Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ịkpọ “Ihe Nile Dị Omimi nke Setan” Asị
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 8. (a) Gịnị ka Jisọs kwuru banyere “Jezebel” ahụ nọ na Taịataịra? (b) Olee ụzọ e siworo nwee mmetụta na-ekwesịghị ekwesị nke ndị inyom n’oge a?

      8 Jisọs gara n’ihu ịgwa ndị okenye nọ na Taịataịra, sị: “Enyekwara m ya oge, ka o wee chegharịa; ma ọ chọghị ichegharị n’ịkwa iko ya. Lee, ana m atụba ya n’ihe ndina, tụbakwa ndị sooro ya kwaa iko n’ime oké mkpagbu, ma a sị na ha echegharịghị n’ọrụ ya.” (Mkpughe 2:21, 22) Dị nnọọ ka ihe àmà gosiri na Jezebel nke mbụ ahụ nwere ike n’ahụ Ehab wee jụkwa ikwenyere onye na-arụrụ Chineke ọrụ mbibi, bụ́ Jihu, otú ahụ ka ọ pụrụ ịbụ na ndị inyom ndị a nwara inwe mmetụta n’ahụ ndị di ha na ndị okenye ọgbakọ. O yiri ka ndị okenye nọ na Taịataịra kwere ka ajọ mmetụta nke Jezebel nke a dịgide. N’ebe a, Jisọs nyere ha ịdọ aka ná ntị siri ike, dịkwa ka ọ dị nye ọgbakọ ndị Jehova gburugburu ụwa taa. N’oge ndị a, ụfọdụ ụmụ nwanyị ndị ekwo kpọrọ nkụ otú ahụ edubawo di ha n’ịghọ ndị si n’ezi ofufe dapụ, kpaliekwa ndị mmadụ ịkpọpụ ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi n’ụlọikpe.—Tụlee Jud 5-8.

  • Ịkpọ “Ihe Nile Dị Omimi nke Setan” Asị
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • 10. (a) N’ihi gịnị ka Jezebel na ụmụ ya ji anata ikpe ọmụma? (b) N’ọnọdụ ize ndụ dị aṅaa ka ndị ahụ na-aghọ ụmụ Jezebel nọ na ya, gịnịkwa ka ndị dị otú ahụ kwesịrị ime?

      10 N’ikwu banyere “nwanyị ahụ, bụ́ Jezebel,” Jisọs gara n’ihu sị: “M ga-ewerekwa ọnwụ gbuo ụmụ ya; nzukọ Kraịst nile ga-amarakwa na mụ onwe m bụ onye na-enyocha akụrụ na obi nile: m ga-enyekwa unu n’otu n’otu dị ka ọrụ nile unu si dị.” (Mkpughe 2:23) Jisọs enyewo Jezebel na ụmụ ya oge iji chegharịa, ma ha nọgidere n’ụzọ ha rụrụ arụ, n’ihi ya, ha aghaghịkwa ịnata ikpe ọmụma. E nwere ozi siri ike n’ebe a nye ndị Kraịst nke oge a. Ndị ahụ na-eṅomi Jezebel, ma hà bụ ndị ikom ma hà bụ ndị inyom, wee si otú ahụ bụrụ ụmụ ya site n’imebi ụkpụrụ Bible banyere ịbụ isi na ịdị ọcha nke omume, ma ọ bụ na-eme isi ike ka ha wee lefuru usoro ọchịchị Chineke anya, nọ n’ọnọdụ ọrịa dị oké ize ndụ n’ụzọ ime mmụọ. N’eziokwu, ọ bụrụ na onye dị otú ahụ akpọkuo ndị okenye ọgbakọ ikpere ya ekpere, “ekpere nke okwukwe ahụ ga-azọpụtakwa onye ahụ ahụ na-adịghị ike, [Jehova, NW] ga-emekwa ka o bilie”—ma ọ bụrụ na o jiri obi umeala mee ihe kwekọrọ n’ekpere ndị ahụ. Ma, ka onye ọ bụla ghara iche na ya pụrụ ịghọgbu Chineke ma ọ bụ Kraịst site n’ịnwa izobe omume rụrụ arụ ma ọ bụ igosi ịnụ ọkụ n’obi n’ozi ahụ nanị n’ihu ọha.—Jemes 5:14, 15.

      11. N’ụzọ dị aṅaa ka e si eme ka ọgbakọ dị iche iche taa mụrụ anya megide mmịbata nke mmetụta na-ekwesịghị ekwesị nke ndị inyom?

      11 Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ na ihe ka ọtụtụ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova taa mụ anya n’ebe ihe ize ndụ nke a dị. Ndị okenye na-elezi anya ịhụta ihe ọ bụla yiri àgwà na-ekwekọghị n’usoro ọchịchị Chineke na mmebi iwu. Ha na-agbalị inyere ma ndị nwoke ma ndị nwanyị aka, bụ́ ndị nọ n’ihe ize ndụ, ka e wee wulite ndụ ime mmụọ ha, mezigharịakwa ndụ ha mgbe oge na-agabigabeghị. (Ndị Galetia 5:16; 6:1) Site n’ịhụnanya na ịkwụsi ike, ndị nlekọta ndị a bụ́ ndị Kraịst na-egbochi mgbalị ọ bụla nke ụmụ nwanyị iguzobe òtù ma ọ bụ ịkwalite ihe omume ndị yiri nke ụmụ nwanyị ndị na-achọ inwere onwe ha. Karịsịa, a na-enye ezi ndụmọdụ site n’oge ruo n’oge n’akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova na-ebipụta.a

      12. N’ụzọ dị aṅaa ka òtù Jọn nke taa si egosipụta ịnụ ọkụ n’obi yiri nke Jihu?

      12 Otú ọ dị, n’ebe e nweworo oké omume rụrụ arụ, karịsịakwa mgbe nke a ghọrọ ihe a na-eme mgbe mgbe, a ghaghị ịchụpụ ndị mmehie na-enweghị nchegharị. Anyị ga-echeta ịnụ ọkụ n’obi Jihu ji kpochapụ mmetụta nile nke Jezebel kpam kpam n’Israel. N’otu aka ahụ, òtù Jọn nke oge a na-emesi ihe ike, na-esetịpụrụ ndị “Jehonadab” na-esonyere ha ihe nlereanya, na-egosikwa na ha pụrụ nnọọ iche n’ebe ndị ụkọchukwu Krisendọm dị, bụ ndị na-agbachi ụdị omume ọ bụla nkịtị.—2 Ndị Eze 9:22, 30-37; 10:12-17.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya