Isi nke 7
Kpalighachi Ịhụnanya Mbụ Ahụ!
EFESỌS
1. Olee ọgbakọ e zijeere ozi mbụ nke Jisọs, gịnịkwa ka o chetaghachiiri ndị nlekọta nọ n’ebe ahụ?
OZI mbụ nke Jisọs bụ nye ọgbakọ ahụ dị n’Efesọs, nke bụ́ n’oge ahụ obodo na-enwe ihe ịga nke ọma nke dị n’ụsọ oké osimiri n’Asia Minor nke dị nso n’agwaetiti Patmọs. O nyere Jọn iwu, sị: “Degara mmụọ ozi nke nzukọ Kraịst dị n’Efesọs akwụkwọ, sị, Ihe ndị a ka ọ na-ekwu, bụ́ onye na-eji kpakpando asaa ahụ n’aka nri ya, onye na-ejegharị n’etiti ihe ịdọba oriọna asaa ahụ nke e ji ọlaedo mee.” (Mkpughe 2:1) Dị ka n’akwụkwọ ozi isii ndị ọzọ ahụ, Jisọs na-akpọtu uche n’ebe a n’otu ihe nke na-egosi ọnọdụ ya dị ka onye nwere ike ọchịchị. O chetaara ndị nlekọta nọ n’Efesọs na ndị okenye nile nọ n’okpuru nlekọta na nchebe ya, na ọ na-enyochakwa ọgbakọ nile. Ruo n’oge anyị a, ọ nọgidewo jiri ịhụnanya na-edu ndú dị otú a, na-elekọta ndị okenye, jirikwa obi ebere na-azụ ndị nile so ọgbakọ na-emekọ ihe dị ka atụrụ. Site n’oge ruo n’oge, ọ na-ahazigharị ndokwa dị iche iche nke ọgbakọ ka ìhè wee nwuo n’ụzọ dị ukwuu karị. Ee, Jisọs bụ Onyeisi Ọzụzụ Atụrụ nke na-elekọta ìgwè atụrụ Chineke.—Matiu 11:28-30; 1 Pita 5:2-4.
2. (a) N’ihi ihe ọma dịgasị aṅaa ka Jisọs jara ọgbakọ dị n’Efesọs mma? (b) Ndụmọdụ dị aṅaa nke Pọl onyeozi nyeburu ka ihe àmà na-egosi na ndị okenye nọ n’Efesọs rubeere isi?
2 Mgbe ahụ Jisọs setịpụrụ ụkpụrụ nke ise n’ime ozi asaa ndị ahụ ga-agbaso site n’iji okwu ịja mma wee meghee. Nke a bụ ozi o ziri ndị Efesọs: “Amatara m ọrụ gị nile, na ndọgbu ị na-adọgbu onwe gị n’ọrụ, na ntachi obi gị, matakwa na ị pụghị ịnagide ndị ọjọọ, ị nwakwara ndị na-akpọ onwe ha ndị ozi, ma ha abụghị, i wee hụ na ha bụ ndị ụgha; i nwekwara ntachi obi, i bukwara ibu n’ihi aha m, ike akagwụghịkwa gị.” (Mkpughe 2:2, 3) Ọtụtụ afọ tupu nke a, Pọl onyeozi adọworị ndị okenye nọ n’Efesọs aka ná ntị banyere “agụ jọgburu onwe ha,” bụ́ ndị si n’ezi ofufe dapụ, ndị na-akpata ọgba aghara n’etiti ìgwè atụrụ ahụ, gwakwa ndị okenye ndị ahụ ka ha ‘na-eche nche’ n’ịgbaso ihe nlereanya ya nke ịrụsi ọrụ ike. (Ọrụ 20:29, 31) Ebe Jisọs jara ha mma ugbu a maka ịdọgbu onwe ha n’ọrụ na inwe ntachi obi nakwa maka ịghara ịda mbà, ọ ghaghị ịbụ na ha tinyere ndụmọdụ ahụ n’ọrụ.
3. (a) Olee ụzọ “ndị ozi ụgha” siworo chọọ iduhie ndị kwesịrị ntụkwasị obi n’oge anyị a? (b) Ịdọ aka ná ntị dị aṅaa banyere ndị si n’ezi ofufe dapụ ka Pita nyere?
3 Ọzọkwa, n’ime ụbọchị Onyenwe anyị ahụ, e nwewokwa “ndị ozi ụgha” ndị “na-ekwu ihe dị iche iche na-eduhie mmadụ ụzọ, ka ha dọpụ ndị na-eso ụzọ Jisọs iso ha n’azụ.” (2 Ndị Kọrint 11:13; Ọrụ 20:30; Mkpughe 1:10) Ha na-ahụ ihe dị mma n’òtù okpukpe dị iche iche ndị na-emegiderịta onwe ha, na-azọrọ na Chineke enweghị otu nzukọ ọ bụla, na-agọpụkwa na Jisọs anataghị ike Alaeze na 1914. Ha na-emezu amụma ahụ dị na 2 Pita 3:3, 4 (NW): “Ndị ọchị ga-eji ịchị ọchị bịa na mgbe ikpeazụ, na-aga dị ka ọchịchọ nke onwe ha si dị, na-asịkwa: ‘Olee ebe nkwa nke a nke ọnụnọ ya dị? N’ihi na site n’ụbọchị nna nna anyị hà dara n’ụra ọnwụ, ihe nile na-adịgide kpọmkwem dị ka ha dịworo site ná mmalite nke okike.’”
4. (a) Olee otú mpako na nnupụisi nke ndị ọchị na-esi apụta ìhè? (b) Ndị Kraịst taa na-egosi na ha nwere echiche yiri nke ndị Efesọs ndị ahụ site n’ime gịnị megide ndị mmegide na-ekwu okwu ụgha?
4 Ndị ọchị ndị a na-enupụ isi n’echiche ahụ nke ime nkwupụta nke okwukwe ha n’ihu ọha. (Ndị Rom 10:10) Ha anarawo nkwado nke ndị ụkọchukwu Krisendọm na enyemaka nke akwụkwọ akụkọ na ụlọ ọrụ TV dị iche iche iji na-agbasa akụkọ ụgha banyere ndị ha na ha na-esobu. Ngwa ngwa, ndị kwesịrị ntụkwasị obi na-achọpụta na okwu na akparamagwa nke ndị nduhie ndị a abụghị eziokwu. Dị ka ndị Efesọs, ndị Kraịst taa ‘apụghị ịnagide ndị ọjọọ,’ ya mere ha na-achụpụ ha n’ọgbakọ ha dị iche iche.a
5. (a) Ịda mbà dị aṅaa ka Jisọs kwuru na ndị Efesọs nwere? (b) Okwu dị aṅaa ka ndị Efesọs ahụ kwesịrị ichetaworịị?
5 Otú ọ dị, ugbu a, dị ka o mere n’ihe banyere ise n’ime ọgbakọ asaa ndị ahụ, Jisọs wepụtara otu nsogbu siri oké ike. Ọ gwara ndị Efesọs ndị ahụ, sị: “Ma enwere m nke a imegide gị, na ị hapụrụ ịhụnanya ahụ i nwere na mbụ.” (Mkpughe 2:4) Ha ekwesịghị ịdaworị n’akụkụ nke a, n’ihi na Pọl edeworo ha akwụkwọ ozi 35 afọ tupu mgbe ahụ, na-ezo aka ‘n’oké ịhụnanya Chineke hụrụ anyị,’ ọ gbawokwa ha ume, sị: “Bụrụnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya; na-ejegharịkwanụ n’ịhụnanya, dị ka Kraịst anyị hụkwara unu n’anya.” (Ndị Efesọs 2:4; 5:1, 2) Ọzọkwa, e kwesịrị ịkanyeworịị okwu Jisọs n’obi ha n’ụzọ a na-apụghị ihichapụ ehichapụ, nke bụ: “Onyenwe anyị, bụ́ Chineke anyị, Onyenwe anyị bụ otu: ị ga-ahụkwa Onyenwe anyị, bụ́ Chineke gị, n’anya, site n’obi gị dum, sitekwa ná mkpụrụ obi gị dum, sitekwa n’uche gị dum, sitekwa n’ike gị dum.” (Mak 12:29-31) Ndị Efesọs enwekwaghị ịhụnanya mbụ ahụ.
6. (a) Ma ànyị bụ ndị nọteworo anya ma ànyị bụ ndị ọhụrụ sonyeere ọgbakọ, ihe ize ndụ na ọchịchọ dịgasị aṅaa ka anyị na-aghaghị ịnọ ná nche megide? (b) Gịnị ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe Chineke nọ kwesịrị ịkpali anyị ime?
6 Ma ànyị bụ ndị nọteworo anya ma ọ bụ ndị ọhụrụ na-esonyere ọgbakọ, anyị aghaghị iche nche megide ịtụfu ịhụnanya mbụ anyị nwere n’ebe Jehova nọ. Olee ụzọ nke a pụrụ isi fụnarị anyị? Anyị pụrụ ikwe ka oké mmasị anyị nwere n’ọrụ ego anyị na-arụ, ọchịchọ nke ịkpata ego dị ukwuu, ma ọ bụ nchụso nke ihe ụtọ ghọọ ihe ndị bụ isi ná ndụ anyị. Otú a, anyị pụrụ ịghọ ndị tụkwasịrị echiche ha n’ihe nke anụ ahụ kama ịbụ n’ihe nke ime mmụọ. (Ndị Rom 8:5-8; 1 Timoti 4:8; 6:9, 10) Ịhụnanya anyị nwere n’ebe Jehova nọ kwesịrị ịkpali anyị idozi ọchịchọ nile dị otú ahụ, ịnọgidekwa ‘buru ụzọ na-achọ Alaeze Chineke na ezi omume ya,’ ka anyị wee nwee ike ‘ịkpadoro onwe anyị akụ n’eluigwe.’—Matiu 6:19-21, 31-33.
7. (a) Gịnị kwesịrị ịkpali ozi anyị na-ejere Jehova? (b) Gịnị ka Jọn kwuru banyere ịhụnanya?
7 Ka ihe na-akpali ozi anyị na-ejere Jehova mgbe nile bụrụ ịhụnanya dị omimi anyị nwere n’ebe ọ nọ. Ka anyị nwee obi ekele dị omimi maka ihe nile Jehova na Kraịst mewooro anyị. Dị ka Jọn n’onwe ya mesịrị dee, sị: “N’ime nke a ka ịhụnanya dị, ọ bụghị na anyị onwe anyị hụrụ Chineke n’anya, kama ọ bụ na ya onwe ya hụrụ anyị n’anya, wee zite Ọkpara ya ka ọ bụrụ ihe ịjụrụ ya obi banyere mmehie anyị.” Jọn gara n’ihu ịgwa anyị, sị: “Chineke bụ ịhụnanya; onye na-anọgidekwa n’ịhụnanya, n’ime Chineke ka ọ na-anọgide, Chineke na-anọgidekwa n’ime ya.” Ka anyị ghara ikwe ka ịhụnanya anyị hụrụ Jehova, Onyenwe anyị bụ Jisọs Kraịst, na Okwu Chineke dị ndụ danyụọ mgbe ọ bụla! Anyị pụrụ igosipụta ịhụnanya nke a ọ bụghị nanị site n’iji ịnụ ọkụ n’obi na-ejere Chineke ozi, kamakwa site n’irube isi ‘n’ihe a e nyere n’iwu nke anyị nwere site n’ebe ọ nọ, ka onye na-ahụ Chineke n’anya, ka ọ hụkwa nwanna ya n’anya.’—1 Jọn 4:10, 16, 21; Ndị Hibru 4:12; leekwa 1 Pita 4:8; Ndị Kọlọsi 3:10-14; Ndị Efesọs 4:15.
“Rụọkwa Ọrụ Mbụ”
8. Gịnị ka Jisọs kwuru na o kwesịrị ịbụ mmeghachi omume nke ndị Efesọs?
8 Ndị Efesọs ndị ahụ aghaghị ịkpalighachi ịhụnanya ahụ ha nwere ná mbụ ma ọ bụrụ na ha achọghị ka ihe fụnarị ha. “Ya mere,” ka Jisọs gwara ha, “cheta ebe i siworo dapụ, gị chegharịakwa, rụọkwa ọrụ mbụ; ma a sị na i meghị otú a, ana m abịakwute gị, m ga-ewepụkwa ihe ịdọba oriọna gị n’ọnọdụ ya, ma a sị na i chegharịghị.” (Mkpughe 2:5) Olee otú ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ ahụ dị n’Efesọs si nara okwu ndị ahụ? Anyị amaghị. Anyị nwere olileanya na ha chegharịrị, nweekwa ihe ịga nke ọma n’ịkpalighachi ịhụnanya ha n’ebe Jehova nọ. Ọ bụrụ na ha emeghị otú a, mgbe ahụ, a ghaghị imenyụworị oriọna ha, bupụkwa ihe ịdọba oriọna ha. Ha ga-atụfu ihe ùgwù ha nke ime ka ìhè nke eziokwu na-enwupụ.
9. (a) Okwu agbamume dị aṅaa ka Jisọs gwara ndị Efesọs? (b) Olee otú ọgbakọ ndị dịrị mgbe oge Jọn gasịrị si daa n’ịgbaso ndụmọdụ ahụ Jisọs nyere ndị Efesọs?
9 Otú ọ dị, Jisọs nwere okwu agbamume nke a ịgwa ndị Efesọs ndị ahụ: “Otú ọ dị, nke a ka i nwere, na ị na-akpọ ọrụ nile nke ndị Nikọlaịtan asị, bụ́ nke mụ onwe m na-akpọkwa asị.” (Mkpughe 2:6) Ma ọ dịghị ihe ọzọ, ha kpọrọ nkewa nke ịrọ òtù asị dị ka Onyenwe anyị Jisọs Kraịst kpọkwara ya asị. Otú ọ dị, ka ọtụtụ afọ naagabiga, ọtụtụ ọgbakọ kwụsịrị ịgbaso okwu Jisọs ndị ahụ. Enweghị ịhụnanya maka Jehova, maka eziokwu, na maka ibe ha rụpụtaara ha ịdapụ banye n’ọchịchịrị ime mmụọ. E kewasịrị ha gaa n’ọtụtụ òtù dị iche iche na-eserịta okwu. Ndị na-edepụtagharị akwụkwọ bụ́ “ndị Kraịst,” ndị na-ahụghị Jehova n’anya wepụrụ ọbụna aha Chineke n’onwe ya site n’ihe odide Bible Grik. Enweghị ịhụnanya nyekwara ohere maka ịkụzi ozizi ndị Babilọn na nke ndị Grik, dị ka ọkụ ala mmụọ, pọgatrị, na Atọ n’Ime Otu, n’aha Iso Ụzọ Kraịst. Ebe ha na-ahụghị Chineke na eziokwu ahụ n’anya, ihe ka ọtụtụ ná ndị ahụ kpọrọ onwe ha ndị Kraịst kwụsịrị ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. Òtù ndị ụkọchukwu na-achọ ọdịmma onwe ha malitere ịchị ha, bụ́ ndị guzobere alaeze nke ha n’elu ala ebe a.—Tụlee 1 Ndị Kọrint 4:8.
10. Ọnọdụ okpukpe dị aṅaa ka e nwere n’ime Krisendọm na 1918?
10 Mgbe ikpe ahụ malitere n’ụlọ Chineke na 1918, ndị ndú òtù okpukpe dị iche iche nke Krisendọm nọ na-akwado Agha Ụwa Mbụ n’ụzọ pụtara ìhè, na-agba ndị Katọlik na ndị Protestant ume n’akụkụ abụọ ndị ahụ ije gburịta ibe ha. (1 Pita 4:17) N’ụzọ na-adịghị ka ọgbakọ ahụ dị n’Efesọs nke kpọrọ ihe ndị òtù Nikọlaịtan na-eme asị, ọ dịwo ogologo oge okpukpe dị iche iche nke Krisendọm nọ na-enwe ozizi ndị na-emegiderịta onwe ha, ndị na-emegidekwa Chineke, ndị ndú okpukpe ha adalawokwara ụwa, bụ́ nke Jisọs kwuru banyere ya na ndị na-eso ụzọ ya agaghị abụ akụkụ ya. (Jọn 15:17-19) Ọgbakọ ha dị iche iche, ebe ha na-amataghị isiokwu Bible, bụ́ Alaeze Chineke, abụghị ihe ịdọba oriọna nke na-eme ka eziokwu nke Akwụkwọ Nsọ na-enwupụ, ndị òtù ha abụghịkwa akụkụ nke ụlọ nsọ ime mmụọ Jehova. Ndị ndú ha bụ ndị ikom (na ndị inyom) abụghị kpakpando, kama e kpughere ha ịbụ akụkụ nke “onye ahụ naemebi iwu.”—2 Ndị Tesalọnaịka 2:3; Malakaị 3:1-3.
11. (a) Òtù ndị Kraịst dị aṅaa nke nọ n’ụwa na 1918 tinyere okwu ahụ Jisọs gwara ndị Efesọs n’ọrụ? (b) Gịnị ka òtù Jọn ahụ mere site 1919 gaa n’ihu?
11 Otú ọ dị, òtù Jọn sitere n’oge oké ọgba aghara nke agha ụwa nke mbụ ahụ pụta, na-enwe ịhụnanya maka Jehova na eziokwu ahụ, nke kpaliri ha iji ịnụ ọkụ n’obi na-ere ka ọkụ jeere ya ozi. Ha guzogidere ndị ahụ nwara iwebata ịrọ òtù dị iche iche site n’ime ka onyeisi oche mbụ nke Watch Tower Society, bụ́ Charles T. Russell, bụrụ arụsị a na-efe efe mgbe ọ nwụsịrị na 1916. Ebe mkpagbu na ihe isi ike dị iche iche nyeworo ha ọzụzụ, n’ụzọ doro anya, òtù ndị Kraịst nke a natara mkpebi ikpe nke “i mere nke ọma” site n’aka Onyenwe ha, na ọkpụkpọ òkù ịbanye n’ọṅụ ya. (Matiu 25:21, 23) Ha hụtara n’ụzọ ihe na-eme n’ụwa si na-aga, sitekwa n’ahụmahụ nke ha onwe ha, mmezu nke ihe ịrịba ama ahụ Jisọs nyere iji kaa ọnụnọ ya a na-adịghị ahụ anya n’ike Alaeze akara. Site 1919 gaa n’ihu, ha gara n’ihu ikere òkè ná mmezu ọzọ nke oké amụma ahụ Jisọs buru, sị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke alaeze eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi, ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwụgwụ ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 6:9, 10; 24:3-14) Ọ bụrụ na ọ dị mkpa ịkpalighachi ịhụnanya ha nwere maka Jehova, e mere ka ọ ghọọ oké ọkụ na-enwu enwu site n’oge ahụ gaa n’ihu.
12. (a) N’otu mgbakọ bụ ihe oké akụkọ na 1922, òkù dị aṅaa ka a kpọrọ? (b) Aha dị aṅaa ka ezi ndị Kraịst nakweere na 1931, gịnịkwa ka ha mere nchegharị na ya?
12 N’otu mgbakọ bụ ihe oké akụkọ, nke 18,000 n’ime ndị Kraịst ndị a bịara, na Cedar Point, Ohio, U.S.A., na September 5-13, 1922, a kpọrọ òkù ahụ bụ: “Laghachinụ n’ubi, unu ụmụ nke Chineke onye kasị ihe nile elu! . . . Ụwa aghaghị ịmara na Jehova bụ Chineke, na Jisọs Kraịst bụkwa Eze kasị ndị eze nile na Onyenwenụ kasị ndị nwenụ nile. . . . Ya mere, kpọsaanụ, kpọsaanụ, kpọsaanụ Eze ahụ na alaeze ya.” A nọ na-eme ka aha Jehova dị oké ọnụ ahịa pụtakwuo ìhè. Na 1931 ndị Kraịst ndị a, ndị zukọtara n’otu mgbakọ na Columbus, Ohio, U.S.A., ṅụrịrị ọṅụ n’ịnara aha ahụ nke Chineke wepụtara n’amụma Aịsaịa—Ndịàmà Jehova. (Aịsaịa 43:10, 12) Ná mbipụta ya nke March 1, 1939, a gbanwere aha nke akwụkwọ bụ́ isi nke nzukọ ahụ ji eme ihe ịbụ Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova, wee si otú a na-enye Onye Okike anyị na ọchịchị eze ya nsọpụrụ bụ́ isi. Ndịàmà Jehova, ndị nwere ịhụnanya e mere ka ọ dị ọhụrụ n’ebe Jehova nọ, echegharịwo n’ọdịda ọ bụla mbụ ha dawororịị n’inye aha ukwu na Alaeze ya nsọpụrụ na ibuli ha elu.—Abụ Ọma 106:6, 47, 48.
“Onye Na-emeri Emeri”
13. (a) Ngọzi dị aṅaa na-echere ndị Efesọs ahụ ma ọ bụrụ na ha ‘emerie’? (b) Olee otú ndị Kraịst nọ n’Efesọs ga-esi ‘nwee mmeri’?
13 N’ikpeazụ, dịkwa ka o mere n’ozi ndị ọzọ, Jisọs dọọrọ uche gaa ná mmụọ Chineke dị ka nke si n’ọnụ Jisọs na-eme ka a mara nkwụghachi ụgwọ dịịrị ikwesị ntụkwasị obi. Ọ gwara ndị Efesọs ahụ, sị: “Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa nzukọ Kraịst. Onye na-emeri emeri, ya ka m ga-ekwenye ka o rie mkpụrụ si n’osisi nke ndụ ahụ pụta, bụ́ nke dị na paradaịs nke Chineke.” (Mkpughe 2:7) Ọ ga-amasị ndị nwere ntị ịnụ ihe ige ntị n’ozi ahụ dị mkpa, na-amata na o siteghị n’echiche nke Jisọs n’onwe ya, kama na o sitere n’ebe Eze Onyenwe anyị Jehova nọ site ná mmụọ nsọ, ma ọ bụ ike ịrụ ọrụ Ya. Hà ga-esi aṅaa ‘merie’? Ọ bụ site n’ịgbasozu nzọụkwụ nile nke Jisọs, onye debere ikwesị ntụkwasị obi ya ruo ọnwụ, wee nwee ike ikwu, sị: “Nweenụ obi ike; mụ onwe m emeriwo ụwa.”—Jọn 8:28; 16:33; leekwa 1 Jọn 5:4.
14. Na gịnị ka “paradaịs nke Chineke” ahụ Jisọs kpọtụrụ uche na-aghaghị izo aka?
14 Ebe ha na-enweghị olileanya nke ịdị ndụ na paradaịs elu ala, olee otú o si bụrụ na ndị Kraịst e tere mmanụ, dị ka ndị ahụ nọ n’Efesọs, ga-anata ụgwọ ọrụ nke iri “mkpụrụ si n’osisi nke ndụ ahụ pụta, bụ́ nke dị na paradaịs nke Chineke”? Nke a apụghị ịbụ Paradaịs ahụ e weghachiri n’elu ala, ebe ọ bụ na 144,000 ndị Kraịst ahụ e tere mmanụ, gụnyere ndị ahụ nọ n’ọgbakọ dị n’Efesọs, bụ ndị a gbatara site n’etiti mmadụ iso Nwa Atụrụ ahụ, bụ́ Kraịst Jisọs, chịa achị n’Ugwu Zaịọn dị n’eluigwe dị ka ụmụ ndị bụ mmụọ. (Ndị Efesọs 1:5-12; Mkpughe 14:1, 4) Ya mere, izo aka e zoro n’ebe a aghaghị ịbụ n’ebe ahụ dị n’eluigwe nke yiri ubi a gbara ogige nke ndị a na-emeri emeri ga-eketa. N’ebe ahụ, “na paradaịs nke Chineke,” ee, n’ihu Jehova n’onwe ya, ndị mmeri ndị a ndị e kenyeworo anwụghị anwụ ga-anọgide na-adị ndụ ruo mgbe ebighị ebi, dị ka e sere onyinyo ya n’ebe a site na ha iri mkpụrụ si n’osisi nke ndụ ahụ.
15. N’ihi gịnị ka agbamume Jisọs inwe mmeri ji bụrụ ihe oké mmasị nye oké ìgwè mmadụ ahụ taa?
15 Mgbe ahụ, gịnị banyere ndị ahụ nọ n’elu ala, ndị ji ikwesị ntụkwasị obi na-akwado 144,000 ndị e tere mmanụ? Oké ìgwè mmadụ nke Ndịàmà ndị a na-esonyere ha na-enwekwa mmeri. Ma olileanya ha bụ nke ịbanye na paradaịs elu ala, ebe ha ga-aṅụ mmiri site ‘n’osimiri nke mmiri nke ndụ’ nwetakwa ngwọta site ‘n’akwụkwọ nke osisi ndị ahụ’ a kụrụ n’akụkụ osimiri ahụ. (Mkpughe 7:4, 9, 17; 22:1, 2) Ọ bụrụ na ị bụ otu n’ime òtù nke a, jisiekwa ike gosipụta ezi ịhụnanya i nwere n’ebe Jehova nọ wee nwee mmeri zuru ezu n’agha nke okwukwe gị. Otú a, ị ga-enweta obi ụtọ nke ndụ ebighị ebi n’elu ala bụ Paradaịs.—Tụlee 1 Jọn 2:13, 14.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka akụkọ ihe mere eme banyere mbilite nke ndị ozi ụgha, lee peji nke 37-44 nke akwụkwọ bụ́ Reasoning From the Scriptures, nke Ndịàmà Jehova bipụtara.
[Foto dị na peeji nke 36]
Otuto Ịhụnanya nye Jehova na Ọkpara Ya
N’akwụkwọ abụ ahụ ndị Jehova wepụtara na 1905, e nwere okpukpu abụọ nke ọnụ ọgụgụ abụ ndị na-eto Jisọs dị ka e nwere abụ ndị na-eto Jehova Chineke. N’akwụkwọ abụ ha nke 1928, ọ fọrọ nke nta ka ọnụ ọgụgụ abụ ndị na-eto Jisọs na ndị na-eto Jehova hara otu. Ma n’akwụkwọ abụ nke ikpeazụ anyị nke 1984, e ji ọnụ ọgụgụ abụ dị okpukpu anọ na-eto Jehova karịa ndị e ji eto Jisọs. Nke a kwekọrọ n’okwu ndị Jisọs kwuru n’onwe ya, sị: “Nna m ka mụ onwe m ukwuu.” (Jọn 14:28) Ịhụnanya maka Jehova aghaghị ịbụ ihe kasị ukwuu, nke ihe ga-esochi ya bụ ịhụnanya dị omimi n’ebe Jisọs nọ na inwe obi ekele maka àjà ya dị oké ọnụ ahịa na ọnọdụ ya dị ka Onyeisi Nchụàjà na Eze nke Chineke.
[Chaatị dị na peeji nke 34]
Usoro Ndụmọdụ Jisọs
(na-akpọtụ uche n’isi na amaokwu dị iche iche nke Mkpughe)
Ozi e ziri Ikike o Okwu ịja Nsogbu nke Ndozi na/ Ngọzi
ọgbakọ dị nwere inye mma e ji e mere ka ma ọ bụ sitere
iche iche ndụmọdụ meghee ọ pụta ìhè agbamume na ya
Efesọs 2:1 2:2, 3 2:4 2:5, 6 2:7
Smụana 2:8 2:9 — 2:10 2:11
Pagamọm 2:12 2:13 2:14, 15 2:16 2:17
Taịataịra 2:18 2:19 2:20, 21 2:24, 25 2:26-28
Sadis 3:1 — 3:1, 2 3:3, 4 3:5
Filadelfịa 3:7 3:8 — 3:8-11 3:12
Leọdisia 3:14 — 3:15-17 3:18-20 3:21