị ihe na-agbagwoju anya n’okwu a. Ma ọ́ bụghị na anyị na-efe Jehova Chineke, ya abụrụ na anyị na-efe Setan bụ́ Ekwensu.
2 Setan chọsiri ike ka a na-efe ya. Ihe a kacha doo anya mgbe ọ nwara Jizọs ọnwụnwa. Anyị mụtara n’Isi nke 1 n’akwụkwọ a na Setan gwara Jizọs na ya ga-enye ya ihe pụrụ iche, ya bụ, ikike ịchịwa alaeze niile nke ụwa. Ma, gịnị ka ọ chọrọ ka Jizọs meere ya? Ọ gwara Jizọs, sị: “Fee m ofufe.” (Mat. 4:9) Ma, mmụọ ozi nke kpugheere Jọn onyeozi ihe ndị o dere n’akwụkwọ Mkpughe emeghị ka Setan. O kweghị ka e fee ya ofufe. (Gụọ Mkpughe 22:8, 9.) Mgbe Jọn chọrọ ife mmụọ ozi ahụ, nwa Chineke a dị umeala n’obi sịrị ya: “Emela ya!” Kama ịsị Jọn, ‘Fee m ofufe,’ ọ sịrị ya, “Na-efe naanị Chineke.”
3. (a) Gịnị ka e bu n’obi bipụta akwukwọ a? (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ya ugbu a?
3 Ihe e bu n’obi bipụta akwụkwọ a bụ iji mee ka anyị kpebisikwuo ike na anyị ga na-eme ihe mmụọ ozi ahụ kwuru, ya bụ, ife naanị Jehova Chineke. (Diut. 10:20; Mat. 4:10) Ka anyị buru ụzọ chetara onwe anyị ihe anyị mụtara gbasara ife Chineke ezigbo ofufe n’amụma ndị Ezikiel buru nakwa n’ọhụụ ndị ọ hụrụ. E mechaa, anyị ejirizie Akwụkwọ Nsọ hụ ihe ga-eme n’ọdịnihu mgbe a ga-ele onye ọ bụla nọ n’ụwa ule ikpeazụ. Ọ bụ ule a ga-eme ka a mata onye ga-anọ hụ mgbe a ga-amaliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe otú ọ chọrọ ka e si na-efe ya ruo mgbe ebighị ebi.
Isi Ihe Atọ E Kwuru n’Akwụkwọ Ezikiel
4. Olee isi ihe atọ e kwuru n’akwụkwọ Ezikiel?
4 Akwụkwọ Ezikiel kụziiri anyị na ife Chineke ezigbo ofufe abụghị ihe a na-eme iji mezuo iwu. Kama, ọ pụtara (1) na anyị ga na-efe naanị Jehova, (2) na anyị na ụmụnna anyị ga-adị n’otu ka anyị na-efe Jehova otú ọ chọrọ, nakwa (3) na anyị ga na-egosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya. Ka anyị hụ otú amụma na ọhụụ ndị anyị lebara anya n’akwụkwọ a si mee ka isi ihe atọ a doo anya.
Isi ihe nke mbụ: Na-efe naanị Jehova
5-9. Gịnị ka anyị mụtara gbasara ife naanị Jehova?
5 Isi nke 3:a Ezikiel hụrụ ọhụụ dị ịtụnanya. N’ọhụụ ahụ, eke na egwurugwu gbara Jehova gburugburu, Jehova nọkwa n’elu ndị mmụọ ozi ya dị ike. Ọhụụ a na-akụziri anyị otu eziokwu gbara ọkpụrụkpụ, ya bụ, na ọ bụ naanị Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ka anyị kwesịrị ife ofufe.—Ezik. 1:4, 15-28.
6 Isi nke 5: Ọ wụrụ anyị akpata oyi n’ahụ́ mgbe anyị mụrụ gbasara ọhụụ nke kwuru otú e si metọọ ụlọ nsọ Jehova. Ọhụụ ahụ gosiri na e nweghị ihe e nwere ike izoro Jehova. Ọ na-ahụ mgbe ndị na-efe ya nupụụrụ ya isi, dị ka mgbe ha hapụrụ ya fewe arụsị, ọ bụrụgodị na mmadụ ahụghị ha. Ụdị omume a na-ewe ya iwe, ọ na-atakwa ndị na-eme ya ahụhụ.—Ezik. 8:1-18.
7 Isi nke 7: Ikpe a mara mba ndị gbara ndị Izrel gburugburu, bụ́ ndị ‘kwara ndị Izrel ezigbo emo,’ gosiri na Jehova ga-eme ka ndị na-emesi ndị ya ike taa ahụhụ. (Ezik. 25:6) Otú ndị Izrel na mba ndị ahụ si mekọọ ihe kụzikwaara anyị na ihe kwesịrị ịkacha anyị mkpa bụ irubere Jehova isi. Anyị ekwesịghị ịhapụ ime ihe Jehova chọrọ maka na anyị chọrọ ka anyị na ndị ikwu anyị na-anaghị efe ya dị ná mma. Anyị ekwesịghịkwa ịtụkwasị akụnụba obi ma ọ bụ na-erubere ọchịchị ụmụ mmadụ isi kama irubere Jehova isi. Ime otú ahụ ga-egosi na anyị adịghị iche n’ụwa.
8 Isi nke 13 na nke 14: Ọhụụ ụlọ nsọ Ezikiel hụrụ, nke dị n’elu ugwu dị nnọọ elu, na-akụziri anyị na anyị kwesịrị ịna-efe Jehova otú o kwuru ka e si na-efe ya, kwetakwa na ọ ka chi niile ọzọ.—Ezik. 40:1–48:35.
9 Isi nke 15: E kwuru na ndị Izrel na ndị Juda dị ka ndị akwụna. Ihe a na-echetara anyị na mmadụ ịhapụ Jehova gaa fewe arụsị jọgburu onwe ya n’anya Jehova.—Ezik., isi 16 na 23.
Isi ihe nke abụọ: Anyị na ụmụnna anyị kwesịrị ịdị n’otu ka anyị na-efe Jehova otú ọ chọrọ
10-14. Olee otú e si mee ka o doo anya na anyị na ụmụnna anyị kwesịrị ịdị n’otu ka anyị na-efe Jehova ezigbo ofufe?
10 Isi nke 8: Amụma ndị kwere nkwa na Jehova ga-ahọpụta onye “ga na-azụ” ndị ya ka atụrụ na-akụziri anyị na anyị na ụmụnna anyị kwesịrị ịdị n’otu, dịrị n’udo ma na-arụkọ ọrụ ọnụ ka Jizọs na-edu anyị.—Ezik. 34:23, 24; 37:24-28.
11 Isi nke 9: Ndị chọrọ ime ihe dị Jehova mma taa ga-amụta ezigbo ihe n’amụma ndị Ezikiel buru gbasara ntọhapụ e si na Babịlọn tọhapụ ndị Chineke, ha alaghachi n’obodo ha. Ndị na-efe Jehova ezigbo ofufe kwesịrị isepụ aka n’ihe ọ bụla gbasara okpukpe ụgha, e kwesịghịkwa inwe ihe ga na-ejikọ ha na okpukpe ụgha. Ndị na-efe Chineke kwesịrị ịdị n’otu n’agbanyeghị okpukpe dị iche iche ha na-ekpebu ma ọ bụ ebe dị iche iche ha si, ma hà nwere ego ma hà dara ogbenye. E ji ịdị n’otu a amata na anyị bụ ndị Chineke.—Ezik. 11:17, 18; 12:24; Jọn 17:20-23.
12 Isi nke 10: Ọhụụ Ezikiel hụrụ ọkpụkpụ kpọrọ nkụ, bụ́ ndị mechara dị ndụ, gosiri na ndị Chineke kwesịrị ịdị n’otu. Ọ bụ ezigbo ihe ọma ka Jehova meere anyị kwe ka anyị soro ná ndị agha na-arụkọ ọrụ ọnụ, ndị e mere ka ha maliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe.—Ezik. 37:1-14.
13 Isi nke 12: Ọ bụ amụma e buru gbasara osisi abụọ bụzi otu osisi kacha gosi na ịdị n’otu dị ezigbo mkpa. Ịhụ otú amụma a si emezu n’isi ndị e tere mmanụ na atụrụ ọzọ na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike. N’agbanyeghị na okpukpe na òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị iche iche emeela ka ndị mmadụ kpọọ ibe ha asị ma ghara ịdị n’otu, ịhụnanya na-eme ka anyị dịrị n’otu, anyị anaghịkwa agbakụta ibe anyị azụ.—Ezik. 37:15-23.
14 Isi nke 16: E ji ọhụụ nwoke ji mpi ịnk odeakwụkwọ na ụmụ nwoke ndị ji ngwá ọgụ ha ji akụgbu mmadụ dọọ anyị aka ná ntị na ọ bụ naanị ndị na-efe Chineke ezigbo ofufe tupu oké mkpagbu amalite ka a ga-aka akara ka a zọpụta.—Mat. 24:21; Ezik. 9:1-11.
Isi ihe nke atọ: Anyị ga na-egosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya
15-18. Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-egosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya, oleekwa otú anyị ga-esi na-eme ya?
15 Isi nke 4: Ezikiel hụrụ ndị mmụọ ozi anọ n’ọhụụ. Ọhụụ a kụziiri anyị àgwà ndị e ji mara Jehova. Nke kachanụ n’ime ha bụ ịhụnanya. Ọ bụrụ na ihe anyị na-ekwu na àgwà anyị na-akpa na-egosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya, anyị na-egosi na Jehova bụ Chineke anyị.—Ezik. 1:5-14; 1 Jọn 4:8.
16 Isi nke 6 na nke 11: Ọ bụ maka na Chineke hụrụ ụmụ mmadụ n’anya mere o ji họpụta ndị nche, dị ka Ezikiel. Ebe ọ bụ na Chineke bụ ịhụnanya, ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla mgbe ọ ga-eme ka Setan kwụsị ịchị ụwa a. (2 Pita 3:9) Chineke meere anyị ihe ọma kwe ka anyị na-ahụ ndị ọzọ n’anya ka ya. Otu ụzọ anyị si eme ya bụ ịna-akwado ọrụ ohu ahụ na-arụ ọrụ nche n’oge anyị a na-arụ.—Ezik. 33:1-9.
17 Isi nke 17 na nke 18: Jehova ma na ọtụtụ ndị agaghị anabata ebere ọ na-emere ụmụ mmadụ, ha ga-agbalịkwa ka ha kpochapụ ndị na-efe ya ezigbo ofufe. Ma, ịhụnanya ga-eme ka Jehova gbachitere ndị ya mgbe “Gọg bụ́ onye Megọg” ga-alụso ndị ji obi ha niile na-efe ya ọgụ. Ịhụnanya ga-emekwa ka anyị na-agwa mmadụ niile anyị nwere ike ịgwa na Jehova ga-ebibi ndị na-emegide ndị ya.—Ezik. 38:1–39:20; 2 Tesa. 1:6, 7.
18 Isi nke 19, 20, na nke 21: N’ọhụụ, Ezikiel hụrụ iyi nke mmiri ya na-enye ndụ nakwa ala a ga-ekere ndị Chineke. Jehova ji ọhụụ ndị ahụ mee ka o doo anya na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya. Ọhụụ ndị ahụ kọwara uru ndị mmadụ ga-erite n’ihe Jehova mere nke kacha gosi na ọ hụrụ ụmụ mmadụ n’anya, ya bụ, ikwe ka Ọkpara ya nwụọ ka e wee gbaghara anyị mmehie anyị, mee ka anyị zuo okè, anyị esorokwa n’ezinụlọ Chineke. Otu n’ime ụzọ kacha mma anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya bụ ịgwa ha banyere ihe ọma Jehova ga-emere ndị nwere okwukwe n’Ọkpara ya n’ọdịnihu.—Ezik. 45:1-7; 47:1–48:35; Mkpu. 21:1-4; 22:17.
Ná Ngwụcha Otu Puku Afọ, Jizọs na Ndị So Ya Chịa Ga-egosi na Ha Dị Umeala n’Obi
19. Gịnị ka Jizọs ga-eme mgbe ọ ga-achịwa ọchịchị otu puku afọ? (Gụọ igbe isiokwu ya bụ “Ihe Ga-eme n’Ule Ikpeazụ.”)
19 Mgbe Jizọs ga-achịwa ọchịchị otu puku afọ, ọ ga-akpọlite ijeri ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ, meekwa ka obi mgbawa “onye iro,” bụ́ ọnwụ, kpatara laa. (1 Kọr. 15:26; Mak 5:38-42; Ọrụ 24:15) Kemgbe Adam na Iv mehiere, ndị mmadụ na-atagbu onwe ha n’ahụhụ, na-anwụkwa anwụ. Ma Jizọs ga-eme ka ihe niile na-akpata obi ọjọọ kwụsị mgbe ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, mee ka ha nwee ike ịdị ndụ n’ụwa otú Chineke bu n’obi kee mmadụ. N’ihi àjà mgbapụta ahụ, Jizọs ga-eme ka ọrịa, agha, na ụkọ nri nakwa nsogbu niile ha kpatara kwụsị. Nke ka nke bụ na ọ ga-enyere anyị aka wepụ isi ihe na-akpatara anyị nsogbu, ya bụ, mmehie anyị ketara n’aka Adam. (Rom 5:18, 19) Jizọs ‘ga-ebibi ọrụ Ekwensu’ kpamkpam. (1 Jọn 3:8) Gịnị ga-emezi?
Ndị a ga-akpọlite n’ọnwụ ga-adị ndụ otú Chineke bu n’obi mgbe o kere mmadụ
20. Olee otú Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ ga-esi gosi na ha dị ezigbo umeala n’obi? (Lee ihe e sere ná mmalite isiokwu a.)
20 Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:24-28. Mgbe mmadụ niile ga-ezu okè, e meekwa ka ụwa niile bụrụ paradaịs otú Jehova bu n’obi mgbe o kere mmadụ, Jizọs na otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ (144,000) ga-egosi na ha dị ezigbo umeala n’obi. Ha ga-enyefe Alaeze Chineke n’aka Jehova. Ha ga-eji obi ha niile nyefee Jehova ikike ha nwere kemgbe otu puku afọ. Ihe niile Alaeze ahụ meere ndị mmadụ ga-adịru mgbe ebighị ebi.
Ule Ikpeazụ
21, 22. (a) Olee otú ụwa ga-adị mgbe otu puku afọ ahụ gwụchara? (b) Gịnị mere Jehova ga-eji tọhapụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya?
21 Jehova ga-emezi ihe gosiri na ọ tụkwasịrị ụmụ mmadụ obi. Ọ ga-enye iwu ka e si n’abis tọhapụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ, bụ́ ebe a tụrụ ha mkpọrọ kemgbe otu puku afọ. (Gụọ Mkpughe 20:1-3.) Otú ụwa ga-adị mgbe ahụ na ndị mmadụ ha ga-ahụ ga-adị ezigbo iche ná ndị nke ha mabu. Tupu Amagedọn, Setan nọ na-eduhie ọtụtụ mmadụ, ịkpọasị na ịkpa ókè mere ka ndị mmadụ ghara ịdị n’otu. (Mkpu. 12:9) Ma mgbe otu puku afọ ahụ ga-agwụcha, mmadụ niile ga na-efe Jehova, bụrụkwa otu ezinụlọ hụrụ ibe ha n’anya. Ụwa niile ga-abụzi paradaịs, nke udo dị na ya.
22 Gịnị mere Jehova ga-eji tọhapụ ndị omekome ahụ, bụ́ Setan na ndị mmụọ ọjọọ, ma kwe ka ha bata n’ụwa a mara ezigbo mma? Ọ bụ n’ihi na ọnwụnwa abịabereghị ọtụtụ n’ime ndị ga-ebi n’ụwa mgbe otu puku afọ ahụ gwụchara ka a mata ma hà ji obi ha niile na-efe Jehova. Ọtụtụ n’ime ha nwụrụ mgbe ha na-amatabeghị Jehova, a kpọlite ha na paradaịs. Jehova nyere ha ndụ, gbooro ha mkpa ha niile, meekwa ka ha na ya dịrị ná mma. Ọ bụ naanị ha na ndị na-eme ihe dị mma nọ. E nweghị ihe ọjọọ ha na-ahụ. Ọ bụ ndị hụrụ Jehova n’anya ma na-efe ya gbara ha gburugburu. Setan nwere ike ibo ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ ebubo ahụ o boro Job, ya bụ, na ha na-efe Chineke maka na ọ na-echebe ha ma na-agọzi ha. (Job 1:9, 10) N’ihi ya, tupu Jehova edee aha anyị n’akwụkwọ nke ndụ otú a na-agaghị ehichapụ ya ehichapụ, ọ ga-enye anyị ohere ka anyị gosi nke ọma na anyị ji obi anyị niile na-efe ya, bụ́ Nna na Ọkaakaa anyị.—Mkpu. 20:12, 15.
23. Olee ọnwụnwa nwere ike ịbịara onye ọ bụla n’ime anyị?
23 A ga-enye Setan obere oge ka o lee ma ọ̀ ga-eme ka ndị mmadụ kwụsị ife Chineke. Olee ihe ọ ga-eji nwaa ndị mmadụ ọnwụnwa? Ọ ga-abụ ụdị ihe o ji nwaa Adam na Iv ka ọ ga-ejikwa anwa mmadụ niile. Ọ ga-anwa anyị ka a mara ma ànyị ga-efe Chineke ofufe, soro ntụziaka ya ma na-akwado ọchịchị ya, ka ànyị ga-enupụrụ Chineke isi ma na-akwado Setan.
24. Gịnị mere e ji kpọọ ndị ga-enupụ isi Gọg na Megọg?
24 Gụọ Mkpughe 20:7-10. A kpọrọ ndị ga-enupụ isi ma otu puku afọ ahụ gwụchaa Gọg na Megọg. Ha ga-akpa àgwà ndị yiri nke ndị nnupụisi Ezikiel buru n’amụma na ha ga-alụso ndị Chineke ọgụ n’oge oké mkpagbu. Ezikiel kpọrọ ha “Gọg bụ́ onye Megọg.” Ha si ná mba dị iche iche, ha megidekwara ọchịchị Jehova. (Ezik. 38:2) A kpọkwara ndị ga-enupụ isi ma Kraịst chịchaa otu puku afọ “mba” dị iche iche. Ihe a a kpọrọ ha dabara adaba. Maka gịnị? Ọ bụ maka na n’ọchịchị otu puku afọ ahụ, a gaghịzi ekewa ndị mmadụ ná mba ná mba. Ọ bụ otu ọchịchị, ya bụ, Alaeze Chineke, ga na-achị mmadụ niile. Anyị niile ga-abụ otu mba na-efe Chineke. Ebe ọ bụ na a kpọrọ ndị ahụ ga-enupụ isi Gọg na Megọg, sịkwa na ha bụ “mba” dị iche iche, amụma ahụ na-egosi na Setan ga-emeli ka ụfọdụ n’ime ndị na-efe Chineke kewaa. E nweghị onye a ga-amanye amanye ka ọ kwado Setan. Onye ọ bụla n’ime ndị ahụ zuru okè ga-eji aka ya kpebie ihe ọ chọrọ ime.
A kpọrọ ndị ga-enụpuru Chineke isi Gọg na Megọg (A ga-akọwa ya na paragraf nke 24)
25, 26. Mmadụ ole ga-esoro Setan? Gịnị ga-emekwa ha?
25 Mmadụ ole ga-esoro Setan? Ndị ga-enupụ isi ga-adị “ọtụtụ ka ájá dị n’oké osimiri.” Ma, ọ pụtaghị na ụmụ mmadụ ndị ga-enupụrụ Chineke isi ga-adị ezigbo ọtụtụ. Olee otú anyị si mara? Ì chetara nkwa Jehova kwere Ebreham? Ọ sịrị na ụmụ Ebreham ga-adị ọtụtụ “ka ájá dị n’ụsọ oké osimiri.” (Jen. 22:17, 18) Ma, ndị bụ́ ụmụ Ebreham dị otu narị puku na puku iri anọ na puku anọ na otu (144,001). (Gal. 3:16, 29) Ọ bụ eziokwu na ha dịtụ ọtụtụ, ma ha dị ole na ole ma e jiri ha tụnyere mmadụ ole bi n’ụwa. N’ihi ya, ndị ga-esonyere Setan nwekwara ike ịdị ọtụtụ, ma ha agaghị akarị akarị. Ndị nnupụisi ahụ agaghị ebibili ndị ji obi ha niile na-efe Jehova.
26 A ga-ebibi ndị niile sooro Ekwensu nupụrụ Chineke isi ngwa ngwa. Ha na Setan na ndị mmụọ ọjọọ agaghịzi adị ndụ, ha agaghịkwa enwe olileanya ịdị ndụ ọzọ. Naanị ihe a ga na-echeta ruo mgbe ebighị ebi bụ ihe ọjọọ ha kpebiri ime nakwa nsogbu ọ kpataara ha.—Mkpu. 20:10.
27-29. Gịnị ka Chineke ga-emere ndị Ekwensu na-enwetaghị n’ule ikpeazụ?
27 Ma a ga-ede aha ndị nke Ekwensu na-enwetaghị n’ule ikpeazụ “n’akwụkwọ nke ndụ,” a gaghịkwa ehichapụ aha ha na ya. (Mkpu. 20:15) Ndị niile hụrụ Jehova n’anya, ma ụmụ nwoke ma ụmụ nwaanyị, ga-abụzi otu ezinụlọ nke ga na-efe Jehova, bụ́ Onye e kwesịrị ife ofufe.
28 Chegodị otú ihe ga-adị mgbe ahụ. Ọrụ ị ga na-arụ bụ ọrụ ga na-eme gị obi ụtọ, ị ga-enwekwa ọtụtụ ezigbo ndị enyi. Ma gị ma ndị ị hụrụ n’anya agaghịzi ata ahụhụ. Ị ga-abụzi onye ezi omume n’anya Chineke na onye na-anaghị eme mmehie, ọ bụghị n’ihi àjà mgbapụta ahụ, kama n’ihi na i zuola okè. Mmadụ niile ga-abụzi ndị enyi Chineke. Nke ka nke bụ na a ga na-efe Chineke ezigbo ofufe ma n’eluigwe ma n’ụwa otú ọ chọrọ ka e si na-efe ya. Ọ bụ mgbe ahụ ka a ga-amaliteghachi ife Jehova ezigbo ofufe otú a na-emetụbeghị.
Mgbe ị ga-ezu okè, ị ga-abụzi onye ezi omume n’anya Chineke na onye na-anaghị eme mmehie, ọ bụghị n’ihi àjà mgbapụta ahụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 28)
29 Ị̀ ga-anọ ndụ hụ mgbe ihe a ga-eme? Ị ga-anọ ya ma ọ bụrụ na ị na-eme isi ihe atọ anyị mụtara n’akwụkwọ Ezikiel, ya bụ, ịna-efe naanị Jehova, gị na ụmụnna gị ịdị n’otu ka ị na-efe Jehova otú ọ chọrọ, nakwa ịna-egosi na ị hụrụ ndị ọzọ n’anya. E nwere ihe ikpeazụ gbara ọkpụrụkpụ anyị mụtakwara n’akwụkwọ Ezikiel. Gịnị ka ọ bụ?
Chegodị otú obi ga-esi atọ anyị ụtọ mgbe ndị niile nọ n’eluigwe nakwa n’ụwa ga na-efe Chineke ezigbo ofufe (A ga-akọwa ya na paragraf nke 27-29)
“Ha Ga-amara na M Bụ Jehova”
30, 31. Jehova kwuru, sị: “Ha ga-amara na m bụ Jehova.” Gịni ka ihe a o kwuru ga-apụtara (a) ndị iro ya? (b) ndị na-efe ya?
30 N’akwụkwọ Ezikiel, Jehova kwuru ugboro ugboro, sị: “Ha ga-amara na m bụ Jehova.” (Ezik. 6:10; 39:28) Ihe a Jehova kwuru pụtara na ọ ga-alụso ndị iro ya agha, bibiekwa ha. Ọ bụghị naanị na ha ga-ekweta n’ike na Jehova dị adị, ha ga-amatakwa na aha ya nke dị ebube pụtara “Ọ Na-eme Ka Ọ Bụrụ.” “Jehova nke ụsụụ ndị agha” ga-abụ “onye agha dị ike.” Ọ ga-alụso ha agha. (1 Sam. 17:45; Ọpụ. 15:3) Ha ga-aghọtazi otu eziokwu dị mkpa gbasara Jehova, ya bụ, na e nweghị ihe ga-egbochili ya imezu ihe o bu n’obi. Ma, mgbe ha ga-aghọta ihe a, oge agwụla.
31 Ma, ihe ahụ Jehova kwuru, ya bụ, “ha ga-amara na m bụ Jehova,” ga-abụrụ ndị na-efe ya ozi ọma. Ọ pụtara na ha ga-adị ndụ, ihe adịkwara ha ná mma. Jehova ga-eme ka anyị bụrụ ihe o bu n’obi mgbe o kere mmadụ, ya bụ, ụmụ ya ndị nwoke na ndị nwaanyị, ndị zuru okè, ndị na-akpakwa àgwà ka ya. (Jen. 1:26) Jehova bụ Nna anyị hụrụ anyị n’anya, bụrụkwa Onye na-azụ anyị ka atụrụ ma na-echebe anyị. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-abụ Eze anyị nke ga-emeri n’agha. Ma tupu oge ahụ eruo, ka anyị na-echeta ihe anyị mụtara n’akwụkwọ Ezikiel. Ka anyị si n’ihe anyị na-ekwu na ihe anyị na-eme na-egosi na anyị ma onye Jehova bụ, marakwa ụdị Chineke ọ bụ. Anyị mee ya, mgbe oké mkpagbu ga-ebido ịkpa mkpamkpa, anyị agaghị atụ egwu. Kama ịtụ egwu, obi ga-esi anyị ike n’ihi na anyị ma na oge Chineke ga-anapụta anyị eruola nso. (Luk 21:28) Ka ọ dị ugbu a, ka anyị nyere ndị mmadụ n’ụwa niile aka ka ha mara Chineke ma hụ ya n’anya, bụ́ Onye e kwesịrị ife naanị ya ofufe, Onye aha ya, bụ́ Jehova, kacha aha niile.—Ezik. 28:26.
a Ọ bụ isi akwụkwọ ndị dị n’akwụkwọ a ka a na-ekwu.