Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Kraịst Na-agwa Ọgbakọ Dị Iche Iche Okwu
    Ụlọ Nche—2003 | Mee 15
    • 7, 8. Olee nsogbu siri ike nke e nwere n’ọgbakọ ahụ dị n’Efesọs, oleekwa otú anyị pụrụ isi mee ihe banyere ọnọdụ yiri nke ahụ?

      7 N’agbanyeghị nke ahụ, Ndị Kraịst nọ n’Efesọs nwere otu nsogbu siri ike. “Enwere m ihe a megide gị,” ka Jizọs kwuru, “na ị hapụwo ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ.” Ọ dị mkpa ka ndị nọ n’ọgbakọ ahụ hụghachi Jehova n’anya otú ha sibu hụ ya. (Mak 12:28-30; Ndị Efesọs 2:4; 5:1, 2) Anyị onwe anyị aghaghịkwa ịnọ na nche megide ịkwụsị ịhụ Chineke n’anya otú anyị si hụ ya na mbụ. (3 Jọn 3) Ma gịnị ma ọ bụrụ na ihe ndị dị ka ọchịchọ ịba ọgaranya ma ọ bụ ịchụso ihe ụtọ aghọwala ihe mbụ ná ndụ anyị? (1 Timoti 4:8; 6:9, 10) Mgbe ahụ, anyị kwesịrị ikpesi ekpere ike ka Chineke nyere anyị aka iji ịhụnanya miri emi anyị nwere n’ebe Jehova nọ na ekele anyị nwere maka ihe nile ya na Ọkpara ya mewooro anyị dochie ọchịchọ ndị dị otú ahụ.—1 Jọn 4:10, 16.

  • Kraịst Na-agwa Ọgbakọ Dị Iche Iche Okwu
    Ụlọ Nche—2003 | Mee 15
    • 11. Olee otú anyị pụrụ isi nwee ike ịnọgide na-ahụ Jehova n’anya?

      11 Ndị Efesọs enweghịzi ịhụnanya ha nwere na mbụ, ma gịnị ma ọ bụrụ na ọnọdụ yiri nke ahụ na-ebilite n’ọgbakọ taa? Ka anyị onwe anyị n’otu n’otu nọgide na-ahụ Jehova n’anya site n’ikwu okwu banyere ụzọ ịhụnanya ndị o si eme ihe. Anyị pụrụ igosipụta ekele anyị nwere maka ịhụnanya Chineke gosiri n’inye ihe mgbapụta site n’aka Ọkpara ya ọ hụrụ n’anya. (Jọn 3:16; Ndị Rom 5:8) Mgbe o kwesịrị ekwesị, anyị pụrụ ikwu okwu banyere ịhụnanya Chineke mgbe anyị na-aza ajụjụ na mgbe anyị na-eme ihe omume n’ọgbakọ. Anyị pụrụ igosipụta ịhụnanya anyị onwe anyị nwere n’ebe Jehova nọ site n’ito aha ya n’ozi Ndị Kraịst. (Abụ Ọma 145:10-13) Ee, okwu ọnụ na omume anyị pụrụ inye aka n’ụzọ dị ukwuu n’ime ka ọgbakọ nweghachi ịhụnanya o nwere na mbụ ma ọ bụ mee ka ịhụnanya ahụ sikwuo ike.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya