Okpukpe Ụgha Na-agbaga Ná Mbibi ya!
IJI chọpụta ma okpukpe ụwa a hà na-eru nso ọgwụgwụ ha, ka anyị nyochaa otu n’ime amụma Bible ndị kasị dị ịrịba ama. Ọ bụ banyere nwanyị ihe atụ ahụ bụ ihe omimi nke a kọwara n’akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, bụ́ Mkpughe.
Ị̀ pụrụ iji anya nke uche gị hụ otu nwanyị chịworo mba nile dị ka eze nwanyị, na-akpa ike ná ndụ ọtụtụ ijeri mmadụ n’akụkọ ihe mere eme nile—nwanyị bara ọgaranya nke e yikwasịrị ákwà odo odo na nke uhie uhie n’ụzọ dị ebube, onye e ji ọlaedo, nkume dị oké ọnụ ahịa, na pearl chọọ mma nke ọma? N’egedege ihu ya ka e dekwasịrị aha dị ogologo, bụ́ ihe omimi: “Babilọn Ukwu ahụ, nne nke ndị na-akwa iko na nke ihe arụ nile nke ụwa.” Obi abụọ adịghị ya na e ji ndụ ọjọọ ya nke inwe mmekọahụ aghara aghara mara ya, ebe ọ bụ na o sorowo ndị eze ụwa ‘kwaa iko.’ Mmehie ya nile arapakọworo n’otu ruo eluigwe. Ọ na-anọkwasị n’elu ajọ anụ ọhịa na-acha uhie uhie, nke nwere isi asaa na mpi nri.—Mkpughe 17:1-6; 18:5.
Ọ bụrụ na ị pụrụ iji anya nke uche gị hụ nwanyị a, ị na-aghọta onye bụ isi n’ihe nkiri amụma ahụ nke onyeozi Jisọs bụ́ Jọn hụrụ n’ọhụụ e nyere ya site n’aka otu mmụọ ozi. Ọ na-akọwa ya n’ụzọ doro anya ná Mkpughe isi nke 17 na 18. Gụọ isiakwụkwọ ndị a na Bible nke gị. Ị ga-enwe ike ịgbaso usoro ihe omume ndị dị malite ná mkpughepụ nke onye nwanyị ihe omimi a bụ ruo ná mbibi ya.
Ịmata Nwanyị ahụ Na-akwa Iko
A na-achọta otu enyemaka n’ịghọta onye ọ bụ site n’ihe abụọ nke eze nwanyị ahụ na-akwa iko na-anọkwasị n’ụzọ ihe atụ. Ná Mkpughe 17:18, a na-akọwa ya dị ka “obodo ukwu ahụ, nke nwere alaeze na-achị ndị eze ụwa.” Nke a na-enye ya ohere ịnọkwasị “n’ọtụtụ mmiri,” nke pụtara “ndị dị iche iche, na ìgwè mmadụ, na mba dị iche iche, na asụsụ dị iche iche,” dị ka e gosiri ná Mkpughe 17:1, 15. Dị ka amaokwu nke 3 n’otu isiakwụkwọ ahụ na-egosị, a na-ahụkwa ya ka ọ na-anọkwasị n’anụ ọhịa nke nwere isi asaa—a na-ejikarị anụ ọhịa eme ihe na Bible dị ka ihe atụ nke ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị ụwa, ma ọ bụ òtù dị iche iche.
Nke a na-egosi na nwanyị ahụ na-akwa iko, bụ́ Babilọn Ukwu ahụ, bụ ihe atụ nke alaeze ukwu e buliri elu, nke na-achị n’elu ndị ọzọ na-achị isi na ndị ha na-achị. Nke a pụrụ nanị ịbụ alaeze nke okpukpe ụgha nile nke ụwa.
Ike ndị ndú okpukpe na-enwe n’ihe banyere ụkpụrụ gọọmenti na ndọrọ ndọrọ ọchịchị bụ akụkụ a ma ama nke akụkọ ihe mere eme. Akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia na-ekwu, sị: “Mgbe ọdịda Alaeze Ukwu Rom nke Ọdịda Anyanwụ [narị afọ nke 5] gasịrị, popu nwere ikike karịrị nke onye ọ bụla ọzọ na Europe. . . . Popu nwere ma ikike ndọrọ ndọrọ ọchịchị ma nke metụtara okpukpe. N’afọ 800, Popu Leo nke Atọ chiri onye ọchịchị Franks ahụ bụ́ Charlemagne [Charles Onye Ukwu] echichi dị ka onye ọchịchị alaeze ukwu nke ndị Rom. . . . Leo nke Atọ emewo ka ikike popu nwere ime ka ịchịisi onye ọchịchị alaeze ukwu bụrụ nke iwu kwadoro sikwuo ike.”
E sitere n’aka kadịnal bụ́ Thomas Wolsey (1475?-1530) nyekwuo ihe atụ nke ikike Chọọchị Katọlik na “ndị ọchịchị” ya nwere n’isi ndị na-achị isi. A kọwara ya dị ka “onye kasị ike n’England ruo ọtụtụ afọ.” N’okpuru ịchịisi Eze Henry nke Asatọ, ọ “bụ n’oge na-adịghị anya onye ihe nile metụtara gọọmenti dị n’aka. . . . O biri ndụ okomoko nke onye eze ma nwee oké afọ ojuju n’ike ya.” Ihe ndekọ akwụkwọ nkà ihe ọmụma ahụ na-aga n’ihu, sị: “Kadịnal Wolsey ji oké ikike ya dị ka onye ọnụ na-eru n’okwu n’ọchịchị na onye ọchịchị mee ihe karịsịa n’ịhụ maka ihe metụtara ndị mba ọzọ nke England nye Henry nke Asatọ.”
Ihe atụ ọzọ pụtara ìhè nke ikike Katọlik nwere n’ihe nkịtị ndị metụtara ọchịchị bụ Kadịnal Richelieu nke France (1585-1642), bụ́ ‘onye chịrị France n’ezie ruo ihe karịrị afọ 18.’ Akwụkwọ ahụ e hotaburu na-ekwu, sị: “O nwere ọchịchọ gabiga ókè, n’oge na-adịghịkwa anya o nwekwaghị ndidi ichere ọkwá ka elu.” E mere ya kadịnal na 1622, ‘n’oge na-adịghịkwa anya ọ ghọrọ onye kasị nwee mmetụta na gọọmenti France.’ O doro anya na ọ bụ nwoke na-eme nke a na-ahụ anya, n’ihi na “o ji aka ya duru usuu ndị agha eze gaa ná ngechibido nke ndị agha mere na La Rochelle.” Ihe odide ahụ na-agbakwụnye, sị: “Mmasị kasịnụ nke Richelieu bụ n’ihe metụtara mba ọzọ.”
A na-ahụ ntinye aka Vatican nọgidere na-etinye n’ọchịchị n’ụzọ pụtara ìhè site n’ọkwa a na-ama mgbe mgbe n’akwụkwọ akụkọ Vatican bụ́ L’Osservatore Romano banyere ndị na-anọchite anya mba ọzọ, bụ́ ndị na-eche akwụkwọ ikike ha n’ihu popu ahụ bụ eze. Ọ pụtara ìhè na Vatican nwere ìgwè ndị Katọlik na-eguzosi ike n’ihe ndị pụrụ ime ka popu mara banyere ihe omume ọchịchị na ndị nnọchiteanya mba dị iche iche n’ụwa nile.
A pụrụ inye ọtụtụ ihe atụ ndị ọzọ iji kọwaa oké ike ndị ndú okpukpe na-akpa—ma n’ime Krisendọm ma n’èzí ya—n’ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ụwa a. Eziokwu ahụ bụ na nwanyị ihe atụ ahụ na-akwa iko na-anọkwasị “n’ọtụtụ mmiri” nile (na-anọchi anya “ndị dị iche iche, na ìgwè mmadụ, na mba dị iche iche”) na n’elu anụ ọhịa ahụ (na-anọchi anya ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị nile nke ụwa) na-egosikwa na ike ọ na-akpa n’ahụ ndị mmadụ, mba, na ikike dị iche iche bụ ọdịdị dị iche nke karịrị nanị ịchịisi ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ka anyị lee ụdị nke ọ bụ.
Akụkụ nke ogologo aha ahụ dị n’egedege ihu ya bụ “Babilọn Ukwu ahụ.” Ọ na-ezo aka na Babilọn oge ochie, nke e guzobere n’ihe dị ka afọ 4,000 gara aga site n’aka Nimrọd, onye “na-emegide Jehova,” bụ́ ezi Chineke ahụ. (Jenesis 10:8-10, NW) Ya ịza aha a na-egosi na ọ bụ ihe nnọchianya buru ibu nke Babilọn oge ochie, na-enwe akụkụ ndị yiri nke ahụ. Akụkụ ndị dị aṅaa? Babilọn oge ochie jupụtara n’okpukpe òtù nzuzo, ọdịnala rụrụ arụ, ofufe arụsị, majik, ịgụ kpakpando, na nkwenkwe ụgha—ha nile bụ nke Okwu Jehova kagburu.
Akwụkwọ bụ́ The New International Dictionary of New Testament Theology na-ekwu na na narị afọ nke 18 T.O.A., e mere Marduk “chi obodo nke Babilọn, wee bụrụkwa onye isi nke ndị Sumer na Accad, bụ́ ụlọ arụsị nke ihe dị ka chi 1300. O webatara ọdịnala okpukpe nile n’ime otu usoro. . . . Na Jen. 11:1-9 a kọwara ihe owuwu nke nnukwu ụlọ nsọ Babilọn ahụ dị ka ihe ngosipụta nke mpako ụmụ mmadụ nke chọrọ ịwakpo eluigwe.”
Ya mere, Babilọn oge ochie bụ ebe nlekwasị anya nke okpukpe ụgha, bụ́ nke metụtara ụwa dum ka oge na-aga. Ihe omume okpukpe, nkwenkwe, ọdịnala, na ihe oyiyi Babilọn abamiwo n’akụkụ nile nke ụwa, a na-egosipụtakwa ha ná ngwakọta nke ọtụtụ puku okpukpe dị n’ụwa. Alaeze ọchịchị na alaeze ukwu dị iche iche ebiliwo ma daa, ma okpukpe Babilọn alanarịwo ha nile.
N’ihi Gịnị Ka Mbibi Ji Dị Oké Nso?
Dị ka a kọwaworo ugboro ugboro ná mbipụta ndị bu ụzọ nke magazin a, amụma Bible na ihe omume na-eme ka ụwa mee mkpatụ kemgbe 1914 na-egosi n’ehieghị ụzọ na anyị na-ebi ugbu a ‘n’ọgwụgwụ nke usoro ihe nke a.’ (Matiu 24:3, NW) Nke a pụtara na ọgwụgwụ nke usoro ụwa anụ ọhịa ji ọsọ na-abịaru nso, dịkwa ka ọgwụgwụ nke “anụ ọhịa na-acha uhie uhie” nke nwere mpi iri, bụ́ nke nwanyị ahụ na-akwa iko na-anọkwasị na ya ugbu a. (Mkpughe 17:3) O doro anya na anụ ọhịa a na-anọchi anya njikọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mba nile n’elu ụwa—òtù Mba Ndị Dị n’Otu. Ọgwụgwụ ahụ e buru n’amụma pụtara mkpochapụ ịchịisi ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-adịghị asọpụrụ Chineke, nke na-ekewa ekewa n’elu ihe a kpọrọ mmadụ. Ma gịnị banyere eze nwanyị ahụ na-akwa iko nke na-anọkwasị n’elu anụ ọhịa ahụ?
Mmụọ ozi Chineke na-akọwa, sị: “Mpi iri ahụ ị hụrụ, ha na anụ ọhịa ahụ, ndị a ga-akpọ nwanyị ahụ na-akwa iko asị, ha ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye tọgbọrọ n’efu bụrụkwa onye gba ọtọ, ha ga-erikwa anụ ahụ ya, rechapụkwa ya n’ọkụ. N’ihi na Chineke tinyere n’obi ha ime izu Ya, na ịgbata otu izu, na iwere alaeze ha nye anụ ọhịa ahụ, ruo mgbe a ga-emezu okwu nile nke Chineke.”—Mkpughe 17:16, 17.
Ya mere amụma ahụ na-egosi na n’oge na-adịghị anya tupu a laa anụ ọhịa ndọrọ ndọrọ ọchịchị ahụ n’iyi, ọ ga-amalite ịkpọ onye na-anọkwasị ya asị na imegide ya. N’ihi gịnị? O doro anya na ndị na-achị achị na gọọmenti dị iche iche ga-eche na njikọ okpukpe ndị nọ n’ókèala ha na-eyi ike na ịbụisi ha egwu. Na mberede, n’ịbụ ndị ike na-arụgide arụgide kpaliri, ha ga-eme “izu” Chineke, mkpebi ya, site n’imezu ihe o kpere n’ikpe n’isi alaeze ụwa nke okpukpe ụgha ahụ na-akwa iko, nke ọbara tetọrọ.a—Tụlee Jeremaịa 7:8-11, 34.
Ọgwụgwụ nke okpukpe ụgha nke ụwa a ga-abịa mgbe o yiri ka ha ka gbasiri ike ma na-akpakwa ike. Ee, amụma ahụ na-egosi na kpọmkwem tupu e bibie nwanyị ahụ na-akwa iko, ọ ka ga na-ekwu n’obi ya, sị: “Ana m anọdụ dị ka eze nwanyị, abụghịkwa m nwanyị di ya nwụrụ, ọ dịghịkwa iru újú m ga-ahụ ma ọlị.” (Mkpughe 18:7) Ma, mbibi ya ga-abịa dị ka ihe ijuanya nye ọtụtụ ijeri ndị ọ na-achị. Ọ ga-abụ otu n’ime ihe omume oké ọdachi kasị bụrụ nke a na-atụghị anya ha n’akụkọ ihe mere eme nke mmadụ.
Kemgbe Babilọn oge ochie pụtara, okpukpe ụgha akpawo ike dị ukwuu n’ahụ ihe a kpọrọ mmadụ site n’aka ndị ndú na ndị na-akwado ha; nkwenkwe ha, ọdịnala ha, na ihe omume ha; ọtụtụ akatamkpo ụlọ ofufe ha; na oké akụ̀ na ụba ha. Ha agaghị apụ nnọọ n’anya n’enweghị onye maara maka ya. Ya mere, mmụọ ozi ọ dị n’aka ikwupụta ozi amamikpe n’isi nwanyị ahụ na-akwa iko ezoghị ọnụ mgbe ọ na-akpọsa, sị: “N’otu ụbọchị ka ihe otiti ya nile ga-abịa, bụ́ ọnwụ, na iru újú, na ụnwụ; a ga-erechapụkwa ya n’ọkụ; n’ihi na Ọ dị ike, bụ́ Onyenwe anyị Chineke, Onye kpere ya ikpe.” Ya mere ọgwụgwụ nke Babilọn Ukwu ahụ ga-abịa dị ka égbè eluigwe gbara na mberede, ọ ga-agafekwa ngwa ngwa, dị ka a ga-asị na ọ bụ “n’otu ụbọchị.”—Mkpughe 18:8; Aịsaịa 47:8, 9, 11.
Okwu dị ike nke mmụọ ozi ahụ na-eduga n’ajụjụ bụ́, À ga-enwe okpukpe ga-afọdụ ma ọlị, ọ bụrụkwa otú ahụ, olee nke, n’ihi gịnịkwa? Gịnị ka amụma na-egosi? A ga-ahụ banyere nke a n’isiokwu na-esonụ.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka ntụle zuru ezu nke amụma ndị a, lee Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!, isi nke 33, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Igbe dị na peeji nke 6]
Ikpe Ọmụma Ọbara Krisendọm n’Africa
Ná Mkpughe 18:24, Bible na-ekwu na ọ bụ n’ime Babilọn Ukwu ahụ ka a hụrụ ọbara nke “ndị nile e gbuworo n’elu ụwa.” Chee echiche banyere agha ndị a lụworo n’ihi ndịrịta iche okpukpe na n’ihi na ndị ndú okpukpe enweghị ike igbochi ha. Otu ihe atụ na-adịbeghị anya na nke a pụtara ìhè ná mgbukpọ nke agbụrụ na Rwanda, bụ́ nke e gburu ihe dị ka mmadụ 500,000—otu ụzọ n’ụzọ atọ ha bụ ụmụaka.
Onye Canada na-ede akwụkwọ bụ́ Hugh McCullum si na Rwanda na-akọ, sị: “Otu onye ụkọchukwu Hutu na Kigali [Rwanda] na-ekwu na a pụghị ịkọwa ọdịda chọọchị na-ada inye nduzi omume ọma. Ọnọdụ ndị bishọp n’ọha mmadụ Rwanda kwesịrị ịdịworịị oké mkpa. Ha matara banyere ọdachi ahụ na-eru nso n’oge dị anya tupu ogbugbu ahụ ewere ọnọdụ. Ebe ikpo okwu chọọchị gaara abụwo ohere ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ mmadụ nile nwere ịnụ ozi siri ike nke gaara egbochiwo mgbukpọ nke agbụrụ ahụ. Kama nke ahụ ndị ndú ahụ gbachiri nkịtị.”
Mgbe oké mgbukpọ ahụ kasị njọ gasịrị na 1994, Justin Hakizimana, onye okenye chọọchị, kwuru n’otu obere nzukọ e nwere n’otu chọọchị Presbyterian dị na Kigali, sị: “Chọọchị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị Habyarimana [president Rwanda] gakọrọ ụkwụ na ụkwụ. Anyị akatọghị ihe na-emenụ n’ihi na e nyere anyị aka azụ. Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime chọọchị anyị, karịsịa ndị Katọlik, katọrọ oké mgbukpọ ahụ.”
Aaron Mugemera, pastọ chọọchị, kwuru ná nzukọ ọzọ e nwere na Rwanda mgbe mgbukpọ nke agbụrụ ahụ gasịrị, sị: “Ihere na-eme chọọchị. . . . Anyị enwewo ogbugbu n’ebe a kemgbe 1959. Ọ dịghị onye katọrọ ha. . . . Anyị ekwuwaghị okwu n’ihi na egwu na-atụ anyị, na n’ihi na anyị enweghị nsogbu.”
[Foto dị na peeji nke 7]
‘Nwanyị a na-akwa iko’ na-emetụta ụwa dum
[Ebe E Si Nweta Foto]
Ụwa: Mountain High Maps® Copyright © 1995 Digital Wisdom, Inc.