Isi nke 39
Onye Agha ahụ Bụ́ Eze Enwee Mmeri n’Amagedọn
Ọhụụ 13—Mkpughe 19:11-21
Isiokwu: Jisọs na-eduru usuu ndị agha dị n’eluigwe jee ibibi usoro ihe nke Setan
Oge mmezu ya: Mgbe e bibisịrị Babilọn Ukwu ahụ
1. Gịnị bụ Amagedọn, gịnị na-edujekwa na ya?
AMAGEDỌN—okwu na-eyi egwu nye ọtụtụ ndị! Ma nye ndị hụrụ ezi omume n’anya, ọ bụ ihe àmà nke ụbọchị ahụ ha chereworo ruo ogologo oge, bụ́ mgbe Jehova ga-emezu ihe ikpeazụ e kpere n’ikpe n’isi mba nile. Ọ bụghị agha nke mmadụ, kama ọ bụ “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Nile”—ụbọchị ịbọ ọ́bọ̀ ya megide ndị ọchịchị ụwa. (Mkpughe 16:14, 16; Ezikiel 25:17) Site n’ime ka Babilọn Ukwu ahụ tọgbọrọ n’efu, oké mkpagbu ahụ ga-amaliteworị. Mgbe ahụ, n’ịbụ ndị Setan kpaliri, anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie na mpi iri ya ga-elekwasị ndị Jehova anya ná mbuso agha ha. Ekwensu, n’ịbụ onye ọnụma juru obi karịa otú ọ bụla ọ dịworo na mbụ megide nzukọ Chineke nke yiri nwanyị, kpebisiri ike iji aghụghọ ya nile mee ihe n’ibuso ndị fọdụrụ n’ime mkpụrụ nwanyị ahụ agha ruo ọgwụgwụ ha. (Mkpughe 12:17) Nke a bụ ohere ikpeazụ Setan ga-enwe!
2. Ònye bụ Gọg nke Megọg, oleekwa ụzọ Jehova si kpalie ya ibuso ndị nke Ya agha?
2 A kọwara ajọ mbuso agha Ekwensu nke ọma n’Ezikiel isi nke 38. N’ebe ahụ, a kpọrọ Setan ahụ nke e wedaworo n’ala “Gọg nke ala Megọg.” Jehova na-etinye nko ihe atụ n’agba Gọg abụọ n’ụzọ ihe atụ, na-adọrọ ya na nnukwute usuu ndị agha ya bịa n’ibu agha. Olee ụzọ o si eme nke a? Site n’ime ka Gọg hụ Ndịàmà Ya dị ka ndị nọ n’enweghị ihe nchebe, bụ́ “ndị a chịkọpụtara site ná mba dị iche iche, ndị nke na-enweta ihe onwunwe dị ukwuu, ndị na-ebi n’etiti ụwa.” Ndị a nọ n’etiti ebe ụwa nile na-ekiri ha dị ka otu ndị jụworo ife anụ ọhịa ahụ na ihe oyiyi ya ofufe. Ike na ihe ịga nke ọma ime mmụọ ha na-enwe na-akpasu Gọg oké iwe. Ya mere, Gọg na nnukwute usuu ndị agha ya, gụnyere anụ ọhịa ahụ nke si n’oké osimiri rịgopụta na mpi iri ya, na-awakwasị ha igbu ha. Otú ọ dị, n’adịghị ka Babilọn Ukwu ahụ, ndị Chineke dị ọcha ga-enweta nchebe Chineke!—Ezikiel 38:1, 4, 11, 12, 15, NW; Mkpughe 13:1.
3. Olee ụzọ Jehova si kpochapụ usuu ndị agha nke Gọg?
3 Olee ụzọ Jehova ga-esi bipụ Gọg na usuu ndị ya na ha so? Gee ntị! “M ga-akpọkwa mma agha ka ọ dakwasị ya n’ugwu m nile, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Onyenwe anyị Jehova pụta): mma agha onye ọ bụla ga na-emegide nwanne ya.” Ma, ma ngwá agha nuklia ma ngwá agha nkịtị adịghị nke ga-aba uru ọ bụla ná mburịta agha ahụ, n’ihi na Jehova kwuru, sị: “Mụ na ya ga-ekpekwa ikpe n’ajọ ọrịa na-efe efe na n’ọbara; ọ bụkwa oké mmiri ozuzo na-ezobiga ókè, na oké akụ mmiri igwe, na ọkụ, na brimstone, ka m ga-eme ka ha zokwasị ya, zokwasịkwa usuu nile nke ndị agha ya, zokwasịkwa ọtụtụ ndị dị iche iche so ya. M ga-emekwa onwe m ka m dị ukwuu, m ga-edokwa onwe m nsọ, mee ka a mara mụ onwe m n’anya ọtụtụ mba; ha ewee mara na mụ onwe m bụ Jehova.”—Ezikiel 38:21-23; 39:11; tụlee Joshua 10:8-14; Ndị Ikpe 7:19-22; 2 Ihe Emere 20:15, 22-24; Job 38:22, 23.
Onye ahụ A Kpọrọ “Onye Kwesịrị Ntụkwasị Obi na Onye Eziokwu”
4. Olee ụzọ Jọn si kọwaa Jisọs Kraịst ná njike nke agha?
4 Jehova na-akpọpụta otu mma agha. Ònye bụ onye ji mma agha ahụ na-eme ihe? N’ịlaghachi n’akwụkwọ Mkpughe, anyị na-enweta azịza ya n’ọhụụ ọzọ na-akpalikwa akpali. Ka Jọn na-ele anya, eluigwe na-emeghe iji kpughee otu ihe nke na-akpali egwu n’ezie—Jisọs Kraịst n’onwe ya n’ejiji nke ibu agha! Jọn na-agwa anyị, sị: “M wee hụ eluigwe ka o gheworo oghe; ma lee, ịnyịnya ọcha dị, na onye na-anọkwasị ya, bụ́ onye a na-akpọ Onye kwesịrị ntụkwasị obi na Onye eziokwu; ọ bụkwa n’ezi omume ka ọ na-ekpe ikpe, na-ebukwa agha. Anya ya abụọ bụrụkwa ire ọkụ, ọ na-ekpukwa ọtụtụ okpueze n’isi ya.”—Mkpughe 19:11, 12a.
5, 6. Gịnị ka e sere onyinyo ya site na (a) “ịnyịnya ọcha” ahụ? (b) aha ahụ bụ “Onye ahụ kwesịrị ntụkwasị obi na Onye eziokwu”? (ch) anya ndị yiri “ire ọkụ”? (d) “ọtụtụ okpueze”?
5 Dị ka n’ọhụụ ahụ a hụrụ tupu nke a nke metụtara ndị ịnyịnya anọ, “ịnyịnya ọcha” nke a bụ ihe nnọchianya kwesịrị ekwesị nke ibu agha n’ezi omume. (Mkpughe 6:2) Oleekwa nke ọ bụ n’ime ụmụ Chineke nke pụrụ ịbụ onye ezi omume karịa Onye Agha nke a bụ dike? Ebe ọ bụ onye “a na-akpọ Onye kwesịrị ntụkwasị obi na Onye eziokwu,” ọ ghaghị ịbụ “onyeàmà ahụ nke kwesịrị ntụkwasị obi, nke bụkwa onye eziokwu,” bụ́ Jisọs Kraịst. (Mkpughe 3:14) Ọ na-ebu agha iji mezuo ihe ezi omume ndị Jehova kpere n’ikpe. Otú a, ọ na-eme ihe n’ọnọdụ ya dị ka Onyeikpe Jehova họpụtaworo, bụ́ “Chineke nke bụ Dike.” (Aịsaịa 9:6) Anya ya abụọ bụ ihe na-atụ egwu, dị ka “ire ọkụ,” na-elepụ anya gaa ná mbibi yiri ọkụ nke na-abịakwasị ndị iro ya.
6 Ọtụtụ okpueze na-adịkwasị n’isi nke Onye Agha nke a bụ Eze. Anụ ọhịa ahụ nke Jọn hụrụ ka o si n’oké osimiri ahụ na-arịgopụta nwere okpueze iri, bụ́ nke sere onyinyo ịchịisi elu ala ya nke na-adịru nwa oge. (Mkpughe 13:1) Ma, Jisọs nwere “ọtụtụ okpueze.” Ọchịchị ya nke dị ebube bụ ihe na-enweghị atụ, ebe ọ bụ “Eze kachasị ndị bụ eze, onye bụkwa Onyenwenụ kachasị ndị na-achị ka ndị nwe mmadụ.”—1 Timoti 6:15.
7. Gịnị bụ aha ahụ e dere ede nke Jisọs nwere?
7 Nkọwa Jọn gara n’ihu, sị: “O nwekwara aha e deworo, nke ọ na-adịghị onye ọ bụla matara, ma ọ bụghị ya onwe ya.” (Mkpughe 19:12b) Bible ekwuworị okwu banyere Ọkpara Chineke site n’aha ndị dị ka Jisọs, Immanuel, na Maịkael. Ma, o yiri ka “aha” nke a a na-edepụtaghị edepụta nọchiri anya ọnọdụ na ihe ùgwù dị iche iche Jisọs nwere n’ime ụbọchị Onyenwe anyị. (Tụlee Mkpughe 2:17.) Aịsaịa, n’ịkọwa Jisọs n’ọnọdụ ya kemgbe 1914, na-asị: “A ga-akpọkwa aha ya Onye ebube, Onye ndụmọdụ, Chineke nke bụ Dike, Nna nke bụ Nna Mgbe Nile Ebighị Ebi, Onyeisi Udo.” (Aịsaịa 9:6) Pọl onyeozi jikọtara aha Jisọs na ihe ùgwù ije ozi Ya ndị dị elu nke ukwuu mgbe o dere, sị: “Chineke welikwara [Jisọs] elu nke ukwuu, werekwa amara nye ya aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu; ka ọ ga-abụ n’aha Jisọs ka ikpere nile wee gbuo n’ala.”—Ndị Filipaị 2:9, 10.
8. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nanị Jisọs pụrụ ịmata aha ahụ e dere ede, ọ̀ bụkwa ya na olee ndị na-ekerịta ụfọdụ n’ime ihe ùgwù ya ndị dị elu?
8 Ihe ùgwù ndị Jisọs nwere pụrụ iche. E wezụgakwa Jehova n’onwe ya, ọ bụ nanị Jisọs pụrụ ịghọta ihe ọ pụtara ịnọ n’ọnọdụ dị elu otú ahụ. (Tụlee Matiu 11:27.) N’ihi ya, n’ime ihe nile Chineke kere eke, ọ bụ nanị Jisọs pụrụ ịghọta aha nke a n’ụzọ zuru ezu. Otú ọ dị, Jisọs na-eme ka nwanyị ahụ ọ na-alụ ọhụrụ soro n’ụfọdụ n’ime ihe ùgwù ndị a. Ya mere o kwere nkwa nke a, sị: “Onye na-emeri emeri, . . . m ga-edekwasịkwa ya aha ọhụrụ nke m.”—Mkpughe 3:12.
9. Gịnị ka e gosiri site na (a) Jisọs ịbụ onye ‘e gbokwasịworo uwe nke e fesaworo ọbara’? (b) Jisọs ịbụ onye a kpọrọ “Okwu Chineke”?
9 Jọn kwukwara, sị: “E gbokwasịwokwa ya uwe nke e fesaworo ọbara: a kpọwokwa aha ya Okwu Chineke.” (Mkpughe 19:13) Ọ̀ bụ “ọbara” òle ndị bụ nke a? Ọ pụrụ ịbụ ọbara ndụ Jisọs nke a wụfuru n’ihi ihe a kpọrọ mmadụ. (Mkpughe 1:5) Ma, n’ọnọdụ nke a, o yikarịrị ka ọ̀ na-ezo aka n’ọbara nke ndị iro ya, nke a wụfuru mgbe a na-emezu ihe Jehova kpere n’ikpe n’isi ha. Ha na-echetara anyị otu ọhụụ bu nke a ụzọ nke ọ bụ n’ime ya ka a chịkọpụtara vine nke ụwa wee zọchaa ha n’oké ebe nzọcha mkpụrụ vine nke ọnụma nke Chineke ruo mgbe ọbara ahụ ruru “bridle ịnyịnya”—na-egosi oké mmeri e meriri ndị iro Chineke. (Mkpughe 14:18-20) N’otu aka ahụkwa, ọbara ahụ nke e fesara n’uwe Jisọs na-emesi ya ike na mmeri ya bụ nke zuru ezu. (Tụlee Aịsaịa 63:1-6.) Ugbu a, Jọn kwukwara okwu ọzọ banyere otu aha a kpọrọ Jisọs. N’oge nke a, ọ bụ site n’aha a mazuru ebe nile—“Okwu Chineke”—na-eme ka a mara Onye Agha nke a bụ Eze dị ka Onyeisi bụ́ Ọnụ Na-ekwuru Jehova, Onye Na-akwadokwa eziokwu ahụ.—Jọn 1:1; Mkpughe 1:1.
Ndị So Jisọs Na-ebu Agha
10, 11. (a) Jọn si aṅaa gosi na Jisọs anọghị nanị ya n’ibu agha ahụ? (b) Gịnị ka e gosiri site n’eziokwu ahụ nke bụ na ịnyịnya ndị ahụ dị ọcha, na ndị na-anọkwasị n’elu ịnyịnya ndị ahụ na-eyi “ezi ákwà ọcha, nke dị ọcha na-enwukwa enwu”? (ch) Olee ndị mejupụtara “usuu nile nke ndị agha” ahụ dị n’eluigwe?
10 Jisọs anọghị nanị ya n’ibu agha nke a. Jọn na-akọrọ anyị, sị: “Usuu nile nke ndị agha ndị dị n’eluigwe wee soo ya n’elu ịnyịnya ọcha, na-eyi ezi ákwà ọcha, nke dị ọcha na-enwukwa enwu.” (Mkpughe 19:14) Eziokwu ahụ nke bụ na ịnyịnya ndị ahụ ‘dị ọcha’ gosiri ibu agha ezi omume. “Ezi ákwà ọcha” kwesịrị ekwesị nye ndị ịnyịnya nke Eze ahụ, ịdị ọcha ya nke na-enwu enwu gosikwara ọnọdụ ezi omume ha nwere n’ihu Jehova. Ya mere, olee ndị mejupụtara “usuu nile nke ndị agha” ndị a? Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha gụnyere ndị mmụọ ozi dị nsọ. Ọ bụrịị ná mmalite nke ụbọchị Onyenwe anyị ka Maịkael na ndị mmụọ ozi ya chụpụrụ Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya site n’eluigwe. (Mkpughe 12:7-9) Ọzọkwa, “ndị mmụọ ozi nile” ga na-ejere Jisọs ozi ka ọ na-anọkwasị n’elu ocheeze ya dị ebube, na-agakwa n’ihu n’ikpe mba nile na ndị nile nke ụwa ikpe. (Matiu 25:31, 32) N’eziokwu, n’agha ikpeazụ ahụ, mgbe a ga-emezu ihe nile Chineke kpere n’ikpe, ndị mmụọ ozi Jisọs ga-esonyekwara ya ọzọ.
11 Ndị ọzọ ga-esokwa na nke a. Mgbe ọ na-ezijere ọgbakọ ahụ dị na Taịataịra ozi ya, Jisọs kwere nkwa, sị: “Onye na-emeri emeri, na onye na-edebe ọrụ m nile ruo ọgwụgwụ ihe nile, ya ka m ga-enyekwa ike ịchị mba nile: ọ ga-ewerekwa mkpanaka ígwè zụọ ha dị ka atụrụ, dị ka a na-akụjisi ite nke ọkpụ ite; dị ka mụ onwe m natawokwara n’aka Nna m.” (Mkpughe 2:26, 27) N’enweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla, mgbe oge ya ruru, ndị ahụ so n’ụmụnna Kraịst, ndị nọrịị anọ n’eluigwe ga-ekere òkè n’iji mkpanaka ígwè zụọ ụmụ mmadụ na mba nile dị ka atụrụ.
12. (a) Ndị ohu Chineke nọ n’elu ala hà ga-ekere òkè n’ịlụ agha n’Amagedọn? (b) Olee ụzọ Amagedọn si metụta ndị Jehova nọ n’elu ala?
12 Ma, gịnị banyere ndị ohu Chineke nọ n’elu ala ebe a? Ndị òtù Jọn ahụ agaghị ekere òkè ọ bụla pụtara ìhè n’ịlụ ọgụ n’Amagedọn; ndị enyi ha na-anọgidesi ike n’akụkụ ha agaghị ekerekwa òkè ọ bụla, bụ́ ndị ahụ si ná mba nile ndị nọworo na-eruba n’ụlọ ime mmụọ nke ofufe Jehova dị ka mmiri. Mmadụ ndị a na-achọ udo akpụgharịworị mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè. (Aịsaịa 2:2-4) Ma, o metụtakwara ha n’ụzọ dị ukwuu! Dị ka anyị hotawororịị, ọ bụ ndị Jehova ndị ahụ o yiri ka ha enweghị ihe nchebe ọ bụla ka Gọg na ìgwè ndị na-eso ya na-ebuso ajọ agha. Nke ahụ bụ ihe àmà Onye Agha Jehova bụkwa Eze na-eche, onye nwekwara nkwado nke usuu ndị agha nọ n’eluigwe, iji wee malite ibu agha mkpochapụ megide mba ndị ahụ. (Ezikiel 39:6, 7, 11; tụlee Daniel 11:44–12:1.) Dị ka ndị na-ekiri ihe na-emenụ, nke a ga-akpali mmasị ndị Chineke nọ n’elu ala nke ukwuu. Amagedọn ga-apụta nzọpụta nye ha, ha ga-adịkwa ndụ ebighị ebi dị ka ndị jiworo anya ha hụ agha ukwu ahụ Jehova ji wepụ onwe ya n’ụta.
13. Ànyị si aṅaa mara na Ndịàmà Jehova adịghị emegide ọchịchị nile?
13 Nke a ọ̀ pụtara na Ndịàmà Jehova na-emegide ọchịchị nile? Ọ dịghị ma ọlị! Ha na-erube isi na ndụmọdụ Pọl onyeozi, bụ: “Ka mkpụrụ obi ọ bụla doo onwe ya n’okpuru ndị na-achị isi n’elu ya.” Ha na-aghọta na ruo ogologo oge usoro ihe dị ugbu a nọgidere na-adị, ‘ndị ahụ na-achị isi’ nọ n’ihi na Chineke kwere ka ha dịgide iji jigide ọ̀tụ̀tụ̀ ụfọdụ nke ihe ịga n’usoro n’etiti ọha mmadụ. N’ihi nke a, Ndịàmà Jehova na-atụ ụtụ isi ha, na-erube isi n’iwu dị iche iche, na-erubere iwu okporo ụzọ isi, na-emekwa ihe iwu chọrọ n’ihe banyere idejupụta akwụkwọ dị iche iche, na ihe ndị ọzọ. (Ndị Rom 13:1, 6, 7) Ọzọkwa, ha na-agbaso ụkpụrụ Bible n’ịbụ ndị na-ekwu eziokwu, na-emekwa ihe n’eziokwu; na-egosi ịhụnanya n’ebe ndị agbata obi ha nọ; na-ewulite ezinụlọ siri ike, ndị nwekwara ụkpụrụ omume ọma; na-azụlitekwa ụmụ ha ịbụ ụmụ amaala bụ ezi ihe nlereanya. N’ụzọ dị otú a ọ bụghị nanị na ha ‘na-akwụghachi Siza ihe nke Siza, kama ha na-akwụghachikwa Chineke ihe nke Chineke.’ (Luk 20:25; 1 Pita 2:13-17) Ebe Okwu Chineke na-egosi na ike ọchịchị dị iche iche nke ụwa nke a na-adịru nanị nwa oge, Ndịàmà Jehova na-akwadebe ugbu a maka ndụ nke zuru ezu karị, bụ́ ndụ ahụ nke bụ ndụ n’ezie, nke ha ga-enweta n’oge na-adịghị anya n’okpuru ịchịisi Alaeze Kraịst. (1 Timoti 6:17-19) Ọ bụ ezie na ha agaghị etinye aka ọ bụla n’ịkwatusị ọchịchị ndị dị n’ụwa nke a, Ndịàmà ahụ ji nsọpụrụ na-atụ oké egwu n’ihe Okwu Chineke nke sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ Bible Nsọ ahụ, na-ekwu banyere mmezu Jehova gaje imezu ihe e kpere n’ikpe n’Amagedọn.—Aịsaịa 26:20, 21; Ndị Hibru 12:28, 29.
Ruo n’Agha Ikpeazụ Ahụ!
14. Gịnị ka “mma agha dị nkọ” nke si n’ọnụ Jisọs pụta sere onyinyo ya?
14 Ọ̀ bụ ikike dị aṅaa ka Jisọs ga-eji nwezuo mmeri ya? Jọn na-agwa anyị, sị: “Mma agha dị nkọ na-esikwa n’ọnụ ya pụta, ka o wee were ya tigbuo mba nile: ya onwe ya ga-ewerekwa mkpanaka nke ígwè zụọ ha dị ka atụrụ.” (Mkpughe 19:15a) ‘Ogologo mma agha ahụ dị nkọ’ na-anọchi anya ikike Chineke nyere Jisọs inye iwu ka e gbuo ndị nile jụrụ ịkwado Alaeze Chineke. (Mkpughe 1:16; 2:16) Ihe atụ nke a pụtara ìhè kwekọrọ n’okwu Aịsaịa: “O [Jehova] wee mee ka ọnụ m dị ka mma agha dị nkọ, na ndo aka ya ka o zobeworo m; o wee mee ka m ghọọ àkụ́ na-egbu àmụ̀mà.” (Aịsaịa 49:2) N’ebe a, Aịsaịa sere onyinyo Jisọs, bụ́ onye na-akpọsa ikpe Chineke, na-emezukwa ha, dị ka à ga-asị na e ji àkụ́ nke na-ada kpọmkwem n’ebe a tụrụ ya.
15. Ka ọ dị ugbu a, ònye ka a ga-ekpugheworị, kpeekwa ya ikpe ka e wee kaa akara mmalite nke gịnị?
15 Ka ọ dị ugbu a, Jisọs ga-emeworị ihe n’imezu okwu Pọl ndị ahụ bụ: “Mgbe ahụ, n’ezie, ka a ga-ekpughe onye ahụ na-emebi iwu, onye Onyenwe anyị Jisọs ga-eji mmụọ nke ọnụ ya gbuo, meekwa ka ọ ghara ịdị irè site ná ngosipụta nke ọnụnọ ya.” Ee, ọnụnọ Jisọs (Grik, pa·rou·siʹa) abụrụwo nke e gosipụtara kemgbe 1914 gaa n’ihu site n’ikpughe na ikpe onye ahụ na-emebi iwu ikpe, bụ́ ndị ndú okpukpe Krisendọm. A ga-eme ka ọnụnọ ahụ pụta ìhè nke ọma mgbe mpi iri nke anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie mezuru ihe ahụ e kpere n’ikpe wee dọkasịa Krisendọm, ya na akụkụ nile fọdụrụnụ nke Babilọn Ukwu ahụ. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:1-3, 8, NW) Nke ahụ ga-abụ mmalite nke oké mkpagbu ahụ! Mgbe nke ahụ gasịrị, Jisọs ga-atụgharị wee chee ihu n’akụkụ fọdụrụ nke nzukọ Setan, n’ikwekọ n’amụma ahụ bụ: “Ọ ga-ejikwa ndele nke ọnụ ya tigbuo ụwa, ọ ga-ejikwa iku ume nke egbugbere ọnụ ya abụọ mee ka ndị na-emebi iwu nwụọ.”—Aịsaịa 11:4.
16. Olee ụzọ Abụ Ọma na Jeremaịa si kọwaa ọrụ Onye Agha Jehova nke bụkwa Eze ga-arụ?
16 Onye Agha ahụ bụkwa Eze, dị ka onye Jehova họpụtara, ga-akpa ókè n’etiti ndị ga-alanarị na ndị ga-anwụ. Jehova, n’ịgwa Ọkpara Chineke nke a okwu n’ụzọ amụma, sịrị: “Ị ga-eji mkpanaka ígwè tijisịa ha [ndị ọchịchị ụwa]; dị ka ihe ọkpụ ite kpụrụ ka a ga-atụpịa ha.” Jeremaịa gwakwara ndị ndú ọchịchị rụrụ arụ ndị a na ndị na-eso ha okwu, na-asị: “Kwasienụ ákwá ike, unu ndị ọzụzụ atụrụ, tiekwanụ mkpu; tụrụọkwanụ ná ntụ, unu ndị dị ebube n’etiti ìgwè ewu na atụrụ: n’ihi na ụbọchị unu eruzuwo ka e gbuo unu, m ga-akpasakwa unu, unu ga-adakwa dị ka ihe a na-achọsi ike.” N’agbanyeghị otú ndị ọchịchị ahụ ga-esiworị bụrụ ihe a na-achọsi ike nye ụwa nke na-emebi iwu, otu ihe otiti site na mkpanaka ígwè nke Eze ahụ ga-akụrisị ha, dị ka à ga-asị na ọ bụ itipịasị ite nke mara mma n’anya. Ọ ga-adị nnọọ ka Devid buru n’amụma banyere Onyenwe anyị Jisọs: “Mkpanaka nke ike gị ka Jehova ga-esi na Zaịọn zipụta: Gị nwee ike n’ahụ mmadụ n’etiti ndị iro gị. [Jehova, NW], n’aka nri gị amapuwo ndị eze n’ụbọchị iwe ya. Ọ ga-ekpe ikpe n’etiti mba nile, ebe nile jupụtara n’ozu.”—Abụ Ọma 2:9, 12; 83:17, 18; 110:1, 2, 5, 6; Jeremaịa 25:34.
17. (a) Olee ụzọ Jọn si kọwaa ọrụ imezu ihe e kpere n’ikpe nke Onye Agha ahụ bụkwa Eze ga-arụ? (b) Kọọ amụma ụfọdụ ndị na-egosi otú ụbọchị iwe Chineke ga-esi bụrụ ihe oké mbibi nye mba nile.
17 Onye Agha ukwu nke a bụkwa Eze na-apụtakwa ọzọ n’ihe na-esonụ a hụrụ n’ọhụụ ahụ: “Ya onwe ya na-azọkwa ebe nzọcha mkpụrụ vine nke mmanya nke ọnụma nke iwe Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” (Mkpughe 19:15b) N’otu ọhụụ bu nke a ụzọ, Jọn ahụworị nzọcha nke ‘ebe nzọcha mkpụrụ vine nke ọnụma Chineke.’ (Mkpughe 14:18-20) Aịsaịa kọwakwara ebe nzọcha mkpụrụ vine nke imezu ihe e kpere n’ikpe, ndị amụma ndị ọzọ kọwakwara otú ụbọchị iwe Chineke ga-esi bụrụ ihe mbibi nye mba nile.—Aịsaịa 24:1-6; 63:1-4; Jeremaịa 25:30-33; Daniel 2:44; Zefanaịa 3:8; Zekaraịa 14:3, 12, 13; Mkpughe 6:15-17.
18. Gịnị ka Joel onye amụma kpughere n’ihe banyere Jehova ikpe mba nile ikpe?
18 Joel onye amụma jikọtara otu nzọcha mkpụrụ vine na ọbịbịa Jehova “ikpe mba nile bi gburugburu ikpe.” Ọ bụkwa Jehova nyere iwu ahụ, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọ bụkwa nye Onyeikpe ahụ na-enyere Ya aka, bụ́ Jisọs, na usuu ndị agha eluigwe ya, sị: “Tinye mma iwe ihe ubi, n’ihi na ihe a ga-ewe n’ubi achawo: bịanụ, zọchaa; n’ihi na ebe nzọcha mkpụrụ vine ejuwo, ebe ịnara mmanya vine nile erubigawo; n’ihi na ihe ọjọọ ha bara ụba. Ọtụtụ ìgwè mmadụ, ọtụtụ ìgwè mmadụ n’ime ndagwurugwu mkpebi ikpe! N’ihi na ụbọchị Jehova dị nso n’ime ndagwurugwu mkpebi ikpe. Anyanwụ na ọnwa ejiwo nji, kpakpando achịkọpụwokwa onwunwu ha. Jehova ga-esikwa na Zaịọn bigbọọ, mee ka olu ya si na Jerusalem daa; eluigwe na ụwa ga-emekwa mkpatụ: ma Jehova ga-abụrụ ndị ya ebe mgbaba, ọ ga-abụkwara ụmụ Israel ebe siri ike. Unu ewee mara na mụ onwe m bụ Jehova, bụ́ Chineke unu.”—Joel 3:12-17.
19. (a) À ga-esi aṅaa zaa ajụjụ ahụ a jụrụ na 1 Pita 4:17? (b) Olee aha e dekwasịrị n’elu uwe Jisọs, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ọ ga-eji bụrụ nke kwesịrị ekwesị?
19 N’ezie, ụbọchị ahụ ga-abụ ụbọchị oké ọdachi nye mba na ụmụ mmadụ nile ndị na-enupụ isi, ma ọ ga-abụ ụbọchị ntụrụ ndụ nye ndị nile meworo Jehova na Onye Agha ya ahụ bụkwa Eze ebe mgbaba ha! (2 Ndị Tesalọnaịka 1:6-9) Ikpe ikpe ahụ nke malitere site n’ụlọ Chineke na 1918 ga-abịaruwo ọgwụgwụ ya, na-aza ajụjụ ahụ dị na 1 Pita 4:17: “Gịnị ga-abụ ọgwụgwụ nke ndị na-ekwenyeghị ozi ọma nke Chineke?” Onye Mmeri ahụ dị ebube ga-azọchawo ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ ruo ọgwụgwụ ya, na-egosipụta na ya bụ Onye ahụ e buliri elu nke Jọn kwuru banyere ya, sị: “O nwekwara aha e dekwasịworo n’elu uwe ya na n’elu apata ụkwụ ya, Eze kachasị ndị eze nile, na Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile.” (Mkpughe 19:16) O gosipụtawo onwe ya ịbụ onye dị ike nke ukwuu karịa onye ọchịchị elu ala ọ bụla, eze ma ọ bụ onyenwenụ ọ bụla bụ mmadụ. Ùgwù ya na ịma mma ya bụ ihe na-enweghị atụ. Ọ gawo nke ọma ‘n’ihi eziokwu na umeala n’obi na ezi omume,’ o nwewokwa mmeri ruo mgbe nile ebighị ebi! (Abụ Ọma 45:4) N’elu uwe ya nke ọbara fesasịrị ka e dekwasịrị aha ahụ nke Eze Onyenwe anyị bụ́ Jehova nyeworo ya, onye ọ bụ Onye o wepụrụ n’ụta!
Oké Nri Anyasị nke Chineke
20. Olee ụzọ Jọn si kọwaa “oké nri anyasị nke Chineke,” na-eme ka e cheta amụma dị aṅaa yiri ya nke bu ya ụzọ?
20 N’ọhụụ Ezikiel, mgbe e bibisịrị ìgwè ndị na-eso Gọg, a kpọrọ nnụnụ na anụ ọhịa nile òkù ịbịa maka otu oké oriri! Ha na-eme ka elu ala dị ọcha site n’irichapụ ozu nile nke ndị iro Jehova nwụrụ anwụ. (Ezikiel 39:11, 17-20) Okwu ọzọ Jọn kwuru na-eme ka e cheta amụma ahụ bu ụzọ nke ọma: “M wee hụ otu mmụọ ozi ka ọ na-eguzo n’ime anyanwụ; o wee were oké olu tie mkpu, na-asị nnụnụ nile nke na-efe n’etiti eluigwe, Bịanụ, zukọọ iri oké nri anyasị nke Chineke; ka unu wee rie anụ ahụ ndị eze, na anụ ahụ ndị ọchịagha, na anụ ahụ ndị dị ike, na anụ ahụ ịnyịnya na nke ndị na-anọkwasị ha, na anụ ahụ mmadụ nile, ma ndị nweere onwe ha ma ndị ohu, ma ndị nta ma ndị ukwu.”—Mkpughe 19:17, 18.
21. Gịnị ka e gosiri site na (a) mmụọ ozi ahụ ‘iguzo n’ime anyanwụ’? (b) eziokwu ahụ nke bụ na a hapụrụ ozu ndị e gburu egbu ka ha ghasara n’elu ala? (ch) ngụkọ nke ndị a ga-ahapụ ozu ha ka ha ghasara n’elu ala? (d) okwu ahụ bụ “oké nri anyasị nke Chineke”?
21 Mmụọ ozi ahụ “na-eguzo n’ime anyanwụ,” bụ́ ọnọdụ dị mma iji mee ka nnụnụ nile hụzuo ya anya. Ọ na-akpọ ha òkù ka ha dị njikere iriju afọ site n’anụ ahụ nke ndị Onye Agha ahụ bụ́ Eze na usuu ndị agha eluigwe ya gaje igbu. Eziokwu ahụ bụ na ndị ahụ nwụrụ anwụ ga-aghasara n’elu ala gosiri na ha gaje ịnwụ n’ọnọdụ ihere n’ihu ọha. Dị ka Jezebel oge ochie, a gaghị eli ha eli n’ụzọ dị ùgwù. (2 Ndị Eze 9:36, 37) Ngụkọ nke ndị a ga-ahapụ ka ozu ha ghasara n’elu ala na-egosi ụdị ndị mbibi ahụ ga-emetụta: ndị eze, ndị ọchịagha, ndị dị ike, ndị nweere onwe ha, na ndị ohu. Ọ dịghị ndị a gụpụrụ. Akụkụ nile nke ụwa nnupụisi nke na-emegide Jehova ka a ga-ewepụchasị. Mgbe nke a gasịrị, a gaghị enwekwa oké osimiri na-enugharị enugharị nke ụmụ mmadụ nọ ná mgbagwoju anya. (Mkpughe 21:1) Nke a bụ “oké nri anyasị nke Chineke,” ebe ọ bụ Jehova na-akpọ nnụnụ ndị ahụ ka ha kere òkè na ya.
22. Olee ụzọ Jọn si chikọta otú agha ikpeazụ ahụ ga-esi gaa?
22 Jọn mere nchịkọta nke otú agha ikpeazụ ahụ ga-esi gaa, sị: “M wee hụ anụ ọhịa ahụ, na ndị eze ụwa, na usuu nile nke ndị agha ha, ka ha zukọrọrịị ibu agha megide onye ahụ nke na-anọkwasị ịnyịnya ahụ, megidekwa usuu ndị agha ya. E wee jide anụ ọhịa ahụ, ya na onye amụma ụgha ahụ nke na-eme ihe ịrịba ama ahụ n’ihu ya, bụ́ nke o ji duhie ndị natararịị akara nke anụ ọhịa ahụ, na ndị na-akpọ isiala nye ihe oyiyi ya: e wee tụda ha abụọ ná ndụ n’ime ọdọ ọkụ ahụ nke ji brimstone na-ere: e wee were mma agha nke onye ahụ na-anọkwasị n’ịnyịnya ahụ, bụ́ mma agha ahụ nke si n’ọnụ ya pụta, gbuo ndị fọdụrụ: nnụnụ nile wee rijuo afọ site n’anụ ahụ ha.”—Mkpughe 19:19-21.
23. (a) N’echiche dị aṅaa ka ọ ga-esi bụrụ na a lụrụ “agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” ‘n’Amagedọn’? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa ka “ndị eze ụwa” na-anaraghị, ọ̀ bụkwa gịnị ga-esi na ya pụta?
23 Mgbe a wụpụsịrị ọkwa nke isii nke ọnụma Jehova, Jọn kọrọ na mgbasa ozi sitere n’aka ndị mmụọ ọjọọ chịkọtara “ndị eze nke elu ala dum na nke ụwa dum” bịa “n’agha nke oké ụbọchị ahụ nke Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” Ha ga-alụ agha nke a n’Amagedọn—ọ bụghị ebe nkịtị dị adị, kama ọnọdụ zuru ụwa ọnụ nke ga-akpali Jehova imezu ihe o kpere n’ikpe. (Mkpughe 16:12, 14, 16, King James Version) Ugbu a, Jọn hụrụ ndị nọ n’akụkụ abụọ nke ibu agha ahụ. N’ebe ahụ, “ndị eze ụwa, na usuu nile nke ndị agha ha” edoziwo onwe ha megide Chineke. Ha agbawo isi akwara wee jụ ido onwe ha n’okpuru Eze nke Jehova. Ọ dọrọ ha aka ná ntị nke ọma n’ozi ahụ sitere n’ike mmụọ ya, bụ: “Sutunụ onye a họpụtaworo ọnụ, ka [Jehova] ghara iwe iwe, unu wee laa n’iyi n’ụzọ.” Ebe ha na-edoghị onwe ha n’okpuru ịchịisi Kraịst, ha aghaghị ịnwụ.—Abụ Ọma 2:12.
24. (a) Ikpe dị aṅaa ka e mezuru n’isi anụ ọhịa ahụ na onye amụma ụgha ahụ, ọ̀ bụkwa n’echiche dị aṅaa ka ha ka nọ “ndụ”? (b) N’ihi gịnị ka “ọdọ ọkụ ahụ” na-aghaghị iji bụrụ nke ihe atụ?
24 Anụ ọhịa ahụ nwere isi asaa na mpi iri, nke si n’oké osimiri bilite, nke na-anọchi anya usoro ndọrọ ndọrọ ọchịchị Setan, bụ́ nke a tụbanyere ná mbibi, ya na onye amụma ahụ, bụ́ alaeze ụwa nke asaa. (Mkpughe 13:1, 11-13; 16:13) Mgbe ha ka nọ “ndụ,” mgbe ha ka nọ n’ọrụ ná mmegide ha jikọrọ aka na-emegide ndị Chineke nọ n’elu ala, a na-atụba ha n’ime “ọdọ ọkụ ahụ.” Nke a ọ̀ bụ ọdọ ọkụ nkịtị? Ee e, dịkwa ka anụ ọhịa ahụ na onye amụma ahụ na-abụghị anụ ọhịa nkịtị. Kama nke ahụ, ọ bụ ihe atụ nke mbibi zuru ezu, ebe a na-apụghị isi na ya lọghachi. Ọ bụ n’ebe a ka a ga-emesịa tụba ọnwụ na Hedis, tinyekwara Ekwensu n’onwe ya. (Mkpughe 20:10, 14) O doro nnọọ anya na ọ bụghị oké ọdọ ọkụ nke ịta ahụhụ ebighị ebi maka ndị mmebi iwu, ebe ọ bụ na echiche nke ebe dị otú ahụ bụ ihe arụ n’anya Jehova.—Jeremaịa 19:5; 32:35; 1 Jọn 4:8, 16.
25. (a) Olee ndị bụ ndị ahụ ‘e weere mma agha nke onye ahụ na-anọkwasị n’ịnyịnya ahụ’ gbuo? (b) Ànyị ga-atụ anya na nke ọ bụla n’ime ndị ahụ ‘e gburu’ ga-enwe mbilite n’ọnwụ?
25 Ndị ọzọ nile ndị aka ha na-adịghị kpọmkwem n’ọchịchị, kama ndị bụkwa akụkụ a na-apụghị ịgbanwe agbanwe nke ụwa nke a rụrụ arụ nke ihe a kpọrọ mmadụ ka a ‘ga-ewerekwa mma agha nke onye ahụ na-anọkwasị n’ịnyịnya ahụ gbuo.’ Jisọs ga-ekwupụta na ha kwesịrị ọnwụ. Ebe ọ bụ na e hotaghị ọdọ ọkụ ahụ n’ọnọdụ nke ha, ànyị ga-atụ anya na ha ga-enwe mbilite n’ọnwụ? Ọ dịghị ebe ọ bụla a gwara anyị na ndị Onyeikpe Jehova gburu n’oge ahụ ga-enwe mbilite n’ọnwụ. Dị ka Jisọs n’onwe ya kwuru, ndị nile na-abụghị “atụrụ” ga-apụ “gaa n’ọkụ ebighị ebi ahụ nke e doziworo nye Ekwensu na ndị mmụọ ozi ya,” ya bụ, “baa ná mbibi ebighị ebi.” (Matiu 25:33, 41, 46, NW) Nke a na-emechi “ụbọchị nke ikpe na ịla n’iyi nke ndị na-adịghị asọpụrụ Chineke.”—2 Pita 3:7; Nehum 1:2, 7-9; Malakaị 4:1.
26. Kọọ ná mkpirikpi ihe Amagedọn ga-arụzu.
26 N’ụzọ dị otú a, nzukọ elu ala dum nke Setan na-abịaru ná njedebe. “Eluigwe mbụ ahụ” nke ịchịisi ndọrọ ndọrọ ọchịchị agabigawo. “Ụwa,” bụ́ usoro ihe ahụ yiri ihe na-adịgide adịgide nke Setan wuliteworo n’ime ọtụtụ narị afọ, abụrụwo nke e bibiri kpam kpam ugbu a. “Oké osimiri,” bụ́ ìgwè mmadụ ndị na-emebi iwu, ndị na-emegide Jehova, adịghịkwa ọzọ. (Mkpughe 21:1; 2 Pita 3:10) Ma, gịnị ka Jehova na-akwadebere Setan n’onwe ya? Jọn gara n’ihu ịkọrọ anyị.