Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • tp isi 5 p. 43-54
  • Ihe Iseokwu Nke Metụtara Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Iseokwu Nke Metụtara Gị
  • Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mmalite nke Iguzogide Ịchịisi Chineke
  • Ihe Iseokwu Ndị A Kpaliri
  • Ihe Ngafe nke Oge Kpugheworo
  • Ihe Mere Ihe Ọjọọ Ka Ji Dịrị
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2007
  • Nhụjuanya Ụmụ Mmadụ—n’Ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Ọ Dịrị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
  • Ihe Iseokwu nke Anyị Nile Na-aghaghị Iche Ihu
    Fee Onye Nanị Ya Bụ Ezi Chineke ahụ Ofufe
  • Gịnị Bụ Nzube Chineke Maka Ụwa?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ezi Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olee Otú Ị Pụrụ Isi Nweta Ya?
tp isi 5 p. 43-54

Isi 5

Ihe Iseokwu Nke Metụtara Gị

1. Gịnị mere o ji siere ndị mmadụ ike ịghọta ihe mere Chineke ji kwere ka ihe ọjọọ dị n’etiti ụmụ mmadụ?

N’AGBANYEGHỊ na mmadụ nile na-achọ udo na ịnọ ná ntụkwasị obi, akụkọ ihe mere eme nke mmadụ ejupụtawo ná mwụfu ọbara na mmerụ ahụ. Ebe Bible na-egosi na Chineke kpọrọ ihe ndị dị otú ahụ asị, n’ihi gịnị mere ọ kwụsịbeghị ọnọdụ ndị a tupu oge a? N’ezie ọ gaghị abụ n’ihi enweghị mmasị. Bible, dịkwa ka ịma mma nke aka ọrụ Chineke n’elu ala na-enye ihe àmà buru ibu nke ịhụnanya na nchegbu ya banyere ụmụ mmadụ. (1 Jọn 4:8) Karịsịa, o metụtara nsọpụrụ nke aha Chineke n’onwe ya, ebe a kpaliworo ndị mmadụ ikwugide ya n’ihi ọnọdụ ndị a. Ya mere, olee ihe a pụrụ ịsị na ọ bụ ya mere o jiworo na-anagide ọtụtụ puku afọ nke ịgba aghara na ime ihe ike?

2. (a) N’olee ebe n’ime Bible ka anyị ga-ahụ ihe mere Chineke ji kwere ka ọnọdụ ọjọọ dịruo ogologo oge otú a? (b) Gịnị na-egosipụta na ihe ndekọ Bible banyere Adam na Iv bụ akụkọ ihe mere eme?

2 A na-achọta azịza ya n’okwu mmeghe Bible banyere Adam na Iv. Nke a abụghị akụkọ ifo nkịtị. Ọ bụ akụkọ ihe mere eme. Bible na-enye ihe ndekọ zuru ezu nke usoro ọmụmụ site na narị afọ nke mbụ nke Oge Anyị laa azụ ruo ná ndị mmadụ mbụ ahụ. (Luk 3:23-38; Jenesis 5:1-32; 11:10-32) Dị ka nne na nna anyị mbụ, Adam na Iv nwere mmetụta n’ebe anyị nọ kpọmkwem. Ihe Bible na-agwakwa anyị banyere ha na-enyere anyị aka ịghọta ọnọdụ nile ndị na-emetụta ndụ anyị taa.

3. Ụdị ndokwa dịgasị aṅaa ka Chineke meere ụmụ mmadụ ná mmalite?

3 Bible na-ekpughe na ndokwa nile nke Chineke maka di na nwunye mbụ ahụ dị nnọọ mma. Ha nwezuru ihe nile maka ndụ obi ụtọ—ebe obibi dị ka ubi n’Iden, ụba nke ụdị ihe oriri dị iche iche, ọrụ na-eju afọ, olileanya nke ịhụ ka ezinụlọ ha tojupụtara ụwa, na ngọzi nke Onye Okike ha. (Jenesis 1:28, 29; 2:8, 9, 15) Ònye pụrụ iji ezi uche chọọ ihe karịrị ndị a?

4. (a) Na mgbe e kere ha, n’ụzọ dịgasị aṅaa ka ụmụ mmadụ si dị iche n’ebe ihe ndị ọzọ e kere eke n’elu ala nọ? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka e si nye ha nduzi dị mkpa?

4 Ihe ndekọ nke Jenesis e jiri ike mmụọ nsọ dee na-ekpughe na ụmụ mmadụ nọ n’ọnọdụ pụrụ iche n’elu ala. N’adịghị ka ụmụ anụmanụ, ha nwere uche nke omume ọma, e nyekwara ha onyinye nke ikpebiri onwe ha ihe. Nke a mere e ji nye ha ikike iche echiche na ikpe ziri ezi. Iji duzie ha, Chineke kụnyere n’ime nwoke na nwanyị ike nke akọ na uche ka o wee bụrụ na dị ka ndị zuru okè, ọchịchọ ha ga-abụkarị nke ime ezi ihe. (Ndị Rom 2:15) E wezuga ihe ndị a nile, Chineke gwara ha ihe mere ha ji dịrị ndụ, ihe ha ga-eme, na onye dokwara ihe nile mara mma ndị dị ha gburugburu. (Jenesis 1:28-30) Ya mere, ànyị pụrụ isi aṅaa kọwaa ihe mere ọnọdụ ọjọọ ndị a jiri dị ugbu a?

5. (a) Ihe dị mfe dị aṅaa ka Chineke chọrọ n’aka mmadụ abụọ ahụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Gịnị mere o ji zie ezi na o metụtara olileanya ha maka ndụ n’ọdịnihu?

5 Ihe ndekọ Akwụkwọ nsọ na-egosi na a kpaliri otu ihe iseokwu—nke metụtara anyị nile taa n’otu n’otu. A kpaliri ya site n’ihe ndị dapụtara mgbe ọ na-adịbeghị anya e kesịrị mmadụ abụọ mbụ ahụ. Chineke nyere nwoke na nwanyị ahụ ohere nke igosipụta ekele site n’ịhụnanya n’ebe Onye Okike ha nọ site n’irube isi n’otu ihe a chọrọ n’aka ha. Ihe ahụ a chọrọ n’aka ha abụghị ihe ga-egosi na ha nwere ọchịchọ rụrụ arụ ndị a na-aghaghị ihichapụsị. Kama, ọ gụnyere ihe nke n’onwe ya bụ ihe ziri ezi ma kwesịkwa ekwesị—iri nri. Dị ka Chineke gwara nwoke ahụ: “Mkpụrụ nke sitere n’osisi nile ọ bụla nke ubi a gbara ogige ka ị ga na-eri: ma mkpụrụ nke sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ, gị erila mkpụrụ sitere na ya: n’ihi na ụbọchị ị ga-eri mkpụrụ sitere na ya ị ghaghị ịnwụ anwụ.” (Jenesis 2:16, 17) Ihe nke a a chọrọ ha n’aka anapụghị mmadụ abụọ mbụ ahụ ihe ọ bụla dị mkpa maka ndụ. Ha pụrụ iri site n’osisi ndị ọzọ nile nke ubi ahụ. Ma o metụtara kpọmkwem olileanya ha maka ndụ n’ọdịnihu, n’ụzọ zikwara ezi. N’ihi gịnị? N’ihi na Onye a nke chọrọ nrubeisi ha bụ kpọmkwem Isi Iyi na Onye Nkwado nke ndụ mmadụ.

6. (a) Nne na nna anyị mbụ gaara adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi a sị na ha mere ihe kwekọrọ n’eziokwu bụ isi dị aṅaa banyere ịchịisi? (b) N’ihi gịnị ka ha gaara ịbụ ndị a kwaliri irubere Chineke isi?

6 Nzube Chineke abụghị ka ndị mmadụ na-anwụ anwụ. A kpọtụghị ọnwụ aha nye Adam na Iv ma ọ bụghị metụta nnupụisi. Nne na nna anyị mbụ nwere n’ihu ha olileanya nke ịdị ndụ ebighị ebi n’ebe obibi ha nke udo na nke dị ka ubi a gbara ogige. Iji nweta nke a, gịnị ka a chọrọ ha n’aka? Ha kwesịrị ịmata na ụwa nke ha bi n’ime ya bụ nke Onye ahụ mere ya, na dịkwa ka Onye Okike ya, Chineke nwere ikike n’ụzọ ziri ezi n’ebe ihe o kere eke nọ. (Abụ Ọma 24:1, 10) N’eziokwu, Onye a nke nyeworo mmadụ ihe ọ bụla dị ya mkpa tinyere ndụ n’onwe ya, kwesịrị ka e rubere ya isi n’ihe ọ bụla ọ chọrọ n’aka ha. Otú ọ dị, ọ chọghị ka nrubeisi ahụ bụrụ nke a manyere amanye. Kama nke ahụ, ọ ghaghị isite n’ọchịchọ obi nke ịhụnanya kpaliri. (1 Jọn 5:3) Ma nne na nna anyị mbụ dara n’igosipụta ụdị ịhụnanya nke a. Nke a ò si aṅaa dị otú ahụ?

Mmalite nke Iguzogide Ịchịisi Chineke

7. (a) Dị ka Bible kwuru, n’ole ebe ka nguzo megide ịchịisi Chineke malitere? (b) Ò si aṅaa bụrụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na e nwere ebe obibi nke ndị bụ mmụọ?

7 Bible na-egosi na nguzo megide ịchịisi Chineke malitere, ọ bụghị n’elu ụwa, kama n’ebe obibi anya mmadụ na-apụghị ịhụ. Dị ka ọtụtụ ndị mmadụ, ànyị kwesịrị inwe obi abụọ ma è nwere ebe dị otú ahụ nanị n’ihi na anyị apụghị ịhụ ya anya? Ọ dị mma, a pụghị ịhụ ike ndọda anya, a pụghịkwa ịhụ ikuku. Ma mmetụta ha dị nnọọ adị n’ezie. Otú ahụkwa a pụrụ ịhụ mmetụta nke ebe obibi a na-apụghị ịhụ anya. Ọ bụ ezie na “Chineke bụ mmụọ” ma a pụrụ ịhụ aka ọrụ nke okike ihe ya gburugburu anyị. Ọ bụrụ na anyị ekwere na ya, anyị aghaghị ikwerekwa na e nwere ebe obibi nke ndị bụ mmụọ. (Jọn 4:24; Ndị Rom 1:20) Ma è nwere onye ọ bụla ọzọ nke bi n’ebe obibi ahụ?

8. Ụdị ndị dị aṅaa ka ndị mmụọ ozi bụ?

8 Dị ka Bible kwuru, e mewo ka ọtụtụ nde ndị bụ mmụọ, bụ́ ndị mmụọ ozi, dị adị tupu mmadụ. (Job 38:4, 7; Abụ Ọma 103:20; Daniel 7:10) E kere ndị a nile n’izu okè, n’enweghị ọchịchọ ọjọọ ọ bụla. Ma, dịkwa ka ihe Chineke kere n’ikpeazụ, bụ́ mmadụ, e nyekwara ha ike nke ikpebiri onwe ha ihe. Ya mere, ha pụrụ ịhọrọ ụzọ nke ikwesị ntụkwasị obi ma ọ bụ nke ekwesịghị ntụkwasị obi nye Chineke.

9, 10. (a) Olee otú ọ pụrụ isi kwe mee na mmụọ e kere eke nke zuru okè pụrụ izube ime ihe ọjọọ? (b) Ya mere, olee otú otu n’ime ndị mmụọ ozi si ghọọ Setan?

9 Ma ajụjụ ọtụtụ ndị na-ajụ bụ: Dị ka ndị zuru okè, olee otú nke ọ bụla n’ime ha pụrụ isi nnọọ nwee mkpali nke ime ihe ọjọọ? Ọ dị mma, ugbo ole n’ime ndụ anyị ka ọnọdụ dị iche iche na-apụta, ndị na-eche ọtụtụ nhọrọ dị iche iche n’ihu anyị—ụfọdụ ndị dị mma, ụfọdụ ndị dị njọ? Inwe ọgụgụ isi iji nwapụta nhọrọ ndị dị njọ adịghị eme ka anyị ghọọ ndị ọjọọ ozugbo, ọ̀ na-eme? Ezigbo ajụjụ dị ya bụ: Olee ụzọ nke anyị ga-etinye uche na obi anyị na ya? Ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’echiche ndị na-emerụ ahụ, a pụrụ ịdọrọ anyị gaa n’ịzụlite ọchịchọ ọjọọ n’obi anyị. Ụdị ọchịchọ ahụ pụrụ n’ikpeazụ ịkwali anyị ime ihe ọjọọ. Onye ahụ so dee Bible bụ Jemes kọwara usoro nke a na-ebibi ihe, sị: “A na-anwa onye ọ bụla mgbe agụụ ihe ọjọọ nke aka ya na-adọkpụfu ya, e wee rafuo ya. Mgbe ahụ agụụ ihe ọjọọ ahụ, mgbe ọ tụworo ime, ọ wee mụpụta mmehie: mmehie ahụ, mgbe o tozu okè, o wee mụpụta ọnwụ.”—Jemes 1:14, 15.

10 Akwụkwọ nsọ kpughere na nke a mere otu n’ime ụmụ mmụọ nke Chineke. A rafuru ya site n’ọchịchọ nke aka ya. Ọ hụtara ohere dị iche iche n’ime ụmụ mmadụ Chineke kere. Hà pụrụ ịbịa nọrọ n’okpuru ya karịa ịnọrọ n’okpuru Chineke? N’ụzọ doro anya ọ malitere ịchọ òkè ụfọdụ nke ofufe dịịrị Chineke. (Luk 4:5-8) N’ime ihe dị ka ọchịchọ ya si dị, ọ ghọrọ onye na-eguzogide Chineke. N’ihi nke ahụ, a na-ezo ya aka n’ime Bible dị ka Setan, nke pụtara onye nguzogide.—Job 1:6.

11. Ihe àmà dị aṅaa nke doro anya na-eme ka e kwere na Setan dị adị n’ezie?

11 Na narị afọ nke iri abụọ nke a nke ịhụ ihe onwunwe n’anya, ọ bụ ihe a na-adịghị anabata nke ọma bụ́ ikwere n’ịdị adị nke onye bụ mmụọ dị otú ahụ, dị ka Setan. Ma, è nwetụla mgbe echiche ndị na-ewu ewu ghọrọ ihe nduzi ziri ezi nke eziokwu? N’etiti ndị mụrụ ihe banyere ọrịa, e nwere mgbe nkwenkwe na nje ndị a na-adịghị ahụ anya so ebute ọrịa bụ ihe a na-adịghị anabata nke ọma. Ma ugbu a mmetụta ha bụ nke a maara nke ọma. Ya mere, n’ezie, na otu ihe bụ ihe a na-amaghị nke ọma apụtaghị na a pụrụ ilefuru ya anya. Jisọs Kraịst n’onwe ya sitere n’ebe obibi nke ndị bụ mmụọ, ya mere ọ pụrụ iji nkwuwa okwu kwuo banyere ụdị ndụ dị n’ebe ahụ. Ọ kọwara Setan kpọmkwem dị ka onye ọjọọ nke bụ mmụọ. (Jọn 8:23; Luk 13:16; 22:31) Ọ bụ nanị n’ịmata ọdịdị nke onyeiro nke a bụ mmụọ ka ọ pụrụ ikwe mee ịghọta ụzọ ụdị ọnọdụ ọjọọ ndị a si malite n’elu ụwa.

12. Setan ò si aṅaa gwa nwanyị ahụ bụ Iv okwu, n’ihi gịnị ka o ji bụrụ n’ụzọ dị otú ahụ?

12 Ihe ndekọ ahụ e ji ike mmụọ nsọ dee, na Jenesis isi 3 kọwara otú Setan si malite imeju ọchịchọ ọjọọ ya. N’ogige Iden, ọ gakwuuru nwanyị ahụ bụ Iv n’ụzọ nke kpuchiri onye ọ bụ n’ezie. O jiri anụmanụ mmadụ abụọ ahụ na-ahụkarị—bụ́ agwọ—mee ihe. N’ụzọ doro anya, site n’iji ihe anyị ga-akpọ ikwu okwu site n’ịtụgharị ụda olu, o mere ka o yie ka a ga-asị na ihe ọ na-ekwu sitere n’ihe ahụ e kere eke. Ụzọ ịdị nkọ ya dị ka e si kee ya dabara nke ọma ná mmetụta Setan chọrọ ka e nwee.—Jenesis 3:1; Mkpughe 12:9.

13. Gịnị ka Setan gwara Iv, gịnịkwa ka ihe àmà na-egosi na o bu n’uche?

13 Kama ịkpọ okwu aha kpọmkwem ka nwanyị ahụ wee lekwasị ya anya dị ka onye na-achị ya, Setan bu ụzọ chọọ ịkụnye obi abụọ n’uche ya, na-ajụ, sị: “Ọ̀ ga-abụ ezie na Chineke sịrị, Unu erila mkpụrụ sitere n’osisi ọ bụla nke ubi a gbara ogige?” Ihe ọ na-ekwu kpọmkwem bụ: ‘Ọ dị oké njọ na Chineke asịwo ka unu ghara iri site n’osisi nile dị n’ubi ahụ.’ Site na nke a ọ na-ekwu na ma eleghị anya Chineke na-ezonarị ha ihe ụfọdụ dị mma. Iv zaghachiri site n’ihota mmachibido iwu nke Chineke, nke metụtara nanị otu osisi, na-akọwakwa na ntaramahụhụ dịịrị nnupụisi bụ ọnwụ. Na nke ahụ, Setan nwara imebi nsọpụrụ ya nye iwu Chineke, na-asị: “Ọ dịghị ọnwụ unu na-aghaghị ịnwụ: n’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu, unu ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 3:1-5) Gịnị ka ị gaara emeworị a sị na ọnọdụ dị otú ahụ chere gị ihu?

14. (a) N’ihi gịnị ka Iv ji daba n’ọnyà Setan? (b) Gịnị ka Adam mere?

14 Iv kwere ka ọchịchọ onwe nanị dọkpụfuo ya. O riri ihe Chineke machibidoro iwu. E mesịa, ná nrụgide ya, di ya rikwara. Ọ họọrọ ịdịnyere nwunye ya karịa Onye Okike ya. (Jenesis 3:6; 1 Timoti 2:14) Gịnị siri na ya pụta?

15. Ya mere, gịnị kpatara imempụ na ime ihe ike, tinyere ọrịa na ọnwụ nke jupụtara n’oge nile agbụrụ mmadụ dịworo adị?

15 E nubara ezinụlọ nke ụmụ mmadụ ka ha hà n’ime mmehie na ezughị okè. Adam na Iv enwekwaghị ike ugbu a inyefe ụmụ ha izu okè nke ha nwetụworo na mbụ. Dị ka ihe nile ndị e sitere n’ihe mebiri emebi mepụta na-emebikwa n’otu aka ahụ, otú a ụmụ ha nile bụ ndị a mụrụ ná mmehie, na-enwe àgwà ebumpụta ụwa nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị. (Jenesis 8:21) Ọchịchọ nke a, nke a na-akparaghị ókè, edubawo n’ihe ọjọọ ndị napụrụ ụmụ mmadụ udo na ịnọ ná ntụkwasị obi. Ọ bụ ihe nketa nke a nke mmehie kpatakwara ọrịa na ọnwụ.—Ndị Rom 5:12.

Ihe Iseokwu Ndị A Kpaliri

16, 17. (a) Iji ghọta ihe mere Chineke jiri nagide ọnọdụ a ruo ogologo mgbe, gịnị ka anyị na-aghaghị ịghọta? (b) Gịnị kpọmkwem bụ ihe iseokwu ahụ a kpaliri?

16 N’ihi ihe ndị a mere eme, uche anyị na-alaghachi azụ n’ajụjụ nke ihe mere Chineke ji nagide ọnọdụ a, na-ekwere ka ọ gaa n’ihu ruo n’ókè nke o ruworo ugbu a. Ọ bụ n’ihi oké ihe iseokwu nke a kpaliri na mmetụta o nwere n’eluigwe na n’elu ala nile. Ò si aṅaa dị otú ahụ?

17 Site n’ịrụ ụka na iwu Chineke nye Adam na Iv adịghị mma nye ha nakwa site n’ịrụ ihe Chineke kwuru ụka na ọ ga-esi ná nnupụisi pụta, Setan na-arụ ịchịisi Chineke ụka. Ee e, ọ rụghị eziokwu bụ na Chineke bụ onye na-achị isi ụka. Kama, ihe iseokwu Setan welitere dabeere n’izi ezi nke ịchịisi Jehova, ọkaaka Ya na ụzọ Ya nile ịbụ nke ezi omume. N’ụzọ nrafu, Setan rụrụ ụka na ndị mmadụ ga-eme nke ọma karị site n’ime ihe nke onwe ha, na-eme mkpebi nke onwe ha kama ịnọ n’okpuru nduzi Chineke. (Jenesis 3:4, 5) Otú ọ dị, n’ụzọ doro anya, site n’ime ihe otú ahụ, ha ga-agbaso idu ndú nke onyeiro Chineke.

18. (a) Olee ihe iseokwu ọzọ a kpaliri, n’ole ebekwa ka e gosiri nke a n’ime Bible? (b) Ihe iseokwu a ò si aṅaa metụta anyị?

18 O metụtakwara ihe iseokwu ọzọ. Ebe ọ bụ na ndị a Chineke kere gbakụtara ya azụ n’ebe ahụ n’Iden, gịnị ka ndị ọzọ ga-eme? E mesịa, n’ụbọchị nwoke ahụ bụ Job, Setan kwupụtara hoo haa na ndị na-efe Jehova na-eme otú ahụ, ọ bụghị site n’ịhụnanya ọ bụla maka Chineke na ịchịisi ya, kama n’ihi ọdịmma onwe onye nanị, n’ihi na Chineke nyere ha ihe nile. Setan na-egosi na ọ dịghị onye ọ bụla a ga-akpagbu ga-eji ikwesị ntụkwasị obi na-akwado ọkaaka nke Jehova. Ya mere, a rụrụ ụka banyere nrubeisi na ikwesị ntụkwasị obi nke ihe nile e kere eke n’eluigwe na n’ụwa. N’ụzọ dị otú ahụ, ihe iseokwu ahụ metụtara gị.—Job 1:8-12; 2:4, 5.

19, 20. Site n’egbughị ndị nguzogide ahụ otu mgbe ahụ, ohere dị aṅaa ka Chineke nyere ihe ndị o kere eke, ma ndị mmụọ ma ndị mmadụ?

19 N’iche ihe ịma aka dị otú a ihu, gịnị ka Jehova ga-eme? Ọ pụrụrịị ibibi Setan na Adam na Iv n’ụzọ dị mfe. Nke ahụ gaara egosipụtaworị ọkaaka nke ike Jehova. Ma ọ̀ gaara aza ajụjụ ndị a kpaliri n’uche ihe nile ndị Chineke kere eke, ndị hụworo otú ihe ndị a si aga? Udo na ịnọ ná ntụkwasị obi ebighị ebi nke eluigwe na ala chọrọ ka a zaa ajụjụ ndị a kpam kpam, nanị otu ugbo. E wezuga nke ahụ, a rụrụ ụka banyere ikwesị ntụkwasị obi na nrubeisi nke ihe nile e kere eke nwere ọgụgụ isi. Ọ bụrụ na ha hụrụ ya n’anya, ha ga-achọ ka ha zaghachi ebubo ụgha ahụ n’onwe ha. Jehova nyere ha ohere ime nnọọ nke ahụ. Ọzọkwa, n’ịhapụ Adam na Iv ka ha mụta ụmụ (ọ bụ ezie na ha ezughị okè), Chineke ga-egbochi mkpochapụ nke ezinụlọ ụmụ mmadụ—ezinụlọ nke gụnyekọtazịrị anyị nile ndị dị ndụ taa. Nke a ga-enyere ụmụ ha ndị a ohere nke ịhọrọ n’onwe ha ma hà ga-erube isi n’ịchịisi Chineke. Nhọrọ nke ahụ bụ nke na-eche gị ihu ugbu a!

20 Ya mere, kama ime ka ha nwụọ ozugbo n’ihi ikpe ọnwụ ahụ, Jehova kwere ka ndị nguzogide ahụ dịruo ndụ nwa mgbe. A chụpụrụ Adam na Iv n’Iden, ka ha nwụọ tupu otu puku afọ agafee. (Jenesis 5:5; tụlee Jenesis 2:17 na 2 Pita 3:8.) A ga-ebibikwa Setan mgbe oge ya ruru, dị nnọọ ka ọ bụ agwọ nke e gwepịaworo isi ya.—Jenesis 3:15; Ndị Rom 16:20.

Ihe Ngafe nke Oge Kpugheworo

21, 22. (a) Banyere ịchịisi, gịnị ka Setan na ụmụ mmadụ nọworo na-eme eri oge ahụ Chineke nyere ohere? (b) Gịnị ka akụkọ ihe mere eme nke mmadụ na-egosi banyere ọchịchị nke na-agbalị ileghara Chineke anya?

21 Gịnị siworo n’ịma izi ezi nke ịchịisi Chineke aka pụta? Mmadụ ò wetaworo onwe ya uru site n’ịgbalị ime ihe nke onwe ya? E nyewo ụmụ mmadụ ohere nke ịnwale ụdị ọchịchị ọ bụla a pụrụ ichepụta. Jehova akwụsịghị mgbalị mmadụ ọsọ ọsọ ka e wee hụ ihe nile ga-esi na ya pụta. Ọbụna otu narị afọ gara aga gaara adị oké ọsọ ọsọ. Mmadụ ka na-abanye mgbe ahụ “n’ọgbọ nkà na ụzụ” ma ka na-amalite nanị itu oké ọnụ nke ihe ọ ga-arụzu.

22 Ma à chọrọ narị afọ ọzọ iji hụ ihe ụzọ mmadụ nke adabereghị na Chineke na-arụpụta? Ọbụna ndị a ma ama n’ọchịchị na n’ọkà mmụta sayensi kwetara na ụwa na-eche oké ihe ize ndụ nke mbibi ihu. N’ezie ọ dịghị mkpa Chineke ikwere ka e bibisie ihe nile iji gosi ndaru ala nke ọchịchị mmadụ na-achị onwe ya. Puku afọ isi agbawo àmà ihe na-eme mgbe ọchịchị leghaara Chineke anya, o nweghịkwa ka a sị na e nweghị oge zuru ezu maka ime ka ịchịisi mmadụ zuo okè. Ihe ndị mere eme na-egosi na e nweghị ọchịchị nke na-adabereghị na Chineke pụrụ iweta ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nye ihe nile a kpọrọ mmadụ.

23. Gịnị ga-eme n’oge na-adịghị anya nke ga-enye ohere maka ịchịisi ezi omume nke ụwa site n’aka Ọkpara Chineke?

23 Dị ka anyị ga-ahụ ma e mesịa, ogologo oge tupu mgbe ya na n’ịgụkọ oge n’ụzọ zuru okè, Jehova Chineke kara otu ọgbọ kpọmkwem akara nke ga-ahụ ka o hichapụrụ ma n’eluigwe ma n’elu ala nguzogide nile megide ịchịisi ya. Ọ bụghị nanị na a ga-ebibi ndị ajọ mmadụ kamakwa a ga-akpọchigide Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya dị ka a ga-asị na ọ bụ n’ime abyss, n’enweghị ike inwe mmetụta n’ihe omume nile nke ndị mmadụ ma ọ bụ nke ndị mmụọ ozi. Nke a bụ iji meghee ụzọ maka ịchịisi ezi omume nke ụwa site n’ọchịchị Ọkpara Chineke. N’oge otu puku afọ, ọchịchị ahụ ga-ewepụ mmerụ nile nke mmadụ iji ọchịchọ onwe nanị na-achị eri ọtụtụ puku afọ wetaworo. Ọ ga-eweghachi ala n’ọnọdụ mara mma nke paradaịs ma wetaghachi agbụrụ mmadụ na-erube isi n’izu okè ahụ e nweworo n’Iden.—Mkpughe 20:1, 2; 21:1-5; 1 Ndị Kọrint 15:25, 26.

24. (a) Olee ihe mere a ga-eji tọhapụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya n’ọgwụgwụ nke otu puku afọ ahụ? (b) Gịnị ga-esi na ya pụta?

24 Bible na-ekwu na ná ngwụsị nke ịchịisi otu puku afọ ahụ, a ga-atọhapụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya site ná mkpọchigide ha maka nwa oge nta. N’ihi gịnị? Iji mee ka ndị nile dị ndụ mgbe ahụ nwee ohere igosipụta onwe ha dị ka ndị na-ekwesị ntụkwasị obi nye ịchịisi okaaka Jehova. Ọtụtụ ọnụ ọgụgụ a na-amaghị ama nke ndị mmadụ ga-abịaworị ná mbilite n’ọnwụ. Nye ọtụtụ n’ime ha, nke a ga-abụ ohere mbụ ha igosipụta n’ule ịhụnanya ha maka Chineke. Ihe iseokwu ga-abụ otu ụdị ahụ e welitere n’Iden—ma hà ga-eji nrubeisi na ikwesị ntụkwasị obi na-ebuli ọkaaka Jehova elu. Jehova na-achọ nanị ndị ịhụnanya ha na-akpali ikwesị ntụkwasị obi dị otú ahụ dị ka ndị ọ ga-achị. Ohere dịkwaara ndị ahụ ga-achọ ịhọrọ ịnọ n’akụkụ onyeiro Chineke na ndị mmụọ ọjọọ ya n’atụmatụ nile ọ bụla ha na-eme imebighachi udo nke eluigwe na ala nke Chineke, ime otú ahụ. Ma, n’isi otú a jụ ọchịchị Chineke, ha ga-ekwesị mbibi. Ma n’oge nke a, ọ ga-abịa n’ike, dị ka ọ bụ n’ọkụ sitere n’eluigwe. Ndị nguzogide nile, ma ndị mmụọ ma ndị mmadụ, ga-alazi n’iyi mgbe ahụ ruo mgbe nile.—Mkpughe 20:7-10.

25, 26. Otú Jehova si chee ihe ndị mere eme ihu si aṅaa na-abara onye ọ bụla n’ime anyị uru n’ezie?

25 N’eziokwu, ụmụ mmadụ ahụwo oké ahụhụ ọtụtụ puku afọ. Ma nke a bụ site ná nhọrọ nke nne na nna anyị mbụ, ọ bụghị nke Chineke. N’oge a nile Chineke ediwo nkwugide, ọ nagidewokwa ihe arụ nile. Ma Chineke, onye ‘otu puku afọ dị ya ka ọ bụ otu ụbọchị’ na-ewere ogologo oge ile ihe anya, nke a na-arụpụtakwara ihe ndị o kere eke ezigbo ihe. Dị ka onyeozi e nyere ike mmụọ nsọ dere, sị: “[Jehova, NW] anọghị ọdụ n’ime nkwa Ya, dị ka ụfọdụ na-agụ ya na ọ bụ ịnọ ọdụ; kama ọ na-atachiri unu ogologo ntachi obi, n’ihi na o zubeghị ka ndị ọ bụla laa n’iyi, kama ka mmadụ nile bịaruo nchegharị.” (2 Pita 3:8, 9) A sị na ọ bụghị n’ihi ndidi na ogologo ntachi obi Chineke, o nweghị onye n’ime anyị ga-enweworị ohere nke nzọpụta.

26 Otú ọ dị, anyị agaghị ekwubi na ọ dịghị ihe Chineke na-eme eri puku afọ isii ahụ gaworo aga. Ee e, ọ nọghị nanị na-ekwere ka ajọ omume dịgide, na-echere ka o nweta ohere ma ghara ịdị na-eme ihe ọ bụla n’onwe ya. Dị ka anyị ga-ahụ, ihe ndị mere eme na-egosi na ọ dịghị otú ahụ.

[Foto dị na peeji nke 51]

Setan rụrụ ụka na n’okpuru ule, ụmụ mmadụ nile ga-ahapụ ikwesị ntụkwasị obi ha ma mee ihe n’adabereghị na Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya