-
Alaeze Chineke Karịrị Ọchịchị Ndị Ọzọ n’Ụzọ NileỤlọ Nche—2006 | Julaị 15
-
-
Jizọs na ndị ha na ya so achị ga-anọ n’ebe ka elu na-achị. Daniel hụkwara ná nrọ nke ọhụụ ya na “alaeze ahụ, na ọchịchị ahụ, . . . ka a ga-enye ndị ahụ, bụ́ ndị nsọ.” (Daniel 7:27) Jizọs agaghị achị nanị ya. O nwere ndị ọzọ ga-eso ya chịa dị ka ndị eze ma jee ozi dị ka ndị nchụàjà. (Mkpughe 5:9, 10; 20:6) Jọn onyeozi dere banyere ha, sị: “M wee hụ, ma, lee! Nwa Atụrụ ahụ ka ọ na-eguzo n’elu Ugwu Zaịọn, ya na narị puku na iri puku anọ na anọ . . . bụ́ ndị a zụtaworo n’ụwa.”—Mkpughe 14:1-3.
Nwa Atụrụ ahụ bụ Jizọs Kraịst ka e chisịrị ya eze dị ka Eze nke Alaeze ahụ. (Jọn 1:29; Mkpughe 22:3) Ugwu Zaịọn ahụ bụ eluigwe.a (Ndị Hibru 12:22) Jizọs na narị puku na iri puku anọ na anọ ahụ ha na ya ga-eso chịa ga-anọ n’eluigwe achị ọchịchị ha. Lee ka ebe ha ga-anọ achị si dị elu! Ebe ọ bụ na ha ga-anọ n’eluigwe, ha ga na-ahụzu ihe karị. Ebe isi ọchịchị “alaeze Chineke” dị n’eluigwe, a na-akpọkwa ya “alaeze eluigwe.” (Luk 8:10; Matiu 13:11) Ọ dịghị ngwá agha, ọbụnadị agha nuklia, pụrụ imetụta ma bibie ọchịchị eluigwe ahụ. A pụghị imeri ya emeri, ọ ga-emezukwa nzube Jehova ji hiwe ya.—Ndị Hibru 12:28.
-
-
Alaeze Chineke Karịrị Ọchịchị Ndị Ọzọ n’Ụzọ NileỤlọ Nche—2006 | Julaị 15
-
-
a Eze Devid nke Izrel oge ochie naara ndị Jebus ebe e wusiri ike nke Ugwu Zaịọn elu ala ma mee ya isi obodo ya. (2 Samuel 5:6, 7, 9) O bufekwara Igbe nsọ ahụ n’ebe ahụ. (2 Samuel 6:17) Ebe ọ bụ na Igbe ahụ na-anọchi anya ọnụnọ Jehova, e weere Zaịọn dị ka ebe obibi Chineke, nke mere ka ọ bụrụ ihe atụ dabara adaba nke eluigwe.—Ọpụpụ 25:22; Levitikọs 16:2; Abụ Ọma 9:11; Mkpughe 11:19.
-