Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • Ihe Gafere Afọ 50 nke ‘Ịgabita’
    Ụlọ Nche—1996 | Nọvemba 1
    • Ihe Gafere Afọ 50 nke ‘Ịgabita’

      DỊ KA EMMANUEL PATERAKIS SI KỌỌ

      Narị afọ 19 gara aga Pọl onyeozi nwetara ọkpụkpọ òkù pụrụ iche, sị: “Gabita na Masedọnia, nyere anyị aka.” Pọl ji obi ya nakwere ohere ọhụrụ a “izi ha ozi ọma.” (Ọrụ 16:9, 10) Ọ bụ ezie na ọkpụkpọ òkù m natara adịghị anya laa azụ otú ahụ, ka o sina dị ọ bụ ihe karịrị afọ 50 gara aga ka m kwetara ‘ịgabita’ n’ókèala ndị ọhụrụ na mmụọ nke Aịsaịa 6:8: “Lee m; ziga m.” Ọtụtụ njem m nyere m utu aha bụ́ Ome Njem Nleta Oge Nile, ma ọrụ m yiri njem nleta n’ụzọ dị nta. Ihe karịrị otu ugboro, mgbe m rutere n’ọnụ ụlọ m na họtel, m na-egbu ikpere n’ala kelee Jehova maka nchebe ya.

      AMỤRỤ m na January 16, 1916, na Hierápetra, dị na Krit, n’ime ezinụlọ ji okpukpe Orthodox kpọrọ ihe nke ukwuu. Malite n’oge m bụ nwa ọhụrụ mama m na-akpọrọ mụ na ụmụnne m ndị nwanyị atọ gaa chọọchị na Sunday. Banyere nna m, o nwere mmasị karị n’ịnọrọ n’ụlọ na-agụ Bible. Asọpụụrụ m nna m nke ukwuu—nwoke na-akwụwa aka ọtọ, ezi mmadụ, nke na-agbaghara—ọnwụ ya kwa, mgbe m dị afọ itoolu, metụtara m nke ukwuu.

      Ana m echeta na mgbe m dị afọ ise, agụrụ m n’ụlọ akwụkwọ otu ihe odide nke kwuru, sị: “Ihe nile dị anyị gburugburu na-akpọsa ịdị adị Chineke.” Ka m na-etolite, ekwenyere m kpam kpam na nke a. N’ihi ya, mgbe m dị afọ 11, ahọọrọ m ide otu edemede nwere Abụ Ọma 104:24 dị ka isiokwu ya: “Lee ka ọrụ Gị si baa ụba nke ukwuu, Jehova! N’amamihe ka I meworo ha nile: ụwa jupụtara n’ihe I nwetara.” Ihe ijuanya nile nke okike dọọrọ mmasị m, ọbụna ntakịrị ihe ndị dị ka mkpụrụ ndị nwere ntakịrị nku ka ikuku wee nwee ike ibupụ ha na ndo nke osisi mịrị ha. Izu sochirinụ ka m nyefesịrị ihe odide m, onye nkụzi m gụụrụ ya klas dum, e mesịakwa gụọrọ ya ụlọ akwụkwọ dum. N’oge ahụ, ndị nkụzi nọ na-alụso echiche ndị Kọmunist ọgụ, obi dịkwa ha ụtọ ịnụ mgbachite m gbachiteere ịdị adị Chineke. Nye m, obi dị m nnọọ ụtọ ikwupụta nkweta m n’Onye Okike.

      Azịza Nye Ajụjụ M Dị Iche Iche

      M ka na-echeta nke ọma mgbe mbụ m zutere Ndịàmà Jehova ná mmalite afọ ndị 1930. Emmanuel Lionoudakis anọwo na-eme nkwusa n’obodo nile nke Krit. Anatara m ya ọtụtụ akwụkwọ nta, kama ọ bụ nke a kpọrọ Where Are the Dead? dọọrọ mmasị m n’ezie. Ana m atụ egwu ọnwụ nke ukwuu nke na agaghịdị m abanye n’ọnụ ụlọ nna m nọrọ nwụọ. Ka m gụrụ akwụkwọ nta a ugboro ugboro ma mụta ihe Bible na-akụzi banyere ọnọdụ ndị nwụrụ anwụ, ahụrụ m ka egwu nkwenkwe ụgha m pụrụ.

      Otu ugbo n’afọ n’oge okpomọkụ, Ndịàmà bịara leta obodo anyị ma wetakwuoro m akwụkwọ ka m gụọ. Nke nta nke nta nghọta m nwere banyere Akwụkwọ Nsọ mụbara, ma anọgidere m na-aga Chọọchị Orthodox. Otú ọ dị, akwụkwọ bụ́ Deliverance wetara oké mgbanwe. O gosiri n’ụzọ doro anya ọdịiche dị ná nzukọ Jehova na nke Setan. Malite n’oge a gaa n’ihu, amalitere m ịmụchi Bible na akwụkwọ Watch Tower Society ọ bụla pụrụ iru m aka anya karị. Ebe a machibidoro Ndịàmà Jehova iwu na Gris, amụrụ m ihe na nzuzo n’abalị. N’agbanyeghị nke ahụ, enwere m oké ịnụ ọkụ n’obi banyere ihe m na-amụta nke na apụghị m igbochi onwe m ịgwa onye ọ bụla banyere ya. Ọ dịghị anya tupu ndị uwe ojii malite inyo m enyo, na-abịa na nke m n’oge ọ bụla n’ehihie na abalị ịchọ akwụkwọ.

      Na 1936, ejere m nzukọ nke mbụ m, na Iráklion nke dị kilomita 120 n’ịdị anya. Obi dị m ụtọ nke ukwuu izute Ndịàmà. Ihe ka ukwuu n’ime ha abaghị ọgaranya, ihe ka n’ọnụ ọgụgụ bụ ndị ọrụ ubi, ma ha nyere aka ime ka m kweta na nke a bụ eziokwu. Emere m nraranye m nye Jehova n’ebe ahụ ozugbo.

      Baptism m bụ ihe omume m na-agaghị echefu echefu. Otu abalị na 1938, Nwanna Lionoudakis kpọọrọ mụ na mmadụ abụọ n’ime ndị m na-eduziri ọmụmụ Bible n’oké ọchịchịrị gaa n’ụsọ osimiri. Mgbe o kpesịrị ekpere, ọ sụbanyere anyị n’ime mmiri.

      E Jide M

      Ihe mere mgbe mbụ m pụrụ ije mee nkwusa, ka m kwuo ya otú ahụ. Ezutere m ochie enyi ụlọ akwụkwọ m onye ghọworo ụkọchukwu, anyị nwekwara nkwurịta okwu magburu onwe ya. Ma ka e mesịrị ọ kọwara na n’ikwekọ n’iwu bishọp nyere, na ya aghaghị ịhụ na e jidere m. Ka anyị nọ na-echere n’ọfịs onye isi obodo maka mbịarute ndị uwe ojii si n’obodo dị nso, ìgwè mmadụ gbakọrọ n’èzí. Ya mere eweere m otu Agba Ọhụrụ Grik dị n’ọfịs ahụ wee malite ịgwa ha okwu dabere na Matiu isi nke 24. Na mbụ ndị ahụ achọghị ịṅa ntị, ma onye ụkọchukwu ahụ tinyere ọnụ. “Kwenụ ya ka o kwuo okwu,” ka o kwuru. “Ọ bụ Bible anyị.” Enwere m ike ikwu okwu ruo otu hour na ọkara. N’ụzọ dị otú a, ụbọchị mbụ m n’ozi bụkwa oge m kwuru okwu ihu ọha mbụ m. Ebe ndị uwe ojii na-abịarutebeghị mgbe m ji kwusie okwu, onye isi obodo ahụ na ụkọchukwu ahụ kpebiri ime ka ìgwè ndị ikom chụpụ m n’obodo. N’ebe mbụ ụzọ gbagọrọ, amalitere m ịgbasi ọsọ ike ruo n’ókè m nwere ike iji zere nkume ndị ha nọ na-atụ.

      N’echi ya ndị uwe ojii abụọ, ndị bishọp ahụ sonyeere, jidere m n’ebe ọrụ. N’ụlọ ọrụ ndị uwe ojii, enwere m ike ịgbara ha àmà site na Bible, ma ebe akwụkwọ m ndị e ji amụ Bible na-enweghị mbịanye aka bishọp nke iwu chọrọ, e boro m ebubo ntọghata na ikesa akwụkwọ a na-akwadoghị. A tọhapụrụ m na-echere mgbe a ga-ekpe m ikpe.

      Ikpe m ikpe weere ọnọdụ otu ọnwa n’ihu. Ná ngọpụ m emere m ka ọ pụta ìhè na ihe m na-eme agwụla irube isi n’iwu Kraịst nke ime nkwusa. (Matiu 28:19, 20) Ọkàikpe ahụ ji njakịrị zaa, sị: “Nwa m, a kpọgburu Onye nyere iwu ahụ n’obe. N’ụzọ dị mwute, enweghị m ikike inye gị ụdị ntaramahụhụ ahụ.” Otú ọ dị, otu nwa okorobịa bụ́ ọkàiwu, bụ́ onye m na-amabughị gbachiteere m, na-ekwu na ebe echiche ọchịchị ndị Kọmunist na ekweghị na Chineke juru ebe nile, ụlọikpe ahụ kwesịrị inwe obi ụtọ na e nwere ụmụ okorobịa dị njikere ịgbachitere Okwu Chineke. Mgbe ahụ ọ bịara kelee m n’ụzọ na-ekpo ọkụ banyere ngọpụ m e dere ede, nke dị n’ime faịlụ m. N’inwe mmasị na m bụ nnọọ nwa okorobịa, o kwuru na ya ga-agbachitere m n’anaghị m ego. Kama ịga mkpọrọ ọnwa atọ ma ọ dịkarịa ala, a mara m ikpe ije mkpọrọ ụbọchị iri nanị na nhá drachma 300. Mmegide dị otú ahụ nanị wusiwanyere mkpebi m ike ijere Jehova ozi na ịgbachitere eziokwu ahụ.

      N’oge ọzọ mgbe e jidere m, ọkàikpe hụrụ otú m si na-ezo aka na Bible n’ụzọ dị mfe. Ọ gwara bishọp ahụ ka ọ pụọ n’ọfịs ya, na-asị: “Ị rụọla ọrụ gị. M ga-ahụ banyere ya.” O wepụtaziri Bible ya, anyị kwurịtakwara okwu banyere Alaeze Chineke n’ehihie ahụ nile. Ihe ndị dị otú ahụ merenụ gbara m ume ịga n’ihu n’agbanyeghị ihe isi ike.

      Amamikpe Ọnwụ

      Na 1940, a kpọrọ m maka ije ozi agha, m deekwa akwụkwọ ozi na-akọwa ihe mere m na-apụghị iji kwe ka e debanye aha m. Ụbọchị abụọ n’ihu ndị uwe ojii jidere m ma tikaa m ahụ. E zijeziri m n’ihu agha n’Albania, bụ́ ebe a kpụpụrụ m n’ụlọikpe ndị agha n’ihi na m jụrụ ịlụ agha. Ndị isi ndị agha gwara m na ha achọghị ịma ma m ziri ezi ma ọ bụ na mụ ezighị ezi kama ná mmetụta nke ihe nlereanya m pụrụ inwe n’ahụ ndị agha. A mara m ikpe ọnwụ, ma n’ihi otu mmehie ihe n’iwu, n’ụzọ nyere m oké ahụ efe, e gbubiri amamikpe a ịbụ mkpọrọ afọ iri nke ọrụ ahụhụ. Anọrọ m ọnwa ole na ole na-esonụ nke ndụ m n’ụlọ mkpọrọ ndị agha dị na Gris n’ọnọdụ ndị siri nnọọ ike, nke m ka na-arịa ihe ụfọdụ si ebe ahụ.

      Otú ọ dị, ụlọ mkpọrọ akwụsịghị m ime nkwusa. Ọ dịghị ma ọlị! Ọ dị mfe ịmalite mkparịta ụka, ebe ọtụtụ nọ na-eche ihe mere onye nkịtị ji nọrọ n’ụlọ mkpọrọ ndị agha. Otu n’ime nkwurịta okwu ndị a m sooro otu nwa okorobịa nwere obi eziokwu nwee dujere n’ọmụmụ Bible n’ime ogige ụlọ mkpọrọ ahụ. Afọ 38 n’ihu, ezutere m nwoke a ọzọ ná mgbakọ. Ọ nakwerewo eziokwu ahụ ma na-eje ozi dị ka onye nlekọta ọgbakọ n’àgwàetiti Lefkás.

      Mgbe ndị agha Hitler wakporo Yugoslavia na 1941, e bumikwuru anyị n’ebe ndịda gaa n’otu ụlọ mkpọrọ dị na Preveza. N’oge njem ahụ, ụgbọelu ndị Germany na-atụ bọmbụ wakporo ìgwè ndị njem anyị, e nyeghịkwa anyị bụ́ ndị mkpọrọ ihe oriri. Mgbe ntakịrị bred m nwere gwụsịrị, ekpegaara m Chineke ekpere, sị: “Ya bụrụ uche gị ka m nwụọ n’agụụ mgbe ị zọpụtasịworo m pụọ n’amamikpe ọnwụ, mgbe ahụ ka uche gị mee.”

      N’echi ya otu ọfịsa kpọpụrụ m n’akụkụ n’oge a na-akpọ aha, mgbe ọ nụsịkwara ebe m si, ndị mụrụ m, na ihe mere m ji nọrọ n’ụlọ mkpọrọ, ọ gwara m ka m so ya. Ọ kpọọrọ m gaa n’ebe ndị ọfịsa na-eri nri nke dị n’ime obodo wee tụọrọ m aka n’otu table nke bred, cheese, na anụ atụrụ a hụrụ n’ọkụ juru wee gwa m riwe. Ma akọwara m na ebe ndị mkpọrọ 60 ndị ọzọ na-enweghị ihe ha ga-eri, akọ na uche m agaghị ekwe m rie ihe. Onye isi ahụ zara, sị: “Apụghị m inye mmadụ nile ihe oriri! Nna gị mesapụụrụ m nnọọ aka. Eji m gị ụgwọ ma ejighị m ndị ọzọ.” “Ọ bụrụ otú ahụ m ga-abịa laghachi,” ka m zaghachiri. O chere echiche ruo nwa oge wee nye m otu nnukwute akpa iji tinye ihe oriri ruo n’ókè m nwere ike.

      Mgbe m laghachiri n’ụlọ mkpọrọ, ebuturu m akpa ahụ n’ala wee kwuo, sị: “Ụmụ ibe, ọ bụ unu nwe ihe a.” Ná ndabata, ná mgbede ụnyaahụ, ebowo m ebubo ịkpata ọnọdụ ọjọọ nke ndị mkpọrọ ndị nke ọzọ n’ihi na anaghị m esonye n’ekpere ha na-ekpegara Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke bụ́ Meri. Otú ọ dị, otu onye Kọmunist agbachiteworo m. Ugbu a mgbe ọ hụrụ ihe oriri ahụ, ọ sịrị ndị ọzọ: “Ebee ka ‘Nwa Agbọghọ Na-amaghị Nwoke bụ́ Meri’ unu nọ? Unu kwuru na anyị ga-anwụ n’ihi nwoke a, ma ọ bụ ya na-ewetara anyị ihe oriri.” Mgbe ahụ o chigharịkwuuru m wee kwuo, sị: “Emmanuel! Bịa kpee ekpere.”

      Ntakịrị oge ka ọ gasịrị, ọbịbịa ndị agha Germany mere ka ndị nche ụlọ mkpọrọ ahụ gbaa ọsọ, na-atọhapụ ndị e ji eji. Agawara m Patras iji chọta Ndịàmà ndị ọzọ tupu m gawa Atens ná ngwụsị nke May 1941. N’ebe ahụ enwere m ike inweta uwe na akpụkpọ ụkwụ ụfọdụ nakwa ịsa ahụ mbụ m n’ihe gafere otu afọ. Ruo mgbe mweghara ahụ gasịrị, ndị Germany kwụsịrị m mgbe mgbe ka m na-eme nkwusa, ma ọ dịghị mgbe ha jidere m. Otu n’ime ha kwuru, sị: “Na Germany anyị na-agbagbu Ndịàmà Jehova. Ma n’ebe a ọ dị anyị ka ndị iro anyị nile bụrụ Ndịàmà!”

      Ihe Omume Mgbe Agha Gasịrị

      Dị ka a ga-asị na Gris alụjubeghị ọgụ afọ, agha obodo tisakwuru ya malite na 1946 ruo 1949, na-akpata ọtụtụ puku ọnwụ. Agbamume dị ukwuu dị ụmụnna mkpa iji nọgidesie ike n’oge mgbe nanị ije nzukọ pụrụ iduje n’ịbụ onye e jidere. A mara ọtụtụ ụmụnna ikpe ọnwụ n’ihi nguzo nnọpụiche ha. Ma n’agbanyeghị nke a, ọtụtụ ndị zaghachiri n’ozi Alaeze ahụ, anyị mekwara otu onye ma ọ bụ abụọ baptism kwa izu. Ka ọ dị na 1947, amalitere m ịrụ ọrụ n’ụlọ ọrụ Society dị n’Atens n’ehihie ma na-eleta ọgbakọ dị iche iche n’abalị dị ka onye nlekọta na-ejegharị ejegharị.

      Na 1948, enwere m ọṅụ nke ịbụ onye a kpọrọ ije Watchtower Bible School of Gilead, na United States. Ma ọ dị nsogbu e nwere. N’ihi mkpọrọ ndị a tụrụ m na mbụ, enweghị m ike inweta akwụkwọ ikike ngafe. Otú ọ dị, otu n’ime ndị m na-eduziri ọmụmụ Bible na otu onye isi agha bụ enyi. Site n’enyemaka nke onye a m na-eduziri ọmụmụ ihe, enwetara m akwụkwọ ikike ngafe m nanị n’ime izu ole na ole. Ma o nyere m nsogbu n’uche mgbe, ntakịrị oge tupu oge m ga-eji hapụ, e jidere m n’ihi ikesa Ụlọ Nche. Otu onye uwe ojii kpọọrọ m gakwuru onye isi Ndị Uwe Ojii Nchebe Obodo dị n’Atens. N’ụzọ juru m nnọọ anya, ọ bụ otu n’ime ndị agbata obi m! Onye uwe ojii ahụ kọwara ihe mere e ji jide m ma nye ya ngwugwu magazin ahụ. Onye agbata obi m wepụtara ikpo magazin Ụlọ Nche site n’ime table ya wee sị m: “Enweghị m mbipụta kasị ọhụrụ. Ka m werenụ otu.” Lee ka obi si ruo m ala ịhụ aka Jehova n’okwu ndị dị otú ahụ!

      Klas nke 16 nke Gilead, na 1950, bụ ahụmahụ magburu onwe ya. Mgbe ọ gwụsịrị, e kenyere m ọrụ na Saịprọs, bụ́ ebe m chọpụtara n’oge na-adịghị anya na mmegide ndị ụkọchukwu kpụ ọkụ n’ọnụ dị ka na Gris. Ọtụtụ mgbe anyị aghaghị iche ìgwè ndị na-anụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè ihu bụ́ ndị ndị ụkọchukwu Orthodox kpaliri ịgba aghara. Na 1953 a bịanyegharịghị aka n’akwụkwọ ikike ngafe m maka Saịprọs, e kenyegharịkwara m ọrụ gaa Istanbul, Turkey. N’ebe a kwa, anọteghị m aka. Esemokwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị dị n’agbata Turkey na Gris pụtara na, n’agbanyeghị ihe ọma ndị a na-arụpụta n’ọrụ nkwusa ahụ, aghaghị m ịga ebe ọzọ—Ijipt.

      Oge m nọ n’ụlọ mkpọrọ, Abụ Ọma 55:6, 7 ga-agbata m n’uche. N’ebe ahụ Devid kwupụtara ọchịchọ ịgbalaga n’ọzara. Echetụghị m n’echiche na ọ bụ kpọmkwem ebe m ga-anọ otu ụbọchị. Na 1954, mgbe njem na-agwụ ike, nke were ọtụtụ ụbọchị, nke m ji ụgbọ okporo ígwè na ụgbọ mmiri osimiri Naịl mee gasịrị, n’ikpeazụ erutere m ebe m na-aga—Khartoum, dị na Sudan. Nanị ihe m chọrọ ime bụ ịsa ahụ na ihi ụra. Ma echefuru m na ọ bụ etiti ehihie. Mmiri dị na tankị dị n’elu ụlọ rechara m isi, na-amanye m iyi okpu helmet ruo ọtụtụ ọnwa ruo mgbe ala isi m dịchara mma.

      Ọtụtụ mgbe ọ dị m ka e kewapụrụ m iche ebe ahụ, nanị m n’etiti Sahara, otu puku mile pụọ n’ọgbakọ kasị nso, ma Jehova kwagidere m ma nye m ume ịga n’ihu. Agbamume bịara mgbe ụfọdụ site n’ebe ndị a na-atụghị anya ha ma ọlị. Otu ụbọchị, ezutere m onye nduzi nke Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie nke Khartoum. Ọ na-anabata echiche ọhụrụ, anyị nwekwara nkwurịta okwu dị mma. Mgbe ọ chọpụtara na m bụ onye Gris, ọ jụrụ m ma m ga-emere ya ihe ọma site n’ịga n’ebe ngosi ihe mgbe ochie ahụ ije sụgharịa ihe odide ụfọdụ e dekwasịrị n’arịa ndị a chọtara n’ime otu chọọchị narị afọ nke isii. Mgbe m nọsịrị hour ise n’otu ụlọ nke okpukpu ime ala nke na-ekwu ume, ahụrụ m otu efere ọjị e dekwasịrị aha Jehova, Tetragrammaton ahụ! Cheedị ọṅụ m nwere! Na Europe ọ bụghị ihe ọhụrụ ịhụ aha Chineke na chọọchị, ma ọ bụ ihe a na-adịghị ahụkebe n’etiti Sahara!

      Mgbe mgbakọ mba nile e nwere na 1958 gasịrị, e kenyere m ọrụ dị ka onye nlekọta zonu ije leta ụmụnna ná mba na ókèala 26 n’Etiti na na Nso Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na gburugburu Mediterranean. Ọtụtụ mgbe amaghị m otú m ga-esi pụta n’ọnọdụ siri ike, ma Jehova nyere ụzọ mgbapụ mgbe nile.

      Nlekọta nzukọ Jehova na-egosi Ndịàmà e kewapụrụ iche ná mba ụfọdụ na-amasị m mgbe nile. N’otu oge, ezutere m otu nwanna nwoke bụ onye India nke na-arụ ọrụ n’ebe a na-egwupụta mmanụ. O yiri ka ọ bụ nanị ya bụ Onyeàmà nọ ná mba ahụ. N’ebe ọ na-etinye ihe, o nwere akwụkwọ n’asụsụ 18 dị iche iche, bụ́ ndị ọ na-enye ndị ọrụ ibe ya. Ọbụna n’ebe a, ebe a machibidoro okpukpe nile bịara abịa iwu kpam kpam, nwanna anyị nwoke echefughị ibu ọrụ o nwere ikwusa ozi ọma ahụ. Ndị ibe ya nwere mmasị ịhụ na e zitewo onye nnọchiteanya nke okpukpe ya ịbịa leta ya.

      N’afọ 1959 ejere m leta Spain na Portugal. Ha abụọ nọcha n’okpuru ọchịchị aka ike ndị agha n’oge ahụ, ebe a machibidoro ọrụ Ndịàmà Jehova iwu kpam kpam. N’ime otu ọnwa, enwere m ike iduzi ihe karịrị otu narị nzukọ, na-agba ụmụnna ume ka ike ghara ịgwụ ha n’agbanyeghị ihe isi ike dị iche iche.

      Anọkwaghị M Nanị M

      Ruo ihe karịrị afọ 20, anọwo m na-ejere Jehova ozi n’ozi oge nile dị ka nwoke na-alụghị nwanyị, ma na mberede ike gwụrụ m na njem oge nile m n’enweghị otu ebe obibi. Ọ bụ ihe dị ka n’oge a ka m zutere Annie Bianucci, onye ọsụ ụzọ pụrụ iche nọ na Tunisia. Anyị lụrụ na 1963. Ịhụnanya ya maka Jehova na eziokwu ahụ, nraranye ya n’ozi ahụ tinyere nkà izi ihe ya, na ọmụma ọ maara asụsụ dị iche iche ghọrọ ngọzi n’ezie n’ọrụ ozi ala ọzọ na nke sekit anyị n’ebe ugwu na n’ebe ọdịda anyanwụ Africa na n’Itali.

      N’August 1965 e kenyere mụ na nwunye m ọrụ na Dakar, Senegal, bụ́ ebe m nwere ihe ùgwù nke ịhazi alaka ụlọ ọrụ dị n’ógbè ahụ. Senegal bụ mba dị ịrịba ama maka ya ikwe okpukpe ndị ọzọ nọrọ, obi abụọ adịghị ya na ọ bụ n’ihi president ya, bụ́ Leopold Senghor, otu n’ime ndị isi Ọchịchị ole na ole bụ́ ndị Africa degaara President Banda nke Malawi akwụkwọ n’ịkwado Ndịàmà Jehova n’oge ajọ mkpagbu ahụ weere ọnọdụ na Malawi n’afọ ndị 1970.

      Ngọzi Bara Ụba nke Jehova

      Na 1950, mgbe m hapụrụ Gilead gawa Saịprọs, eji m igbe ákwà asaa gawa. Mgbe m na-ahapụ Turkey, enwere m nanị ise. Ma ebe m na-eme njem nke ukwuu, ọ ghaghị ịmara m ahụ ibu ibu na-agafeghị kilogram 20 ahụ iwu kwuru, nke gụnyere faịlụ m na “ntọntọ” ígwè typewriter m. Otu ụbọchị agwara m Nwanna Knorr, bụ́ onye isi oche Watch Tower Society n’oge ahụ, sị: “I chebere m pụọ n’ịhụ ihe onwunwe n’anya. I mere ka m jiri kilogram 20 na-adị ndụ, m na-emekwa nnọọ nke ọma.” Ọ dịtụbeghị m ka a napụrụ m ihe n’ihi enweghị ọtụtụ ihe.

      Nsogbu bụ isi m nwere n’oge njem m bụ ịbanye na isi ná mba dị iche iche pụọ. Otu ụbọchị, n’otu ala ebe a machibidoro ọrụ ahụ iwu, onye ọrụ maka ihe si mba ọzọ malitere ịfọkasị faịlụ m. Nke a bụ ihe ize ndụ nye Ndịàmà nọ ná mba ahụ, ya mere ewepụtara m n’ime jaket m otu akwụkwọ ozi nwunye m dere wee sị onye ọrụ maka ihe si mba ọzọ: “Ahụrụ na ị na-enwe mmasị ịgụ akwụkwọ ozi. Ị̀ ga-enwekwu mmasị ịgụ akwụkwọ ozi a nwunye m dere, nke na-adịghị n’ime faịlụ ndị ahụ?” N’ihere, ọ rịọrọ mgbaghara ma hapụ m ka m gafere.

      Kemgbe 1982 mụ na nwunye m anọwo na-eje ozi dị ka ndị ozi ala ọzọ na Nice, na ndịda France. N’ihi ahụ ike na-ada ada, enwekwaghị m ike imeru ihe dị ka m na-emebu. Ma nke ahụ apụtaghị na ọṅụ anyị ebelatawo. Anyị ahụwo na ‘ọrụ anyị abụghị ihe efu n’ime Onyenwe anyị.’ (1 Ndị Kọrint 15:58) Enwere m ọṅụ nke ịhụ ọtụtụ ndị m nweworo ihe ùgwù nke iduziri ọmụmụ ihe n’afọ ndị gafeworonụ tinyere ihe karịrị mmadụ 40 bụ́ ndị ezinụlọ m ka ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-ejere Jehova ozi.

      Adịghị m akwa mmakwaara ma ọlị banyere àjà dị iche iche nke ndụ ‘ngabita’ m gụnyeworo. E kwuwerị, ọ dịghị nke ọ bụla n’ime àjà ndị anyị na-achụ nke pụrụ iru ka ihe Jehova na Ọkpara ya, Kraịst Jisọs, mewooro anyị. Mgbe m cheghachiri echiche azụ n’afọ 60 gara aga m mawooro eziokwu ahụ, apụrụ m ikwu na Jehova agọziwo m n’ụba. Dị ka Ilu 10:22 na-ekwu, “ngọzi Jehova, nke ahụ na-eme mmadụ ọgaranya.”

      N’enweghị obi abụọ, “ebere [Jehova] dị mma karịa ndụ.” (Abụ Ọma 63:3) Ka nsogbu dị iche iche nke ime agadi nọgidere na-amụba, okwu onye ọbụ abụ ahụ e nyere ike mmụọ nsọ na-abatakarị n’ekpere m: “N’ime Gị, Jehova, ka m gbabaworo: ekwela ka ihere mee m ruo mgbe ebighị ebi. N’ihi na Gị onwe gị bụ olileanya m, Onyenwe anyị Jehova: Gị bụ ntụkwasị obi m site na nwata. Chineke, I ziwo m ihe site na nwata; ọ bụkwa ruo ugbu a ka m na-egosi oké ọrụ Gị nile. Ọzọ, ọbụna ruo agadi na isi awọ ahapụla m, Chineke.”—Abụ Ọma 71:1, 5, 17, 18.

      [Foto dị na peeji nke 25]

      Mụ na nwunye m, bụ́ Annie, taa

  • “Onyinye Dị Ebube Sitere n’Aka Jehova”
    Ụlọ Nche—1996 | Nọvemba 1
    • “Onyinye Dị Ebube Sitere n’Aka Jehova”

      MBIPỤTA Ụlọ Nche nke May 1, 1996, nwere ntụle dị omimi nke nnọpụiche ndị Kraịst na ụzọ isi hazie ibu ọrụ anyị n’ebe Jehova na “Siza” nọ. (Matiu 22:21) A nụwo ọtụtụ okwu ekele maka ihe ọmụma ọhụrụ ahụ e nyere. Otu n’ime ha bụ akwụkwọ ozi na-esonụ, nke Onyeàmà nọ na Gris degaara Òtù Na-achị Isi nke Ndịàmà Jehova:

      “Achọrọ m ikwupụta ekele m kasị omimi nye unu ụmụnna nile anyị hụrụ n’anya maka ilekọta anyị nke ọma otú a n’ụzọ ime mmụọ. Ebe m nọworo ihe ruru afọ itoolu n’ụlọ mkpọrọ n’ihi okwukwe m nke ndị Kraịst, enwere m mmasị n’ezie n’echiche ndị dị ebube dị ná mbipụta Ụlọ Nche nke May 1, 1996. (Aịsaịa 2:4) Nke a bụ onyinye dị ebube sitere n’aka Jehova.—Jemes 1:17.

      “Ka m nọ na-agụ isiokwu ndị a, echetara m otu okwu dị n’Ụlọ Nche bu ụzọ (August 1, 1994, peji nke 14): ‘N’ụzọ doro anya, ezi uche bụ àgwà dị oké ọnụ ahịa, otu nke na-akwali anyị ịhụkwu Jehova n’anya.’ Ee, ụmụnna, ana m ekele Jehova na m bụ akụkụ nke nzukọ ya nwere obiọma, nke na-ahụ n’anya, nke na-egosipụta amamihe ya n’ụzọ doro anya.—Jemes 3:17.

      “A nabatawo ìhè mụbara amụba dị n’Ụlọ Nche nke May 1 nke ọma n’ebe a na Gris, karịsịa nye ndị nọworo ọtụtụ afọ n’ụlọ mkpọrọ ma ọ bụ ndị ka nọ n’ụlọ mkpọrọ n’ihi okwukwe ha. Ọzọkwa, unu emeela. Ka Jehova jiri mmụọ ya wusie unu ike ịnọgide na-enye anyị nri ime mmụọ bara uru n’oge ndị a jupụtara ná nsogbu.”

Akwukwo Igbo (1984-2025)
Pụọ
Banye
  • Igbo
  • Ziga ya
  • Ịgbanwe Ihe
  • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
  • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
  • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
  • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
  • JW.ORG
  • Banye
Ziga ya