Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w90 7/15 p. 3-6
  • N’Isi Nso—Ụwa Nke Ihe Mgbu Na-adịghị!

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’Isi Nso—Ụwa Nke Ihe Mgbu Na-adịghị!
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ̀ Bụ Chineke Ka Ụta Dịịrị?
  • Otú Ihe Mgbu Ga-esi Gwụsịa
  • Olee Mgbe Ihe Mgbu Ga-agwụsị?
  • Mkpughe 21:4—“Ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri niile dị ha n’anya”
    Amaokwu Baịbụl Ndị A Kọwara
  • “Lee! Ana M Eme Ihe Niile Ka Ha Dị Ọhụrụ”
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2013
  • Nhụjuanya Ụmụ Mmadụ—n’Ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Ọ Dịrị?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1990
w90 7/15 p. 3-6

N’Isi Nso—Ụwa Nke Ihe Mgbu Na-adịghị!

ỤWA nke ihe mgbu na-adịghị na ya ọ̀ na-abịa n’isi nso? Lee nnọọ akụkọ na-enye obi ụtọ nke ahụ ga-abụrụ ndị taworo ahụhụ ruo ogologo oge—ma ihe mgbu ha ọ̀ bụ nke anụ ahụ, nke uche, ma ọ bụ nke mmetụta! Dị ka ihe atụ, ọ ga-abụrụ ọtụtụ nde mmadụ ihe oké ọṅụ ịhụ na e wepụwo oké ihe mgbu anụ ahụ nke ụdị ọrịa cancer ụfọdụ na-akpata, ihe otiti nke ọrịa ihe osise bụ tic douloureux, na ọrịa obi ahụ bụ angina pectoris. Ndị nwere oké nsogbu nke uche ga-enwe obi ụtọ ịbụ ndị a tọhapụrụ site n’ịta ahụhụ ha, bụ́ nke ọ na-esikarị ike ịkọwa akọwa. Ọtụtụ nde ndị ọzọ ga-enwekwa ọṅụ ma a sị na ihe mgbu nke uche ha na-enweta site ná mmetụta ndị dị ka egwu, iru újú, amamikpe akọ na uche, nchegbu, na nchekasị, agwụsịa. Ma ànyị chọrọ n’ezie ịhụ ọgwụgwụ nke ihe mgbu nile?

Onyeọkà mmụta akụkụ ahụ dị iche iche, bụ́ Allan Basbaum nke University of California nke dị na San Francisco, kwuru, sị, “Enweghị ihe mgbu ma ọlị bụ oké ọdachi.” O nwere ezi ihe mere o ji kwuo otú ahụ. Dị ka ihe na-agba àmà, ihe ịfụ mmadụ ụfụ n’ahụ na-eme ka anyị mara na ọ dị ihe na-emerụ ahụ nke na-emenụ.

Enweghị ike ịnụ ụfụ ihe n’anụ ahụ pụrụ ịbụ ihe ọdachi n’ezie. E mere ihe atụ banyere nke a n’akụkọ nke a dị na magazin bụ Time: “E nwere oké ọdịiche n’etiti ọmarịcha ihu ọchị nke nwa okoro nta ahụ dị afọ iri na abụọ na ọdịdị ahụ ya nke kwesịrị imere ebere. Aka na ụkwụ ya kwarụsịrị akwarụ, hịkọsịakwa ahịkọ, dị ka à ga-asị na ọ rịawo ọrịa rickets. Ọtụtụ n’ime mkpịsị aka ya adịghịzi. Otu nnukwute ọnyá dị n’otu ikpere ya, ọ tarisịwokwa egbugbere ọnụ ahụ nke na-achị ọchị. O yiri nnọọ nwata nke a na-eti ihe nke ukwuu. . . . O bu otu ụdị ọrịa a na-adịghị ahụkebe wee pụta ụwa, bụ́ nke na-eme ka ọ ghara ịdị na-anụ ụfụ ihe. Ihe kụpịasịrị mkpịsị aka ya ma ọ bụkwanụ ọkụ rere ha n’ihi na o wepụghị aka ya site n’ihe ndị dị ọkụ ma ọ bụ ihe ndị na-emerụ ahụ. Ọkpụkpụ na nkwonkwo ya nile hịkọsịrị ahịkọ n’ihi na ọ na-amasibiga ụkwụ n’ala ike ókè mgbe ọ na-aga ije ma ọ bụ mgbe ọ na-agba ọsọ. Ọnyá na-aba ya n’ikpere site n’igbe igbe n’elu ihe ndị dị nkọ, bụ́ ndị ọ na-adịghị enwe mmetụta ha. Ọ bụrụ na ọkpụkpụ ya agbajie ma ọ bụ ọ bụrụ na ọkpụkpụ úkwù ya ekwopụ, ọ naghị anụ ụfụ ya ruo n’ókè nke iti mkpu ka a bịa nyere ya aka.”

Ụfọdụ ndị na-eme ngwa n’ịta Chineke ụta maka ụdị ihe otiti dị otú ahụ nakwa maka ahụhụ nke ọtụtụ nde mmadụ na-ata. Otú ọ dị, ànyị pụrụ izi ezi n’ịta Chineke ụta maka ntaramahụhụ ihe mgbu nke ihe a kpọrọ mmadụ?

Ọ̀ Bụ Chineke Ka Ụta Dịịrị?

Ruo ihe dị ka 6,000 afọ ugbu a, ihe a kpọrọ mmadụ anọwo n’ịbụ ohu nye ihe mgbu nke anụ ahụ, nke uche, na nke mmetụta. N’eziokwu, ihe dị ka nari afọ iri na itoolu gara aga, onyeozi ndị Kraịst ahụ bụ Pọl kwuru n’ụzọ ziri ezi, sị: “Ihe e kere eke nile na-asụkọ ude, ime na-emekọkwa ha, ruo ugbu a.” (Ndị Rom 8:22) N’agbanyeghị ụdị ọgwụ dị iche iche e ji akwụsị ahụ mgbu ndị a na-azụta n’ebe a na-ere ọgwụ nakwa mgbalị nile nke ndị dọkịta na ndị ọkà n’ịgwọ ọrịa uche, ịbụ ohu nye ụdị ihe mgbu dị iche iche nọgidere na-aga n’ihu. Ee, ụfọdụ ndị akọchawo Chineke n’ihi ahụhụ nile ha na-ata, ọbụna dị ka nwunye nke nwoke ahụ bụ Job gbara ya ume ka o mee n’ọtụtụ narị afọ gara aga! Otú ọ dị, dị ka nwoke ahụ ghọtara n’onwe ya, mmụọ dị otú ahụ bụ nke nzuzu, bụrụkwa nke na-ezighị ezi.—Job 2:9, 10.

O zighị ezi ịta Chineke ụta maka ịbụ ohu nye ihe mgbu nke ụmụ mmadụ nọ na ya taa. Kama nke ahụ, ụta dịịrị onye ụgha ahụ a na-adịghị ahụ anya nakwa nne na nna mbụ anyị. Ò si aṅaa dị otú ahụ?

Akwụkwọ nsọ na-egosi na, ọ bụ ezie na ọ bụbu onye ezi omume, otu mmụọ e kere eke malitere inwe anyaukwu maka ike na ịbụ onye a ma ama. Ná mmalite nke ndụ mmadụ n’elu ala, o jiri anya nke uche ya hụ agbụrụ ihe a kpọrọ mmadụ ndị bi n’elu ala nke bụ paradaịs, ndị na-enye Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile, bụ́ Jehova, nsọpụrụ zuru ezu. N’ịbụ onye a kpaliri site n’obi nke maliteworo iche echiche ọjọọ, mmụọ nke a e kere eke nupụụrụ Onye Okike ahụ isi, na-achọ ịnara ofufe na nsọpụrụ nke ihe a kpọrọ mmadụ nye onwe ya. Echiche ọjọọ ya pụtara ìhè mgbe o ji aghụghọ kwuo okwu ụgha. Nke a webatakwara mmehie n’ime ụwa.

Jehova Chineke gwara nwoke mbụ ahụ, bụ́ Adam, na iri mkpụrụ sitere n’osisi ịma ezi ihe na ihe ọjọọ ahụ ga-akpata ọnwụ. (Jenesis 2: 15-17) Ma a raara nwunye Adam, bụ́ Iv, gaa n’inupụ isi. Site n’iji agwọ ahụ mere ihe dị ka ọnụ na-ekwuru ya, mmụọ Nduhie ahụ gwara ya, sị: “Ọ dịghị ọnwụ unu [gaje, NW] ịnwụ: n’ihi na Chineke maara na n’ụbọchị unu ga-eri mkpụrụ sitere na ya, mgbe ahụ ka a ga-emeghe anya unu [nke Iv na nke di ya], unu [abụọ] ewee dị ka Chineke, na-ama ezi ihe na ihe ọjọọ.” (Jenesis 3:1-5) Nke ahụ bụ okwu ụgba mbụ e kwuru, o mekwara ka a mara ajọ mmụọ nke a e kere eke dị ka ‘nna nke ụgha.’ (Jọn 8:44) Ojiji o jiri agwọ mee ihe n’oge ahụ n’ogige Iden nwere myirita n’etiti ihe e ji mara ya n’Akwụkwọ nsọ dị ka “agwọ ochie ahụ, onye a na-akpọ Ekwensu na Setan.”—Mkpughe 12:9.

Mmehie wetaara ihe a kpọrọ mmadụ ịsụ ude na ịbụ ohu nye ihe mgbu. N’ikwekọ n’okwu Chineke, n’ụbọchị ahụ Adam mehiere, Chineke kwupụtara amamikpe nke ọnwụ n’isi ndị mmehie ahụ. Dị ka usoro ikpe si dị, n’otú Jehova si ele ihe anya, Adam na Iv nwụrụ n’ụbọchị ahụ. (Tụlee Luk 20:37, 38.) N’Iden, Jehova gwara nwanyị mbụ ahụ nke mehieworonụ, sị: “M ga-eme ka ihe mgbu gị na ịtụ ime gị baa ụba nke ukwuu; n’ihe mgbu ka ị ga-amụ ụmụ.” (Jenesis 3:16) Adam ga-adọgbu onwe ya n’ọrụ iji chọta ihe ha ga-eri n’azụ ogige ahụ n’ala nke na-adịkwaghị n’ọdịdị paradaịs ma ọlị. Jehova sịrị: “N’ọsụsọ ihu gị ka ị ga-eri nri, ruo mgbe ị ga-alata n’ala; n’ihi na e siri na ya wepụta gị; n’ihi na ájá ka ị bụ, ọ bụkwa ájá ka ị ga-alata.” (Jenesis 3:17-19) Agbụrụ mmadụ si otú a malite ịbụ ohu nye ihe mgbu.

Ya mere, e jikọtara ịbụ ohu nye ihe mgbu na ezughị okè, mmehie, na ọnwụ nke e ketara site n’Adam. Dị ka Pọl onyeozi si kwuo ya: “Mmehie si n’aka otu mmadụ baa n’ụwa, dị ka ọnwụ si n’aka mmehie baakwa; ọnwụ wee si otú a gabiga ruo mmadụ nile, n’ihi na mmadụ nile mehiere.” (Ndị Rom 5:12) Ma Okwu Chineke na-enyere anyị aka ịnagide ihe mgbu, n’ihi na ọ na-agwa anyị ihe mere Jehova ji kwere ka ọ dịgide, na-ekwekwa anyị nkwa na ọ ga-agwụsị n’isi nso. Chineke kwere ka agwọ ahụ bụ ‘nna nke ụgha,’ Setan bụ́ Ekwensu jiri ihe mgbu tie Job onye ezi omume ihe otiti, wee si otú a tinye ikwesị ntụkwasị obi ya n’ule. Arụmụka nke Ekwensu bụ na Job na-ejere Chineke ozi n’ihi ọdịmma nke onwe ya, ọ bụghị n’ihi ịhụnanya, (Job 1:8-12) Ma, Job nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke, na-egosipụta na ụmụ mmadụ na-ezughị okè pụrụ ijere Ya ozi site n’ịhụnanya, nọgidekwa na-akwado ịbụ ọkaaka Ya n’agbanyeghị oké ule nke okwukwe ha. Ntachi obi Job dị ka onye na-ekwesị ntụkwasị obi nyere aka n’ido aha Jehova nsọ, nwapụta Setan ịbụ onye ụgha, wetakwara nna ochie ahụ nke bụ ezi ihe nlereanya nkwụghachi ụgwọ n’ụba. (Job 42:12-17; Jemes 5:11) Site n’ahụmahụ Job, anyị pụrụ ikwubi na mgbe ọ bụla e mezuworo nzube Chineke, ihe a kpọrọ mmadụ ịbụ ohu nye ihe mgbu ga-abịa ná njedebe. Ma ànyị pụrụ isi aṅaa jide nke ahụ n’aka?

Otú Ihe Mgbu Ga-esi Gwụsịa

N’eziokwu, Jehova eguzobewo ụzọ dị nnọọ irè nke iweta ịbụ ohu nye ihe mgbu nke ihe a kpọrọ mmadụ nọ na ya ná njedebe. O mewo nke a n’ihe ndabere nke àjà mgbapụta nke Ọkpara ya, bụ́ Jisọs Kraịst. Jisọs bụ “Nwa Atụrụ Chineke, nke na-ebupụ mmebie nke ụwa.” (Jọn 1:29) Ọ bịara n’ụwa, “[ọ bụghị] ka e jeere ya ozi, kama ka o jee ozi, ka o werekwa ndụ ya [ndụ mmadụ ya zuru okè] nye ka ọ bụrụ ihe mgbapụta n’ọnọdụ ọtụtụ mmadụ.” (Matiu 20:28) Site ná nnupụisi, ndụ mmadụ zuru okè na iru eru na olileanya nile so ya, funarịrị Adam. Nke ahụ bụkwa kpọmkwem ihe e nwetaghachiri site n’àjà mgbapụta nke Jisọs. (1 Timoti 2:5, 6; Ndị Hibru 7:26) N’eziokwu, “Chineke hụrụ ụwa [nke ihe a kpọrọ mmadụ] n’anya otú a, na o nyere ọbụna Ọkpara ọ mụrụ nanị ya, ka onye ọ bụla nke kweere na ya wee ghara ịla n’iyi, kama ka o nwee ndụ ebighị ebi.”—Jọn 3:16.

Chineke ekwewokwa nkwa kpọmkwem na ịbụ ohu nye ihe mgbu gaje ịbịa ná njedebe. N’ibu amụma banyere oge mgbe ihe mgbu nke e jikọtara ya na mmehie na-agaghị adịkwa ọzọ, mmụọ Chineke kpaliri onyeozi ndị Kraịst bụ Jọn ide, sị:

“M wee hụ eluigwe ọhụrụ na ụwa ọhụrụ: n’ihi na eluigwe mbụ ahụ na ụwa mbụ ahụ gabigararịị; oké osimiri adịghịkwa ọzọ. . . . M wee nụ oké olu ka ọ na-esi n’ocheeze ahụ daa, sị, Lee, ụlọ ikwuu nke Chineke dịnyeere mmadụ, ọ ga-ebinyekwara ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị nke ya, Chineke onwe ya ga-anọnyekwara ha, bụrụkwa Chineke ha: ọ ga-ehichapụkwa anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha; ọnwụ agaghị adịkwa ọzọ; iru újú ma ọ bụ ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ: ihe mbụ nile agabigawo. Onye ahụ nke na-anọkwasị n’ocheeze ahụ [Jehova Chineke] wee sị, Lee, ana m eme ihe nile ka ha dị ọhụrụ. O wee sị, Dee akwụkwọ: n’ihi na okwu ndị a kwesịrị ntụkwasị obi, bụrụkwa eziokwu.”—Mkpughe 21:1-5.

N’oge na-adịghị anya, ndị mmadụ na-erube isi ga-enweta uru zuru ezu nke àjà mgbapụta Jisọs. Nke a ga-eme n’okpuru ọchịchị nke Alaeze ahụ nke ndị ezi omume kpeworo ekpere maka ya ruo ogologo oge, na-asị: “Nna anyị nke bi n’eluigwe, ka e doo aha gị nsọ. Ka alaeze gị bịa. Ka e mee ihe ị na-achọ, dị ka e si eme ya n’eluigwe, ka e meekwa otú ahụ n’ụwa.” (Matiu 6:9, 10) N’Alaeze eluigwe ahụ, Jisọs ga-achị achị ruo mgbe o dosịworo ndị iro ya nile n’okpuru ụkwụ ya abụọ, gụnyere ịbụ ohu nye ihe mgbu na onyeiro ikpeazụ ahụ, bụ́ ọnwụ.—1 Ndị Kọrint 15:25, 26.

Ee, ruo ókè o metụtara ụmụ mmadụ ndị na-erube isi, n’oge na-adịghị anya, Chineke ‘ga-ehichapụ anya mmiri nile ọ bụla n’anya ha, ọnwụ, iru újú, ịkwa ákwá ma ọ bụ ahụ ụfụ agaghị adịkwa ọzọ.’ (Mkpughe 21:4) Mgbe ahụ, okwu amụma nke a nke nwere mmezu ime mmụọ ugbu a ga-enwekwa mmezu nkịtị: “Gozie Jehova, mkpụrụ obi m; . . . bụ́ onye na-agbaghara gị ajọ omume gị nile; onye na-agwọ ọrịa gị nile.” “Onye obibi ya agaghị asị. Ana m arịa ọrịa.”—Abụ Ọma 103:1-3; Aịsaịa 33:24.

Olee Mgbe Ihe Mgbu Ga-agwụsị?

Ọgwụgwụ nke ịbụ ohu nye ihe mgbu dị oké nso. Ee, ọ ga-emezu n’oge anyị a, ọgbọ nke a kpọmkwem ga-ahụkwa ya. Mmezu amụma Bible na-egosi na anyị na-ebi n’ime mgbe ikpeazụ nke ajọ usoro ihe nke a. Agha ndị a na-ahụtụbeghị ụdị ya na mbụ, ụnwụ nri, na ala ọma jijiji, tinyekwara nkwusa ozi ọma nke Ndịàmà Jehova na-ekwusa gburugburu ụwa, bụcha akụkụ nke otu “ihe ịrịba ama” nke ọtụtụ ihe mejupụtara nke na-egosi “ọnụnọ” [NW] Jisọs a na-adịghị ahụ anya n’ebube nke Alaeze eluigwe.—Matiu 24:3-14, 21, 34

N’isi nso, “eluigwe mbụ ahụ na ụwa mbụ ahụ,” bụ́ usoro ihe a haziri ahazi nke Setan na usoro ọchịchị ya, ga-agabiga. “Oké osimiri” na-amagharị amagharị nke ihe a kpọrọ mmadụ ndị na-emebi iwu agaghị adịkwa ọzọ. N’ihi nke a, anyị na-eguzo n’ọnụ ọnụ ọchịchị “eluigwe ọhụrụ” nke Chineke gọziworo, nke ga-achị “ụwa ọhụrụ,” bụ òtù ụmụ mmadụ ndị ezi omume. ‘Ezi omume ga-ebikwa’ n’ime ndị a.—Mkpughe 21:1; 2 Pita 3:13.

Ebe ngọzi ndị dị otú a n’okpuru ọchịchị ọhụrụ—Alaeze Chineke—dị nso otú a, nwee nkasi obi. Chọkwuo ihe ọmụma banyere ụwa ọhụrụ ahụ nke ihe mgbu na ọnwụ na-agaghị adị na ya. N’ezie, na-atụ anya ụbọchị ahụ a gọziri agọzi nke dị oké nso ugbu a, bụ́ mgbe ndị nile na-erubere Jehova Chineke isi ga-ebi n’ime ụwa nke ihe mgbu na-adịghị na ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya