Isi nke 34
A Kọwawo Otu Ihe Omimi Dị Egwu
1. (a) Olee otú Jọn si meghachi omume mgbe ọ hụrụ oké nwanyị ahụ na-akwa iko na ihe ahụ na-atụ egwu nke ọ na-anọkwasị n’elu ya, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? (b) Olee ụzọ òtù Jọn ahụ si emeghachi omume taa ka ihe ndị na-emenụ na-emezu ọhụụ amụma ahụ?
GỊNỊ bụ mmeghachi omume Jọn mgbe ọ hụrụ oké nwanyị ahụ na-akwa iko na ihe ahụ dị egwu nke ọ na-anọkwasị n’elu ya? Ọ na-aza n’onwe ya, sị: “Mgbe m hụrụ ya o wee ju m anya nke ukwuu.” (Mkpughe 17:6b) Echiche mmadụ efu apụghị ichepụta ihe dị otú ahụ. Ma, lee nnọọ ka ọ nọ ebe ahụ—n’ime ime ọzara—nwanyị rụrụ arụ nke na-akwa iko ka ọ na-anọkwasị n’elu anụ ọhịa dị egwu nke na-acha uhie uhie! (Mkpughe 17:3) Ọ na-ejukwa òtù Jọn nke oge a anya nke ukwuu ka ọtụtụ ihe na-eme iji mezuo ọhụụ amụma nke a. A sị na ndị bi n’elu ụwa pụrụ ịhụ ya, ha ga-eti mkpu, sị, ‘Ọ dịkwa egwu!’ ndị ọchịchị ụwa ga-asịkwa, ‘Tụfịakwa!’ Ma ọhụụ ahụ na-aghọ ihe mere eme n’ụzọ dị ịtụnanya taa. Ndị Chineke ekereworị òkè n’ụzọ pụtara ìhè ná mmezu nke ọhụụ ahụ, nke a na-emesikwa ha obi ike na amụma ahụ ga-aga n’ihu ruo mmezu ya dị ebube.
2. (a) Ná nzaghachi nye ihe ijuanya Jọn nwere, gịnị ka mmụọ ozi ahụ gwara ya? (b) Gịnị ka e kpughewooro òtù Jọn ahụ, oleekwa ụzọ e siworo mee nke a?
2 Mmụọ ozi ahụ hụtara oké ihe ijuanya Jọn nọ na ya. Jọn gara n’ihu ịkọ, sị, “Mmụọ ozi ahụ wee sị m, N’ihi gịnị ka o juru gị anya? Mụ onwe m ga-agwa gị ihe omimi nke nwanyị ahụ, na nke anụ ọhịa ahụ nke na-eburu ya, nke nwere isi asaa ahụ na mpi iri ahụ.” (Mkpughe 17:7) Aa, mmụọ ozi ahụ gaje ịkọwa ihe omimi ahụ ugbu a! Ọ kọwaara Jọn ahụ egwu ji akụkụ dị iche iche nke ọhụụ ahụ na oké ihe omume ndị gaje iwere ọnọdụ n’isi nso. N’otu aka ahụ, mgbe ọ na-eje ozi n’okpuru nduzi nke ndị mmụọ ozi taa, e kpugheworo òtù Jọn ahụ nke mụ anya nghọta nke amụma ahụ. “Ọ́ bụghị Chineke nwe akụkọ isi nrọ nile?” Dị ka Josef ahụ kwesịrị ntụkwasị obi, anyị kwere na ọ bụ ya nwe ha. (Jenesis 40:8; tụlee Daniel 2:29, 30.) A pụrụ ikwu na e debewo ndị Chineke n’etiti ọgbọ ihe nkiri ka Jehova na-akọwara ha ihe ọhụụ ahụ pụtara na mmetụta o nwere ná ndụ ha. (Abụ Ọma 25:14) Kpọmkwem n’oge ya, o mewo ka ha ghọta ihe omimi nke nwanyị ahụ na nke anụ ọhịa ahụ.—Abụ Ọma 32:8.
3, 4. (a) Olee okwu ihu ọha N. H. Knorr kwuru n’afọ 1942, oleekwa ụzọ o si gosipụta ihe anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie bụ? (b) Okwu dị aṅaa nke mmụọ ozi ahụ gwara Jọn ka N. H. Knorr tụlere?
3 Malite na September 18 ruo 20, 1942, n’oge Agha Ụwa nke Abụọ kpụ ọkụ n’ọnụ, Ndịàmà Jehova nọ na United States mere Mgbakọ Ọchịchị Chineke nke Ụwa Ọhụrụ ha. E jiri eriri telifonu jikọta obodo bụ isi a nọrọ mee ya, bụ́ Cleveland, Ohio, na ihe karịrị 50 ebe ndị ọzọ a nọ mee mgbakọ, na-enwe ọnụ ọgụgụ kasị elu nke 129,699 ndị bịaranụ. Ebe o kwere omume n’ọnọdụ agha ndị ahụ, mgbakọ ndị ọzọ e nwere meghachiri usoro ihe omume ahụ gburugburu ụwa. N’oge ahụ, ọtụtụ ndị Jehova tụrụ anya na agha ahụ ga-amụba ruo n’ịghọ agha Chineke nke Amagedọn; n’ihi ya, isiokwu okwu ihu ọha ahụ, bụ́ “Udo—Ọ̀ Pụrụ Ịdịgide?,” kpaliri oké ịtụ anya ihe gaje ime. Olee nnọọ otú onyeisi oche ọhụrụ ahụ nke Watch Tower Society, bụ́ N. H. Knorr, pụrụ isi malite ikwu okwu banyere udo mgbe o yiri ka ọ bụ kpọmkwem ihe megidere ya na-eche mba nile ihu?a Ihe kpatara ya bụ na òtù Jọn ahụ ‘na-aṅabiga ntị ókè’ n’Okwu amụma Chineke.—Ndị Hibru 2:1; 2 Pita 1:19.
4 Nkọwa dị aṅaa ka okwu ahụ bụ́ “Udo—Ọ̀ Pụrụ Ịdịgide?” nyere banyere amụma ahụ? N’ime ka a mara nke ọma anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie nke dị ná Mkpughe 17:3 dị ka òtù League of Nations, N. H. Knorr gara n’ihu ịkọwa otú ihe siworo gaara ya, na-adabere n’ihe ndị na-esonụ mmụọ ozi ahụ gwara Jọn: “Anụ ọhịa ahụ nke ị hụrụ dịrị, ọ dịghịkwa ugbu a; ọ gajekwa isi n’abyss ahụ rịgopụta, na ịla n’iyi.”—Mkpughe 17:8a.
5. (a) Ò si aṅaa bụrụ na “anụ ọhịa ahụ . . . dịrị,” e mesịa “ọ dịghịkwa”? (b) Olee ụzọ N. H. Knorr si zaa ajụjụ ahụ bụ, “Òtù League ahụ ọ̀ ga-anọgide n’ime olulu?”
5 “Anụ ọhịa ahụ . . . dịrị.” Ee, ọ dịwo adị mbụ dị ka òtù League of Nations malite na January 10, 1920, gaa n’ihu, na-enwe mba 63 dị iche iche ndị so na ya n’otu mgbe ma ọ bụ na mgbe ọzọ. Ma, mgbe e mesịrị, Japan, Germany, na Itali sepụrụ aka na ya, a chụpụkwara mba bụbu Soviet Union site n’òtù League ahụ. Na September 1939, onye ọchịchị aka ike ndị Nazi nke Germany malitere Agha Ụwa nke Abụọ.b Ebe ọ na-enwebeghị ike ime ka e nwee udo n’elu ụwa, o yiri nnọọ ka à ga-asị na òtù League of Nations ahụ adanyewo n’ime abyss nke arụghị ọrụ. Ka ọ na-erule 1942, ọ ghọwo ihe a ga-asị na ọ dịburu adị. Ọ dịghị mgbe ọ bụla ọzọ tupu oge a ma ọ bụ mgbe ọ gasịrị—kama kpọmkwem n’oge ahụ dị mkpa—ka Jehova kọwaara ndị ya n’ozuzu ya, ihe ọhụụ ahụ pụtara! Ná Mgbakọ Ọchịchị Chineke nke Ụwa Ọhụrụ ahụ, N. H. Knorr pụrụ ikwupụta, n’ikwekọ n’amụma ahụ, na ‘anụ ọhịa ahụ adịghịkwa.’ Mgbe ahụ, ọ jụrụ ajụjụ ahụ bụ́, “Òtù League ahụ ọ̀ ga-anọgide n’ime olulu?” N’ihota okwu site ná Mkpughe 17:8, ọ zara, sị: “Njikọ nke mba ụwa dị iche iche ga-ebilite ọzọ.” Otú ahụ ka o mere kpọmkwem—n’ịkwado Okwu amụma Jehova!
Ịrịgopụta n’Abyss Ahụ
6. (a) Olee mgbe anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie si n’abyss ahụ rịgopụta, gịnị bụkwa aha ọhụrụ ya? (b) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ na òtù United Nations ahụ bụ n’ezie ntụteghachi nke anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie?
6 Anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie pụtara n’ezie site n’abyss ahụ. Na June 26, 1945, n’ememe oké mkpọtụ e mere na San Francisco, U.S.A., mba 50 dị iche iche kwekọrịtara ịnabata Akwụkwọ Iwu e ji guzobe òtù United Nations. Nzube òtù a bụ “ijigide udo na ịnọ ná ntụkwasị obi nke mba nile.” E nwere ọtụtụ myirịta dị n’etiti òtù League ahụ na òtù UN. Akwụkwọ The World Book Encyclopedia kwuru, sị: “N’ụzọ ụfọdụ, òtù UN ahụ yiri òtù League of Nations, bụ́ nke e guzobere mgbe Agha Ụwa nke Mbụ gasịrị . . . Ọtụtụ n’ime mba ndị so guzobe òtù UN sokwa ná ndị guzobere òtù League ahụ. Dị ka òtù League ahụ, e guzobere òtù UN iji nye aka mee ka udo dị n’etiti mba dị iche iche. Akụkụ ndị bụ́ isi nke òtù UN ahụ yikwara ndị nke òtù League ahụ.” Ya mere, òtù UN bụ n’ezie ntụteghachi nke anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie. Ihe karịrị mba 190 dị iche iche ndị nọ n’ime ya karịrị nnọọ 63 ndị nọ n’òtù League ahụ; ọ narawokwa ibu ọrụ ndị dị ukwuu karịa nke òtù ahụ bu ya ụzọ.
7. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka ndị bi n’elu ala siworo nwee ihe ijuanya mgbe ha na-ele anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie nke a tụteghachiri anya ọma? (b) Ihe mgbaru ọsọ dị aṅaa ka òtù UN ahụ na-enwebeghị ike iru, gịnịkwa ka odeakwụkwọ ukwu ya kwuru banyere nke a?
7 Ná mmalite, e kwupụtara oké olileanya dị iche iche maka òtù UN ahụ. Nke a bụ iji mezuo okwu mmụọ ozi ahụ bụ́: “Ọ ga-ejukwa ndị bi n’elu ụwa anya, bụ́ ndị a na-edeghị aha ha n’akwụkwọ nke ndụ ahụ site n’oge ịtọ ntọala ụwa, mgbe ha na-ele anụ ọhịa ahụ anya, na ọ dịrị, ọ dịghịkwa ugbu a, ọ ga-abịakwa.” (Mkpughe 17:8b) Ndị bi n’elu ụwa ejiriwo mmasị na-ekiri oké ihe oyiyi a, nke nwere nnukwute isi ụlọ ọrụ ya n’akụkụ Osimiri East dị na New York. Ma ezi udo na ịnọ ná ntụkwasị obi erubeghị òtù UN aka. N’ihe ka ukwuu n’ime narị afọ nke 20, ihe mere ka a nọgide na-enwe udo n’ụwa bụ iyi egwu nke “mkpochapụrịta e ji n’aka” (mutual assured destruction)—MAD, dị ka e si edebiri ya n’asụsụ Bekee—ịsọrịta mpi n’imepụta ngwá agha anọwokwa na-arị oké elu. Mgbe ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 40 nke mgbalị òtù United Nations na-eme gafeworo, onye odeakwụkwọ ukwu ya n’oge ahụ, bụ́ Javier Pérez de Cuéllar, kwara arịrị na 1985 wee kwuo, sị: “Anyị na-ebi n’ime ọgbọ ọzọ nke ndị na-anụbiga ọkụ n’obi ókè, ọ dịghịkwa ihe anyị maara anyị ga-eme banyere ya.”
8, 9. (a) N’ihi gịnị ka òtù UN na-enweghị azịza nye nsogbu nile nke ụwa, gịnị gajekwa ime ya n’oge na-adịghị anya dị ka iwu Chineke si dị? (b) N’ihi gịnị ka a na-edenyeghị aha ndị guzobere òtù UN ahụ na ndị ji mmasị na-ekiri ya “n’akwụkwọ nke ndụ” nke Chineke? (ch) Gịnị ka Alaeze Jehova ga-enwe ihe ịga nke ọma n’iguzobe?
8 Òtù UN enweghị azịza nye nsogbu ndị ahụ. Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Onye ahụ na-enye ihe a kpọrọ mmadụ ndụ abụghị onye na-enye òtù UN ndụ. Ndụ ya ga-adị mkpirikpi, n’ihi na dị ka iwu Chineke si dị, ‘ọ gaje ịla n’iyi.’ E denyeghị aha ndị guzobere òtù UN na ndị ji mmasị na-ekiri ya n’akwụkwọ nke ndụ nke Chineke. Olee otú ụmụ mmadụ na-emehie emehie, ndị na-anwụ anwụ, ndị ọtụtụ n’ime ha na-akwa aha Chineke emo, ga-esi mezuo site n’òtù UN ahụ ihe Jehova Chineke kwuworo na ya gaje imezu, ọ bụghị site n’aka ụmụ mmadụ, kama site n’aka Alaeze nke Kraịst ya?—Daniel 7:27; Mkpughe 11:15.
9 Òtù UN ahụ bụ n’ezie ihe nnọchianya na-ezighị ezi nke Alaeze Mesaịa nke Chineke, nke dị n’aka Onyeisi Udo ya, bụ́ Jisọs Kraịst—onye ịbụ onyeisi ya na-agaghị enwe ọgwụgwụ. (Aịsaịa 9:6, 7) Ọbụna ma a sị na òtù UN eguzobe udo nke na-adị nwa oge, n’oge na-adịghị anya, agha ga-etiwapụkwa ọzọ. Nke ahụ bụ ụzọ ndị mmadụ na-emehie emehie na-esi akpa àgwà. Ha “bụ ndị a na-edeghị aha ha n’akwụkwọ nke ndụ ahụ site n’oge ịtọ ntọala ụwa.” Alaeze Jehova nke dị n’aka Kraịst abụghị nanị na ọ ga-eguzobe udo n’elu ala ruo mgbe ebighị ebi kama, n’ihe ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs, ọ ga-akpọlite ndị nwụrụ anwụ, ma ndị ezi omume ma ndị ajọ omume ndị nọ ná ncheta nke Chineke. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Nke a gụnyere ndị nile nọgidesiri ike ná nrubeisi n’agbanyeghị mbuso agha nile nke Setan na mkpụrụ ya, na ndị ọzọ ndị ka gaje igosipụta onwe ha dị ka ndị na-erube isi. O doro anya na akwụkwọ nke ndụ nke Chineke agajeghị inwe aha ndị ahụ kwesiri olu ike na-akwado Babilọn Ukwu ahụ ma ọ bụ nke onye ọ bụla nọgidere na-efe anụ ọhịa ahụ ofufe n’ime ya.—Ọpụpụ 32:33; Abụ Ọma 86:8-10; Jọn 17:3; Mkpughe 16:2; 17:5.
Udo na Ịnọ ná Ntụkwasị Obi—Olileanya Na-enweghị Isi
10, 11. (a) Gịnị ka òtù UN kpọsara na 1986, gịnị bụkwa nzaghachi e nwere banyere ya? (b) “Ezinụlọ okpukpe” ole zukọtara n’Assisi, Itali, ikpe ekpere maka udo, Chineke ọ̀ na-azakwa ụdị ekpere ndị ahụ? Kọwaa.
10 Ná mgbalị o mere iji kwalite olileanya nke ụmụ mmadụ, òtù United Nations kpọsara 1986 ịbụ “Afọ Udo nke Mba Nile,” na-enwe isiokwu nke bụ “Iji Chebe Udo na Ọdịnihu nke Ihe A Kpọrọ Mmadụ.” A kpọkuru mba ndị na-eburịta agha ka ha chịsa ngwá agha ha, ma ọ dịghị ihe ọzọ ruo otu afọ. Gịnị bụ nzaghachi ha? Dị ka otu akụkọ a natara n’aka òtù International Peace Research Institute si kwuo, e gburu ihe ruru nde mmadụ ise n’ihi agha ndị a lụrụ na 1986 nanị! Ọ bụ ezie na e bipụtara mkpụrụ ego na stampụ ndị pụrụ iche iji cheta afọ ahụ, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná mba nile mere nanị ihe dị nta iji chụso udo n’afọ ahụ. N’agbanyeghị nke a, okpukpe nile nke ụwa—ndị ọ na-agụ agụụ mgbe nile inwe mmekọrịta dị mma n’etiti ha na òtù UN—mere ihe iji kpọsaa afọ ahụ n’ụzọ dị iche iche. Na January 1, 1986, Pope John Paul nke Abụọ jara ọrụ òtù UN ahụ mma wee rarakwa afọ ọhụrụ ahụ nye udo. N’October 27, ọ kpọkọtakwara ndị ndú nke ọtụtụ okpukpe ndị dị n’ụwa n’Assisi, Itali, ikpe ekpere maka udo.
11 Chineke ọ̀ na-aza ụdị ekpere ndị ahụ e kpere maka udo? N’ezie, olee Chineke nke ndị ndú okpukpe ndị ahụ na-ekpegara ekpere? Ọ bụrụ na ị jụọ ha, òtù nke ọ bụla ga-enye azịza dị iche. È nwere nchịkọta nke ọtụtụ nde chi dị iche iche ndị pụrụ ịnụ ma zaa ekpere ndị e kpere n’ọtụtụ ụzọ dị iche iche? Ọtụtụ n’ime ndị keere òkè na-efe chi Atọ n’Ime Otu nke Krisendọm.c Ndị okpukpe Buddha, Hindu, na ndị ọzọ kpere ekpere nye ọtụtụ chi a na-apụghị ịgụta ọnụ. Ná ngụkọta, “ezinụlọ okpukpe” 12 zukọtara n’ebe ahụ, na-enwe ndị nnọchianya pụtara ìhè dị ka Archbishop of Canterbury nke ndị Anglican, Dalai Lama nke ndị okpukpe Buddha, otu onye nlekọta nke otu ógbè chọọchị Russian Orthodox, onyeisi oche nke Òtù Ụlọ Chi Shinto ndị dị na Tokyo, ndị na-ekpere arụsị si Africa, na ndị American Indian abụọ ndị kpu okpu e tubesịrị abụba nnụnụ. Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ha bụ nnọọ ìgwè mmadụ mara mma ile anya, na-eme ka e gosi ha na TV nke ukwuu. Otu òtù kpere ekpere n’esepụghị aka ruo hour 12. (Tụlee Luk 20:45-47.) Ma, ọ̀ dị nke ọ bụla n’ekpere ndị ahụ gabigara igwe ojii ahụ mmiri rujuru nke dị n’elu ebe a nọ mee nzukọ ahụ? Ọ dịghị ma ọlị, n’ihi ihe ndị a sonụ:
12. Gịnị bụ ihe ndị mere Chineke azaghị ekpere ndị ahụ ndị ndú okpukpe ụwa kpere maka udo?
12 N’ụzọ na-eyighị ndị ahụ ‘na-ejegharị n’aha Jehova,’ ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ndị okpukpe ahụ na-ekpegara Jehova ekpere, bụ́ Chineke ahụ dị ndụ, onye aha ya pụtara ihe dị ka 7,000 ugboro n’ime ihe odide mbụ nke Bible. (Maịka 4:5; Aịsaịa 42:8, 12)d Dị ka otu òtù, ha abịakwuteghị Chineke n’aha Jisọs, ọbụna na ihe ka ọtụtụ n’ime ha ekwenyeghị na Jisọs Kraịst. (Jọn 14:13; 15:16) Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha na-eme uche Chineke maka oge anyị a, nke bụ ikwusa n’ụwa nile Alaeze Chineke nke na-abịanụ—ọ bụghị òtù UN—dị ka ezi olileanya dịịrị ihe a kpọrọ mmadụ. (Matiu 7:21-23; 24:14; Mak 13:10) N’akụkụ ka ukwuu, òtù okpukpe ha dị iche iche etinyewo aka n’agha mwụfu ọbara nile a lụworo n’akụkọ ihe mere eme, gụnyere agha ụwa abụọ ahụ a lụworo n’ime narị afọ nke ohu. Chineke na-agwa ndị dị otú ahụ, sị: “Ọbụna mgbe unu na-ekpe ọtụtụ ekpere, m gaghị adị na-anụ: aka unu jupụtara n’ọbara.”—Aịsaịa 1:15; 59:1-3.
13. (a) N’ihi gịnị ka o ji bụrụ ihe kwesịrị ịrịba ama na ndị ndú okpukpe ụwa sonyere òtù UN n’ịkpọ òkù maka udo? (b) Ihe omume ikpeazụ dị aṅaa nke Chineke buru amụma banyere ya ka òkù ndị a na-akpọ maka udo ga-eduje na ya?
13 Ọzọkwa, ọ bụ ihe e kwesịrị ịrịba nnọọ ama na ndị ndú okpukpe ụwa ga-esonyere òtù United Nations n’ịkpọ òkù maka udo n’oge nke a. Ọ ga-amasị ha ime ka òtù UN mee ihe ga-abara ha uru, karịsịa n’ọgbọ nke a mgbe ọtụtụ n’ime ndị òtù ha na-agbakụta okpukpe azụ. Dị ka ndị ndú na-ekwesịghị ntụkwasị obi n’Israel oge ochie, ha na-akpọ òkù, sị, “Udo, udo; mgbe udo na-adịghị.” (Jeremaịa 6:14) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ha ga-anọgide na-akpọ òkù maka udo, na-ebili ịkwado ihe omume ikpeazụ ahụ nke Pọl onyeozi buru amụma banyere ya, sị: “Dị ka onye ohi na-abịa n’abalị, otú a ka ụbọchị nke [Jehova, NW] na-abịa. Mgbe ha na-asị, Udo na ntụkwasị obi dị, mgbe ahụ na mberede ka mbibi na-abịakwasị ha, dị ka ime na-eme nwanyị nke dị ime; ha agaghị agbanarịkwa ya ma ọlị.”—1 Ndị Tesalọnaịka 5:2, 3.
14. Olee otú òkù “Udo na ntụkwasị obi” ahụ pụrụ ịdị, oleekwa ụzọ mmadụ pụrụ isi zere ịbụ onye o duhiere?
14 N’afọ ndị na-adịbeghị anya, ndị ọchịchị ejiwo okwu bụ́ “udo na ntụkwasị obi” kọwaa atụmatụ dịgasị iche iche ndị mmadụ na-eme. Mgbalị dị otú ahụ ndị ndú ụwa na-eme ọ̀ bụ mmalite nke mmezu nke 1 Ndị Tesalọnaịka 5:3? Ka Pọl ọ̀ na-ezo aka nanị n’otu ihe kpọmkwem nke ga-adịkwa ịrịba ama ruo n’ókè nke ịdọta mmasị ụmụ mmadụ. Ebe ọ bụ na a na-aghọtazukarị amụma Bible nanị mgbe ha mezuchara ma ọ bụ mgbe ha na-emezu, anyị ga-echere iji ghọta ya. Ka ọ dịgodị, ndị Kraịst maara na n’agbanyeghị otú ọ pụrụ iyi ka mba dị iche iche hà nwetara udo na ntụkwasị obi, n’ụzọ bụ́ isi, ihe ka ga-adịkwa otú ọ dịbu. Ịchọ ọdịmma onwe onye nanị, ịkpọasị, mpụ, ndakpọ ezinụlọ, omume rụrụ arụ, ọrịa, iru újú, na ọnwụ ka ga-adịkwa. Ọ bụ ya mere mkpọsa ọ bụla e mere maka “udo na ntụkwasị obi” ekwesịghị iduhie gị ma ọ bụrụ na ị nọgide na-aghọta ihe ndị na-eme n’ụwa, na-aṅakwa ntị n’ịdọ aka ná ntị ndị e buru n’amụma n’Okwu Chineke.—Mak 13:32-37; Luk 21:34-36.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a J. F. Rutherford nwụrụ na January 8, 1942, N. H. Knorr wee nọchie ya dị ka onyeisi oche nke Watch Tower Society.
b Na November 20, 1940, Germany, Itali, Japan, na Hungary bịanyere aka n’akwụkwọ maka “òtù League of Nations ọhụrụ,” bụ́ nke ihe sochiri ya bụ mkpọsa Vatican kpọsara Mas na ekpere maka udo nke okpukpe na maka usoro ihe ọhụrụ. “League ọhụrụ” ahụ adịghị mgbe ọ pụtara.
c Ozizi Atọ n’Ime Otu malitere na Babilọn oge ochie, ebe a na-efekọ chi anyanwụ bụ Shamash, chi ọnwa bụ Sin, na chi kpakpando bụ Ishtar dị ka atọ n’ime otu. Ijipt gbasokwara otu ụkpụrụ ihe omume ahụ, na-efe Osiris, Isis, na Horus. Chi bụ isi nke ndị Asiria, bụ Asshur, ka a na-egosipụta dị ka nke nwere isi atọ. N’ịgbasokwa otu ụkpụrụ ahụ, a na-ahụ ihe oyiyi dị iche iche na chọọchị Katọlik dị iche iche ndị na-egosipụta Chineke dị ka onye nwere isi atọ.
d Webster’s Third New International Dictionary nke 1993 kọwara Jehova Chineke dị ka “chi kachasị ihe nile elu nke a maara dị ka chi Ndịàmà Jehova na-efe nanị ya.”
Igbe dị na peeji nke 250]
Ihe Mgbagwoju Anya nke “Udo”
Ọ bụ ezie na òtù UN kpọsara 1986 ịbụ Afọ Udo nke Mba Nile, ịsọ mpi ara ara n’imepụta ngwá agha rịrị elu nke ukwuu. Akwụkwọ World Military and Social Expenditures 1986 na-enye akụkọ ndị a na-awụ akpata oyi n’ahụ:
Na 1986 ego ụwa nile mefuru n’agha ruru $900 puku nde.
Ego ụwa nile na-emefu n’otu hour n’agha gaara ezu iji gbaa nde mmadụ 3.5 ọgwụ mgbochi ọrịa, bụ́ ndị nwụrụ kwa afọ n’ihi ọrịa na-efe efe ndị a pụrụ igbochi egbochi.
Gburugburu ụwa, otu n’ime mmadụ ise bụ ogbenye ọnụ ntụ́. A gaara enwe ike iji ego ụwa na-emefu n’ụbọchị abụọ ná ngwá agha nyezuo ndị a nile agụụ na-agụgbu nri ruo otu afọ.
Ike mgbawa dị ná ngwá agha nuklia ụwa kwakọbara ji okpukpu 160,000,000 karịa mgbawa Chernobyl ahụ.
A pụrụ ịtụpụ otu bọmbụ nuklia nke nwere ike mgbawa ji 500 okpukpu karịa bọmbụ ahụ a tụrụ na Hiroshima na 1945.
Nkwakọba ngwá agha nuklia nwere ihe karịrị otu nde Hiroshima. Ha nọchiri anya okpukpu 2,700 ike mgbawa a wụpụrụ n’Agha Ụwa nke Abụọ, mgbe nde mmadụ 38 nwụrụ.
Agha ghọrọ ihe na-eme ọtụtụ mgbe na ihe na-akpata ọnwụ karị. Ngụkọta ọnụ ọgụgụ ndị nwụrụ n’agha bụ nde 4.4 na narị afọ nke 18, nde 8.3 na narị afọ nke 19, nde 98.8 n’ime afọ 86 mbụ nke narị afọ nke 20. Kemgbe narị afọ nke 18, ndị na-anwụ n’agha amụbawo ihe karịrị okpukpu isii n’ịdị ngwa karịa ọnụ ọgụgụ ndị bi n’ụwa. Ndị nwụrụ n’agha nke ọ bụla a lụrụ na narị afọ nke 20 ji okpukpu iri karịa ndị nwụrụ n’agha na narị afọ nke 19.
[Foto ndị dị na peeji nke 247]
Dị ka e buru n’amụma banyere anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie, a tụbara òtù League of Nations n’abyss n’oge Agha Ụwa nke Abụọ ma a tụteghachiri ya dị ka òtù United Nations
[Foto ndị dị na peeji nke 249]
N’ịkwado “Afọ Udo” nke òtù UN, ndị nnọchianya nke okpukpe ụwa dị iche iche kpere ekpere ndị a gwagburu agwagbu n’Assisi, Itali, ma ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ha kpegaara Chineke ahụ dị ndụ, bụ́ Jehova ekpere