Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w91 8/1 p. 4-7
  • Ụbọchi Ikpe—Oge Inwe Olileanya!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụbọchi Ikpe—Oge Inwe Olileanya!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndabere maka Ụbọchị Ikpe
  • Ụbọchị Ikpe Ahụ
  • Olee Mgbe Ọ Ga-abụ?
  • Òle Ndị Ka A Ga-ekpe Ikpe?
  • Ikpe ahụ
  • Ụbọchị Ikpe—Oge Inwe Olileanya
  • Gịnị Bụ Ụbọchị Ikpe?
    Teta!—2010
  • Ụbọchị Ikpe—Gịnị Ka Ọ Bụ?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Gịnị Ga-eme n’Ụbọchị Ikpe?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2015
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1991
w91 8/1 p. 4-7

Ụbọchi Ikpe—Oge Inwe Olileanya!

Ọ BỤRỤ na echiche banyere ụbọchị ikpe ahụ na-atụ gị egwu, gịnị mere ị tụleghị ihe Bible kwuru banyere ya? Dị ka ihe atụ, ọ̀ bụ eziokwu na mgbe Chineke mezuru ihe o kpere n’ikpe n’isi ndị mmehie, na a na-atụba ha n’ime ọkụ ala mmụọ?

Otú ọ dị, ihe ndekọ mbụ e nwere banyere ikpe nke Chineke bụ kpọmkwem ná mmalite akụkọ ihe mere eme nke mmadụ. Adam na Iv nwere ohere ịdị ndụ ebighị ebi n’elu ala nke bụ paradaịs. (Jenesis 1:26-28; 2:7-9, 15-25) Otú ọ dị, ha mehiere, wee banye n’okpuru amamikpe nke Chineke. Gịnị si na nke a pụta? Chineke napụrụ ha onyinye nke ndụ. N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha nwụrụ. Chineke gwara ha, sị: “N’ọsụsọ ihu gị ka ị ga-eri nri, ruo mgbe ị ga-alata n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.”—Jenesis 3:16-19.

Nke a bụ amamikpe siri ike, ma o ziri ezi. O dokwara anya na o metụtaghị ọkụ ala mmụọ. Mgbe Adam na Iv nwụrụ, ha laghachiri n’ájá. Ha kwụsịrị ịdị adị. Ọ dịghị ebe ọ bụla Bible nyere echiche nke bụ na otu akụkụ nke Adam ma ọ bụ nke mmadụ ọ bụla ọzọ dịgidere ndụ mgbe ọ nwụsịrị ka e wee taa ya ahụhụ n’otu ebe ruo mgbe ebighị ebi. Kama nke ahụ, anyị na-agụ, sị: “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ: ma ndị nwụrụ anwụ adịghị ama ihe ọ bụla.”—Eklisiastis 9:5.

Ị̀ mabu na Bible kwuru nke a? Ị̀ maakwara na ọ dịghị mgbe ọ bụla Bible jiri okwu ahụ bụ “mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ” mee ihe? Kama nke ahụ, ọ na-asị: “Mkpụrụ obi ahụ nke na-emehie, ya onwe ya ga-anwụ.” (Ezikiel 18:4) Nke a kwekọzuru n’ụkpụrụ Bible ahụ bụ: “Ụgwọ ọrụ nke mmehie bụ ọnwụ.” (Ndị Rom 6:23) Ụkpụrụ nke a na-emetụta anyị nile. Anyị nile bụ ndị sitere n’usoro ọmụmụ Adam ahụ mehiere emehie, ya mere anyị nile na-emehie emehie, na-anatakwa ụgwọ ọrụ nke mmehie, bụ́ ọnwụ. Dị ka Bible na-asị: “Site n’aka otu mmadụ mmehie batara n’ụwa, ọnwụ sikwa ná mmehie bata; ya mere ọnwụ gazuuru mmadụ nile, n’ihi na ha nile emehiewo.” (Ndị Rom 5:12, King James Version) Ụbọchị Ikpe ahụ bụ akụkụ bụ isi nke ndokwa Chineke iji chebe anyị pụọ n’ọnọdụ nke a.

Ihe Ndabere maka Ụbọchị Ikpe

Dị ka Bible si kwuo, ọ bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ gara aga ka Chineke tọrọ ntọala maka ihe gaje ime n’Ụbọchị Ikpe. Nke a bụ mgbe Jisọs bịara n’elu ala, wee nye ndụ mmadụ ya zuru okè n’ọnọdụ anyị. Jisọs n’onwe ya kọwara, sị: “Chineke hụrụ ụwa n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kweere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

Ọ bụrụ na anyị enwee okwukwe na Jisọs, anyị na-erite uru site n’àjà ya ọbụna ugbu a n’ụzọ ime mmụọ. Chineke na-agbaghara mmehie anyị, na-ekwekwa ka anyị bịakwute ya. (Jọn 14:6; 1 Jọn 2:1, 2) Ma anyị ka bụ ndị na-ezughị okè, ndị mmehie, n’ihi nke ahụkwa, anyị ka na-ada ọrịa anụ ahụ, mesịakwa na-anwụ. Anyị enwetabeghị ndụ ebighị ebi ahụ nke Jisọs kwere nkwa ya. Nke a ga-abịa dị ka ihe si n’Ụbọchị Ikpe ahụ pụta.

Ụbọchị Ikpe Ahụ

Jọn onyeozi hụrụ ọhụụ nke Ụbọchị Ikpe, ọ kọwakwara ya n’ụzọ dị otú a: “M wee hụ oké ocheeze dị ọcha, na onye nọkwasịrị na ya, onye ụwa na eluigwe gbapụrụ n’ihu ya; a hụghịkwa ebe ọ bụla nye ha. M wee hụ ndị nwụrụ anwụ, ndị ukwu na ndị nta, ka ha na-eguzo n’ihu Chineke; e wee saghee akwụkwọ dị iche iche: a saghekwara akwụkwọ ọzọ, nke bụ akwụkwọ nke ndụ: e wee kpee ndị nwụrụ anwụ ikpe site n’ihe ndị e dererịị n’akwụkwọ ahụ dị iche iche, dị ka ọrụ ha si dị.”—Mkpughe 20:11, 12, KJ.

Ee, dị ka ọhụụ Jọn si dị, Ụbọchị Ikpe ga-abụ nke Chineke onwe ya lekọtara. Ma o metụtakwara otu onye ọzọ. Pọl onyeozi kọwara, sị: “[Chineke edebewo] otu ụbọchị, nke ọ ga-ekpe elu ụwa dum ikpe n’ezi omume n’ime ya site n’aka nwoke ahụ ọ kara aka.” (Ọrụ 17:31, KJ) Ònye bụ nwoke ahụ? Jisọs, onye kwuru n’onwe ya, sị: “Nna m adịghị ekpekwa mmadụ ọ bụla ikpe, kama o werewo ikpe nile nye Ọkpara ya.” (Jọn 5:22) Ya mere, Jisọs ga-abụ Onye Ikpe Chineke họpụtara n’Ụbọchị Ikpe.

Nke a bụ ozi ọma nye ụmụ mmadụ. Oziọma ndị ahụ na-egosi na Jisọs bụ onye nwere ọmịiko dị ukwuu. Ọ bụghị onye dị mpako ma ọ bụ onye na-achọkarị ihe n’aka mmadụ, kama ọ bụ “onye nwayọọ na onye wedatara onwe ya ala n’obi.” (Matiu 11:29; 14:14; 20:34) Anyị nwere obi ụtọ ịnọ n’okpuru nlekọta onye ikpe dị otú ahụ.

Olee Mgbe Ọ Ga-abụ?

Ma, olee mgbe Ụbọchị Ikpe ahụ ga-abụ? Mkpughe na-ekwu na ọ ga-abụ mgbe “ụwa na eluigwe [gbapụworo].” Nke a na-echetara anyị okwu Pita onyeozi, bụ: “Eluigwe nke dị ugbu a, ha na ụwa, ka a kpadoworo nye ọkụ . . . ebe a na-edebe ha nye ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.” (2 Pita 3:7) À gaje isu elu ala nkịtị ọkụ? Ee e, Bible na-ekwu ihe doro anya banyere nke a. Ọ dịghị mgbe ọ bụla a gaje ibibi elu ala nkịtị. ‘A gaghị ewezụga ụwa n’ọnọdụ ya ruo mgbe nile ebighị ebi.’ (Abụ Ọma 104:5) Okwu ndị dị gburugburu okwu ahụ Pita kwuru na-egosi na ọ bụ usoro ihe nke ụwa dị ugbu a nke na-adịghị asọpụrụ Chineke ka a gaje ibibi. Mmadụ ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke, ọ bụghị mbara ala bụ Ụwa, gaje ịla n’iyi.—Jọn 12:31; 14:30; 1 Jọn 5:19.

A gaje ibibi mmadụ ndị a ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke n’ihe ahụ Bible kpọrọ agha Amagedọn—nke, dị ka magazin nke a gosiworo ọtụtụ mgbe, gaje iwere ọnọdụ n’isi nso. (Mkpughe 16:14, 16) Mgbe nke ahụ gasịrị, a gaje ịtụba Setan n’onwe ya n’ime abyss, gbochiekwa ya itinye aka n’ihe metụtara ihe a kpọrọ mmadụ ruo otu puku afọ, puku afọ nke a bụkwa ogologo oge Ụbọchị Ikpe ga-adịru. (Mkpughe 19:17–20:3) Gịnị ga-eme ndị kwesịrị ntụkwasị obi mgbe ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke ga-ala n’iyi n’Amagedọn? Ha ga-adịrị ndụ banye kpọmkwem n’ime Ụbọchị Ikpe. Anyị na-agụ, sị: “Ndị zuru òkè ga-afọdụkwa n’ime [ụwa]. Ma ndị na-emebi iwu ka a ga-ebipụ n’ụwa.”—Ilu 2:21, 22.

N’ịkwado nke a, Bible na-ekwu banyere “oké ìgwè mmadụ, nke onye ọ bụla na-apụghị ịgụta ọnụ, ndị si ná mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta” ndị a ga-ahụ n’elu ala tupu Amagedọn. Ndị a “na-esi n’oké mkpagbu ahụ pụta”; n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ha ga-alanarị ọgwụgwụ nke ụwa nke a na-adịghị atụ egwu Chineke dị nnọọ ka Noa lanarịrị ọgwụgwụ ụwa nke oge ya. (Mkpughe 7:9-17; 2 Pita 2:5) Ị̀ maara na oké ìgwè mmadụ nke a zuru mba nile nke ndị Kraịst na-arụsi ọrụ ike dị adị ọbụna ugbu a? Ndị a nwere olileanya ịlanarị oké mkpagbu ahụ ma dịrị ndụ ebighị ebi n’elu ala. Ịdị adị ha bụ ihe àmà e ji n’aka nke ịdị nso nke Ụbọchị Ikpe.

Òle Ndị Ka A Ga-ekpe Ikpe?

A gaje ikpe oké ìgwè mmadụ nke a ikpe n’Ụbọchị Ikpe. Ma ha agaghị anọ nanị ha. Ihe ndekọ Jọn na-aga n’ihu, sị: “Oké osimiri wee nyeghachi ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ya; ọnwụ na hell nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ha: e wee kpee ha ikpe n’otu n’otu dị ka ọrụ nile ha si dị.” (Mkpughe 20:13, KJ) N’ebe a ka e nwere ihe àmà ọzọ nke na-egosi na ụmụ mmadụ adịghị ata ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi n’ime hell. Ọ bụrụ na hell enyeghachi ndị nwụrụ anwụ nọ n’ime ya, olee ụzọ onye ọ bụla pụrụ isi nọrọ n’ebe ahụ ruo mgbe ebighị ebi? N’eziokwu, hell nke Bible bụ ili nkịtị nke ihe a kpọrọ mmadụ, ebe ndị nwụrụ anwụ na-anọgide n’amaghị ihe ọ bụla na-echere mbilite n’ọnwụ. N’Ụbọchị Ikpe, a gaje iwepụtacha ndị nile nwụrụ anwụ nọ na hell kpam kpam.—Eklisiastis 9:10.

Òle ndị ka a ga-akpọlite n’ọnwụ n’Ụbọchị Ikpe? Pọl onyeozi sịrị: “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” (Ọrụ 24:15) Ya mere, a gaje ịkpọlite ndị ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi, bụ́ “ndị ezi omume.” Ma a gajekwa ịkpọlite ọtụtụ ndị ọzọ a na-apụghị ịgụta ọnụ, bụ́ “ndị ajọ omume.” Ihe àmà gosiri na mbilite n’ọnwụ ahụ gaje ịgụnye ndị nile nwụworonụ, ndị ka nọ n’ime ili—e wezụgakwa ndị ọ bụla mmehie ha siri ike nke ukwuu nke na Chineke ekpewo ha rịị ikpe wee chọpụta na ha ekwesịghị ịdị ndụ ma ọlị.—Matiu 12:31.

Ikpe ahụ

Ma, gịnị ga-eme oké ìgwè mmadụ ahụ ndị lanarịrịnụ na ndị a kpọlitere n’ọnwụ n’Ụbọchị Ikpe? Bible na-asị: “E wee kpee ndị nwụrụ anwụ ikpe site n’ihe nile e dererịị n’akwụkwọ ahụ dị iche iche, dị ka ọrụ nile ha si dị.” Nke a bụ oge ime nnyocha. Ndị nile ndị dị njikere ime ihe kwekọrọ ‘n’ihe ndị ahụ e dererịị n’akwụkwọ ndị ahụ’—nke ihe àmà gosiri na ha bụ ihe ndị Chineke chọrọ ihe a kpọrọ mmadụ n’aka n’oge ahụ—ka a ga-edenye aha ha n’ime “akwụkwọ nke ndụ.” (Mkpughe 20:12) Ha ga-anọ n’ụzọ nke na-eduje ná ndụ ebighị ebi!

E mesịa, ọnwụ ọchụchụ àjà nke Kraịst ga-ewetazi abamuru anụ ahụ! Ndị e depụtara aha ha n’akwụkwọ nke ndụ n’oge ahụ agaghị adabakwa ọzọ n’ọrịa na n’ọnwụ. Kama nke ahụ, a ga-eji nwayọọ nwayọọ wetaghachi ha n’izu okè nke mmadụ, na-enye ha ndụ ebighị ebi ahụ nke e kwere ndị ahụ nwere okwukwe na Jisọs ná nkwa. Lee nnọọ olileanya kwesịrị ịrịba ama nke a bụ! Ma n’agbanyeghị nke ahụ, ihe àmà gosiri na ụfọdụ ndị ga-ajụ irubere ‘ihe ndị e deworo n’ime akwụkwọ ndị ahụ’ isi. Gịnị ga-eme ha? Ha agaghị enweta ndụ ebighị ebi. Kama nke ahụ, akụkụ akwụkwọ nsọ ahụ na-asị: “Onye ọ bụla nke a na-ahụghị aha ya n’ime akwụkwọ nke ndụ ahụ, a ga-atụba ya n’ime ọdọ ọkụ ahụ.”—Mkpughe 20:15, KJ.

Nke a ọ̀ bụ ọkụ ala mmụọ ahụ Krisendọm na-ekwu okwu banyere ya? Ee e, n’ihi na n’amaokwu bu nke a ụzọ, anyị na-agụ, sị: “E wee tụba ọnwụ na hell n’ime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke abụọ.” (Mkpughe 20:14, KJ) Ọ bụrụ na a na-atụba hell n’ime ọdọ ọkụ ahụ, ọdọ ọkụ ahụ apụghị ịbụ ọkụ ala mmụọ n’onwe ya. Karịa nke ahụ, ọnwụ abụghị ihe a pụrụ ijide aka, nke a pụrụ ịtụtụlite wee tụba ya n’otu ebe. Ya mere, ọdọ ọkụ ahụ aghaghị ịbụ ihe atụ. Nke gịnị? Bible na-asị: “Nke a bụ onwụ nke abụọ.” Mgbe a tụbara ọnwụ na Hedis n’ime ọdọ ọkụ ahụ, ha “na-anwụ,” kwụsị ịdị adị. N’otu aka ahụ, ụmụ mmadụ ndị na-enupụ isi ndị na-ejedebe n’ebe ahụ na-anwụ ma ọ bụ kwụsị ịdị adị. Ma, nke a bụ ọnwụ nke abụọ, nke a na-enweghị olileanya mbilite n’ọnwụ site na ya.

Ụbọchị Ikpe—Oge Inwe Olileanya

Ya mere, mgbe anyị na-atụle ihe banyere Ụbọchị Ikpe, anyị ekwesịghị ịtụ oké egwu ma ọ bụ na-ele ya anya dị ka ihe arụ. Ụbọchị Ikpe bụ oge inwe olileanya, oge a ga-eweghachiri ihe a kpọrọ mmadụ ndụ ebighị ebi ahụ nke Adam tụfuru. Gee ntị ná ngọzi ndị ọ ga-ewetara ndị ahụ e kpere ikpe dị ka ndị kwesịrị ntụkwasị obi: “Lee, ụlọ ikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke ya, Chineke onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo.”—Mkpughe 21:3, 4.

N’ọgwụgwụ nke Ụbọchị Ikpe ahụ nke ga-adịru otu puku afọ, ụmụ mmadụ kwesịrị ntụkwasị obi site n’akụkụ nile nke ala ga-emesịa bụrụ ndị zuru okè. Ha ‘ga-adịworị ndụ’ n’echiche ya zuru ezu, Ụbọchị Ikpe ahụ ga-emezuwokwarị nzube ya. (Mkpughe 20:5) Mgbe ahụ, dị ka Bible na-ekwu, a ga-enye Setan ohere n’ebe ihe a kpọrọ mmadụ nọ nke ikpeazụ ya. (Mkpughe 20:3, 7-10) Ndị guzogidere ya n’oge nke ikpeazụ a ga-enweta mmezu zuru ezu nke nkwa Bible ahụ bụ: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 37:29.

Lee nnọọ ndokwa magburu onwe ya Ụbọchị Ikpe bụ. Leekwa ka o si bụrụ ihe kwesịrị ịrịba ama na anyị pụrụ ịkwadebe maka ya ọbụna ugbu a, site n’ịmụ Bible, ịmụta ihe bụ uche Chineke, na itinye uche Chineke nke a ná ndụ anyị! Ka a sịkwa ihe mere onye ọbụ abụ ji kwupụta ọṅụ n’iche echiche banyere ikpe nke Chineke mgbe o dere, sị: “Ka eluigwe ṅụrịa, ka ụwa tegharịakwa egwú ọṅụ; ka oké osimiri bigbọọ, ya na ùjú ya; ka ọhịa ṅụrịa ọṅụ agha, ya na ihe nile nke dị n’ime ya; mgbe ahụ osisi nile nke oké ọhịa ga-eti mkpu ọṅụ; n’ihu Jehova, n’ihi na ọ bịawo; n’ihi na ọ bịawo ikpe ụwa ikpe.”—Abụ Ọma 96:11-13.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya