Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • re isi 33 p. 235-245
  • Ikpe Ajọ Nwanyị ahụ Na-akwa Iko Ikpe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikpe Ajọ Nwanyị ahụ Na-akwa Iko Ikpe
  • Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • ‘Ịkwa Iko’ nke Oge A
  • Ịnọkwasị n’Ọtụtụ Mmiri
  • Akwụna ahụ Na-anọkwasị n’Otu Anụ Ọhịa
  • Aha nke Bụ Ihe Omimi
  • Ibibi Babilọn Ukwu Ahụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
  • Okpukpe Ụgha Na-agbaga Ná Mbibi ya!
    Teta!—1996
  • Gịnị Bụ Anụ Ọhịa Na-acha Uhie Uhie E Kwuru Okwu Ya ná Mkpughe Isi 17?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
re isi 33 p. 235-245

Isi nke 33

Ikpe Ajọ Nwanyị ahụ Na-akwa Iko Ikpe

Ọhụụ 11—Mkpughe 17:1-18

Isiokwu: Babilọn Ukwu ahụ na-anọkwasị n’elu anụ ọhịa na-acha uhie uhie nke mesịrị chigharịa ma bibie ya

Oge mmezu ya: Malite na 1919 ruo oké mkpagbu ahụ

1. Gịnị ka otu n’ime mmụọ ozi asaa ahụ kpugheere Jọn?

A GHAGHỊ ịwụpụ ọnụma ezi omume Jehova ruo mmezu ya, ọkwa asaa ahụ nile! Mgbe mmụọ ozi nke isii wụpụrụ ọkwa nke ya n’ebe Babilọn oge ochie ahụ dị, o sere onyinyo ziri ezi nke iti Babilọn Ukwu ahụ ihe otiti ka ihe ndị na-emenụ ji ọsọ na-eru n’agha ikpeazụ nke Amagedọn. (Mkpughe 16:1, 12, 16) O yiri ka ọ̀ bụ otu mmụọ ozi ahụ na-ekpughe ugbu a ihe mere Jehova ga-eji mezuo ikpe ezi omume ya na otú ọ ga-esi mee ya. Ihe ọzọ Jọn hụrụ ma nụ tụrụ ya n’anya: “Otu mmụọ ozi n’etiti ndị mmụọ ozi asaa ahụ ndị nwere ọkwa asaa ahụ wee bịa, wee kpanyere m ụka, sị, Bịarị, m ga-egosi gị ikpe nke oké nwanyị ahụ na-akwa iko onye na-anọkwasị n’ọtụtụ mmiri; onye ya na ndị eze ụwa kwara iko, e mekwara ka mmanya ịkwa iko ya baa ndị bi n’ụwa n’anya.”—Mkpughe 17:1, 2.

2. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere na “oké nwanyị ahụ na-akwa iko” (a) abụghị Rom oge ochie? (b) abụghị oké azụmahịa? (ch) bụ òtù okpukpe?

2 “Oké nwanyị ahụ na-akwa iko”! N’ihi gịnị ka e ji kpọọ ya ajọ aha dị otú a? Ònye ka ọ bụ? Ụfọdụ ndị ekwuwo na akwụna ihe atụ nke a bụ Rom oge ochie. Ma Rom bụ ike ọchịchị. Akwụna nke a sooro ndị eze ụwa kwaa iko, ihe àmà gosikwara na nke a gụnyere ndị eze Rom. N’agbanyeghị nke a, mgbe e bibisịrị ya, a sịrị na “ndị eze ụwa” na-eru újú ọnwụ ya. N’ihi nke a, ọ pụghị ịbụ ike ọchịchị. (Mkpughe 18:9, 10) Ọzọkwa, ebe ndị ahịa nọ n’ụwa sokwa ruoro ya újú, ọ pụghị ise onyinyo oké azụmahịa. (Mkpughe 18:15, 16) Otú ọ dị, anyị na-agụ na ‘e jiri omume mgbaasị ya duhie mba nile.’ (Mkpughe 18:23) Nke a mere ka ọ pụta ìhè na oké akwụna ahụ aghaghị ịbụ njikọ okpukpe zuru ụwa ọnụ.

3. (a) N’ihi gịnị ka oké akwụna ahụ na-aghaghị ise onyinyo ihe karịrị Chọọchị Roman Katọlik ma ọ bụ ọbụna Krisendọm nile? (b) Ozizi ndị dị aṅaa nke Babilọn ka a na-ahụ n’ihe ka ọtụtụ n’okpukpe ndị Ọwụwa Anyanwụ Ụwa nakwa n’òtù dị iche iche nke Krisendọm? (ch) Gịnị ka onye kadinal Roman Katọlik bụ́ John Henry Newman kwetara banyere mmalite nke ọtụtụ ozizi, ememe, na omenala Krisendọm? (Lee nkọwa ala ala peji.)

3 Olee njikọ okpukpe nke ọ bụ? Ọ̀ bụ Chọọchị Roman Katọlik, dị ka ụfọdụ ndị nọgideworo na-ekwu? Ka ọ̀ bụ Krisendọm nile? Ee e, ọ ghaghị ibu ibu ọbụna karịa ndị a ma ọ bụrụ na ọ ga-eduhie mba nile. N’eziokwu, ọ bụ alaeze zuru ụwa ọnụ nke okpukpe ụgha. Mmalite ya n’akụkọ ihe omimi nile nke Babilọn pụtara ìhè n’ihi na ọtụtụ ozizi na omenala ndị Babilọn jupụtara n’okpukpe nile dị n’ụwa. Dị ka ihe atụ, ihe ka ọtụtụ n’okpukpe ndị Ọwụwa Anyanwụ ụwa nakwa òtù dị iche iche nke Krisendọm kwere n’anwụghị anwụ nke mkpụrụ obi mmadụ, n’ịta ahụhụ na hell, nakwa na chi atọ n’ime otu. Okpukpe ụgha, nke a malitere ihe karịrị 4,000 afọ gara aga n’obodo oge ochie ahụ bụ́ Babilọn, aghọwo oké ihe nke oge a nke e nyere aha ziri ezi, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ.a Otú ọ dị, n’ihi gịnị ka e ji jiri ajọ aha ahụ bụ́ “oké nwanyị ahụ na-akwa iko” kọwaa ya?

4. (a) N’ụzọ dịgasị aṅaa ka Israel oge ochie si kwaa iko? (b) N’ụzọ dị aṅaa pụtara ìhè ka Babilọn Ukwu ahụ siworo kwaa iko?

4 Babilọn (ma ọ bụ Bebel, nke pụtara “Ọgba Aghara”) bịara dị nnọọ ukwuu n’oge Nebukadneza. Ọ bụ isi obodo okpukpe na nke ọchịchị, nke nwere ihe karịrị otu puku ụlọ nsọ dị iche iche na ụlọ ekpere dị iche iche. Usoro ndị nchụàjà ya nwere ike dị ukwuu. Ọ bụ ezie na ọ dịwo anya kemgbe Babilọn na-abụkwaghị ike ọchịchị nke ụwa, Babilọn Ukwu ahụ nke okpukpe ka nọgidere na-adị ndụ, n’ịgbasokwa ụkpụrụ oge ochie ahụ, ọ ka na-achọ inwe mmetụta ma na-eduzi ihe ndị ọchịchị na-eme. Ma, Chineke ọ̀ na-akwado okpukpe itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị? N’Akwụkwọ Nsọ Hibru, e kwuru na Israel kwara iko mgbe o tinyere aka n’ofufe ụgha na mgbe o sooro mba dị iche iche mee nkwekọrịta kama ịtụkwasị Jehova obi. (Jeremaịa 3:6, 8, 9; Ezikiel 16:28-30) Babilọn Ukwu ahụ na-akwakwa iko. N’ụzọ pụtara nnọọ ìhè, o mewo ihe nile ọ bụla o chere na ọ dị mkpa ka o mee ka o wee nweta ike na mmetụta n’ahụ ndị eze na-achị achị n’elu ala.—1 Timoti 4:1.

5. (a) Ọnọdụ dị aṅaa ka ndị ndú okpukpe na-enwe mmasị na ya? (b) N’ihi gịnị ka ọchịchọ ịbụ onye a ma ama n’ụwa ji bụrụ ihe megidere okwu Jisọs Kraịst kpọmkwem?

5 Taa, ndị ndú okpukpe na-azọ ọkwá ọchịchị dị elu mgbe mgbe, ná mba ụfọdụkwa, ha na-ekere òkè n’ọchịchị, ọbụna na-eji ọkwá dị ka ndị minista. N’afọ 1988, ndị ndú okpukpe Protestant abụọ a ma ama so ná ndị zọrọ ọkwá president na United States. Ndị ndú nọ na Babilọn Ukwu ahụ nwere mmasị n’ịbụ ndị a ma ama; a na-ahụkarị foto ha n’usoro mgbasa ozi ọha mgbe ha na ndị ọchịchị na-enwe nzukọ. N’ụzọ megidere nke ahụ, Jisọs jụrụ itinye aka na ọchịchị wee kwuo banyere ndị na-eso ụzọ ya, sị: “Ha esiteghị n’ụwa, dị ka mụ onwe m na-esiteghị n’ụwa.”—Jọn 6:15; 17:16; Matiu 4:8-10; leekwa Jemes 4:4.

‘Ịkwa Iko’ nke Oge A

6, 7. (a) Olee ụzọ òtù Nazi Party nke Hitler si bata n’ọchịchị na Germany? (b) Olee ụzọ nkwekọrịta ahụ Vatican sooro Nazi Germany mee si nyere Hitler aka n’ọchịchọ ya ịchị ụwa nile?

6 Site na ya itinye aka n’ọchịchị, oké akwụna ahụ ewetaworo agbụrụ mmadụ iru újú dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, tụlee ihe ndị nyere aka ime ka Hitler banye n’ọkwá ọchịchị na Germany—akụkọ ọjọọ nke ụfọdụ ndị ga-achọ iwepụ n’akwụkwọ akụkọ ihe mere eme. Na May 1924, òtù Nazi Party nwere ọnọdụ 32 n’ụlọ nzukọ ndị ome iwu bụ́ Reichstag nke Germany. Ka ọ na-erule na May 1928, ọ dalatawo ruo n’ịbụ ọnọdụ 12. Otú ọ dị, Oké Ndakpọ Akụ na Ụba ahụ rikpuru ụwa nile n’afọ 1930; mgbe ọ gasịrị, ndị òtù Nazi nwere nlọghachi pụtara ìhè, na-enweta 230 n’ime ọnọdụ 608 ndị a zọrọ ná ntụliaka ọchịchị e mere na Germany na July 1932. N’oge na-adịghị anya, onye bụbu onyeisi ala bụ́ Franz von Papen, bụ́ Papal Knight, gbataara ndị òtù Nazi ọsọ enyemaka. Dị ka ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme si kwuo, von Papen tụrụ anya Alaeze Rom Dị Nsọ ọhụrụ. Oge dị mkpirikpi ọ nọrọ dị ka onyeisi ala akụwo afọ n’ala, ugbu a o nwekwara olileanya inweta ike ọchịchị site n’aka ndị òtù Nazi. Na January 1933, o nwetaworo Hitler nkwado ndị isi ụlọ ọrụ mmepụta ihe, sitekwa n’omume aghụghọ ọ hụrụ na e mere Hitler onyeisi ala Germany na January 30, 1933. E mere ya onwe ya onye na-esote onyeisi ala, Hitler jikwara ya mee ihe inweta nkwado nke akụkụ Germany bụ́ nke ndị Katọlik. N’ime ọnwa abụọ o ji banye n’ọchịchị, Hitler mechiri nzukọ ndị ome iwu, duje ọtụtụ puku ndị ndú òtù ndị na-emegide ya n’ogige ịta ahụhụ, wee malite mkpọsa pụtara ìhè nke imegide ndị Juu.

7 Na July 20, 1933, e gosipụtara mmasị Vatican nwere n’ike na-aba ụba nke òtù Nazi mgbe Cardinal Pacelli (onye mesịrị ghọọ Pope Pius nke Iri na Abụọ) bịanyere aka n’otu nkwekọrịta na Rom nke dị n’etiti Vatican na Nazi Germany. Von Papen bịanyere aka n’akwụkwọ ahụ dị ka onye nnọchianya Hitler, Pacelli nọkwara n’ebe ahụ nye von Papen oké ihe ùgwù ahụ ndị popu na-enye nke bụ́ ọkwá Grand Cross of the Order of Pius.b N’akwụkwọ ya bụ́ Satan in Top Hat, Tibor Koeves dere ihe banyere nke a, na-asị: “Nkwekọrịta ahụ bụụrụ Hitler oké mmeri. O nyere ya ezi nkwado mbụ o nwetara site n’ebe na-abụghị mba nke aka ya, nke a bụkwa site n’ebe dị nnọọ elu.” Nkwekọrịta ahụ kwuru ka Vatican kwụsị ịkwado òtù Catholic Center Party nke Germany, wee si otú a na-akwado “ọchịchị o kwusịa ọ gwụ”c nke nanị otu òtù ọchịchị nke Hitler. N’ịga n’ihu, akụkụ ya nke 14 kwuru, sị: “A ga na-eme nhọpụta nke ndị achịbishọp, bishọp, na ndị ọzọ ji ọkwá dị otú ahụ nanị mgbe onye gọvanọ, nke Ọchịchị obodo a họpụtara, chọpụtasịworo na e nweghị ihe ịrụ ụka ọ bụla banyere ya n’ihe banyere ọnọdụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị n’ebe ahụ.” N’ọgwụgwụ afọ 1933 (nke Pope Pius nke Iri na Otu kpọsara dị ka “Afọ Dị Nsọ”), nkwado ndị Vatican aghọwo ihe bụ́ isi n’ọchịchọ Hitler nwere maka ọchịchị ụwa.

8, 9. (a) Olee ụzọ Vatican nakwa Chọọchị Katọlik na ndị ndú ya si meghachi omume n’ọchịchị aka ike Nazi? (b) Nkwupụta okwu dị aṅaa ka ndị bishọp Katọlik nọ na Germany kwuru ná mmalite Agha Ụwa nke Abụọ? (ch) Gịnị ka mmekọrịta okpukpe na ọchịchị rụpụtaworo?

8 Ọ bụ ezie na ndị ụkọchukwu na ndị nọn ole na ole kwugidere arụrụala nile nke Hitler—wee taakwa ahụhụ n’ihi ya—Vatican, tinyere Chọọchị Katọlik na ìgwè ndị ụkọchukwu ya nyere ọchịchị aka ike ndị Nazi ahụ nkwado n’ụzọ pụtara ìhè ma ọ bụ n’ụzọ na-apụtachaghị ìhè, bụ́ nke ha lere anya dị ka ihe mgbochi megide ọganihu ndị kọmunist n’ụwa. Ebe ọnọdụ dịịrị ya mma na Vatican, Pope Pius nke Iri na Abụọ kwere ka Oké Mgbukpọ ndị Juu ahụ na mkpagbu obi ọjọọ megide Ndịàmà Jehova na ndị ọzọ na-aga n’ihu n’enwetaghị nkatọ ọ bụla. Ọ bụ omume ihu abụọ na Pope John Paul nke Abụọ, mgbe o jere Germany na May 1987, ga-aja otu onye ụkọchukwu nwere obi eziokwu mma n’ihi imegide ndị Nazi. Gịnị ka ọtụtụ puku ndị ụkọchukwu Germany ndị ọzọ nọ na-eme n’oge ọchịchị nchịgbu nke Hitler? Otu akwụkwọ ozi nke ndị bishọp Katọlik nọ na Germany dere na September 1939 mgbe Agha Ụwa nke Abụọ na-amalite na-enye nkọwa ụfọdụ banyere isi ihe nke a. Ọ na-agụ n’otu akụkụ, sị: “N’oge hour nke a dị oké mkpa, anyị na-adụ ndị Katọlik anyị bụ́ ndị agha ọdụ ka ha jezuo ozi ha ná nrubeisi nye Onye ndú ahụ, ka ha dịrịkwa njikere iji onwe ha chụọ àjà. Anyị na-arịọ Ndị Kwere Ekwe ka ha sonye n’ikpesi ekpere ike ka Chineke duzie agha nke a ruo ná mmeri a gọziri agọzi.”

9 Omume dị otú a nke okpukpe Katọlik na-enye ihe atụ nke ụdị ịkwa iko okpukpe tinyeworo aka na ya n’ime 4,000 afọ gara aga n’ịchọ inweta ihu ọma ndị ọchịchị Obodo ka ha wee nweta ike na uru. Mmekọrịta okpukpe na ọchịchị dị otú a akpaliwo agha, mkpagbu, na nhụjuanya ụmụ mmadụ n’ókè dị ukwuu. Lee ka ọ ga-esi nye ihe a kpọrọ mmadụ obi ụtọ ịmara na ikpe ọmụma Jehova megide oké akwụna ahụ adịwo nso. Ka e mezuokwa ya ngwa ngwa!

Ịnọkwasị n’Ọtụtụ Mmiri

10. Gịnị bụ “ọtụtụ mmiri” ahụ nke Babilọn Ukwu ahụ na-atụ anya inweta nchebe site n’aka ya, gịnịkwa na-eme ha ugbu a?

10 Babilọn oge ochie nọkwasịrị n’ọtụtụ mmiri—Osimiri Yufretis na ọtụtụ ọwa mmiri. Ndị a bụ ihe nchebe nye ya, bụrụkwa ụzọ azụmahịa nke na-ewetara ya akụ na ụba, ruo mgbe ha nile takọsịrị n’otu anyasị. (Jeremaịa 50:38; 51:9, 12, 13) Babilọn Ukwu ahụ na-atụkwa anya ka “ọtụtụ mmiri” chebe ya, wetakwara ya akụ na ụba. Mmiri ihe atụ ndị a bụ “ndị dị iche iche, na ìgwè mmadụ, na mba dị iche iche, na asụsụ dị iche iche,” ya bụ, ọtụtụ puku nde ụmụ mmadụ ndị ọ nọworo na-achị, ndị o sikwa n’aka ha na-enweta nkwado n’ụzọ onwunwe. Ma mmiri ndị a na-atakọsịkwa, ma ọ bụ na-anapụ ya nkwado ha.—Mkpughe 17:15; tụlee Abụ Ọma 18:4; Aịsaịa 8:7.

11. (a) Olee ụzọ Babilọn oge ochie si ‘mee ka mmanya baa ụwa dum n’anya’? (b) Olee ụzọ Babilọn Ukwu ahụ siworo ‘mee ka mmanya baa ụwa nile n’anya’?

11 Ọzọkwa, a kọwara Babilọn oge ochie dị ka ‘iko ọlaedo nke dị n’aka Jehova, nke na-eme ka ụwa nile ṅụbiga mmanya ókè.’ (Jeremaịa 51:7) Babilọn oge ochie manyere mba ndị agbata obi ya ịnara ngosipụta iwe Jehova mgbe o meriri ha n’agha, na-eme ka ike gwụsịa ha dị ka ndị ikom ṅụbigara mmanya ókè. N’ọnọdụ nke ahụ, ọ bụ ihe ọrụ dị n’aka Jehova. Babilọn Ukwu ahụ enwewokwa ọtụtụ mmeri ruo n’ókè ịbụ alaeze zuru ụwa ọnụ. Ma o doro anya na ọ bụghị ihe ọrụ Chineke ji na-eme ihe. Kama, o jeworo “ndị eze ụwa” ozi, bụ́ ndị ya na ha na-akwa iko n’ụzọ okpukpe. O mewo ihe na-atọ ndị eze ndị a ụtọ site n’iji ozizi ụgha ya nile na ihe omume ndị na-eduba n’ịbụ ohu na-eme ka ike gwụsịa ụmụ mmadụ, “ndị bi n’ụwa,” dị ka ndị ikom ṅụbigara mmanya ókè, ndị na-ekwenyere ndị ọchịchị ha n’ihe ọ bụla.

12. (a) Olee ụzọ otu akụkụ nke Babilọn Ukwu ahụ dị na Japan si kpata oké mwụfu ọbara n’Agha Ụwa nke Abụọ? (b) Olee ụzọ “mmiri” ndị na-akwado Babilọn Ukwu ahụ si takọsịa na Japan, gịnịkwa si n’ime ya pụta?

12 Japan nke ndị Shinto bụ ihe atụ pụtara ìhè banyere nke a. Onye agha Japan nke e megharịworo anya na-ewe ya dị ka ihe ùgwù kasị elu ịnwụrụ onyeeze ọnwụ—bụ́ chi Shinto kasị ukwuu. N’oge Agha Ụwa nke Abụọ, e gburu ihe dị ka 1,500,000 ndị agha Japan n’ihu agha; ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ha nile na-ele ịchịliri ndị ọzọ aka elu anya dị ka ihe ihere. Ma n’ihi mmeri e meriri Japan, a manyere Eze Hirohito ikwu na ya abụkwaghị chi. Nke a kpatara ntakọ pụtara ìhè nke “mmiri” ndị na-akwado akụkụ Shinto nke Babilọn Ukwu ahụ—ewo, nke a mere mgbe okpukpe Shinto kwadosịworo mwụfu nke ọbara dị ukwuu n’ọgbọ agha nke ógbè Pacific! Mbelata nke mmetụta okpukpe Shinto nwere emepewokwara ihe karịrị 200,000 ndị Japan ụzọ n’afọ ndị na-adịbeghị anya gara aga, nke ihe ka ọtụtụ n’ime ha bụbu ndị okpukpe Shinto na ndị okpukpe Buddha, ịghọ ndị ozi raara onwe ha nye, ndị e mekwara baptism, nke Eze Onyenwe anyị Jehova.

Akwụna ahụ Na-anọkwasị n’Otu Anụ Ọhịa

13. Olee ihe dị ịtụnanya nke Jọn hụrụ mgbe mmụọ ozi ahụ buuru ya n’ike nke mmụọ nsọ banye n’ọhịa?

13 Gịnị ọzọ ka amụma ahụ na-ekpughe banyere oké akwụna ahụ na ihe ga-eme ya? Dị ka Jọn na-akọ ugbu a, a hụrụ ihe nkiri ọzọ gbara ọkpụrụkpụ: “O [mmụọ ozi ahụ] wee bupụ m baa n’ọhịa n’ime mmụọ nsọ: m wee hụ nwanyị ka ọ na-anọkwasị n’anụ ọhịa na-acha uhie uhie, nke nwere aha dị iche iche jupụtara ná nkwulu Chineke, nweekwa isi asaa na mpi iri.”—Mkpughe 17:3.

14. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị na e buuru Jọn banye n’ọhịa?

14 N’ihi gịnị ka e ji buru Jọn baa n’ọhịa? Otu amụma mbibi e buru tupu oge a megide Babilọn oge ochie ka a kọwara dị ka nke bụ́ megide “ọzara nke oké osimiri.” (Aịsaịa 21:1, 9) Nke a nyere ịdọ aka ná ntị nke bụ́ na n’agbanyeghị mmiri nile na-echedo ya, Babilọn oge ochie gaje ịghọ ebe tọgbọrọ n’efu nke ndụ na-adịghị. Ya mere, o kwesịrị ekwesị na a ga-eburu Jọn n’ọhụụ ya baa n’ọzara ịhụ ihe ga-eme Babilọn Ukwu ahụ. Ọ gajekwa ịghọ ebe tọgbọrọ n’efu nke ihe ọ bụla na-adịghị. (Mkpughe 18:19, 22, 23) Ma, ihe Jọn hụrụ n’ebe ahụ tụrụ ya n’anya. Oké akwụna ahụ anọghị nanị ya! Ọ na-anọkwasị n’otu ajọ anụ ọhịa!

15. Ọdịiche dị aṅaa ka e nwere n’etiti anụ ọhịa nke Mkpughe 13:1 na nke ahụ dị ná Mkpughe 17:3?

15 Anụ ọhịa nke a nwere isi asaa na mpi iri. N’ihi nke a, ya na anụ ọhịa ahụ nke Jọn hụrụ na mbụ ọ̀ bụ otu ihe ahụ, bụ́ nke nwekwara isi asaa na mpi iri? (Mkpughe 13:1) Ee e, e nwere ihe ndị dị iche. Anụ ọhịa nke a na-acha uhie uhie, n’eyighịkwa anụ ọhịa nke mbụ ahụ, e kwughị na o nwere okpueze dị iche iche. Kama inwe aha ndị jupụtara ná nkwulu Chineke nanị n’isi asaa ya, o “nwere aha dị iche iche jupụtara ná nkwulu Chineke.” Ma, a ghaghị inwe njikọ n’etiti anụ ọhịa ọhụrụ nke a na nke mbụ ahụ; myirịta dị n’etiti ha dị ukwuu nke na ọ gaghị abụ ihe ndabara nkịtị.

16. Gịnị bụ anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie, gịnịkwa ka e kwuworo banyere nzube ya?

16 N’ihi ya, gịnị bụ anụ ọhịa ọhụrụ nke a na-acha uhie uhie? Ọ ghaghị ịbụ onyinyo nke anụ ọhịa ahụ, nke e guzobere site ná nkwado nke anụ ọhịa Anglo-America ahụ nke nwere mpi abụọ yiri nke nwa atụrụ. Mgbe e mesịrị ihe oyiyi ahụ, e kwere ka anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ nye ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ ume ndụ. (Mkpughe 13:14, 15) Ugbu a, Jọn na-ahụ anụ ọhịa ahụ nke dị ndụ, na-ekukwa ume. O sere onyinyo òtù League of Nations nke anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ guzobere n’afọ 1920. President Wilson nke mba U.S. nwere olileanya na òtù League ahụ “ga-abụ ebe a ga-anọ na-ahụ na mmadụ nile nwetara ikpe ziri ezi, hichapụkwa ihe iyi egwu nke agha ruo mgbe ebighị ebi.” Mgbe a kpọliteghachiri ya n’ọnwụ n’oge a lụsịrị agha ụwa nke abụọ dị ka òtù United Nations, nzube ya e dere ede bụ “ijigide udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke mba nile.”

17. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka anụ ọhịa ihe atụ ahụ na-acha uhie uhie si jupụta n’aha nkwulu Chineke? (b) Ònye na-anọkwasị anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie? (ch) Olee otú okpukpe Babilọn si jikọta onwe ya n’òtù League of Nations ahụ na nke nọchiri ya site ná mmalite?

17 N’ụzọ dị aṅaa ka anụ ọhịa ihe atụ nke a si jupụta n’aha nkwulu Chineke? Ọ bụ n’ihi na ụmụ mmadụ eguzobewo arụsị nke a jikọtara ọtụtụ mba dị ka ihe e ji dochie anya Alaeze Chineke—iji mezuo ihe Chineke kwuru na ọ bụ Alaeze ya nanị pụrụ imezu. (Daniel 2:44; Matiu 12:18, 21) Ma, ihe kwesịrị ịrịba ama banyere ọhụụ Jọn bụ na Babilọn Ukwu ahụ na-anọkwasị n’elu anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie. N’imezu amụma ahụ, okpukpe Babilọn, karịsịa Krisendọm, ejikọtawo onwe ha n’òtù League of Nations ahụ na nke nọchiri anya ya. Laarịị azụ na December 18, 1918, òtù ahụ nke a maara ugbu a dị ka òtù National Council of the Churches of Christ in America nabatara otu nkwupụta okwu nke kwuru n’otu akụkụ, sị: “Òtù League ahụ abụghị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nkịtị e mere iji mee ka ihe dịrị ụmụ mmadụ mfe; kama ọ bụ ngosipụta nke Alaeze Chineke n’elu ala. . . . Chọọchị pụrụ inye mmụọ nke ihu ọma, òtù League of Nations apụghịkwa ịdịgide ma ọ bụrụ na o nweghị ya. . . . Òtù League of Nations ahụ gbanyere mkpọrọgwụ n’Oziọma ahụ. Dị ka Oziọma ahụ, nzube ya bụ ‘udo n’elu ala, ihu ọma nye ụmụ mmadụ.’”

18. Olee otú ndị ndú Krisendọm si gosi nkwado ha nye òtù League of Nations ahụ?

18 Na January 2, 1919, akwụkwọ akụkọ San Francisco Chronicle buru isiokwu dị n’ihu peji nke bụ́: “Popu Arịọ Ka A Nabata League of Nations nke Wilson.” N’October 16, 1919, e nyere ụlọ nzukọ Senate nke mba U.S. akwụkwọ arịrịọ nke 14,450 ndị ụkọchukwu nke òtù okpukpe ndị bụ́ isi bịanyere aka na ya, na-arịọ nzukọ ahụ “ka ọ kwadoo nkwekọrịta udo nke Paris ahụ, nke gụnyere ọgbụgba ndụ òtù mba nile ahụ.” Ọ bụ ezie na ụlọ nzukọ Senate nke mba U.S. akwadoghị nkwekọrịta ahụ, ndị ndú Krisendọm nọgidere na-eme mgbasa ozi iji kwadoo òtù League ahụ. Oleekwa otú e si guzobe òtù League ahụ? Otu akụkọ e sitere Switzerland zipụ, nke akara ụbọchị ya bụ November 15, 1920, na-agụ, sị: “A mara ọkwa mmeghe nke nnọkọ mbụ nke òtù League of Nations n’elekere anya iri na otu nke ụtụtụ taa site n’ịkụ mgbịrịmgba chọọchị nile dị na Geneva.”

19. Mgbe anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie pụtara, gịnị ka òtù Jọn ahụ mere?

19 Òtù Jọn ahụ, bụ́ nanị otu òtù dị n’elu ala nke ji ịnụ ọkụ n’obi nabata Alaeze Mesaịa ahụ na-abịa abịa, hà sonyeere Krisendọm n’ịsọpụrụ anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie? Ọ dịghị ma ọlị! Na Sunday, September 7, 1919, ná mgbakọ ahụ ndị Jehova nwere na Cedar Point, Ohio, e kwuru okwu ihu ọha nke isiokwu ya bụ “Olileanya Dịịrị Ihe A Kpọrọ Mmadụ Nọ ná Mkpagbu.” N’ụbọchị na-eso ya, Star-Journal nke Sandusky kọrọ na J. F. Rutherford, mgbe ọ na-agwa ihe chọrọ iru 7,000 mmadụ okwu, “kwuru na iwe Onyenwe anyị aghaghị ịbịakwasị òtù League ahụ . . . n’ihi na ndị ndú okpukpe—nke ndị Katọlik na Protestant—ndị na-azọrọ na ha bụ ndị nnọchianya Chineke, agbakụtawo atụmatụ ya azụ ma kwadoo òtù League of Nations ahụ, na-eto ya dị ka ngosipụta ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke alaeze Kraịst n’elu ala.”

20. N’ihi gịnị ka o ji bụrụ nkwulu ndị ndú okpukpe ito òtù League of Nations dị ka “ngosipụta nke Alaeze Chineke n’elu ala”?

20 Oké ọdịda nke òtù League of Nations ahụ kwesịrị igosiworị ndị ndú okpukpe na òtù dị otú ahụ ndị mmadụ guzobere abụghị akụkụ ọ bụla nke Alaeze Chineke n’elu ala. Lee nnọọ oké nkwulu ọ bụ ime nzọrọ dị otú ahụ! O mere ka o yie ka à ga-asị na Chineke tinyere aka n’iguzobe oké ihe tọgbọrọ n’efu nke òtù League mesịrị bụrụ. N’ihe banyere Chineke, “ihe zuru okè ka ọrụ ya bụ.” Alaeze eluigwe nke Jehova n’okpuru Kraịst—ọ bụghị nchịkọta ndị ọchịchị na-eserịta okwu, nke ọtụtụ n’ime ha bụ ndị na-ekweghị na Chineke dị—bụ ụzọ ọ ga-esi webata udo wee hụkwa na e mezuru uche ya n’elu ala dị ka a na-eme ya n’eluigwe.—Deuterọnọmi 32:4; Matiu 6:10.

21. Gịnị na-egosi na oké akwụna ahụ na-akwado, nweekwa mmasị n’ihe nọchiri anya òtù League ahụ, bụ́ United Nations?

21 Olee banyere nke nọchiri òtù League ahụ, bụ́ United Nations? Malite na mgbe e guzobere ya, oké akwụna ahụ anọkwasịwokwa n’elu òtù nke a, na-abụ nke e jikọtara ya na ya n’ụzọ pụtara ìhè, na-agbalịkwa iduzi ebe ọ na-eje. Dị ka ihe atụ, mgbe ọ gbara afọ 20 na June 1965, ndị nnọchianya Chọọchị Roman Katọlik na Chọọchị Eastern Orthodox, ha na ndị Protestant, ndị Juu, ndị Hindu, ndị okpukpe Buddha, na ndị Alakụba—ndị a sịrị na ha na-anọchite anya puku nde mmadụ abụọ ndị bi n’elu ala—zukọtara na San Francisco iji mee ememe nke na-egosi nkwado na mmasị ha nwere n’ebe òtù UN dị. Mgbe o letara òtù UN n’October 1965, Pope Paul nke Isii kọwara ya dị ka “òtù mba nile kasị ukwuu” wee kwuokwa, sị: “Ndị nile nke elu ala na-echigharịkwuru òtù United Nations dị ka olileanya ikpeazụ e nwere maka udo na ịdị n’otu.” Otu onye popu ọzọ bịara leta ya, bụ́ Pope John Paul nke Abụọ, mgbe ọ na-agwa òtù UN okwu n’October 1979, sịrị: “Enwere m olileanya na òtù United Nations ga-anọgide na-abụ ebe kasị elu a ga-esi nweta udo na ikpe ziri ezi.” Ọ bụ ihe dị ịrịba ama na popu ahụ akpọtụghị Jisọs Kraịst ma ọ bụ Alaeze Chineke aha n’okwu ya. Mgbe o jere leta United States na September 1987, dị ka The New York Times si kọọ ya, “John Paul kwuru ọtụtụ ihe banyere òkè dị mkpa òtù United Nations na-ekere n’ịkwalite . . . ‘ịdị n’otu ọhụrụ nke zuru ụwa ọnụ.’”

Aha nke Bụ Ihe Omimi

22. (a) Ụdị anụ ọhịa dị aṅaa ka oké akwụna ahụ họrọwooro ịnọkwasị? (b) Olee otú Jọn si kọwaa akwụna ihe atụ ahụ bụ́ Babilọn Ukwu ahụ?

22 N’isi nso, Jọn onyeozi gaje ịmata na ọ bụ anụ ọhịa jọgburu onwe ya ka oké akwụna ahụ họrọwooro ịnọkwasị n’elu ya. Ma, e bu ụzọ dọrọ uche ya gaa n’ebe Babilọn Ukwu ahụ n’onwe ya nọ. E ji ihe ndị dị oké ọnụ ahịa chọọ ya mma, ma lee ka o si bụrụ ihe arụ! “E gbokwasịwokwa nwanyị ahụ ákwà odo odo na ákwà uhie, e werewokwa ọlaedo na nkume dị oké ọnụ na pearl chọọ ya mma, o nwekwara iko ọlaedo n’aka ya nke jupụtara n’ihe arụ, bụ́ ihe nile na-adịghị ọcha nke ịkwa iko ya, e dekwasịkwararịị aha n’egedege ihu ya, bụ́ ihe omimi, Babilọn Ukwu ahụ, nne nke ndị na-akwa iko na nke ihe arụ nile nke ụwa. M wee hụ nwanyị ahụ ka ọbara ndị nsọ na ọbara ndị àmà Jisọs na-aba ya n’anya dị ka mmanya.”—Mkpughe 17:4-6a.

23. Gịnị bụ aha zuru ezu nke Babilọn Ukwu ahụ, gịnịkwa ka aha ahụ pụtara?

23 Dị ka a na-eme na Rom oge ochie, a maara akwụna nke a site n’aha nke dị n’egedege ihu ya.d Aha ahụ dị ogologo: “Babilọn Ukwu ahụ, nne nke ndị na-akwa iko na nke ihe arụ nile nke ụwa.” Aha ahụ bụ “ihe omimi,” nke e zoro isi ihe ọ pụtara ezo. Ma n’oge a kara aka nke Chineke, a gaje ịkọwa ihe omimi ahụ. N’eziokwu, mmụọ ozi ahụ nyere Jọn ihe ọmụma zuru ezu inyere ndị ohu Jehova aka taa ịghọta ihe aha nkọwa ahụ pụtara n’ụzọ zuru ezu. Anyị na-amata Babilọn Ukwu ahụ dị ka okpukpe ụgha nile. Ọ bụ “nne nke ndị na-akwa iko,” n’ihi na okpukpe ụgha nile dị n’ụwa n’otu n’otu, gụnyere ọtụtụ ịrọ òtù nke Krisendọm, yiri ụmụ ya ndị inyom, na-eṅomi ya n’ịkwa iko ime mmụọ. Ọ bụkwa nne nke “ihe arụ nile” n’ihi na ọ mụpụtawo ihe ndị rụrụ arụ dị ka ikpere arụsị, mgbaasị, ịgba afa, ịgụ kpakpando, ịgụ akara aka, iji mmadụ achụ àjà, ịgba akwụna ụlọ nsọ, ịṅụbiga mmanya ókè iji sọpụrụ chi ụgha dị iche iche, na omume ndị ọzọ rụrụ arụ.

24. N’ihi gịnị ka o ji kwesị ekwesị na Babilọn Ukwu ahụ na-eyi “ákwà odo odo na akwa uhie” na e jikwa “ọlaedo na nkume dị oké ọnụ na pearl chọọ ya mma”?

24 E gbokwasịrị Babilọn Ukwu ahụ “ákwà odo odo na ákwà uhie,” bụ́ ihe e ji mara ndị eze, e jikwa “ọlaedo na nkume dị oké ọnụ na pearl chọọ ya mma.” Lee ka o si kwesị ekwesị! Cheedị nnọọ echiche banyere ụlọ ndị dị ebube, ihe ọkpụkpụ na ihe osise ndị dị oké ọnụ ahịa, na ihe ndị ọzọ e jikọtara ha na okpukpe, tinyekwara ihe onwunwe na ego nke ngụkọta ha hiri nne nke ukwuu, nke okpukpe ụwa nke a chịkọtaworo. Ma ọ̀ dị na Vatican, ma ọ bụ n’alaeze nke ndị okwuchukwu TV nke hiwere isi na United States, ma ọ bụ n’ụlọ nsọ ndị a chọrọ mma nke ukwuu ndị dị n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa, Babilọn Ukwu ahụ achịkọtawo akụ dị ukwuu—mgbe ụfọdụ o funarịwokwa ya.

25. (a) Gịnị ka ihe ndị dị n’ime ‘iko ọlaedo ahụ jupụtara n’ihe arụ’ sere onyinyo ya? (b) N’echiche dị aṅaa ka mmanya na-egbu akwụna ihe atụ ahụ?

25 Ugbu a lee anya n’ihe akwụna ahụ ji n’aka ya. Jọn aghaghị ịkụjaworị mgbe ọ hụrụ nke a—iko ọlaedo “nke jupụtara n’ihe arụ, bụ́ ihe nile na-adịghị ọcha nke ịkwa iko ya”! Nke a bụ iko ahụ nke nwere “mmanya nke ọnụma nke ịkwa iko ya” nke o jiworo mee ka mmanya baa mba nile n’anya. (Mkpughe 14:8; 17:4) O yiri ihe dị oké ọnụ ọhịa n’elu, ma ihe dị n’ime ya bụ ihe arụ, ihe na-adịghị ọcha. (Tụlee Matiu 23:25, 26.) Ihe dị n’ime ya bụ omume na okwu ụgha nile rụrụ arụ nke oké akwụna ahụ jiworo rafuo mba nile wee weta ha n’okpuru ike nduzi ya. Ọbụna nke na-asọ oyi karị, Jọn hụrụ na akwụna ahụ n’onwe ya nọ ná mmanya ogbugbu site n’ọbara nke ndị ohu Chineke! N’eziokwu, anyị na-emesịa gụọ na “n’ime ya ka a hụrụ ọbara nke ndị amụma na nke ndị nsọ, na nke ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.” (Mkpughe 18:24) Lee nnọọ oké ikpe ọmụma ọbara nke a bụ!

26. Ihe àmà dị aṅaa ka e nwere banyere ikpe ọmụma ọbara nke dịkwasịrị Babilọn Ukwu ahụ?

26 N’ime ọtụtụ narị afọ gafeworonụ, alaeze ụwa nke okpukpe ụgha awụfuwo ọbara dị ukwuu. Dị ka ihe atụ, na Japan oge ochie, e mere ka ụlọ nsọ ndị dị na Kyoto ghọọ ebe e wusiri ike, ndị mọnk na-ebu agha, ndị na-akpọkukwa “aha nsọ nke Buddha,” burịtara agha ruo mgbe ọbara jupụtara n’okporo ụzọ ha. Na narị afọ nke 20, ndị ụkọchukwu Krisendọm sooro usuu ndị agha nke mba ha dị iche iche zọọ ije, ndị a gburịtakwara onwe ha, na-akpata ọnwụ nke ma ọ dịkarịa ala, otu narị nde mmadụ. N’October 1987, onye bụbu onye isi ala mba U.S. bụ Nixon kwuru, sị: “Narị afọ nke 20 nke a abụwo nke a kasị wụfuo ọbara n’ime ya n’akụkọ ihe mere eme. E gbuwo ọtụtụ mmadụ n’agha ndị a lụrụ na narị afọ nke a karịa n’agha nile a lụworo tupu narị afọ nke a amalite.” Chineke na-ewetara okpukpe nile nke ụwa ajọ ikpe ọmụma n’ihi òkè ha keere n’ihe a nile; Jehova na-akpọ “aka na-awụsi ọbara na-emeghị ihe ọjọọ” asị. (Ilu 6:16, 17) Tupu nke a, Jọn nụrụ oké olu sitere n’ebe ịchụàjà ahụ, sị: “Ruo olee mgbe, Onyenwe anyị, onye dị nsọ, bụrụkwa onye eziokwu, ka ị na-ekpeghị ikpe bọọkwa ọ́bọ̀ ọbara anyị n’isi ndị bi n’elu ụwa?” (Mkpughe 6:10) N’ụzọ dị ukwuu, ọ ga-emetụta Babilọn Ukwu ahụ, bụ́ nne nke ndị na-akwa iko na nke ihe arụ nile dị n’ụwa mgbe oge ruru maka ịza ajụjụ ahụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a N’igosi na ọ bụghị ndị kraịst malitere ọtụtụ ozizi, ememe, na omenala nke Krisendọm si n’ezi ofufe dapụ, onye kadinal Roman Katọlik na narị afọ nke 19 bụ́ John Henry Newman dere n’akwụkwọ ya bụ́ Essay on the Development of Christian Doctrine, sị: “Ojiji a na-eji ụlọ nsọ eme ihe, bụkwa ndị a na-arara nye ndị senti ụfọdụ kpọmkwem, werekwa alaka osisi chọọ ha mma n’oge ụfọdụ; insensi, oriọna, na kandụl; inye onyinye mgbe mmadụ si n’ọrịa gbakee; mmiri nsọ; ebe mgbaba; oge ezumike na oge dị iche iche n’afọ, iji kalenda eme ihe, ịkwụ n’ahịrị, ịgọzi ala ubi; uwe ndị ụkọchukwu, ịkpụcha isi onye na-aghọ ụkọchukwu, ọla alụmdi na nwunye, iche ihu n’Ọwụwa Anyanwụ, iyi ihe oyiyi ma e mesịa, ma eleghị anya ukwe ndị òtù chọọchị, na Kyrie Eleison ahụ [abụ ahụ bụ́ “Onyenwe Anyị, Mee Ebere”], malitechara n’aka ndị ọgọ mmụọ, e dokwara ha nsọ site n’ịnabata ha na Chọọchị.”

Kama ido ikpere arụsị dị otú ahụ nsọ, “Jehova Onye Pụrụ Ime Ihe Nile” na-adụ ndị Kraịst ọdụ, sị: “Sinụ n’etiti ha pụta, guzokwanụ iche, . . . unu emetụkwala ihe na-adịghị ọcha aka.”—2 Ndị Kọrint 6:14-18.

b Akwụkwọ akụkọ ihe mere eme nke William L. Shirer dere, bụ́ The Rise and Fall of the Third Reich kwuru na von Papen bụ “onye e sitere n’aka ya, karịa onye ọ bụla ọzọ nọ na Germany, mee ka Hitler bata n’ọkwá ọchịchị.” Na January 1933, onye bụbu onyeisi ala Germany bụ́ von Schleicher kwuru banyere von Papen, sị: “Ọ bụ ụdị onye nrafu nke Judas Iskarịọt bụ onye nsọ ma e jiri ya tụnyere ya.”

c Mgbe ọ na-agwa ndị College of Mondragone okwu na May 14, 1929, Pope Pius nke Iri na Otu kwuru na ya ga-adị njikere iso Ekwensu n’onwe ya kwurịta okwu ma ọ bụrụ na ọ ga-akpata ọdịmma nke ndị mmadụ.

d Tụlee okwu nke onye Rom na-ede akwụkwọ bụ́ Seneca gwara otu onye nchụàjà nwanyị na-ejehie ejehie (dị ka Swete hotara okwu ya): “Gị nwa agbọghọ, i guzo n’ụlọ nke a kpọkwasịrị aha ọjọọ . . . aha gị na-adịkwasịkwa n’egedege ihu gị; ị naara ego iji menye onwe gị ihere.”—Controv. i, 2.

Igbe dị na peeji nke 237]

Churchill Ekpughee ‘Ịkwa Iko’

N’akwụkwọ ya bụ́ The Gathering Storm (1948), Winston Churchill kọrọ na Hitler họpụtara Franz von Papen dị ka onye nnọchianya Germany na Vienna ka o wee “weda ma ọ bụ nweta nkwado nke ndị ndú ndọrọ ndọrọ ọchịchị ndị Austria.” Churchill hotara ihe onye nnọchianya mba U.S. nọ na Vienna kwuru banyere von Papen, sị: “N’igosipụta oké omume nke asọghị anya . . . Papen gara n’ihu ịgwa m na . . . ya bu n’uche iji ọmụma a maara ya dị ka ezi onye Katọlik mee ihe iji nwee mmetụta n’ebe ndị Austria dị ka Cardinal Innitzer nọ.”

Mgbe Austria chịlisịrị aka elu, usuu ndị agha Hitler wee zọrọkwa ije bata Vienna, Cardinal Innitzer nke ndị Katọlik nyere iwu ka chọọchị nile dị n’Austria tinye ọkọlọtọ swastika ahụ, na-akụ mgbịrịmgba, na-ekpekwara Adolf Hitler ekpere iji kwanyere ụbọchị ọmụmụ ya ùgwù.

Igbe/Foto dị na peeji nke 238]

‘EKPERE AGHA’ MAKA ỌCHỊCHỊ

N’okpuru isiokwu nke a, ihe odide a na-esonụ pụtara ná mbipụta mbụ nke The New York Times nke December 7, 1941:

“Ndị Bishọp Katọlik Nọ na Fulda Arịọ Maka Ngọzi na Mmeri . . . Nzukọ Ndị Bishọp Katọlik bụ́ ndị Germany mere na Fulda atụwo aro ka e webata ‘ekpere agha’ pụrụ iche, nke a ga na-agụ ná mmalite na ná mmechi nke nnọkọ ofufe nile. Ekpere ahụ na-akpọku Chineke ka o jiri mmeri gọzie ngwá agha ndị Germany, chebekwa ndụ na ahụ ike nke ndị agha nile. Ndị Bishọp ahụ gara n’ihu inye ndị ụkọchukwu Katọlik ndụmọdụ ka ha na-edebe, na-echetakwa ndị agha Germany ‘nke elu ala, ụgbọ mmiri na nke mbara igwe’ n’okwuchukwu pụrụ iche a na-ekwu n’ụbọchị Sunday, ya dịkarịa ala, otu ugbo n’ọnwa.”

E nwetara ihe odide a site ná mbipụta ndị ikpeazụ nke akwụkwọ akụkọ ahụ. December 7, 1941, bụ ụbọchị mgbe ndị nkwado Nazi Germany, bụ́ Japan, wakwasịrị ụgbọ mmiri U.S. dị na Pearl Harbor.

Igbe dị na peeji nke 244]

‘Aha Ndị Jupụtara ná Nkwulu’

Mgbe anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ guzobere òtù League of Nations ahụ mgbe Agha Ụwa nke Mbụ gasịrị, ndị okpukpe bụ́ enyi ya mere ihe ngwa ngwa iji nye ya nkwado n’ụzọ okpukpe. N’ihi nke a, òtù udo ọhụrụ ahụ “nwere aha dị iche iche jupụtara ná nkwulu Chineke.”

“Iso Ụzọ Kraịst pụrụ inye ya nkwado, bụ́ ike mkpali nke na-akwado òtù [mba nile] ahụ, wee mee ka nkwekọrịta ahụ ghara ịbụkwa nanị iberibe akwụkwọ efu ma mee ka ọ ghọọ ngwá ọrụ nke alaeze Chineke.”—The Christian Century, U.S.A., June 19, 1919, peji nke 15.

“Echiche nke iguzobe òtù League of Nations ahụ bụ iwebata echiche nke Alaeze Chineke dị ka ihe na-akpata ịdị mma n’etiti ndị bi n’elu ụwa bịa ná mmekọrịta mba na mba. . . . Ọ bụ ya ka ndị Kraịst nile na-ekpe ekpere maka ya mgbe ha na-asị, ‘Ka Alaeze gị bịa.’”—The Christian Century, U.S.A., September 25, 1919, peji nke 7.

“Ihe Jidesiri òtù League of Nations ahụ ike bụ Ọbara nke Kraịst.”—Dr. Frank Crane, onye ụkọchukwu ndị Protestant, U.S.A.

“Òtù [National] Council [of Congregational Churches] na-akwado Ọgbụgba Ndụ [nke òtù League of Nations ahụ] dị ka nanị ngwá ọrụ ọchịchị e nwere nke Mmụọ nke Jisọs Kraịst ga-eji nwee ike ịbụ nke e ji mee ihe n’ụzọ sara mbara n’ihe omume nke mba nile.”—The Congregationalist and Advance, U.S.A., November 6, 1919, peji nke 642.

“Nzukọ a na-akpọku ndị Methodist nile ka ha kwadoo ma kwalitekwa echiche nile [nke òtù League of Nations] dị ka e gosipụtara ha n’echiche nke Chineke bụ́ Nna na ụmụ Chineke nile bi n’elu ala.”—The Wesleyan Methodist Church, Britain.

“Mgbe anyị tụlere nzube nile, ihe nile a pụrụ imezu na mkpebi nile dị n’akwụkwọ nkwekọrịta nke a, anyị na-ahụ na ihe dị n’ime ya bụ isi ihe dị n’ozizi nile nke Jisọs Kraịst: Alaeze Chineke na ezi omume ya . . . Ọ bụghị ihe ọzọ ma ọ bụghị nke ahụ.”—Okwuchukwu nke Archbishop of Canterbury kwuru mgbe a na-emeghe nnọkọ òtù League of Nations Assembly na Geneva, December 3, 1922.

“Òtù League of Nations ná mba nke a nwere otu ikike ndị ahụ òtù ndị ozi ọ bụla na-ahụ maka ọdịmma mmadụ nwere, n’ihi na n’oge dị ugbu a, ọ bụ ngwá ọrụ kasị dị irè nke ọchịchị Kraịst dị ka Onyeisi udo n’etiti mba nile.”—Dr. Garvie, onye ụkọchukwu chọọchị Congregational, Britain.

[[Map dị na peeji 236]

Ozizi ụgha ndị e kwenyere na ha gburugburu ụwa malitere na Babilọn

Babilọn

Usoro chi atọ dị iche iche

Mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ mgbe mmadụ nwụrụ

Mgbaasị—iso “ndị nwụrụ anwụ” kwurịta okwu

Iji ihe oyiyi eme ihe n’ofufe

Ime ihe omume e ji emeda ndị mmụọ ọjọọ obi

Ọchịchị nke ndị ụkọchukwu dị oké ike

[Foto dị na peeji nke 239]

Babilọn oge ochie ahụ nọkwasịrị n’elu ọtụtụ mmiri

[Foto dị na peeji nke 239]

Taa, oké nwanyị ahụ na-akwa iko na-anọkwasịkwa “n’ọtụtụ mmiri”

[Foto dị na peeji nke 241]

Babilọn Ukwu ahụ na-anọkwasị n’elu anụ ọhịa jọgburu onwe ya

[Foto ndị dị na peeji nke 242]

Nwanyị okpukpe ahụ na-akwa iko esorowo ndị eze ụwa kwaa iko

[Foto ndị dị na peeji nke 245]

‘Ọbara ndị nsọ na-aba nwanyị ahụ n’anya’

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya