Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w98 7/1 p. 19-24
  • “A Gaje Ime Ka Ọnwụ Ghara Ịdị Irè”

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • “A Gaje Ime Ka Ọnwụ Ghara Ịdị Irè”
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụdị Ahụ Dị Aṅaa?
  • Ọ̀ Bụ Mbilite n’Ọnwụ Ịnọ n’Elu Ala?
  • Ònye Na-abịaghachi?
  • Mbilite n’Ọnwụ Dị n’Usoro
  • Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Nwere Ike
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2000
  • “Olee Otú A Ga-esi Kpọlite Ndị Nwụrụ Anwụ?”
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • Olileanya Mbilite n’Ọnwụ Bụ Ihe E Ji n’Aka
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2020
  • ‘A Ga-eme Ka Ndị Nwụrụ Anwụ Si n’Ọnwụ Bilie’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1998
w98 7/1 p. 19-24

“A Gaje Ime Ka Ọnwụ Ghara Ịdị Irè”

“Dị ka onye iro ikpeazụ, a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.”—1 NDỊ KỌRINT 15:26.

1, 2. (a) Olileanya dị aṅaa ka Pọl onyeozi na-ekwupụta maka ndị nwụrụ anwụ? (b) Ajụjụ dị aṅaa banyere mbilite n’ọnwụ ka Pọl zara?

“M KWERE ná . . . mbilite n’ọnwụ nke ahụ, na ndụ ebighị ebi.” Otú ahụ ka Ụkpụrụ Okwukwe Ndị Ozi kwuru. Ndị Katọlik na ndị Protestant ji ịdị uchu ekwughachi ya, n’amatachaghị na nkwenkwe ha yiri nkà ihe ọmụma ndị Gris karịa ihe ọ bụla ndị ozi kweretụworo. Otú ọ dị, Pọl onyeozi jụrụ nkà ihe ọmụma ndị Gris, o kweghịkwa ná mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. Ma, o kwenyesiri ike ná ndụ dị n’ihu ma dee n’ike mmụọ nsọ, sị: “Dị ka onye iro ikpeazụ, a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrint 15:26) Gịnị nnọọ ka nke ahụ pụtara nye ihe a kpọrọ mmadụ na-anwụ anwụ?

2 N’ịza ya, ka anyị laghachi ná ntụle Pọl banyere mbilite n’ọnwụ nke e dekọrọ ná 1 Ndị Kọrint isi nke 15. Ị ga-echeta na n’amaokwu ndị mbụ ya, Pọl mere ka mbilite n’ọnwụ doo anya dị ka akụkụ dị mkpa nke ozizi ndị Kraịst. Ugbu a ọ na-aza otu ajụjụ kpọmkwem, sị: “Ma otu onye ga-asị, È si aṅaa eme ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie? ọ̀ bụkwa aha ahụ gịnị ka ha ji bịa?”—1 Ndị Kọrint 15:35.

Ụdị Ahụ Dị Aṅaa?

3. Gịnị mere ụfọdụ ji jụ mbilite n’ọnwụ?

3 N’iwelite ajụjụ a, Pọl pụrụ ibuworị n’uche ịgbagha mmetụta nke nkà ihe ọmụma Plato. Plato kụziri na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ nke na-adịgide mgbe ahụ nwụsịrị. Nye ndị e ji echiche dị otú ahụ zụlite, obi abụọ adịghị ya na nkụzi ahụ nke ndị Kraịst na-eyi ihe na-adịghị mkpa. Ọ bụrụ na mkpụrụ obi na-adịgide mgbe ahụ nwụsịrị, gịnị bụ uru nke mbilite n’ọnwụ? Ọzọkwa, o yikarịrị ka mbilite n’ọnwụ yiri ihe ezi uche na-adịghị na ya. Ozugbo ahụ reworo ghọọ ájá, olee otú a pụrụ isi nwee mbilite n’ọnwụ? Onye na-akọwa Bible bụ́ Heinrich Meyer sịrị na omume mmegide nke ụfọdụ ndị Kọrint dabeere ma eleghị anya “n’echiche nkà ihe ọmụma nke na mweghachi nke ihe ndị mejupụtara ahụ agaghị ekwe mee.”

4, 5. (a) N’ihi gịnị ka ọjụjụ nke ndị na-enweghị okwukwe jụrụ ji bụrụ nke ezi uche na-adịghị na ya? (b) Kọwaa ilu Pọl banyere “mkpụrụ efu.” (ch) Ụdị ahụ dị aṅaa ka Chineke na-enye ndị e tere mmanụ e mere ka ha si n’ọnwụ bilie?

4 Pọl na-ekpughe ịbụ ihe nzuzu nke echiche ha: “Onye na-enweghị uche, a dịghị eme ka mkpụrụ gị onwe gị na-agha dị ndụ, ma ọ bụrụ na ọ nwụghị anwụ: ihe ị na-aghakwa, ọ bụghị ahụ ga-apụta ka ị na-agha, kama ọ bụ mkpụrụ efu, ma eleghị anya ọ ga-abụ ọka, ma ọ bụ mkpụrụ ọ bụla n’ime mkpụrụ fọdụrụ; ma Chineke na-enye ya ahụ dị ka Ọ chọrọ, na-enyekwa mkpụrụ ọ bụla n’ime mkpụrụ nile ahụ nke aka ya.” (1 Ndị Kọrint 15:36-38) Chineke agajeghị ịkpọlite ahụ ndị mmadụ nwere mgbe ha nọ n’elu ala. Kama nke ahụ, a gaje inwe nnwogha.

5 Pọl ji mbilite n’ọnwụ tụnyere mpulite nke mkpụrụ. Ntakịrị mkpụrụ ọka wheat adịghị eyitụ ihe ọkụkụ nke ga-esi na ya pulite. The World Book Encyclopedia na-asị: “Mgbe mkpụrụ osisi malitere ipulite, ọ na-amịrị mmiri dị ukwuu. Mmiri ahụ na-akpata ọtụtụ mgbanwe mmiri ọgwụ n’ime mkpụrụ ahụ. Ọ na-emekwa ka ahụ nke ime mkpụrụ osisi ahụ koo ma gbawapụta ná mkpo nke mkpụrụ ahụ.” N’ikwu ya n’ụzọ ọzọ, mkpụrụ ahụ na-anwụ dị ka mkpụrụ ma ghọọ ihe ọkụkụ na-etolite etolite. “Chineke na-enye ya ahụ” n’echiche nke na o guzobere iwu sayensị ndị na-achịkwa uto ya, mkpụrụ nke ọ bụla na-anatakwa ahụ dị ka ụdị ya si dị. (Jenesis 1:11) N’otu aka ahụ, ndị Kraịst e tere mmanụ na-ebu ụzọ nwụọ dị ka mmadụ. E mesịa, n’oge Chineke kara aka, ọ na-eweghachi ha ná ndụ n’ahụ ọhụrụ kpam kpam. Dị ka Pọl gwara ndị Filipaị, “Jisọs Kraịst . . . ga-eme ahụ nke ọnọdụ anyị dị ala ka o nwee oyiyi ọhụrụ, ka ya na ahụ nke ebube Ya wee nwekọọ otu ụdị.” (Ndị Filipaị 3:20, 21; 2 Ndị Kọrint 5:1, 2) A na-eme ka ha si n’ọnwụ bilie n’ahụ nke mmụọ ma biri n’ógbè ndị bụ́ mmụọ.—1 Jọn 3:2.

6. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na Chineke pụrụ inye ndị e mere ka ha si n’ọnwụ bilie ahụ mmụọ kwesịrị ekwesị?

6 Nke a ò siri oké ike ikwere? Ee e. Pọl tụgharịrị uche na ụmụ anụmanụ na-enwe ọtụtụ ụdị ahụ dị iche iche. Tụkwasị na nke a, o gosiri ọdịiche dị n’etiti ndị mmụọ ozi nke eluigwe na ụmụ mmadụ nwere anụ ahụ na ọbara, na-asị: “Ahụ nke eluigwe na ahụ nke ụwa dịkwa.” E nwekwara ndịrịta iche dị ukwuu n’ihe ndị e kere eke na-adịghị ndụ. “Otu kpakpando dị iche n’ahụ kpakpando ọzọ n’ebube,” ka Pọl kwuru, ogologo oge tupu sayensị achọpụta ihe ndị dị na mbara igwe dị otú ahụ dị ka blue stars, red giants, na white dwarfs. N’ihi nke a, ọ́ bụghị ihe ezi uche dị na ya na Chineke pụrụ inye ndị e tere mmanụ e mere ka ha si n’ọnwụ bilie ahụ mmụọ?—1 Ndị Kọrint 15:39-41.

7. Gịnị ka ereghị ure pụtara? anwụghị anwụ pụtara?

7 Pọl ekwuzie, sị: “Otú a ka mbilite n’ọnwụ nke ndị nwụrụ anwụ dịkwa. A na-agha ya n’ire ure; a na-eme ka o si n’ọnwụ bilie n’ereghị ure.” (1 Ndị Kọrint 15:42) Ahụ mmadụ, ọbụna mgbe o zuru okè, pụrụ ire ure. A pụrụ igbu ya. Dị ka ihe atụ, Pọl kwuru na Jisọs ahụ e mere ka o si n’ọnwụ bilie ‘agajeghị ịlaghachi n’ire ure ọzọ.’ (Ọrụ 13:34) Ọ dịghị mgbe ọ ga-abịaghachi ná ndụ n’ahụ mmadụ na-ere ure, ọ bụ ezie na o zuru okè. Ahụ ndị Chineke na-enye ndị e tere mmanụ e mere ka ha si n’ọnwụ bilie apụghị ire ure—nke na-apụghị ịnwụ anwụ ma ọ bụ mebie. Pọl na-aga n’ihu, sị: “A na-agha ya n’ihe ihere; a na-eme ka o si n’ọnwụ bilie n’ebube: a na-agha ya n’adịghị ike; a na-eme ka o si n’ọnwụ bilie n’ike: a na-agha ya ahụ nke mkpụrụ obi na-achị; a na-eme ka o si n’ọnwụ bilie ahụ nke Mmụọ dị n’ime ya na-achị.” (1 Ndị Kọrint 15:43, 44) Ọzọkwa, Pọl na-asị: “Ahụ a nke pụrụ ịnwụ anwụ aghaghị iyikwasị anwụghị anwụ.” Anwụghị anwụ pụtara ndụ na-adịghị agwụ agwụ, nke a na-apụghị ibibi ebibi. (1 Ndị Kọrint 15:53; Ndị Hibru 7:16) N’ụzọ dị otú a, ndị e mere ka ha si n’ọnwụ bilie na-enwe “onyinyo nke Onye eluigwe ahụ,” bụ́ Jisọs, onye mere ka mbilite n’ọnwụ ha kwe omume.—1 Ndị Kọrint 15:45-49.

8. (a) Olee otú anyị si mara na ndị e mere ka ha si n’ọnwụ bilie bụ otu mmadụ ahụ ha bụ mgbe ha dị ndụ n’elu ala? (b) Amụma ndị dị aṅaa ka a ga-emezu mgbe mbilite n’ọnwụ weere ọnọdụ?

8 N’agbanyeghị nnwogha a, ndị e mere ka ha si n’ọnwụ bilie ka bụkwa ndị ha bụ tupu ha anwụọ. A ga-eme ka ha si n’ọnwụ bilie na-enwe otu ikike ncheta ahụ na otu àgwà ndị Kraịst ahụ magburu onwe ya. (Malakaị 3:3; Mkpughe 21:10, 18) Ha yiri Jisọs Kraịst na nke a. Ọ gbanwere site na mmụọ gaa n’ụdị mmadụ. E mesịa ọ nwụrụ, e mekwara ka o si n’ọnwụ bilie dị ka mmụọ. Ma, “Jisọs Kraịst dị otu aka ahụ [ụnyaahụ] na taa, ee, ruokwa mgbe nile ebighị ebi.” (Ndị Hibru 13:8) Lee ihe ùgwù dị ebube ndị e tere mmanụ nwere! Pọl na-asị: “Ma mgbe ọ bụla ahụ a nke pụrụ ire ure ga-eyikwasịworị ereghị ure, mgbe ahụ a nke pụrụ ịnwụ anwụ ga-eyikwasịworị anwụghị anwụ kwa, mgbe ahụ okwu ahụ e deworo n’akwụkwọ nsọ ga-eme, bụ́, E loro ọnwụ ruo mmeri. Ọnwụ, olee ebe mmeri gị dị? Ọnwụ, olee ebe ihe ọgbụgba gị dị?”—Ndị Kọrint 15:54, 55; Aịsaịa 25:8; Hosea 13:14.

Ọ̀ Bụ Mbilite n’Ọnwụ Ịnọ n’Elu Ala?

9, 10. (a) N’ihe gbara 1 Ndị Kọrint 15:24 gburugburu, gịnị bụ “ọgwụgwụ ihe nile,” ihe omume dịkwa aṅaa na-ewere ọnọdụ n’ihe banyere ya? (b) Olee ihe na-aghaghị iwere ọnọdụ ka e wee mee ka ọnwụ ghara ịdị irè?

9 È nwere ọdịnihu ọ bụla dịịrị ọtụtụ nde ndị na-enweghị olileanya ndụ anwụghị anwụ nke ịbụ mmụọ n’eluigwe? N’ezie e nwere! Mgbe ọ kọwasịrị na mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe ga-ewere ọnọdụ n’oge ọnụnọ Kraịst, Pọl kọwapụtara ihe omume ndị ga-esochi, na-asị: “E mesịa ọgwụgwụ ihe nile ga-abịa, mgbe ọ bụla ọ ga-arara alaeze Ya nye n’aka Chineke, Onye bụkwa Nna; mgbe ọ bụla Ọ ga-emeworị ka ọbụbụisi nile na ịchịisi nile na ike nile ghara ịdị irè.”—Ndị Kọrint 15:23, 24.

10 “Ọgwụgwụ ihe nile” bụ ọgwụgwụ nke Ọchịchị Puku Afọ Kraịst, mgbe Jisọs ga-eji obi umeala na iguzosi ike n’ihe nyefee Chineke na Nna ya Alaeze ahụ. (Mkpughe 20:4) A ga-emezuworị nzube Chineke nke “ịchịkọta ihe nile n’ime Kraịst anyị.” (Ndị Efesọs 1:9, 10) Otú ọ dị, tupu nke ahụ, Kraịst ga-ebibiworị “ọbụbụisi nile na ịchịisi nile na ike nile” na-emegide uche Eze Onyenwe anyị Chineke. Nke a na-agụnye ihe karịrị mbibi a ga-eweta n’Amagedọn. (Mkpughe 16:16; 19:11-21) Pọl na-asị: “[Kraịst aghaghị] ịbụ eze, ruo mgbe Ọ ga-edebeworị ndị iro Ya nile n’okpuru ụkwụ Ya. Dị ka onye iro ikpeazụ, a gaje ime ka ọnwụ ghara ịdị irè.” (1 Ndị Kọrint 15:25, 26) Ee, a ga-ewepụworị ihe nile metụtara mmehie na ọnwụ sitere n’Adam. Mgbe ahụ, dị ka ọ dị mkpa, Chineke ga-ewepụtasịworị ihe ndị nọ “n’ili” site n’iweghachi ndị nwụrụ anwụ ná ndụ.—Jọn 5:28.

11. (a) Olee otú anyị si mara na Chineke pụrụ ikegharị mkpụrụ obi nwụrụ anwụ? (b) Ụdị ahụ ndị dị aṅaa ka a ga-enye ndị ahụ a kpọlitere n’ọnwụ gaa n’elu ala?

11 Nke a pụtara ikegharị mkpụrụ obi ụmụ mmadụ. Ọ̀ bụ ihe na-agaghị ekwe omume? Ee e, n’ihi na Abụ Ọma 104:29, 30 na-emesi anyị obi ike na Chineke pụrụ ime otú ahụ: “Ị na-achịkọta mmụọ ha, ha ekubie ume, wee laghachi n’ájá ha. Ị na-ezipụ Mmụọ Gị, e kee ha.” Ọ bụ ezie na ndị e mere ka ha si n’ọnwụ bilie ga-abụ otu ụdị mmadụ ahụ ha bụ tupu ọnwụ ha, ọ gaghị adị ha mkpa inwe otu ụdị ahụ ahụ. Dị ka ọ dị ndị ahụ a kpọlitere gaa n’eluigwe, Chineke ga-enye ha ahụ dị nnọọ ka o si masị ya. Obi abụọ adịghị ya na ahụ ọhụrụ ha ga-adị ezigbo mma n’ụzọ nkịtị, yiekwa ahụ ha mbụ n’ụzọ ezi uche dị na ya nke na ndị ha hụrụ n’anya ga-amata ha.

12. Olee mgbe mbilite n’ọnwụ ịnọ n’elu ala na-ewere ọnọdụ?

12 Olee mgbe mbilite n’ọnwụ ịnọ n’elu ala ga-ewere ọnọdụ? Mata kwuru banyere nwanne ya nwoke nwụrụ anwụ, bụ́ Lazarọs, sị: “Amatara m na ọ ga-esi n’ọnwụ bilie ná mbilite ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ.” (Jọn 11:24) Olee otú o si mara nke ahụ? Mbilite n’ọnwụ bụ ihe a na-esere okwu n’ụbọchị ya, ebe ọ bụ na ndị Farisii kweere ya ma ndị Sadusii ekweghị. (Ọrụ 23:8) Ma, Mata aghaghị ịmaraworị banyere ndị àmà biri tupu oge ndị Kraịst bụ́ ndị nwere olileanya ná mbilite n’ọnwụ. (Ndị Hibru 11:35) Ọzọkwa, ọ pụrụ ịghọtawo site na Daniel 12:13 na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ n’ụbọchị ikpeazụ. Ọbụna ọ pụrụ ịmụtawo nke a site n’ọnụ Jisọs n’onwe ya. (Jọn 6:39) ‘Ụbọchị ikpeazụ’ ahụ na Ọchịchị Puku Afọ nke Kraịst dabakọrọ. (Mkpughe 20:6) Chetụdị mkpali a ga-enwe “n’ụbọchị” ahụ mgbe ihe omume ndị a dị ebube ga-amalite!—Tụlee Luk 24:41.

Ònye Na-abịaghachi?

13. Ọhụụ dị aṅaa nke mbilite n’ọnwụ ka e dekọrọ ná Mkpughe 20:12-14?

13 Ná Mkpughe 20:12-14 ka e dekọrọ ọhụụ Jọn banyere mbilite n’ọnwụ ịnọ n’elu ala: “M wee hụ ndị nwụrụ anwụ nile, ndị ukwu na ndị nta, ka ha na-eguzo n’ihu ocheeze ahụ; e wee saghee akwụkwọ dị iche iche: a saghekwara akwụkwọ ọzọ, nke bụ́ akwụkwọ nke ndụ: e wee kpee ndị nwụrụ anwụ ikpe site n’ihe nile e dererịị n’akwụkwọ ahụ dị iche iche, dị ka ọrụ nile ha si dị. Oké osimiri wee nyeghachi ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ya; ọnwụ na Hedis nyeghachikwara ndị nwụrụ anwụ dị n’ime ha: e wee kpee ha ikpe n’otu n’otu dị ka ọrụ nile ha si dị. E wee tụba ọnwụ na Hedis n’ime ọdọ ọkụ ahụ. Nke a bụ ọnwụ nke abụọ ahụ, bụ́ ọdọ ọkụ ahụ.”

14. Olee ndị ga-eso n’ime ndị ahụ e mere ka ha si n’ọnwụ bilie?

14 Mbilite n’ọnwụ ga-agụnye “ndị ukwu na ndị nta,” ma ndị a ma ama ma ndị a na-amaghị ama bụ́ ndị dịworo ndụ ma nwụọ. Leenụ, ọbụna ụmụ ọhụrụ ga-eso n’ime ha! (Jeremaịa 31:15, 16) N’Ọrụ 24:15, e kpughere nkọwa ọzọ dị mkpa: “Mbilite n’ọnwụ nke ndị ezi omume na nke ndị ajọ omume kwa gaje ịdị.” Ndị pụtara ìhè n’etiti “ndị ezi omume” ga-abụ ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi nke oge ochie, dị ka Ebel, Ịnọk, Noa, Abraham, Sera, na Rehab. (Ndị Hibru 11:1-40) Chetụdị banyere inwe ike iso ndị dị otú ahụ kwurịta okwu ma nweta nkọwa ihe omume Bible ndị mere ogologo oge gara aga n’ọnụ ndị ji anya ha hụ ya! “Ndị ezi omume” ga-agụnyekwa ọtụtụ puku ndị na-atụ egwu Chineke bụ́ ndị nwụworo na nso nso a, ndị na-enweghịkwa olileanya eluigwe. Ì nwere onye òtù ezinụlọ ma ọ bụ onye ị hụrụ n’anya nke pụrụ iso n’ime ndị a? Lee otú o si bụrụ ihe na-akasi obi ịmara na ị pụrụ ịhụ ha ọzọ! Otú ọ dị, ole ndị bụ́ “ndị ajọ omume” ga-abịaghachikwa? Ha na-agụnye ọtụtụ nde, ikekwe ọtụtụ ijeri, bụ́ ndị nwụrụ n’enweghị ohere ịbịa mụọ ma tinye eziokwu Bible n’ọrụ.

15. Gịnị ka ọ pụtara bụ́ na a ga-ekpe ndị na-alọghachi “ikpe site n’ihe nile e dererịị n’akwụkwọ ahụ dị iche iche”?

15 Olee otú a ga-esi kpee ndị na-abịaghachi “ikpe site n’ihe nile e dererịị n’akwụkwọ ahụ dị iche iche, dị ka ọrụ nile ha sị dị”? Akwụkwọ ndị a abụghị ihe ndekọ nke ihe ndị ha mere n’oge gara aga; mgbe ha nwụrụ, a tọhapụrụ ha site ná mmehie ndị ha mere n’oge ndụ ha. (Ndị Rom 6:7, 23) Otú ọ dị, mmadụ ndị e mere ka ha si n’ọnwụ bilie ka ga-anọ n’okpuru mmehie Adam. Mgbe ahụ, ọ ghaghị ịbụ na akwụkwọ ndị a ga-esetịpụ ntụziaka Chineke nke mmadụ nile na-aghaghị ịgbaso iji rite uru zuru ezu site n’àjà Jisọs Kraịst. Ka e wepụrụ ihe àmà ikpeazụ nke mmehie Adam, ‘a ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị irè’ n’ụzọ zuru ezu. Ka ọ na-erule ngwụsị nke puku afọ ahụ, Chineke ‘ga-abụ ihe nile n’ime ihe nile.’ (1 Ndị Kọrint 15:28) Ntinye aka nke Onyeisi Nchụàjà ma ọ bụ Onye Mgbapụta agakwaghị adị mmadụ mkpa. A ga-eweghachi ihe nile a kpọrọ mmadụ n’ọnọdụ ahụ zuru okè nke Adam nwere na mbụ.

Mbilite n’Ọnwụ Dị n’Usoro

16. (a) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe ezi uche dị na ya ikwere na mbilite n’ọnwụ ga-abụ nke dị n’usoro? (b) Ole ndị ka o yiri ga-eso n’ime ndị mbụ ga-esi ná ndị nwụrụ anwụ lọghachi?

16 Ebe mbilite n’ọnwụ gaa n’eluigwe dị n’usoro, “mmadụ nile n’otu n’otu n’usoro nke aka ha,” ihe àmà na-egosi na mbilite n’ọnwụ ịnọ n’elu ala agaghị akpata oké ịrị elu na-adịghị n’usoro nke ụba mmadụ. (1 Ndị Kọrint 15:23) N’ụzọ kwere nghọta, ndị ahụ a ka mere ka ha si n’ọnwụ bilie ga-achọ ka e lekọta ha anya. (Tụlee Luk 8:55.) Ha ga-achọ ihe anụ ahụ e ji akwado ndụ na—nke ka mkpa—enyemaka ime mmụọ n’inweta ihe ọmụma na-enye ndụ nke Jehova Chineke na Jisọs Kraịst. (Jọn 17:3) Ọ bụrụ na mmadụ nile ga-abịaghachi ná ndụ n’otu mgbe, ọ gaghị ekwe mee ilekọta ha n’ụzọ zuru ezu. Ọ bụ ihe ezi uche dị na ya iche na mbilite n’ọnwụ ga-ewere ọnọdụ n’ụzọ na-aga n’ihu n’ihu. O yiri ka ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị nwụrụ nwa mgbe tupu ọgwụgwụ nke usoro ihe Setan ga-eso n’ime ndị mbụ a ga-akpọlite. Anyị pụkwara ịtụ anya na ndị ikom oge ochie kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ ndị ga-eje ozi dị ka “ndị isi” ga-eso ná ndị mbụ a ga-eme ka ha si n’ọnwụ bilie.—Abụ Ọma 45:16.

17. Gịnị bụ okwu ndị metụtara mbilite n’ọnwụ ndị Bible gbachiri nkịtị na ha, n’ihi gịnịkwa ka ndị Kraịst na-ekwesịghị iji na-echegbukarị onwe ha banyere okwu ndị dị otú ahụ?

17 Otú o sina dị, anyị ekwesịghị ikwesi olu ike n’okwu ndị dị otú ahụ. Bible gbachiri nkịtị n’ọtụtụ okwu. O kwupụtaghị ihe nile banyere otú, mgbe, ma ọ bụ ebe mbilite n’ọnwụ nke ndị mmadụ n’otu n’otu ga-ewere ọnọdụ. Ọ gwaghị anyị otú a ga-esi nye ndị ahụ na-alọghachite ụlọ, nri, na uwe. Anyị apụghịkwa ikwu hoo haa otú Jehova ga-esi hazie okwu ndị dị ka ịzụ na ilekọta ụmụaka ndị e mere ka ha si n’ọnwụ bilie ma ọ bụ otú ọ ga-esi mee ihe banyere ọnọdụ ụfọdụ ndị pụrụ imetụta ndị enyi anyị na ndị anyị hụrụ n’anya. N’eziokwu, ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị iche banyere ihe ndị dị otú ahụ; ma ọ ga-abụ ihe amamihe na-adịghị na ya itinye oge n’ịnwa ịza ajụjụ ndị a na-apụghị ịzali ugbu a. Ihe anyị na-elekwasị anya aghaghị ịbụ ijere Jehova ozi n’ikwesị ntụkwasị obi na inweta ndụ ebighị ebi. Ndị Kraịst e tere mmanụ na-eme ka olileanya ha dabere ná mbilite n’ọnwụ dị ebube gaa n’eluigwe. (2 Pita 1:10, 11) “Atụrụ ọzọ” ahụ na-ele anya ihe nketa ebighị ebi n’ógbè elu ala nke Alaeze Chineke. (Jọn 10:16; Matiu 25:33, 34) Banyere ọtụtụ nkọwa metụtara mbilite n’ọnwụ ndị a na-amaghị, anyị na-atụkwasị nnọọ Jehova obi. Ọ dịghị ihe ga-eme obi ụtọ anyị n’ọdịnihu nke dị n’aka Onye ahụ nke pụrụ ‘iwere ihe dị ihe ọ bụla dị ndụ ụtọ mee ka afọ ju ya.’—Abụ Ọma 145:16; Jeremaịa 17:7.

18. (a) Mmeri dị aṅaa ka Pọl na-eme ka ọ pụta ìhè? (b) N’ihi gịnị ka anyị ji eji obi ike atụkwasị obi n’olileanya mbilite n’ọnwụ?

18 Pọl mechiri okwu ya site n’iti mkpu, sị: “Ekele dịrị Chineke, Onye na-enye anyị mmeri site n’aka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst.” (1 Ndị Kọrint 15:57) Ee, a na-emeri ọnwụ Adam site n’àjà mgbapụta Jisọs Kraịst, ma ndị e tere mmadụ ma “atụrụ ọzọ” ahụ na-ekerekwa òkè ná mmeri ahụ. N’ezie, “atụrụ ọzọ” ndị dị ndụ taa nwere olileanya nke pụrụ iche n’ebe ọgbọ a dị. Dị ka akụkụ nke otu “oké ìgwè mmadụ” na-amụbawanyenụ, ha pụrụ ịlanarị “oké mkpagbu” ahụ na-abịa, gharakwa ịnwụ ọnwụ nkịtị ma ọlị! (Mkpughe 7:9, 14) Otú ọ dị, ọbụna ndị nwụrụ n’ihi “mgbe na ihe ndapụta” ma ọ bụ n’aka ndị ọrụ Setan pụrụ itinye obi ike ha n’olileanya mbilite n’ọnwụ ahụ.—Eklisiastis 9:11.

19. Agbamume dị aṅaa ka ndị Kraịst nile na-aghaghị ịṅa ntị na ya taa?

19 Ya mere, anyị na-echesi ụbọchị ahụ ike mgbe a ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị irè. Ntụkwasị obi anyị na-adịghị ada ada ná nkwa Jehova maka mbilite n’ọnwụ na-eme ka anyị lee ihe anya n’ụzọ ezi uche dị na ya. Ihe ọ bụla mere anyị ná ndụ a—ọ bụrụgodị na anyị ga-anwụ—ọ dịghị ihe ga-anapụ anyị ụgwọ ọrụ ahụ Jehova kweworo ná nkwa. N’ihi ya, agbamume ikpeazụ nke Pọl nye ndị Kọrint dabara adaba taa dị ka ọ dị na puku afọ abụọ gara aga: “Ya mere, ụmụnna m m hụrụ n’anya, guzosienụ ike, bụrụnụ ndị a na-apụghị ifopụ efopụ, ndị na-arụbiga ọrụ Onyenwe anyị ókè mgbe nile, ebe unu matara na ndọgbu unu na-adọgbu onwe unu n’ọrụ abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị.”—1 Ndị Kọrint 15:58.

Ị̀ Pụrụ Ịkọwa?

◻ Olee otú Pọl si zaa ajụjụ banyere ụdị ahụ ndị e tere mmanụ ga-enwe mgbe e mere ka ha si n’ọnwụ bilie?

◻ N’ụzọ dị aṅaa, ọ bụkwa ole mgbe ka a ga-eme ka ọnwụ ghara ịdị irè kpam kpam?

◻ Olee ndị a ga-agụnye ná mbilite n’ọnwụ ịnọ n’elu ala?

◻ Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị metụta okwu ndị Bible gbachiri nkịtị na ha?

[Foto ndị dị na peeji nke 20]

Mkpụrụ osisi “na-anwụ” site n’ịgabiga mgbanwe dị ịrịba ama

[Foto ndị dị na peeji nke 23]

Ndị ikom na ndị inyom kwesịrị ntụkwasị obi nke oge ochie, dị ka Noa, Abraham, Sera, na Rehab, ga-eso n’ime ndị a ga-eme ka ha si n’ọnwụ bilie

[Foto dị na peeji nke 24]

Mbilite n’ọnwụ ga-abụ oge oké ọṅụ!

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya