Isi nke 30
“Ọ Dawo, Bụ́ Babilọn Ukwu Ahụ!”
1. Gịnị ka mmụọ ozi nke abụọ mara ọkwa ya, ònyekwa bụ Babilọn Ukwu ahụ?
OGE eruwo maka ikpe Chineke! Ya mere, gee ntị n’ozi ahụ sitere n’ebe Chineke nọ: “Mmụọ ozi ọzọ, bụ́ nke abụọ, wee soo, sị, Ọ dawo, ọ dawo, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ, nke meworo ka mba nile ṅụọ n’ime mmanya nke ọnụma nke ịkwa iko ya.” (Mkpughe 14:8) Na nke mbụ ya, ma ọ bụghị nke ikpeazụ ya, Mkpughe lekwasịrị anya na Babilọn Ukwu ahụ. Mgbe e mesịrị, isi nke 17 ga-akọwa ya dị ka nwanyị na-akwa iko nke na-enweta oké ihe ụtọ n’omume ya. Ònye ka ọ bụ? Dị ka anyị gaje ịhụ, ọ bụ alaeze ụwa, o metụtara okpukpe, ọ bụkwa usoro ihe na-abụghị ezie nke Setan ji eme ihe ibuso mkpụrụ nke nwanyị Chineke agha. (Mkpughe 12:17) Babilọn Ukwu ahụ bụ alaeze ụwa nke okpukpe ụgha dum. Ọ gụnyekọtara okpukpe nile ndị ka jigidere ozizi na omume okpukpe nile nke Babilọn oge ochie, na-egosipụtakwa mmụọ ya.
2. (a) Olee otú e si gbasaa okpukpe Babilọn gazuo akụkụ nile nke ụwa? (b) Gịnị bụ akụkụ kasị pụta ìhè nke Babilọn Ukwu ahụ, oleekwa mgbe ọ pụtara dị ka òtù siri ike?
2 N’ihe karịrị 4,000 afọ gara aga, ọ bụ na Babilọn ka Jehova ghagburu asụsụ nke ndị chọrọ iwu Ụlọ Ukwu nke Bebel. A gbasasịrị ìgwè ndị na-asụ asụsụ dị iche iche gaa ná nsọtụ ụwa nile, ha werekwaara nkwenkwe na omenala ha nile na-ezighị ezi bụ ndị ihe ka ọtụtụ n’okpukpe ndị nke oge a dabeere na ha. (Jenesis 11:1-9) Babilọn Ukwu ahụ bụ akụkụ metụtara okpukpe nke nzukọ Setan. (Tụlee Jọn 8:43-47.) Akụkụ ya kasị pụta ìhè taa bụ Krisendọm nke dapụrụ n’ezi ofufe, bụ́ nke bilitere dị ka òtù siri ike, na-emebikwa iwu, na narị afọ nke anọ mgbe Kraịst nọsịrị n’elu ala, na-enwe ụkpụrụ iwu na usoro ime ihe dị iche iche ndị e nwetara, ọ bụghị site na Bible, kama n’akụkụ dị ukwuu, site n’okpukpe ndị Babilọn.—2 Ndị Tesalọnaịka 2:3-12.
3. À pụrụ isi aṅaa kwuo na Babilọn Ukwu ahụ adawo?
3 Ị pụrụ ịjụ, sị, ‘Ebe okpukpe ka na-enwe mmetụta dị ukwuu n’elu ala, gịnị mere mmụọ ozi ahụ ji maa ọkwa na Babilọn Ukwu ahụ adawo?’ Ọ dị mma, gịnị mere mgbe afọ 539 T.O.A. gasịrị, bụ́ mgbe Babilọn ochie ahụ dara? Ee, e mere ka Israel nwere onwe ha ịlaghachi n’ala nke aka ha wee guzobeghachi ezi ofufe n’ebe ahụ! Ya mere, mweghachi e weghachiri Israel ime mmụọ n’ọnọdụ inwe ọganihu n’ụzọ ime mmụọ na 1919, nke nọgidere na-aga n’ihu, na-agbasapụkwa ruo taa, bụ ihe àmà na-egosi na Babilọn Ukwu ahụ dara n’afọ ahụ. O nweghịkwa ike mgbochi ọzọ n’ahụ ndị Chineke. Ọzọkwa, e nwere nsogbu dị ukwuu n’etiti ndị nke ya. Kemgbe 1919, e kpughewo mmekpu, emeghị ihe n’eziokwu, na omume rụrụ arụ ya n’ụzọ dị ukwuu. N’akụkụ ka ukwuu nke Europe, ọ bụzị nanị mmadụ ole na ole ka na-aga chọọchị, n’ụfọdụ mba ndị socialist kwa, a na-ele okpukpe anya dị ka “ọgwụ mmegharị anya a na-enye ụmụ mmadụ.” N’ịbụ nke e menyeworo ihere n’ihu ndị nile hụrụ Okwu eziokwu nke Chineke n’anya, Babilọn Ukwu ahụ nọzị ugbu a na-echere dị ka onye a maworo ikpe ọnwụ, dị ka a pụrụ ikwu ya, ruo mgbe a ga-emezu ihe ezi omume Jehova kpere n’ikpe megide ya.
Ọdịda Na-eme Ihere nke Babilọn
4-6. Ò si aṅaa bụrụ na “Babilọn Ukwu ahụ . . . [mere] ka mba nile ṅụọ n’ime mmanya nke ọnụma nke ịkwa iko ya”?
4 Ka anyị tụlekwuo nke ọma ọnọdụ ndị metụtara ọdịda ahụ na-eme ihere nke Babilọn Ukwu ahụ dara. N’ebe a, mmụọ ozi ahụ na-agwa anyị na ‘Babilọn Ukwu ahụ mere ka mba nile ṅụọ n’ime mmanya nke ọnụma nke ịkwa iko ya.’ Gịnị ka nke a pụtara? O metụtara inwe mmeri. Dị ka ihe atụ, Jehova gwara Jeremaịa, sị: “Nara iko mmanya nke ọnụma nke a n’aka m, mee ka mba nile ṅụọ ya, bụ́ ndị mụ onwe m na-eziga gị jekwuru. Ha ga-aṅụkwa, wee ṅagharịa, wịa ara, n’ihi mma agha ahụ nke mụ onwe m na-eziga n’etiti ha.” (Jeremaịa 25:15, 16) N’ime narị afọ nke isii na nke asaa T.O.A., Jehova jiri Babilọn oge ochie mee ihe ịwụpụ iko ihe atụ nke mkpagbu nye ọtụtụ mba ka ha ṅụọ, gụnyere Juda ahụ si n’ezi ofufe dapụ, nke mere na ọbụna ndị nke ya ka e mere ka ha jee biri n’ala ọzọ. E mesịa, mgbe oge nke ya ruru, Babilọn dara n’ihi na eze ya buliri onwe ya elu megide Jehova, bụ́ “Onyenwe eluigwe.”—Daniel 5:23.
5 Babilọn Ukwu ahụ enwewokwa mmeri, ma n’akụkụ ka ukwuu, mmeri ndị a bụ n’ụzọ aghụghọ. O ‘mewo ka mba nile ṅụọ mmanya’ site n’iji omume aghụghọ nile nke nwanyị na-akwa iko, soro ha na-akwa iko n’ụzọ okpukpe. Ọ rarawo ndị ọchịchị banye ná nkwekọrịta na ọbụbụenyi dị iche iche nke ha na ya. Site n’ihe ndọrọ nke okpukpe, o mewo atụmatụ iwetara ụmụ mmadụ mkpagbu n’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, azụmahịa, na n’ụzọ akụ na ụba. Ọ kpaliwo mkpagbu nke okpukpe, na agha okpukpe na agha ntụte okwukwe dị iche iche, tinyekwara agha mba dị iche iche, ndị ihe kpatara ha bụ kpọmkwem ihe ndị metụtara ndọrọ ndọrọ ọchịchị na azụmahịa. O dowokwa agha ndị a nsọ site n’ikwu na ha bụ uche Chineke.
6 Ntinye aka okpukpe na-etinye n’agha na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile nke narị afọ nke 20 bụ ihe a mazuru ebe nile—dị ka na Japan nke ndị Shinto, India nke ndị Hindu, Vietnam nke ndị okpukpe Buddha, Northern Ireland na Latin America nke “ndị Kraịst,” tinyere ndị ọzọ—a gaghịkwa elefuru anya òkè nke ndị ụkọchukwu ogige ndị agha keere n’akụkụ abụọ ndị ahụ n’ime agha ụwa abụọ e buworo, ịkpali ụmụ okorobịa ka ha jee gburịta onwe ha. Otu ihe atụ pụtara ìhè nke ịkwa iko Babilọn Ukwu ahụ bụ òkè o keere n’Agha Obodo Spain nke 1936-1939, nke ọ bụ n’ime ya ka e gburu ihe na-adịghị ala karịa 600,000 mmadụ. Ndị kpaliri mwụfu ọbara nke a bụ ndị na-akwado ndị ndú okpukpe Katọlik na ndị òtù ha, n’otu akụkụ n’ihi na akụ na ọkwá dị elu nke chọọchị nọ n’ihe ize ndụ n’aka gọọmenti ndị Spain nke iwu kwadoro.
7. Olee ndị ka Babilọn Ukwu ahụ lekwasịworo anya n’ụzọ bụ isi, oleekwa ụzọ ndị o jiworo mee ihe megide ndị a o lekwasịrị anya?
7 Ebe Babilọn Ukwu ahụ bụ akụkụ okpukpe nke mkpụrụ Setan, ọ nọgidewo mgbe nile na-eme ka “nwanyị” nke Jehova, bụ́ “Jerusalem nke dị n’elu,” bụrụ ebe bụ isi o lekwasịrị anya. Na narị afọ mbụ, e mere ka a mata nke ọma na ọgbakọ nke ndị Kraịst e tere mmanụ bụ mkpụrụ nke nwanyị ahụ. (Jenesis 3:15; Ndị Galetia 3:29; 4:26) Babilọn Ukwu ahụ gbalịsiri ike imeri ọgbakọ ahụ dị ọcha site n’ịrara ya banye n’ịkwa iko n’ụzọ okpukpe. Ndị ozi bụ Pọl na Pita dọrọ aka ná ntị na ọtụtụ ndị ga-adaba na nke a, na nke a ga-akpatakwa oké ndapụ n’ezi ofufe. (Ọrụ 20:29, 30; 2 Pita 2:1-3) Ozi Jisọs zijeere ọgbakọ asaa ahụ gosiri na n’oge ọgwụgwụ nke ndụ Jọn, Babilọn Ukwu ahụ na-enwe ihe ịga nke ọma ụfọdụ ná mgbalị ya imerụ ndị mmadụ. (Mkpughe 2:6, 14, 15, 20-23) Ma Jisọs adịlarị mbụ gosi ókè a ga-ekwe ka ọ garuo.
Ọka na Ata Ndị Ahụ
8, 9. (a) Gịnị ka ilu Jisọs banyere ọka na ata gosiri? (b) Gịnị mere “mgbe mmadụ na-arahụ ụra”?
8 N’ilu ya banyere ọka na ata, Jisọs kwuru okwu banyere otu nwoke onye ghara mkpụrụ ọma n’ubi ya. “Ma mgbe mmadụ na-arahụ ụra,” onyeiro bịara wee ghaakwa ata n’ubi ahụ. Ya mere, ata ahụ mere ka ọka ahụ gharakwa ịpụta ìhè. Jisọs ji okwu ndị a kọwaa ilu ya: “Onye na-agha mkpụrụ ọma ahụ bụ Nwa nke mmadụ; ubi ahụ bụ ụwa; mkpụrụ ọma ahụ, ndị ahụ bụ ụmụ alaeze eluigwe; ata ahụ bụ ụmụ ajọ onye ahụ; onyeiro ahụ nke ghara ha bụ Ekwensu.” Ọ gara n’ihu igosi na a ga-ekwere ka ọka na ata ndị ahụ tokọta ruo “ọgwụgwụ oge a,” mgbe ndị mmụọ ozi “ga-achịkọpụta” ata ihe atụ ndị ahụ.—Matiu 13:24-30, 36-43.
9 Ihe Jisọs na ndị ozi bụ Pọl na Pita dọrọ aka ná ntị ya mezuru. “Mgbe mmadụ na-arahụ ụra,” ma ọ bụ mgbe ndị ozi ahụ nwụsịrị ma ọ bụ mgbe ndị nlekọta bụ́ ndị Kraịst dara mbà n’ichekwa ìgwè atụrụ Chineke, ndapụ n’ezi ofufe nke ndị Babilọn bilitere kpọmkwem n’ime ọgbakọ. (Ọrụ 20:31) N’oge na-adịghị anya, ata ahụ bara ụba nke ukwuu karịa ọka ahụ wee mee ka ọka ahụ gharakwa ịpụta ìhè. Ruo narị afọ ole na ole, ọ pụrụ iyiworị ka nnukwute uwe mwụda nke Babilọn Ukwu ahụ o kpuchikọtawo mkpụrụ nke nwanyị ahụ kpam kpam.
10. Gịnị weere ọnọdụ ka ọ na-erule n’afọ ndị 1870, oleekwa otú Babilọn Ukwu ahụ si meghachi omume na nke a?
10 Ka ọ na-erule n’afọ ndị 1870, ndị Kraịst e tere mmanụ malitere ime mgbalị pụtara ìhè ikewapụ onwe ha site n’ụzọ ịkwa iko nile nke Babilọn Ukwu ahụ. Ha gbakụtara ozizi ụgha azụ, bụ́ ndị Krisendọm siworo n’ikpere arụsị weta, jirikwa Bible mee ihe n’atụghị egwu n’ikwusa na oge ndị Jentaịl ga-agwụ na 1914. Ihe bụ isi Babilọn Ukwu ahụ ji arụ ọrụ, bụ́ ndị ndú okpukpe Krisendọm, megidere mgbalị ndị a a na-eme iweghachi ezi ofufe. N’oge agha ụwa mbụ, ha jiri ọgba aghara nke oge agha ahụ mee ihe ịnwa ikpochapụ ìgwè nta ahụ nke ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi. Na 1918, mgbe ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na a kwụsịwo ọrụ ha nile kpam kpam, o yiri ka Babilọn Ukwu ahụ ò nwewo ihe ịga nke ọma. O yiri ka o meriwo ha.
11. Gịnị si n’ọdịda nke Babilọn oge ochie dara pụta?
11 Dị ka anyị hotaworo na mbụ, obodo ahụ dị mpako bụ Babilọn zutere ajọ ọdịda site n’ọkwá ọchịchị n’afọ 539 T.O.A. Mgbe ahụ, a nụrụ iti mkpu ahụ bụ: “Ọ dawo, Babilọn adawo.” Ọnọdụ dị elu nke alaeze ụwa ahụ dara n’aka usuu ndị agha Midia na Peasia ndị nọ n’okpuru nduzi Saịrọs Onye Ukwu. Ọ bụ ezie na obodo ahụ n’onwe ya lanarịrị mmeri ahụ, ọdịda ọ dara site n’ọkwá ọchịchị mere eme n’ezie, o mekwara ka a tọhapụ ndị Juu ọ dọtara n’agha. Ha laghachiri Jerusalem iguzobeghachi ezi ofufe n’ebe ahụ.—Aịsaịa 21:9; 2 Ihe Emere 36:22, 23; Jeremaịa 51:7, 8.
12. (a) N’oge anyị a, à pụrụ isi aṅaa kwuo na Babilọn Ukwu ahụ adawo? (b) Gịnị na-egosi na Jehova ajụwo Krisendọm kpam kpam?
12 N’oge anyị a, a nụwokwa mkpu ahụ nke a na-eti na Babilọn Ukwu ahụ adawo! Ihe ịga nke ọma na-adịteghị aka nke Krisendọm ahụ sitere na Babilọn nwere na 1918 lara n’iyi na mberede na 1919 mgbe e weghachiri ihe fọdụrụ ná ndị ahụ e tere mmanụ, bụ́ òtù Jọn ahụ, site ná mbilite n’ọnwụ ime mmụọ. Babilọn Ukwu ahụ adawo n’ihe metụtara inwe ike ọ bụla ijide ndị Chineke dị ka ndị a dọtara n’agha. Dị ka igurube, ụmụnna Kraịst e tere mmanụ enupụtawo n’abyss ahụ, dị njikere ịrụ ọrụ. (Mkpughe 9:1-3; 11:11, 12) Ha bụ “ohu ahụ kwesịrị ka a tụkwasị ya obi, nke nwekwara uche” nke oge a, Onyenwe ha edebewokwa ha ilekọta ihe nile o nwere n’elu ala. (Matiu 24:45-47) Iji ha rụọ ọrụ n’ụzọ dị otú a gosipụtara na Jehova ajụwo Krisendọm kpam kpam n’agbanyeghị nzọrọ ọ na-azọrọ na ya bụ onye nnọchianya ya n’elu ala. E guzobeghachiri ofufe dị ọcha, e meghekwara ụzọ ịrụzu ọrụ nke ịka ihe fọdụrụ na 144,000 ahụ akara—bụ́ ndị fọdụrụ ná mkpụrụ nwanyị ahụ, nke bụ́ onye iro Babilọn Ukwu ahụ eri ogologo oge. Ihe ndị a nile bụ ihe àmà nke ajọ mmeri nye nzukọ okpukpe Setan ahụ.
Ntachi Obi Ndị Nsọ
13. (a) Gịnị ka mmụọ ozi nke atọ mara ọkwa ya? (b) Ọmụma ikpe dị aṅaa ka Jehova mara ndị na-anata akara nke anụ ọhịa ahụ?
13 Ugbu a mmụọ ozi nke atọ na-ekwu okwu. Gee ntị! “Mmụọ ozi ọzọ, bụ́ nke atọ, wee soo ha, were oké olu sị, Ọ bụrụ na onye ọ bụla na-akpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na ihe oyiyi ya, na-anatakwa akara ya n’egedege ihu ya, ma ọ bụ n’aka ya, ya onwe ya ga-aṅụkwa n’ime mmanya nke ọnụma Chineke, nke e doziworo n’agwaghị agwa n’ime iko nke iwe ya.” (Mkpughe 14:9, 10a) Ná Mkpughe 13:16, 17, e mere ka a mara na n’ime ụbọchị Onyenwe anyị ahụ, ndị na-adịghị efe onyinyo nke anụ ọhịa ahụ ga-ata ahụhụ—ọbụna na a ga-egbu ha. Ugbu a anyị na-amụta na Jehova ekpebisiwo ike ikpe ha ikpe, bụ́ ndị “nwere akara ahụ, bụ́ aha nke anụ ọhịa ahụ ma ọ bụ ọnụ ọgụgụ aha ya.” A ga-amanye ha ịṅụ ‘iko ọnụma’ na-elu ilu nke iwe Jehova. Gịnị ka nke a ga-apụtara ha? N’afọ 607 T.O.A., mgbe Jehova manyere Jerusalem ịṅụ “iko nke ọnụma ya,” obodo ahụ nwetara ahụmahụ nke “mbibi na ntikpọ na oké ụnwụ na mma agha” n’aka ndị Babilọn. (Aịsaịa 51:17, 19) N’otu aka ahụkwa, mgbe ndị na-efe ike ọchịchị ụwa dị iche iche na ihe oyiyi ha, bụ́ òtù United Nations, ga-aṅụ iko nke ọnụma Jehova, ọ ga-apụtara ha mbibi. (Jeremaịa 25:17, 32, 33) A ga-ebibi ha kpam kpam.
14. Ọbụna tupu e bibie ndị ahụ na-efe anụ ọhịa ahụ na ihe oyiyi ya ofufe, gịnị ka ndị dị otú ahụ na-aghaghị inweta, Jọn sikwa aṅaa kọwaa nke a?
14 Otú ọ dị, ọbụna tupu nke ahụ emee, ndị ahụ nwere akara nke anụ ọhịa ahụ ga-enwe mmetụta ịta ahụhụ nke iwe Jehova. N’ikwu okwu banyere onye na-efe anụ ọhịa ahụ na ihe oyiyi ya, mmụọ ozi ahụ gwara Jọn, sị: “A ga-ejikwa ọkụ na brimstone mekpaa ya ahụ n’ihu ndị mmụọ ozi dị nsọ, na n’ihu Nwa Atụrụ ahụ: anwụrụ ọkụ nke mmekpa ahụ ha na-arịgo ruo mgbe nile ebighị ebi; ha adịghị ezukwa ike ehihie na abalị, bụ́ ndị na-akpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na ihe oyiyi ya, ma ọ bụrụkwa na onye ọ bụla anata akara nke aha ya.”—Mkpughe 14:10b, 11.
15, 16. Gịnị ka okwu ndị ahụ bụ “ọkụ na brimstone” pụtara ná Mkpughe 14:10?
15 N’ihi na a kpọtụrụ ọkụ na brimstone aha n’ebe a, ụfọdụ elewo ya anya dị ka ihe àmà nke na-egosi na e nwere ọkụ hell. Ma, iji mkpirikpi oge lee anya n’otu amụma yiri nke a na-egosi ihe okwu ndị a pụtara n’ezie n’ọnọdụ nke a. Laa azụ n’oge Aịsaịa, Jehova dọrọ mba Edọm aka ná ntị na a ga-enye ha ahụhụ n’ihi iro ha na-ebuso Israel. Ọ sịrị: “Iyi ya nile ga-agbanwe pitch, ájá ya ga-agbanwekwa brimstone, ala ya ga-aghọkwa pitch na-ere ọkụ. N’abalị ma ọ bụ n’ehihie ọ gaghị anyụ anyụ; ruo mgbe ebighị ebi ka anwụrụ ọkụ ya ga-akwụgo: site n’otu ọgbọ ruo ọgbọ ọzọ ọ ga-atọgbọrọ n’efu; ruo mgbe nile ebighị ebi ọ dịghị onye na-agabiga n’ime ya.”—Aịsaịa 34:9, 10.
16 À tụbara Edọm n’ọkụ hell dị n’akụkọ ifo ka ọ na-ere ruo mgbe ebighị ebi? Ọ dịghị ma ọlị. Kama nke ahụ, mba ahụ pụrụ n’anya kpam kpam site n’elu ụwa dị ka à ga-asị na e ji ọkụ na brimstone repịa ya. Ihe ikpeazụ si n’ahụhụ ahụ e nyere ya pụta abụghị ịnọ na-ata ahụhụ ruo mgbe ebighị ebi, kama ọ bụ “ịtọgbọrọ n’efu . . . ịtọgbọrọ nkịtị . . . ihe efu.” (Aịsaịa 34:11, 12) Anwụrụ ọkụ ahụ ‘ịkwụgo ruo mgbe ebighị ebi’ kọwara nke a nke ọma. Mgbe ụlọ gbara ọkụ, anwụrụ ọkụ na-anọgide na-akwụgo site ná ntụ ya ruo ogologo oge ụfọdụ mgbe ire ọkụ ndị ahụ danyụsịworo, na-eme ka ndị na-ekiri ihe na-emenụ mara na e nwewo ọkụ ọgbụgba nke bibiri ihe nke ukwuu. Ọbụna taa, ndị Chineke na-echeta ihe a mụtara site ná mbibi e bibiri Edọm. N’ụzọ dị otú a, ‘anwụrụ ọkụ nke orire ọkụ ya’ ka nọ na-akwụgo n’ụzọ ihe atụ.
17, 18. (a) Gịnị ka ọ ga-apụtara ndị ahụ natara akara nke anụ ọhịa ahụ? (b) Olee ụzọ o si bụrụ na a na-emekpa ndị na-efe anụ ọhịa ahụ ofufe ahụ? (ch) Olee otú o si bụrụ na “anwụrụ ọkụ nke mmekpa ahụ ha na-arịgo ruo mgbe nile ebighị ebi”?
17 A ga-ebibikwa ndị nwere akara anụ ọhịa ahụ kpam kpam, dị ka à ga-asị na e ji ọkụ bibie ha. Dị ka amụma ahụ mesịrị gosi, a ga-ahapụ ozu ha n’elighị ha eli ka ụmụ anụmanụ na nnụnụ rie ha. (Mkpughe 19:17, 18) Ya mere, o doro anya na nke a abụghị ịnọgide ruo mgbe ebighị ebi na-enye ha ahụhụ! Ò si aṅaa bụrụ na ‘e ji ọkụ na brimstone mekpaa ha ahụ’? Ọ bụ n’echiche nke bụ na eziokwu ahụ na-ekpughe ha, na-adọkwa ha aka ná ntị banyere ikpe Chineke nke na-abịanụ. N’ihi nke a, ha na-akatọ ndị Chineke, ya bụrụkwa na o kwe mee, jiri ụzọ aghụghọ na-akpali anụ ọhịa ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ ịkpagbu, ọbụna igbu Ndịàmà Jehova. Dị ka ihe ikpeazụ ga-esi na nke a pụta, a ga-eji ọkụ na brimstone bibie ndị mmegide ndị a. Mgbe ahụ, “anwụrụ ọkụ nke mmekpa ahụ ha na-arịgo ruo mgbe nile ebighị ebi” n’echiche nke bụ na ikpe Chineke megide ha ga-anọ dị ka ihe ncheta, ma ọ bụrụ na ọ dị mgbe ọ bụla ọzọ a ga-ama ọkaaka ịchịisi Jehova aka. Mgbe ahụ, a ga-edoziworị ihe iseokwu ahụ ruo mgbe nile ebighị ebi.
18 Ònye na-akpọsa ozi mmekpa ahụ ahụ taa? Cheta na igurube ihe atụ ndị ahụ nwere ikike imekpa ndị mmadụ ahụ, bụ́ ndị na-enweghị akara nke Chineke n’egedege ihu ha. (Mkpughe 9:5) Ihe àmà gosiri na ọ bụ ndị a, n’okpuru nduzi nke ndị mmụọ ozi, bụ ndị ga-eweta mmekpa ahụ ahụ. Nnọgidesi ike nke igurube ihe atụ ndị ahụ siri ike otú a nke na “ha adịghị ezukwa ike ehihie na abalị, bụ́ ndị na-akpọ isiala nye anụ ọhịa ahụ na ihe oyiyi ya, ma ọ bụrụkwa na onye ọ bụla anata akara nke aha ya.” N’ikpeazụkwa, mgbe e bibisịrị ha, oké ihe àmà nke iwepụ ọkaaka ịchịisi Jehova n’ụta, bụ́ “anwụrụ ọkụ nke mmekpa ahụ ha,” ga na-arịgo ruo mgbe nile ebighị ebi. Ka òtù Jọn ahụ nọgidekwa na-enwe ntachi obi ruo mgbe e mezuru nke a! Dị ka mmụọ ozi ahụ kwubiri, sị: “N’ebe a ka ntachi obi ndị nsọ dị, bụ́ ndị na-edebe ihe Chineke nyere n’iwu, na okwukwe Jisọs.”—Mkpughe 14:12.
19. N’ihi gịnị ka e ji chọọ ntachi obi n’aka ndị nsọ ahụ, gịnịkwa ka Jọn kọrọ nke na-agba ha ume?
19 Ee, “ntachi obi ndị nsọ” pụtara na ha na-arara ofufe ha nye nanị Jehova site na Jisọs Kraịst. Ozi ha na-ezisa bụ ihe na-adịghị ọha mma. Ọ na-akpata mmegide, mkpagbu, ọbụna igbu ha n’ihi okwukwe ha. Ma ihe ọzọ Jọn kọrọ na-agba ha ume: “M wee nụ olu ka ọ na-esi n’eluigwe daa, sị, Dee akwụkwọ, Ngọzi na-adịrị ndị nwụrụ anwụ, bụ́ ndị ga-anwụ anwụ n’ime Onyenwe anyị site n’ugbu a: ee, ka mmụọ nsọ na-ekwu, ka ha wee si ná ndọgbu nile ha dọgburu onwe ha n’ọrụ zuru ike; n’ihi na ọrụ nile ha na-eso ha gaa.”—Mkpughe 14:13.
20. (a) Olee otú nkwa ahụ nke Jọn kọrọ banyere ya si kwekọọ n’amụma Pọl buru banyere ọnụnọ Jisọs? (b) Olee ihe ùgwù pụrụ iche nke e kwere ndị ahụ e tere mmanụ, bụ́ ndị nwụrụ mgbe a chụpụsịrị Setan n’eluigwe, nkwa ya?
20 Nkwa nke a kwekọrọ nnọọ nke ọma n’amụma Pọl buru banyere oge ọnụnọ Jisọs: “Ndị nwụrụ n’ime Kraịst ga-ebukwa ụzọ si n’ọnwụ bilie: mgbe ahụ anyị onwe anyị, bụ́ ndị nọ ná ndụ, ndị a na-ahapụ [ndị so ná ndị ahụ e tere mmanụ, ndị nọ ná ndụ banye n’ime ụbọchị Onyenwe anyị] anyị na ha ka a ga-ewelikọ n’igwe ojii, izute Onyenwe anyị n’ime mbara eluigwe.” (1 Ndị Tesalọnaịka 4:15-17) Mgbe a chụpụsịrị Setan n’eluigwe, ndị ahụ nwụrụ n’ime Kraịst buru ụzọ si n’ọnwụ bilie. (Tụlee Mkpughe 6:9-11.) Mgbe nke a gasịrị, ndị ahụ e tere mmanụ ndị nwụrụ n’ime ụbọchị Onyenwe anyị ka e kwere nkwa ihe ùgwù pụrụ iche. Mbilite n’ọnwụ ha gaa ná ndụ ime mmụọ n’eluigwe ga-abụ ozugbo ahụ ha nwụsịrị, “n’otu ntabi anya.” (1 Ndị Kọrint 15:52) Lee ka nke a si bụrụ ihe dị ebube! Ọrụ ezi omume ha na-arụ na-anọgidekwa na-aga n’ihu n’ime eluigwe.
Owuwe Ihe Ubi nke Ụwa
21. Gịnị ka Jọn na-agwa anyị banyere ‘owuwe ihe ubi nke ụwa’?
21 Ndị ọzọ na-eritekwa uru n’ụbọchị ikpe nke a, dị ka Jọn gara n’ihu ịkọrọ anyị: “M wee hụ, ma lee, igwe ọcha; n’elu igwe ọcha ahụ ka m hụrụ otu onye yiri nwa nke mmadụ ka ọ na-anọdụ ala, na-ekpu okpueze nke ọlaedo n’isi ya, mma iwe ihe ubi dị nkọ dịkwa n’aka ya. Mmụọ ozi ọzọ [nke anọ] wee si n’ụlọ nsọ ahụ pụta, na-ewere oké olu tiere onye ahụ nke na-anọkwasị n’igwe ọcha ahụ mkpu, sị, Tinye mma iwe ihe ubi gị, weekwa ihe ubi: n’ihi na oge hour iwe ihe ubi abịaruwo; n’ihi na ihe a ga-ewe n’ubi nke ụwa achabigawo ókè. Onye ahụ nke na-anọkwasị n’igwe ọcha ahụ wee tụda mma iwe ihe ubi ya n’elu ụwa; e wee were ụwa dị ka ihe ubi.”—Mkpughe 14:14-16.
22. (a) Ònye bụ onye ahụ nke na-ekpu okpueze e ji ọlaedo mee, onye na-anọkwasịkwa n’elu igwe ọcha? (b) Olee mgbe mmezu owuwe ihe ubi ahụ na-ewere ọnọdụ, ọ̀ bụkwa n’ụzọ dị aṅaa?
22 A maara onye na-anọkwasị n’igwe ọcha ahụ nke ọma. Ka ọ na-anọkwasị n’elu igwe ọcha, na-eyi nwa nke mmadụ, nweekwa okpueze nke ọlaedo, o doro anya na ọ bụ Jisọs, bụ́ Eze Mesaịa ahụ nke Daniel hụkwara n’ọhụụ. (Daniel 7:13, 14; Mak 14:61, 62) Ma gịnị bụ owuwe ihe ubi ahụ e buru amụma ya n’ebe a? Mgbe ọ ka nọ n’elu ala, Jisọs jiri ọrụ ime ndị na-eso ụzọ ahụ tụnyere owuwe ihe ubi n’ụwa nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Matiu 9:37, 38; Jọn 4:35, 36) Mmezu nke owuwe ihe ubi a na-abịa n’ime ụbọchị Onyenwe anyị, mgbe e kpubere Jisọs okpu dị ka Eze, o wee mezuokwa ihe Nna ya kpere n’ikpe. Otú a, oge ọchịchị ya, malite na 1914, bụkwa oge ọṅụ nke iwebata ihe e wetara n’ubi.—Tụlee Deuterọnọmi 16:13-15.
23. (a) Ònye ka e si n’ọnụ ya nụ okwu ahụ nke bụ ka a malite iwe ihe ubi? (b) Owuwe ihe ubi dị aṅaa werewooro ọnọdụ malite na 1919 ruo ugbu a?
23 Ọ bụ ezie na ọ bụ Eze na Onyeikpe, Jisọs na-echere okwu sitere n’ọnụ Jehova bụ Chineke ya tupu ọ malite iwe ihe ubi. Okwu ahụ na-abịa site “n’ụlọ nsọ ahụ” site n’ọnụ otu mmụọ ozi. Ozugbo ahụ, Jisọs rubere isi wee mee ihe. Nke mbụ, site na 1919 gaa n’ihu, o mere ka ndị mmụọ ozi ya chịkọtazuo 144,000 ahụ. (Matiu 13:39, 43; Jọn 15:1, 5, 16) Ọzọ, nchịkọbata owuwe ihe ubi nke oké ìgwè mmadụ ahụ nke atụrụ ọzọ na-ewere ọnọdụ. (Jọn 10:16; Mkpughe 7:9) Akụkọ ihe mere eme na-egosi na n’agbata 1931 na 1935, ọnụ ọgụgụ dị ukwuu nke atụrụ ọzọ ndị a malitere ịpụta ìhè. Na 1935, Jehova mere ka òtù Jọn ahụ ghọta nke ọma ndị oké ìgwè mmadụ ahụ nke Mkpughe 7:9-17 bụ n’ezie. Malite mgbe ahụ gaa n’ihu, e lekwasịkarịrị anya n’ịchịkọbata ìgwè mmadụ a. Ka ọ na-erule n’afọ 2005, ọnụ ọgụgụ ha agafeela nde mmadụ isii, ọ ka nọkwa na-aga n’ihu. N’ezie, onye ahụ yiri nwa nke mmadụ ejiriwo ọṅụ webata ihe ubi n’ụba n’oge ikpeazụ ndị a.—Tụlee Ọpụpụ 23:16; 34:22.
Ịzọcha Vine nke Ụwa
24. Gịnị dị n’aka mmụọ ozi nke ise, gịnịkwa ka mmụọ ozi nke isii kpọrọ òkù ka e mee?
24 Mgbe e webatasịrị ihe ubi maka nzọpụta, oge eruwo maka owuwe ihe ubi ọzọ. Jọn na-akọ, sị: “Mmụọ ozi ọzọ [nke ise] wee si n’ụlọ nsọ ahụ nke dị n’eluigwe pụta, ya onwe ya nwekwara mma iwe ihe ubi dị nkọ. Mmụọ ozi ọzọ [nke isii] wee si n’ebe ịchụàjà ahụ pụta, bụ́ onye nwere ike n’ebe ọkụ ahụ dị; o wee were oké olu tiere onye ahụ nke nwere mma iwe ihe ubi dị nkọ mkpu, sị, Tinye mma iwe ihe ubi gị dị nkọ, bipụ ụyọkọ nile nke vine nke ụwa; n’ihi na mkpụrụ vine ya achazuwo.” (Mkpughe 14:17, 18) E nyere ndị mmụọ ozi ọrụ owuwe ihe ubi dị ukwuu n’ime ụbọchị Onyenwe anyị, ka ha na-ekewapụ ndị dị mma n’etiti ndị dị njọ!
25. (a) Gịnị ka e gosiri site n’eziokwu bụ na mmụọ ozi nke isii ahụ sitere n’ụlọ nsọ ahụ pụta? (b) N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị na ọkpụkpọ òkù ahụ bụ ka a malite iwe ihe ubi sitere n’ọnụ mmụọ ozi nke “si n’ebe ịchụàjà ahụ pụta”?
25 Mmụọ ozi nke ise ahụ sitere n’ebe Jehova nọ n’ime ụlọ nsọ ahụ pụta; ya mere, owuwe ihe ubi ikpeazụ ahụ na-ewerekwa ọnọdụ dị ka uche Jehova si dị. E nyere mmụọ ozi ahụ iwu ka ọ malite ọrụ ya site n’ozi mmụọ ozi ọzọ zirutere, bụ́ nke “si n’ebe ịchụàjà ahụ pụta.” Eziokwu nke a dị mkpa nke ukwuu, ebe ọ bụ na mkpụrụ obi ndị kwesịrị ntụkwasị obi ndị dị n’okpuru ebe ịchụàjà ahụ ajụworị, sị: “Ruo olee mgbe, Onyenwe anyị, onye dị nsọ, bụrụkwa onye eziokwu, ka ị na-ekpeghị ikpe bọọkwa ọ́bọ̀ ọbara anyị n’isi ndị bi n’elu ụwa?” (Mkpughe 6:9, 10) Site n’owuwe ihe ubi nke vine nke ụwa, a ga-aza òkù ịbọ ọ́bọ̀ nke a.
26. Gịnị bụ “vine nke ụwa”?
26 Ma gịnị bụ “vine nke ụwa”? N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e kwuru okwu banyere mba ndị Juu ahụ dị ka vine nke Jehova. (Aịsaịa 5:7; Jeremaịa 2:21) N’otu aka ahụkwa, e kwukwara okwu banyere Jisọs Kraịst na ndị ahụ ya na ha gaje ịrụ ọrụ n’ime Alaeze Chineke dị ka vine. (Jọn 15:1-8) N’ọnọdụ nke a, ihe dị mkpa e ji mara vine bụ na ọ na-amịpụta mkpụrụ, ezi vine ndị Kraịst ahụ amịpụtawokwa mkpụrụ n’ụba iji wetara Jehova otuto. (Matiu 21:43) N’ihi nke a, “vine nke ụwa” aghaghị ịbụ, ọ bụghị ezi vine nke a, kama nke na-abụghị ezie Setan mepụtara, bụ́ usoro ọchịchị ya rụrụ arụ a na-ahụ anya nke dịkwasịrị n’elu ụmụ mmadụ, ya na “ụyọkọ” ya dị iche iche nke mkpụrụ ndị mmụọ ọjọọ mịpụtaworo n’ime ọtụtụ narị afọ gara aga. Babilọn Ukwu ahụ, nke Iso Ụzọ Kraịst si n’ezi ofufe dapụ bụ akụkụ a ma ama n’ime ya, enwewo ike dị ukwuu n’ebe ajọ vine nke a dị.—Tụlee Deuterọnọmi 32:32-35.
27. (a) Gịnị mere mgbe mmụọ ozi ahụ ji mma iwe ihe ubi chịkọta vine nke ụwa? (b) Amụma dịgasị aṅaa dị n’Akwụkwọ Nsọ Hibru gosiri ókè owuwe ihe ubi ahụ ga-eru?
27 A ghaghị imezu ihe e kpere n’ikpe! “Mmụọ ozi ahụ wee tụba mma iwe ihe ubi ya n’ụwa, wee bipụ mkpụrụ vine nke ụwa, tụba ya n’ime ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ, nke dị ukwuu, bụ́ nke ọnụma Chineke. E wee zọchaa ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ n’azụ obodo ahụ, ọbara wee si n’ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ pụta, ruo bridle ịnyịnya, ruokwa ihe hà ka [otu puku na narị furlong isii].” (Mkpughe 14:19, 20) Ọ dịworị anya a mara ọkwa ọnụma Jehova megide vine nke a. (Zefanaịa 3:8) Otu amụma dị n’akwụkwọ Aịsaịa mere ka a ghara inwe ihe ịrụ ụka ọ bụla na a gaje ibibi mba nile mgbe a zọchara ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ. (Aịsaịa 63:3-6) Joel bukwara amụma na “ọtụtụ ìgwè mmadụ,” bụ́ mba dị iche iche, ka a ga-azọpịasị ruo mbibi n’ime “ebe nzọcha mkpụrụ vine” ahụ dị na “ndagwurugwu mkpebi ikpe.” (Joel 3:12-14) N’ezie, nke a bụ owuwe ihe ubi nke a na-agaghị enwe ihe yiri ya mgbe ọ bụla ọzọ! Dị ka ọhụụ Jọn si dị, ọ bụghị nanị mkpụrụ vine ndị ahụ ka a ga-ewepụta, kama a ga-egbutusị vine ihe atụ ahụ dum wee chịba ha n’ime ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ ka e wee zọpịasịa ha. Ya mere, a ga-azọpịa vine nke ụwa, ọ dịghịkwa mgbe ọ bụla ọzọ ọ ga-enwe ike itolite.
28. Olee ndị na-azọcha vine nke ụwa, gịnịkwa ka ọ pụtara bụ na ‘a na-azọcha ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ n’azụ obodo’?
28 N’ọhụụ ahụ, ọ bụ ịnyịnya mere nzọcha ahụ, n’ihi na ọbara nke a zọchapụtara na vine ahụ ruru na “bridle ịnyịnya.” Ebe ọ bụ na okwu ahụ bụ “ịnyịnya” na-ezokarị aka n’ịlụ agha, nke a aghaghị ịbụ oge a na-alụ agha. Usuu ndị agha nke eluigwe ndị na-esoro Jisọs banye n’agha ikpeazụ ahụ megide usoro ihe nke Setan ka e kwuru banyere ha na ha na-azọcha “ebe nzọcha mkpụrụ vine nke mmanya nke ọnụma nke iwe Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Nile.” (Mkpughe 19:11-16) Ọ pụtara ìhè na ọ bụ ndị a na-eme nzọcha nke mkpụrụ vine nke ụwa. A na-eme ‘nzọcha nke ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ n’azụ obodo,’ ya bụ, n’ebe na-adịghị n’ime Zaịọn nke eluigwe. N’eziokwu, o kwesịrị nnọọ ekwesị na a ga-azọcha vine nke ụwa n’elu ala. Ma, ‘a ga-azọchakwa ya n’azụ obodo’ n’echiche nke bụ na ndị fọdụrụ ná mkpụrụ nwanyị ahụ agaghị enweta mmerụ ahụ ọ bụla, bụ́ ndị nọchiri anya Zaịọn nke eluigwe n’elu ala. Ndị a, ha na oké ìgwè mmadụ ahụ ka a ga-ezobe n’enweghị mmerụ ahụ ọ bụla n’ime ndokwa nke nzukọ Jehova dị n’elu ala.—Aịsaịa 26:20, 21.
29. Gịnị bụ ịdị omimi nke ọbara si n’ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ, ogologo ya hàkwa aṅaa, gịnịkwa ka ihe a nile na-egosi?
29 Ọhụụ nke a gbara ọkpụrụkpụ nwere ihe ndị yiri ya ná ntipịasị nke alaeze dị iche iche nke ụwa site na nkume Alaeze ahụ a kọwara na Daniel 2:34, 44. A ga-ekpochapụ ihe nile. Osimiri nke ọbara nke si n’ebe nzọcha mkpụrụ vine ahụ dị omimi nke ukwuu, ruo bridle ịnyịnya, ọ gbatịkwara ruo ogologo nke 1,600 furlong.a Ọnụ ọgụgụ nke a dị ukwuu, nke e nwetara site n’iji anọ ụzọ anọ mụbaa iri ụzọ iri (4 x 4 x 10 x 10), mere ka ozi ahụ doo anya nke bụ na ihe àmà nke mbibi ga-emetụta elu ụwa nile. (Aịsaịa 66:15, 16) Mbibi ahụ ga-ezu ebe nile, a pụghịkwa inughachi ya azụ. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ ma ọlị vine nke Setan ga-agbanye mkpọrọgwụ n’elu ala!—Abụ Ọma 83:17, 18.
30. Mkpụrụ dịgasị aṅaa ka vine nke Setan mịpụtaworo, gịnịkwa kwesịrị ịbụ mkpebi anyị siri ike?
30 Ebe ọ bụ na anyị na-ebi ugbu a n’ime ime nke oge ọgwụgwụ, ọhụụ nke owuwe ihe ubi abụọ ndị a dị mkpa nke ukwuu. Ihe ọ dị anyị mkpa ime bụ nanị ile anya ka anyị hụ mkpụrụ nke vine Setan mịpụtaworo. Isikwopụ afọ ime na ụdị igbu ọchụ ndị ọzọ; idina ụdị onwe onye, ịkwa iko ndị lụworo di na nwunye, na ụdị adịghị ọcha nile ndị ọzọ; emeghị ihe n’eziokwu na enweghị ịhụnanya—ihe nile dị otú ahụ na-eme ka ụwa nke a bụrụ ihe rụrụ arụ n’anya Jehova. Vine nke Setan na-amịpụta “mkpọrọgwụ nke na-amị nsí na wormwood.” Ụzọ mbibi nke ịkwa iko nke ọ gbasoworo na-ewetara Onye Okike Ukwu nke ihe a kpọrọ mmadụ nkọcha. (Deuterọnọmi 29:18; 32:5; Aịsaịa 42:5, 8) Lee nnọọ ihe ùgwù ọ bụ iso òtù Jọn ahụ na-arụ ọrụ n’ụzọ chiri anya n’iwebata ezi mkpụrụ ahụ nke Jisọs na-ewebata iji nye Jehova otuto! (Luk 10:2) Ka anyị nile kpebisie ike na ọ dịghị mgbe ọ bụla anyị ga-ekwere ka vine nke ụwa nke a merụọ anyị, ka anyị sikwa otú a zere ịbụ ndị a zọpịakọtara ha na vine nke ụwa mgbe a ga-emezu ikpe ọmụma Jehova n’isi ha.
[Ihe e dere n’ala ala peeji]
a 1,600 furlong bụ ihe dị ka 300 kilomita, ma ọ bụ 180 maịlụ nke ndị England.—Mkpughe 14:20, New World Translation Reference Bible, nkọwa ala ala peji.
Igbe dị na peeji nke 208]
‘Mmanya nke Ịkwa Iko Ya’
Otu akụkụ pụtara ìhè nke Babilọn Ukwu ahụ bụ Chọọchị Roman Katọlik. Onye na-achị chọọchị ahụ bụ popu nke nọ na Rom, ọ na-azọrọkwa na popu nke ọ bụla bụ onye nọchiri Pita onyeozi. Ihe na-esonụ bụ eziokwu ụfọdụ e biri ebi banyere ndị a a sị na ha bụ ndị nnọchianya:
Formosus (891-896): “Ọnwa itoolu mgbe ọ nwụsịrị, a bọpụtara ozu Formosus site n’ebe a na-adọba ozu ndị popu, wee kpọpụta ya n’ụlọikpe n’ihu kansụl ‘ndị na-ekpe ozu ikpe,’ nke Stephen [popu ọhụrụ] nọ n’isi ya. E boro popu ahụ nwụrụ anwụ ebubo maka oké ọchịchọ ịnọ n’ọkwá popu, wee sịkwa na ihe nile o mere adịkwaghị irè. . . . E yipụrụ ozu ya uwe ndị popu; bepụsịa mkpịsị aka nri ya.”—New Catholic Encyclopedia.
Stephen nke Isii (896-897): “N’ime ọnwa ole na ole [e kpesịrị ozu Formosus ikpe] ọgba aghara ọ kpalitere mere ka Pope Stephen kwụsị ịbụ popu; a napụsịrị ya ejiji ndị popu, tụọ ya mkpọrọ, ma nyagbuo ya.”—New Catholic Encyclopedia.
Sergius nke Atọ (904-911): “A nyagburu mmadụ abụọ ndị bu ya ụzọ kpọmkwem . . . n’ụlọ mkpọrọ. . . . Na Rom, ezinụlọ Theophylactus kwadoro ya, nke a sịrị na o sitere n’otu n’ime ụmụ ya ndị inyom, bụ́ Marozia, mụta otu nwa nwoke (onye mesịrị bụrụ Pope John nke Iri na Otu).”—New Catholic Encyclopedia.
Stephen nke Asaa (928-931): “N’afọ ndị ikpeazụ ya dị ka popu, Pope John nke Iri . . . akpasuwo Marozia iwe, onye bụ Donna Senatrix nke Rom, a tụwokwa ya mkpọrọ ma gbuo ya. Marozia nyefezịrị Pope Leo nke Isii ọkwá popu, onye nwụrụ mgbe ọ nọsịrị ọnwa 6 1/2 ọnwa n’ọkwá ahụ. Stephen nke Asaa nọchiri ya, ma eleghị anya site n’ike Marozia. . . . N’ime afọ 2 ọ nọrọ dị ka Popu, o nweghị ike ime ihe ọ bụla n’okpuru nduzi Marozia.”—New Catholic Encyclopedia.
John nke Iri na Otu (931-935): “Mgbe Stephen nke Asaa nwụsịrị . . . , Marozia, onye si n’Ụlọ Theophylactus, nataara nwa ya bụ́ John ọkwá popu, bụ́ nwa okoro nke ka gbara 20 afọ na ụma. . . . Dị ka popu, John nọ n’okpuru nduzi nke nne ya.”—New Catholic Encyclopedia.
John nke Iri na Abụọ (955-964): “O rubeghị afọ iri na asatọ, akụkọ ndị oge ahụ na-ekwekọkwa banyere enweghị mmasị ya n’ihe ime mmụọ, oké mmasị o nwere n’ihe ụtọ arụrụala, na ndụ rụrụ arụ ya nke a na-akparaghị ókè.”—The Oxford Dictionary of Popes.
Benedict nke Itoolu (1032-1044; 1045; 1047-1048): “Ihe e ji mara ya bụ iresị nna mmiri chukwu ya ọkwá popu ahụ, mesịa naraghachikwa ọkwá ahụ ugbo abụọ.”—The New Encyclopœdia Britannica.
Otú a, kama ịgbaso ihe nlereanya nke Pita ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, ndị a na popu ndị ọzọ nwere mmetụta dị njọ. Ha kwere ka ikpe ọmụma ọbara na ịkwa iko ime mmụọ na nke anụ ahụ, tinyere mmetụta nke Jezebel, merụọ chọọchị ahụ ha na-achị. (Jemes 4:4) Na 1917, akwụkwọ Ndị Mmụta Bible bụ́ The Finished Mystery depụtara ọtụtụ n’ime eziokwu ndị a n’ụzọ pụtara ìhè. Nke a bụ otu ụzọ Ndị Mmụta Bible n’oge ahụ si ‘were ihe otiti nile ọ bụla tie ụwa.’—Mkpughe 11:6; 14:8; 17:1, 2, 5.
[Foto dị na peeji nke 206]
Ndị mmụọ ozi na-akwado Kraịst ahụ nke nọkwasịworo n’ocheeze mgbe ọ na-ekpe ikpe
[Foto dị na peeji nke 207]
Mgbe Babilọn dasịrị na 539 T.O.A., a tọhapụrụ ndị ọ dọtara n’agha