Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w97 11/1 p. 4-7
  • Ịdị n’Otu Ụwa—Olee Otú Ọ Ga-esi Dịrị?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịdị n’Otu Ụwa—Olee Otú Ọ Ga-esi Dịrị?
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Ịgba Egwú n’Akụkụ Ili’
  • Ike Na-abụghị nke Mmadụ Nọ n’Ọrụ
  • Ọchịchị Ụwa
  • Ndị Dị n’Otu Sitere ná Mba Nile
  • Olee Ebe Ụwa Na-eche Ihu?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2005
  • Ụwa Ọ̀ Ga-adị n’Otu?
    Teta!—2000
  • “Udo nke Ọ Ga-enye Agaghị Enwe Njedebe”
    Teta!—2019
  • Ụwa Ga-aghọ Paradaịs n’Oge Na-adịghị Anya!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2008
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1997
w97 11/1 p. 4-7

Ịdị n’Otu Ụwa—Olee Otú Ọ Ga-esi Dịrị?

DỊ KA ụlọ dakpọrọ adakpọ nke ndị obibi ya nwere omume ọ gbasara m bibisịrị nke ukwuu, usoro ihe nke ụwa dị ugbu a kwesịrị nanị otu ihe—nkụda na ndochi. Nke a abụghị nnọọ echiche ọzọ nke mbibi na enweghị olileanya. Dị ka Bible si kwuo, ọ bụ nanị echiche ziri ezi e nwere. N’ihi gịnị?

Ntọala nke usoro ihe ụwa nke oge a dị ize ndụ. Ọdịdị ya dum jupụtara n’àkị́kà na ụ́tụ́ na-agba osisi. Ide ígwè ya na-ata nchara. Mgbidi ndị na-akwado ya esikwaghị ike. Elu ya na-ada ada. Paịpụ mmiri ya na-ehi ehi. Usoro ọkụ elektrik ya adịghị mma, ọ dịkwa ize ndụ. Ndị bi n’ime ya na-alụ ọgụ n’akwụsịghị akwụsị ma jiri obi ọjọọ na-akpata mbibi n’ụlọ ahụ nile. Ihe owuwu ahụ dum na gburugburu ya jupụtara n’anụ ndị na-ebibi ihe ma nweekwa ike ịkpata ọnwụ na oké mmerụ ahụ.

‘Ịgba Egwú n’Akụkụ Ili’

N’ihi esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-adịghị akwụsị akwụsị, anyaukwu, ọgụ, na ịkpọasị agbụrụ na ebo gbamiri mkpọrọgwụ, “agbụrụ nile nke mmadụ,” dị ka Gwynne Dyer si tinye ya, “na-agba egwú n’akụkụ ili.” N’ụwa nile, ìgwè ndị ka nta obi siri ike—òtù nrụgide, ndị agha nnwere onwe, òtù ndị mpụ, ndị na-eyi ndị mmadụ egwu n’ụwa nile, na ndị ọzọ—na-achụso ihe omume ọdịmma onwe ha nanị, yiekwa ndị nwere ike imebi olileanya ọ bụla maka udo n’ụwa mgbe ọ masịrị ha. Dị ka ndị obibi na-akpaghasị ihe, ha pụrụ ime ka ndụ siere onye ọ bụla ọzọ ike.

Otú ọ dị, dị ka ọtụtụ ndị na-akọwa ihe na-ekwu, ọ bụghị òtù ndị ekweghị ekwe ma ọ bụ ndị isi ike nanị na-egbochi ịdị n’otu ụwa. Ihe mgbochi kasị ukwuu bụ mba ndị kwụụrụ onwe ha. Mba ndị kwụụrụ onwe ha, ka onye na-ede ihe banyere agha bụ́ S. B. Payne, Jr., na-ekwu, nọ “n’ọnọdụ enweghị ọchịchị n’ụwa nile.” Ha na-eme ihe ọ bụla bụ maka ọdịmma kasịnụ nke mba ha, na-adịghị echebatụrụ ndị ọzọ echiche. N’ihi ya, n’akụkọ ihe mere eme nile “mmadụ nwere ike n’ahụ mmadụ ibe ya imejọ ya.”—Eklisiastis 8:9.

N’eziokwu, gọọmenti mba ụfọdụ enwetatụwo ihe ịga nke ọma n’ịlụso ikpe na-ezighị ezi na mmegbu ọgụ n’ókèala ha nakwa, ruo n’ókè ụfọdụ, n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ. Ha eguzobewo ọ̀tụ̀tụ̀ nke ịdị n’otu zuru ụwa ọnụ site n’oge ruo n’oge. Ma ọbụna mgbe ndị ụfọdụ jikọworo aka ime ihe megide mba na-eme mwakpo, a na-anọgide na-enyo ha enyo na ha mere ihe site n’ọdịmma onwe ha kama ịbụ n’ihi ezigbo ịchọ ọdịmma ndị ọzọ. Eziokwu dị na ya bụ na gọọmenti ụmụ mmadụ enweghị ọgwụgwọ zuru ezu, nke na-adịgide adịgide nye adịghị n’otu ụwa. Gwynne Dyer na-akọwa: “Echiche nke na mba nile nke ụwa ga-ejikọ aka ọnụ iji gbochie ma ọ bụ nye ahụhụ maka mwakpo sitere n’aka mba kwụụrụ onwe ya dị mma n’ụkpụrụ, ma ònye ga-akọwa onye mwakpo, ònye kwa ga-akwụ ụgwọ ego na ndụ bụ́ ndị pụrụ ịdị mkpa iji mee ka ọ kwụsị?”

N’ezie, otu mba ịwakpo mba ọzọ ga-ekwe omume nanị mgbe ihe ka ọtụtụ n’ụmụ amaala ya na-emegideghị mwakpo ahụ. Akụkọ ihe mere eme na-egosi ugboro ugboro na ọ bụghị nanị ná “mba kwụụrụ onwe ya” ka ụmụ amaala kwadoworo ndị ndú ha, ma ò ziri ezi ma o zighị ezi. N’ezie, ihe ka ọtụtụ ná ndị bi n’ụwa emewo nke a. Ha agbasowo “ụgha, okwu nrafu na okwu nduhie” n’ìsì, dị ka magazin bụ́ Time si tinye ya, bụ́ ndị sitere n’ọnụ ọtụtụ ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị na okpukpe.

Ịhụ mba n’anya akpaliwo mmetụta nke ndị gaara abụ ndị nwere ezi uche na ọmịiko, o mewokwa ka ha kpaa ajọ arụ megide ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka nke mba ọzọ. Dị ka ihe atụ, n’izo aka n’Agha Ụwa Mbụ, ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ J. M. Roberts na-asị: “Otu n’ime eziokwu yiri ụgha nke 1914 bụ na ná mba ọ bụla ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke ndị mmadụ, n’òtù nile, ụkpụrụ okwukwe na usoro ọmụmụ, n’ụzọ na-eju anya, yiri ka ha ejiriwo obi ha nile gaa agha n’obi ụtọ.” Ndị mmadụ hà amụtawo ihe kemgbe ahụ? Ee e! Anụ ọhịa ahụ bụ́ “ịhụ mba n’anya kpuru ìsì,” dị ka odeakụkọ bụ́ Rod Usher kpọrọ ya, nọgidere na-emebi ohere ọ bụla maka ịdị n’otu ụwa.

Ike Na-abụghị nke Mmadụ Nọ n’Ọrụ

Otú ọ dị, e nwere ihe mgbochi ka ukwuu nye ịdị n’otu ụwa. Bible na-ekpughe na ike ndị na-abụghị nke mmadụ nọ n’ọrụ. A matara ndị a dị ka Setan Ekwensu na ndị na-eso ụzọ ya, ndị mmụọ ọjọọ. Dị ka Bible si kwuo, Setan bụ “chi nke oge a [onye] mere ka anya nke uche nke ndị na-ekweghị ekwe kpuo ìsì,” nke na “inye ìhè nke ozi ọma nke ebube Kraịst” adịghị enwe mmetụta n’ahụ ha.—2 Ndị Kọrint 4:4; Mkpughe 12:9.

Otú ọ dị, nke a adịghị atọhapụ ndị mmadụ n’ajụjụ ha ga-aza maka omume ha. Ma ọ na-akọwa ihe mere ọchịchị mmadụ ji na-apụghị iguzobe ụwa dị n’otu n’ezie ma ọlị. Ruo ogologo oge Setan Ekwensu nọgidere na-adị, ọ ga-eme ka ndị ikom na ndị inyom zụlite ihe Bible na-akpọ “ọrụ nile nke anụ ahụ,” na-agụnye ‘ibu iro, esemokwu, ịkpa iche iche, na nkewa.’—Ndị Galetia 5:19-21.

Ọchịchị Ụwa

Gịnịzi bụ ngwọta ya? Ihe dị ka narị afọ asaa gara aga, onye Itali a ma nke ọma na-ede uri na ọkà ihe ọmụma, bụ́ Dante, tụrụ aka n’azịza ya. Ọ rụrụ ụka na nanị ọchịchị ụwa pụrụ ime ka e jide udo na ịdị n’otu ihe a kpọrọ mmadụ n’aka. Nye ọtụtụ ndị, olileanya nke ụdị ọ bụla nke ọchịchị ụwa bụ nanị ihe mmegharị anya, ọ bụghị ihe a ga-atụkwasị ezi obi. “Ọchịchị ụwa,” ka Payne na-ede akwụkwọ bụ́ onye a kpọburu aha na-ekwubi, “apụghị ime eme n’oge a n’akụkọ ihe mere eme.” N’ihi gịnị? N’ihi na ọchịchị ụwa ọ bụla nwere ihe ịga nke ọma ga-ahụ na e nwere ihe abụọ nke yiri ihe kagbunyụrụ ikike mmadụ anya, ya bụ na “ọchịchị ụwa ga-akwụsị agha nakwa na ọchịchị ụwa agaghị abụ ọchịchị aka ike zuru ụwa ọnụ.”

O doro anya na ọ dịghị ọchịchị mmadụ ga-eruli ihe ọ̀tụ̀tụ̀ a. Otú ọ dị, Alaeze Chineke n’aka Jisọs Kraịst pụrụ, ọ ga-ewepụkwa agha. (Abụ Ọma 46:9, 10; Matiu 6:10) N’ezie, ọ ga-ewepụ ndị nile na-akpali agha. Daniel onye amụma na-egosi na n’ọgwụgwụ nke oge Chineke kara aka maka mmadụ ịchị ụwa, ịchịisi mmadụ ga-abụ ihe “e kewara ekewa” dị ka ‘ígwè a gwakọtara ya na ụrọ apịtị.’ (Daniel 2:41-43) Nke a ga-arụpụta nkewasị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na esemokwu a na-apụghị izere ezere. Ma, Daniel na-ekwu na Alaeze Chineke “ga-etipịa alaeze ndị a nile [nke mba dị iche iche ndị na-adịghị n’otu],” ma ọ bụ ọchịchị, “mee ka ha gwụsịa,” na-eji Alaeze a nọworo na-eche eri ogologo oge nke dị n’aka Jisọs Kraịst dochie ha.—Daniel 2:44.

Ọ gaghị aba uru imepụta ọnọdụ ọma maka ndị mmadụ ma ọ bụrụ na ndị omekome nọgideworo na-eme ka ndụ siere ndị ọzọ ike anọgide na-ebi n’ụwa. Otú ọ dị, “a ga-ebipụ ndị na-eme ihe ọjọọ.” (Abụ Ọma 37:1, 2, 9, 38; Ilu 2:22) Ya mere, Kraịst ga-ewepụ ndị nile ma ụma na-ajụ ụkpụrụ Chineke ma ọ bụ ndị na-akwado ịchịisi ụwa ndị na-akpaghasị ihe. Ọ ga-ebibi ndị nile na-emetọ mbara ụwa a. Chineke na-ekwe nkwa “imebi ndị ahụ na-emebi ụwa.”—Mkpughe 11:18.

Nke a agaghị abụ ihe dị ka ọchịchị aka ike zuru ụwa ọnụ. Jisọs Kraịst ga-eme ihe ‘n’eziokwu na umeala n’obi na ezi omume’ mgbe ọ ga-ekewapụ ndị ọma site ná ndị ọjọọ. (Abụ Ọma 45:3, 4; Matiu 25:31-33) Nke a agaghịkwa abụ nanị ihe na-ezighị ezi ma na-ebibi ihe, iji ike eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi. Ee e! Ọ bụghị dị ka a ga-asị na otu onye na-arụ ụlọ bụ́ onye anyaukwu na-aga ibibi otu ụlọ ochie mara mma. Ọ ga-adị nnọọ ka ibibi gburugburu ebe rere ure iji mepụta ohere maka gburugburu ebe obibi dị ọcha, makwara mma.

Ma gịnị banyere ike ndị na-abụghị nke mmadụ bụ́ ndị kpataworo adịghị n’otu dị otú ahụ n’oge gara aga? Hà ga-enwere onwe ha igbebata n’usoro ihe ọhụrụ a ka ndị bi n’ime ya wee malite usoro mbibi ahụ ọzọkwa, na-alụso ndị obibi ibe ha ọgụ ma na-eme ka ndụ siere onye ọ bụla ike? Ọ dịghị ma ọlị. Nchụpụ na ndozigharị a bụ nke a na-apụghị ịgbanwe agbanwe, ha zukwara ezu. “Mkpagbu agaghị ebili nke ugbo abụọ.”—Nehum 1:9.

Bible ji mbibi ikpeazụ nke Setan tụnyere ịkpọ ihe mkpofu ọkụ. Ọ na-asị na “Ekwensu ahụ nke na-eduhie [ndị bi n’ụwa], a tụbara ya n’ime ọdọ ọkụ na brimstone.” (Mkpughe 20:10) Lee ihe atụ dị ike ọ bụ! Cheedị, e ji mbibi tụnyere ọ bụghị nanị ebe dị ntakịrị a na-akpọ ihe ọkụ nke nwere ike dị nta kama nnọọ ọdọ ọkụ, na-erepịa ma na-eme ka ihe nile dị njọ, e merụkwara emerụ ghara ịdị. Ọ dịghị onye ọ bụla, ma mmadụ ma mmụọ ọjọọ, a ga-ekwe ka ọ gaa n’ihu na-eme ihe ndị na-eyi ịdị n’usoro nke eluigwe na ala egwu, nke na-emebi ụkpụrụ Chineke nke ezi ihe na ihe ọjọọ, ma ọ bụ onye na-akpatara mmadụ ibe ha ihe mgbu. Ndị nile na-emebi ịdị n’otu ga-apụsị!—Abụ Ọma 21:9-11; Zefanaịa 1:18; 3:8.

Ndị Dị n’Otu Sitere ná Mba Nile

Ndị lanarịrị oké nhichapụ ahụ ga-emejupụta “oké ìgwè mmadụ . . . si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” (Mkpughe 7:9) Ndịrịta iche mba na agbụrụ agaghị ekewa ha. Ha ga-amụtaworị ibikọ ọnụ n’ịdị n’otu nke udo. (Aịsaịa 2:2-4) Ọbụna ihe dị ịtụnanya karị, ndị a ga-abụ ndị ndị bi na mbara ụwa n’oge gara aga ga-esonyere bụ́ ndị a ga-akpọtaghachi ibi n’ụwa ahụ e mere ka ọ dị ọcha site ná ndokwa magburu onwe ya nke mbilite n’ọnwụ.—Jọn 5:28, 29.

Ọ̀ ga-amasị gị ibi n’ụdị ụwa ahụ? Nanị ndị rapagidesiri ike n’ihe ndị Chineke na-achọ ga-eme otú ahụ, e setịpụkwara ihe ndị ọ chọrọ n’ime Bible n’ụzọ doro anya. (Jọn 17:3; Ọrụ 2:38-42) Ndịàmà Jehova ga-enwe obi ụtọ inyere gị aka ịmụta ihe Chineke na-achọ ka i wee nwee ike inwe olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ime ụwa dị n’otu n’ezie.

[Foto dị na peeji nke 7]

Ọchịchị nke dị n’aka Jisọs Kraịst ga-ahụ na e nwere ụwa dị n’otu

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya