Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 10 p. 47-54
  • Ịkpọ “Ihe Nile Dị Omimi nke Setan” Asị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịkpọ “Ihe Nile Dị Omimi nke Setan” Asị
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Nwanyị ahụ, bụ Jezebel”
  • “Ihe Unu Nwere, Jidisienụ Ya Ike”
  • Nọgide n’Ikwesị Ntụkwasị Obi
  • Gee Ntị n’Ihe Mmụọ Nsọ Na-ekwu!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Jezibel​—⁠Ajọ Eze Nwaanyị
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • E Gburu Nwunye Eze Bụ́ Nwaanyị Ọjọọ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Uru Akwụkwọ Mkpughe Ga-abara Gị Taa
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 10 p. 47-54

Isi nke 10

Ịkpọ “Ihe Nile Dị Omimi nke Setan” Asị

TAỊATAỊRA

1. Olee ebe Taịataịra dị ma e jiri ya tụnyere ọgbakọ ndị ọzọ, oleekwa otú ebe ahụ dị n’ihe banyere okpukpe?

N’IHE dị ka 65 kilomita n’ebe ndịda ọwụwa anyanwụ nke Bergama (Pagamọm) ka e nwere obodo ahụ dị na Turkey nke mmadụ bijupụtara, bụ́ Akhisar. N’ihe dị ka 1,900 afọ gara aga, obodo a bụ ebe e nwere Taịataịra. Ọ ga-adịrị onye nlekọta na-ejegharị ejegharị mfe iru Taịataịra site n’ụzọ ime obodo nke sitere Pagamọm wee gaa gburugburu ijezu ọgbakọ nile fọdụrụ ndị e dere banyere ha ná Mkpughe isi nke 3—Sadis, Filadelfịa, na Leọdisia. N’adịghị ka Pagamọm, o yighị ka Taịataịra ọ bụ ebe a ma ama a na-efe onyeeze ofufe, ma o nwere ihu arụsị na ụlọ nsọ dị iche iche ndị a raara nye chi dị iche iche nke ndị na-ekpere arụsị. A maara Taịataịra nke ọma dị ka obodo azụmahịa.

2, 3. (a) Gịnị ka e dekọrọ na mbụ banyere otu onye Taịataịra nke ghọrọ onye Kraịst? (b) Mkpa dị aṅaa ka ọ dị ndị Kraịst nọ na Taịataịra ịmara na Jisọs bụ “Ọkpara Chineke,” na ‘anya ya abụọ dịkwa ka ire ọkụ’?

2 Mgbe Pọl na-ekwusa ozi ọma na Masedonịa, o zutere otu nwanyị onye Taịataịra aha ya bụ Lidia, onye na-ere ihe e ji esiji ákwà odo odo. Lidia na ezinụlọ ya ji obi ụtọ nakwere ozi Pọl na-ekwusa wee leekwa ya ọbịa n’ụzọ pụrụ iche. (Ọrụ 16:14, 15) Nwanyị a ghọrọ onye Taịataịra mbụ e nwere ihe ndekọ banyere ya nke nakweere Iso Ụzọ Kraịst. Mgbe oge na-aga, e mesịrị nwee ọgbakọ ndị Kraịst n’obodo ahụ. Jisọs zijeere ọgbakọ ahụ ozi ya kasị ogologo: “Degakwara mmụọ ozi nke nzukọ Kraịst dị na Taịataịra akwụkwọ, sị, Ihe ndị a ka Ọkpara Chineke na-ekwu, onye anya ya abụọ dị ka ire ọkụ, ụkwụ ya abụọ dịkwa ka ọla a kwọchapụrụ ka o gbupụ.”—Mkpughe 2:18.

3 Ọ bụ nanị n’ebe a ka okwu ahụ bụ “Ọkpara Chineke” pụtara ná Mkpughe, ọ bụ ezie na n’ebe ndị ọzọ, Jisọs zoro aka n’ebe Jehova nọ dị ka “Nna m.” (Mkpughe 2:27; 3:5, 21) Ọ ga-abụ na iji ùtú aha ahụ mee ihe n’ebe a chetaara ndị Kraịst nọ na Taịataịra mmekọrịta chiri anya nke dị n’etiti Jisọs na Jehova. Ọkpara nke a bụ “onye anya ya abụọ dị ka ire ọkụ”—bụ́ ịdọ aka ná ntị nye ndị Kraịst ahụ nọ na Taịataịra na ikpe ya ga-ere dị ka ọkụ megide ihe ọ bụla ọ hụrụ nke na-emetọ ọgbakọ ahụ. Site n’izo aka nke ugbo abụọ n’ụkwụ ya nke na-enwupụ dị ka ọla a kwọchapụrụ akwọchapụ, ọ na-emesi ike ihe atụ nke ya onwe ya dị ka onye jegharịrị n’elu ala n’ikwesị ntụkwasị obi. O doro anya na ndị Kraịst nọ na Taịataịra gbasoro ndụmọdụ ya, anyị aghaghịkwa ime otú ahụ taa!—1 Pita 2:21.

4, 5. (a) N’ihi gịnị ka Jisọs ji nwee ike ịja ndị Kraịst ahụ nọ na Taịataịra mma? (b) N’ụzọ dị aṅaa ka ọgbakọ ahụ dị na Taịataịra si bụrụ ihe atụ nke ọgbakọ Ndịàmà Jehova taa?

4 Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ na Jisọs pụrụ ịja ndị nọ na Taịataịra mma. O kwuru, sị: “Amatara m ọrụ gị nile, na ịhụnanya gị na okwukwe gị na ije ozi gị na ntachi obi gị, matakwa na ọrụ ikpeazụ gị karịrị nke mbụ.” (Mkpughe 2:19) N’adịghị ka ndị Efesọs, ndị Kraịst e tere mmanụ nọ n’ebe ahụ ahapụbeghị ịhụnanya mbụ ha nwere n’ebe Jehova nọ. Okwukwe ha siri ike. Karịsịa, ọrụ ha karịrị ndị ha rụrụ n’oge gara aga, dịkwa ka ọgbakọ atọ ndị bu ya ụzọ, ndị Kraịst nọ na Taịataịra na-atachi obi. Lee nnọọ ka nke a si bụrụ ihe atụ nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 100,000 ọgbakọ Ndịàmà Jehova dị gburugburu ụwa taa! A na-ahụta nnwupụ nke ịhụnanya ha nwere n’ebe Jehova nọ, ka mmụọ nke ịnụ ọkụ n’obi n’ozi ahụ na-agazu nzukọ ahụ dum, na-akpali ma ụmụntakịrị ma ndị okenye. Ọnụ ọgụgụ na-abawanye ụba na-etinye onwe ha n’ọrụ dị ka ndị ọsụ ụzọ, wee si otú a jiri amamihe na-eji oge fọdụrụ na-eme ihe ịkpọsa olileanya dị ebube nke Alaeze Chineke na-abịanụ!—Matiu 24:14; Mak 13:10.

5 Ruo ọtụtụ iri afọ, ọtụtụ ndị kwesịrị ntụkwasị obi, ma ndị so n’ihe fọdụrụ ahụ e tere mmanụ ma ndị so n’oké ìgwè mmadụ ahụ, anọwo na-egosi ezi ihe nlereanya nke ntachi obi n’ozi Chineke, ka ụwa nke ha nọ n’ime ya nọgideworo na-abamikwu n’ime ọchịchịrị nke olileanya na-adịghị ya. Ma ka anyị nwee ezi obi ike! Mkpughe na-akwado àmà nke ndị amụma Chineke n’oge ochie. “Oké ụbọchị Jehova dị nso, ọ dị nso, ọ na-emekwa ngwa ngwa nke ukwuu.”—Zefanaịa 1:14; Joel 2:1; Habakuk 2:3; Mkpughe 7:9; 22:12, 13.

“Nwanyị ahụ, bụ Jezebel”

6. (a) N’agbanyeghị ihe ndị a pụrụ ịja mma nke ọgbakọ ahụ na-eme, nsogbu dị aṅaa ka Jisọs hụtara n’ọgbakọ ahụ dị na Taịataịra nke ọ dị mkpa ilebara ya anya ozugbo? (b) Ònye bụ Jezebel, ò kwesịkwara ekwesị ịzọrọ na ya bụ onye amụma nwanyị?

6 Anya Jisọs nke dị ka ire ọkụ gara n’ihu ịhụ ihe. Ọ kpọtụrụ uche n’otu ihe nke chọrọ ilebara anya ngwa ngwa. Ọ gwara ndị Kraịst ahụ nọ na Taịataịra, sị, “Ma enwere m nke a imegide gị, na i kwere nwanyị ahụ, bụ́ Jezebel, onye na-akpọ onwe ya onye amụma nwanyị; ọ na-ezikwa ndị ohu m ihe, na-eduhiekwa ha, ka ha kwaa iko, riekwa ihe a chụrụ n’àjà nye arụsị.” (Mkpughe 2:20) Na narị afọ nke iri T.O.A., Eze Nwanyị Jezebel, bụ́ nwunye Eze Ehab nke Israel onye na-efe chi Beal, aghọwo onye a ma ama n’ihi igbu mmadụ, ịkwa iko, na ọchịchị aka ike ya. Jihu, dị ka onye Jehova e tere mmanụ, hụrụ na e gburu ya. (1 Ndị Eze 16:31; 18:4; 21:1-16; 2 Ndị Eze 9:1-7, 22, 30, 33) Jezebel ahụ na-efe arụsị enweghị ezi ihe ọ bụla mere ọ ga-eji kwuo na ya bụ onye amụma nwanyị. Ọ dịghị ka Miriam na Debora, ndị jere ozi dị ka ndị amụma nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi n’Israel. (Ọpụpụ 15:20, 21; Ndị Ikpe 4:4; 5:1-31) Mmụọ Jehova akpalighịkwa ya ibu amụma dị ka ọ kpaliri agadi nwanyị ahụ bụ́ Ana na ụmụ ndị inyom anọ nke Filip onye na-ekwusa ozi ọma.—Luk 2:36-38; Ọrụ 21:9.

7. (a) Site n’ịkpọtụ “nwanyị ahụ, bụ́ Jezebel” aha, mmetụta dị aṅaa ka ihe àmà gosiri na Jisọs na-ezo aka na ya? (b) Olee otú ụfọdụ ndị inyom nọ n’ọgbakọ pụrụ isiworị gosi na ịgbaso echiche nke onwe ha ziri ezi?

7 N’ihi nke a, o doro anya na “nwanyị ahụ, bụ́ Jezebel,” onye na-azọrọ na ya bụ onye amụma nwanyị na Taịataịra bụ adịgboroja. O nweghị nkwado nke mmụọ Chineke. Ònye ka ọ bụ? O yiri ka ọ bụ otu nwanyị ma ọ bụ ìgwè ndị inyom ndị nọ dị ka ndị ihere na-adịghị eme, ndị na-enwe mmetụta na-emerụ emerụ n’ọgbakọ ahụ. Ndị inyom ụfọdụ nọ n’ọgbakọ pụrụ ịnọworị na-eduba ndị nọ n’ọgbakọ ahụ n’omume rụrụ arụ, ma jiri anya ọcha na-egosipụta na ịgbaso echiche nke onwe ha n’ụzọ dị otú a ziri ezi site n’ịkọwahie akụkụ akwụkwọ nsọ dị iche iche. Nke a bụ n’ezie ibu amụma ụgha! Ha ga-aghọgbu ndị ọzọ ịdaba n’ụzọ ha nke “ịkwa iko, adịghị ọcha, ọchịchọ ọjọọ, agụụ ihe ọjọọ na anyaukwu ahụ, n’ihi na nke a bụ ikpere arụsị.” (Ndị Kọlọsi 3:5) Ha ga-eme ka ndị nọ n’ime ọgbakọ tinye aka n’ụzọ adịghị ọcha nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, bụ́ nke a na-anabata ugbu a ma ọ bụ gbachi nkịtị ka ọ na-aga n’ihu n’ihe ka ọtụtụ n’okpukpe nile nke Krisendọm.

8. (a) Gịnị ka Jisọs kwuru banyere “Jezebel” ahụ nọ na Taịataịra? (b) Olee ụzọ e siworo nwee mmetụta na-ekwesịghị ekwesị nke ndị inyom n’oge a?

8 Jisọs gara n’ihu ịgwa ndị okenye nọ na Taịataịra, sị: “Enyekwara m ya oge, ka o wee chegharịa; ma ọ chọghị ichegharị n’ịkwa iko ya. Lee, ana m atụba ya n’ihe ndina, tụbakwa ndị sooro ya kwaa iko n’ime oké mkpagbu, ma a sị na ha echegharịghị n’ọrụ ya.” (Mkpughe 2:21, 22) Dị nnọọ ka ihe àmà gosiri na Jezebel nke mbụ ahụ nwere ike n’ahụ Ehab wee jụkwa ikwenyere onye na-arụrụ Chineke ọrụ mbibi, bụ́ Jihu, otú ahụ ka ọ pụrụ ịbụ na ndị inyom ndị a nwara inwe mmetụta n’ahụ ndị di ha na ndị okenye ọgbakọ. O yiri ka ndị okenye nọ na Taịataịra kwere ka ajọ mmetụta nke Jezebel nke a dịgide. N’ebe a, Jisọs nyere ha ịdọ aka ná ntị siri ike, dịkwa ka ọ dị nye ọgbakọ ndị Jehova gburugburu ụwa taa. N’oge ndị a, ụfọdụ ụmụ nwanyị ndị ekwo kpọrọ nkụ otú ahụ edubawo di ha n’ịghọ ndị si n’ezi ofufe dapụ, kpaliekwa ndị mmadụ ịkpọpụ ndị ohu Jehova kwesịrị ntụkwasị obi n’ụlọikpe.—Tụlee Jud 5-8.

9. (a) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na okwu Jisọs banyere Jezebel adịghị arụ ụmụ nwanyị nile nọ n’ọgbakọ aka ọjọọ? (b) Nanị olee mgbe ka mmetụta Jezebel na-ebilite?

9 Ọ dịghị ụzọ ọ bụla nke a si na-arụ ụmụ nwanyị kwesịrị ntụkwasị obi ndị nọ n’ọgbakọ ndị Kraịst aka ọjọọ. N’oge a, ọ bụ ụmụ nwanyị na-arụzu akụkụ ka ukwuu nke ọrụ ịgba àmà ahụ; site n’ọmụmụ Bible ebe obibi ndị ha na-eduzi, ha na-akpọbata oké ìgwè ndị ọhụrụ n’ime ọgbakọ. Chineke n’onwe ya na-agọzi ndokwa nke a, dị ka e gosiri n’Abụ Ọma 68:11: “Onyenwe anyị na-enye okwu: ndị inyom ndị na-ezisa ozi ahụ bụ usuu bara ụba.” A pụrụ inwe mmetụta dị mma n’ahụ ndị bụ di site n’àgwà dị nro, nke na-egosikwa nsọpụrụ nke ndị nwunye ha, “nke dị oké ọnụ ahịa n’anya Chineke.” (1 Pita 3:1-4) Eze Lemuel jara nwanyị ahụ na-ejide onwe ya nke ọma, na-arụsikwa ọrụ ike, mma. (Ilu 31:10-31) Ọ bụ nanị mgbe ndị inyom zọhiere ụkwụ site n’ịghọgbu ndị nwoke ma ọ bụ n’ịma ịbụ isi ha aka ma ọ bụ ilefuru ya anya ka a na-enwe mmetụta nke Jezebel.—Ndị Efesọs 5:22, 23; 1 Ndị Kọrint 11:3.

10. (a) N’ihi gịnị ka Jezebel na ụmụ ya ji anata ikpe ọmụma? (b) N’ọnọdụ ize ndụ dị aṅaa ka ndị ahụ na-aghọ ụmụ Jezebel nọ na ya, gịnịkwa ka ndị dị otú ahụ kwesịrị ime?

10 N’ikwu banyere “nwanyị ahụ, bụ́ Jezebel,” Jisọs gara n’ihu sị: “M ga-ewerekwa ọnwụ gbuo ụmụ ya; nzukọ Kraịst nile ga-amarakwa na mụ onwe m bụ onye na-enyocha akụrụ na obi nile: m ga-enyekwa unu n’otu n’otu dị ka ọrụ nile unu si dị.” (Mkpughe 2:23) Jisọs enyewo Jezebel na ụmụ ya oge iji chegharịa, ma ha nọgidere n’ụzọ ha rụrụ arụ, n’ihi ya, ha aghaghịkwa ịnata ikpe ọmụma. E nwere ozi siri ike n’ebe a nye ndị Kraịst nke oge a. Ndị ahụ na-eṅomi Jezebel, ma hà bụ ndị ikom ma hà bụ ndị inyom, wee si otú ahụ bụrụ ụmụ ya site n’imebi ụkpụrụ Bible banyere ịbụ isi na ịdị ọcha nke omume, ma ọ bụ na-eme isi ike ka ha wee lefuru usoro ọchịchị Chineke anya, nọ n’ọnọdụ ọrịa dị oké ize ndụ n’ụzọ ime mmụọ. N’eziokwu, ọ bụrụ na onye dị otú ahụ akpọkuo ndị okenye ọgbakọ ikpere ya ekpere, “ekpere nke okwukwe ahụ ga-azọpụtakwa onye ahụ ahụ na-adịghị ike, [Jehova, NW] ga-emekwa ka o bilie”—ma ọ bụrụ na o jiri obi umeala mee ihe kwekọrọ n’ekpere ndị ahụ. Ma, ka onye ọ bụla ghara iche na ya pụrụ ịghọgbu Chineke ma ọ bụ Kraịst site n’ịnwa izobe omume rụrụ arụ ma ọ bụ igosi ịnụ ọkụ n’obi n’ozi ahụ nanị n’ihu ọha.—Jemes 5:14, 15.

11. N’ụzọ dị aṅaa ka e si eme ka ọgbakọ dị iche iche taa mụrụ anya megide mmịbata nke mmetụta na-ekwesịghị ekwesị nke ndị inyom?

11 Ọ bụ ihe obi ụtọ ịhụ na ihe ka ọtụtụ n’ọgbakọ Ndịàmà Jehova taa mụ anya n’ebe ihe ize ndụ nke a dị. Ndị okenye na-elezi anya ịhụta ihe ọ bụla yiri àgwà na-ekwekọghị n’usoro ọchịchị Chineke na mmebi iwu. Ha na-agbalị inyere ma ndị nwoke ma ndị nwanyị aka, bụ́ ndị nọ n’ihe ize ndụ, ka e wee wulite ndụ ime mmụọ ha, mezigharịakwa ndụ ha mgbe oge na-agabigabeghị. (Ndị Galetia 5:16; 6:1) Site n’ịhụnanya na ịkwụsi ike, ndị nlekọta ndị a bụ́ ndị Kraịst na-egbochi mgbalị ọ bụla nke ụmụ nwanyị iguzobe òtù ma ọ bụ ịkwalite ihe omume ndị yiri nke ụmụ nwanyị ndị na-achọ inwere onwe ha. Karịsịa, a na-enye ezi ndụmọdụ site n’oge ruo n’oge n’akwụkwọ dị iche iche Ndịàmà Jehova na-ebipụta.a

12. N’ụzọ dị aṅaa ka òtù Jọn nke taa si egosipụta ịnụ ọkụ n’obi yiri nke Jihu?

12 Otú ọ dị, n’ebe e nweworo oké omume rụrụ arụ, karịsịakwa mgbe nke a ghọrọ ihe a na-eme mgbe mgbe, a ghaghị ịchụpụ ndị mmehie na-enweghị nchegharị. Anyị ga-echeta ịnụ ọkụ n’obi Jihu ji kpochapụ mmetụta nile nke Jezebel kpam kpam n’Israel. N’otu aka ahụ, òtù Jọn nke oge a na-emesi ihe ike, na-esetịpụrụ ndị “Jehonadab” na-esonyere ha ihe nlereanya, na-egosikwa na ha pụrụ nnọọ iche n’ebe ndị ụkọchukwu Krisendọm dị, bụ ndị na-agbachi ụdị omume ọ bụla nkịtị.—2 Ndị Eze 9:22, 30-37; 10:12-17.

13. Gịnị ga-eme ndị ahụ dabara ná mmetụta ọjọọ nke ndị inyom?

13 Dị ka Onyeozi na Ọkàikpe nke Jehova, Ọkpara Chineke na-eme ihe ziri ezi n’ime ka a mara Jezebel nke oge a na ịtụba ya n’ihe ndina ọrịa n’ihi na ọrịa ime mmụọ ya bụ n’ezie ọrịa na-adịghị ala ala. (Malakaị 3:1, 5) Ndị ahụ dabaworo n’ajọ mmetụta ndị inyom nke a ga-atakwa ahụhụ mkpagbu dị ukwuu—iru újú nke ịbụ ndị a chụpụrụ n’ọgbakọ, na-ekewapụ ha n’ọgbakọ ndị Kraịst dị ka à ga-asị na ha nwụrụ anwụ. Ọ gwụla ma ndị a hà chegharịrị, chigharịakwa, e wee nabataghachi ha n’ime ọgbakọ, ha onwe ha na-echekwa ọnwụ anụ ahụ ihu site ‘n’ajọ ihe otiti’—ya dịkarịa anya, n’oge mkpagbu ukwu ahụ. Ka ọ dị ugbu a, ha pụrụ inweghachi ọnọdụ mbụ ha ma ọ bụrụ na ha echegharịa kpam kpam n’ọrụ ọjọọ ha nile.—Matiu 24:21, 22; 2 Ndị Kọrint 7:10.

14. (a) Olee otú Jisọs si eji ndị okenye eme ihe n’ilebara okwu ụfọdụ anya, dị ka mmetụta Jezebel ọ bụla? (b) Olee otú ọgbakọ kwesịrị isi kwadoo ndị okenye ndị na-eleba anya n’ụdị okwu ndị ahụ?

14 “Nzukọ Kraịst nile” aghaghị ịmara na Jisọs na-enyocha “akụrụ,” bụ́ mmetụta nile kasị dị omimi, na “obi” bụ́ ihe mmadụ bụ n’ime, gụnyere ihe ndị na-akpali ya. Iji mee nke a, ọ na-eji kpakpando ndị ahụ ọ tụkwasịrị obi, ma ọ bụ ndị okenye, na-elebara okwu ụfọdụ anya, dị ka mmetụta Jezebel ọ bụla a malitere ịhụ. (Mkpughe 1:20) Mgbe ndị okenye ndị a nyochasịworo okwu yiri nke a wee kpebie ikpe, ọ dịghịrị ndị mmadụ n’otu n’otu ije nyochasịwa ihe kpatara e ji mee ihe e mere. Mmadụ nile kwesịrị iji obi umeala nakwere otú ndị okenye si lebara okwu anya nọgidekwa na-akwado kpakpando ndị a dị n’ọgbakọ. A ga-akwụghachi ikwesị ntụkwasị obi nye Jehova na ndokwa nile dị ná nzukọ ya ụgwọ ọrụ. (Abụ Ọma 37:27-29; Ndị Hibru 13:7, 17) N’akụkụ nke gị, ka ihe ị ga-eketa bụrụkwa ngọzi mgbe Jisọs ga-enye onye ọ bụla n’otu n’otu dị ka ọrụ nile ya si dị.—Ndị Galetia 5:19-24; 6:7-9.

“Ihe Unu Nwere, Jidisienụ Ya Ike”

15. (a) Gịnị ka Jisọs gwara ndị ahụ Jezebel na-emerụbeghị? (b) Gịnị gosiri na ọ bụghị ndị nile kpọrọ onwe ha ndị Kraịst laa azụ na 1918 ka Krisendọm nke si n’ezi ofufe dapụ merụworo?

15 Okwu ọzọ Jisọs kwuru bụ ihe nkasi obi: “Ma unu ka m na-agwa, bụ́ ndị fọdụrụ na Taịataịra, ka unu hà, bụ́ ndị na-enweghị ozizi a, mmadụ ndị na-amaghị ihe nile dị omimi nke Setan, dị ka ha na-ekwu; Ebokwasịghị m unu ibu arọ ọzọ. Otú ọ dị, ihe unu nwere, jidesienụ ya ike ruo mgbe m ga-abịa.” (Mkpughe 2:24, 25) E nwere mkpụrụ obi ndị na-ekwesị ntụkwasị obi na Taịataịra, ndị na-ekwebeghị ka Jezebel nwee mmetụta n’ahụ ha. N’otu aka ahụ, n’ime 40 afọ bu 1918 ụzọ, nakwa eri mgbe ahụ, ọ bụghị ndị nile kpọrọ onwe ha ndị Kraịst nakwereworo ụzọ ịkwa iko nile rụrụ arụ nke jupụtara ebe nile na Krisendọm. Ìgwè nta nke Ndị Mmụta Bible, ndị a maara ugbu a dị ka Ndịàmà Jehova, ndị nwara inyere ndị òtù chọọchị aka ịhụ otú o si bụrụ na ọtụtụ ozizi Krisendọm amaliteghị n’aka ndị Kraịst, emewo ihe iwepụchasị n’etiti onwe ha mmetụta nile fọrọ afọ nke Babilọn na omume nile a natara site n’aka Krisendọm nke si n’ezi ofufe dapụ. Nke a gụnyere ozizi ahụ nke na-anakwere ihe ọjọọ nke “nwanyị ahụ, bụ́ Jezebel.”

16. Ọ bụ ezie na Jisọs na òtù na-achị isi nke ndị Kraịst na narị afọ mbụ ahụ atụkwasịghị ibu ọrụ ọzọ, olee ihe ndị a na-aghaghị izere?

16 Òtù Jọn ahụ nke oge a agbawokwa ndị na-esonyere ha, bụ́ oké ìgwè mmadụ ahụ, ume ịkpachara anya megide mmetụta ọjọọ nile, dị ka ndị ahụ dị n’ihe ntụrụ ndụ ụwa ndị na-emerụ emerụ. Ọ dịghị mkpa ikiri ma ọ bụ inwe ahụmahụ nke ihe rụrụ arụ nanị ka a mara otú ọ dị ma ọ bụ iji mata ihe e kwesịrị izere. Ọ bụ ụzọ amamihe izere “ihe nile dị omimi nke Setan.” Dị ka Jisọs kwuru: “Ebokwasịghị m unu ibu arọ ọzọ.” Nke a na-echetara anyị iwu ahụ òtù na-achị isi nke ndị Kraịst na narị afọ mbụ nyere, sị: “Ọ dị mmụọ nsọ mma, dịkwa anyị onwe anyị mma, ka anyị ghara ibo unu ibu arọ karị ihe ndị a dị mkpa: ka unu hapụ ihe nile a chụrụ n’àjà nye arụsị, na ọbara, na anụ a nyagburu anyagbu, na ịkwa iko; ọ bụrụ na unu edebe onwe unu ghara imetụ ihe ndị a aka, ọ ga-adịrị unu mma. Jisienụ ike.” (Ọrụ 15:28, 29) Ka i wee nwee ihe ịga nke ọma n’ime mmụọ, zere okpukpe ụgha, iji ọbara eme ihe na-ekwesịghị ekwesị (dị ka ná mmịnye ọbara), na omume rụrụ arụ! Nke a pụkwara ichebe ahụ ike gị n’anụ ahụ.

17. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Setan siworo jiri “ihe nile dị omimi” nwaa ndị mmadụ taa? (b) Gịnị kwesịrị ịbụ àgwà anyị n’ebe “ihe nile dị omimi” nke ụwa ọgbara ọhụrụ Setan dị?

17 Setan nwere “ihe nile dị omimi” ndị ọzọ taa, dị ka nchepụta echiche na-agbagwoju anya na ozizi ndị na-eme ka echiche mmadụ chee na ọ bụ oké ihe. Tụkwasị n’echiche na-adịghị ọcha ndị na-anakwere ụdị àgwà ọ bụla, ndị a gụnyere ime mgbaasị na ozizi nke evolushọn. Olee otú Onye Okike ahụ kasị nwee amamihe si ele “ihe nile dị omimi” ndị a anya? Pọl onyeozi hotara ihe o kwuru, sị: “M ga-ala amamihe nke ndị maara ihe n’iyi.” N’ụzọ megidere nke ahụ, “ihe nile dị omimi nke Chineke” dị mfe, kwe nghọta, na-enye obi ụtọ. Ndị Kraịst maara ihe na-ajụ “ihe nile dị omimi” nke ụwa ọgbara ọhụrụ Setan. Cheta na “ụwa na-agabigakwa, ya na agụụ ihe ọjọọ ya: ma onye naeme ihe Chineke na-achọ na-anọgide ruo mgbe ebighị ebi.”—1 Ndị Kọrint 1:19; 2:10; 1 Jọn 2:17.

18. Ngọzi dịgasị aṅaa ka Jisọs kwere ndị Kraịst e tere mmanụ ná nkwa, bụ́ ndị nọgidere n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ, ihe ùgwù dịkwa aṅaa ka ndị a a kpọlitere n’ọnwụ ga-enwe n’Amagedọn?

18 Ugbu a, Jisọs na-agwa ndị Kraịst ahụ nọ na Taịataịra okwu agbamume. Okwu ndị ahụ na-agbakwa ndị Kraịst e tere mmanụ ume taa: “Onye na-emeri emeri, na onye na-edebe ọrụ m nile ruo ọgwụgwụ ihe nile, ya ka m ga-enyekwa ike ịchị mba nile: ọ ga-ewerekwa mkpanaka ígwè zụọ ha dị ka atụrụ, dị ka a na-akụjisi ite nke ọkpụ ite; dị ka mụ onwe m natawokwara n’aka Nna m.” (Mkpughe 2:26, 27) Lee nnọọ ihe ùgwù dị ebube nke a bụ! Ikike nke a nke ndị e tere mmanụ na-enwe mmeri natara mgbe ha bilitere n’ọnwụ bụ iso Jisọs kere òkè n’iji “mkpanaka ígwè” ahụ e ji ebibi ihe na-eme ihe megide mba nile na-enupụ isi n’Amagedọn. N’agbanyeghị otú ha dịruru n’ike, ngwá agha nuklia nke mba ndị ahụ ga-agbarịsị dị ka icheku ọkụ a wụsara mmiri mgbe Kraịst na-etipịasị ndị iro ya dị ka à ga-asị na ha bụ ite ụrọ.—Abụ Ọma 2:8, 9; Mkpughe 16:14, 16; 19:11-13, 15.

19. (a) Ònye bụ “kpakpando ụtụtụ” ahụ, à ga-esikwa aṅaa were ya nye ndị nwere mmeri? (b) Agbamume dị aṅaa ka e nyere oké ìgwè mmadụ ahụ?

19 Jisọs kwukwara, sị: “M ga-enyekwa ya kpakpando ụtụtụ.” (Mkpughe 2:28) Jisọs n’onwe ya mesịrị kọwaa ihe “kpakpando” nke a bụ, na-asị: “Mụ onwe m bụ mkpọrọgwụ Devid, bụrụkwa nwa ọ mụrụ, kpakpando na-enwu enwu, nke bụkwa kpakpando ụtụtụ ahụ.” (Mkpughe 22:16) Ee, ọ bụ Jisọs bụ onye mezuru amụma ahụ nke Jehova manyere Belam ibu, ọ bụ ezie na ọ dịghị njikere ime otú ahụ: “Otu kpakpando ga-esi na Jekọb zọlie ije, mkpanaka eze ga-esikwa n’Israel bilie.” (Ọnụ Ọgụgụ 24:17) Olee otú Jisọs ga-esi nye ndị ahụ nwere mmeri “kpakpando ụtụtụ”? O doro anya na ọ bụ site n’inye ha onwe ya, site n’ịkpọbata ha ná mmekọrịta kasị chie anya nke ha na ya. (Jọn 14:2, 3) Lee nnọọ oké ihe mkpali nke a bụ iji nwee ntachi obi! Ọ bụkwa ezi ihe mkpali nye oké ìgwè mmadụ ahụ ịmara na “kpakpando ụtụtụ ahụ” ga-eji ike Alaeze mee ihe n’oge na-adịghị anya n’iweghachite Paradaịs n’elu ala ebe a!

Nọgide n’Ikwesị Ntụkwasị Obi

20. Ihe ndị dị aṅaa na-eme na Krisendọm na-echetara anyị adịghị ike ụfọdụ e nwere n’ọgbakọ ahụ dị na Taịataịra?

20 Ozi nke a aghaghị ịgbaworịị ndị Kraịst nọ na Taịataịra ume n’ụzọ dị ukwuu. Cheedị nnọọ ihe ọ bụ—Ọkpara Chineke ahụ e meworo ka ọ dị ebube n’eluigwe agwawo ndị Kraịst nọ na Taịataịra okwu n’onwe ya banyere ụfọdụ n’ime ihe isi ike ndị ha na-enwe! O doro anya na, ma ọ dịghị ihe ọzọ, ụfọdụ ndị nọ n’ime ọgbakọ ahụ nakweere ọzụzụ ịhụnanya dị otú a a zụrụ ha dị ka atụrụ. Ozi nke a kasị ogologo n’ime ozi asaa ahụ na-enyekwara anyị aka ịmata nke bụ ezi ọgbakọ ndị Kraịst taa. Na 1918, mgbe Jisọs bịara n’ụlọ nsọ Jehova ikpe ikpe, ihe ka nnọọ ọtụtụ n’òtù ndị na-azọrọ na ha bụ ndị Kraịst jupụtara n’ikpere arụsị na ịkwa iko ime mmụọ. (Jemes 4:4) Ụfọdụ mere ka nkwenkwe ha nile dabere n’ozizi nke ụmụ nwanyị ndị nwere echiche siri ike na narị afọ nke 19, dị ka Ellen White nke ndị Seventh-Day Adventists na Mary Baker Eddy nke ndị Christian Scientists, n’oge ndị na-adịbeghịkwa anya, ọtụtụ ụmụ nwanyị anọwo na-ezi ihe site na pụlpit. (Lee ọdịiche dị n’etiti nke a na 1 Timoti 2:11, 12.) N’etiti òtù dị iche iche nke okpukpe Katọlik, a na-enyekarị Meri nsọpụrụ karịa Chineke na Kraịst. Jisọs enyeghị ya ụdị nsọpụrụ ahụ. (Jọn 2:4; 19:26) À pụrụ ịnakwere òtù ndị na-anabata mmetụta ụmụ nwanyị ndị dị otú ahụ dị ka ndị bụ nke ndị Kraịst n’ezie?

21. Ihe mmụta dịgasị aṅaa ka ndị mmadụ n’otu n’otu pụrụ inweta n’ozi Jisọs zigaara Taịataịra?

21 Ndị Kraịst n’otu n’otu, ma hà so n’òtù Jọn ahụ ma ọ bụ na ha so n’etiti atụrụ ọzọ ahụ ga-eme nke ọma ịtụle ozi nke a. (Jọn 10:16) Ọ pụrụ ịmasị ụfọdụ ndị ịgbaso ụzọ dị mfe, dị ka ndị na-eso ụzọ Jezebel ahụ nọ na Taịataịra mere. E nwekwara ọnwụnwa nke ikwenyere ozizi ụgha. Taa, e nwere ihe iseokwu ndị a na-aghaghị iche ihu, dị ka iri ihe ndị e ji ọbara mee ma ọ bụ ịnara mmịnye ọbara. Ụfọdụ ndị pụrụ iche na ịnụ ọkụ n’obi n’ozi ubi ma ọ bụ ikwu okwu ihu ọha dị iche iche na-enye ha ikike ịgbahapụtụ ihe ndị ọzọ aka, dị ka ikiri sinima na vidio ndị na-egosi ime ihe ike na omume rụrụ arụ, ma ọ bụ ịṅụbiga mmanya ókè. Ịdọ aka ná ntị Jisọs nyere ndị Kraịst nọ na Taịataịra gosiri na anyị ekwesịghị ịkpa àgwà ndị dị otú ahụ. Jehova chọrọ ka anyị dị ọcha, jiri obi nile na-eje ozi, ghara ịbụ ndị e kewara ekewa n’uche, dị ka ọtụtụ ndị Kraịst nọ na Taịataịra.

22. Jisọs si aṅaa mesie mkpa ọ dị ike inwe ntị nke na-anụ ihe?

22 N’ikpeazụ, Jisọs kwuru, sị: “Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa nzukọ Kraịst.” (Mkpughe 2:29) Na nke ugboro anọ ya, Jisọs kwughachiri okwu ịdọ aka ná ntị nke a na-akpali akpali, a ga-ejikwa ya mechie ozi ya atọ ndị ka na-abịa n’ihu. Ì nwere ntị na-anụ ihe otú ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, nọgide na-aṅa ntị nke ọma ka Chineke, site ná mmụọ ya, nọgidere na-enye ndụmọdụ site n’ụzọ nzite ozi ya.

[Ihe e dere n’ala ala peeji]

a Dị ka ihe atụ, lee isiokwu bụ́ “Ndị Inyom Ndị Kraịst Kwesịrị Ntụkwasị Obi—Ndị Dị Oké Ọnụ Ahịa Na-efe Chineke Ofufe” nke dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke November 1, 2003.

[Foto ndị dị na peeji nke 51]

Taa, ụmụnna anyị ndị nwanyị ndị na-ekwesị ntụkwasị obi na-arụzu akụkụ dị ukwuu n’ọrụ ịgba àmà ahụ ka ha ji obi umeala na-akwado ịchịisi ọchịchị Chineke

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya