Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 4 p. 18-21
  • Jisọs Ejiri Agbamume Bịa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Jisọs Ejiri Agbamume Bịa
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Onyeàmà Kwesịrị Ntụkwasị Obi”
  • “Ọ Na-abịa, Ya na Igwe Ojii”
  • “Alfa ahụ na Omega Ahụ”
  • Mkpughe na Gị Onwe Gị
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Bụrụnụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-agụ Akwụkwọ Mkpughe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ihe Ndị Na-aghaghị Ime n’Isi Nso
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Mgbapụta Ná Mkpughe Nke Jisọs Kraịst
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 4 p. 18-21

Isi nke 4

Jisọs Ejiri Agbamume Bịa

1. Olee ndị ka Jọn na-edegara akwụkwọ ugbu a, olee ndị taa kwesịkwara inwe oké mmasị n’ozi ahụ?

IHE ọzọ sochirinụ kwesịrị ịkpali mmasị dị ukwuu n’ime onye ọ bụla nọ n’ọgbakọ ndị Chineke taa. N’ebe a, e nwere usoro ozi dị iche iche. Ha nwere mmetụta pụrụ iche ka ‘oge ahụ a kara aka’ na-eru nso. (Mkpughe 1:3) Ọ ga-ewetara anyị abamuru ebighị ebi ma ọ bụrụ na anyị egee ntị ná nkwupụta okwu ndị ahụ. Ihe ndekọ ahụ na-agụ, sị: “Jọn na-edegara nzukọ Kraịst asaa nke dị n’Esia akwụkwọ: Amara dịrị unu, ya na udo, nke si n’aka Onye ahụ pụta, bụ́ onye na-adị adị, onye dịkwararịị, onye na-abịakwa; nke sikwa n’aka mmụọ asaa ahụ pụta, bụ ndị nọ n’ihu ocheeze ya; nke sikwa n’aka Jisọs Kraịst pụta.”—Mkpughe 1:4, 5a.

2. (a) Gịnị ka ọnụ ọgụgụ bụ́ “asaa” na-egosi? (b) N’ime ụbọchị Onyenwe anyị, olee ndị ozi ahụ e zigaara “nzukọ Kraịst asaa” ahụ metụtara?

2 N’ebe a, Jọn na-agwa “nzukọ Kraịst asaa” okwu, e mesịkwara kpọtụrụ anyị aha ha n’ime amụma ahụ. Ọnụ ọgụgụ ahụ bụ́ “asaa” bụ nke a kpọtụrụ aha ọtụtụ ugbo ná Mkpughe. Ọ na-egosi izu ezu, karịsịa n’ihe banyere Chineke na ọgbakọ ya e tere mmanụ. Ebe ọ bụ na ọnụ ọgụgụ nke ọgbakọ ndị Chineke gburugburu ụwa amụbawo ruo ọtụtụ iri puku n’ime ụbọchị Onyenwe anyị, anyị pụrụ ijide n’aka na ihe a gwara “nzukọ Kraịst asaa” ahụ nke ndị e tere mmanụ kpọmkwem metụtakwara ndị Chineke nile taa. (Mkpughe 1:10) Ee, Jọn nwere ozi dị mkpa nye ọgbakọ nile nke Ndịàmà Jehova na ndị nile na-esonyere ha n’akụkụ nile nke elu ala nke a.

3. (a) N’okwu ekele Jọn, olee ebe ‘amara na udo’ si abịa? (b) Okwu dị aṅaa nke Pọl onyeozi kwuru yiri okwu ekele Jọn?

3 ‘Amara na udo’—lee ka ihe ndị a si bụrụ ihe a na-achọsi ike, karịsịa mgbe anyị matara ebe ha si na-abịa! “Onye” ahụ nke ha si na ya na-erupụta bụ Eze Onyenwe anyị Jehova n’onwe ya, “Eze nke mgbe nile,” onye na-adị ndụ “site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.” (1 Timoti 1:17; Abụ Ọma 90:2) Okwu a metụtakwara “mmụọ asaa ahụ,” bụ́ aha nke gosiri izu ezu n’ọrụ nke ike ịrụ ọrụ, ma ọ bụ mmụọ nsọ Chineke, ka ọ na-ewetara ndị nile na-ege ntị n’amụma ahụ nghọta na ngọzi. Onye ọzọ nọkwa n’ọnọdụ dị mkpa bụ “Jisọs Kraịst,” onye Jọn mesịrị dee banyere ya, sị: “O jupụtara n’amara na eziokwu.” (Jọn 1:14) Otú a, ekele Jọn nwere otu ihe ndị ahụ Pọl onyeozi hotara ná mmechi nke akwụkwọ ozi nke abụọ o degaara ọgbakọ dị na Kọrint, sị: “Ka amara nke Onyenwe anyị Jisọs Kraịst, na ịhụnanya nke Chineke, na nnwekọ nke mmụọ nsọ, dịnyere unu nile.” (2 Ndị Kọrint 13:14) Ka okwu ndị ahụ metụtakwa anyị nile bụ ndị hụrụ eziokwu n’anya taa!—Abụ Ọma 119:97.

“Onyeàmà Kwesịrị Ntụkwasị Obi”

4. Olee otú Jọn si gaa n’ihu ịkọwa Jisọs Kraịst, n’ihi gịnịkwa ka okwu nkọwa ndị a ji kwesị nnọọ ekwesị?

4 Jehova gasịa, Jisọs bụ onye ọzọ kasị dịrị ebube n’eluigwe na ala, dị ka Jọn matara, na-akọwa ya dị ka “Onyeàmà kwesịrị ntụkwasị obi, onye e buru ụzọ mụọ n’etiti ndị nwụrụ anwụ, bụrụkwa onyeisi nke ndị eze ụwa.” (Mkpughe 1:5b) Dị ka ọnwa nke dị n’eluigwe, e mewo ka o guzosie ike dị ka Onyeàmà kasị ukwuu nke eziokwu ahụ bụ na Jehova bụ Chineke n’ezie. (Abụ Ọma 89:37) N’ihi na o kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ịchụ àjà, ọ ghọrọ onye mbụ sitere n’etiti ụmụ mmadụ nke a kpọlitere jee ná ndụ anwụghị anwụ dị ka mmụọ. (Ndị Kọlọsi 1:18) Ebe ọ nọ n’ihu Jehova ugbu a, e buliwo ya elu gaa n’ọnọdụ kasị nke ndị eze elu ala nile, na-enye ya “ike nile dị n’eluigwe na n’elu ụwa.” (Matiu 28:18; Abụ Ọma 89:27; 1 Timoti 6:15) Na 1914, e guzobere ya dị ka Eze ịchị achị n’etiti mba nile nke elu ala.—Abụ Ọma 2:6-9.

5. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jọn si gaa n’ihu ikwupụta mmasị o nwere n’ebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ? (b) Olee ndị ritere uru site n’onyinye Jisọs nyere ndụ mmadụ ya zuru okè, n’ụzọ dịkwa aṅaa ka ndị Kraịst e tere mmanụ siworo kere òkè ná ngọzi pụrụ iche?

