Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ọnụnọ nke Mesaịa ahụ na Ọchịchị Ya
    Ụlọ Nche—1992 | Ọktoba 1
    • Ụzọ Kraịst Ga-esi Laghachi

      3. Gịnị ka ọtụtụ mmadụ kwere banyere nlaghachi Kraịst?

      3 Dị ka akwụkwọ ahụ bụ́ An Evangelical Christology si kwuo, “ọbịbịa nke ugbo abụọ ma ọ bụ nlaghachi nke Kraịst (parousia) na-eguzobe alaeze Chineke, n’ikpeazụ, n’ihu mmadụ nile, nakwa ruo mgbe nile ebighị ebi.” Ọ bụ nkwenkwe nke e nwere n’ebe nile na nlaghachị Kraịst ga-eme n’anya mmadụ nile, bụrụ nke onye ọ bụla bi ná mbara elu ala ga-ahụ n’ụzọ nkịtị. Iji kwadoo echiche nke a, ọtụtụ na-arụtụ aka gaa ná Mkpughe 1:7, bụ́ nke na-agụ, sị: “Lee, ọ na-abịa, ya na igwe ojii; anya nile ọ bụla ga-ahụzukwa ya, ndị ahụ ga-ahụkwa ya, bụ́ ndị mara ya ube.” Ma amaokwu nke a ọ̀ bụ nke a ga-aghọta n’ụzọ nkịtị?

      4, 5. (a) Olee ụzọ anyị si mara na a gaghị ewere ihe Mkpughe 1:7 pụtara n’echiche nkịtị? (b) Olee ụzọ okwu Jisọs n’onwe ya si mesie nghọta nke a ike?

      4 Cheta, e nyefere akwụkwọ Mkpughe “n’ihe àmà.” (Mkpughe 1:1, NW) Mgbe ahụ, ihe odide nke a aghaghị ịbụ ihe atụ; e kwuwerị, olee ụzọ “ndị mara ya ube” pụrụ isi hụ nlaghachi Kraịst? Ha anwụworị n’ihe dị ka 20 narị afọ! Ọzọkwa, ndị mmụọ ozi ahụ kwuru na Kraịst ga-alaghachi “n’otu aka ahụ” dị ka o si laa. Ọ dị mma, olee otú o si laa? Ọ̀ bụ ka ọtụtụ nde nọ na-ekiri ya? Ee e, nanị mmadụ ole na ole kwesịrị ntụkwasị obi hụrụ ihe omume ahụ. Mgbe ndị mmụọ ozi ahụ gwakwara ha okwu, ndị ozi ahụ hà nọ na-ekiri ọlịla Kraịst n’ụzọ nkịtị ruo mgbe o ruru eluigwe? Ee e, igwe ojii ekpuchiwo Jisọs pụọ n’ọhụhụ ụzọ ha. Mgbe oge ụfọdụ gasịrị, ọ ghaghị ịbanyeworị n’eluigwe nke ndị bụ mmụọ dị ka onye bụ mmụọ, nke anya mmadụ na-adịghị ahụ. (1 Ndị Kọrint 15:50) Ya mere, ya karịsịa, ndị ozi ahụ hụrụ nanị mmalite nke ọlịla Jisọs; ha apụghị ikiri ọgwụgwụ ya, nlaghachi ya gaa n’ọnụnọ eluigwe nke Nna ya, bụ́ Jehova. Nke a ka ha pụrụ nanị ịghọta site n’anya nke okwukwe ha.—Jọn 20:17.

      5 Bible na-akụzi na Jisọs ga-alaghachi n’ụzọ yiri nke ahụ kpọmkwem. Jisọs n’onwe ya kwuru n’oge na-adịghị anya tupu ọnwụ ya, sị: ‘Ọ fọdụrụ nwa oge, ụwa agaghị ahụkwa m.’ (Jọn 14:19) O kwukwara na “alaeze Chineke adịghị abịa n’ụzọ a na-ahụ anya nke ọma.” (Luk 17:20, NW) Mgbe ahụ, n’echiche dị aṅaa ka ‘anya nile ga-ahụ ya’? Iji zaa nke ahụ, ọ dị mkpa ka anyị buru ụzọ ghọta n’ụzọ doro anya okwu nke Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ji mee ihe n’ihe banyere nlaghachi ya.

      6. (a) N’ihi gịnị ka okwu ndị dị ka “nlaghachi,” “mbịarute,” “ịbịa ọzọ,” na “ọbịbịa” na-ejighị bụrụ nsụgharị zuru ezu nke okwu Grik ahụ bụ́ pa·rou·siʹa? (b) Gịnị na-egosi na pa·rou·siʹa, ma ọ bụ “ọnụnọ,” na-adị anya karịa ihe ọ bụla a na-eme nwa oge?

      6 Ihe bụ eziokwu bụ, Kraịst na-eme ihe karịrị nnọọ “nlaghachi.” Okwu ahụ, dị ka “ọbịbịa,” “mbịarute,” ma ọ bụ “ịbịa ọzọ,” pụtara otu ihe omume e mere n’ime oge dị mkpirikpi. Ma okwu Grik nke Jisọs na ndị na-eso ụzọ ya ji mee ihe pụtara ihe karịrị nke ahụ. Okwu ahụ bụ pa·rou·siʹa, nke pụtara n’ụzọ nkịtị “ịnọnyere” ma ọ bụ “ọnụnọ.” Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ndị ọkà mmụta kwetara na okwu nke a metụtara ọ bụghị nanị mbịarute nkịtị kamakwa ịnọrọ gaa n’ihu—dị ka mgbe onye eze bịara leta Obodo. Ọnụnọ nke a abụghị ihe e mere n’ime nwa oge; ọ bụ ọgbọ pụrụ iche, oge nke a kara akara. Na Matiu 24:37-39, (NW), Jisọs sịrị na “ọnụnọ [pa·rou·siʹa] nke Nwa nke mmadụ” ga-adị ka “ụbọchị Noa” nke gwụsịrị n’Iju Mmiri ahụ. Noa na-ewu ugbo ahụ ma na-adọ ndị ajọ omume aka ná ntị ruo ọtụtụ iri afọ tupu Iju Mmiri ahụ abịa wee kpochapụ usoro ụwa ahụ rụrụ arụ. Mgbe ahụ, n’otu aka ahụ, ọnụnọ Kraịst nke a na-adịghị ahụ anya na-adịru ogologo oge nke iri afọ ụfọdụ tupu ọ bịa ná ngwụsị n’oké mbibi.

      7. (a) Gịnị na-egosi na pa·rou·siʹa ahụ abụghị nke anya mmadụ na-ahụ? (b) Olee ụzọ, ọ̀ bụkwa olee mgbe ka akụkụ akwụkwọ nsọ ndị na-akọwa nlaghachi Kraịst dị ka nke “anya nile ọ bụla” ga-ahụ ga-emezu?

      7 Ihe ịrụ ụka adịghị ya na pa·rou·siʹa abụghị nke anya mmadụ na-ahụ n’ụzọ nkịtị. Ọ bụrụ na ọ bụ, n’ihi gịnị ka Jisọs ga-eji wepụta oge dị ukwuu, dị ka anyị ga-ahụ, inye ndị na-eso ụzọ ya ihe ịrịba ama iji nyere ha aka ịghọta ọnụnọ nke a?a Otú ọ dị, mgbe Kraịst bịara ibibi usoro ụwa Setan, eziokwu nke ọnụnọ ya ga-apụta ìhè nke ukwuu nye mmadụ nile. Ọ bụ mgbe ahụ ka “anya mmadụ nile ọ bụla ga-ahụzukwa ya.” Ọbụna ndị mmegide Jisọs ga-enwe ike ịghọta, n’ihere ha, na ọchịchị Kraịst bụ ezie.—Lee Matiu 24:30; 2 Ndị Tesalonaịka 2:8; Mkpughe 1:5, 6.

  • Ọnụnọ nke Mesaịa ahụ na Ọchịchị Ya
    Ụlọ Nche—1992 | Ọktoba 1
    • a Laa azụ n’afọ 1864, onye ọkà mmụta okpukpe bụ́ R. Govett kwupụtara ya otú a, sị: “Nke a yiri m ihe e kwubiri nke ọma. Inye ihe ịrịba ama nke Ọnụnọ ahụ na-egosi na ọ bụ ihe nzuzo. Ihe ịrịba ama adịghị mkpa iji mee ka anyị mara maka ọnụnọ nke ihe anyị na-ahụ.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya