Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ozi Ọma nye Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ!
    Ụlọ Nche—1990 | Jenụwarị 1
    • “M WEE hụ mmụọ ozi ọzọ ka ọ na-efe n’etiti eluigwe, na-enwe ozi ọma ebighị ebi izisara ndị na-anọdụ n’elu ụwa, bụ́ mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla.” (Mkpughe 14:6) Jọn onye ozi ahụ meworo agadi ji okwu ndị a kọwaa ọhụụ amụma ya nke sitere n’ike mmụọ nsọ, bụ́ ọhụụ nke a na-emezu n’oge anyị a. Lee ka o si bụrụ ihe obi iru ala ịmara na e nwere ozi ọma n’ime ọgbọ nke a nke e nwere mmụba nke imempụ, imetọ ikuku na mmiri, iyi ọha egwu, agha, na ọnọdụ akụ na ụba nke a na-ejighị n’aka nke zuru ebe nile! Ma olee ụdị ozi pụrụ ịdị mma ruo n’ókè na ọ dị mkpa ka mmụọ ozi na-akpọsa ya? Olee ozi nke pụrụ ịbụ ihe obi ụtọ nke na o ruru eru ịbụ nke a kpọsara nye mba nile na ebo nile na asụsụ nile na ndị nile?

  • Ozi Ọma nye Ihe Nile A Kpọrọ Mmadụ!
    Ụlọ Nche—1990 | Jenụwarị 1
    • Laa azụ na narị afọ mbụ ahụ, Jisọs mezuru ọtụtụ n’ime nzube ndị Chineke nwere maka ya, ma e dokwasịghị ya n’ocheeze dị ka Eze nke Alaeze Chineke n’oge ahụ. Dị ka magazin nke a meworo ka ọ pụta ìhè mgbe mgbe, nke ahụ emeghị ruokwa 1914. Dị ka mmezu amụma na-egosi n’ụzọ pụtara ìhè, n’afọ ahụ, e guzobere Alaeze Chineke n’eluigwe. (Mkpughe 12:10, 12) Ọ bụ ezie na e nwere ozi jọgburu onwe ya na 1914—ntiwapụ nke Agha Ụwa nke Mbụ—ọmụmụ nke Alaeze Chineke bụ ozi kachasị ozi nile mma. Ọ bụ n’ihi ya ka Jisọs ji buo amụma banyere oge anyị, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile.”—Matiu 24:14.

      È mezuwo amụma Jisọs ahụ? Azịza ya bụ ee! E mezuwokwa ọhụụ amụma ahụ Jọn hụrụ. N’eziokwu, anyị apụghị ịhụ mmụọ ozi ahụ a na-adịghị ahụ anya nke Jọn hụrụ. Ma Ndịàmà Jehova abụwo nnọọ ndị a na-ahụ anya ka ha nọ na-ekwusa ozi ọma nke mmụọ ozi ahụ nye “mba nile ọ bụla na ebo nile ọ bụla na asụsụ nile ọ bụla na ndị nile ọ bụla.” N’ime 212 ala na agwaetiti dị iche iche nke oké osimiri, a nụwo olu ha. Ọtụtụ ìgwè mmadụ na-azaghachikwa. Ahụmahụ nke ụfọdụ n’ime ndị a ga-egosipụta nnọọ otú ozi banyere Alaeze Chineke dịruru mma n’ezie.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya