Isi nke 8
Ịgbalị Ịbụ Ndị Ga-enwe Mmeri
SMỤANA
1. (a) Ọgbakọ ọzọ dị aṅaa natara akwụkwọ ozi sitere n’aka Jisọs ahụ e meworo ka ọ dị ebube? (b) Site n’ịkpọ onwe ya “Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ,” gịnị ka Jisọs na-echetara ndị Kraịst nọ n’ọgbakọ ahụ?
TAA, Efesọs oge ochie bụ mkpọmkpọ ebe. Ma ebe ahụ e zijere akwụkwọ ozi nke abụọ nke Jisọs ka bụ ebe e nwere otu obodo nke jupụtara ná ndị mmadụ. N’ihe dị ka 35 maịlụ n’ebe ugwu site ná mkpọmkpọ ebe nile nke Efesọs ka e nwere obodo ahụ dị na Turkey bụ́ Izmir, ebe e nwere ọgbakọ Ndịàmà Jehova anọ na-anụ ọkụ n’obi ọbụna taa. Ebe a ka a kpọrọ Smụana na narị afọ mbụ. Ugbu a rịba ama okwu ọzọ Jisọs kwuru: “Degakwara mmụọ ozi nke nzukọ Kraịst dị na Smụana akwụkwọ, sị, Ihe ndị a ka ọ na-ekwu, bụ́ onye ahụ nke bụ Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ, onye ghọrọ onye nwụrụ anwụ, wee dịba ndụ.” (Mkpughe 2:8) Site n’ịgwa ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana okwu nke a, Jisọs na-echetara ha na ya bụ onye mbụ na-ekwesị ntụkwasị obi nke Jehova kpọlitere n’onwe ya gaa ná ndụ anwụghị anwụ dị ka mmụọ, bụrụkwa onye ikpeazụ e mere otú ahụ. Jisọs n’onwe ya gaje ịkpọlite ndị Kraịst ndị ọzọ nile e tere mmanụ. Otú a, o ruru nnọọ eru inye ụmụnna ya ndụmọdụ, bụ́ ndị na-ata ahụhụ, dị ka ya onwe ya tara ahụhụ, ndị nwekwara olileanya iso ya wee kerịta ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe.
2. N’ihi gịnị ka e ji kasie ndị Kraịst nile obi site n’okwu nile nke Onye ahụ “ghọrọ onye nwụrụ anwụ, wee dịba ndụ”?
2 Jisọs bụ onye ndú n’inwe ntachi obi na mkpagbu n’ihi ezi omume, ọ natakwara ụgwọ ọrụ zuru ezu. Ikwesị ntụkwasị obi ya ruo ọnwụ na mbilite n’ọnwụ ya bụ ebe ndabere nke olileanya ndị Kraịst nile. (Ọrụ 17:31) Eziokwu ahụ bụ na Jisọs “ghọrọ onye nwụrụ anwụ, wee dịba ndụ” na-anwapụta na ihe ọ bụla mmadụ na-aghaghị inwe ntachi obi wee gabiga n’ihi eziokwu ahụ agaghị ala n’efu. Mbilite n’ọnwụ Jisọs bụ ihe na-enye ndị Kraịst nile agbamume, karịsịa mgbe ha na-aghaghị ịta ahụhụ n’ihi okwukwe ha. Ị̀ bụ otu n’ime ndị ahụ? Ya bụrụ otú ahụ, ị pụkwara inweta agbamume site n’okwu ndị ọzọ Jisọs gwara ọgbakọ ahụ dị na Smụana:
3. (a) Agbamume dị aṅaa ka Jisọs nyere ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana? (b) Ọ bụ ezie na ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana bụ ndị ogbenye, n’ihi gịnị ka Jisọs ji sị na ha bụ ndị “ọgaranya”?
3 “Amatara m mkpagbu gị, na ogbenye ị bụ (ma ị bụ ọgaranya), na nkwulu Chineke nke ndị na-asị na ha bụ ndị Juu, ma ha abụghị, kama ha bụ ụlọ nzukọ Setan.” (Mkpughe 2:9) Jisọs enweghị okwu nkatọ ọ bụla ọ ga-agwa ụmụnna ya ndị nọ na Smụana, ọ bụ nanị okwu ịja mma. Ha atawo ahụhụ mkpagbu dị ukwuu n’ihi okwukwe ha. Ha bụ ndị ogbenye n’ụzọ ihe onwunwe, eleghị anya n’ihi ikwesị ntụkwasị obi ha. (Ndị Hibru 10:34) Otú ọ dị, ihe bụ isi nchegbu ha bụ ihe ime mmụọ, ha akpadowokwa akụ n’eluigwe, dị ka Jisọs gbara ume ka e mee. (Matiu 6:19, 20) N’ihi nke a, Onyeisi Ọzụzụ Atụrụ ahụ na-ele ha anya dị ka ndị bụ “ọgaranya.”—Tụlee Jemes 2:5.
4. Site n’aka ole ndị ka ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana nwetara mmegide dị ukwuu, oleekwa otú Jisọs si lee ndị mmegide ndị a anya?
4 Jisọs rịbara ama karịsịa na ndị Kraịst nọ na Smụana anagidewo mmegide dị ukwuu n’aka ndị Juu anụ ahụ. N’oge ochie, ọtụtụ ndị si n’agbụrụ nke a leziri anya megide mgbasa nke Iso Ụzọ Kraịst. (Ọrụ 13:44, 45; 14:19) Ugbu a, nanị iri afọ ole na ole mgbe Jerusalem dasịrị, ndị Juu ahụ nọ na Smụana na-egosipụtakwa otu mmụọ Setan ahụ. Ka a sịkwa ihe mere Jisọs ji lee ha anya dị ka “ụlọ nzukọ Setan”!a
5. Ọnwụnwa dịgasị aṅaa na-echere ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana?
5 N’ihi ịkpọasị dị otú ahụ nke na-eche ha ihu, Jisọs kasiri ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana obi, sị: “Atụla ahụhụ nile ị gaje ịhụ egwu: lee, Ekwensu gaje ịtụba ụfọdụ n’etiti unu n’ime ụlọ mkpọrọ, ka e wee nwaa unu; unu ga-enwekwa mkpagbu ụbọchị iri. Gosi onwe gị onye kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ, m ga-enyekwa gị okpueze ahụ, bụ́ ndụ.” (Mkpughe 2:10) N’ebe a, Jisọs jiri ụdị okwu Grik ahụ bụ maka “unu” mee ihe ugbo atọ, na-egosi na okwu ndị a metụtara ọgbakọ ahụ dum. Jisọs apụghị ikwe nkwa na ọnwụnwa a na-anwa ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana ga-akwụsị n’oge na-adịghị anya. A ga-anọgide na-akpagbu ụfọdụ n’ime ha, na-atụba ha n’ime ụlọ mkpọrọ. Ha ga-enwe mkpagbu “ụbọchị iri.” Iri bụ ọnụ ọgụgụ nke na-anọchi anya izu ezu ma ọ bụ akụkụ dum n’ihe banyere elu ala. Ọbụna ndị ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi bụ́ ọgaranya n’ime mmụọ ga-anata ule zuru ezu mgbe ha nọ n’anụ ahụ.
6. (a) N’ihi gịnị ka ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana na-ekwesịghị ịtụ egwu? (b) Olee otú Jisọs si mechie ozi o zijeere ọgbakọ ahụ dị na Smụana?
6 N’agbanyeghị nke ahụ, ndị Kraịst nọ na Smụana ekwesịghị ịtụ egwu ma ọ bụ kwenyere ndị ahụ na-akpagbu ha. Ọ bụrụ na ha anọgide n’ikwesị ntụkwasị obi ruo ọgwụgwụ, ha nwere ụgwọ ọrụ na-echere ha nke bụ “okpueze ahụ, bụ́ ndụ,” nke bụ, n’ọnọdụ ha, ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe. (1 Ndị Kọrint 9:25; 2 Timoti 4:6-8) Pọl onyeozi lere ihe mgbata n’ọsọ nke a anya dị ka ihe ruru eru iji ihe nile ọzọ chụọ àjà n’ihi ya, ọbụna ndụ ya n’elu ala. (Ndị Filipaị 3:8) Ihe àmà gosiri na ndị ahụ na-ekwesị ntụkwasị obi nọ na Smụana nwere otu echiche ahụ. N’ihi nke a, Jisọs mechiri ozi ya site n’ịsị: “Onye nwere ntị, ya nụ ihe mmụọ nsọ na-agwa nzukọ Kraịst. Onye na-emeri emeri, a gaghị emejọ ya site n’ọnwụ nke abụọ ahụ.” (Mkpughe 2:11) Nye ndị ahụ na-emeri emeri, e nwere olileanya ahụ e ji n’aka nke ndụ anwụghị anwụ n’eluigwe nke ọnwụ na-apụghị igbochi.—1 Ndị Kọrint 15:53, 54.
“Mkpagbu Ụbọchị Iri”
7, 8. Dị ka ọgbakọ ahụ dị na Smụana, n’ụzọ dị aṅaa ka ọgbakọ ndị Kraịst si nweta ‘ọnwụnwa n’ụzọ zuru ezu’ na 1918?
7 Dị nnọọ ka ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana, òtù Jọn na ndị na-esonyere ha taa bụ ndị ‘a na-anwa n’ụzọ zuru ezu.’ Ikwesị ntụkwasị obi ha n’okpuru ọnwụnwa na-anwapụta na ha bụ ndị nke Chineke. (Mak 13:9, 10) N’oge na-adịghị anya ka ụbọchị Onyenwe anyị ahụ malitere, okwu Jisọs gwara ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana wetaara ìgwè nta zuru mba nile nke ndị Jehova ezi nkasi obi. (Mkpughe 1:10) Kemgbe 1879, ndị a anọgidewo na-egwupụta site n’Okwu Chineke, akụ ime mmụọ ndị ha jiworo afọ ofufo kesaa n’etiti ha na ndị ọzọ. Ma n’oge Agha Ụwa Mbụ ha zutere oké ịkpọasị na mmegide, n’otu akụkụ n’ihi na ha amabanyeghị n’ọgba aghara nke agha ahụ, n’akụkụ nke ọzọ n’ihi na ha ji atụghị egwu na-agbaba njehie nile nke Krisendọm ọtọ. Mkpagbu ahụ nke ụfọdụ ndị ndú Krisendọm kpataara ha kachasịrị njọ na 1918, a pụkwara iji ya tụnyere ihe ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana natara n’aka òtù ndị Juu nọ n’ebe ahụ.
8 Oké mkpagbu e nwere na United States of America karịsịrị njọ mgbe a tụrụ onyeisi oche ọhụrụ nke Watch Tower Society, bụ́ Joseph F. Rutherford na ndị òtù ya asaa mkpọrọ na June 22, 1918, nke e kwuru na ọtụtụ n’ime ha ga-anọ 20 afọ n’ụlọ mkpọrọ. A napụtara ha n’akaebe mgbe ọnwa itoolu gasịrị. Na May 14, 1919, ụlọikpe mkpegharị ikpe nke mba ahụ mesịrị kachapụ ebubo ụgha nile e boro ha; e gosipụtara na e nwere 130 ihe ndị e mehiere emehie n’ikpe ahụ e kpere ha. Judge Manton, bụ́ onye Roman Katọlik, onye bụkwa onye knight nke òtù St. Gregory Onye Ukwu, onye na-ekweghị ka a napụta ndị Kraịst ndị a n’akaebe na 1918, ka e mesịrị maa ikpe, na 1939, ije mkpọrọ afọ abụọ na ịkwụ nha $10,000 n’ihi ịrịọ na ịnara ego awụufu ugbo isii.
9. Olee otú Hitler si mesoo Ndịàmà Jehova nọ na Nazi Germany, gịnị bụkwa mmeghachi omume nke ndị ụkọchukwu?
9 N’oge ọchịchị ndị Nazi na Germany, Hitler machibidoro nkwusa nke Ndịàmà Jehova iwu kpam kpam. Ruo ọtụtụ afọ, a tụrụ ọtụtụ puku Ndịàmà mkpọrọ obi ọjọọ n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche, bụ́ ebe ọtụtụ n’ime ha nwụrụ, ihe dị ka 200 ụmụ okorobịa jụkwara ịbanye n’usuu ndị agha Hitler. E nwere ihe àmà nke nkwado ndị ụkọchukwu nyere ihe a nile n’okwu otu onye ụkọchukwu Katọlik kwuru, nke e bipụtara n’akwụkwọ bụ́ The German Way nke May 29, 1938. Ihe ụfọdụ o kwuru bụ: “Ugbu a, e nwere otu mba n’elu ala ebe a machibidoro ndị ahụ a na-akpọ . . . Ndị Mmụta Bible [Ndịàmà Jehova] iwu. Ọ bụ na Germany! . . . Mgbe Adolf Hitler weere ike ọchịchị, mgbe ndị òtù Catholic Episcopate nke Germany rịọghachikwara arịrịọ ha, Hitler sịrị: ‘Ndị ahụ a na-akpọ Ndị Na-amụsị Bible Ike [Ndịàmà Jehova] bụ ndị na-akpata nsogbu; . . . ana m ele ha anya dị ka ndị bụ́ adịgboroja; agaghị m ekwenye ka onye America nke a bụ Judge Rutherford tetọọ ndị Katọlik bụ́ ndị Germany n’ụzọ dị otú a; ana m etisasị [Ndịàmà Jehova] na Germany.’” Onye ụkọchukwu ahụ kwukwasịrị okwu ịja mma, sị: “Odogwu!”
10. (a) Ka ụbọchị Onyenwe anyị gaworo n’ihu, mkpagbu dị aṅaa ka Ndịàmà Jehova cheworo ihu? (b) Gịnị na-esikarị na ya apụta mgbe ndị Kraịst ndị a lụrụ ọgụ iji nweta inwere onwe nke okpukpe n’ụlọikpe?
10 Ka ụbọchị Onyenwe anyị gaworo n’ihu, Agwọ ahụ na mkpụrụ ya adịbeghịkwa mgbe ọ bụla ha kwụsịrị ịlụ ọgụ megide ndị Kraịst e tere mmanụ na ndị na-esonyere ha. A tụwo ọtụtụ n’ime ndị a mkpọrọ, kpagbuokwa ha n’ụzọ jọgburu onwe ya. (Mkpughe 12:17) Ndị iro ndị ahụ anọgidewo “na-eji ụkpụrụ kpụzie mmegbu,” ma ndị Jehova anọgidesiwo ike na-ekwu, sị: “Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karị mmadụ.” (Abụ Ọma 94:20; Ọrụ 5:29) Na 1954, magazin Ụlọ Nche (Bekee) kọrọ, sị: “Ihe karịrị iri mba asaa, n’otu oge ma ọ bụ n’oge ọzọ n’ime iri afọ anọ gara aga, enyewo iwu mgbochi, kpagbuokwa Ndịàmà Jehova.” N’ebe ndị o kwere omume ịchọ nnwere onwe okpukpe n’ụlọikpe, ndị Kraịst ndị a emewo otú ahụ, nwetakwa oké mmeri dị iche iche n’ọtụtụ mba. Nanị n’ụlọikpe Supreme Court nke mba United States, Ndịàmà Jehova enwewo mmeri n’ikpe 50.
11. Amụma dị aṅaa nke Jisọs banyere ihe ịrịba ama nke ọnụnọ ya mezuworo n’ahụ Ndịàmà Jehova n’ime ụbọchị Onyenwe anyị?
11 Ọ dịbeghị òtù ọ bụla ọzọ n’akụkọ ihe mere eme nke jiworo iwu Jisọs ahụ bụ ịkwụghachi Siza ihe nke Siza kpọrọ mkpa otú a. (Luk 20:25; Ndị Rom 13:1, 7) Ma, ọ dịbeghị òtù ọ bụla ọzọ nke a tụrụ ndị òtù ha mkpọrọ n’ọtụtụ ala n’okpuru ụdị ọchịchị dị iche iche otú a, nke a nọgidekwara na-eme ruo ugbu a na kọntinent ndị dị n’America, na Europe, n’Africa, nakwa n’Esia. Oké amụma Jisọs banyere ihe ịrịba ama ahụ nke ọnụnọ ya gụnyere okwu ndị a: “Mgbe ahụ ka ha ga-arara unu nye ná mkpagbu, ha ga-egbukwa unu: mba nile ga-akpọkwa unu asị n’ihi aha m.” (Matiu 24:3, 9) N’ezie, nke a emezuwo n’ime ụbọchị Onyenwe anyị n’ahụ ndị Kraịst bụ Ndịàmà Jehova.
12. N’ụzọ dị aṅaa ka òtù Jọn ahụ siworo wusie ndị Chineke ike megide mkpagbu?
12 Iji wusie ndị Chineke ike megide mkpagbu, òtù Jọn ahụ anọgidewo na-echetara ha isi ihe dị n’okwu Jisọs gwara ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana. Dị ka ihe atụ, ka mkpagbu nke ndị Nazi na-amalite, Ụlọ Nche (Bekee) na 1933 na 1934 nwere isiokwu ndị dị ka “Unu Atụla Ha Egwu,” nke kọwara Matiu 10:26-33; “Oké Ule Ahụ,” nke dabeere na Daniel 3:17, 18; na “Ọnụ Ọdụm,” nke nwere Daniel 6:22 dị ka akụkụ akwụkwọ nsọ bụ́ isi ọ dabeere na ya. N’afọ ndị 1980, bụ́ mgbe e bipụtara akwụkwọ a na nke mbụ ya nakwa mgbe Ndịàmà Jehova nwetara oké mkpagbu n’ihe karịrị ala 40, Ụlọ Nche wusiri ndị Chineke ike site n’isiokwu ndị dị ka “Inwe Obi Ụtọ n’Agbanyeghị Ịbụ Ndị A Na-esogbu!” na “Ndị Kraịst, Jirinụ Ntachi Obi Nagide Nsogbu.”b
13. Dị ka ndị Kraịst nọ na Smụana, n’ihi gịnị ka ndị Kraịst bụ́ Ndịàmà Jehova na-atụbeghị egwu mkpagbu?
13 N’ezie, ndị Kraịst bụ Ndịàmà Jehova na-enwe mkpagbu na ule ndị ọzọ n’anụ ahụ ruo ụbọchị iri nke ihe atụ. Dị ka ndị Kraịst ahụ nọ na Smụana oge ochie, ha adịghị atụ egwu; onye ọ bụla n’ime anyị ekwesịghịkwa ịtụ egwu ka nsogbu dị iche iche na-adịwanye njọ n’elu ala ebe a. Anyị dị njikere inwe ntachi obi ná mkpagbu, jirikwa ọṅụ nara ọbụna ‘mpụnara nke a na-apụnara anyị ihe nile anyị nwere.’ (Ndị Hibru 10:32-34) Site n’ịmụ Okwu Chineke na ime ka ọ bụrụ nke anyị, a ga-akwadebe anyị iguzosi ike n’okwukwe. Jide n’aka na Jehova pụrụ, ọ ga-echebekwa gị n’ikwesị ntụkwasị obi gị. “Na-atụkwasịnụ ya nchegbu nile unu na-echegbu onwe unu, n’ihi na ihe nile banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 Pita 5:6-11.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a N’ihe dị ka 60 afọ mgbe Jọn nwụsịrị, e suru Polycarp onye dị 86 afọ ọkụ na Smụana n’ihi na o kweghị agọnarị okwukwe ya n’ebe Jisọs nọ. Akwụkwọ ahụ bụ The Martyrdom of Polycarp, nke e kwenyere na e dere ya n’oge ihe a mere, kwuru na mgbe a na-achịkọta nkụ iji suo ya ọkụ, “ndị Juu nwere ịnụ ọkụ n’obi dị ukwuu, dị ka ha na-emekarị, n’inye aka na nke a”—ọ bụ ezie na ogbugbu ahụ weere ọnọdụ “n’oké ụbọchị Sabat.”
b Lee Ụlọ Nche nke November 1, 1933; October 1 na 15, December 1 na 15, 1934 (Bekee); November 1, 1983.
Igbe/Foto dị na peeji nke 39]
Ruo ọtụtụ afọ, ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme anọgidewo na-ewepụta ihe àmà metụtara ikwesị ntụkwasị obi nke ndịàmà Jehova bụ ndị Germany n’oge ọchịchị ndị Nazi. Akwụkwọ ahụ bụ Mothers in the Fatherland, nke onye ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ Claudia Koonz dere, nke e bipụtara na 1986, kwuru nke a: “Ihe ka nnọọ ọtụtụ ná ndị Germany nile ndị a na-azụliteghị n’ụkpụrụ ndị Nazi chọtara ụzọ ha ga-esi dịrị ndụ n’okpuru ọchịchị ha kpọrọ asị. . . . Ná nsọtụ nke ọzọ nke ngụkọ na ụkpụrụ echiche ahụ, e nwere 20,000 Ndịàmà Jehova ndị, n’otu n’otu, jụwara isi igosi ụdị ọ bụla nke nrubeisi nye ọchịchị ndị Nazi ahụ. . . . Ndị kasị guzosie ike n’imegide ha bụ ndị okpukpe ha kwadoro. Site ná mmalite, Ndịàmà Jehova ekwenyeghịrị akụkụ ọ bụla nke ọchịchị ndị Nazi ahụ. Ọbụna mgbe ndị Gestapo bibiri isi ụlọ ọrụ ha dị ná mba ahụ na 1933, machibidokwa òtù ahụ iwu na 1935, ha jụrụ ime ọbụna ihe dị nta dị ka ịsị ‘Heil Hitler.’ Ihe dị ka ọkara (nke ọtụtụ n’ime ha bụ ndị ikom) nke Ndịàmà Jehova ka e zijere n’ogige ịta ahụhụ dị iche iche, e gburu otu puku n’ime ha, otu puku ọzọ nwụkwara n’agbata 1933 na 1945. . . . Ndị Katọlik na ndị Protestant nụrụ ka ndị ụkọchukwu ha na-agba ha ume ịkwado Hitler. Ọ bụrụ na ha eguzogide ya, ha na-eme nke a megide iwu nke ma chọọchị ma ọchịchị.”