5 Jọn gara n’ihu igosi mmasị o nwere n’ebe Onyenwe anyị Jisọs Kraịst nọ n’okwu ndị a dị ebube: “Onye ahụ nke na-ahụ anyị n’anya, onye tọpụkwara anyị ná mmehie nile anyị n’ime ọbara ya; o wee mee ka anyị bụrụ alaeze, ndị nchụàjà nye Chineke na Nna nke ya; ọ bụ ya ka otuto nile na ike nile dịịrị ruo mgbe nile ebighị ebi. Amen.” (Mkpughe 1:5ch, 6) Jisọs nyere ndụ ya dị ka mmadụ zuru okè ka ndị nọ n’ime ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ, ndị gosiri okwukwe n’ime ya nwee ike ịbụ ndị e weghachiri ná ndụ zuru okè. Gị onwe gị, ezi onye na-agụ akwụkwọ a, pụrụ isonye na nke a! (Jọn 3:16) Ma, ọnwụ ọchụchụ àjà nke Jisọs meghere ụzọ maka ngọzi pụrụ iche nye ndị ahụ na-aghọ ndị Kraịst e tere mmanụ dị ka Jọn. A gụwo ndị a ná ndị ezi omume n’ihe ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs. N’iwepụsị olileanya nile ha nwere maka ndụ elu ala, dị ka Jisọs mere, ndị ahụ so n’ìgwè atụrụ nta abụwo ndị e ji mmụọ Chineke mụta, na-enwe olileanya nke ịbụ ndị a kpọlitere n’ọnwụ isoro Jisọs Kraịst jee ozi dị ka ndị eze na ndị nchụàjà n’Alaeze ya. (Luk 12:32; Ndị Rom 8:18; 1 Pita 2:5; Mkpughe 20:6) Lee nnọọ ihe ùgwù nke a bụ! Ka a sịkwa ihe mere Jọn ji tie mkpu otú ahụ na-ekwu na ebube na ike nile dịịrị Jisọs!

“Ọ Na-abịa, Ya na Igwe Ojii”

6. (a) Gịnị ka Jọn mara ọkwa ya banyere Jisọs ‘ịbịa n’igwe ojii,’ ọ̀ bụkwa amụma dị aṅaa nke Jisọs ka ọ pụrụ ịbụ na e chetaara Jọn? (b) Jisọs si aṅaa ‘bịa,’ oleekwa ndị nọ n’elu ala ndị ga-enwe oké ihe mgbu?

6 Ọzọ, Jọn ji ọṅụ mee mkpọsa, sị: “Lee, ọ na-abịa, ya na igwe ojii; anya nile ọ bụla ga-ahụzukwa ya, ndị ahụ ga-ahụkwa ya, bụ́ ndị mara ya ube; ebo nile nke ụwa ga-etikwara ya aka n’obi. Ee, Amen.” (Mkpughe 1:7) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na e chetaara Jọn n’ebe a banyere amụma Jisọs buru n’oge gara aga banyere ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a. N’ebe ahụ Jisọs kwuru, sị: “Mgbe ahụ ka ihe ịrịba ama nke Nwa nke mmadụ ga-apụtakwa ìhè n’eluigwe: mgbe ahụ ka ebo nile nke ụwa ga-etikwa aka n’obi, ha ga-ahụkwa Nwa nke mmadụ ka ọ na-abịa n’elu igwe ojii nile nke eluigwe n’ike na oké ebube.” (Matiu 24:3, 30) Otú a, Jisọs “na-abịa” site n’ịtụgharị wee lekwasị anya n’imezu ihe nile Jehova kpere n’ikpe megide mba nile. Nke a ga-arụpụta oké mgbanwe dị iche iche n’elu ala, ebe ọ bụkwa na “ebo nile nke ụwa” elefuruwo ịbụ eziokwu nke ọbụbụeze Jisọs anya, ha ga-ahụta n’ezie “ọnụma nke iwe Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.”—Mkpughe 19:11-21; Abụ Ọma 2:2, 3, 8, 9.

7. N’ụzọ dị aṅaa ka “anya nile ọ bụla,” tinyere nke ndị nnupụisi ga-esi ‘hụ’ Jisọs?

7 N’anyasị ikpeazụ Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya nọkọrọ, ọ gwara ha, sị: “Ọ fọdụrụ nwa oge, ụwa ahụkwaghị m ọzọ.” (Jọn 14:19) Ya bụrụ otú ahụ, olee otú o si bụrụ na “anya nile ọ bụla ga-ahụzukwa ya”? Anyị ekwesịghị ịtụ anya na ndị iro Jisọs ga-eji anya nkịtị hụ ya, n’ihi na Pọl onyeozi kwuru, mgbe Jisọs lagosịrị n’eluigwe, na Jisọs “na-ebi n’ime ìhè nke a na-apụghị ịbịaru nso,” na “ọ dịghị mmadụ ọ bụla hụworo ya anya, ma ọ bụ [nwee ike] ịhụ ya anya.” (1 Timoti 6:16) Ihe àmà gosiri na ihe Jọn bu n’uche bụ ‘ịhụ ya anya’ n’echiche nke bụ “ịghọta,” dị nnọọ ka anyị pụrụ ịhụ, ma ọ bụ ghọta, àgwà nile nke Chineke a na-apụghị ịhụ anya site n’ihe ndị o kere. (Ndị Rom 1:20) Jisọs “na-abịa, ya na igwe ojii” n’echiche nke bụ na ọ ga-abụ onye anya mmadụ efu na-apụghị ịhụ dị ka a na-apụghị ịhụ anyanwụ anya mgbe igwe ojii kpuchiri ya. Ọbụna mgbe igwe ojii kpuchiri anyanwụ n’oge ehihie, anyị maara na ọ dị ya n’ihi ìhè nke ehihie nke anyị na-ahụ gburugburu anyị. N’otu aka ahụ, ọ bụ ezie na a pụghị ịhụ Onyenwe anyị Jisọs anya, a ga-ekpughe ya dị ka ‘ọkụ na-ere ere ka ọ na-abọ ọ́bọ̀ n’ahụ ndị na-aṅaghị ntị n’ozi ọma banyere ya.’ A ga-amanyekwa ndị a ‘ịhụ ya anya.’—2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-8; 2:8.

8. (a) Olee ndị bụ “ndị mara ya ube” n’afọ 33 O.A., olee ndị dịkwa otú ahụ taa? (b) Ebe Jisọs na-anọkwaghị n’elu ala ebe a, olee ụzọ ndị mmadụ pụrụ isi ‘maa ya ube’?

8 “Ndị mara ya ube” ‘ga-ahụkwa’ Jisọs. Olee ndị ka ndị a pụrụ ịbụ? Mgbe e gburu Jisọs n’afọ 33 O.A., ndị agha Rom mara ya ube n’ụzọ nkịtị. Ndị Juu so kere òkè n’ikpe ọmụma nke igbu ọchụ ahụ, n’ihi na Pita gwara ụfọdụ n’ime ndị a n’ụbọchị Pentikọst, sị: “Chineke mere ya ka ọ bụrụ ma Onyenwe anyị ma Kraịst, bụ́ Jisọs nke a onye unu kpọgburu.” (Ọrụ 2:5-11, 36, NW; tụlee Zekaraịa 12:10; Jọn 19:37.) Ndị Rom na ndị Juu ahụ anwụwo ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 2,000 afọ ugbu a. Ya mere, “ndị mara ya ube” taa aghaghị ịnọchi anya mba na ndị dị iche iche ndị na-egosi otu omume ịkpọasị ahụ e gosiri mgbe a kpọgidere Jisọs n’osisi. Jisọs anọkwaghị n’elu ala ebe a. Ma mgbe ndị mmegide na-akpagbu Ndịàmà Jehova, bụ́ ndị na-agbara Jisọs àmà, n’ụzọ pụtara ìhè ma ọ bụ n’ụzọ na-apụtaghị ìhè site n’ikwenyere mmeso ọjọọ dị otú ahụ, ọ bụ nnọọ dị ka à ga-asị na ọ bụ Jisọs n’onwe ya ka ndị mmegide ndị ahụ ‘na-ama ube.’—Matiu 25:33, 41-46.

“Alfa ahụ na Omega Ahụ”

9. (a) Ònye na-ekwu okwu ugbu a, ugbo olekwa n’ime akwụkwọ Mkpughe ka o mere otú ahụ? (b) Mgbe Jehova kpọrọ onwe ya “Alfa ahụ na Omega ahụ” na “Onye Pụrụ Ime Ihe Nile,” gịnị ka o bu n’uche?

9 Ugbu a, lee ihe ebube kachasị ihe ebube nile! Eze Onyenwe anyị Jehova n’onwe ya na-ekwu okwu ugbu a. Lee ka nke a si kwesị ekwesị dị ka okwu mmalite nye ọhụụ ndị ahụ a gaje ikpughe, ebe ya onwe ya bụ Onye Ozizi Ukwu anyị na Isi Iyi kasị ukwu nke Mkpughe! (Aịsaịa 30:20) Chineke anyị na-ekwu, sị: “Mụ onwe m bụ Alfa ahụ na Omega ahụ, . . . bụ́ onye na-adị adị, onye dịkwararịị, onye na-abịakwa, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” (Mkpughe 1:8) Nke a bụ nke mbụ n’ime ugbo atọ n’akwụkwọ Mkpughe mgbe Jehova n’onwe ya sitere n’eluigwe kwuo okwu. (Leekwa Mkpughe 21:5-8; 22:12-15.) Ndị Kraịst nke narị afọ mbụ ga-aghọtaworị alfa na omega ngwa ngwa dị ka mkpụrụ akwụkwọ mbụ na nke ikpeazụ nke usoro mkpụrụ akwụkwọ ndị Grik. Ojiji Jehova jiri mkpụrụ akwụkwọ abụọ ahụ kpọọ onwe ya na-emesi ya ike na tupu ya onwe ya, ọ dịghị Chineke onye pụrụ ime ihe nile ọzọ dịnụ, ọ dịghịkwa nke gaje ịdị ma ọ gasịa. Ọ ga-eweta ná njedebe dị mma, ruo mgbe nile ebighị ebi, ihe iseokwu ahụ banyere onye bụ Chineke. A ga-egosipụta ya ruo mgbe ebighị ebi dị ka onye ọ bụ nanị ya bụ Chineke onye pụrụ ime ihe nile, Eze Kasị Ukwuu n’elu ihe nile o kere eke.—Tụlee Aịsaịa 46:10; 55:10, 11.

10. (a) Jọn si aṅaa kọwaa onwe ya ọzọ, oleekwa ebe a kpọchibidoro ya? (b) Ọ̀ bụ enyemaka ònye ka a na-aghaghị ijiworị wejere ọgbakọ ndị ahụ akwụkwọ mpịakọta ahụ Jọn dere? (ch) Olee ụzọ a na-esikarị eweta nri ime mmụọ taa?

10 N’inwe obi ike na Jehova ga-eduzi otú okwu ahụ ga-esi gaa, Jọn gwara ndị ohu ibe ya, sị: “Mụ onwe m, bụ Jọn, nwanna unu na onye na-eso unu nwekọọ mkpagbu na alaeze na ntachi obi nke dị n’ime Jisọs, e mere ka m nọọ n’agwaetiti ahụ nke a na-akpọ Patmọs, n’ihi okwu Chineke na àmà Jisọs.” (Mkpughe 1:9) N’ịbụ onye mkpọrọ n’agwaetiti Patmọs n’ihi ozi ọma ahụ, na-esoro ụmụnna ya na-enwe ntachi obi ná mkpagbu dị iche iche, na-enwe olileanya siri ike ikere òkè n’Alaeze ahụ na-abịa abịa, Jọn ahụ meworo agadi malitere ugbu a ịhụ nke mbụ n’ime ọhụụ ndị ahụ nke Mkpughe. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọhụụ ndị a gbara ya ume nke ukwuu, dị nnọọ ka a na-akpali ndị òtù Jọn nke oge a mgbe ha na-ahụ mmezu ha. Anyị amaghị otú Jọn si zijere ọgbakọ ndị ahụ akwụkwọ mpịakọta nke Mkpughe, ebe ọ bụ na e ji ya eji n’oge ahụ. (Mkpughe 1:11; 22:18, 19) Ọ ghaghị ịbụ na ndị mmụọ ozi Jehova nyere aka na nke a, dị nnọọ ka ha chebeworo Ndịàmà Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi ọtụtụ mgbe, bụ́ ndị na-arụ ọrụ n’okpuru mmachibido iwu dị iche iche taa, nke mere na ndị a enwewo ike iwejere ụmụnna ha, ndị agụụ eziokwu ahụ na-agụ, nri ime mmụọ.—Abụ Ọma 34:6, 7.

11. Ihe ùgwù dị aṅaa, nke yiri nke ahụ Jọn nwere mmasị na ya, ka òtù Jọn nke oge a na-agụ dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa?

11 Lee nnọọ ka Jọn ga-esiworị nwee mmasị dị omimi maka ihe ùgwù nke ịbụ onye Jehova jiri mee ihe dị ka ụzọ O si zijere ọgbakọ dị iche iche ozi! N’otu aka ahụ òtù Jọn nke oge a na-ewerekwa ihe ùgwù ya nke inye ezinụlọ Chineke ‘nri ime mmụọ n’oge ya’ dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa. (Matiu 24:45) Ka ị bụrụkwa otu n’ime ndị ihe ime mmụọ ndị a a na-enye na-ewusi ike, ka i wee ruokwa ihe mgbaru ọsọ ahụ dị ebube nke bụ ndụ ebighị ebi!—Ilu 3:13-18; Jọn 17:3.

Igbe dị na peeji nke 21]

Inweta Nri Ime Mmụọ n’Oge Ihe Isi Ike

N’ime mgbe ikpeazụ ndị a, mgbe Ndịàmà Jehova taworo ahụhụ mkpagbu na ihe isi ike dị ukwuu, ọ bụwo ihe dị ha mkpa inweta nri ime mmụọ ka ha wee guzosie ike n’okwukwe. N’ọnọdụ ka ukwuu, e nyewo ha ihe zuru ezu nke na-ewusi ha ike, nke na-esitekarị ná ngosipụta pụtara ìhè nke ike Jehova.

Dị ka ihe atụ, na Germany nke dịrị n’okpuru Hitler, Ndịàmà bipụtagharịrị ma kesaa akwụkwọ Ụlọ Nche, bụ́ nke ndị ọchịchị Nazi obi tara mmiri machibidoro iwu. Na Hamburg, ndị uwe ojii Gestapo wabatara n’otu ụlọ ebe a na-eme mbipụtagharị dị otú a. Ụlọ ahụ dị ntakịrị, ọ dịghịkwa ebe a pụrụ izo ihe ọ bụla ka a ghara ịhụ ya. A dọbara ígwè typewriter ahụ n’ime otu kọbọdụ, nnukwute ígwè ahụ e ji ebipụtagharị akwụkwọ bụkwa nke a dọnyere n’ime otu nnukwute igbe e ji achịnye potato n’ụlọ dị n’okpuru ala. Karịsịa, n’azụ igbe ahụ, e nwere otu akpati nke jupụtara na magazin! O yiri ihe a na-apụghị izere ezere na a ga-achọta ihe ndị a. Ma gịnị mere? Onye uwe ojii nke mepere kọbọdụ ahụ mere otú a n’ụzọ mere na ọ hụghị ígwè typewriter ahụ. N’ihe banyere ụlọ ahụ dị n’okpuru ala, onyenwe ụlọ ahụ kọrọ, sị: “Ndị uwe ojii atọ ahụ guzoro n’etiti ụlọ ahụ, chetakwa na kpọmkwem n’ebe ahụ ka igbe ahụ guzo, akpati ahụ nke jupụtara n’Ụlọ Nche dịkwa n’azụ ya. Ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha yiri ka ha hụtara ya; o yiri nnọọ ka e mere ka ha kpuo ìsì.” N’ihi oké nnapụta nke a, ezinụlọ ahụ nwere ike ịnọgide na-ewepụta nri ime mmụọ n’oge ihe isi ike nke dịkwa ize ndụ.

N’afọ ndị 1960, e nwere agha obodo n’etiti Nigeria na otu akụkụ nke kewapụrụ onwe ha, bụ́ Biafra. Ebe ọ bụ na ókèala ndị Nigeria gbara Biafra gburugburu kpam kpam, nanị ihe jikọtara ya na akụkụ ụwa ndị ọzọ bụ otu ọdụ ụgbọ elu. Nke a pụtara na Ndịàmà nọ na Biafra nọ n’ihe ize ndụ nke ịbụ ndị e kewapụrụ site n’ebe ha si enweta nri ime mmụọ. Mgbe ahụ, ná mmalite afọ 1968, ndị ọchịchị Biafra dunyere otu n’ime ndị ọrụ obodo ha ije were otu ọnọdụ dị mkpa na Europe, e dunyekwara onye ọzọ ịrụ ọrụ n’ọdụ ụgbọ elu ahụ dị na Biafra. Ọ dabara na mmadụ abụọ ahụ bụcha Ndịàmà Jehova, ugbu a, ha nọkwa n’akụkụ abụọ nke nanị ụzọ nzirịta ozi dị n’etiti Biafra na akụkụ ụwa ndị ọzọ. Ha abụọ ghọtara na ọ ghaghị ịbụ na ndokwa ahụ sitere n’aka Jehova. N’ihi nke a, ha wepụtara onwe ha maka ọrụ ahụ dị ize ndụ nke iwebata nri ime mmụọ na Biafra. Ha nọgidekwara na-eme otú a n’oge nile agha ahụ gara n’ihu. Otu n’ime ha kwuru, sị: “Ndokwa ahụ karịrị ihe ụmụ mmadụ pụrụ imeworị atụmatụ ya.”

[Chaatị dị na peeji nke 19]

Ọnụ Ọgụgụ Ndị Nọchiri Anya Ihe ná Mkpughe

Ọnụ Ọgụgụ Ihe Ọ Nọchiri Anya Ya

2 Nọchiri anya ime ka okwu guzosie ike.

(Mkpughe 11:3, 4; tụlee Deuterọnọmi 17:6.)

3 Na-egosi imesi ihe ike. Ọ na-egosikwa otú ihe siruru ike.

(Mkpughe 4:8; 8:13; 16:13, 19)

4 Na-egosi ijikọta ihe nile, ma ọ bụ inwe akụkụ anọ hà nhata

n’ọ̀tụ̀tụ̀. (Mkpughe 4:6; 7:1, 2; 9:14; 20:8; 21:16)

6 Na-egosi ezughị okè, ihe na-adịghị otú o kwesịrị ịdị, ihe

jọgburu onwe ya. (Mkpughe 13:18; tụlee 2 Samuel 21:20.)

7 Na-egosi ngosipụta nke Chineke banyere ihe zuru ezu, ma ọ̀

na-ezo aka n’ebe nzube Jehova ma ọ bụ nke Setan dị.

(Mkpughe 1:4, 12, 16; 4:5; 5:1, 6; 10:3, 4; 12:3)

10 Na-egosi ozuzu n’ụzọ anụ ahụ, banyere ihe ndị dị n’elu

ala. (Mkpughe 2:10; 12:3; 13:1; 17:3, 12, 16)

12 Na-egosi ndokwa Chineke guzobere n’eluigwe ma ọ bụ n’elu

ala. (Mkpughe 7:5-8; 12:1; 21:12, 16; 22:2)

24 Na-egosi ndokwa bara ụba (okpukpu abụọ) nke nzukọ Jehova.

(Mkpughe 4:4)

E kwesịrị ịghọta ọnụ ọgụgụ ụfọdụ a kpọtụrụ aha ná Mkpughe dị ka nke nkịtị. Mgbe mgbe, ihe a na-ekwu okwu ya na-enye aka ikpebi nke a. (Lee Mkpughe 7:4, 9; 11:2, 3; 12:6, 14; 17:3, 9-11; 20:3-5.)

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya