Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 9 p. 41-47
  • Ijidesi Aha Jisọs Ike

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ijidesi Aha Jisọs Ike
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Ndị Na-enwe Mmetụta Ọjọọ
  • Zere Ịrọ Òtù!
  • ‘Manna E Zoro Ezo na Nkume Ọcha’
  • Kraịst Na-agwa Ọgbakọ Dị Iche Iche Okwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Irite Uru Site ‘n’Ọka nke Eluigwe’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Uru Akwụkwọ Mkpughe Ga-abara Gị Taa
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
  • Ikpughe Otu Ihe Omimi Dị Nsọ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 9 p. 41-47

Isi nke 9

Ijidesi Aha Jisọs Ike

PAGAMỌM

1. Olee ọgbakọ natara ozi ọzọ nke Jisọs, oleekwa otú obodo ndị Kraịst ndị ahụ bi n’ime ya dị?

Ọ BỤRỤ na anyị esite Smụana gaa njem kilomita 80 n’ebe ugwu wee banye n’ime ihe dị ka 24 kilomita na-agbaso ndagwurugwu Osimiri Caicus, anyị na-erute Pagamọm, nke a na-akpọ Bergama ugbu a. A maara obodo ahụ nke ọma n’ihi ụlọ nsọ Zeus, ma ọ bụ Jupita, nke dị n’ebe ahụ. N’afọ ndị 1800, ndị ọkà n’igwupụta ihe mgbe ochie n’ala buuru ebe ịchụ àjà nke ụlọ nsọ ahụ jee Germany, bụ́ ebe ndị mmadụ ka nwekwara ike ikiri ya, ya na ọtụtụ ihe ọkpụkpụ na ihe osise nke chi ụgha dị iche iche, n’ụlọ ndebe ihe mgbe ochie nke Pergamon dị na Berlin. Ozi dị aṅaa ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst ga-ezijere ọgbakọ ahụ nke na-ebi n’etiti ikpere arụsị dị ukwuu otú ahụ?

2. Jisọs si aṅaa mee ka a mata onye ọ bụ, gịnịkwa ka ojiji o ji ‘mma agha nwere ihu abụọ’ na-egosi?

2 Na mbụ, Jisọs kọwapụtara onye ọ bụ, na-asị: “Degakwara mmụọ ozi nke nzukọ Kraịst dị na Pagamọm akwụkwọ, sị, Ihe ndị a ka ọ na-ekwu, bụ́ onye ahụ nke nwere mma agha dị nkọ ahụ nke nwere ihu abụọ.” (Mkpughe 2:12) N’ebe a, Jisọs kwughachiri otú ahụ e si kọwaa ya ná Mkpughe 1:16. Dị ka Ọkaikpe na Onye Na-eweta Mbibi, ọ ga-ebibi ndị ahụ na-akpagbu ndị na-eso ụzọ ya. Lee ka nkwa nke ahụ si bụrụ ihe nkasi obi! Otú ọ dị, n’ihe banyere ikpe ikpe, ndị nọ n’ime ọgbakọ kwesịkwara ịnara ịdọ aka ná ntị na Jehova, site n’aka “onyeozi ọgbụgba ndụ” nke a, bụ́ Jisọs Kraịst, “ga-abụkwa onyeàmà dị ngwa” megide ndị nile na-akpọ onwe ha ndị Kraịst, ma na-ekpere arụsị, na-etinye aka n’adịghị ọcha, na-agha ụgha, ndị na-adịghị emekwa ihe n’eziokwu na ndị na-adịghị elekọta ndị nọ ná mkpa anya. (Malakaị 3:1, 5; Ndị Hibru 13:1-3) A ghaghị ịnara ndụmọdụ na ịdọ aka ná ntị Chineke mere ka Jisọs nye!

3. Ofufe ụgha dị aṅaa ka a na-efe na Pagamọm, à pụkwara isi aṅaa kwuo na “ocheeze Setan” dị n’ebe ahụ?

3 Ugbu a, Jisọs na-agwa ọgbakọ ahụ, sị: “Amatara m ebe i bi, bụ́ ebe ocheeze Setan dị.” (Mkpughe 2:13a) N’eziokwu, ofufe Setan gbara ndị Kraịst ndị ahụ gburugburu. N’agụnyeghị ụlọ nsọ nke Zeus, e nwere ihu arụsị nke Aesculapius, bụ́ chi nke ọgwụgwọ. A makwa Pagamọm ama dị ka ebe bụ isi n’ihe omume nke ife onye eze ofufe. N’asụsụ Hibru, okwu ahụ nke a sụgharịrị ịbụ “Setan” pụtara “Onye Mmegide,” “ocheeze” ya nọchiri anya ọchịchị ọ na-achị ụwa dị ka Chineke kwere ka ọ dịrị ruo ogologo oge ụfọdụ. (Job 1:6, New World Translation Reference Bible, nkọwa ala ala peji) Njupụta ikpere arụsị jupụtara na Pagamọm gosiri na “ocheeze” Setan guzosiri ike n’obodo ahụ. Lee nnọọ ka ọ ga-esiworị bụrụ ihe mkpasu iwe nye Setan na ndị Kraịst nọ n’ebe ahụ adịghị akpọ isiala nye ya n’ofufe nke ndị mba ahụ!

4. (a) Okwu ịja mma dị aṅaa ka Jisọs gwara ndị Kraịst ahụ nọ na Pagamọm? (b) Gịnị ka onye nnọchianya eze Rom bụ Pliny degaara Eze Trajan n’ihe banyere otú o si emeso ndị Kraịst? (ch) N’agbanyeghị ihe ize ndụ ahụ, ụzọ dị aṅaa ka ndị Kraịst ahụ nọ na Pagamọm gbasoro?

4 Ee, “ocheeze Setan” dị kpọmkwem n’ebe ahụ na Pagamọm. Ma Jisọs gara n’ihu ikwu, sị, “Ị na-ejidesikwa aha m ike, ị gọnarịghịkwa okwukwe m, ọbụna n’ụbọchị Antipas onyeàmà m, onye nke m kwesịrị ntụkwasị obi, onye e gburu n’etiti unu, ebe Setan bi.” (Mkpughe 2:13b) Lee nnọọ okwu ịja mma na-akpali akpali nke a bụ! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ogbugbu e gburu Antipas n’ihi okwukwe ya bụ n’ihi ọjụjụ ọ jụrụ isonyere omume ikpere ndị mmụọ ọjọọ na ofufe nke eze Rom. N’oge na-adịghị anya ka Jọn natasịrị amụma nke a, Pliny nke Nta, bụ́ onye nnọchianya nke Eze Trajan nke Rom, dejeere Trajan akwụkwọ wee kọwaa usoro ọ na-eji emeso ndị e boro ebubo na ha bụ ndị Kraịst—bụ́ usoro nke eze ahụ kwadoro. A na-atọhapụ ndị ahụ gọpụrụ na ha abụghị ndị Kraịst mgbe, dị ka Pliny kwuru, “ha sooro m kwughachi okwu mkpọku nye chi dị iche iche, jirikwa mmanya na ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ chụọrọ ihe oyiyi gị [Trajan] àjà . . . mesịakwa, bụọ Kraịst ọnụ.” A na-egbu ndị ọ bụla a chọpụtara na ha bụ ndị Kraịst. Ọbụna mgbe ihe ize ndụ dị otú a na-eche ha ihu, ndị Kraịst nọ na Pagamọm agọnarịghị okwukwe ha. Ha ‘jidesiri aha Jisọs ike’ n’ihi na ha nọgidere na-asọpụrụ ọnọdụ ya dị elu dị ka Onye ga-ewepụ Jehova n’ụta na Onyeikpe ọ họpụtara. Ha ji ikwesị ntụkwasị obi gbasoo nzọụkwụ Jisọs dị ka ndịàmà nke Alaeze ahụ.

5. (a) Ihe dị aṅaa na-eme n’oge a nke yiri ihe omume nke ife onye eze ofufe wetawooro ndị Kraịst oké ule dị iche iche n’oge anyị a? (b) Enyemaka dị aṅaa ka Ụlọ Nche nyewooro ndị Kraịst?

5 N’oge dị iche iche, Jisọs emewo ka a mara na Setan bụ onye na-achị ụwa ajọ omume nke a, ma n’ihi ikwesị ntụkwasị obi Jisọs, Setan enweghị ike ọ bụla n’ahụ ya. (Matiu 4:8-11; Jọn 14:30) N’oge anyị mba ndị dị ike, n’ụzọ pụtakarịrị ìhè “eze ugwu” na “eze ndịda,” adọgburịtawo onwe ha maka onye ga-achị ụwa. (Daniel 11:40) A kpalịwo oké ịhụnanya maka mba dị iche iche, ihe omume nke ife onye eze ofufe nwekwara ihe yiri ya n’oge a n’oké omume nke ịhụ mba n’anya nke zuworo elu ala nile ọnụ. Isiokwu ndị metụtara nnọpụiche ndị dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke November 1, 1939 (Bekee), nakwa nke May 1, 1980, na April 1, 1987, emewo ka ihe bụ́ ozizi Bible doo anya n’isiokwu a, na-enye ndị Kraịst nduzi, bụ́ ndị chọrọ ije ije n’aha Jehova ma merie ụwa dị ka Jisọs ji obi ike mee.—Maịka 4:1, 3, 5; Jọn 16:33; 17:4, 6, 26; 18:36, 37; Ọrụ 5:29.

6. Dị ka Antipas, olee otú Ndịàmà Jehova siworo guzosie ike n’oge a?

6 Ndụmọdụ ndị dị otú ahụ adịwo nnọọ oké mkpa. N’ihi oké ịhụ mba n’anya na-enweghị isi, ọ dịwo mkpa ka Ndịàmà Jehova, ma ndị e tere mmanụ ma ndị na-esonyere ha, guzosie ike n’okwukwe ha. Na United States, a chụpụsịrị ọtụtụ narị ụmụntakịrị na ndị nkụzi site n’ụlọ akwụkwọ n’ihi na ha ekeleghị ọkọlọtọ nke mba ahụ, ebe a kpagburu Ndịàmà nọ na Germany n’ụzọ jọgburu onwe ya n’ihi na ha jụrụ ikele ọkọlọtọ swastika ahụ. Dị ka e hotaworo, ndị Nazi nke Hitler gburu ọtụtụ puku ndị ohu Jehova dị umeala n’obi n’ihi na ha jụrụ ikere òkè n’ife mba ahụ ofufe dị ka arụsị. N’afọ ndị 1930, n’oge ihe omume ife ndị eze ofufe n’okpuru okpukpe Shinto ka na-ewu ewu na Japan, ndị ozi abụọ bụ ndị ọsụ ụzọ kụrụ mkpụrụ Alaeze dị ukwuu n’obodo Taiwan ebe ndị Japan bijupụtara. Ndị ọchịchị bụ ndị agha tụbara ha n’ụlọ mkpọrọ, ebe otu n’ime ha nwụrụ n’ihi ụzọ ọjọọ e si meso ya omume. A tọhapụrụ onye nke ọzọ, wee si n’azụ gbagbuo ya—Antipas nke oge a. Ruo taa, e nwere ala ebe ndị a na-achọ ka a na-efe ihe oyiyi dị iche iche nke mba ofufe, na-enyekwa Ọchịchị nraranye a na-ekewaghị ekewa. A tụwo ọtụtụ Ndịàmà na-eto eto mkpọrọ, e gbuwokwa ọtụtụ n’ime ha, n’ihi nguzosi ike ha dị ka ndị Kraịst nọpụrụ iche. Ọ bụrụ na ị bụ onye na-eto eto nke chere ihe iseokwu ndị dị otú a ihu, mụọ Okwu Chineke kwa ụbọchị, ka i wee ‘nwee okwukwe nke na-eduje n’ichebe mkpụrụ obi,’ na-enwe olileanya nke ndụ ebighị ebi.—Ndị Hibru 10:39–11:1; Matiu 10:28-31.

7. Olee otú ndị na-eto eto nọ n’India si chee ihe iseokwu nke ife mba ofufe ihu, gịnị sikwa n’ime ya pụta?

7 Ụmụntakịrị nọ n’ụlọ akwụkwọ echewo ihe iseokwu ndị dị otú a ihu. Na 1985, na steti Kerala, India, ụmụntakịrị atọ nke Ndịàmà Jehova jụrụ imebi okwukwe ha nke dabeere na Bible, na-ajụ ịbụ abụ e ji eto mba. Ha na-eji nkwanye ùgwù guzoro ọtọ mgbe ndị ọzọ na-abụ abụ, ma n’agbanyeghị nke ahụ a chụpụrụ ha n’ụlọ akwụkwọ. Nna ụmụntakịrị ahụ weere okwu a ruo n’Ụlọikpe Kasị Elu nke India, ebe ndị ọkàikpe abụọ nọ n’ebe ahụ kpelaara ụmụntakịrị ahụ, na-eji obi ike kwuo, sị: “Omenala anyị na-akụziri anyị égbé bere ugo bere; ụkpụrụ echiche anyị na-akụzi égbé bere ugo bere; iwu na-achị ala anyị kwekwara ka égbé bere ugo bere; ka anyị gharanụ ịgwagbu ya.” Akụkọ na ihe odide dị n’akwụkwọ akụkọ dị iche iche ndị e dere n’ihi okwu ahụ mere ka mba ahụ dum, nke ihe mejupụtara ya mgbe ahụ bụ ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu ụzọ n’ụzọ ise nke ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa dum, mara na e nwere ndị Kraịst n’ala ahụ, ndị na-efe ezi Chineke ahụ bụ́ Jehova na ndị jikwa ikwesị ntụkwasị obi na-ejidesi ụkpụrụ Bible ike.

Ihe Ndị Na-enwe Mmetụta Ọjọọ

8. Okwu nkatọ dị aṅaa ka Jisọs hụrụ na ọ dị mkpa ịgwa ndị Kraịst ahụ nọ na Pagamọm?

8 Ee, ndị Kraịst ahụ nọ na Pagamọm bụ ndị na-ekwesị ntụkwasị obi. “Ma,” ka Jisọs sịrị, “enwere m ihe ole na ole imegide gị.” Gịnị ka ha meworo nke ga-ewetara ha nkatọ dị otú a? Jisọs na-agwa anyị: “N’ihi na i nwere n’ebe ahụ ụfọdụ ndị na-ejidesi ozizi Belam ike, bụ́ onye na-ezi Belak ịtọgbọ n’ihu ụmụ Israel ihe ịma n’ọnyà, ka ha rie ihe a chụrụ n’àjà nye arụsị, ka ha kwaakwa iko.”—Mkpughe 2:14.

9. Ònye bụ Belam, oleekwa ụzọ ndụmọdụ ya si ‘tọgbọ n’ihu ụmụ Israel ihe ịma n’ọnyà’?

9 N’oge Mosis, Eze Belak nke Moab goro Belam, bụ́ onye amụma na-abụghị onye Israel, onye maara ihe ụfọdụ banyere ụzọ nile nke Jehova, ka ọ bụọ ndị Israel ọnụ. Jehova guzogidere Belam, na-amanye ya ikwupụta okwu ngọzi gwa ndị Israel na ahụhụ nye ndị iro ha. Belam mere ka obi jụrụ Belak site n’iwe a kpasuru ya n’ihi nke a site n’ịtụ aro ụzọ mbuso agha ọzọ dị aghụghọ: Ka ndị inyom Moab jee ghọgbuo ndị ikom Israel ịdanye n’ajọ ịkwa iko na ofufe arụsị nke chi ụgha ahụ bụ Beal nke Peoa! Ụzọ aghụghọ nke a gara nke ọma. Iwe ezi omume nke Jehova biliri, o wee zije ihe otiti nke gburu 24,000 mmadụ n’etiti ndị Israel ahụ kwara iko—bụ́ ihe otiti nke a kwụsịrị nanị mgbe onye nchụàjà bụ́ Fineas mere ihe n’onwe ya iji wepụ ajọ ihe ahụ n’Israel.—Ọnụ Ọgụgụ 24:10, 11; 25:1-3, 6-9; 31:16.

10. Ihe ịma n’ọnyà ndị dị aṅaa mịbataworo n’ọgbakọ ahụ dị na Pagamọm, n’ihi gịnịkwa ka ọ pụrụ ịbụ na ndị Kraịst ndị ahụ chere na Chineke ga-eleghara mmehie ha anya?

10 Ugbu a, n’oge Jọn, è nwere ihe ịma n’ọnyà dị otú ahụ na Pagamọm? E nwere! Omume rụrụ arụ na ikpere arụsị amịbatawo n’ọgbakọ ahụ. Ndị Kraịst ahụ erubeghị isi n’ịdọ aka ná ntị ndị Chineke nyere site n’ọnụ Pọl onyeozi. (1 Ndị Kọrint 10:6-11) Ebe ọ bụ na ha enwewo ntachi obi ná mkpagbu, ma eleghị anya ha pụrụ iche na Jehova ga-eleghara mmehie ịkwa iko ha anya. N’ihi nke a, Jisọs mere ka o doo ha anya na ha aghaghị ịjụ mmebi iwu dị otú ahụ.

11. (a) Gịnị ka ndị Kraịst na-aghaghị iche nche megide, ụdị echiche dị aṅaa ka anyị na-aghaghịkwa izere? (b) N’ọtụtụ afọ ndị gara aga, mmadụ ole ka a chụpụworo n’ọgbakọ ndị Kraịst, ọ̀ bụkwa karịsịa n’ihi gịnị?

11 N’otu aka ahụkwa taa, ndị Kraịst aghaghị ịnọ na nche megide ‘ịgha amara Chineke anyị ka ọ bụrụ agụụ ịkwa iko.’ (Jud 4) Anyị aghaghị ịkpọ ihe ọjọọ asị, ‘tipụtakwa ahụ anyị ọnya’ ka anyị wee gbasoo ụzọ ndụ nke ịdị mma ndị Kraịst. (1 Ndị Kọrint 9:27; Abụ Ọma 97:10; Ndị Rom 8:6) Anyị ekwesịghị iche mgbe ọ bụla na ịnụ ọkụ n’obi n’ozi Chineke na ikwesị ntụkwasị obi n’okpuru mkpagbu na-enye anyị ikike itinye aka n’omume na-ezighị ezi nke mmekọahụ. N’ọtụtụ afọ ndị gara aga, ndị mere ihe ọjọọ a chụpụrụ n’ọgbakọ ndị Kraịst gburugburu ụwa, ndị ọtụtụ n’ime ha bụ n’ihi adịghị ọcha nke mmekọahụ, eruwo ọtụtụ iri puku. N’afọ ụfọdụ, e nwewo ọbụna ọnụ ọgụgụ karịrị ndị ahụ dara n’Israel oge ochie n’ihi Beal nke Peoa. Ka anyị nọrọ na nche mgbe nile ka anyị ghara ịdaba n’òtù ndị ahụ!—Ndị Rom 11:20; 1 Ndị Kọrint 10:12.

12. Dị ka ọ dị n’ihe banyere ndị ohu Chineke nke oge ochie, ụkpụrụ ndị dị aṅaa metụtara ndị Kraịst taa?

12 Jisọs bakwaara ndị Kraịst ahụ nọ na Pagamọm mba n’ihi ‘iri ihe a chụrụ n’àjà nye arụsị.’ Gịnị ka nke a metụtara? N’iburu n’uche okwu Pọl gwara ndị Kọrint, eleghị anya ụfọdụ ndị na-elezi anya na-eji inwe onwe ndị Kraịst ha na-eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi, wee na-emejọ akọ na uche ndị ọzọ. Ma, o yikarịrị ka hà na-etinye aka kpọmkwem n’ememe ikpere arụsị ụfọdụ. (1 Ndị Kọrint 8:4-13; 10:25-30) Taa, ndị Kraịst na-ekwesị ntụkwasị obi aghaghị igosipụta ịhụnanya na-adịghị achọ ọdịmma onwe onye nanị mgbe ha na-eji inwe onwe ndị Kraịst ha na-eme ihe, na-elezi anya ka ha ghara ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ. O doro anya na ha aghaghị izere ụdị ikpere arụsị ndị nke oge a, dị ka ife ndị ọkà n’ihe omume TV, sinima, na egwuregwu, ma ọ bụ ime ka ego ghọọ chi, ma ọ bụ ọbụna ime ka afọ nke ha onwe ha ghọọrọ ha chi!—Matiu 6:24; Ndị Filipaị 1:9, 10; 3:17-19.

Zere Ịrọ Òtù!

13. Okwu ọzọ dị aṅaa ka Jisọs ji tụọ ndị Kraịst ahụ nọ na Pagamọm mmehie ha n’anya, n’ihi gịnịkwa ka o ji dị mkpa ịgwa ọgbakọ ahụ okwu otú ahụ?

13 Jisọs gara n’ihu ịtụ ndị Kraịst ahụ nọ na Pagamọm mmehie ha n’anya, na-asị: “Otú a, gị onwe gị nwekwara ụfọdụ ndị na-ejidesi ozizi ndị Nikọlaịtan ike otú ahụ.” (Mkpughe 2:15) Tupu nke a, Jisọs ajawo ndị Efesọs mma n’ihi ịkpọ ihe omume nke ndị òtù nke a asị. Ma ọ dị mkpa inye ndị Kraịst nọ na Pagamọm ndụmọdụ n’ime ka ịrọ òtù ghara imetụta ọgbakọ ahụ. Ọ dị mkpa imesikwu ihe ike n’ịnọgide n’ụkpụrụ ndị Kraịst ka e wee chebe ịdị n’otu ahụ nke Jisọs kpere ekpere maka ya na Jọn 17:20-23. Ọ dị mkpa “ịdụsi ọdụ ike n’ime ozizi nke na-enye ezi ndụ, na ịtụkwa ndị na-ekwugide ekwugide mmehie ha n’anya.”—Taịtọs 1:9.

14. (a) Siterị n’oge mbụ, olee ndị ọ dịwooro mkpa ka ọgbakọ ndị Kraịst guzogide, Pọl onyeozi sikwa aṅaa kọwaa ha? (b) Okwu Jisọs dị aṅaa ka onye ọ bụla kwesịrị ịgbaso, bụ́ onye pụrụ inwe ọchịchọ isonyere òtù kewapụrụ onwe ha?

14 Siterị n’oge ochie, ọ dịwo mkpa ka ọgbakọ ndị Kraịst mee ihe megide ndị mpako si n’ezi ofufe dapụ, bụ́ ndị na-esite n’okwu ire ụtọ na nke nduhie na-akpata “nkewa dị iche iche ahụ na ọnyà dị iche iche ahụ, na-emegide ozizi” nke na-abịa site n’ụzọ nke Jehova. (Ndị Rom 16:17, 18) Pọl onyeozi dọrọ aka ná ntị banyere ihe iyi egwu nke a n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ akwụkwọ ozi ya nile.a N’oge a, mgbe Jisọs weghachiworo ezi ọgbakọ ahụ n’ọnọdụ dị ọcha na ịdị n’otu nke ndị Kraịst, a ka nwekwara ihe ize ndụ nke ịrọ òtù. N’ihi nke a, onye ọ bụla nke nweworo ọchịchọ isoro òtù ọ bụla kewapụrụ onwe ha, wee si otú a na-ahọpụta otu òtù, kwesịrị ige ntị n’okwu ọzọ Jisọs kwuru: “Ya mere, chegharịa; ma a sị na i meghị otú a ana m abịakwute gị ọsọ ọsọ, m ga-ewerekwa mma agha nke ọnụ m buo agha megide ha.”—Mkpughe 2:16.

15. Olee otú ịrọ òtù na-esi amalite?

15 Olee otú ịrọ òtù na-esi amalite? Onye kpọrọ onwe ya onye ozizi pụrụ ịkụnye obi abụọ, na-arụ ụka n’eziokwu Bible ụfọdụ (dị ka eziokwu ahụ nke bụ na anyị nọ n’ime mgbe ikpeazụ), otu òtù wee kewapụ onwe ha ma sonyere ya. (2 Timoti 3:1; 2 Pita 3:3, 4) Ma ọ bụ, otu onye nwere ike ịdị na-akatọ ụzọ Jehova si na-eme ka a rụzuo ọrụ ya, wee na-akwado mmụọ nke imere onwe onye ebere site n’ikwu na Akwụkwọ Nsọ akwadoghị ya, na ọ dịghịkwa mkpa iji ozi Alaeze ahụ na-eje site n’ụlọ ruo n’ụlọ. Ikere òkè n’ozi dị otú ahụ n’ịgbaso ihe nlereanya nke Jisọs na ndị ozi ya ga-eme ka ndị a bụrụ ndị dị obi umeala; ma, ọ kaara ha mma ikewapụ onwe ha wee tụsara ahụ, ma eleghị anya na-agụ Bible site n’oge ruo n’oge dị ka òtù nọọrọ onwe ha. (Matiu 10:7, 11-13; Ọrụ 5:42; 20:20, 21) Ndị dị otú ahụ na-echepụta echiche nke onwe ha banyere Ememe Ncheta nke ọnwụ Jisọs, iwu Akwụkwọ Nsọ ahụ nke izere ọbara, ime ememe ụbọchị ezumike dị iche iche, na iji ụtaba eme ihe. Karịsịa, ha na-eweda aha Jehova ala; n’oge na-adịghị anya, ha na-adanyeghachi kpọmkwem n’ụzọ omume a na-achịkwaghị achịkwa nke Babilọn Ukwu ahụ. Ọbụna nke ka njọ, Setan na-akpali ụfọdụ n’ime ha ichigharị wee ‘na-eti ndị ohu ibe ha ihe,’ ndị bụbu ụmụnna ha.—Matiu 24:49; Ọrụ 15:29; Mkpughe 17:5.

16. (a) N’ihi gịnị ka ndị na-adịghị eguzosi ike n’ihi mmetụta nke ndị si n’ezi ofufe dapụ ji kwesị ichegharị ngwa ngwa? (b) Gịnị ga-eme ndị jụrụ ichegharị?

16 Onye ọ bụla nke na-adagharị n’ihi mmetụta ndị si n’ezi ofufe dapụ kwesịrị ịdị ngwa n’ige ntị n’òkù ahụ Jisọs kpọrọ ka o chegharịa! A ghaghị ịjụ mgbasa echiche nke ndị si n’ezi ofufe dapụ dị ka nsí ahụ ọ bụ! Ihe kpatara ya bụ anyaukwu na ịkpọasị, bụ́ nke megidere eziokwu ndị ahụ na-agbaso ụkpụrụ ezi omume, ịdị ọcha, na nke ịhụnanya ndị Jisọs ji na-azụ ọgbakọ ya. (Luk 12:42; Ndị Filipaị 1:15, 16; 4:8, 9) N’ihe banyere ndị ahụ jụrụ ichegharị, Onyenwe anyị Jisọs “ga-ewerekwa mma agha nke ọnụ [ya] buo agha megide ha.” Ọ na-ayọcha ndị ya ka o wee chebe ịdị n’otu ahụ o kpere ekpere maka ya n’anyasị ikpeazụ ya na ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ n’elu ala. (Jọn 17:20-23, 26) Ebe ndị dapụrụ n’ezi ofufe jụrụ ịnara ndụmọdụ na enyemaka kpakpando ndị ahụ dị n’aka nri ya ji ịhụnanya na-enye ha, Jisọs na-ama ha ikpe, ‘taakwa ha oké ahụhụ,’ na-achụpụ ha baa “n’ọchịchịrị nke èzí.” A na-achụpụ ha n’ọgbakọ ka ha gharakwa ịnọ dị ka ihe iko achịcha n’etiti ndị Chineke.—Matiu 24:48-51; 25:30; 1 Ndị Kọrint 5:6, 9, 13; Mkpughe 1:16.

‘Manna E Zoro Ezo na Nkume Ọcha’

17. Ụgwọ ọrụ dị aṅaa na-echere ndị Kraịst e tere mmanụ, ndị ‘nwere mmeri,’ gịnịkwa ka ọ dị mkpa ka ndị Kraịst nọ na Pagamọm merie?

17 Oké nkwụghachi ụgwọ na-echere ndị nile na-ege ntị na ndụmọdụ Jisọs nke e nyere site ná nduzi nke mmụọ nsọ Jehova. Gee ntị! “Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa nzukọ Kraịst. Onye na-emeri emeri, ya ka m ga-enye ụfọdụ n’ime manna ahụ nke e zobeworo, m ga-enyekwa ya nkume ọcha, n’elu nkume ahụ ka e dewokwara aha ọhụrụ, nke ọ na-adịghị onye ọ bụla matara ma ọ bụghị onye na-anata ya.” (Mkpughe 2:17) Otú a, a gbara ndị Kraịst ahụ nọ na Pagamọm ume ‘inwe mmeri’ dị ka a gbakwara ndị Kraịst nọ na Smụana. Ka ha wee nwee ihe ịga nke ọma, ndị ahụ nọ Pagamọm, bụ́ ebe ocheeze Setan dị, aghaghị ịjụ ikpere arụsị. Ha aghaghị imeri adịghị ọcha, ịrọ òtù, na ndapụ n’ezi ofufe nke e jikọtara ya na Belak, Belam, na ndị Nikọlaịtan. N’ime otú a, a ga-akpọ ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ òkù iri ụfọdụ n’ime “manna ahụ nke e zobeworo.” Gịnị ka nke a pụtara?

18, 19. (a) Gịnị bụ manna ahụ nke Jehova nyere ndị Israel? (b) Olee manna nke e zobeworo ezobe? (ch) Gịnị ka iri manna ahụ e zobeworo sere onyinyo ya?

18 N’oge Mosis, Jehova nyere manna iji zụọ ndị Israel n’oge njem ha n’ime ọzara. E zoghị manna nke ahụ ezo, n’ihi na n’ụtụtụ ọ bụla—e wezụga n’ụbọchị Sabat—ọ pụtara n’ụzọ ọrụ ebube, dị ka ụfụfụ ọcha nke kpuchiri ala. Ọ bụ onyinye sitere n’aka Chineke iji debe ndị Israel ndụ. Dị ka ihe ncheta, Jehova nyere Mosis iwu ka o tinye ụfọdụ n’ime “achịcha” nke a n’ime ite e ji ọlaedo mee nke dị n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ dị nsọ ruo “ọgbọ nile [nke Israel].”—Ọpụpụ 16:14, 15, 23, 26, 33; Ndị Hibru 9:3, 4.

19 Lee nnọọ ihe atụ kwesịrị ekwesị ọ bụ! E zobere manna nke a n’ime Ebe Kasị Nsọ nke ụlọ ikwuu ahụ, ebe ìhè ahụ nke ji ụzọ ọrụ ebube na-enwu n’elu Igbe ọgbụgba ndụ ahụ bụ ihe atụ nke ọnụnọ Jehova n’onwe ya. (Ọpụpụ 26:34) Ọ dịghị onye e kwere ka ọ banye n’ime ebe ahụ dị nsọ iri manna ahụ e zobeworo na ya. Otú ọ dị, Jisọs kwuru na ndị na-eso ụzọ ya, ndị meririnụ, ga-eri “manna ahụ nke e zobeworo.” Dị ka Kraịst mere tupu ha, ha na-abanye, ‘ọ bụghị n’ebe nsọ e ji aka mee, bụ ihe atụ yiri ebe nke bụ ebe nsọ n’ezie, kama ọ bụ n’eluigwe n’onwe ya.’ (Ndị Hibru 9:12, 24) Mgbe a kpọlitere ha n’ọnwụ, ha na-eyikwasị ereghị ure na anwụghị anwụ—bụ́ onyinye dị ebube nke Jehova nyere, nke e mere ihe atụ ya site n’inye ha “manna ahụ nke e zobeworo” nke na-adịghị emebi emebi. Lee nnọọ ka o si bụrụ oké ihe ùgwù nye ìgwè nta nke ndị ahụ na-enwe mmeri!—1 Ndị Kọrint 15:53-57.

20, 21. (a) Gịnị ka inye ndị Kraịst e tere mmanụ nkume ọcha sere onyinyo ya? (b) Ebe e nwere nanị 144,000 nkume ọcha, olileanya dị aṅaa ka oké ìgwè mmadụ ahụ nwere?

20 Ndị a na-anatakwa “nkume ọcha.” N’ụlọikpe ndị Rom, a na-eji nkume eme ihe n’ikpebi ikpe.b Nkume ọcha pụtara na a tọhapụwo onye ahụ, ebe nkume ojii pụtara na a mawo ya ikpe, nke na-abụkarị ikpe ọnwụ. Jisọs inye ndị Kraịst ahụ nọ na Pagamọm “nkume ọcha” ga-egosi na ọ gụrụ ha ná ndị na-emeghị ihe ọjọọ, ndị dịkwa ọcha. Ma okwu Jisọs pụrụ inwekwa ihe ọzọ ọ pụtara. N’oge ndị Rom, a na-ejikwa nkume eme ihe dị ka ihe na-enye mmadụ ikike ịbanye n’ebe a na-eme ihe omume dị mkpa. N’ihi ya, nkume ọcha ahụ pụrụ igosi ihe pụrụ nnọọ iche nye onye Kraịst ahụ e tere mmanụ nke na-enwe mmeri—ya ịbụ onye a nabatara n’ebe dị ùgwù n’eluigwe n’oge alụmdi na nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ. Nanị 144,000 nkume ndị ahụ ka e nyere.—Mkpughe 14:1; 19:7-9.

21 Nke a ọ̀ pụtara na a ga-agbaba gị aka ma ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime oké ìgwè mmadụ ahụ nke ndị so na-efe ofufe? Ọ dịghị ma ọlị! Ọ bụ ezie na ị gaghị anata nkume ọcha nke nnabata n’eluigwe, ọ bụrụ na i nwee ntachi obi, i nwere ike isi n’oké mkpagbu ahụ pụta ikere òkè n’ọrụ ahụ na-enye ọṅụ nke iweghachi Paradaịs n’elu ala. Ndị ga-eso gị kere òkè na nke a bụ ndị bilitere n’ọnwụ, bụ́ ndị kwesịrị ntụkwasị obi tupu oge ndị Kraịst na ndị ahụ so n’atụrụ ọzọ ahụ ndị ọ pụrụ ịbụ na ọ dịbeghị oké anya ha nwụrụ. A ga-emesị gosi ndị ọzọ nile a gbapụtaworo ihu ọma site n’ịkpọlite ha n’ọnwụ baa ná ndụ n’elu ala bụ paradaịs.—Abụ Ọma 45:16; Jọn 10:16; Mkpughe 7:9, 14.

22, 23. Gịnị ka aha ahụ e dekwasịrị n’elu nkume ahụ e nyere ndị Kraịst e tere mmanụ pụtara, agbamume dịkwa aṅaa ka nke a kwesịrị inye?

22 Gịnị bụ aha ọhụrụ ahụ a na-edekwasị n’elu nkume ahụ? Aha bụ ihe e ji amara mmadụ na ihe e ji egosi ọdịiche dị n’etiti onye ahụ na ndị ọzọ. Ndị Kraịst ndị a e tere mmanụ na-anata nkume ahụ mgbe ha jezuworo ozi elu ala ha dị ka ndị nwere mmeri. Ya mere, o doro anya na aha ahụ a na-edekwasị n’elu nkume ahụ metụtara ihe ùgwù ha nke ịbụ ndị e jikọtara ha na Jisọs n’eluigwe—bụ́ ọnọdụ dị oké mma nke ije ozi dị ka eze, nke ọ bụ nanị ndị ahụ ketara Alaeze eluigwe ga-aghọta, marakwa ụtọ ya. Ya mere, ọ bụ aha, ma ọ bụ ọkwa ọrụ, “nke ọ na-adịghị onye ọ bụla matara ma ọ bụghị onye na-anata ya.”—Tụlee Mkpughe 3:12.

23 Lee nnọọ ihe mkpali ọ bụụrụ òtù Jọn ahụ ‘ịnụ ihe mmụọ nsọ na-agwa nzukọ Kraịst’ ma tinye ha n’ọrụ! Leekwa ka nke a si akpali ndị na-esonyere ha, bụ́ oké ìgwè mmadụ iji ikwesị ntụkwasị obi soro ha na-eje ozi mgbe ha na ha ka nwere ike ịnọkọ n’elu ala ebe a, sorokwa ha kere òkè n’ime ka a mara Alaeze Jehova!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Leekwa 1 Ndị Kọrint 3:3, 4, 18, 19; 2 Ndị Kọrint 11:13; Ndị Galetia 4:9; Ndị Efesọs 4:14, 15; Ndị Filipaị 3:18, 19; Ndị Kọlọsi 2:8; 1 Ndị Tesalọnaịka 3:5; 2 Ndị Tesalọnaịka 2:1-3; 1 Timoti 6:3-5; 2 Timoti 2:17; 4:3, 4; Taịtọs 1:13, 14; 3:10; Ndị Hibru 10:26, 27.

b Lee Ọrụ Ndị Ozi 26:10 na nkọwa ala ala peji ya, New World Translation Reference Bible.

[Foto ndị dị na peeji nke 43]

E debere ihe àmà ndị a nke oké ikpere arụsị jupụtara ebe nile n’ụlọ ndebe ihe mgbe ochie nke Pergamon dị na Berlin

[Foto dị na peeji nke 45]

E zobere manna ụfọdụ n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ịbụ ndị e nyere manna ihe atụ e zobeworo pụtaara ndị ahụ e tere mmanụ nwere mmeri na ha na-anata anwụghị anwụ

[Foto dị na peeji nke 45]

Nkume ọcha ahụ bụ maka ndị ahụ a nabatara n’ọlụlụ nwunye nke Nwa Atụrụ ahụ

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya