Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 142
  • Ònye ma Ọ Bụ Gịnị Bụ “Alfa na Omega”?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye ma Ọ Bụ Gịnị Bụ “Alfa na Omega”?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Gịnị mere Chineke ji akpọ onwe ya “Alfa na Omega”?
  • Onye bụ onye “mbụ na onye ikpeazụ”?
  • Mkpughe 22:13 ò gosiri na Jizọs bụ “Alfa na Omega”?
  • Otú Jehova Si Mee Ka Obi Sie Anyị Ike na Ụwa Ga-aghọ Paradaịs
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2023
  • Jisọs Ejiri Agbamume Bịa
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Aha Ole Ka Chineke Nwere?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Eluigwe Ọhụrụ na Ụwa Ọhụrụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 142
Alfa na omega, mkpụrụ akwụkwọ mbụ na nke ikpeazụ n’asụsụ Grik

Ònye ma Ọ Bụ Gịnị Bụ “Alfa na Omega”?

Ihe Baịbụl kwuru

Ọ bụ Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ka a kpọrọ “Alfa na Omega.” Okwu a gbara ugboro atọ n’ime Baịbụl.—Mkpughe 1:8; 21:6; 22:13.a

Gịnị mere Chineke ji akpọ onwe ya “Alfa na Omega”?

Alfa bụ mkpụrụ akwụkwọ edemede Grik nke mbụ, omega abụrụ nke ikpeazụ. Grik bụ asụsụ e ji dee akwụkwọ Baịbụl ndị a na-akpọ Agba Ọhụrụ, nke akwụkwọ Mkpughe so na ya. Ebe mkpụrụ akwụkwọ edemede Grik ndị a dị, ka e ji gosi na ọ bụ naanị Jehova bụ mmalite na ọgwụgwụ. (Mkpughe 21:6) Ọ bụ ya bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile na mgbe ebighị ebi gara aga, ọ ga-anọgidekwa bụrụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ruo mgbe ebighi ebi. Ọ bụ naanị ya dị “site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 90:2.

Onye bụ onye “mbụ na onye ikpeazụ”?

Ọ bụ ma Jehova Chineke ma Ọkpara ya bụ Jizọs ka Baịbụl kpọrọ “onye mbụ na onye ikpeazụ.” Ma, e nwere ihe dị iche ha pụtara ma a bịa n’onye nke a na-ekwu okwu ya. Tulee ihe atụ abụọ a.

  • N’Aịzaya 44:6, Jehova kwuru, sị: “Abụ m onye mbụ, abụkwa m onye ikpeazụ, ọ dịghị Chineke ọzọ dịnụ ma e wezụga m.” N’ebe a, Jehova kwuru na ọ bụ ya bụ ezi Chineke nke na-adịru ebighi ebi, na e wezụga ya, e nweghị onye ọzọ. (Diuterọnọmi 4:35, 39) Na nke ugbu a, “onye mbụ na onye ikpeazụ” na “Alfa na Omega” pụtara otu ihe.

  • Ma, “Onye Mbụ [pro’tos, ọ bụghị alfa] na Onye Ikpeazụ [e’skha·tos, ọ bụghị omega]” gbara ná Mkpughe 1:17, 18 na 2:8. Ihe ndị e kwuru n’amaokwu ndị a gosiri na onye a na-ekwu okwu ya nwụrụ ma si n’ọnwụ bilie. N’ihi ya, ọ gaghị abụ Chineke ka amaokwu ndị a na-ekwu gbasara ya, n’ihi na ọ dịbeghị mgbe Chineke nwụrụ anwụ. (Habakọk 1:12) Ma, Jizọs nwụrụ, e sikwa n’ọnwụ kpọlite ya. (Ọrụ Ndịozi 3:13-15) Ọ bụ mmadụ mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya agaa eluigwe bụrụ mmụọ na-anaghị anwụ anwụ. Ọ bụkwa ebe ahụ ka ọ ga-adị ndụ “ruo mgbe ebighị ebi.” (Mkpughe 1:18; Ndị Kọlọsi 1:18) Ọ bụzi Jizọs kpọliteziri ndị ọzọ niile nwụrụ anwụ. (Jọn 6:40, 44) N’ihi ya, ọ bụ onye ikpeazụ Jehova ji aka ya kpọlite n’ọnwụ. (Ọrụ Ndịozi 10:40) Ọ bụ na nke a ka ọ ga-ekwesị ekwesị ịkpọ Jizọs “Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ.”

Mkpughe 22:13 ò gosiri na Jizọs bụ “Alfa na Omega”?

Mba. E kwughị kpọmkwem onye kwuru ihe ahụ dị ná Mkpughe 22:13, e nwekwara ọtụtụ ndị kwuru okwu ná Mkpughe isi iri abụọ na abụọ. Mgbe Prọfesọ William Barclay na-ekwu gbasara Mkpughe isi iri abụọ na abụọ, o dere, sị: “E deghị ihe ndị a na-ekwu okwu ha n’usoro n’usoro; . . . o sikwara ike ịma kpọmkwem onye na-ekwu okwu.” (The Revelation of John, Mpịakọta nke 2, Nke E Degharịrị Edegharị, peeji nke 223) N’ihi ya, e nwere ike ikwu na onye a kpọrọ “Alfa na Omega” ná Mkpughe 22:13 bụ otu onye ahụ a kpọrọ “Alfa na Omega” n’ebe ndị ọzọ n’akwụkwọ Mkpughe, ya bụ, Jehova Chineke.

a Nke ugboro anọ ọ gbara bụ na Mkpughe 1:11 na Baịbụl King James Version. Ma, ọ dịghị n’ọtụtụ Baịbụl nke oge a n’ihi na ọ dịghị n’ihe odide Grik kacha ochie. Ma, ọ ga-abụ na e mechara tinye ya n’ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ a sụgharịrị ọhụrụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya