Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 6 p. 27-32
  • Ikpughe Otu Ihe Omimi Dị Nsọ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikpughe Otu Ihe Omimi Dị Nsọ
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ”
  • Kpakpando na Ihe Ịdọba Oriọna Ndị Ahụ
  • Oké Ndapụ n’Ezi Ofufe Ahụ
  • Mkpụrụ ahụ Nọgidere
  • Jọn Hụrụ Jisọs ahụ E Meworo Ka Ọ Dị Ebube
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Kraịst Na-agwa Ọgbakọ Dị Iche Iche Okwu
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • “Amaara M Ihe Ndị Ị Na-eme”
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2019
  • Bụrụnụ Ndị Ji Obi Ụtọ Na-agụ Akwụkwọ Mkpughe
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 6 p. 27-32

Isi nke 6

Ikpughe Otu Ihe Omimi Dị Nsọ

1. Olee ụzọ anyị kwesịrị isi meghachi omume n’ihe onyinyo ahụ dị ebube nke e dekọrọ ná Mkpughe 1:10-17?

ỌHỤỤ ahụ nke Jisọs e buliworo elu bụ n’ezie ihe dị ebube! Ihe ịrụ ụka adịghị ya na a sị na anyị so Jọn onyeozi nọrọ na-ekiri ihe ahụ, oké ebube ahụ ga-enweworị mmetụta dị ukwuu n’ahụ anyị n’otu aka ahụ, anyị ewee daa kpuo ihu n’ala dị ka ya onwe ya mere. (Mkpughe 1:10-17) Ihe ndekọ nke a sitere n’ike mmụọ nsọ nke na-enweghị atụ abụwo nke e chebere iji wee kpalie anyị ime ihe taa. Dị ka Jọn, anyị kwesịrị iji obi umeala gosi ezi mmasị n’ihe nile ọhụụ ahụ pụtara. Ka anyị na-enwe nsọpụrụ dị omimi mgbe nile maka ọnọdụ Jisọs dị ka Eze nke nọkwasịworo n’ocheeze, Onyeisi Nchụàjà, na Onyeikpe.—Ndị Filipaị 2:5-11.

“Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ”

2. (a) Ùtú aha dị aṅaa ka Jisọs ji na-akọwa onwe ya? (b) Gịnị ka ọ pụtara mgbe Jehova sịrị: “Mụ onwe m bụ onye mbụ na onye ikpeazụ”? (ch) Na gịnị ka ùtú aha Jisọs bụ “Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ” na-adọrọ uche anyị gaa?

2 Otú ọ dị, egwu anyị ekwesịghị ịghọ egwu gabigara ókè. Jisọs mesiri Jọn obi ike, dị ka onyeozi ahụ gara n’ihu ịkọ. “O wee bikwasị m aka nri ya, sị, Atụla egwu; mụ onwe m bụ Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ, bụrụkwa onye ahụ na-adị ndụ.” (Mkpughe 1:17b, 18a) N’Aịsaịa 44:6, Jehova kọwara ọnọdụ ya nke ọma dị ka nanị Chineke onye pụrụ ime ihe nile, na-asị: “Mụ onwe m bụ onye mbụ, mụ onwe m bụkwa onye ikpeazụ; ọ dịghịkwa Chineke ọ bụla dị ma e wezụga nanị mụ onwe m.”a Mgbe Jisọs ji ùtú aha ahụ bụ “Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ” mee ihe banyere onwe ya, ọ naghị azọrọ na ya na Jehova, bụ́ Onye Okike Ukwu ahụ, hà nhata. Ihe ọ na-eme bụ iji ùtú aha nke Chineke nyere ya n’ụzọ ziri ezi wee na-eme ihe. N’Aịsaịa, Jehova na-ekwu okwu banyere ọnọdụ Ya pụrụ iche dị ka ezi Chineke ahụ. Ọ bụ Chineke ruo mgbe nile ebighị ebi, e wezụga ya, ọ dịghịkwa Chineke ọ bụla ọzọ dị n’ezie. (1 Timoti 1:17) Ná Mkpughe, Jisọs na-ekwu banyere ùtú aha e nyere ya enye, na-adọrọ uche gaa ná mbilite n’ọnwụ ya nke pụrụ iche.

3. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka Jisọs si bụrụ “Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ”? (b) Gịnị ka ọ pụtara bụ na Jisọs nwere “mkpịsị ugodi nile nke ọnwụ na nke Hedis”?

3 Jisọs bụ n’ezie mmadụ “Mbụ” a kpọlitere n’ọnwụ gaa ná ndụ anwụghị anwụ dị ka mmụọ. (Ndị Kọlọsi 1:18) Ọzọkwa, ọ bụ “Onye Ikpeazụ” Jehova n’onwe ya kpọlitere n’ọnwụ. Otú a, ọ ghọrọ “onye ahụ na-adị ndụ . . . ruo mgbe nile ebighị ebi.” O nwere anwụghị anwụ. Na nke a, o yiri Nna ya na-adịghị anwụ anwụ, onye a kpọrọ “Chineke dị ndụ.” (Mkpughe 7:2; Abụ Ọma 42:2) Nye ndị ọzọ nile n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ, Jisọs n’onwe ya bụ “mbilite n’ọnwụ na ndụ.” (Jọn 11:25) N’ikwekọ na nke a, ọ gwara Jọn, sị: “Aghọkwara m onye nwụrụ anwụ, ma lee, ana m adị ndụ ruo mgbe nile ebighị ebi, enwekwara m mkpịsị ugodi nile nke ọnwụ na nke Hedis.” (Mkpughe 1:18b) Jehova enyewo ya ikike ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ. Ọ bụ ya mere Jisọs ji nwee ike ikwu na ya nwere mkpịsị ugodi nile iji gbapee ọnụ ụzọ nile nye ndị ahụ ọnwụ na Hedis (ili) jibidoro.—Tụlee Matiu 16:18.

4. Iwu dị aṅaa ka Jisọs na-enyeghachi, ọ̀ bụkwa maka abamuru nke olee ndị?

4 N’ebe a, Jisọs na-enyeghachi iwu ahụ o nyere na mbụ ka e dee ihe ndị a ede, na-agwa Jọn, sị: “Ya mere, dee ihe nile ị hụrụ n’akwụkwọ, ha na ihe nke na-adị adị, na ihe nile nke gaje ịpụta mgbe ihe ndị a gasịrị.” (Mkpughe 1:19) Ihe ndị dị aṅaa na-akpali akpali ka Jọn gaje idetu maka ndụmọdụ anyị?

Kpakpando na Ihe Ịdọba Oriọna Ndị Ahụ

5. Olee otú Jisọs si kọwaa “kpakpando asaa ahụ” na “ihe ịdọba oriọna asaa ahụ”?

5 Jọn ahụworị Jisọs n’etiti ihe ịdọba oriọna asaa e ji ọlaedo mee, na-enwe kpakpando asaa n’aka nri ya. (Mkpughe 1:12, 13, 16) Ugbu a Jisọs na-akọwa nke a, sị: “Ihe omimi nke kpakpando asaa ahụ nke ị hụrụ n’aka nri m, na ihe ịdọba oriọna asaa ahụ nke e ji ọlaedo mee. Kpakpando asaa ahụ bụ ndị mmụọ ozi nke nzukọ Kraịst asaa ahụ: ihe ịdọba oriọna asaa ahụ bụkwa nzukọ Kraịst asaa.”—Mkpughe 1:20.

6. Gịnị ka kpakpando asaa ahụ nọchiri anya ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka e ji zigara ndị a kpọmkwem ozi ndị ahụ?

6 “Kpakpando” ndị ahụ bụ “ndị mmụọ ozi nke nzukọ Kraịst asaa ahụ.” Ná Mkpughe, kpakpando na-anọchi anya ndị mmụọ ozi nkịtị mgbe ụfọdụ, ma o yighị ka Jisọs ọ ga-eji onye odeakwụkwọ bụ mmadụ degara ndị mmụọ e kere eke a na-adịghị ahụ anya akwụkwọ. Ya mere, “kpakpando” ndị a aghaghị ịbụ ndị nlekọta bụ mmadụ, ma ọ bụ ndị okenye, n’ọgbakọ dị iche iche, ndị a na-ele anya dị ka ndị ozi nke Jisọs.b Ọ bụ kpakpando ndị ahụ ka a na-ezijere ozi ndị ahụ, n’ihi na ndị a nwere ibu ọrụ nke ilekọta ìgwè atụrụ Jehova.—Ọrụ 20:28.

7. (a) Gịnị na-egosi na Jisọs ịgwa nanị otu mmụọ ozi okwu n’ọgbakọ nke ọ bụla apụtaghị na ọgbakọ nke ọ bụla nwere nanị otu okenye? (b) N’ihi ya, olee ndị kpakpando asaa ahụ dị n’aka nri Jisọs nọchiri anya ha?

7 Ebe ọ bụ na Jisọs na-agwa nanị otu “mmụọ ozi” okwu n’ọgbakọ nke ọ bụla, nke a ọ̀ na-apụta na ọgbakọ ọ bụla nwere nanị otu onye okenye? Ee e. Laarị azụ n’oge Pọl, ọgbakọ dị n’Efesọs nwere ọtụtụ ndị okenye, ọ bụghị nanị otu. (Mkpughe 2:1; Ọrụ 20:17) Ya mere, n’oge Jọn, mgbe e zigaara kpakpando asaa ahụ akwụkwọ ozi a ga-agụrụ ọgbakọ ndị ahụ (gụnyere nke ahụ dị n’Efesọs), kpakpando ndị ahụ aghaghị ịnọchiworị anya ndị nile na-eje ozi n’òtù dị iche iche nke ndị okenye ndị dị n’ọgbakọ Jehova e tere mmanụ. N’otu ụzọ ahụkwa, ndị nlekọta nke oge a na-agụrụ ọgbakọ ha dị iche iche akwụkwọ ozi ndị a natara site n’aka Òtù Na-achị Isi nke ndị nlekọta e tere mmanụ mejupụtara, bụ́ ndị na-eje ozi n’okpuru nduzi Jisọs. Òtù ndị okenye nke ọgbakọ ọ bụla aghaghị ijide n’aka na ọgbakọ ha na-agbaso ndụmọdụ Jisọs. Otú ọ dị, ndụmọdụ ahụ bụ maka abamuru nke mmadụ nile nọ n’ọgbakọ ndị ahụ, ọ bụghị nanị nye ndị okenye.—Lee Mkpughe 2:11a.

8. Gịnị ka e gosiri site ná ndị okenye ahụ ịnọ n’aka nri Jisọs?

8 Ebe Jisọs bụ Isi nke ọgbakọ ya, o ziri ezi ikwu na ndị okenye ahụ nọ n’aka nri ya, ya bụ, n’okpuru nduzi na ntụziaka ya. (Ndị Kọlọsi 1:18) Ọ bụ Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ, ha bụkwa ndị ọzụzụ atụrụ nọ n’okpuru ya.—1 Pita 5:2-4.

9. (a) Gịnị ka ihe ịdọba oriọna asaa ahụ nọchiri anya ha, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ihe ịdọba oriọna ji bụrụ ihe atụ kwesịrị ekwesị maka ndị a? (b) Gịnị ka okwu dị otú ahụ na-aghaghị ichetawororịị Jọn onyeozi?

9 Ihe ịdọba oriọna asaa ahụ bụ nzukọ Kraịst asaa ndị Jọn degaara akwụkwọ Mkpughe: Efesọs, Smụana, Pagamọm, Taịataịra, Sadis, Filadelfịa, na Leọdisia. N’ihi gịnị ka e ji jiri ihe ịdọba oriọna mee ihe atụ nke ọgbakọ dị iche iche? Ọ bụ n’ihi na ndị Kraịst, n’otu n’otu ma ọ bụ mgbe a chịkọtara ha dị ka ọgbakọ dị iche iche, aghaghị ‘ime ka ìhè ha nwuo n’ihu mmadụ’ n’ime ụwa nke a gbara ọchịchịrị. (Matiu 5:14-16) Ọzọkwa, ihe ịdọba oriọna dị iche iche so n’ihe ndị e ji chọọ ụlọ nsọ Solomọn mma. Ịkpọ ọgbakọ ndị ahụ ihe ịdọba oriọna aghaghị ichetawororịị Jọn na, n’ụzọ ihe atụ, ọgbakọ ọ bụla nke ndị e tere mmanụ bụ “ụlọ nsọ Chineke,” ebe obibi nke mmụọ Chineke. (1 Ndị Kọrint 3:16) Karịsịa, n’ihe ka ukwuu e sere onyinyo ya site ná ndokwa ụlọ nsọ ndị Juu ahụ, ndị so n’ọgbakọ nke ndị e tere mmanụ na-eje ozi dị ka “òtù ndị nchụàjà ndị bụkwa eze” ná ndokwa ụlọ ukwu ime mmụọ nke Jehova, nke Jisọs bụ Onyeisi Nchụàjà ya, ebe Jehova n’onwe ya na-ebi n’ime Ebe Kasị Nsọ nke dị n’eluigwe.—1 Pita 2:4, 5, 9; Ndị Hibru 3:1; 6:20; 9:9-14, 24.

Oké Ndapụ n’Ezi Ofufe Ahụ

10. Gịnị mere usoro ihe ndị Juu ahụ na ndị na-akwado ya, bụ́ ndị na-enweghị nchegharị, n’afọ 70 O.A.?

10 Mgbe Jọn dere akwụkwọ Mkpughe, Iso Ụzọ Kraịst anọruwo ihe karịrị 60 afọ. Site ná mmalite, ọ gabigawo 40 afọ nke mmegide okpukpe ndị Juu nọgidere na-emegide ya. E mesịa, usoro ihe ndị Juu ahụ natara ihe otiti jọgburu onwe ya n’afọ 70 O.A. mgbe ndị Juu ahụ na-enweghị nchegharị tụfuru ihe e ji mara ha dị ka otu mba, na ihe ahụ ha weere dị ka ihe a ga-efe ofufe—ụlọ nsọ ahụ dị na Jerusalem.

11. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na oge ahụ kwesịrị ekwesị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu ahụ dọọ ọgbakọ ndị ahụ aka ná ntị banyere ihe ndị na-ebilitenụ?

11 Otú ọ dị, Pọl onyeozi ebuworị amụma na a gaje inwe ndapụ n’ezi ofufe ọbụna n’etiti ndị Kraịst e tere mmanụ, ozi ndị ahụ Jisọs zitere gosikwara na n’oge Jọn meworo agadi, ndapụ nke a amalitelarị iwere ọnọdụ. Jọn bụ onye ikpeazụ n’ime ndị ahụ nọrọ dị ka ihe mgbochi megide oké mgbalị nke a Setan mere imerụ mkpụrụ nke nwanyị ahụ. (2 Ndị Tesalọnaịka 2:3-12; 2 Pita 2:1-3; 2 Jọn 7-11) Ya mere, ọ bụ oge kwesịrị ekwesị ka Onye Ọzụzụ Atụrụ Ukwu nke Jehova degara ndị okenye nọ n’ọgbakọ ndị ahụ akwụkwọ, na-adọ ha aka ná ntị banyere ihe ndị na-ebilitenụ, na-agbakwa ndị nwere obi eziokwu ume iguzosi ike maka ezi omume.

12. (a) Olee ụzọ ndapụ n’ezi ofufe ahụ si gaa n’ihu na narị afọ ndị dịrị mgbe oge Jọn gasịrị? (b) Olee otú Krisendọm si malite?

12 Anyị amataghị otú ọgbakọ ndị ahụ si meghachi omume n’ozi Jisọs ndị ahụ n’afọ 96 O.A. Ma anyị matara na ndapụ n’ezi ofufe ahụ mụbara ngwa ngwa mgbe Jọn nwụsịrị. “Ndị Kraịst” kwụsịrị iji aha Jehova na-eme ihe, wee jiri “Onyenwe anyị” ma ọ bụ “Chineke” na-edochi anya ya n’ihe odide Bible ha. Ka ọ na-erule na narị afọ nke anọ, ozizi ụgha nke Atọ n’Ime Otu abanyewo n’ime ọgbakọ ndị ahụ. N’ime otu oge ahụ, a malitere ịnakwere echiche nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ. E mesịa, Onye Eze Rom bụ́ Constantine kwadoro okpukpe “Ndị Kraịst,” nke a mekwara ka e nwee Krisendọm, bụ́ ebe Chọọchị na Ọchịchị jikọrọ aka n’ịchị achị ruo otu puku afọ. Ọ bụ ihe dị mfe ịghọ ụdị ọhụrụ nke “onye Kraịst.” Ìgwè agbụrụ dị iche iche hazigharịrị nkwenkwe ikpere arụsị ha ndị ochie ka ha wee kwekọọ na nkwenkwe dị iche iche nke okpukpe nke a. Ọtụtụ ndị ndú nọ na Krisendọm ghọrọ ndị ọchịchị aka ike, na-eji mma agha eme ka ndị mmadụ kwere n’echiche ha ndị na-ekwekọghị n’ezi ofufe.

13. N’agbanyeghị ịdọ aka ná ntị Jisọs megide ịrọ òtù, ụzọ dị aṅaa ka ndị Kraịst ahụ na-adapụ n’okwukwe gbasoro?

13 Ndị Kraịst ahụ si n’ezi ofufe na-adapụ gbakụtara okwu Jisọs gwara ọgbakọ asaa ndị ahụ azụ kpam kpam. Jisọs dọrọ ndị Efesọs aka ná ntị ka ha nwetaghachi ịhụnanya ha nwere na mbụ. (Mkpughe 2:4) Ma n’agbanyeghị nke a, ndị òtù Krisendọm, bụ́ ndị ịhụnanya Jehova na-ejikọkwaghị ọzọ, lụrụ ajọ agha dị iche iche, kpagburịtakwa onwe ha n’ụzọ jọgburu onwe ya. (1 Jọn 4:20) Jisọs dọrọ ọgbakọ dị na Pagamọm aka ná ntị megide ịrọ òtù. Ma òtù dị iche iche pụtara ọbụna na narị afọ nke abụọ, taakwa, Krisendọm nwere ọtụtụ puku ịrọ òtù na okpukpe dị iche iche ndị na-eserịta okwu.—Mkpughe 2:15.

14. (a) Ọ bụ ezie na Jisọs dọrọ aka ná ntị megide ịnọ dị ka ndị nwụrụ anwụ n’ime mmụọ, ụzọ ndị dị aṅaa ka ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst gbasoro? (b) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Kraịst na-anaraghị ịdọ aka ná ntị Jisọs megide ikpere arụsị na ịkwa iko?

14 Jisọs dọrọ ọgbakọ dị na Sadis aka ná ntị megide ịbụ ndị nwụrụ anwụ n’ime mmụọ. (Mkpughe 3:1) Dị ka ndị ahụ bi na Sadis, ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst mere ngwa ngwa n’ichefu ihe banyere ọrụ ndị Kraịst, n’oge na-adịghị anya ha mekwara ka ọrụ ahụ dị oké mkpa nke ikwusa ozi ọma dịịrị nanị òtù ndị ụkọchukwu ole na ole a na-akwụ ụgwọ. Jisọs dọrọ ọgbakọ dị na Taịataịra aka ná ntị megide ikpere arụsị na ịkwa iko. (Mkpughe 2:20) Ma, Krisendọm pụtara ìhè n’ịkwado ojiji a na-eji ihe oyiyi dị iche iche eme ihe, tinyekwara nkwalite nke ikpere arụsị na-apụtachaghị ìhè, bụ́ ịhụ mba n’anya na ịhụ ihe onwunwe n’anya. N’ihe banyere omume rụrụ arụ, ọ bụkwa ezie na a na-ekwu okwu megide ya mgbe ụfọdụ, ma a na-anakwere ya nke ukwuu.

15. Gịnị ka okwu Jisọs gwara ọgbakọ asaa ahụ na-ekpughe banyere okpukpe nile nke Krisendọm, gịnịkwa ka ndị ụkọchukwu Krisendọm gosiworo onwe ha ịbụ?

15 Ya mere, okwu Jisọs gwara ọgbakọ asaa ahụ na-ekpughe ụzọ okpukpe nile nke Krisendọm si daa kpam kpam n’ịbụ ndị Jehova pụrụ iche. N’eziokwu, ndị ndú Krisendọm abụrụwo ndị kasị pụta ìhè so ná mkpụrụ nke Setan. N’ikwu banyere ndị a dị ka ‘onye ahụ nke na-emebi iwu,’ Pọl onyeozi buru amụma na “ọbịbịa [ha] dị ka ịrụsi ọrụ ike nke Setan n’ike nile ọ bụla na ihe ịrịba ama dị iche iche na ọrụ ebube dị iche iche nke ụgha, na aghụghọ nile kwa nke ajọ omume.”—2 Ndị Tesalọnaịka 2:9, 10.

16. (a) Megide ole ndị ka ndị ndú Krisendọm gosiworo ịkpọasị pụrụ iche? (b) Gịnị mere n’ime Krisendọm n’Oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya? (ch) Nnupụisi ma ọ bụ Nhazigharị ndị Protestant ahụ ọ̀ gbanwere ụzọ ndapụ n’ezi ofufe nke Krisendọm?

16 Ọ bụ ezie na ha na-azọrọ na ha bụ ndị na-azụ ìgwè atụrụ Chineke, ndị ndú Krisendọm, ma nke okpukpe ya ma nke ihe omume efu, na-egosipụta ịkpọasị pụrụ iche megide onye ọ bụla nke nwara ịgba ndị mmadụ ume ịgụ Bible ma ọ bụ onye ọ bụla nke na-ekpughe omume ha nile akwụkwọ nsọ na-akwadoghị. A kpagburu ma gbuokwa John Hus na onye na-asụgharị Bible bụ William Tyndale n’ihi okwukwe ha. N’oge ahụ Ụwa Na-emepechabeghị Anya, ọchịchị ndị wezụgara onwe ha n’ezi ofufe ruru ịrị elu ya kasị ukwuu ná Njụta Okwukwe ndị Katọlik ahụ jọgburu onwe ya. A na-akpagbu onye ọ bụla nke rụrụ ụka n’ozizi ma ọ bụ ikike chọọchị nwere n’egosighị ebere ọ bụla, ọtụtụ puku ndị a kpọrọ ndị ozizi ụgha ka a tara ahụhụ ruo ọnwụ ma ọ bụ kegide ha n’osisi wee suo ha ọkụ. Otú a, Setan gbara mbọ ịhụ na a ga-eme ngwa n’ịzọpịa ezi mkpụrụ ọ bụla nke nzukọ Chineke ahụ yiri nwanyị. Mgbe nnupụisi ma ọ bụ Nhazigharị ndị Protestant weere ọnọdụ (site na 1517 gaa n’ihu), ọtụtụ chọọchị Protestant gosipụtara otu ụdị mmụọ ahụ nke ekweghị ibe ha nọrọ. Ha onwe ha ghọkwara ndị ikpe ọbara mara site n’igbu ndị ahụ gbalịrị ikwesị ntụkwasị obi nye Chineke na Kraịst. N’eziokwu, a wụsiri “ọbara ndị nsọ” n’ụzọ dị ukwuu!—Mkpughe 16:6; tụlee Matiu 23:33-36.

Mkpụrụ ahụ Nọgidere

17. (a) Gịnị ka ilu Jisọs banyere ọka na ata buru amụma ya? (b) Gịnị mere na 1918, na-arụpụta ọjụjụ dị aṅaa na nhọpụta dị aṅaa?

17 N’ilu ya banyere ọka na ata ndị ahụ, Jisọs buru amụma banyere oge ọchịchịrị nke a ga-enwe mgbe Krisendọm nọ na-achị achị. Ma n’agbanyeghị ọtụtụ narị afọ nke ndapụ n’ezi ofufe, a ga-enwe ndị Kraịst nọ n’otu n’otu dị ka ọka, bụ́ ndị e tere mmanụ n’ezie. (Matiu 13:24-29, 36-43) Otú a, mgbe ụbọchị Onyenwe anyị malitere n’October 1914, a ka nwekwara ezi ndị Kraịst nọ n’elu ala. (Mkpughe 1:10) O yiri ka Jehova bịaruru n’ụlọ nsọ ya maka ikpe ikpe mgbe ihe dị ka afọ atọ gasịrị, na 1918, ya na Jisọs dị ka “onyeozi ọgbụgba ndụ ahụ.” (Malakaị 3:1; Matiu 13:47-50) Oge eruwo ka Onyenwenụ ahụ jụ ndị Kraịst ụgha kpam kpam, họpụtakwa ‘ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi ilekọta ihe nile o nwere.’—Matiu 7:22, 23; 24:45-47.

18. Gịnị ka “oge hour” ya ruru na 1914, gịnịkwa ka oge ya ruru ka ohu ahụ mee?

18 Oge rukwara ka ohu nke a leba anya n’ụzọ pụrụ iche n’ihe e dere n’ozi Jisọs nke e zigaara ọgbakọ asaa ahụ, dị ka anyị pụrụ ịhụta site n’ihe e dere n’ime ha. Dị ka ihe atụ, Jisọs na-ekwu banyere ọbịbịa ya ikpe ọgbakọ ndị ahụ ikpe, bụ́ ikpe ikpe nke malitere na 1918. (Mkpughe 2:5, 16, 22, 23; 3:3) O kwuru banyere ichebe ọgbakọ dị na Filadelfịa “n’oge hour nke ọnwụnwa ahụ, bụ́ oge hour nke gaje ịbịakwasị elu ụwa dum mmadụ bi.” (Mkpughe 3:10, 11) “Oge hour nke ọnwụnwa” nke a bịara nanị mgbe ụbọchị Onyenwe anyị malitere na 1914, bụ́ nke, mgbe ọ gasịrị, e lere ndị Kraịst ule banyere ikwesị ntụkwasị obi ha nye Alaeze Chineke ahụ e guzobeworo.—Tụlee Matiu 24:3, 9-13.

19. (a) Gịnị ka ọgbakọ asaa ahụ sere onyinyo ya taa? (b) Ìgwè ndị dị aṅaa sonyewooro ndị Kraịst e tere mmanụ, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ndụmọdụ Jisọs na ọnọdụ ndị ọ kọwara ji metụta ha? (ch) Olee otú anyị kwesịrị isi lee ozi ahụ anya, nke Jisọs zijeere ọgbakọ asaa ahụ na narị afọ mbụ?

19 N’ihi nke a, okwu Jisọs gwara ọgbakọ ndị ahụ enwewo mmezu ha bụ isi kemgbe 1914. N’ọnọdụ nke a, ọgbakọ asaa ahụ sere onyinyo ọgbakọ nile nke ndị Kraịst e tere mmanụ n’ụbọchị Onyenwe anyị. Karịsịa, n’ime ihe karịrị afọ 70 gara aga, ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ, ndị Jọn sere onyinyo ha enwetawo ọnụ ọgụgụ mmadụ dị ukwuu nke ndị kwere ekwe ndị sonyeere ha, bụ́ ndị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs elu ala. Ndụmọdụ nke Jisọs Kraịst ahụ e meworo ka ọ dị ebube na ọnọdụ ndị ọ hụrụ n’ime ọgbakọ asaa ahụ dị ka ihe si ná nnyocha ya pụta nwekwara otu ụdị mmetụta ahụ n’ebe ndị a nọ, ebe e nwere nanị otu ụkpụrụ ezi omume na nke ikwesị ntụkwasị obi dịịrị ndị ohu Jehova nile. (Ọpụpụ 12:49; Ndị Kọlọsi 3:11) N’ihi nke a, ozi ndị Jisọs zijeere ọgbakọ asaa ahụ dị n’Asia Minor na narị afọ mbụ abụghị nanị akụkọ ihe mere eme efu. Ha pụtaara onye ọ bụla n’ime anyị ndụ ma ọ bụ ọnwụ. N’ihi ya, ka anyị ṅaa ntị nke ọma n’okwu Jisọs.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’asụsụ Hibru mbụ n’Aịsaịa 44:6, e nweghị okwu ọ bụla na-ezo aka n’ihe kpọmkwem nke ya na okwu ahụ bụ “mbụ” na “ikpeazụ” so, ma ná nkọwa Jisọs kọwara onwe ya n’asụsụ Grik mbụ ahụ ná Mkpughe 1:17, a na-ahụ ụdị okwu ahụ na-ezo aka n’ihe kpọmkwem. Ya mere, n’ụzọ kwekọrọ n’ụtọ asụsụ, Mkpughe 1:17 na-egosi ùtú aha, ebe Aịsaịa 44:6 na-akọwa Jehova dị ka onye bụ Chineke.

b Okwu Grik bụ agʹge·los (nke mkpọpụta ya bụ “anʹge·los”) pụtara “onye ozi” nakwa “mmụọ ozi.” Na Malakaị 2:7, a na-ekwu okwu banyere onye nchụàjà bụ onye Livaị dị ka “onye ozi” (Hibru, mal·’akhʹ).—Lee New World Translation Reference Bible, nkọwa ala ala peji.

Igbe dị na peeji nke 32]

Oge Ile Ule na Ikpe Ikpe

E mere Jisọs baptism, teekwa ya mmanụ dị ka Eze A Họpụtaworo n’Osimiri Jọdan n’ihe dị ka October nke afọ 29 O.A. Mgbe afọ atọ na ọkara gasịrị, na 33 O.A., ọ bịara n’ụlọ nsọ dị na Jerusalem wee chụpụsịa ndị ahụ na-eme ya ọgba ndị na-apụnara mmadụ ihe. O yiri ka e nwere ihe kwekọrọ na nke a n’ogologo oge ahụ dị afọ atọ na ọkara site na mgbe Jisọs nọkwasịrị n’ocheeze n’eluigwe n’October 1914 ruo mgbe ọ bịara inyocha ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Kraịst mgbe ikpe ikpe ahụ malitere n’ụlọ Chineke. (Matiu 21:12, 13; 1 Pita 4:17) Ná mmalite afọ 1918, ọrụ Alaeze nke ndị Jehova zutere oké mmegide. Ọ bụ oge ile ule gburugburu ụwa, a yọchapụkwara ndị na-atụ egwu. Na May 1918, ndị ụkọchukwu Krisendọm mere ka a tụọ ndị ọrụ nke Watch Tower Society mkpọrọ, ma mgbe ọnwa itoolu gasịrị a tọhapụrụ ndị a. E mesịa, a kachapụrụ ebubo ụgha ndị ahụ e boro ha. Site 1919 gaa n’ihu, nzukọ ndị Chineke, nke a nwapụtaworo, nụchaakwa ya, gara n’ihu n’ịnụ ọkụ n’obi ịkpọsa Alaeze Jehova nke dị n’aka Kraịst Jisọs dị ka olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ.—Malakaị 3:1-3.

Ka Jisọs malitere nnyocha ya na 1918, ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị ụkọchukwu Krisendọm natara ikpe ọmụma. Ọ bụghị nanị na ha akpataworo ndị Chineke mkpagbu, kama ha enwetawokwa oké ikpe ọmụma ọbara site n’ịkwado mba ndị ahụ na-eburita agha n’oge agha ụwa nke mbụ. (Mkpughe 18:21, 24) Mgbe ahụ, ndị ụkọchukwu ndị ahụ tụkwasịrị olileanya ha n’òtù League of Nations ahụ mmadụ guzobere. Krisendọm esonyeworo alaeze ụwa dum nke okpukpe ụgha dapụ kpam kpam site n’ihu ọma Chineke na 1919.

[[Map dị na peeji 28, 29]

(Ị chọọ ịhụ ebe e sere map a, gaa n’akwụkwọ a nke e biri ebi)

EFESỌS

SMỤANA

PAGAMỌM

TAỊATAỊRA

FILADELFỊA

SADIS

LEỌDISIA

[Foto ndị dị na peeji nke 31]

Okpukpe nke Krisendọm nwetara oké ikpe ọmụma ọbara site n’ịkpagbu na igbu ndị sụgharịrị, gụọ, ma ọ bụ ọbụna nwee Bible

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya