Isi nke 35
Ibibi Babilọn Ukwu Ahụ
1. Olee otú mmụọ ozi ahụ si kọwaa anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie, oleekwa ụdị amamihe dị mkpa iji ghọta ihe atụ ndị dị ná Mkpughe?
N’ỊKỌWAKWU anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie nke Mkpughe 17:3, mmụọ ozi ahụ gwara Jọn, sị: “N’ebe a ka uche nke nwere amamihe dị. Isi asaa ahụ bụ ugwu asaa, nke nwanyị ahụ na-anọdụ n’elu ha: ndị eze asaa dịkwa; ise n’ime ha adawo, otu n’ime ha na-adị adị, onye fọdụrụ akabịaghị; mgbe ọ ga-abịa ọ ghaghịkwa ịnọgide nwa oge.” (Mkpughe 17:9, 10) N’ebe a, mmụọ ozi ahụ na-enye amamihe nke sitere n’elu, bụ́ amamihe nke ọ bụ nanị ya pụrụ inye nghọta nke ihe atụ ndị ahụ dị ná Mkpughe. (Jemes 3:17) Amamihe nke a na-enye òtù Jọn ahụ na ndị na-esonyere ha nghọta banyere otú o si bụrụ na oge ndị anyị na-ebi n’ime ha siri oké ike. Ọ na-eme ka obi ndị raara onwe ha nye nwee nghọta nke ikpe Jehova nile, ndị a gaje imezu n’isi nso, na-akụnyekwa ezi egwu Jehova n’ime ha. Dị ka Ilu 9:10 kwuru: “Mmalite amamihe ka egwu Jehova bụ: ihe ọmụma nke Onye Nsọ bụkwa nghọta.” Gịnị ka amamihe Chineke na-ekpughere anyị banyere anụ ọhịa ahụ?
2. Gịnị ka isi asaa nke anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie pụtara, oleekwa otú o si bụrụ na “ise n’ime ha adawo, otu n’ime ha na-adị adị”?
2 Isi asaa nke anụ ọhịa ahụ na-anọchi anya “ugwu” asaa, ma ọ bụ “ndị eze” asaa. N’ime Akwụkwọ Nsọ, a na-eji okwu abụọ ndị ahụ eme ihe iji zoo aka n’ike ọchịchị dị iche iche. (Jeremaịa 51:24, 25; Daniel 2:34, 35, 44, 45) N’ime Bible, e gosipụtara alaeze ụwa isii dị ka ndị nwere mmetụta n’ihe banyere ndị Chineke: Ijipt, Asiria, Babilọn, Medo-Peasia, Gris, na Rom. N’ime ndị a, ise n’ime ha abịawo ma gabiga n’oge Jọn natara Mkpughe ahụ, ebe Rom ka nọ n’oge ahụ bụrụ alaeze ụwa. Nke a kwekọrọ nke ọma n’okwu ndị ahụ bụ, “ise n’ime ha adawo, otu n’ime ha na-adị adị.” Ma gịnị banyere “onye fọdụrụ” nke ahụ na-abịa abịa?
3. (a) Olee otú e si kewaa Alaeze Rom ahụ? (b) Ihe dịgasị aṅaa malitere ime n’Ebe Ọdịda Anyanwụ? (ch) Olee ụzọ e kwesịrị isi lee Alaeze Rom Dị Nsọ anya?
3 Alaeze Rom nọgidere ọbụna gbasapụkwa ruo ọtụtụ narị afọ mgbe oge Jọn gasịrị. N’afọ 330 O.A., Eze Constantine bupụrụ isi obodo ya site na Rom gaa Byzantium, bụ́ nke ọ gụgharịrị aha ịbụzi Constantinople. N’afọ 395 O.A., e kewara Alaeze Rom gaa n’akụkụ Ọwụwa Anyanwụ na nke Ọdịda Anyanwụ. N’afọ 410 O.A., Rom n’onwe ya dara n’aka Alaric, bụ́ eze ndị Visigoth (bụ́ otu agbụrụ ndị Germany ndị gbanweworo okpukpe ha gaa n’ụdị “Iso Ụzọ Kraịst” nke ndị òtù Arius). Agbụrụ dị iche iche nke ndị Germany (ndị bụkwa “ndị Kraịst”) meriri Spain na akụkụ dị ukwuu nke ókèala ndị Rom na-achị n’Ebe Ugwu Africa. E nwere ọtụtụ narị afọ nke ọgba aghara, mbili megide ọchịchị, na ndozigharị ihe na Europe. Ndị eze dị iche iche a ma ama bilichara n’Ọdịda Anyanwụ, ndị dị ka Charlemagne, onye guzobere njikọ aka n’etiti ya na Pope Leo nke Atọ n’ime narị afọ nke 9, na Frederick nke Abụọ, onye chịrị achị n’ime narị afọ nke 13. Ma alaeze ha, ọ bụ ezie na a kpọrọ ya Alaeze Rom Dị Nsọ dị nnọọ nta nke ukwuu karịa Alaeze Rom oge ochie ahụ mgbe ọ nọ n’ebube ya. N’ụzọ bụ isi, ọ bụ mweghachi ma ọ bụ iwere alaeze oge ochie nke a gaa n’ihu kama ịbụ alaeze ọhụrụ.
4. Ihe ịga nke ọma dịgasị aṅaa ka Alaeze Ebe Ọwụwa Anyanwụ ahụ nwere, ma gịnị mere akụkụ dị ukwuu nke ebe Rom oge ochie na-achịbu n’Ebe Ugwu Africa, Spain, na Siria?
4 Alaeze Ebe Ọwụwa Anyanwụ nke Rom nke nwere isi obodo ya na Constantinople, nọgidere na-enwe mmekọrịta nke ahụ na-eruchaghị ala n’etiti ya na Alaeze nke Ọdịda Anyanwụ. N’ime narị afọ nke isii, onyeeze nke Ọwụwa Anyanwụ bụ Justinian nke Mbụ dọrọghachiri akụkụ dị ukwuu nke Ebe Ugwu Africa n’agha, o tinyekwara aka na Spain na Itali. Na narị afọ nke asaa, Justinian nke Abụọ weghachiteere Alaeze ahụ ókèala nile nke Masedonia nke ndị agbụrụ Slav jibu na-achị. Otú ọ dị, ka ọ na-erule narị afọ nke asatọ, akụkụ dị ukwuu nke ókèala Rom oge ochie nweburu n’Ebe Ugwu Africa, Spain, na Siria abanyewo n’okpuru alaeze ọhụrụ nke ndị Alakụba wee si otú a pụọ n’okpuru ọchịchị nke ma Constantinople ma Rom.
5. Ọ bụ ezie na obodo Rom dara n’afọ 410 O.A., olee ụzọ o si bụrụ na o were ọtụtụ narị afọ ọzọ iji wepụchasịa ihe nile fọdụrụ n’ọchịchị Alaeze Rom ahụ n’elu ụwa?
5 Obodo Constantinople n’onwe ya nọgidere ruo mgbe dịtụ ogologo karị. O guzogidere mbuso agha nke ndị Peasia, Arabia, Bulgaria, na ndị Russia busoro ya ọtụtụ mgbe ruo n’afọ 1203 mgbe o mesịrị daa—ọ bụghị n’aka ndị Alakụba kama ọ bụ n’aka ndị Agha Ntụte si Ọdịda Anyanwụ bịa. Ma, n’afọ 1453, ọ banyere n’okpuru ọchịchị nke onye Alakụba na-achị alaeze Ottoman bụ Mehmed nke Abụọ, n’oge na-adịghị anya ọ ghọkwara isi obodo nke Alaeze Ottoman, ma ọ bụ Turkey. Otú a, ọ bụ ezie na obodo Rom dara n’afọ 410 O.A., o were ọtụtụ narị afọ ndị ọzọ iji wepụsịa ihe ncheta nile nke Alaeze Rom n’elu ụwa. Ọbụna mgbe ahụ, a ka na-enwe mmetụta ya n’alaeze okpukpe dị iche iche ndị dabeere n’ọkwá onye popu nke Rom nakwa na chọọchị nile nke Eastern Orthodox.
6. Alaeze ndị dị nnọọ ọhụrụ dịgasị aṅaa bilitere, oleekwa nke kasị nwee ihe ịga nke ọma?
6 Otú ọ dị, ka ọ na-erule narị afọ nke 15, mba dị iche iche nọ na-ewulite alaeze ndị dị nnọọ ọhụrụ. Ọ bụ ezie na ụfọdụ n’ime ọchịchị alaeze ọhụrụ ndị a nọ n’ókèala ndị dị n’ebe Rom na-achịbu, alaeze ha dị iche iche abụghị iwere Alaeze Rom ahụ gaa n’ihu. Portugal, Spain, France, na Holland ghọchara ọnọdụ nke ọchịchị ndị dịwaga iche iche. Ma nke kasị nwee ihe ịga nke ọma bụ Britain, nke mesịrị nọrọ n’isi alaeze buru ibu nke ukwuu nke ‘anyanwụ na-adịghị ada n’elu ya.’ Alaeze nke a gbasara n’oge dị iche iche gabiga akụkụ dị ukwuu nke Ebe Ugwu America, Africa, India, na Ebe Ndịda Ọwụwa Anyanwụ Esia, tinyekwara mbara ala dị ukwuu nke Ebe Ndịda Pacific.
7. Olee otú e si malite inwe ụdị alaeze nke nwere akụkụ abụọ, ruokwa ogologo oge hà aṅaa ka Jọn kwuru na “isi” ma ọ bụ alaeze ụwa nke asaa ahụ ga-adịgide?
7 Ka ọ na-erule narị afọ nke 19, ụfọdụ n’ókèala ndị Britain na-achịbu n’Ebe Ugwu America ekewapụworị onwe ha iguzobe mba United States of America nke kwụụrụ onwe ya. N’ụzọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, a nọgidere na-enwe esemokwu n’etiti mba ọhụrụ ahụ na mba na-achịbu ya. Otú ọ dị, agha ụwa nke mbụ manyere mba abụọ ahụ ịghọta na e nwere otu ụdị ihe ndị na-amasị ha, ha wee wulite mmekọrịta pụrụ iche n’etiti onwe ha. Otú a, a malitere inwe otu alaeze ụwa nke nwere akụkụ abụọ, nke ihe mejupụtara ya bụ United States of America, nke bụ ugbu a mba kasị nwee akụ n’ụwa, na Great Britain, bụ́ isi ọnọdụ nke alaeze ụwa kasị ibu. Ya mere, nke a bụ “isi” ma ọ bụ alaeze ụwa nke asaa ahụ, nke nọgidere na-adị ruo oge ọgwụgwụ a, bụkwa nke a nọrọ n’ókèala ya dị iche iche malite inwe Ndịàmà nke oge a nke Jehova. Ọ bụrụ na i jiri ya tụnyere ọchịchị dịrị ogologo oge nke isi nke isii ahụ, nke asaa ahụ na-anọ nanị “nwa oge,” ruo mgbe Alaeze Chineke ga-ebibi mba nile.
N’ihi Gịnị Ka E Ji Kpọọ Ya Eze nke Asatọ?
8, 9. Gịnị ka mmụọ ozi ahụ kpọrọ anụ ọhịa ihe atụ ahụ na-acha uhie uhie, oleekwa otú o si bụrụ na o si n’asaa ahụ bilite?
8 Mmụọ ozi ahụ gara n’ihu ịkọwara Jọn, sị: “Anụ ọhịa ahụ nke dịrị, nke na-adịghịkwa ugbu a, ya onwe ya bụkwa [eze] nke asatọ, o sikwa n’asaa ahụ pụta; ọ na-alakwa n’iyi.” (Mkpughe 17:11) Anụ ọhịa ihe atụ ahụ na-acha uhie uhie ‘pụtara site’ n’isi asaa ndị ahụ; ya bụ, a mụrụ ya site, ma ọ bụ ịdị adị ya dabeere, n’isi ndị ahụ nke ‘anụ ọhịa mbụ ahụ si n’oké osimiri rịgopụta,’ nke anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie bụ ihe oyiyi ya. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? Ee, na 1919 alaeze Anglo-America bụ isi nke pụtara ìhè. Isi isii ndị bu ya ụzọ adawo, ọnọdụ nke ịbụ alaeze na-achị ụwa dum agafetawokwa n’aka isi nke a nwere akụkụ abụọ. Isi nke asaa nke a, dị ka ihe na-anọchi anya usoro alaeze ụwa ndị ahụ n’oge a, bụ ike nke kpaliri nguzobe nke òtù League of Nations ahụ, ọ bụkwa onyeisi n’ịkwalite na inye òtù United Nations ahụ nkwado ego. Otú a, n’ụzọ ihe atụ, anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie—bụ́ eze nke asatọ—‘pụtara site’ n’isi asaa ndị mbụ ahụ. Ọ bụrụ na e lee ya anya n’ụzọ dị otú a, okwu ahụ nke bụ na o sitere n’asaa ahụ pụta kwekọrọ nke ọma ná mkpughe ahụ e bu ụzọ mee nke bụ na anụ ọhịa ahụ nwere mpi abụọ yiri nke nwa atụrụ (bụ́ Alaeze Ụwa nke Anglo-America, isi nke asaa nke anụ ọhịa mbụ ahụ) gbara ume ka e mebe ihe oyiyi ahụ ma nyekwa ya ndụ.—Mkpughe 13:1, 11, 14, 15.
9 Ọzọkwa, ndị mbụ so n’òtù League of Nations ahụ, tinyere mba Great Britain, gụnyere ọchịchị ndị ọnọdụ ha bụ n’isi obodo nke ụfọdụ n’ime isi ndị mbụ ahụ, dị ka Gris, Iran (Peasia), na Itali (Rom). Mgbe e mesịrị, ọchịchị ndị na-achị ókèala nke alaeze ụwa isii ndị mbụ ahụ na-achịbu ghọrọ ndị òtù na-akwado ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ. N’echiche nke a, a pụkwara ikwu na anụ ọhịa nke a na-acha uhie uhie si n’alaeze ụwa asaa ndị ahụ bilite.
10. (a) À pụrụ isi aṅaa kwuo na anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie ‘bụkwa n’onwe ya eze nke asatọ’? (b) Olee ụzọ otu onye ndú nke ebe bụbu Soviet Union si kwupụta nkwado ya maka òtù United Nations?
10 Rịba ama na anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie ‘n’onwe ya bụkwa [eze] nke asatọ.’ Otú a, e guzobere òtù United Nations nke taa iyi ọchịchị zuru ụwa ọnụ. Mgbe ụfọdụ, o mewo omume ọbụna n’ụzọ dị otú ahụ, na-edupụ usuu ndị agha banye n’ọgbọ agha iji dozie esemokwu mba dị iche iche, dị ka e mere na Korea, na Sinai Peninsula, ná mba Africa ụfọdụ, na Lebanon. Ma ọ bụ nanị ihe oyiyi nke onye bụ́ eze. Dị ka ihe oyiyi nke okpukpe, o nweghị mmetụta ma ọ bụ ike ọ bụla n’onwe ya e wezụgakwa nke ndị ahụ guzobere ya nyere ya, bụ́kwa ndị na-efe ya ofufe. Mgbe ụfọdụ, anụ ọhịa ihe atụ nke a na-eyi ihe na-esighị ike; ma ọ dịbeghị mgbe ọ dabara n’ọnọdụ nke oké nlefuru anya site n’aka ndị òtù ya chọrọ ịchị ọchịchị aka ike, bụ́ nke mere ka òtù League of Nations ahụ daba n’abyss. (Mkpughe 17:8) Ọ bụ ezie na o nwere echiche dị iche nke ukwuu n’akụkụ ndị ọzọ, otu onye ndú a ma ama nke ebe bụbu Soviet Union n’afọ 1987 sonyeere ndị popu nke Rom n’ikwupụta nkwado maka òtù UN. Ọbụna na ọ kpọrọ òkù ka e nwee “usoro chịkọtara ihe nile nke ịnọ ná ntụkwasị obi nke mba nile” nke dabeere n’òtù UN ahụ. Dị ka Jọn matara n’oge na-adịghị anya, oge gaje ịbịa mgbe òtù UN ahụ ga-eji ike dị ukwuu mee ihe. Mgbe ahụ, oge ga-erukwa ka ya onwe ya ‘laa n’iyi.’
Ndị Eze Iri n’Ime Otu Hour
11. Gịnị ka mmụọ ozi Jehova kọrọ banyere mpi iri ndị ahụ nke anụ ọhịa ihe atụ ahụ na-acha uhie uhie?
11 N’isiakwụkwọ Mkpughe bu nke a ụzọ, ndị mmụọ ozi nke isii na nke asaa wụpụrụ ọkwa dị iche iche nke ọnụma Chineke. E si otú a mee ka anyị mara na a na-achịkọta ndị eze ụwa bịa n’agha Chineke nke Amagedọn, na ‘a ga-echetakwa Babilọn Ukwu ahụ n’ihu Chineke.’ (Mkpughe 16:1, 14, 19) Ugbu a anyị gaje inwetakwu nkọwa nke ụzọ a ga-esi mezuo ihe Chineke kpere n’ikpe megide ndị a. Geekwa mmụọ ozi Jehova ntị ọzọ mgbe ọ na-agwa Jọn okwu. “Mpi iri ahụ nke ị hụkwara bụ eze iri, mmadụ ndị akanataghị alaeze ọ bụla; ma ha na-anata ike dị ka ndị eze, ha na anụ ọhịa ahụ, otu oge hour. Ndị a nwere otu aro, ha na-ewerekwa ike ha na ịchịisi ha nye anụ ọhịa ahụ. Ndị a ga-ebu agha megide Nwa Atụrụ ahụ, Nwa Atụrụ ahụ ga-emerikwa ha, n’ihi na ọ bụ Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile, na Eze kachasị ndị eze nile; ndị sooro ya ga-emerikwa, bụ́ ndị a kpọworo, ndị a họpụtawokwara, ndị kwesịkwara ntụkwasị obi.”—Mkpughe 17:12-14.
12. (a) Gịnị ka mpi iri ndị ahụ sere onyinyo ya? (b) Olee otú o si bụrụ na mpi iri ihe atụ ndị ahụ ‘anatabeghị alaeze’? (ch) Olee otú o si bụrụ na mpi iri ihe atụ ndị ahụ nwere “alaeze” ugbu a, ọ̀ bụkwa ruo ogologo oge hà aṅaa?
12 Mpi iri ahụ sere onyinyo ike ọchịchị nile ndị nọ n’ọchịchị n’elu ụwa ugbu a, ndị na-akwadokwa ihe oyiyi nke anụ ọhịa ahụ. Ọ bụ nanị ole na ole ná mba ndị dị ugbu a ka a maara n’oge Jọn. Ndị dịkwa adị mgbe ahụ, dị ka Ijipt na Peasia (Iran), nwere usoro ọchịchị dịwaga nnọọ iche taa. N’ihi ya, n’ime narị afọ mbụ ahụ, ‘mpi iri ahụ anatabeghị alaeze.’ Ma ugbu a n’ime ụbọchị Onyenwe anyị, ha nwere “alaeze,” ma ọ bụ ike ọchịchị. Mgbe nnukwute mba ndị ahụ na-achị ọtụtụ mba ndị ọzọ dakpọsịrị, karịsịa kemgbe agha ụwa nke abụọ, e nwewo ọtụtụ mba ndị ọhụrụ. Ndị a, tinyekwara ọchịchị ndị nọteworo anya karị, aghaghị iso anụ ọhịa ahụ chịa achịa ruo nwa oge—nanị “otu oge hour”—tupu Jehova eweta ike ọchịchị elu ụwa nile ná njedebe n’Amagedọn.
13. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa ka mpi iri ndị ahụ si nwee “otu aro,” omume dịkwa aṅaa ka nke a na-eme ka e jide n’aka na ha ga-enwe n’ebe Nwa Atụrụ ahụ nọ?
13 Taa, ịhụ mba n’anya bụ otu n’ime ihe kasị sie ike nke na-akpali mpi iri ndị a. Ha nwere “otu aro” n’echiche nke bụ na ha chọrọ ijigide ike ọchịchị nke mba ha dị iche iche kama ịnakwere Alaeze Chineke. Nke a bụ nzube mere ha ji malitedị ịkwado òtù League of Nations ahụ nakwa òtù United Nations—iji chebe udo nke ụwa wee si otú a chebe ndịgide nke ha onwe ha. Omume dị otú ahụ mere ka ọ bụrụ ihe e ji n’aka na mpi ndị ahụ ga-eguzogide Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ “Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile, na Eze kachasị ndị eze nile,” n’ihi na Jehova ezubewo na Alaeze ya nke dị n’aka Jisọs Kraịst ga-anọchi alaeze ndị a nile n’oge na-adịghị anya.—Daniel 7:13, 14; Matiu 24:30; 25:31-33, 46.
14. Olee ụzọ o si kwe omume ndị ọchịchị ụwa ibuso Nwa Atụrụ ahụ agha, gịnị ga-esikwa na nke a pụta?
14 N’eziokwu, ọ dịghị ihe ọ bụla ndị ọchịchị ụwa nke a pụrụ ime megide Jisọs n’onwe ya. Ọ nọ n’eluigwe, ebe dị anya nke aka ha na-apụghị iru. Ma ụmụnna Jisọs, bụ́ ndị fọdụrụ ná mkpụrụ nwanyị ahụ, ka nọ n’elu ala, o dokwara anya na ha nọ n’ihe ize ndụ. (Mkpughe 12:17) Ọtụtụ n’ime mpi ndị ahụ egosipụtaworị oké ịkpọasị n’ebe ha nọ, ha esiwokwa otú a busoo Nwa Atụrụ ahụ agha. (Matiu 25:40, 45) Ma n’oge na-adịghị anya, oge ga-eru mgbe Alaeze Chineke “ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa.” (Daniel 2:44) Mgbe ahụ, ndị eze ụwa ga-abanye n’oké agha kpụ ọkụ n’ọnụ nke ha na Nwa Atụrụ ahụ, dị ka anyị gaje ịhụ n’oge na-adịghị anya. (Mkpughe 19:11-21) Ma n’ebe a, anyị na-amụta ihe zuru ezu iji ghọta na mba ndị ahụ agaghị enwe ihe ịga nke ọma. Ọ bụ ezie na ha na anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie nke UN nwere “otu aro,” ha apụghị imeri oké “Onyenwenụ kachasị ndị nwenụ nile, na Eze kachasị ndị eze nile,” ha apụghịkwa imeri ‘ndị so ya, bụ́ ndị a kpọworo, ndị a họpụtawokwara, ndị kwesịkwara ntụkwasị obi,’ nke gụnyere ndị na-eso ụzọ ya e tere mmanụ, ndị ka nọ n’elu ala. Ndị a ga-enwewokwarị mmeri site n’ịnọgide n’ikwesị ntụkwasị obi ná nzaghachi nye ajọ ebubo nile Setan na-ebo ha.—Ndị Rom 8:37-39; Mkpughe 12:10, 11.
Ibibi Nwanyị ahụ Na-akwa Iko
15. Gịnị ka mmụọ ozi ahụ kwuru banyere nwanyị ahụ na-akwa iko na omume mpi iri ahụ na anụ ọhịa ahụ ga-emeso ya?
15 Ọ bụghị nanị ndị Chineke ka mpi iri ahụ kpọrọ asị. Ugbu a, mmụọ ozi ahụ na-adọrọ uche Jọn gaghachi n’ebe nwanyị ahụ na-akwa iko nọ, sị: “O wee sị m, Mmiri nile ị hụrụ, ebe nwanyị ahụ onye na-akwa iko na-anọdụ, bụ ndị dị iche iche, na ìgwè mmadụ, na mba dị iche iche, na asụsụ dị iche iche. Mpi iri ahụ ị hụrụ, ha na anụ ọhịa ahụ, ndị a ga-akpọ nwanyị ahụ na-akwa iko asị, ha ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu bụrụkwa onye gba ọtọ, ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ.”—Mkpughe 17:15, 16.
16. N’ihi gịnị ka Babilọn Ukwu ahụ na-agaghị enwe ike ịdabere n’ebe mmiri ndị gbara ya gburugburu dị maka nchebe mgbe ndị ọchịchị chigharịrị imegide ya?
16 Dị nnọọ ka Babilọn oge ochie dabeere ná mmiri nke na-echebe ya, Babilọn Ukwu ahụ taa na-adaberekwa n’ọnụ ọgụgụ buru ibu nke “ndị dị iche iche, na ìgwè mmadụ, na mba dị iche iche, na asụsụ dị iche iche” bụ́ ndị òtù ya. N’ụzọ ziri ezi, mmụọ ozi ahụ dọọrọ uche anyị gaa na nke a tupu ọ kọọ ihe ọzọ na-awụ ibubo n’ahụ nke merenụ: Ndị ọchịchị nke ụwa nke a ga-awakwasị Babilọn Ukwu ahụ. Gịnị ka “ndị dị iche iche, na ìgwè mmadụ, na mba dị iche iche, na asụsụ dị iche iche” ndị ahụ ga-eme mgbe ahụ? Ndị Chineke anọworị na-adọ Babilọn Ukwu ahụ aka ná ntị na mmiri nile nke osimiri Yufretis ga-atakọ. (Mkpughe 16:12) Mmiri nile ahụ ga-emesịa takọọ kpam kpam. Ha agaghị enwe ike inye ajọ agadi nwanyị ahụ na-akwa iko nkwado ọ bụla dị irè n’oge hour nke mkpa ya kachasị ukwuu.—Aịsaịa 44:27; Jeremaịa 50:38; 51:36, 37.
17. (a) N’ihi gịnị ka akụ na ụba nke Babilọn Ukwu ahụ na-agaghị azọpụta ya? (b) Olee ụzọ ngwụsị Babilọn Ukwu ahụ na-agaghị esi nnọọ bụrụ ihe dị ùgwù? (ch) E wezụgakwa mpi iri ahụ, ma ọ bụ mba dị iche iche, gịnị ọzọ na-esonye ná mwakwasị ahụ megide Babilọn Ukwu ahụ?
17 N’eziokwu, oké akụ na ụba nke Babilọn Ukwu ahụ agaghị azọpụta ya. Ọ pụrụ ọbụna ime ka mbibi ya bịa ngwa ngwa karị, n’ihi na ọhụụ ahụ na-egosi na mgbe anụ ọhịa ahụ na mpi iri ahụ gosipụtara ịkpọasị ha n’ebe ọ nọ, ha ga-adọkapụsị uwe nile nke ọbụbụeze ya na ihe ịchọ mma ya nile. Ha ga-ebusasị ihe onwunwe ya nile. Ha “ga-emekwa ya . . . onye gba ọtọ,” na-emenye ya ihere site n’ikpughe ụdị onye ọ bụ n’ezie. Lee nnọọ oké mbibi nke ahụ bụ! Ọgwụgwụ ya abụghịkwa ihe ùgwù ma ọlị. Ha na-ebibi ya, ‘riekwa anụ ahụ ya,’ na-eme ka ọ ghọọ ọkpụkpụ na-adịghị ndụ. N’ikpeazụ, ha ‘ga-erechapụkwa ya n’ọkụ.’ Ha na-esu ya ọkụ dị ka onye bu ọrịa na-efe efe, ọbụna n’elighị ya eli n’ụzọ dị mma n’anya! Ọ bụghị nanị mba dị iche iche, dị ka mpi iri ndị ahụ nọchiri anya ha, na-ebibi oké nwanyị ahụ na-akwa iko, kama “anụ ọhịa ahụ” n’onwe ya, nke pụtara òtù UN n’onwe ya, na-esonyere ha ná ndọkasị nke a. Ọ ga-enye nkwado ya maka mbibi nke okpukpe ụgha. Ọtụtụ n’ime ihe karịrị mba 190 ndị nọ n’òtù UN ahụ amaliteworị igosi, site n’usoro ntụliaka ọchịchị ha, ịkpọasị n’ebe okpukpe dị, karịsịa n’ebe Krisendọm dị.
18. (a) Gịnị ka a hụwororịị nke na-egosi na o kwere omume mba dị iche iche ichigharị megide okpukpe Babilọn? (b) Gịnị ga-abụ isi ihe nke ga-akpata oké mbuso agha ahụ megide oké nwanyị ahụ na-akwa iko?
18 N’ihi gịnị ka mba ndị a ga-eji meso onye a bụbu enyi ha n’ụzọ dị njọ otú a? Anyị ahụwo n’akụkọ ihe ndị mere n’oge na-adịbeghị anya gara aga na nchigharị dị otú ahụ megide okpukpe Babilọn kwere omume. Mmegide ndị ọchịchị na-enye ebelatawo ike okpukpe nwere nke ukwuu ná mba ndị dị ka ebe bụbu Soviet Union na China. N’akụkụ Protestant nke Europe, enweghị mmasị na inwe obi abụọ gbasazuru ebe dum emewo ka ọtụtụ chọọchị tọgbọrọ nkịtị, nke mere na n’ụzọ bụ́ isi, okpukpe aghọwo nnọọ ihe nwụrụ anwụ. Nnupụisi na enweghị nkwekọrịta adọwasịwo nnukwute alaeze Katọlik, bụ́ nke ndị ndú ya na-enwebeghị ike ịchịkwata. Otú ọ dị, anyị ekwesịghị ichefu eziokwu ahụ nke bụ́ na oké mbuso agha ikpeazụ a megide Babilọn Ukwu ahụ na-abịa dị ka ngosipụta nke ikpe Chineke a na-apụghị ịgbanwe agbanwe megide oké nwanyị ahụ na-akwa iko.
Imezu Izu Chineke
19. (a) Olee ụzọ a pụrụ isi jiri ikpe Jehova mara Jerusalem nke dapụrụ n’ezi ofufe n’afọ 607 T.O.A. mee ihe atụ nke mmezu ihe o kpere n’ikpe megide oké nwanyị ahụ na-akwa iko? (b) Gịnị ka ọnọdụ Jerusalem nke ịbụ ebe tọgbọrọ n’efu nke mmadụ na-ebighị mgbe afọ 607 T.O.A. gasịrị sere onyinyo ya maka oge anyị a?
19 Olee ụzọ Jehova si emezu ihe a o kpere n’ikpe? A pụrụ ime ihe atụ nke a site n’ihe Jehova mere megide ndị dapụrụ n’ezi ofufe n’oge ochie, ndị o kwuru banyere ha, sị: “N’ahụ ndị amụma Jerusalem ka m hụworo ihe jọgburu onwe ya; ha na-akwa iko, na-ejegharịkwa n’okwu ụgha, ha emewokwa ka aka ndị na-eme ihe ọjọọ dị ike, ha wee ghara isi, onye ọ bụla n’ihe ọjọọ ya, lata: ha nile aghọworo m ihe dị ka Sọdọm, ndị bi n’ime ya aghọwokwara m ihe dị ka Gọmọra.” (Jeremaịa 23:14) N’afọ 607 T.O.A., Jehova jiri Nebukadneza mee ihe iji ‘yipụsịa obodo ahụ nke na-akwa iko n’ụzọ ime mmụọ uwe n’ahụ, chịrị ihe ya nile mara mma, hapụkwa ya dị ka onye gba ọtọ.’ (Ezikiel 23:4, 26, 29) Jerusalem nke oge ahụ bụ ihe atụ nke Krisendọm taa, dịkwa ka Jọn hụrụ n’ọhụụ ndị bu ụzọ, Jehova ga-eji ntaramahụhụ yiri nke ahụ leta Krisendọm na akụkụ nile ọzọ nke okpukpe ụgha. Ọnọdụ Jerusalem nke ịbụ ebe tọgbọrọ n’efu nke mmadụ na-ebighị mgbe afọ 607 T.O.A. gasịrị na-egosi ihe okpukpe Krisendọm ga-adị ka ya mgbe a napụsịrị ya akụ nile, menyekwa ya ihere site n’ikpughe ọtọ ya. Ọnọdụ akụkụ dum fọdụrụ nke Babilọn Ukwu ahụ agaghị adịkwa mma karị.
20. (a) Olee ụzọ Jọn si gosi na Jehova gajekwa iji ndị ọchịchị bụ mmadụ mee ihe n’imezu ihe o kpere n’ikpe? (b) Gịnị bụ “izu” Chineke? (ch) N’ụzọ dị aṅaa ka mba nile ga-esi mezuo “otu izu” ha, ma ọ̀ bụ izu nke ònye ka a gaje imezu n’ezie?
20 Ọzọkwa, Jehova na-eji ndị ọchịchị bụ mmadụ eme ihe n’imezu ihe o kpere n’ikpe. “N’ihi na Chineke tinyere n’obi ha ime izu ya, na ịgbata otu izu, na iwere alaeze ha nye anụ ọhịa ahụ, ruo mgbe a ga-emezu okwu nile nke Chineke.” (Mkpughe 17:17) Gịnị bụ “izu” nke Chineke? Ọ bụ ime ndokwa ka ndị ga-ebibi Babilọn Ukwu ahụ jikọta onwe ha, ka ha wee bibie ya kpam kpam. N’ezie, nzube ndị ọchịchị ahụ n’ibuso ya agha bụ iji mezuo “otu izu” nke ha. Ha ga-eche na ọ bụ maka ọdịmma nke mba ha dị iche iche ibuso oké nwanyị ahụ na-akwa iko agha. Ọ pụrụ ịbụ na ha ga-ele ndịgide nke okpukpe ndị a haziri ahazi n’ókèala ha dị iche iche anya dị ka ihe na-eyi ọchịchị ha egwu. Ma n’ezie, ọ bụ Jehova na-eduzi ihe na-emenụ; ha ga-emezu izu ya site n’ibibi onyeiro ya nke eri ogologo oge dị anya, bụ́ nwanyị na-akwa iko n’otu ntabi anya!—Tụlee Jeremaịa 7:8-11, 34.
21. Ebe ọ bụ na a gaje iji anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie mee ihe ibibi Babilọn Ukwu ahụ, gịnị ka ihe àmà gosiri na mba dị iche iche gaje ime n’ihe banyere òtù United Nations?
21 Ee, mba nile ga-eji anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie mee ihe, bụ́ òtù United Nations, n’ibibi Babilọn Ukwu ahụ. Ha anaghị eme ihe site n’echiche nke onwe ha, n’ihi na Jehova na-etinye n’ime obi ha ‘ọbụna imezu otu izu ha site n’iwere alaeze ha nye anụ ọhịa ahụ.’ Mgbe oge ya ruru, ihe àmà gosiri na mba nile ga-ahụ mkpa ọ dị ime ka òtù United Nations siwanye ike. Ha ga-enye ya ézé, dị ka a pụrụ ikwu ya, na-enye ya ikike na ike ọchịchị nile ha nwere ka o nwee ike ịchịgharị megide okpukpe ụgha wee nwee ihe ịga nke ọma n’ibuso ya agha “ruo mgbe a ga-emezu okwu nile nke Chineke.” Otú a, nwanyị na-akwa iko nke oge ochie ahụ ga-abịaru ná njedebe ya kpam kpam. Ọ dịkwa nnọọ mma na o si otú a pụọ n’anya!
22. (a) Ná Mkpughe 17:18, gịnị ka e gosiri site n’ụzọ mmụọ ozi ahụ si mechie àmà ahụ ọ na-agba? (b) Olee ụzọ Ndịàmà Jehova si na-emeghachi omume ná mkpughe nke ihe omimi nke a?
22 Dị ka à ga-asị na ọ bụ imesi ya ike na ọ bụ ihe e ji n’aka na a ga-emezu ihe Jehova kpere n’ikpe megide alaeze ụwa nke okpukpe ụgha, mmụọ ozi ahụ mechiri àmà ahụ ọ na-agba site n’ikwu, sị: “Ma nwanyị ahụ ị hụrụ bụ obodo ukwu ahụ, nke nwere alaeze na-achị ndị eze ụwa.” (Mkpughe 17:18) Dị ka Babilọn nke oge Belshaza, Babilọn Ukwu ahụ “abụrụwo nke a tụrụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ wee hụ na ihe kọrọ ya.” (Daniel 5:27, The New English Bible) Mbibi ya ga-abịa ọsọ ọsọ, bụrụkwa nke ọ na-apụghị isi na ya pụta ọzọ. Oleekwa otú Ndịàmà Jehova si emeghachi omume ná mkpughe nke ihe omimi nke oké nwanyị ahụ na-akwa iko na nke anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie? Ha na-egosipụta ịnụ ọkụ n’obi n’ịkpọsa ụbọchị ikpe nke Jehova, ka ha ‘jikwa amara’ na-azaghachi ndị ji ezi obi na-achọ eziokwu ahụ. (Ndị Kọlọsi 4:5, 6; Mkpughe 17:3, 7) Dị ka isiakwụkwọ na-esonụ ga-egosi, ndị nile nwere ọchịchọ ịlanarị mgbe a ga-ebibi oké nwanyị ahụ na-akwa iko aghaghị ime ihe, ha aghaghịkwa ime ya ngwa ngwa!
[Foto ndị dị na peeji nke 252]
Usoro Ọchịchị Ụwa Asaa Ndị Ahụ
IJIPT
ASIRIA
BABILỌN
MEDO- PEASIA
GRIS
ROM
ANGLO-AMERICA
[Foto ndị dị na peeji nke 254]
‘Ya onwe ya bụkwa eze nke asatọ’
[Foto dị na peeji nke 255]
N’ịgbakụta Nwa Atụrụ ahụ azụ, ‘ha na-ewere ike ha na ịchịisi ha nye anụ ọhịa ahụ’
[Foto dị na peeji nke 257]
Krisendọm, dị ka akụkụ bụ isi nke Babilọn Ukwu ahụ, ga-eyi Jerusalem oge ochie n’ịbụ ajọ mkpọmkpọ ebe