Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • bh p. 219-220
  • Ịmata Ihe “Babilọn Ukwu ahụ” Bụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịmata Ihe “Babilọn Ukwu ahụ” Bụ
  • Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Babịlọn Ukwu Ahụ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Iru Újú na Ịṅụrị Ọṅụ ná Mbibi nke Babilọn
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • “Babilọn” Na-anọghị ná Ntụkwasị Obi Na-eche Mbibi Ihu
    Inọ ná Ntụkwasị Obi Zuru Ụwa Ọnụ n’Okpuru “Onyeisi Udo” Ahụ
  • E Bibie Obodo Ukwu Ahụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
bh p. 219-220

IHE ODIDE NTỤKWASỊ

Ịmata Ihe “Babilọn Ukwu ahụ” Bụ

N’AKWỤKWỌ Mkpughe, e nwere okwu ndị a na-agaghị aghọta n’ụzọ nkịtị. (Mkpughe 1:1) Dị ka ihe atụ, o kwuru okwu banyere otu nwanyị nke e dere aha bụ́ “Babilọn Ukwu ahụ” n’egedege ihu ya. E kwuru na nwanyị a nọ ọdụ n’elu ‘ìgwè mmadụ na mba dị iche iche.’ (Mkpughe 17:1, 5, 15) Ebe ọ bụ na ọ dịghị nwanyị nkịtị pụrụ ime nke a, Babilọn Ukwu ahụ aghaghị ịbụ ihe atụ. Ya mere, gịnị ka nwanyị akwụna ihe atụ a na-anọchi anya ya?

Ná Mkpughe 17:18, a kọwara nwanyị ihe atụ a dị ka “obodo ukwu ahụ nke nwere alaeze na-achị ndị eze nke ụwa.” Okwu bụ́ “obodo” na-enye echiche nke ìgwè mmadụ a haziri ahazi. Ebe ọ bụ na “obodo ukwu” a na-achị “ndị eze nke ụwa,” nwanyị ahụ a kpọrọ Babilọn Ukwu ahụ aghaghị ịbụ òtù na-akpa ike n’ụwa nile. N’ụzọ ziri ezi, a pụrụ ịkpọ ya alaeze ụwa. Ụdị alaeze dị aṅaa ka ọ bụ? Ọ bụ nke okpukpe. Rịba ama otú akụkụ ụfọdụ nke akwụkwọ Mkpughe, bụ́ ndị na-ekwu banyere ya, si enyere anyị aka iru ná nkwubi okwu a.

Alaeze pụrụ ịbụ nke ọchịchị, nke azụmahịa, ma ọ bụ nke okpukpe. Nwanyị ahụ a na-akpọ Babilọn Ukwu ahụ abụghị alaeze nke ọchịchị n’ihi na Okwu Chineke kwuru na ya na “ndị eze nke ụwa,” ma ọ bụ ndị ọchịchị nke ụwa a, “kwara iko.” Ịkwa iko ya na-ezo aka ná njikọ nke dị n’etiti ya na ndị ọchịchị ụwa a, ọ na-egosikwa ihe mere e ji kpọọ ya “oké nwanyị akwụna.”—Mkpughe 17:1, 2; Jems 4:4.

Babilọn Ukwu ahụ apụghị ịbụ alaeze nke azụmahịa n’ihi na “ndị ahịa nke ụwa,” bụ́ ndị na-anọchi anya òtù azụmahịa, ga-eruru ya újú mgbe e bibiri ya. N’eziokwu, a kọwara ma ndị eze ma ndị azụmahịa dị ka ndị nọ “n’ebe dị anya” na-ekiri Babilọn Ukwu ahụ. (Mkpughe 18:3, 9, 10, 15-17) N’ihi ya, ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na Babilọn Ukwu ahụ abụghị alaeze nke ọchịchị ma ọ bụ nke azụmahịa, kama ọ bụ nke okpukpe.

Ihe ọzọ na-egosi na Babilọn Ukwu ahụ bụ okpukpe bụ okwu ahụ bụ́ na o sitere ná “mgbaasị” ya na-eduhie mba nile. (Mkpughe 18:23) Ebe ọ bụ na ụdị nile nke mgbaasị sitere n’aka ndị mmụọ ọjọọ, ọ bụghị ihe ijuanya na Bible na-akpọ Babilọn Ukwu ahụ “ebe obibi nke ndị mmụọ ọjọọ.” (Mkpughe 18:2; Deuterọnọmi 18:10-12) A kọwakwara alaeze a dị ka nke na-emegide nnọọ ezi okpukpe, na-akpagbu “ndị amụma” na “ndị nsọ.” (Mkpughe 18:24) N’eziokwu, Babilọn Ukwu ahụ kpọrọ nnọọ ezi okpukpe asị nke na ọ na-akpagbu “ndị àmà Jizọs” n’ụzọ kpụ ọkụ n’ọnụ, ọbụna na-egbu ha. (Mkpughe 17:6) N’ihi ya, n’ụzọ doro anya, nwanyị a a kpọrọ Babilọn Ukwu ahụ na-anọchi anya alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, bụ́ nke na-agụnye okpukpe nile na-emegide Jehova Chineke.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya