Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Olee Ndị Ka A Mụrụ Ọzọ?
    Ụlọ Nche—1992 | Nọvemba 15
    • Olee Ndị Ka A Mụrụ Ọzọ?

      NDỊ ezi omume nile hà na-aga eluigwe? Ọtụtụ na-eche otú ahụ, ma Jisọs Kraịst ekwenyeghị. Ka ọ na-agwa onye ọchịchị ndị Juu bụ́ Nikọdimọs, bụ́ onye bịakwutere ya ná nzuzo n’abalị, okwu, Jisọs sịrị: “Ọ dịghịkwa onye ọ bụla rịgoworo n’eluigwe.”—Jọn 3:13.

      Ma, Jisọs mere ka Nikọdimọs mata na oge ga-abịa mgbe ndị ụfọdụ ga-enwe ohere ịba n’Alaeze eluigwe. Banyere nke a Jisọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na a mụghị mmadụ site na mmiri na mmụọ nsọ, ọ pụghị ịba n’alaeze Chineke. Nke a mụworo site n’anụ ahụ bụ anụ ahụ; nke a mụwokwara site na mmụọ nsọ bụ mmụọ. Ka ọ ghara iju gị anya na m sịrị gị, A ghaghị ịmụ unu ọzọ.” Ma Nikọdimọs nwere ijuanya otú a pụrụ isi mụọ mmadụ ọzọ.—Jọn 3:1-9.

      Ma eleghị anya gị onwe gị nwekwara ihe ijuanya banyere ihe Jisọs bu n’uche. Okwu ya hà pụrụ ịbụ ahụmahụ ntọghata mberede nke ọtụtụ ndị na-eche na mmụọ nsọ Chineke ejupụtawo n’ime ha, na-ekwu na ha nwere?

      Mmetụta Dị Iche Iche na Uche

      Ụfọdụ na-asị na n’ịmata ma à mụwo mmadụ ọzọ, ihe dị mkpa bụ inwe mmetụta nke ike mmụọ ahụ. Ma, obi na uche anyị pụrụ iduhie anyị, karịsịa ma ọ bụrụ na mmetụta uche dị ike na-akpa ha ike n’ahụ.—Jeremaịa 17:9.

      William Sargant, onye nnyocha banyere ihe ndị na-apụta site ná mmetụta ndị mmetụta uche na-enwe n’ebe uche dị, na-ehota mkpa nke “anyị ịnọ ná nche megide nkwenkwe ndị e nwetara mgbe a nọ n’ọnọdụ nke mkpali mmetụta uche mgbe ụbụrụ anyị pụrụ ịdị na-eduhie anyị.” Dị ka Sargant kwuru, otu ihe atụ bụ mmetụta nke nkwusa ndị okpukpe ntụteghachi na iyi egwu nke ntaramahụhụ n’ọkụ ala mmụọ. Olee onye na-agaghị achọ ịbụ onye a mụrụ ọzọ iji gaa eluigwe ma ọ bụrụ na nhọrọ e nwere nanị ya bụ ịta ahụhụ ná mmekpa ahụ ebighị ebi? Sargant na-asị na n’okpuru nrụgide mmetụta uche dị otú a, “a na-ewezụga ezi uche n’ụsọ, a na-akụsịtụ usoro ụbụrụ na-ejikarị arụ ọrụ, a na-anakwere echiche na nkwenkwe ndị ọhụrụ n’ajụghị ajụjụ.”—The Mind Possessed.

      Ya mere, olee otú mmadụ pụrụ isi mara ma nkwenkwe e nwere banyere ịmụ ọzọ ọ bụ nke “a nakweere n’ajụghị ajụjụ”? Ụzọ nke amamihe bụ ịbụ onye e duziri site n’ihe ọ bụla nke mmụọ nsọ Chineke mere ka ndị so dee Bible detuo. A na-agba ndị Kraịst ume ife Chineke ofufe ‘dị ka uche ha si dị,’ ọ dịkwa ha mkpa ijide n’aka na ihe ha kwenyere na ya bụ eziokwu.—Ndị Rom 12:1, 2; 1 Ndị Tesalọnaịka 5:21.

      Ịbụ onye a mụrụ ọzọ na-emeghepụ otu n’ime ùgwù ndị kasị elu e nyetụworo ụmụ mmadụ. E jikọrọ ya na otu ihe omume dị ịrịba ama n’ezie ná mmezu nke nzube Chineke. Ebe ọ bụ ezie na ihe a dum bụ eziokwu, ajụjụ ụfọdụ dị ka ndị a na-ebilite: Olee ndị ka a mụrụ ọzọ? Olee otú nke a si eme? Olileanya ndị dị aṅaa ka a na-esetịpụrụ ndị dị otú ahụ? Ọ̀ bụkwa nanị ha ka a ga-azọpụta?

  • Ihe Mere E Ji Mụọ Ụfọdụ Ọzọ
    Ụlọ Nche—1992 | Nọvemba 15
    • Ihe Mere E Ji Mụọ Ụfọdụ Ọzọ

      “ỌBỤRỤ na a mụghị mmadụ ọzọ, ọ pụghị ịhụ alaeze Chineke anya.” (Jọn 3:3) Okwu ndị ahụ emewo ọtụtụ ndị obi ụtọ, meekwa ka ha nwee ijuanya eri mgbe Jisọs Kraịst kwuru ha n’ihe karịrị 1,900 afọ gara aga.

      Maka nghọta kwesịrị ekwesị nke okwu Jisọs banyere ịbụ onye a mụrụ ọzọ, anyị aghaghị ibu ụzọ zaa ajụjụ ndị a: Gịnị bụ nzube Chineke maka agbụrụ mmadụ? Gịnị na-eme mkpụrụ obi mgbe a nwụrụ? Gịnị ka e zubere ka Alaeze Chineke mee?

      Nzube Chineke Maka Ihe A Kpọrọ Mmadụ

      E kere nwoke mbụ bụ́ Adam ịbụ ọkpara mmadụ zuru okè nke Chineke. (Luk 3:38) Ọ dịghị mgbe Jehova Chineke zubere na Adam ga-anwụ. Adam na nwunye ya, bụ́ Iv, nwere olileanya nke iwepụta ezinụlọ mmadụ na-enweghị mmehie nke ga-adị ndụ ebighị ebi ma jupụta elu ụwa paradaịs. (Jenesis 1:28) Ọnwụ abụghị akụkụ nke nzube mbụ Chineke maka nwoke na nwanyị. Ọ batara n’ógbè ụmụ mmadụ nanị dị ka ihe sitere n’inupụrụ iwu Chineke isi.—Jenesis 2:15-17; 3:17-19.

      Nnupụisi nke a welitere nnukwu ihe iseokwu banyere omume ọma, dị ka izi ezi nke ọkaaka Chineke na ikike ụmụ mmadụ nwere ịnọgide na-ekwesị ntụkwasị obi nye iwu ya nile. A ga-achọ oge iji dozie ihe iseokwu ndị a. Ma nzube Jehova Chineke maka ihe a kpọrọ mmadụ agbanweghị, ọ pụghịkwa ịda ada n’ihe ọ malitere ime. O zubesiri ike iji ezinụlọ mmadụ zuru okè nke ga-adị ndụ ebighị ebi n’ime Paradaịs mejupụta ụwa. (Abụ Ọma 37:29; 104:5; Aịsaịa 45:18; Luk 23:43) Anyị aghaghị iburu eziokwu nke a bụ isi n’uche mgbe anyị na-atụle okwu Jisọs banyere ịmụ ọzọ.

      Gịnị Na-eme Mkpụrụ Obi Mgbe A Nwụrụ?

      N’amaghị ihe mmụọ nsọ Chineke kpugheworo nye ndị so dee Bible, ndị ọkà ihe ọmụma Gris gbalịsiri ike ịchọta ihe ndụ pụtara. Ha apụghị ikwenye na e zubere ka mmadụ bie nanị afọ ole na ole, ọtụtụ mgbe n’ọnọdụ ndị jọgburu onwe ha, wee mesịa kwụsị ịdị adị. Na nke a ha ziri ezi. Ma ná nkwubi okwu ha nile banyere olileanya mmadụ mgbe a nwụsịrị, ha hiere ụzọ. Ha kwubiri na ịdị adị mmadụ na-aga n’ihu n’ụdị ọzọ mgbe a nwụsịrị, na n’ime onye ọ bụla e nwere mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ.

      Echiche ndị dị otú ahụ metụtara ndị Juu na ndị Kraịst egbugbere ọnụ. Akwụkwọ bụ́ Heaven—A History na-asị: “Ebe ọ bụla ndị Juu ahụ a chụlagasịrị mba ọzọ zutere ndị okè amamihe Gris, echiche nke mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ na-ebilite.” Akwụkwọ ahụ na-ekwukwa, sị: “Ozizi ndị Gris banyere mkpụrụ obi nwere mmetụta na-adịgide adịgide ná nkwenkwe ndị Juu na e mesịa nke ndị Kristian. . . . Site n’iguzobe njikọ dị n’otu nke ọkà ihe ọmụma Plato na omenala Bible, Philo [onye Juu bụ ọkà ihe ọmụma na narị afọ mbụ n’Alexandria] meghere ụzọ maka ndị nchepụta ihe bụ́ ndị Kraịst bụ́ ndị sochirinụ.”

      Gịnị ka Philo kwenyere? Otu akwụkwọ ahụ gara n’ihu ịsị: “Nye ya, ọnwụ na-eweghachi mkpụrụ obi n’ọnọdụ mbụ ya, tupu ọmụmụ. Ebe mkpụrụ obi dịịrị ụwa nke ndị mmụọ, ndụ n’ime ahụ na-aghọ nanị ahụmahụ dị mkpirikpi, ọtụtụ mgbe nke na-adịghị enye obi ụtọ.” Otú ọ dị, ‘ọnọdụ tupu ọmụmụ’ nke Adam bụ adịghị adị. Dị ka ihe ndekọ Bible na-ekwu, ọ dịghị mgbe Chineke zubere mbufe n’otu ntabi anya gaa n’ógbè obibi ọzọ mgbe a nwụrụ, dị ka a ga-asị na ụwa bụ nanị ebe nkwadebe maka ọdịdị dị elu karị ma ọ bụ dị ala karị.

      E zighị nkwenkwe nke na mkpụrụ obi mmadụ adịghị anwụ anwụ n’Okwu Chineke nke mmụọ nsọ nyere ike e ji dee ya bụ́ Bible. O jighị okwu ahụ bụ “mkpụrụ obi na-adịghị anwụ anwụ” mee ihe ọbụna otu ugbo. Ọ na-ekwu na e kere Adam dị ka mkpụrụ obi, ọ bụghị na o nyere ya mkpụrụ obi. Jenesis 2:7 na-asị: “Jehova, bụ Chineke, wee were ájá sitere n’ala kpụọ mmadụ, o wee kuo ume ndụ nye n’oghere imi ya abụọ; mmadụ ahụ wee ghọọ mkpụrụ obi di ndụ.” Ọ dịghị mgbe e chere n’ihu ihe a kpọrọ mmadụ olileanya nke ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ ahụhụ ebighị ebi n’ọkụ ala mmụọ. Bible na-egosi na mkpụrụ obi, ma ọ bụ onye, nke nwụrụnụ adịghị ama ihe ọ bụla. (Abụ Ọma 146:3, 4; Eklisiastis 9:5, 10; Ezikiel 18:4) Ya mere, ndị ọkà ihe ọmụma anakwerewo echiche ndị na-adịghị n’Akwụkwọ Nsọ banyere mkpụrụ obi. Ọ dị anyị mkpa ịnọ na nche megide echiche ndị pụrụ ikpu nghọta anyị ìsì banyere okwu ndị Jisọs kwuru banyere ịmụ ọzọ.

      Ịbụ Ndị A Mụrụ Ọzọ Ịchị Achị dị ka Ndị Eze

      Jisọs gwara Nikọdimọs na ndị a ‘mụrụ ọzọ na-aba n’alaeze Chineke.’ (Jọn 3:3-5) Gịnị bụ Alaeze ahụ? N’okwu ihe atụ, ná mmalite nke akụkọ ihe mere eme nke mmadụ, Jehova Chineke mere ka a nụ nzube ya iji “mkpụrụ” pụrụ iche—onye ọchịchị na-abịa abịa—chifịa isi nke Agwọ ochie ahụ, Setan bụ Ekwensu. (Jenesis 3:15; Mkpughe 12:9) Dị ka e ji nwayọọ nwayọọ kpughee ya n’Akwụkwọ Nsọ, a matara “mkpụrụ” nke a ịbụ Jisọs Kraịst, onye ya na ndị ọchịchị ibe ya na-achị achị ná ngosipụta pụrụ iche nke ọkaaka Chineke, bụ́ Alaeze Mesaịa ahụ. (Abụ Ọma 2:8, 9; Aịsaịa 9:6, 7; Daniel 2:44; 7:13, 14) Nke a bụ Alaeze eluigwe ahụ, gọọmenti dị n’eluigwe nke ga-ewepụ ọkaaka Jehova n’ụta ma napụta ihe a kpọrọ mmadụ site n’ịbụ ohu nye mmehie na ọnwụ.—Matiu 6:9, 10.

      Ndị e jikọrọ ha na Jisọs bụ 144,000 ndị ọchịchị ibe, bụ́ ndị ya a gbatara n’etiti ihe a kpọrọ mmadụ. (Mkpughe 5:9, 10; 14:1-4) Chineke ahọrọwo ụfọdụ ndị site n’ezinụlọ mmadụ na-ezughi okè nke Adam ịbụ ndị a bụ “ndị nsọ nke Onye ahụ nke Kachasị Ihe Nile Elu,” ndị so Kraịst na-achị n’Alaeze Mesaịa ahụ. (Daniel 7:27; 1 Ndị Kọrint 6:2; Mkpughe 3:21; 20:6) Ndị ikom na ndị inyom ndị a na-etinye okwukwe na Jisọs Kraịst, onye kwuru na a ‘ga-amụ ha ọzọ.’ (Jọn 3:5-7) Olee otú, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị ka ọmụmụ a ji ewere ọnọdụ?

      E mewo ndị a baptism n’ime mmiri dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst. Chineke agbagharawo mmehie ha dum ná ndabere nke àjà mgbapụta Jisọs, kpọọ ha ndị ezi omume, ma nabata ha dị ka ụmụ ime mmụọ. (Ndị Rom 3:23-26; 5:12-21; Ndị Kọlọsi 1:13, 14) Nye ndị dị otú ahụ, Pọl onyeozi sịrị: “Unu natara mmụọ nke ido ka nwa nwoke, nke anyị na-eti mkpu n’ime ya, sị, Aba, Nna. Mmụọ nsọ onwe ya sooro mmụọ anyị na-agba àmà, na anyị bụ ụmụ Chineke: ma ọ bụrụ na anyị bụ ụmụ, anyị bụkwa ndị nketa; ndị nketa nke Chineke, na ndị ha na Kraịst na-ekekọ; ma ọ bụrụ na ọ bụ ezie na anyị na ya na-ahụkọ ahụhụ, ka e wee nyekọọkwa anyị na ya otuto.”—Ndị Rom 8:15-17.

      Dị ka ndị na-eso ụzọ Kraịst, ndị a enwetawo ọmụmụ ọhụrụ, ma ọ bụ mmalite ọhụrụ, ná ndụ. O mewo ka obi sie ha ike na ha ga-eketa òkè n’ihe nketa eluigwe nke Jisọs. (Luk 12:32; 22:28-30; 1 Pita 1:23) Pita onyeozi kọwara mmụghachi ahụ n’ụzọ dị otú a: “[Chineke] mụrụ anyị ọzọ, dị ka oké ebere ya si dị, ka anyị wee nwee olileanya dị ndụ, site ná mbilite n’ọnwụ ahụ nke Jisọs Kraịst si ná ndị nwụrụ anwụ bilite, ka anyị wee keta nketa nke a na-apụghị imebi, nke a na-adịghị emerụkwa emerụ, nke na-adịghị atalatakwa, nke e debeworo n’eluigwe nye unu.” (1 Pita 1:3, 4) Ndụ ọhụrụ nke a n’eluigwe na-ekwe ndị dị otú ahụ nnweta n’ihi na Chineke na-akpọlite ha n’ọnwụ dị ka ọ kpọlitere Jisọs.—1 Ndị Kọrint 15:42-49.

      Gịnị Banyere Ụwa?

      Nke a apụtaghị na a ga-emesịa mụọ ihe nile a kpọrọ mmadụ na-erube isi ọzọ isi n’elu ụwa gaa n’eluigwe. Echiche hiere ụzọ dị otú ahụ yiri nke ndị ọkà ihe ọmụma dị ka Philo nwere, bụ́ onye kụziri na “ndụ n’ime ahụ [bụ] nanị ahụmahụ dị mkpirikpi, ọtụtụ mgbe nke na-adịghị enye obi ụtọ.” Ma ọ dịghị ihe dị njọ n’ihe mbụ Jehova Chineke kere n’elu ụwa.—Jenesis 1:31; Deuterọnọmi 32:4.

      Ọ dịghị mgbe e zubere ka ndụ mmadụ bụrụ ihe dị mkpirikpi na nke ihe mgbu. Jisọs Kraịst na ndị ahụ a mụrụ ọzọ isoro ya jee ozi dị ka ndị eze na ndị nchụàjà n’eluigwe ga-ewepụ mmerụ ahụ nile sitere ná nnupụisi Setan. (Ndị Efesọs 1:8-10) Site na ha dị ka “mkpụrụ Abraham” ahụ e kwere ná nkwa, “mba nile nke ụwa ga-agọzi onwe ha.” (Ndị Galetia 3:29; Jenesis 22:18) Nye ihe a kpọrọ mmadụ na-erube isi nke a ga-apụta ndụ n’elu ụwa bụ paradaịs, dịwaga nnọọ iche site n’ịdị adị ruo mkpirikpi oge nke jupụtara n’ihe mgbu nke a na-adị taa.—Abụ Ọma 37:11, 29; Mkpughe 21:1-4.

      Olee Ndị Ga-erite Uru?

      Ndị nwụrụ anwụ a kpọlitere bụ́ ndị gosipụtara okwukwe n’àjà mgbapụta Jisọs ga-eso ná ndị ga-erite uru site ná ndokwa Chineke mere maka ngọzi nke ihe a kpọrọ mmadụ. (Jọn 5:28, 29; Ọrụ 24:15) Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’ime ha adịbeghị mgbe ha mụrụ banyere Chineke na Kraịst, n’ihi ya kwa ha apụghị igosipụta okwukwe na Jisọs. Ndị a kpọlitere ga-agụnyekwa ndị okwukwe dị ka Jọn Onye Na-eme Baptism, onye nwụrụ tupu ọnwụ Jisọs emepee ụzọ maka ndụ eluigwe. (Matiu 11:11) E wezụga ndị a, ‘oké ìgwè mmadụ site ná mba nile asawo uwe mwụda ha, meekwa ka ha dị ọcha n’ọbara Nwa Atụrụ ahụ,’ bụ́ Jisọs Kraịst. Ha na-azaghachi nke ọma n’ọrụ nkwusa Alaeze nke “ụmụnna” Jisọs a mụrụ ọzọ na-ebute ụzọ na ya, ha ga-alanarịkwa agha Chineke nke Amagedọm ibi ndụ n’ụwa e meworo ka ọ dị ọcha. (Mkpughe 7:9-14; 16:14-16; Matiu 24:14; 25:31-46) Ya mere, ná nhazi ihe nke Chineke, a ga-azọpụta ọtụtụ nde mmadụ, ọ bụ ezie na a mụghị ha ọzọ iso Kraịst chịa n’eluigwe.—1 Jọn 2:1, 2.

      Ị̀ ga-eso na ndị ga-eketa ndụ na paradaịs elu ụwa? Ị pụrụ iso ma ọ bụrụ na igosipụta okwukwe n’àjà Jisọs Kraiṣt ma soro ezi ọgbakọ ndị Kraịst na-arụsi ọrụ ike. E jibeghị nkà ihe ọmụma merụọ ya kama ọ nọgidewo na-abụ “ide na ntọala nke eziokwu.” (1 Timoti 3:15; tụlee Jọn 4:24; 8:31, 32.) Mgbe ahụ ị pụrụ ilepụ anya maka ọdịnihu dị ebube mgbe ụmụ ndị ikom a mụrụ ọzọ nke Chineke na-achị achị n’eluigwe, ụmụ nile nke Chineke n’elu ala abụrụkwa ndị e weghachiri n’izu okè na paradaịs elu ala dị ebube. Ya mere jiri ohere i nwere mee ihe maka ndụ n’ụwa ọhụrụ ahụ nke ngọzi ebighị ebi.—Ndị Rom 8:19-21; 2 Pita 3:13.

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya