Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • E Bibie Obodo Ukwu Ahụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • Mmanya nke Na-akpali Agụụ Ịkwa Iko

      13. (a) Olee ụzọ mmụọ ozi ahụ dị oké ike si dọrọ uche gaa n’ịdị ukwuu nke ịkwa iko nke Babilọn Ukwu ahụ? (b) Ndụ ịkwa iko dị aṅaa nke jupụtara na Babilọn oge ochie ka a na-ahụtakwa na Babilọn Ukwu ahụ?

      13 Ihe ọzọ mmụọ ozi ahụ siri oké ike mere bụ ịkpọtụ uche n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu nke ịkwa iko nke Babilọn Ukwu ahụ, na-ekwu, sị: “N’ihi na mba nile adawo site ná mmanya nke [na-akpali agụụ, NW] nke ịkwa iko ya;a ndị eze ụwa sokwara ya kwaa iko, ndị ahịa nke ụwa bụrụ ọgaranya site n’ike nke inupụ isi ya.” (Mkpughe 18:3) O dubatawo mba nile nke ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ nile na-adịghị ọcha nke okpukpe ya. Na Babilọn oge ochie, dị ka onye Grik na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Herodotus si kọọ, a chọrọ ka nwa agbọghọ ọ bụla jiri ọnọdụ amaghị nwoke ya gbaa akwụna n’ofufe a na-efe n’ụlọ nsọ. A ka na-egosipụta mmerụ dị oké njọ n’ụzọ mmekọahụ ruo taa n’ihe ọkpụkpụ okpukpe ndị ahụ agha mebisịworo, ndị dị n’Angkor Wat nke dị na Kampuchea nakwa ndị dị n’ụlọ nsọ dị iche iche dị na Khajuraho, India, ndị na-egosi chi ndị Hindu ahụ bụ Vishnu ka ọnọdụ mmekọahụ dị iche iche gbara ya gburugburu. N’ime United States, mkpughe ndị mere ka ụwa maa jijiji e kpughere omume na-adịghị ọcha nke ndị okwuchukwu TV na 1987, nakwa na 1988, tinyekwara mkpughe nke omume zuru ebe nile nke ndị nwoke idina nwoke ibe ha n’etiti ndị ụkọchukwu okpukpe, na-egosi na ọbụna Krisendọm na-agbachi nkịtị ka ịkwa iko gabigara ókè nke na-awụ akpata oyi dịgide n’etiti ha. Ma n’agbanyeghị nke a, mba nile adabawo n’ụdị ịkwa iko nke siri ike ọbụna karị.

      14-16. (a) Mmekọrịta dị aṅaa na-ezighị ezi n’ụzọ ime mmụọ nke okpukpe na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị bilitere n’Itali nke ndị ọchịchị Fascist? (b) Mgbe ndị Itali wabatara n’Abyssinia, okwu dịgasị aṅaa ka ndị bishọp Chọọchị Roman Katọlik kwuru?

      14 Anyị atụleworị njikọ ahụ na-ezighị ezi dị n’etiti okpukpe na ọchịchị, bụ́ nke mere ka Hitler mabata n’ike ọchịchị na Nazi Germany. Mba ndị ọzọ takwara ahụhụ n’ihi ntinye aka okpukpe na-etinye n’ihe omume nke ụwa. Dị ka ihe atụ: N’Itali nke dị n’okpuru ọchịchị ndị Fascist, na February 11, 1929, Mussolini na Cardinal Gasparri bịanyere aka n’akwụkwọ nkwekọrịta Lateran Treaty ahụ, na-eme ka Vatican City bụrụ mba kwụụrụ onwe ya. Pope Pius nke Iri na Otu kwupụtara na ya “ewerewo Itali nyeghachi Chineke, werekwa Chineke nyeghachi Itali.” Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu? Tụlee ihe mere mgbe afọ isii gasịrị. N’October 3, 1935, Itali wabatara n’Abyssinia, na-ekwu na mba ahụ bụ “ala na-eme ihe ike, ndị ka na-agba ohu.” Ònye n’ezie bụ onye na-eme ihe ike? Chọọchị Katọlik ọ̀ katọrọ omume aka ike nke Mussolini? Ka popu ahụ nọ na-ekwu okwu ndị na-esi ike nghọta, ndị bishọp ya nọ na-eme nnọọ ihe pụtara ìhè n’ịgọzi usuu ndị agha nke “ala nna” ha bụ Itali. N’akwụkwọ bụ The Vatican in the Age of the Dictators, Anthony Rhodes kọrọ, sị:

      15 “N’akwụkwọ Ọzụzụ Atụrụ ya nke akara ụbọchị ya bụ October 19 [1935], onye Bishọp nke Udine [Itali] dere, sị, ‘Oge erubeghị o kwesịghịkwa ekwesị ka anyị kwupụta ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi banyere okwu ahụ. Ọrụ dịịrị anyị dị ka ndị Itali, karịakwa dị ka ndị Kraịst, bụ inye aka n’ihe ịga nke ọma nke ndị agha anyị.’ Onye Bishọp nke Padua dere n’October 21, sị, ‘N’oge ihe isi ike nke anyị nọ na ya ugbu a, anyị na-arịọ unu ka unu nwee okwukwe ná ndị ndú anyị na n’usuu ndị agha anyị.’ N’October 24, onye Bishọp nke Cremona doro flag òtù ndị agha ole na ole nsọ, wee sị: ‘Ka ngọzi Chineke dịkwasị ndị agha ndị a ndị ga-anọ n’ala Africa merie ala ọhụrụ ebe a ga-anọ zụlite ọkà ihe ọmụma ndị Itali, wee si otú ahụ na-eweta ha bịa n’omenala ndị Rom na nke ndị Kraịst. Ka Itali guzoghachikwa ọzọ dị ka ndị na-akụziri ụwa dum àgwà ndị Kraịst.’”

      16 A wakwasịrị Abyssinia n’ike, na-enwe ngọzi nke ndị ndú okpukpe Roman Katọlik. Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla ndị a pụrụ isi kwuo na ha yiri Pọl onyeozi n’ịbụ onye ‘dị ọcha n’ebe ọbara mmadụ nile dị’?—Ọrụ 20:26.

      17. Olee ụzọ Spain si taa ahụhụ n’ihi na ndị ndú okpukpe ya enweghị ike ‘ịkpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma oge’?

      17 Tụkwasị na Germany, Itali, na Abyssinia, otu mba ọzọ nke ịkwa iko Babilọn Ukwu ahụ metụtaworo—Spain. Otu n’ime ihe ndị kpatara Agha Obodo nke 1936-1939 ná mba ahụ bụ mgbalị ọchịchị a họpụtara ahọpụta mere iji belata ike dị ukwuu Chọọchị Roman Katọlik nwere. Mgbe agha ahụ malitere, onyendú usuu ndị agha mgbanwe ọchịchị nke ọchịchị Fascist ndị Katọlik, bụ́ Franco, kọwara onwe ya dị ka “Ọchịagha Ndị Kraịst n’Agha Ntụte Dị Nsọ,” bụ́ ùtú aha nke o mesịrị kwụsị iji na-eme ihe. Ọtụtụ narị puku ndị Spain nwụrụ n’agha ahụ. E wezụgakwa nke a, dị ka otu ngụkọ e leziri anya mee ka ọ ghara ịgabiga ókè si kọọ, ndị òtù Nationalist nke Franco egbuwo 40,000 ndị òtù Popular Front, ebe ndị nọ n’òtù nke abụọ ahụ gbuworo 8,000 ndị nọ n’ọkwá okpukpe dị iche iche—ndị mọnk, ndị ụkọchukwu, ndị nọn, na ndị a ka nabatara ọhụrụ n’ọkwá okpukpe. Otú ahụ ka ọ dị bụ ihe egwu na ọnọdụ ọjọọ na-adị n’agha obodo, na-egosipụta amamihe dị n’ịgbaso okwu Jisọs nke bụ: “Mịghachi mma agha gị n’ọnọdụ ya: n’ihi na mmadụ nile ndị weere mma agha ga-ala n’iyi site ná mma agha.” (Matiu 26:52) Lee ka o si bụrụ ihe jọgburu onwe ya na Krisendọm na-etinye aka ná mwụfu ọbara n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu otú a! N’ezie, ndị ụkọchukwu ya adawo nnọọ ada ‘n’ịkpụgharị mma agha ha ka ha bụrụ mma oge’!—Aịsaịa 2:4.

  • E Bibie Obodo Ukwu Ahụ
    Mkpughe—Mmezu Ya Dị Ebube Dị Nso!
    • Igbe dị na peeji nke 263]

      “Ndị Eze . . . Sokwara Ya Kwaa Iko”

      Ná mmalite afọ ndị 1800, ndị ahịa Europe na-ebuba ọgwụ opium dị ukwuu na China. Na March 1839, ndị ọchịchị China nwara ịkwụsị azụmahịa ahụ megidere iwu site n’ijichi 20,000 igbe ọgwụ ahụ site n’aka ndị ahịa Britain. Nke a dujere n’esemokwu n’etiti Britain na China. Ka mmekọrịta dị n’etiti mba abụọ ahụ na-ajọwanye njọ, ụfọdụ ndị ozi ala ọzọ nke Protestant gbara Britain ume ka ha banye n’ibu agha, site n’okwu ndị dị ka ndị a:

      “Lee nnọọ ka ihe isi ike ndị a si na-enye obi m ọṅụ n’ihi na echere m na iwe pụrụ iwe gọọmenti England, Chineke, site n’ike Ya, pụkwara ịkwatusị ihe mgbochi nile na-egbochi oziọma Kraịst ịbanye na China.”—Henrietta Shuck, onyeozi ala ọzọ nke okpukpe Southern Baptist.

      N’ikpeazụ, agha tiwapụrụ—agha nke a maara taa dị ka Agha Opium. Ndị ozi ala ọzọ ji obi ha nile gbaa Britain ume site n’okwu ndị dị ka ndị a:

      “A na-amanye m ịtụleghachi ọnọdụ dị ugbu a, ọ bụchaghị dị ka okwu metụtara opium ma ọ bụ ndị England, kama dị ka oké atụmatụ nke Chineke iji obi ọjọọ nke mmadụ kwalite nzube Ya nile nke obi ebere n’ebe China nọ site n’ịkwatusị mgbidi nile kewapụrụ ya iche.”—Peter Parker, onye ozi ala ọzọ nke okpukpe Congregational.

      Onye ozi ala ọzọ nke okpukpe Congregational, Samuel W. Williams, kwukwara, sị: “Aka Chineke pụtara ìhè n’ihe nile meworonụ n’ụzọ dị ịrịba ama, anyị adịghịkwa arụ ụka na Ya, onye sịrị na Ya bịara iweta mma agha n’elu ala abịawo n’ebe a, na ọ bụkwa maka ibibi ndị iro Ya ngwa ngwa na iguzobe alaeze nke Ya. Ọ ga-anọgide na-akwatu ruo mgbe O guzobere Onyeisi Udo ahụ.”

      Banyere ajọ mgbukpọ nke ndị China, onye ozi ala ọzọ bụ J. Lewis Shuck dere, sị: “Ana m ewere ọnọdụ ndị dị otú ahụ . . . dị ka ngwá ọrụ Onyenwe anyị ji eme ihe kpọmkwem n’ikpochapụ unyi nile na-egbochi ọganihu nke Eziokwu Chineke.”

      Onye ozi ala ọzọ nke okpukpe Congregational, Elijah C. Bridgman kwukwara, sị: “Ọtụtụ mgbe, Chineke ejiwo aka siri ike nke ike ọchịchị mee ihe n’idozi ụzọ maka alaeze Ya . . . Ngwá ọrụ e ji na-eme ihe n’oge ndị a dị oké mkpa bụ ụmụ mmadụ; ike nduzi ya bụ nke Chineke. Onye ọchịchị ahụ dị elu nke mba nile ewerewo England n’ọrụ iji baara China mba ma wetuo ya n’ala.”—Nhota ndị e wetara n’isiokwu bụ́ “Mmezu na Ụzọ Mmezu,” 1974, ihe odide nke Stuart Creighton Miller bipụtara na The Missionary Enterprise in China and America (Nnyocha Harvard nke onye editọ ya bụ John K. Fairbank).

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya